Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/15 p. 15-20
  • Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Gahiere?
  • Nzube Chineke Agbanwebeghị
  • Ha Tụkwasịrị Jehova Obi
  • Ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Tụkwasịrị Chineke Obi
  • Jehova Na-emezuru Ndị Na-ekwesị Ntụkwasị Obi Nkwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ònye Bụ Ebreham?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Jehova Kpọrọ Ya “Enyi M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/15 p. 15-20

Tụkwasị Jehova Obi na Ọ Ga-emezu Nzube Ya

“Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—⁠ABỤ ỌMA 37:29.

1. Gịnị bụ nzube Jehova maka ụmụ mmadụ na maka ụwa nke a?

MGBE Jehova kere nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv, o mere ka ha zuo okè. O kekwara ha ka ha nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ụwa ebe a​—⁠ma ọ bụrụ na ha erube isi n’iwu ya nile. (Jenesis 1:26, 27; 2:17) Ọzọkwa, Chineke tinyere ha na gburugburu ebe obibi nke paradaịs. (Jenesis 2:​8, 9) Jehova gwara ha, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Otú a, mgbe oge na-aga ụmụ ha ga-agbasa ruo ụwa nile, mbara ala nke a ga-abụkwa paradaịs nke jupụtara n’agbụrụ ụmụ mmadụ zuru okè, nwee obi ụtọ. Lee mmalite mara mma nke ezinụlọ mmadụ nwere! “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.”​—⁠Jenesis 1:31.

2. Ọnọdụ ihe omume ụmụ mmadụ na-akpalite ajụjụ dịgasị aṅaa?

2 Ma, ọnọdụ nke ihe omume ụmụ mmadụ nke dịworo ọtụtụ puku afọ enweghị myirịta ọ bụla ná nzube mbụ nke Chineke. Ihe a kpọrọ mmadụ ezughị okè ma ọlị, ha enweghịkwa obi ụtọ ọ bụla. Ọnọdụ ụwa abụwo nke ihe isi ike, dị ka e bukwara ya n’amụma, ha akawanyewo njọ n’ụzọ dị egwu n’oge anyị. (2 Timoti 3:​1-5, 13) Ya mere olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na nzube Chineke maka ụmụ mmadụ ga-emezu n’ọdịnihu dị nso? Oge dị ogologo karị ọ̀ ga-agafe ya na ọnọdụ ihe isi ike nke na-aga n’ihu?

Gịnị Gahiere?

3. Gịnị mere Jehova akwụsịghị nnupụisi ihe a kpọrọ mmadụ otu mgbe ahụ?

3 Ndị nwere ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ maara ihe mere Jehova jiworo kwere ka ọnọdụ ọjọọ ndị a dịgide n’elu ala. Ha matakwara ihe ọ gaje ime banyere ha. Site n’ihe ndekọ Bible, ha amụtawo na nne na nna anyị mbụ jirị onyinye dị ebube nke ime nhọrọ nke Chineke nyere ụmụ mmadụ mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Tụlee 1 Pita 2:16.) N’ụzọ na-ezighị ezi ha họọrọ inwere onwe ha pụọ n’ebe Chineke nọ. (Jenesis, isi 2 na 3) Nnupụisi ha welitere ajụjụ ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị nnọọ ukwuu, dị ka: Ọkaaka Eluigwe na Ala ò nwere ikike ịchị isi n’elu ụmụ mmadụ? Ịchịisi ya ọ̀ bụ nke ka mma nye ha? Ịchịisi ụmụ mmadụ ọ̀ pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’enweghị nlekọta nke Chineke? Ụzọ kasị mma isi chọta azịza nye ajụjụ ndị a bụ ichere ka ọtụtụ narị afọ nke ịchịisi ụmụ mmadụ gafee. Ihe si n’ime ya pụta ga⁠-⁠egosi n’ụzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha ma ụmụ mmadụ hà pụrụ inwe ihe ịga nke ọma ma e wezụga inyeaka nke Onye Mere ha.

4, 5. (a) Gịnị siworo ná ụmụ mmadụ ịjụ ịchịisi Chineke pụta? (b) Gịnị ka ngafe nke oge gosipụtaworo n’ụzọ ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya?

