N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Mezuo Nkwa Gị?
“TỤLIERENỤ nwoke ahụ kwere nkwa kasị nta aka; ọ ga-aka emezu nkwa ya,” ka Bernard Baruch kwuru, bụ́ onye ndụmọdụ nwụrụ anwụ nke president. N’ụwa taa o yiri ka a na-ekwe nkwa iji ghara imezu ya. Ọ pụrụ ịbụ nkwa ọlụlụ, nkwekọrịta achụmnta ego, ma ọ bụ nkwa iwepụtakwu oge isoro ụmụ gị nọkọọ. N’ebe nile, a na-eleghara ihe ilu ahụ a na-anụkarị bụ́, “Ekwu eme ka e ji ama dike,” pụtara anya.
N’ezie, ọtụtụ ndị adịghị mgbe ha na-ebu n’obi imezu nkwa ha. Ndị ọzọ na-eji ọsọ ekwe nkwa ndị ha na-agaghị emezuli ma ọ bụ ghara imezu ihe ha kwuru nanị n’ihi na nke a bụ ụzọ kasị dịrị ha mfe isi lafere.
N’eziokwu, imezu nkwa pụrụ ịta akpụ ma ọ bụrụ na e nwee ihe ndapụta. Ma nkwa a na-emezughị ọ̀ na-emebi ihe dị ukwuu n’ezie? Ì kwesịrị iji nkwa gị akpọrọ ihe? Ilebatụ anya n’ihe nlereanya Jehova Chineke ga-enyere anyị aka ịhụ ihe mere anyị kwesịrị iji lee okwu a anya dị ka nke siri ike.
Jehova Na-emezu Nkwa Ya
Anyị na-efe Chineke nke e jikọtara ọbụna aha ya na mmezu nke nkwa ya. N’oge Bible aha mmadụ na-akọwakarị ụdị onye ọ bụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa banyere aha ahụ bụ́ Jehova, nke pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Ghọọ.” N’ihi ya, aha Chineke na-agụnye echiche bụ́ na ọ ga-emezu nkwa ya na nzube ya nile.
N’ikwekọ n’aha ya, Jehova mezuru nkwa nile o kwere mba Israel oge ochie. Eze Solomọn kwetara banyere nkwa ndị a, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Jehova bụ, Onye nyeworo ndị Ya, bụ́ Israel, izu ike, dị ka ihe nile nke O kwuru si dị: ọ dịghị otu okwu dapụrụ n’okwu Ya nile dị mma, nke O kwuru n’aka Mosis, bụ́ ohu Ya.”—1 Ndị Eze 8:56.
Ọbụbụ Jehova bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi ruru n’ókè nke na Pọl onyeozi pụrụ ikwu, sị: “Mgbe Chineke kwere Abraham nkwa, ebe Ọ na-enweghị onye ọ bụla ka Ya ukwuu iji ṅụọ iyi, O ji Onwe ya ṅụọ iyi.” (Ndị Hibru 6:13) Ee, aha Jehova na ụdị onye ọ bụ kpọmkwem bụ ihe mmesi obi ike na ọ ghaghị imezu nkwa ya, ọ bụ ezie na ha pụrụ ifu ya ihe dị ukwuu. (Ndị Rom 8:32) Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova na-emezu nkwa ya na-enye anyị olileanya nke bụụrụ mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndụ anyị, arịlịka.—Ndị Hibru 6:19.
Nkwa Jehova na Ọdịnihu Anyị
Olileanya anyị, okwukwe anyị, na ndụ anyị kpọmkwem na-adaberecha ná mmezu nke nkwa Jehova. Olee olileanya anyị ji akpọrọ ihe? “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Akwụkwọ Nsọ na-enyekwa anyị ihe ndabere maka inwe okwukwe na “mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Anyị pụkwara ijide n’aka na e nwere ihe karịrị ndụ a anyị dị ugbu a. N’ezie, ihe Jọn onyeozi na-akpọ “nkwa ahụ” bụ “ndụ ebighị ebi.” (1 Jọn 2:25) Ma nkwa Jehova kwere n’Okwu ya abụghị nanị banyere ọdịnihu. Ha na-eme ka ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị ugbu a nwee nzube.
