-
Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube YaỤlọ Nche—1994 | Mach 15
-
-
15. Olee otú Devid si kwupụta ntụkwasị obi ya n’ebe nzube Jehova dị?
15 Ihe dị ka narị afọ isii mgbe Job nwụsịrị na ihe dị ka otu puku afọ tutu Jisọs abịa n’ụwa, Devid kwupụtara ntụkwasị obi ya n’ebe ụwa ọhụrụ dị. O kwuru n’abụ ọma ndị ahụ, sị: “Ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa. . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” N’ihi olileanya ya na-adịghị ada ada, Devid gbara ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi . . . Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”—Abụ Ọma 37:3, 4, 9-11, 29.
-
-
Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube YaỤlọ Nche—1994 | Mach 15
-
-
22. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka anyị tụkwasị Jehova obi?
22 N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-ahụ mmezu nke Ndị Rom 8:21: “A ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” Ha ga-ahụ mmezu nke ekpere nke a nke Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Ya mere tinye ntụkwasị obi gị nile n’ebe Jehova nọ n’ihi na nkwa ya na-adịghị ada ada bụ: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
-