4 Mgbe Adam na Iv hapụrụ Chineke, ọ nọgideghị na-akwado ha n’izu okè. N’enwekwaghị nkwado ya, ọnọdụ ha malitere imebi. Ihe si n’ime ya pụta bụ ezughị okè, ịka nká, na n’ikpeazụ ọnwụ. Site n’iwu nke nketa, nne na nna anyị mbụ bufeere ụmụ ha nile, gụnyere anyị, mjimara ndị ahụ na-adịghị mma. (Ndị Rom 5:12) Gịnịkwa banyere ihe siworo n’ọtụtụ puku afọ nke ịchịisi ụmụ mmadụ pụta? Ọ bụrụwo oké ọdachi, dị nnọọ ka Eklisiastis 8:9 na-ekwu n’eziokwu: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”

5 Ngafe nke oge egosiwo n’ụzọ ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na ọ dịghị n’ikike ụmụ mmadụ iduzi ihe omume ha n’ụzọ ga-aga nke ọma n’enweghị inyeaka Onye Okike ha. Jeremaịa so dee Bible site n’ike mmụọ nsọ kwupụtara, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”​—⁠Jeremaịa 10:23; Deuterọnọmi 32:​4, 5; Eklisiastis 7:29.

Nzube Chineke Agbanwebeghị

6, 7. (a) Ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme ọ̀ gbanwewo nzube Jehova? (b) Gịnị ka nzube Jehova gụnyere?

6 Ngafe nke ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme nke ụmụ mmadụ​—⁠nke jupụtara n’ajọ omume na nhụjuanya⁠—​ọ̀ gbanwewo nzube Chineke? Okwu ya na-asị: “Otú a ka Jehova Nke keworo eluigwe sịrị; Ya onwe ya bụ Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya; Ya onwe ya mere ka o guzosie ike, ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya, ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” (Aịsaịa 45:18) Ya mere Chineke kpụrụ ụwa ka ụmụ mmadụ biri na ya, nke ahụ ka bụkwa nzube ya.

7 Ọ bụghị nanị na Jehova kere ụwa ka e biri n’ime ya kama ọ bụkwa nzube ya na ọ ga-aghọ paradaịs nke mmadụ ndị zuru okè, nwere obi ụtọ, ga-anụ ụtọ ya. Nke ahụ mere Bible ji buo amụma na a ga-enwe “ụwa ọhụrụ,” òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ, nke “ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Nakwa ná Mkpughe 21:4, Okwu Chineke na-agwa anyị na n’ime ụwa ọhụrụ ya, “ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya [ihe a kpọrọ mmadụ]; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” Ọ bụ n’ihi ihe ndị dị otú ahụ ka Jisọs pụrụ iji kwuo banyere ụwa ọhụrụ ahụ na-abịanụ n’elu ala dị ka “Paradaịs.”​—⁠Luk 23:43.

8. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova gaje imezu nzube ya?

8 Ebe ọ bụ na Jehova bụ Onye Okike kasị ike, kasịkwa nwee amamihe nke eluigwe na ala, ọ dịghị onye pụrụ imebi nzube ya. “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka M cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka M zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.” (Aịsaịa 14:24) Otú a, mgbe Chineke kwuru na ya gaje ime elu ala a paradaịs nke mmadụ ndị zuru okè bi n’ime ya, nke ahụ bụ ihe ga-eme. Jisọs kwuru, sị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” (Matiu 5:5; tụlee Abụ Ọma 37:29.) Anyị pụrụ iji mmezu nke nkwa ahụ n’aka. N’ezie, anyị pụrụ ịtọgbọ ndụ anyị maka ya.

Ha Tụkwasịrị Jehova Obi

9. Gịnị ka Abraham mere nke gosiri ntụkwasị obi ya n’ebe Jehova nọ?

9 Ọtụtụ mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke n’akụkọ ihe mere eme nile tọgbọrọ ndụ ha n’ihi nzube Chineke maka ụwa n’ihi na ha ji n’aka na ọ ga-emezu ya. Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ihe ọmụma ha nwere dị nta, ha tụkwasịrị Chineke obi ma wukwasị ndụ ha n’elu ime uche ya. Dị ka ihe atụ, e nwere Abraham, onye dịrị ndụ ihe dị ka 2,000 afọ tutu Jisọs abịa n’ụwa​—⁠ogologo oge tutu amalite ide Bible. Ọ tụkwasịrị Jehova obi imezu nkwa Ya nile. O yiri nnọọ ka Abraham ọ mụtara banyere Onye Okike ahụ site n’aka nna ya ochie kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Shem, onye Noa kụziiri ihe. Ya mere mgbe Chineke gwara Abraham ka ọ pụọ n’obodo ahụ nwere akụ̀ na ụba bụ́ Ua nke ndị Kaldea gaa n’ala nke ọ na-amaghị, nke dịkwa ize ndụ bụ́ Kenean, nna ochie ahụ maara na ya pụrụ ịtụkwasị Jehova obi, ya mere ọ pụrụ. (Ndị Hibru 11:8) Mgbe oge na-aga, Jehova gwara ya, sị: “M ga-emekwa ka ị ghọọ mba ukwu.”​—⁠Jenesis 12:2.