Ọbụ abụ ahụ bụrụ, sị: “Jehova dị nso ndị nile na-akpọku Ya, . . . ọ bụkwa ntiku ha ka Ọ ga-anụ.” (Abụ Ọma 145:18, 19) Chineke na-emesikwa anyị obi ike na “Ọ bụ Onye na-enye onye dara mbà ike; onye ike na-adịghị ka Ọ na-emekwa ka o nwee ume n’ụba.” (Aịsaịa 40:29) Leekwa ihe nkasị obi ọ bụ ịmara na ‘Chineke agaghị ekwe ka a nwaa anyị karịa nke anyị pụrụ ịnagide; kama n’oge ọnwụnwa ahụ Ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ’! (1 Ndị Kọrint 10:13) Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime nkwa ndị a emezuwo n’ebe anyị nọ, anyị na-ama na Jehova bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi kpam kpam. N’ihi abamuru ndị anyị na-enweta site n’ọtụtụ nkwa Chineke na-ekwe ma na-emezu, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele nkwa ndị anyị na-ekwe ya anya?
Imezu Nkwa Ndị Anyị Na-ekwe Chineke
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke bụ nkwa kasị mkpa anyị pụrụ ikwe. Site n’iwere nzọụkwụ a, anyị na-egosi na anyị chọrọ ijere Jehova ozi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ezie na ihe Chineke nyere n’iwu adịghị arọ, ọ pụrụ ịbụ na ọ gaghị adị mfe mgbe nile ime ihe ọ na-achọ, ebe ọ bụ na anyị na-ebi n’ime ajọ usoro ihe a. (2 Timoti 3:12; 1 Jọn 5:3) Ma ozugbo anyị ‘tinyesịrị aka anyị n’ọgụ anụ ụlọ na-adọkpụgharị’ ma ghọọ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye na ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, anyị ekwesịtụghị ileghachi anya azụ n’ihe nke ụwa nke anyị hapụworo.—Luk 9:62.
Mgbe anyị kpegaara Jehova ekpere, anyị pụrụ inwe mkpali nke ikwe ya nkwa na anyị ga-alụ ọgụ iji merie otu adịghị ike, zụlite otu àgwà ndị Kraịst, ma ọ bụ mụbaa akụkụ ụfọdụ nke ọrụ ọchịchị Chineke anyị. Gịnị ga-enyere anyị aka imezu nkwa ndị a?—Tụlee Eklisiastis 5:2-5.
Ezi nkwa na-esite n’obi nakwa n’uche. N’ihi ya, ka anyị mesie nkwa anyị kwere Jehova ike site n’imeghere ya obi anyị n’ekpere, jiri ezi obi na-ekwupụta egwu, ọchịchọ, na adịghị ike anyị. Ikpe ekpere banyere nkwa ga-ewusi mkpebi anyị imezu ya, ike. Anyị pụrụ ile nkwa ndị anyị kwere Chineke anya dị ka ụgwọ. Mgbe ụgwọ e ji buru ibu, a ghaghị iji nwayọọ nwayọọ kwụọ ya. N’otu aka ahụ, ọ ga-ewe oge iji mezuo ọtụtụ nkwa anyị kwere Jehova. Ma site n’inye ya ókè ike kwere anyị mgbe mgbe, anyị na-egosi na anyị ji ihe anyị na-ekwu kpọrọ ihe, ọ ga-agọzikwa anyị n’ihi ya.
Anyị pụrụ igosi na anyị ji nkwa anyị akpọrọ ihe site n’ikpe ekpere banyere ha mgbe mgbe, ikekwe kwa ụbọchị. Nke a ga-egosi Nna anyị nke eluigwe na anyị ji ezi obi kwe ha. Ọ ga-abụkwa ihe ncheta mgbe nile. Devid setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya na nke a. Ọ rịọrọ Jehova n’abụ, sị: “Chineke, nụrụ olu iti mkpu m; ṅaa ntị ekpere m. . . . M ga-abụku aha Gị abụ ọma ruo mgbe ebighị ebi, ka m wee kwụghachi nkwa m nile kwa ụbọchị.”—Abụ Ọma 61:1, 8.
