Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 33
  • Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Bụ Alaeze Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Olee Ihe Ndị Alaeze Chineke Ga-eme?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 33
Isi nke 33. Ebe ndị mmadụ bi n’ụwa mgbe ọ ghọrọ paradaịs.

ISI NKE 33

Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ọtụtụ ihe gbanwee n’ụwa. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere gị.

1. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi na ya?

Jizọs bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, bibiekwa ọchịchị ụmụ mmadụ n’agha Amagedọn. (Mkpughe 16:​14, 16) N’oge ahụ, nkwa a dị na Baịbụl ga-emezuru n’isi. Baịbụl sịrị: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.” (Abụ Ọma 37:10) Jizọs ga-eji Alaeze ahụ mee ka udo dịrị ebe niile n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi.​—Gụọ Aịzaya 11:4.

2. Olee otú ndụ ga-adị mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa?

Alaeze Chineke chịwa ụwa “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe ndị niile bi na ya bụ ndị ezi omume hụrụ ma Jehova ma mmadụ ibe ha n’anya. O nweghị onye ga-arịa ọrịa. Ha niile ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.

3. Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị ma e bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ?

E bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ, Jizọs ga-achị otu puku afọ. N’oge ahụ, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị ga-eso ya achị ga-eme ka ndị mmadụ zuo okè, gharakwa ịna-eme mmehie. Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ, ụwa niile ga-abụ paradaịs mara ezigbo mma. Ndị niile bi na ya ga-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-erubere Jehova isi. Jizọs ga-enyeghachizi Nna ya, bụ́ Jehova, ọchịchị ka ọ chịrị gawa. N’oge ahụ, ‘a ga-edo aha Chineke nsọ’ otú a na-edotụbeghị ya na mbụ. (Matiu 6:​9, 10) Ọ ga-edo ewu na ọkụkọ anya mgbe ahụ na Jehova bụ ezigbo onye ọchịchị, onye ihe gbasara ndị ọ na-achị na-emetụ n’obi. Jehova ga-ebibizi Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na onye ọ bụla ọzọ na-enupụrụ ya isi. (Mkpughe 20:​7-​10) Ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe niile o kwuru na Baịbụl na ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.

4. Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ

Baịbụl kwuru na “mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” (Ekliziastis 8:9) Jehova ga-eji Alaeze ya mee ka ọchịchị nchịgbu a kwụsị.

Gụọnụ Daniel 2:​44 na 2 Ndị Tesalonaịka 1:​6-8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Gịnị ka Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ga-eme ndị ọchịchị na ndị niile na-akwado ha?

  • Olee otú ihe ị mụtarala gbasara Jehova na Jizọs si eme ka obi sie gị ike na ha agaghị emegbu onye ọ bụla?

Ebe Jizọs si n’eluigwe na-achị ụwa mgbe ọ ghọrọ paradaịs.

5. O nweghị eze dị ka Jizọs

Jizọs, bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-emere ndị ọ ga na-achị n’ụwa ọtụtụ ihe ọma. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú Jizọs sirila gosi na inyere ndị mmadụ aka na-agụ ya agụụ nakwa na Chineke nyere ya ikike inyere ha aka.

VIDIO: Jizọs Gosiri Ihe Alaeze Chineke Ga-emere Anyị (1:​13)

Ihe ndị Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri anyị ihe ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị. N’ihe ndị e depụtara ebe a Jizọs ga-emere anyị, olee ndị ị kacha atụ anya ịhụ mgbe ha ga-eme? Gụọnụ amaokwu Baịbụl ya na nkwa nke ọ bụla so ka unu mụtakwuo gbasara nkwa ahụ.

MGBE JIZỌS NỌ N’ỤWA, . . .

JIZỌS GA-ESI N’ELUIGWE . . .

  • ọ baara oké ifufe mba.​—Mak 4:​36-​41.

  • mezie ihe niile ndị mmadụ mebirila n’ụwa.​—Aịzaya 35:​1, 2.

  • ọ rụrụ ọrụ ebube nye ọtụtụ puku mmadụ nri.​—Matiu 14:​17-​21.

  • mee ka agụụ kwụsị n’ụwa.​—Abụ Ọma 72:16.

  • ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa ha na-arịa.​—Luk 18:​35-​43.

  • hụ na e nweghịzi onye na-arịa ọrịa.​—Aịzaya 33:24.

  • ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.​—Luk 8:​49-​55.

  • kpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ọnwụ gharazie ịdị.​—Mkpughe 21:​3, 4.

6. Ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu magburu onwe ya

Alaeze Chineke ga-eme ka ọmarịcha ihe niile Jehova bu n’obi imere ụmụ mmadụ ruo ha aka. Ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ọ ga-abụ paradaịs. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe ndị Jehova si n’aka Ọkpara ya na-eme iji mezuo ihe o bu n’obi.

VIDIO: Hụperetụ Ihe Ọma Ndị Ga-eme n’Ọdịnihu (4:​38)

Gụọnụ Abụ Ọma 145:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee otú obi dị gị ịmara na Jehova ga-eji “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ”?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụrụ na anyị niile agbakọọ aka na anyị ga-akwụsịli nsogbu ndị dị n’ụwa.

  • Olee nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-akwụsị, ndị ọchịchị ụmụ mmadụ na-agaghị akwụsịli?

NCHỊKỌTA

Alaeze Chineke ga-eme ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ndị ga-ebikwa na ya bụ ndị ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Olee otú Alaeze Chineke ga-esi doo aha Chineke nsọ?

  • Olee ihe mere anyị ga-eji kwere na nkwa ndị dị na Baịbụl ga-emezu n’Alaeze Chineke?

  • N’ime ihe niile Alaeze Chineke ga-emere anyị, olee nke ị kacha atụ anya ya?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Chọpụta ihe Amagedọn bụ.

“Gịnị Bụ Agha Amagedọn?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe ndị ga-eme n’oge Jizọs kpọrọ “oké mkpagbu.”—Matiu 24:21.

“Gịnị Bụ Oké Mkpagbu Ahụ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta otú ezinụlọ nwere ike isi nọkọọ tụgharịa uche n’ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere ha n’ọdịnihu.

Hụ Onwe Gị na Paradaịs (1:50)

Gụọ isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Ihe Nọ Na-enye M Nsogbu n’Obi” ka ị hụ otú otu onye na-enupụburu ọchịchị isi si chọta ihe ọ na-achọ.

“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2012)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya