Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 10 p. 108-116
  • Ị̀ Dị Njikere Iche Eziokwu Ihu ná Ndụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Dị Njikere Iche Eziokwu Ihu ná Ndụ Gị?
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mkpa maka Ndụmọdụ na Ịdọ Aka ná Ntị
  • ‘Na-agwarịtanụ Ibe Unu Eziokwu’
  • Chineke Na-elekọta Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu
  • Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ihe Niile
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Eziokwu Ọ̀ Ka Dị Mkpa?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 10 p. 108-116

Isi 10

Ị̀ Dị Njikere Iche Eziokwu Ihu ná Ndụ Gị?

1, 2. (a) Olee otú eziokwu pụrụ isi bara anyị uru? (b) Gịnị ka i kwere bụ n’ezie isi iyi ebe ezi udo na ntụkwasị obi ga-esi bịa?

ỊMATA eziokwu pụrụ ịbụ ihe dị oké ọnụ ahịa. E jiri ya mee ihe n’ụzọ amamihe, ọ pụrụ ichebe gị pụọ ná mmerụ ahụ ma ọ bụ mfu ihe, kpatakwara gị obi ụtọ na ịnọ ná ntụkwasị obi. Otú ahụ ka ọ dị karịsịa n’ihe banyere eziokwu nke metụtara ihe dị n’ihu maka ọgbọ a.

2 Site n’ihe e dere n’akwụkwọ a, ị pụrụ ikweta na mmadụ apụghị iweta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ị pụrụ ịghọta na ihe Bible na-ekwu bụ eziokwu—na nanị Chineke, site n’Alaeze ya, pụrụ igbo mkpa ndị chere ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Mgbe ahụ ọ̀ gaghị abụ ihe amamihe dị na ya idozi ụzọ ndụ gị ikwekọ n’ihe ị maara ugbu a na ọ bụ eziokwu? (Jemes 1:22) Gịnị ka nke a gụnyere?

3. Olee otú mgbanwe ndị ahụ mmadụ na-aghaghị ime ná ndụ ya ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ibi ndụ n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke si dị mkpa?

3 Bible na-eguzobe ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ndị Chineke ga-anara dị ka akụkụ nke Usoro Ihe Ọhụrụ ya nke ezi omume ga-eru. Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a chọrọ ka e mee mgbanwe dị iche iche ugbu a ná ndụ onye ọ bụla chọrọ ịdị ndụ mgbe ahụ. N’eziokwu, site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọ bụghị ụzọ ndụ onye ọ bụla ugbu a ka a na-ele anya dị ka nke dị njọ. Otú o sina dị, mgbanwe gaa n’ụkpụrụ nke Bible gụnyere ụzọ ile ndụ anya dị ọhụrụ kpam kpam. Nke ahụ bụ ihe mere Ndị Rom 12:2 ji kwuo, sị: “Unu ekwela ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ́ ezi ihe nke dịkwa ya ezi ụtọ nke zukwara okè.”

4. Ọ bụrụ n’ezie na anyị ‘gaje ije ije n’ụzọ eziokwu,’ na gịnị ka anyị ga-adabere iji kpebie ihe ziri ezi na nke na-ezighị ezi?

4 Ụdị nnwogha ahụ ga-emetụta otú anyị si ekpebi ihe dị mma na ihe dị njọ. N’oge gara aga anyị pụrụ ịdaberewo n’echiche ndị ọzọ ma ọ bụ guzobe ụkpụrụ ndị nke onwe anyị. Ma ugbu a anyị na-aghọta na ọ bụ ụzọ ile ihe anya dị otú ahụ kpatara Adam na Iv ji jụ Chineke dị ka Onye Na-achị ha, nke kpatara oké ihe ọjọọ dị iche iche. Ya bụrụ na anyị chọrọ ihu ọma Chineke, anyị aghaghị ilekwasị ya anya maka ụkpụrụ ndị ziri ezi nke ezi ihe na ihe ọjọọ. Ụkpụrụ ndị ahụ dị nnọọ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Dị ka Abụ Ọma 119:151 na-asị: ‘Ihe nile o nyere n’iwu bụ eziokwu.’ N’ihi ya, ikwekọ na ha pụtara ‘ije ije n’ụzọ nke eziokwu.’ (Abụ Ọma 86:11) Nke a ọ̀ bụghị ihe ị chọrọ ime?