Imezu Nkwa Anyị Na-ewulite Ntụkwasị Obi
Ọ bụrụ na e kwesịghị iji nkwa e kwere Chineke gwurie egwu, a pụkwara ikwu otú ihe ahụ banyere ndị anyị na-ekwe ndị Kraịst ibe anyị. Anyị ekwesịghị imeso Jehova ihe n’otu ụzọ ma mesoo ụmụnna anyị ihe n’ụzọ ọzọ. (Tụlee 1 Jọn 4:20.) N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru, sị: “Ma ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e.” (Matiu 5:37) Ijide n’aka na okwu anyị bụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi mgbe nile bụ otu ụzọ isi ‘na-arụ ezi ihe n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.’ (Ndị Galetia 6:10) Nkwa ọ bụla anyị mezuru na-ewulite ntụkwasị obi.
Ihe emezughị nkwa na-emebi na-aka ukwuu mgbe mgbe ma ọ bụrụ na o metụtara ego. Ma ọ bụ ịkwụghachi ego mgbazinye, ịrụ ọrụ, ma ọ bụ imezu nkwekọrịta azụmahịa, onye Kraịst kwesịrị imezu ihe o kwuru. Nke a na-atọ Chineke ụtọ ma na-eme ka ntụkwasị obi anyị nwerịtara n’ebe ibe anyị nọ sikwuo ike bụ́ nke dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ụmụnna ‘ga-ebikọ n’otu.’—Abụ Ọma 133:1.
Otú ọ dị, emezughị ihe e kwekọrịtara pụrụ imerụ ọgbakọ nakwa ndị ahụ o metụtara kpọmkwem, ahụ. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ekwu, sị: “Esemokwu achụmnta ego—nke ihe na-akpatakarị ya bụ nkwekọrịta nke ma ọ dịghị ihe ọzọ otu onye na-eche na onye nke ọzọ emezughị—na-aghọkarị ihe ọha na eze mazuuru. N’ihi ya, ụmụnna na-adụnyere otu onye ma ọ bụ onye nke ọzọ úkwù, ọnọdụ a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụkwara ịdị njọ.” Lee ka o si dị mkpa iji nlezianya tụlee nkwekọrịta ọ bụla anyị na-eme ma dee ya ede!a
Anyị kwesịkwara ịkpachara anya mgbe anyị na-ere ihe ndị dara oké ọnụ ma ọ bụ mgbe anyị na-atụ aro maka atụmatụ achụmnta ego, nke ka nke ma ọ bụrụ na anyị onwe anyị ga-erite uru n’achụmnta ego ahụ. N’otu aka ahụ, ọ dị mkpa ịkpachara anya nke ọma ịghara ikwubiga okwu ókè banyere uru dị ná ngwá ahịa ụfọdụ ma ọ bụ n’ihe ụfọdụ na-akwalite ahụ ike ma ọ bụ ikwe nkwa na a ga-enweta uru na-apụghị ikwe omume n’atụmatụ achụmnta ego. Ịhụnanya kwesịrị ịkpali ndị Kraịst ịkọwa ọghọm ọ bụla dị na ya nke ọma. (Ndị Rom 12:10) Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụnna anyị enwechaghị ahụmahụ n’ihe banyere achụmnta ego, ha pụrụ ịtụkwasị ndụmọdụ anyị obi nanị n’ihi na anyị bụ ndị ezinụlọ nke okwukwe ha. Lee ihe dị njọ ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na e mebie ntụkwasị obi a!