10, 11. N’ihi gịnị ka Abraham ji dị njikere ịchụ ọkpara ọ mụrụ nanị ya bụ́ Aịsak, n’àjà?

10 Gịnị mere mgbe a mụsịrị Aịsak nye Abraham? Jehova gosiri Abraham na ọ bụ site n’Aịsak ka ndị sitere n’eriri ya ga-amụba ịbụ mba ukwu. (Jenesis 21:12) Ya mere, ọ ghaghị iyiworị ihe na-emegiderịta ibe ya mgbe Jehova gwara Abraham, dị ka ule nke okwukwe ya, ka ọ chụọ nwa ya nwoke bụ́ Aịsak n’àjà. (Jenesis 22:2) Ma, site ná ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, Abraham mere ihe iji mezuo ihe a gwara ya, na-eweli mmà ya n’ezie igbu Aịsak. Kpọmkwem tupu o mee, Chineke zitere otu mmụọ ozi igbochi Abraham.​—⁠Jenesis 22:​9-⁠14.

11 Gịnị mere Abraham ji rube isi otú a? Ndị Hibru 11:​17-⁠19 na-ekpughe, sị: “Mgbe a na-anwa Abraham, ọ bụ okwukwe ka o ji chee Aịsak n’ihu Chineke dị ka àjà: ee, onye ahụ nke naararịị nkwa ahụ nke ọma na-eche nwa nwoke ọ mụrụ nanị ya n’ihu Chineke dị ka àjà: bụ́ onye e kwuru okwu banyere ya, sị, N’ime Aịsak ka a ga-akpọ mkpụrụ gị: ebe ọ na-agụ na Chineke pụrụ ime ka o si ọbụna ná ndị nwụrụ anwụ bilie; nke ọ naghachikwara ya site n’ebe ahụ n’ime ilu.” Ndị Rom 4:​20, 21 n’otu aka ahụ na-ekwu, sị: “O [Abraham] jighịkwa ekweghị ekwe nwee obi abụọ n’ebe nkwa Chineke dị, . . . na-ekwezukwa na ihe [Chineke] kwererịị ná nkwa, Ọ pụrụ imekwa.”

12. Olee otú e si nyeghachi Abraham ụgwọ ọrụ n’ihi okwukwe ya?

12 E nyeghachiri Abraham ụgwọ ọrụ n’ihi okwukwe ya ọ bụghị nanị site n’ịhapụ Aịsak ndụ na site n’inwe “mba ukwu” site na ya kamakwa n’ụzọ ọzọ. Chineke gwara Abraham, sị: “Ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jenesis 22:18) N’ụzọ dị aṅaa? Eze nke Alaeze eluigwe Chineke ga-abịa site n’eriri ọmụmụ Abraham. Alaeze ahụ ga-etipịa ụwa ọjọọ nke a dị n’okpuru Setan mee ka ọ pụọ n’anya. (Daniel 2:44; Ndị Rom 16:20; Mkpughe 19:​11-⁠21) Mgbe ahụ, n’ime ụwa e mere ka ọ dị ọcha n’okpuru ịchịisi Alaeze, a ga-agbasapụ Paradaịs ruo ụwa nile, sitekwa ná “mba nile” ụmụ mmadụ ndị na-eme uche Chineke ga-ama ụtọ nke ahụ ike zuru okè na ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (1 Jọn 2:​15-⁠17) Ọ bụkwa ezie na Abraham nwere nanị ihe ọmụma dị nta banyere Alaeze ahụ, ọ tụkwasịrị Chineke obi ma lepụ anya n’ọdịnihu maka nguzobe ya.​—⁠Ndị Hibru 11:10.

13, 14. N’ihi gịnị ka Job ji tụkwasị Chineke obi?

13 Ọtụtụ narị afọ n’ihu, e nwere Job, onye dịrị ndụ n’agbata narị afọ nke 17 na nke 16 T.O.A. n’ebe bụ Arabia ugbu a. Ọ dịkwara ndụ tutu a malite ide Bible. Job ‘bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezi, ọ na-atụkwa egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:1) Mgbe Setan ji ọrịa na-asọ oyi nke na-egbu mgbu tie Job ihe otiti, nwoke ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi “ekwughị otu mkpụrụ okwu mmehie” n’ogologo oge nile nke nhụsianya ya. (Job 2:10, The New English Bible) Job tụkwasịrị Chineke obi. Ọ bụkwa ezie na ọ mataghị ihe nile kpatara o ji na-ata oké ahụhụ otú a, ọ tọgbọrọ ndụ ya maka Chineke na nkwa Ya nile.