Mkpa maka Ndụmọdụ na Ịdọ Aka ná Ntị

5. (a) Ọ bụrụ na anyị ga-eme mgbanwe ná ndụ anyị, eziokwu dị aṅaa banyere onwe anyị ka anyị na-aghaghị ịdị njikere iche ihu? (b) Gịnị na-egbochikarị mmadụ ikweta ihe ọ na-emezighị, gịnị na-esikwa na ya apụta?

5 Ọ bụrụ na mmadụ gaje ime mgbanwe ná ndụ ya, ọ ghaghị ịhụta na e nwere mkpa maka nke a. “Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie,” ka Bible na-ekwu. (1 Ndị Eze 8:46) Ma ọtụtụ ndị adịghị njikere ikweta mmejọ ha. N’ihi gịnị? Nganga ji ha aka. Kama ha iweda onwe ha ala kwere mmejọ ha, ha na-atakarị ndị ọzọ ụta. Nke a na-eme nanị ka nsogbu ahụ kawanye njọ.

6. Ebee ka anyị ga-ele anya inweta ịdọ aka ná ntị, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Nsogbu ọzọ dị ukwuu n’otu aka ahụ bụ na anyị ezughị okè, anyị adịghịkwa amatakarị ụzọ ziri ezi ịgbaso. A pụrụ ọbụna ịghọgbu anyị iche na otu ụzọ mmerụ ahụ ziri nnọọ ezi. (Ilu 16:25) Ya mere anyị chọrọ ịdọ aka ná ntị site n’ebe ka mmadụ elu ma ọ bụrụ na anyị ga-anọgide na-eme ihe n’ụzọ ga-abara anyị uru karị, bakwaara ndị mmadụ ibe anyị. Ilu 3:11 kọwara Isi Iyi ahụ, sị: “Nwa m, ajụla ịdọ aka ná ntị nke Jehova.”

7. (a) Ịdọ aka ná ntị site n’aka Jehova si aṅaa erute anyị? (b) Ịnakwere na iji ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ mee ihe na-egosi gịnị banyere anyị?

7 Olee otú Jehova si enye ịdọ aka ná ntị? Site n’Okwu ya, bụ́ Bible Nsọ. Ya mere mgbe anyị na-agụ Bible ma ọ bụ onye kwere ekwe ibe anyị adọrọ uche anyị gaa ná ndụmọdụ ya, ma mụtakwa na n’otu ụzọ anyị adịghị eru n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ya, anyị na-enweta ịdọ aka ná ntị Chineke. Site n’ịnakwere ịdọ aka ná ntị ahụ dị ka ihe ziri ezi ma na-emekwa ihe banyere ya, anyị na-egosi na anyị na-eche eziokwu ihu. Anyị na-anakwere izi ezi Chineke inye anyị nduzi nakwa na-egosi na anyị bụ ụdị mmadụ ndị ọ chọrọ n’Usoro Ihe Ọhụrụ ya. Ee, ndụ anyị dabeere n’ịnara ịdọ aka ná ntị Chineke!—Ilu 4:13.

8. (a) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-emerụ onwe anyị ahụ n’ezie ma ọ bụrụ na anyị na-eme dị ka a ga-asị na anyị nakweere ịdọ aka ná ntị mgbe anyị na-agbanweghị ụzọ anyị n’ezie? (b) Gịnị mere o ji bụrụ ihe nkasi obi ịmara na Jehova na-ahụ anyị n’ebe ọ bụla anyị nọ?

8 N’ezie ọ bụrụ na anyị gaje irite uru site n’ịdọ aka ná ntị Chineke, anyị aghaghị ịdị na-eme ihe n’eziokwu. Ọ gaghị abara anyị uru ọ bụla ime dị ka ezi mmadụ mgbe ndị ọzọ na-ele anyị anya, nanị ịlaghachi n’ụzọ mbụ anyị mgbe ha na-adịghị ele anyị anya. Anyị ime dị ka ndị ihu abụọ ga-eme ka akọ na uche anyị bụrụ nke gbara itiri. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ pụrụ iji mmasị na-ele anyị anya, anyị apụghị ịghọgbu Onye Okike ahụ. Ilu 15:3 na-agwa anyị, sị: “N’ebe nile ọ bụla ka anya abụọ nke Jehova dị, na-eche ndị ọjọọ na ndị bụ ezi mmadụ nche.” Ịmata na Jehova Chineke na-ele anya ga-egbochi anyị ime ihe ọjọọ. N’otu mgbe ahụ, anyị pụrụ inweta agbamume n’ijide n’aka na ọ na-ele ‘ndị ezi omume’ anya ọma.