Dị ka ndị Kraịst, anyị apụghị ịnakwere achụmnta ego ndị a na-adịghị eme ihe n’eziokwu na ha ma ọ bụ ndị na-eleghara ezi ọdịmma nke ndị ọzọ anya. (Ndị Efesọs 2:2, 3; Ndị Hibru 13:18) Iji nweta ihu ọma Jehova dị ka ‘ọbịa n’ụlọikwuu Ya,’ anyị aghaghị ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. ‘Ọ bụrụgodị na anyị aṅụwo iyi nke ga-emejọ anyị onwe anyị, anyị adịghị agbanwe okwu anyị.’—Abụ Ọma 15:1, 4.
Onyeikpe Jefta nke Israel kwere nkwa na ọ bụrụ na Chineke emee ka ya merie ụmụ Amọn, na ya ga-enye Jehova ihe mbụ nke zutere ya mgbe ya lọtasịrị n’agha dị ka àjà nsure ọkụ. Ihe ahụ mesịrị bụrụ nanị otu nwa Jefta mụtara, ma ọ laghị azụ n’imezu okwu ya. Site ná nkwenye nwa ya nwanyị ji ezi obi kwenye, o nyefere ya maka ije ozi n’akwụsịghị akwụsị n’ebe nsọ Chineke—àjà nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ọ bụ nke dị mwute ma dị oké ọnụ ahịa n’ụzọ dịgasị iche.—Ndị Ikpe 11:30-40.
Ndị nlekọta ọgbakọ karịsịa nwere ibu ọrụ nke imezu ihe ha kwekọrịtara. Dị ka 1 Timoti 3:2 si kwuo, onye nlekọta kwesịrị ịbụ “onye a na-adịghị akalu.” Nke a bụ nsụgharị nke okwu Grik pụtara “onye a na-apụghị ijideli, onye a na-apụghị ịkọcha, onye karịrị nkọcha.” Ọ “na-enye echiche na ọ bụghị nanị na nwoke ahụ nwere ezi aha, kama na o ruru eru inwe ya.” (A Linguistic Key to the Greek New Testament) Ebe ọ bụ na onye nlekọta aghaghị ịbụ onye a na-adịghị akalu, nkwa ya kwesịrị ịbụ ndị a pụrụ ịdabere na ha mgbe nile.
Ụzọ Ndị Ọzọ Isi Mezuo Nkwa Anyị
Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele nkwa ndị anyị na-ekwe ndị na-abụghị ndị Kraịst ibe anyị anya? “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ,” ka Jisọs kwuru, “ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:16) Site n’igosipụta na anyị na-eme ihe anyị kwuru, anyị pụrụ ịdọta ndị ọzọ n’ebe ozi ndị Kraịst anyị dị. N’agbanyeghị ndakpọ e nwere n’ụkpụrụ ime ihe n’eziokwu gburugburu ụwa, ihe ka n’ọtụtụ mmadụ ka na-eji iguzosi ike n’ezi ihe akpọrọ ihe. Imezu nkwa anyị bụ otu ụzọ isi gosipụta ịhụnanya n’ebe Chineke na ndị agbata obi anyị nọ na ịdọta mmasị nke ndị hụrụ ezi omume n’anya.—Matiu 22:36-39; Ndị Rom 15:2.
N’afọ ije ozi nke 1998 ha, Ndịàmà Jehova tinyere ihe karịrị otu ijeri awa n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihu ọha. (Matiu 24:14) A pụrụ ilegharawo ụfọdụ n’ime nkwusa ndị a anya ma ọ bụrụ na anyị adịghị emezu ihe anyị kwuru ná mmekọrịta achụmnta ego ma ọ bụ n’ihe ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na anyị na-anọchite anya Chineke nke eziokwu, ọ bụ ihe ziri ezi na ndị mmadụ na-atụ anya n’aka anyị ime ihe n’eziokwu. Site n’ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na ndị na-eme ihe n’eziokwu, anyị “[na-achọ] ozizi nke Onye nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.”—Taịtọs 2:10.
N’ozi anyị, anyị na-enwe ohere imezu ihe anyị kwuru mgbe anyị na-alaghachi iji leta ndị gosipụtara mmasị n’ozi Alaeze ahụ. Ọ bụrụ na anyị asị na anyị ga-alọghachi, anyị kwesịrị ime otú ahụ. Ịlọghachi dị ka anyị kwere ná nkwa bụ otu ụzọ isi ghara ‘igbochi ezi ihe ná ndị ọ dịịrị.’ (Ilu 3:27) Otu nwanna nwanyị si otú a kọwaa okwu a: “Ọtụtụ mgbe, ezutewo m ndị nwere mmasị bụ́ ndị sịrị na Onyeàmà kwere nkwa ịlọghachi ma o meghị otú ahụ. N’ezie, amaara m na ọ pụrụ ịbụ na onye nwe ụlọ anọghị n’ụlọ ma ọ bụ na ọnọdụ pụrụ imewo ka ọ ghara ikwe omume ịlọghachi. Ma agaghị m achọ ka onye ọ bụla kwuo otú ahụ banyere m, ya mere ana m eme ihe nile m pụrụ ime iji chọta onye ahụ n’ụlọ ya ọzọ. Ekweere m na ọ bụrụ na m mechuo mmadụ ihu, ọ ga-enye Jehova na ụmụnna m nile aha ọjọọ.”
N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ na anyị achọghị ịlaghachi n’ihi na anyị na-ekwubi na onye ahụ enweghị mmasị n’ezie. Otu nwanna nwanyị ahụ na-akọwa, sị: “Adịghị m anwa ikpebi ókè onye ahụ nweruru mmasị. Ahụmahụ nke m akụziworo m na mmetụta mbụ adịghị ezikarị ezi. Ya mere ana m agbalị inwe echiche ziri ezi, na-ele onye nke ọ bụla anya dị ka onye gaje ịbụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị.”
N’ozi ndị Kraịst nakwa n’ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ, ọ dị anyị mkpa igosipụta na a pụrụ ịtụkwasị ihe anyị na-ekwu obi. N’eziokwu, ọ na-aka adị mfe ikwu ihe ụfọdụ ekwu karịa ime ha eme. Nwoke amamihe ahụ kwuru, sị: “Ọtụtụ mmadụ na-akpọsa, onye ọ bụla ebere nke aka ya: ma onye kwesịrị ntụkwasị obi, ònye ga-achọpụta ya?” (Ilu 20:6) Site ná mkpebisi ike, anyị pụrụ ịnọgide na-emezu okwu anyị.
Ngọzi Bara Ụba Site n’Aka Chineke
Ịkpachapụ anya na-ekwe nkwa a na-agaghị emezu emezu bụ emeghị ihe n’eziokwu, a pụkwara iji ya tụnyere mmadụ ide akwụkwọ ndọrọ ego n’enweghị ego zuru ezu n’ụlọ akụ̀. Ma lee ụgwọ ọrụ na ngọzi ndị anyị na-enweta maka imezu nkwa anyị! Inwe ezi akọ na uche bụ otu ngọzi a na-enweta maka ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. (Tụlee Ọrụ 24:16.) Kama inwe mmetụta ịkwa ụta, anyị na-enwe afọ ojuju na udo. Ọzọkwa, site n’imezu okwu anyị, anyị na-atụnye ụtụ n’ịdị n’otu nke ọgbakọ, nke na-adabere n’ịtụkwasịrịta obi. “Okwu nke eziokwu” anyị na-emekwa ka a mara anyị dị ka ndị na-ejere Chineke nke eziokwu ozi.—2 Ndị Kọrint 6:3, 4, 7.
Jehova na-emezu okwu ya, ọ na-akpọkwa “ire okwu ụgha” asị. (Ilu 6:16, 17) Site n’iṅomi Nna anyị nke eluigwe, anyị na-abịarukwu ya nso. Mgbe ahụ, n’ezie, anyị nwere ezi ihe mere anyị ji emezu nkwa anyị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Dee Ya Ede!” na Teta! (Bekee) nke February 8, 1983, peji nke 13-15.
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Jefta mezuru nkwa ya, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị mwute ime
[Foto ndị dị na peeji nke 11]
Ọ bụrụ na i kwere nkwa ịlaghachi, kwadebe nke ọma ime otú ahụ