14 Job maara na ọ bụrụ na ya anwụọ, Chineke pụrụ iweghachi ya ná ndụ n’otu ụbọchị site ná mbilite n’ọnwụ. O gosipụtara olileanya nke a mgbe ọ gwara Jehova Chineke, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na I zobe m [n’ime Sheol, NW, (ili)⁠], . . . ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m! Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị.” (Job 14:​13-⁠15) Ọ bụ ezie na ọ nọ n’oké ihe mgbu, Job gosipụtara okwukwe ya n’ebe ọkaaka Jehova dị, na-asị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m.”​—⁠Job 27:5.

15. Olee otú Devid si kwupụta ntụkwasị obi ya n’ebe nzube Jehova dị?

15 Ihe dị ka narị afọ isii mgbe Job nwụsịrị na ihe dị ka otu puku afọ tutu Jisọs abịa n’ụwa, Devid kwupụtara ntụkwasị obi ya n’ebe ụwa ọhụrụ dị. O kwuru n’abụ ọma ndị ahụ, sị: “Ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa. . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ. Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” N’ihi olileanya ya na-adịghị ada ada, Devid gbara ume, sị: “Tụkwasị Jehova obi . . . Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”​—⁠Abụ Ọma 37:​3, 4, 9-11, 29.

16. Olileanya dị aṅaa ka ‘oké igwe ojii nke ndịàmà’ nwere?

16 Eri ọtụtụ narị afọ ndị na-agafenụ, ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi enwewo otu olileanya a nke ndụ ebighị ebi n’elu ala. N’ezie, ha mejupụtara ‘oké igwe ojii nke ndịàmà’ bụ́ ndị tọgbọrọ ndụ ha n’ụzọ nkịtị maka nkwa nile nke Jehova. N’ihi okwukwe ha, a tara ọtụtụ n’ime ndịàmà Jehova n’oge ochie ahụhụ ma gbuo ha, “ka ha wee nata mbilite n’ọnwụ ka mma.” N’ụzọ dị aṅaa? N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, Chineke ga-eji mbilite n’ọnwụ ka mma na olileanya nke ndụ ebighị ebi nyeghachi ha ụgwọ ọrụ.​—⁠Jọn 5:​28, 29; Ndị Hibru 11:35; 12:1.

Ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Tụkwasịrị Chineke Obi

17. Olee otú ntụkwasị obi ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere n’ebe Jehova nọ siruru n’ike?

17 Na narị afọ mbụ O.A., Jehova kpugheere ọgbakọ ndị Kraịst ahụ e guzobere ọhụrụ nkọwa ndị ọzọ banyere Alaeze ahụ na ịchịisi ya n’elu ala. Dị ka ihe atụ, mmụọ ya nyere Jọn onyeozi ike ide na ọnụ ọgụgụ ndị ga-esonyere Jisọs Kraịst n’Alaeze eluigwe ahụ ga-abụ 144,000. Ndị a ga-abụ ndị na-ejere Chineke ozi n’ikwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ.” (Mkpughe 7:4; 14:1-⁠4) Ha ga-achị isi n’elu ụwa “dị ka ndị eze” ha na Kraịst n’eluigwe. (Mkpughe 20:​4-⁠6) Ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ tụkwasịsiri Jehova obi ike na ọ ga-emezu nzube ya banyere Alaeze eluigwe ahụ na elu ụwa ọ ga-achị isi n’elu ya nke na ha dị njikere ịtọgbọ ndụ ha n’ihi okwukwe ha. Ọtụtụ n’ime ha mere nke ahụ kpọmkwem.

18. Olee otú Ndịàmà Jehova taa si eṅomi ndị ogbo ha nke oge dị anya gara aga?

18 Taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde Ndịàmà Jehova ise nwere otu ntụkwasị obi ahụ n’ebe Chineke nọ dị ka ndị ogbo ha dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ tupu ha. Ndịàmà ndị a nke oge a atọgbọwokwa ndụ ha n’ihi nkwa Chineke. Ha ararawo ndụ ha nye ya, nweekwa Bible zuru ezu iji wusie okwukwe ha ike. (2 Timoti 3:​14-⁠17) Ndịàmà Jehova ndị a nke oge a na-eṅomi ndị na-eso ụzọ Jisọs nke narị afọ mbụ ndị kwupụtara na ha aghaghị “ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Na narị afọ nke a a kpagbuwo ọtụtụ n’ime ndị Kraịst ndị a bụ́ Ndịàmà n’ụzọ dị ilu. Ọbụna na e gbuwo ụfọdụ n’ihi okwukwe ha. Ndị ọzọ anwụwo n’ihi ọrịa, ihe ọghọm, ma ọ bụ ịka nká. Otú ọ dị, dị ka ndịàmà kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ndị gara aga, ha tụkwasịrị Chineke obi n’ihi na ha matara na ọ ga-eweghachi ha ná ndụ n’ime ụwa ọhụrụ ya site ná mbilite n’ọnwụ.​—⁠Jọn 5:​28, 29; Ọrụ 24:15; Mkpughe 20:​12, 13.

19, 20. Gịnị ka anyị na-amata banyere amụma Bible maka ụbọchị anyị?

19 Ndịàmà Jehova ghọtara na ha ịbụ ndị a kpọpụtara site ná mba nile ịbụ otu òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ bụ nke e kwuru banyere ya ogologo oge dị anya n’amụma Bible. (Aịsaịa 2:​2-⁠4; Mkpughe 7:​4, 9-⁠17) Jehova jikwa ha na-arụ ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ iji chịkọta ndị ọzọ nwere obi eziokwu n’ime ihu ọma na nchebe ya. (Ilu 18:10; Matiu 24:14; Ndị Rom 10:13) Ndị a nile na-enwe ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, na-amata na n’oge na-adịghị anya ọ ga-ewebata ụwa ọhụrụ ya dị ebube.​—⁠Tụlee 1 Ndị Kọrint 15:58; Ndị Hibru 6:10.

20 Amụma dị iche iche nke Bible na-egosi na ụwa Setan anọworị na mgbe ikpeazụ ya ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 afọ ugbu a, kemgbe afọ ahụ dị ịrịba ama nke 1914. Ụwa a na-abịaru ọgwụgwụ ya. (Ndị Rom 16:20; 2 Ndị Kọrint 4:4; 2 Timoti 3:​1-⁠5) Ndịàmà Jehova na-enwe obi ike n’ihi na ha matara na n’oge na-adịghị anya Alaeze Chineke ga-eweghara nchịkwa zuru ezu n’ihe omume nile nke ụwa. Site n’iweta ụwa ọjọọ nke a ná njedebe na iwebata ụwa ọhụrụ ya nke ezi omume, Chineke ga-ehichapụ kpam kpam ọnọdụ ọjọọ dịworo n’elu ụwa ruo ọtụtụ narị afọ.​—⁠Ilu 2:​21, 22.

21. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ n’agbanyeghị nsogbu ndị dị ugbu a?

21 Mgbe ahụ, na mgbe ebighị ebi nile, Chineke ga-egosipụta oké nlekọta anya n’ebe anyị nọ site n’ịwụpụ ọtụtụ ngọzi bụ́ nke ga-abụ ihe nkwụghachi gafere nke ukwuu mmerụ ahụ ọ bụla nke anyị nataworo na mgbe gara aga. Ọtụtụ ihe ọma dị iche iche ga-emere anyị n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke na a gaghị echetakwa nsogbu ndị anyị nweworo ná mbụ. Lee ka o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na na mgbe ahụ Jehova ‘ga-asaghe aka ya werekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’​—⁠Abụ Ọma 145:16; Aịsaịa 65:​17, 18.

22. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka anyị tụkwasị Jehova obi?

22 N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-ahụ mmezu nke Ndị Rom 8:21: “A ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” Ha ga-ahụ mmezu nke ekpere nke a nke Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Ya mere tinye ntụkwasị obi gị nile n’ebe Jehova nọ n’ihi na nkwa ya na-adịghị ada ada bụ: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”​—⁠Abụ Ọma 37:29.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị bụ nzube Jehova maka ụmụ mmadụ na maka ụwa nke a?

◻ Gịnị mere Chineke ji kwere ka ọnọdụ ọjọọ dịrị n’elu ụwa?

◻ Olee otú ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie si gosi ntụkwasị obi ha n’ebe Jehova nọ?

◻ N’ihi gịnị ka ndị na-ejere Chineke ozi taa ji atụkwasị Jehova obi?

[Foto dị na peeji nke 16]

Chineke kere ụmụ mmadụ ịdị ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ n’elu ala paradaịs

[Foto dị na peeji nke 18]

Abraham tụkwasịrị obi ya n’ikike Jehova nwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya