Mee Ka Ndụ Gị Gaa nke Ọma!
“Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu . . . Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”—ABỤ ỌMA 1:1, 3.
1. (a) Olee otú ọtụtụ ndị ntorobịa nọ n’ụwa si ele ihe ịga nke ọma anya? (b) Olee otú Bible si akọwa onye ihe na-agara nke ọma?
IHE ịga nke ọma—gịnị ka okwu ahụ pụtara nye gị? “Ihe mgbaru ọsọ m kasị mkpa bụ ịbụ ọchụ nta ego ihe na-agara nke ọma,” ka otu nwa okorobịa kwuru. Otu nwa agbọghọ na-eto eto, sịrị: “Ihe mgbaru ọsọ m bụ́ isi bụ inwe ezinụlọ obi ụtọ.” Ma nwa agbọghọ ọzọ na-eto eto, na-asị: “Ihe mgbaru ọsọ m bụ nnọọ inwe ụlọ mara mma, ụgbọala mara mma . . . enwere m mmasị n’ebe nanị m nọ.” Ihe bụ nsogbu bụ na ma ego, ma ezinụlọ, ma ọ bụ ọbụna ọrụ na-enye ezigbo ego adịghị nke bụ́ ihe e ji amata ezi ihe ịga nke ọma. N’Abụ Ọma 1:1-3, anyị na-agụ, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu . . . N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị . . . Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”
2. Ebee ka a na-achọta ezi ihe ịga nke ọma, oleekwa nanị ụzọ e si enweta ya?
2 N’ebe a Bible na-ekwe nkwa ihe mmadụ ọ bụla na-apụghị inye—ezi ihe ịga nke ọma! Ma ọ naghị ekwu banyere uru ihe onwunwe. Bible n’onwe ya na-adọ aka ná ntị, sị: “Ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche.” (1 Timoti 6:10) A na-achọta ezi ihe ịga nke ọma site n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ—gụnyere ịgbaso iwu Jehova. Ọ bụ nanị nke a pụrụ iweta ezi afọ ojuju na obi ụtọ! Ikekwe echiche nke ịnọ n’okpuru iwu Jehova na ịbụ onye a na-agwa ihe ọ ga-eme adịghị amasị gị. Ma, Jisọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3, NW) Ma ị maara ma ọ bụ na ị maghị, e kere gị inwe mkpa ime mmụọ—gụnyere mkpa gbara mkpọrọgwụ nke ịmara Chineke na ịghọta nzube ya. N’ihi ya, ị pụrụ inwe ezi obi ụtọ nanị ma ọ bụrụ na ị na-egbo mkpa ndị ahụ ma na-agbaso ‘iwu Jehova.’
Ihe Mere Iwu Chineke Ji Dị Anyị Mkpa
3. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee obi ụtọ ikwe ka Jehova ‘mee ka nzọụkwụ anyị guzosie ike’?
3 Jeremaịa onye amụma dere, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Otú a ka ọ dị n’ebe mmadụ nile nọ, ma nwata ma agadi. Ọ bụghị nanị na anyị enweghị amamihe, ahụmahụ, na ihe ọmụma iji mee ka nzọụkwụ anyị guzosie ike; o rughịrị anyị nnọọ ime otú ahụ. Ná Mkpughe 4:11, Bible na-asị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” Dị ka Onye Okike anyị, Jehova bụ “isi iyi ndụ.” (Abụ Ọma 36:9) N’ihi ya, ọ maara otú anyị kwesịrị isi jiri ndụ anyị mee ihe karịa onye ọ bụla ọzọ. Ya mere ọ bụghị iji napụ anyị obi ụtọ ka o ji nye iwu, kama ọ bụ iji nyere anyị aka ịbara onwe anyị uru. (Aịsaịa 48:17) I leghara iwu Chineke anya, ị maala onwe gị ikpe ịkụ afọ n’ala.
4. N’ihi gịnị ka imerime ndị na-eto eto ji ala ndụ ha n’iyi?
4 Dị ka ihe atụ, ì chetụwo echiche ihe mere imerime ndị na-eto eto ji ala ndụ ha n’iyi site n’ọgwụ ọjọọ, inwe mmekọahụ aghara aghara, na omume ọjọọ ndị ọzọ? Abụ Ọma 36:1, 2 na-akọwa, sị: “Ihe nke na-apụta n’ọnụ njehie nke onye na-emebi iwu na-asị n’etiti obi m, ọ dịghị oké egwu Chineke dị n’anya ya abụọ. N’ihi na ọ na-agwa onwe ya okwu ire ụtọ n’anya onwe ya, banyere ịchọpụta ajọ omume ya na ịkpọ ya asị.” N’ihi na ha enweghị ezi “oké egwu Chineke,” ọtụtụ ndị na-eto eto na-aghọgbu onwe ha gaa n’ikwere na ọ dịghị ihe ndị na-esi n’akparamàgwà dị ize ndụ apụta. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ha aghaghị ịnakwere ụkpụrụ a na-adịghị agbanwe agbanwe, bụ́: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye Mmụọ Nsọ ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.”—Ndị Galetia 6:7, 8.
“Ịgụta Ụbọchị”
5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ndị ntorobịa kwesịrị iji ‘gụta ụbọchị ha,’ gịnịkwa ka ime otú ahụ pụtara? (b) Gịnị ka ‘icheta Onye keworo anyị’ pụtara?
5 Ị̀ pụrụ isi aṅaa mee ka ndụ gị gaa nke ọma ma “weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi”? Mosis dere, sị: “Ụbọchị afọ nile anyị dị [afọ iri asaa]; ma ọ bụrụ na ha esite n’ịdị ike anyị ruo [afọ iri asatọ] . . . ọ gbapụwo ọsọ ọsọ, anyị wee felaa dị ka nnụnụ.” (Abụ Ọma 90:10) Ọ pụrụ ịbụ na ị dịghị echekarị echiche banyere ọnwụ, ma ọ bụrụ na i chetụworị ya eche. N’ezie, ọtụtụ ndị ntorobịa na-akpa àgwà ka a ga-asị na ha bụ anwụ anwụ. Ma Mosis na-eme ka anyị hụ eziokwu ahụ dị mwute nke bụ́ na ndụ dị mkpụmkpụ. Anyị ejighịdị n’aka na anyị ga-adịru afọ 70 ma ọ bụ 80. “Mgbe na ihe ndapụta” pụrụ igbu ọbụna ndị na-eto eto ahụ sikwara ike. (Eklisiastis 9:11) Oleezi otú ị ga-esi jiri ndụ dị oké ọnụ ahịa nke ị dị ugbu a mee ihe? Mosis kpere ekpere, sị: “Si otú a mee ka anyị mara ịgụta ụbọchị anyị, ka anyị wee mee ka obi amamihe bịa.”—Abụ Ọma 90:12.
6 Gịnị ka ịgụta ụbọchị gị pụtara? Ọ pụtaghị na ị ga na-echegbubiga onwe gị ókè banyere ogologo oge ị pụrụ ịdịru ndụ. Mosis nọ na-ekpe ekpere ka Jehova kụziere ndị Ya ụzọ isi jiri ụbọchị ha ndị fọdụrụnụ mee ihe n’ụzọ na-ewetara Ya nsọpụrụ. Ị̀ na-agụta ụbọchị ndụ gị—na-ele ụbọchị nke ọ bụla anya dị ka ohere dị oké ọnụ ahịa iji mee ihe iwetara Chineke otuto? Bible na-enye ndị na-eto eto agbamume a: “Wezụga mkpasu iwe n’obi gị, meekwa ka ihe ọjọọ si n’anụ ahụ gị gabiga: n’ihi na okorobịa na mgbe dimkpa bụ ihe efu. Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.” (Eklisiastis 11:10–12:1) Icheta Onye Okike anyị pụtara ihe karịrị nanị ịghara ichefu na ọ dị adị. Mgbe onye omekome ahụ rịọrọ Jisọs, sị, “Cheta m mgbe ọ bụla Ị ga-abịa n’alaeze Gị,” ọ chọrọ ka Jisọs mee ihe karịrị icheta aha ya. Ọ chọrọ ka Jisọs mee ihe, ka ọ kpọlite ya n’ọnwụ! (Luk 23:42; tụlee Jenesis 40:14, 23; Job 14:13.) N’otú aka ahụ, icheta Jehova na-agụnye ime ihe, ime ihe na-atọ ya ụtọ. À pụrụ ikwu na ị na-echeta Jehova?
Zere Ikwoso Ndị Na-eme Ihe Ọjọọ Ekworo
7. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị ntorobịa ji ahọrọ ichefu Onye Okike ha? Nye ihe atụ.
7 Ọtụtụ ndị na-eto eto na-ahọrọ ichefu Jehova n’ihi na ha na-eche na ịbụ Onyeàmà na-eke mmadụ agbụ nke ukwuu. Otu nwanna nwoke nọ na Spain na-echeta mmetụta o nwere mgbe ọ nọ n’afọ iri na ụma: “A dọtara m n’ebe ụwa dị n’ihi na eziokwu ahụ yiri ihe tara akpụ na ihe siri ike. Ọ pụtara ịnọdụ ala, ịmụ ihe, ịga nzukọ, ịkpọ taị, ihe ndị ahụ abụghịkwa ihe ndị m na-enwe mmasị ime.” Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na ihe na-efunahụ gị n’ihi na ị na-ejere Chineke ozi? Ikekwe ọ ga-eju gị anya ịmara na otu onye so dee Bible nwere mmetụta ndị dị otú ahụ. Biko sapee Bible gị ma gụọ Abụ Ọma nke 73.
8. N’ihi gịnị ka Esaf ji ‘kwosoo ndị na-anya isi ekworo’?
8 Ka anyị nyochaa abụ ọma a n’ụzọ zutụrụ ezu. Amaokwu nke 2 na 3 na-asị: “Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m abụọ wezụga onwe ha; nzọụkwụ m fọdụrụ nke nta ka ha gbụchapụ. N’ihi na ekwosoro m ndị na-anya isi ekworo, ọ bụ udo nke ndị na-emebi iwu ka m na-ahụ.” Dị ka ihe e dekwasịrị n’elu ya si kwuo, ọ bụ Esaf dere abụ ọma a. Ọ bụ onye Livaị na-eti egwú na onye dịrị ndụ n’oge Eze Devid. (1 Ihe E Mere 25:1, 2; 2 Ihe E Mere 29:30) Ọ bụ ezie na o nwere ọmarịcha ihe ùgwù nke ije ozi n’ụlọ nsọ Chineke, o ‘kwosoro’ ndị nyara isi banyere mmebi iwu ha ekworo. Ihe yiri ka ọ̀ na-agara ha nke ọma; o yiri nnoọ ka hà nọ n’udo na nchebe. N’ezie, ihe ịga nke ọma o yiri ka hà na-enwe ‘gabigara ntụgharị nile nke obi ha.’ (Amaokwu nke 5, 7) Ha na-ekwu banyere ihe ndị ha mere “[n’ụzọ] dị elu,” ya bụ, n’ụzọ mpako. (Amaokwu nke 8) ‘Ha na-edo ọnụ ha n’eluigwe, ire ha na-ejegharịkwa n’ụwa,’ n’egosighị nkwanye ùgwù n’ebe onye ọ bụla nọ—ma n’eluigwe ma n’elu ụwa.—Amaokwu nke 9.
9. Olee otú ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst taa pụrụ isi na-enwe mmetụta yiri nke Esaf?
9 Ikekwe a pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere ndị ọgbọ gị n’ụlọ akwụkwọ. Ị pụrụ ịnụ ka ha na-anya isi n’ụzọ ihere na-adịghị na ya banyere mmekọahụ ndị ha na-enwe, nnọkọ oriri ha ndị a na-achịkwaghị achịkwa, na mmikpu ha na-emikpu n’ịṅụ mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ọjọọ. Mgbe i ji ndụ ha nke a na-asị na ọ bụ ndụ obi ụtọ tụnyere ụzọ dị warara nke ị na-aghaghị ije ije na ya dị ka onye Kraịst, ị pụrụ mgbe ụfọdụ ‘ikwoso ndị ahụ na-anya isi ekworo.’ (Matiu 7:13, 14) Esaf n’onwe ya ruru n’ọnọdụ nke ikwu, sị: “Ọ bụ nanị n’efu ka m meworo ka obi m dị ọcha, n’efu ka m kwọworo ọbọ aka m abụọ n’emeghị ihe ọjọọ; bụrụkwa onye a na-eti ihe ogologo ụbọchị nile.” (Amaokwu 13, 14) Ee, ọ malitere inwe obi abụọ banyere uru dị n’ijere Chineke ozi na ibi ndụ ziri ezi.
10, 11. (a) Gịnị mere ka Esaf gbanwee àgwà ya? (b) Olee otú ndị na-emebi iwu si nọrọ “n’ebe nile na-alọ alọ”? Nye ihe atụ.
10 Ihe ọma mere na Esaf anọgideghị n’ọnọdụ obi nkoropụ a ruo ogologo oge. Ọ bịara ghọta ngwa ngwa na ihe ahụ yiri udo nke ndị na-emebi iwu na-enwe bụ nanị ihe nghọgbu—nke na-adịrukwa nanị nwa oge! O kwuru, sị: “N’ezie ọ bụ n’ebe nile na-alọ alọ ka Ị na-edo ha: I mewo ka ha daruo ntikpọ. Hà siri aṅaa ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu n’otu ntabi anya? Ha agwụwo gwụsịa site n’ihe egwu dị iche iche.” (Amaokwu nke 18, 19) N’otu aka ahụ, ọtụtụ n’ime ndị ọgbọ gị nọ “n’ebe nile na-alọ alọ.” Ka oge na-aga, àgwà asọpụrụghị Chineke ha ga-achọpụta ha, ikekwe na-akpata ịtụrụ ime ọkwà, ọrịa a na-ebute site ná mmekọahụ, ọbụna ịtụ mkpọrọ ma ọ bụ ọnwụ! Nke kakwa njọ, ha ga-abụ ndị e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ.—Jemes 4:4.
11 Otu Onyeàmà na-eto eto nọ na Spain nwere ahụmahụ nke eziokwu a. Dị ka onye ntorobịa, o biri ụdị ndụ abụọ, na-eso ìgwè ndị ntorobịa na-adịghị asọpụrụ Chineke na-akpachi nnọọ anya. Ka oge n’aga, ya na otu n’ime ha—onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ—hụwara onwe ha n’anya. Ọ bụ ezie na o zeere iji ọgwụ ọjọọ mee ihe, ọ na-azụtara nwoke ahụ ọgwụ ọjọọ. “Ọbụna ana m enyere ya aka etinye ntụtụ ya,” ka ọ na-ekweta. Ihe ọma mere na e mere ka anya doo nwanna nwanyị a, e weghachikwara ya n’ahụ ike ime mmụọ. Ma lee ka o si wụọ ya akpata oyi ịmata mgbe oge ụfọdụ gasịrị na ọrịa AIDS egbuola enyi ya nwoke ahụ na-eji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ee, dị nnọọ ka ọbụ abụ ahụ kwuru, ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke nọ “n’ebe nile na-alọ alọ.” Ụfọdụ pụrụ ịnwụ na mberede n’ihi ụzọ ndụ ha rụrụ arụ. N’ebe ndị fọdụrụnụ nọ, ọ gwụla ma hà gbanwere ụzọ ha, n’ọdịnihu dị nso ha ga-ahụ “mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, Ya na ndị mmụọ ozi nke ike Ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8.
12. Olee otú onye ntorobịa nọ na Japan si bịa hụ nzuzu dị n’ikwoso ndị na-emebi iwu ekworo?
12 Mgbe ahụ, lee ihe nzuzu ọ bụ ikwoso “ndị na-amataghị Chineke” ekworo! N’ezie, ọ bụ ndị ahụ maara Jehova ma nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi bụ ndị a ga-eṅomi eṅomi. Otu nwanna nwoke na-eto eto nọ na Japan ghọtara nke ahụ. Dị ka onye ntorobịa, ya onwe ya “chọkwuru nnwere onwe.” Ọ na-akọwa, sị: “Echere m na ihe na-efunahụ m. Mgbe ahụ aghọtara m ihe ndụ m ga-adị ka ya ma e wezụga eziokwu ahụ. Apụrụ m ịhụ onwe m ka m dịruru afọ 70 ma ọ bụ 80 ma nwụọ. Ma Jehova na-enye olileanya nke ndụ ebighị ebi! Ịghọta nke a nyeere m aka iji ihe m nwere n’ezie kpọrọ ihe.” Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ dịghị mfe ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe ndị na-adịghị agbaso iwu Chineke gbara gị gburugburu. Olee ihe ụfọdụ ị pụrụ ime iji guzogide nrụgide ndị ahụ?
Kpachara Anya ná Mkpakọrịta Gị!
13, 14. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ime nhọrọ mgbe a bịara ná ndị anyị na ha na-akpakọrịta?
13 Ka anyị leba anya ọzọ ná nkọwa nke onye ihe na-agara nke ọma, bụ́ nke e dekọrọ n’Abụ Ọma 1:1-3: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu, nke na-eguzoghịkwa n’ụzọ ndị mmehie, nke na-anọghịkwa n’ọnọdụ ndị na-akwa emo. Kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ [na-agụ n’olu dị ala, NW] ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.”
14 Rịbagodị ama na ndị gị na ha na-akpakọrịta na-ekere òkè dị ukwuu. Ilu 13:20 na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” Nke a adịghị apụta imeso ndị ntorobịa na-abụghị Ndịàmà Jehova ihe n’ụzọ enweghị mmasị, enweghị omume enyi, ma ọ bụ n’ụzọ mkparị. Bible na-agba anyị ume ka anyị hụ ndị agbata obi anyị n’anya nakwa ka anyị na ‘mmadụ nile na-adị n’udo.’ (Ndị Rom 12:18; Matiu 22:39) Otú ọ dị, ị pụrụ ịhụta onwe gị dị ka onye ‘na-eje ije na ndụmọdụ’ nke ndị na-adịghị agbaso ụkpụrụ Bible ma ọ bụrụ na ị na-eso ha akpakọchi nnọọ anya.
Uru Ndị Dị n’Ọgụgụ Bible
15. Olee otú ndị na-eto eto pụrụ isi zụlite agụụ maka ọgụgụ Bible?
15 Ọbụ abụ ahụ kwukwara na ihe ụtọ nke onye ahụ ihe na-agara nke ọma dị n’ịgụ iwu Chineke “n’olu dị ala ehihie na abalị.” (Abụ Ọma 1:1, 2) N’eziokwu, Bible adịghị mfe ọgụgụ, “ihe ụfọdụ nke dị ike ịghọta,” dịkwa n’ime ya. (2 Pita 3:16) Ma ọgụgụ Bible ekwesịghị ịbụ ihe na-agwụ ike. Ọ pụrụ ikwe mee ‘agụụ mmiri ara nke Okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, ịgụsi gị ike.’ (1 Pita 2:2) Gbalịa ịdị na-agụ ya nnọọ obere obere kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na e nwere isi ihe ndị ị na-aghọtaghị, mee nnyocha. Mgbe e mesịrị, chebara ihe ị gụrụ echiche. (Abụ Ọma 77:11, 12) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike itinye uche gị n’ihe ị na-agụ, gbalịa ịgụpụta ya agụpụta “n’olu dị ala.” Ka oge na-aga, mmasị gị n’ọgụgụ Bible ga-amụbarịrị. Otu nwanna nwanyị na-eto eto nọ na Brazil na-echeta, sị: “Ọ na-eyikarị m ka Jehova ọ̀ nọ n’ebe dị anya. Ma ruo ọnwa ole na ole ugbu a, anọwo m na-eme ka ọmụmụ ihe onwe onye na ọgụgụ Bible m ka mma. Ugbu a ana m enwe mmetụta na mmekọrịta mụ na Jehova esiela ike karị. Ọ dị adị n’ezie nye m karị.”
16. Ànyị pụrụ isi aṅaa ritekwuo uru ná nzukọ ọgbakọ?
16 Ịga nzukọ ọgbakọ dịkwa mkpa nye uto ime mmụọ gị. Ọ bụrụ na i ‘lezie anya otú i si anụ,’ ị pụrụ inweta agbamume dị ukwuu. (Luk 8:18) Ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na nzukọ adịghị adịcha ụtọ? Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka m na-eme iji mee ka nzukọ bụrụ nke na-atọ ụtọ? Àna m ege ntị? Àna m eme nkwadebe? Àna m aza ajụjụ?’ E kwuwerị, Bible na-agwa anyị ka anyị “na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; . . . na-adụsi ndị ọzọ ọdụ ike.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Iji mee nke a ị ghaghị ikere òkè! N’ezie, iji kere òkè, ị ghaghị ịmụ ihe tupu oge eruo. Otu nwanna nwanyị na-eto eto na-ekweta, sị: “N’ezie ọ na-aka adị mfe ikere òkè ná nzukọ mgbe i mere nkwadebe.”
Ịgbaso Ụzọ Chineke Na-eduga n’Ihe Ịga nke Ọma
17. Olee otú onye na-agụchi Bible anya si yie “osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri”?
17 Ọbụ abụ ahụ kọwakwuru nwoke ahụ ihe na-agara nke ọma dị ka “osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara na mmiri.” Iyi jupụtara na mmiri pụrụ izowo aka n’ọwa mmiri ndị e ji mee ihe n’ịgba osisi ndị dị n’ubi mkpụrụ osisi mmiri. (Aịsaịa 44:4) Ịgụ Bible kwa ụbọchị dị nnọọ ka ịbụ onye e jikọtara ya na isi iyi na-adịghị ata ata dị otú ahụ nke na-akwado ndụ ma na-enye ume ọhụrụ. (Jeremaịa 17:8) Ị ga na-enweta ume dị gị mkpa kwa ụbọchị iji nagide ọnwụnwa na ihe isi ike. N’ịbụ onye mụtaworo echiche Jehova, ị ga-enweta amamihe dị gị mkpa iji mee mkpebi ndị amamihe dị na ha.
18. Gịnị pụrụ ime ka ihe ịga nke ọma nke onye na-eto eto n’ijere Jehova ozi bụrụ ihe e ji n’aka?
18 Mgbe ụfọdụ, ijere Jehova ozi pụrụ iyi ihe tara akpụ. Ma echela ma ọlị na ọ bụ ihe tara oké akpụ n’omume. (Deuterọnọmi 30:11) Bible na-ekwe gị nkwa na ‘ihe ọ bụla ị na-eme ga-aga nke ọma’ n’ikpeazụ ma ọ bụrụhaala na ebumnobi gị bụ́ isi bụ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ na ime ka obi ya ṅụrịa! (Ilu 27:11) Chetakwa na ị nọghị nanị gị. I nwere nkwado Jehova na nke Jisọs Kraịst. (Matiu 28:20; Ndị Hibru 13:5) Ha maara nrụgide ndị ị na-eche ihu, ha agaghịkwa agbahapụ gị. (Abụ Ọma 55:22) I nwekwara nkwado nke “òtù ndị bụ́ ụmụnna” na ndị mụrụ gị ma ọ bụrụ na ha na-atụ egwu Chineke. (1 Pita 2:17) N’inwe nkwado dị otú ahụ, tinyere mkpebisi ike na mgbalị gị, ị pụrụ ịnụ ụtọ ndụ na-aga nke ọma ọ bụghị nanị ugbu a kamakwa ruo mgbe ebighị ebi!
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ Gịnị bụ ezi ihe ịga nke ọma?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị anyị mkpa ka Jehova mee ka nzọụkwụ anyị guzosie ike?
◻ Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi ‘gụta ụbọchị ha’?
◻ N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe nzuzu ikwoso ndị na-emebi iwu ekworo?
◻ Olee otú ọgụgụ Bible kwa ụbọchị na ịgachi nzukọ anya pụrụ isi nyere ndị ntorobịa aka ịnụ ụtọ ndụ na-aga nke ọma?
[Foto dị na peeji nke 20]
N’ihi na ha enweghị ezi “oké egwu Chineke,” ọtụtụ ndị ntorobịa na-etinye aka n’akparamàgwà na-akpata mbibi
[Foto dị na peeji nke 22]
Ndị ntorobịa na-echefukarị na e nwere ihe ndị ga-esi n’omume ha pụta
[Foto dị na peeji nke 23]
Zụlite mmasị n’ọgụgụ Bible
[Foto dị na peeji nke 23]
Ị ga-aka erite uru ná nzukọ ma ọ bụrụ na i kere òkè