‘Na-agwarịtanụ Ibe Unu Eziokwu’

9. (a) Mgbe a bịara n’ikwu eziokwu, gịnị ka a na-anabata n’ụwa dị ka ezi ihe? N’ihi gịnị? (b) Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ agajeghị ikwe ka ‘e mee ka o yie oge a,’ mgbanwe dị aṅaa dị mkpa?

9 Ọ bụ ezie na ha adịghị azọrọ na ha na-esochi Bible anya, ọtụtụ mmadụ taa adịghị ele onwe ha anya dị ka ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu. Ma ole ka ha dị bụ́ ndị na-anọgide na-ekwu eziokwu? Ọtụtụ mmadụ na-ekpuchikarị eziokwu ma ọ bụ kwuo nanị ihe ha kwetara ga-abara ha uru. Ọ bụ ezie na a gụrụ nke a dị ka ihe dị mma n’ụwa, nke a emeghị ya ka o zie ezi. Ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ nke e wezugara n’ebe Chineke nọ “na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” “Ajọ onye” ahụ, bụ́ Setan Ekwensu bụ ‘nna ụgha.’ Ọ bụ ya malitere ịgha ụgha. (1 Jọn 5:19; Jọn 8:44) Ya mere, ọ gaghị abụ ihe ijuanya nye mmadụ ịchọpụta na ọ dị ya mkpa ime oké mgbanwe n’ihe banyere ikwu eziokwu ma ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe ka ‘e mee ka o yie ajọ oge a.’

10. Ngazu dị njọ nke emeghị ihe n’eziokwu si aṅaa arụ ọrụ megide ezi udo na ntụkwasị obi?

10 E nwere ezi ihe mere a ga-eji na-eme ihe n’eziokwu. O nweghị ihe na-egbochi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi karịa adịghị eme ihe n’eziokwu mgbe nile—n’ebe obibi, n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’azụmahịa, ná ntụrụ ndụ, na ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya. Mgbe ndị mmadụ na-edebeghị okwu ha, mgbe ha duhiere ma ọ bụ ghọgbuo ndị ọzọ, o nweghị onye na-erite uru. Ndị e mesoro ihe n’ụzọ aghụghọ na-enwekarị obi ilu na iwe. E wezuga nrụgide nile nke uche na ụbụrụ, emeghị ihe n’eziokwu pụrụ ịkpata mmerụ ahụ na ọbụna ọnwụ. Dị ka ihe atụ, ịrụ ọrụ ọjọọ, ihe ọrụ na-adịghị mma na nzọrọ aghụghọ esowo kpata ajọ ihe ọghọm dị iche iche. Onye ahụ nke na-eche na ya na-erite uru site n’emeghị ihe n’eziokwu, na-atụfu ihe site n’emeghị ihe n’eziokwu nke ndị ọzọ. Ya onwe ya kwa na-akwụ ụgwọ dị elu maka ngwongwo na ozi e jeere ya n’ihi na ndị e were n’ọrụ na ndị na-azụrụ ihe na-ezu ohi. Ya mere, emeghị ihe n’eziokwu si otú a na-eme ka omume ọjọọ nọgide na-adị. Mgbe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-erigbu ndị ọzọ, obi mgbawa, ime ihe ike, mmerụ ahụ, na ọbụna ọnwụ na-amụba.

11. Olee otú Jehova si ele emeghị ihe n’eziokwu na ịgha ụgha anya?

11 N’ihi ụdị mkpụrụ ọjọọ a, ọ bụghị ihe ijuanya na tinyere ihe ndị “Jehova kpọrọ asị,” e nwere okwu ụgha, ịgba àmà ụgha, nkume ísì ihe aghụghọ na ihe ósìsì aghụghọ. (Ilu 6:16-19; 20:23) Ndị ụgha maara ahụ agaghị eketa òkè ọ bụla n’ime ngọzi nile nke Jehova kwadoro maka ndị hụrụ ya n’anya. (Mkpughe 21:8) Nke a ọ̀ bụghị ihe anyị ga-atụ anya ya n’aka Chineke nke ezi omume? Ọ bụrụ na Chineke ga-anọgide na-anagide ndị na-achọ iji aghụghọ na-erigbu ndị agbata obi ha, olee otú onye ọ bụla ga-esi nọrọ ná ntụkwasị obi n’Usoro Ihe Ọhụrụ Ya?

12, 13. (a) Gịnị ka Bible n’onwe ya na-ekwu banyere ikwu eziokwu? (b) Olee otú ime ihe n’eziokwu si metụta ma ànyị ga-ejere Jehova ozi dị ka ndịàmà ya?

12 Ya mere, a gaghị e ji Bible gwuo egwu mgbe o nyere iwu, sị: “Kwuonụ, onye ọ bụla ọ gwa ibe ya, eziokwu.” (Zekaraịa 8:16; Ndị Efesọs 4:25) Banyere nkwa na nkwekọrịta dị iche iche, ka “Ee” anyị bụrụ Ee, ka “Ee e” anyị bụrụkwa Ee e. (Jemes 5:12) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọchite anya “Jehova, Chineke nke eziokwu,” anyị aghaghị ịnọgide na-ekwu eziokwu. (Abụ Ọma 31:5) Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ekwu eziokwu, ọ pụghị inweta nsọpụrụ Chineke ma ọ bụ nke ndị mmadụ ibe ya. Ọ pụghịkwa ịnọchite anya Chineke dị ka otu n’ime ndịàmà Ya. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ma ndị na-emebi iwu ka Chineke gwara okwu, sị, Olee ọrụ gị dị ya n’ịkọ ụkpụrụ m nile? Olee ọrụ gị dịkwa ya na i buruwo ọgbụgba ndụ m n’ọnụ gị? Ị rarawo ọnụ gị nye n’ikwu ihe ọjọọ, ire gị na-ejikọtakwa aghụghọ.”—Abụ Ọma 50:16, 19.

13 Ma ụfọdụ pụrụ ịjụ, sị: Mmadụ ọ̀ pụrụ ịdị na-ekwu eziokwu, na-akwụba aka ya ọtọ ma nọgide na-ebi ndụ n’ime ụwa nke a? Ọ̀ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’azụmahịa ma ọ bụrụ na o meghị ihe onye ọ bụla ọzọ na-eme?

Chineke Na-elekọta Ndị Na-eme Ihe n’Eziokwu

14. Bible si aṅaa enyere anyị aka ịghọta na ọ ga-ekwe mee mmadụ ibi ezi ndụ ma ghara ime ihe n’ụzọ akwụwaghị aka ọtọ?

14 Ikwu na mmadụ apụghị ịdị ndụ n’ekwughị okwu ụgha ga-abụ ikwu na Chineke adịghị elekọta ndị hụrụ ya n’anya. Ma nke a megidere ahụmahụ nke ndị ohu Chineke n’ọtụtụ puku afọ gara aga. (Ndị Hibru 13:5, 6) Ọbụ abụ ahụ bụ Devid kwuru, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:25) Nke a apụtaghị na ndị ezi omume adịghị enwe ihe isi ike ma ọ bụ banye n’ọnọdụ ọjọọ. Devid n’onwe ya abụrụwo onye a manyere ibi ndụ mgbe ụfọdụ dị ka osu n’ebe ọha mmadụ nọ. Ma o nwere ihe ndị dị mkpa ná ndụ.

15. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere mmasị Chineke nwere maka anyị inweta ihe onwunwe iji kwado ndụ?

15 Ihe ndọrọ mmasị nke ezi ofufe abụghị uru ihe onwunwe. Otú ọ dị, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya na o kwesịrị ekwesị ikpegara Chineke ekpere maka ngọzi ya ná mgbalị ha inweta “nri kwa ụbọchị.” (Luk 11:2, 3) N’ịmata mkpa ha maka ihe ndị dị mkpa ná ndụ, o mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike, sị: “Nna unu nke eluigwe na-amata na ihe ndị a nile dị unu mkpa.” Ma ọ gbara ha ume, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:25-34) Ì kwere nke ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, agaghị anwa gị ọnwụnwa ịjụ ụkpụrụ nile nke ezi omume Chineke nanị n’ihi na ndị ọzọ na-eme ya. Kama nke ahụ, ị ga-aghọta uru nke amamihe ahụ e dekọrọ na 1 Timoti 6:6-8, nke na-asị: “Ma nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa, bụ ụzọ irite uru nke ukwuu; n’ihi na anyị ewetaghị ihe ọ bụla n’ụwa, ọ bụkwa n’ihi na anyị apụghị iwere ihe ọ bụla pụọ n’ime ya; ma ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.”

16. Olee otú itinye ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ ndị a n’ọrụ pụrụ isi chebe anyị?

16 Ịgbaso ndụmọdụ nke a chọrọ ụzọ ile ihe anya nke dị nnọọ iche n’ihe a na-ahụkarị n’ụwa taa. Ya mere, nke a gụnyekwara ‘ime ka uche anyị dị ọhụrụ.’ Inwe afọ ojuju n’ihe ndị dị mkpa ná ndụ na-echebe anyị pụọ n’ime nchụso nke ego na ihe onwunwe ihe mbụ ná ndụ anyị na ịdaba n’ọnwụnwa irigbu ndị ọzọ iji nweta ihe ndị a. (Ilu 28:20; Matiu 6:24; 1 Timoti 6:9, 10) Ndị na-eme akụ ihe mgbaru ọsọ ha, pụrụ iche na ihe ndị a nọchitere anya ịnọ ná ntụkwasị obi na obi ụtọ. Ma kama nke ahụ ọ bụ dị ka Bible si kwuo, “onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.” (Eklisiastis 5:10) Ndị ahụ nwere ọtụtụ ihe karị na-achọ inwetakwu. Mgbe mgbe ha na-achụ ahụ ike ha na ndụ ezinụlọ ha n’àjà iji nweta ya. Kama inwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe, ha na-ebi ndụ nke ịtụ ụjọ ịtụfu ihe ha nwere.

17. (a) Mgbe mmadụ tinyere obi ya n’inweta akụ a na-ahụ anya, eziokwu dị aṅaa ka ọ na-eleghara anya? (b) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na ọ pụrụ ikwe mee itinye ụkpụrụ nile nke ime ihe n’eziokwu n’ịdị ndụ?

17 Onye na-achụso akụ adịghị eche eziokwu ahụ ihu, nke bụ na dị ka Jisọs kwuru, “ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Ọ kachasị mma itinye okwukwe n’ike Chineke nwere inye ndị ohu ya ihe ha chọrọ. N’ihe karịrị 200 ala n’etiti ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova, e nwere ihe àmà doro anya na Chineke na-eme ụdị ndokwa dị otú ahụ. N’okpuru ụdị ọchịchị ọ bụla na n’ụdị ọrụ ọ bụla nke iwu kwadoro, Ndịàmà site n’agbụrụ nile na ụzọ ndụ nile na-enwe ike ibi ndụ obi ụtọ, ha na-enwetazukwa ihe ndị dị ha mkpa. Okwukwe ha n’ike Chineke inye ha ihe ha chọrọ, ọbụna mgbe ịkwụwa aka ọtọ yiri ka ọ ga-eme ka ihe kara ha njọ, akwụghachiwo ha ụgwọ. Ha enwetawo nsọpụrụ ndị mmadụ ibe ha, ọtụtụ mgbe a na-ewerekarị ha n’ọrụ karị ndị ọzọ n’ihi na ndị mmadụ ka chọrọ iji ndị kwesịrị ịtụkwasị obi mee ihe. Ma ihe kachasị mkpa bụ na ndị ziri ezi na-enweta akọ na uche dị ọcha n’ihi ịkwụwa aka ha ọtọ.

18, 19. (a) N’ihi gịnị ka ndị a jiri gbanwee ndụ ha ikwekọ n’ụkpụrụ nile nke Chineke? (b) Ụdị mmadụ dị aṅaa ka Chineke na-achọ maka nchebe baa n’Usoro Ihe Ọhụrụ ya?

18 Tupu ha aghọọ Ndịàmà Jehova, ha ekwekọwo n’usoro omume nke ụwa n’ókè dị ukwuu ma ọ bụ nke dị nta. Ma ọmụmụ Bible na iji eziokwu ya na-eme ihe emewo ka ha hapụ omume ọjọọ nile. Ugbu a ha na-agbalịsi ike igosipụta “ezigbo ikwesị ntụkwasị obi nile; ka ha wee chọọ ozizi nke Onye Nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.” (Taịtọs 2:10) Ọ dịbeghịrị ha mfe mgbe nile iche eziokwu ihu ma na-emekwa mgbanwe n’ime ndụ ha. Ma ịhụnanya maka eziokwu enyeworo ha aka ime ihe kwekọrọ na ya.

19 Ì nwere otu ụdị ịhụnanya ahụ maka eziokwu? Ọ bụrụ na i nwere ya, ị bụ ụdị mmadụ Chineke na-achọ ichebe ndụ n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ ya. Iji bụrụ onye Chineke nakweere, ị ghaghị “ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:24) Nke a ga-aka gị akara dị ka onye dị iche pụọ n’ụwa nke gbara gị gburugburu. O nwekwara ụzọ ndị ọzọ ebe ị na-aghaghị ịdị iche pụọ n’ụwa ma ọ bụrụ na ị ga-eme ihe dị Chineke mma. Gịnị ka ihe ndị a bụ?

[Foto dị na peeji nke 113]

Mmadụ ọ̀ pụrụ ịnọgide na-ekwu eziokwu ma na-akwụwa aka ya ọtọ ma ka nweta akụ n’ime ụwa nke a?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya