Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/15 p. 14-19
  • Iji Obi Dị n’Otu Na-eje Ije

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Obi Dị n’Otu Na-eje Ije
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Egwu nke Kwesịrị Ekwesị
  • Ebere Jehova
  • “Ihe Ịrịba Ama Banyere Ezi Ihe”
  • Jehova, Onye Na-eme Ihe Ndị Dị Ebube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Jehova—Onye Nlereanya Kasịnụ nke Ịdị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Nọgide Na-egosipụta Ịdị Mma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • “Mee Ka Obi M Dị n’Otu Ịtụ Egwu Aha Gị”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/15 p. 14-19

Iji Obi Dị n’Otu Na-eje Ije

“Zi m ụzọ gị, Jehova; . . . mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.”—ABỤ ỌMA 86:11.

1. Olee otú Jehova si enyeghachi ndị ebere ya ụgwọ ọrụ?

‘JEHOVA, gị onwe gị bụ Chineke, nanị gị’ (Abụ Ọma 86:8, 10) Devid toro Chineke site n’obi nke jupụtara n’ekele. Ọbụna tupu Devid abụrụ eze Israel nile, Jehova anapụtawo ya n’aka Sọl na site n’aka ndị Filistia. N’ihi ya, ọ pụrụ ịbụ abụ, sị: “Jehova bụ oké nkume m, na ebe m e wusiri ike, na onye na-eme ka m gbapụ, onye m nwere. N’ebe onye ebere nọ ị ga-egosi onwe gị onye ebere.” (2 Samuel 22:2, 26) Jehova echebewo onye ebere na-ejere ya ozi n’ọtụtụ ule. Devid pụrụ itinye ntụkwasị obi na obi ike ya na Chineke nke ebere, ma nduzi a nọgidere na-enye dị ya mkpa. Ugbu a Devid rịọsiri Chineke ike, sị: “Zi m ụzọ gị, Jehova.”—Abụ Ọma 86:11.

2. Olee otú Jehova siworo mee ndokwa maka anyị ịbụ ndị o ziri ihe?

2 Devid achọghị inwe ihe jikọrọ ya na echiche na nkà ihe ọmụma nile nke ụwa. Ọ chọrọ ịbụ onye “mmụta Jehova,” dị ka onye amụma Chineke si mesịa kwuo ya. (Aịsaịa 54:13) Devid pụrụ ịtụgharịwo uche na nanị akwụkwọ itoolu nke Bible e nwere n’ụbọchị ya. Ma, ozizi ahụ sitere n’aka Jehova dị oké ọnụ ahịa nye ya! N’ịbụ ndị a na-ezi ihe, anyị n’oge a pụrụ iri ihe site n’akwụkwọ 66 nile nke Bible, nakwa n’ụba nke akwụkwọ Alaeze a na-ewepụta site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Dị ka Devid, ka anyị kpọkuo Jehova, ka mmụọ ya wee nyere anyị aka inyocha n’ime “ka ha hà, bụ́ ihe Chineke doziiri ndị hụrụ ya n’anya . . . ọbụna ihe nile dị omimi nke Chineke.”—Ndị Kọrint 2:9, 10.

3. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ntụziaka Bible pụrụ isi baara anyị uru?

3 Bible nwere azịza nye ajụjụ na nsogbu ọ bụla pụrụ ibilite ná ndụ anyị. “N’ihi na ka ha hà, bụ́ ihe e dere n’akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Ịnakwere ntụziaka sitere n’aka Jehova ga-enye anyị ume ịnagide ihe isi ike, kasie anyị obi n’oge nkụda mmụọ, ma mee ka olileanya Alaeze ahụ na-egbukepụ egbukepụ n’obi anyị. Ka anyị nweta obi ụtọ n’ịgụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya “ehihie na abalị,” n’ihi na amamihe dabeere na Bible na-aghọ “osisi na-enye ndụ [nye] ndị na-ejide ya aka: ee, onye ọ bụla nke na-ejisi ya aka ike bụ onye na-agara nke ọma.”—Abụ Ọma 1:1-3; Ilu 3:13-18; leekwa Jọn 17:3.

4. Banyere omume anyị, ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ anyị?

4 Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs, onye a na-akpọkwa “Nwa Devid,” legara anya na Jehova mgbe nile maka ntụziaka. (Matiu 9:27)a Ọ sịrị: “Ọkpara apụghị ime ihe ọ bụla n’onwe ya, ma ọ bụghị ihe ọ hụrụ na Nna ya na-eme: n’ihi na ihe ọ bụla ya onwe ya na-eme, ndị a ka Ọkpara ya na-emekwa otú ahụ.” “Ọ dịghịkwa ihe m na-eme n’onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a.” (Jọn 5:19; 8:28) Jisọs hapụụrụ anyị ihe nlereanya ka anyị “soo ijeụkwụ ya nile.” (1 Pita 2:21) Cheedị nnọọ echiche! Ọ bụrụ na anyị amụọ ihe dị nnọọ ka Jisọs na-aghaghị imewo, n’ọnọdụ ọ bụla anyị ga-enwe ike ime ihe dị ka Jehova ga-achọ ka anyị mee. Ụzọ nke Jehova bụ mgbe nile ụzọ nke ziri ezi.

5. Gịnị bụ “eziokwu”?

5 Ihe ọzọ Devid kpọsara bụ: “M ga-ejegharị n’eziokwu gị.” (Abụ Ọma 86:11) Mgbe otu puku afọ gasịrị, Paịlet ka ọ na-agwa Nwa Devid, bụ́ Jisọs, okwu, jụrụ, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” Ma, Jisọs ka zasịrị ajụjụ ahụ, na-agwa Paịlet, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a,” na-agbakwụnye, sị: “Gị onwe gị na-asị na mụ onwe m bụ eze. A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:33-38) Jisọs si otú a na-eme ka a mara na eziokwu ahụ na-elekwasị anya n’Alaeze Mesaịa. N’ezie, isiokwu Bible dum bụ ido aha Jehova nsọ site n’Alaeze ahụ.—Ezikiel 38:23; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 11:15.

6. N’ije ije n’eziokwu, gịnị ka anyị ga-elezi anya banyere ya?

6 Gịnị ka ije ije n’eziokwu ahụ pụtara? Ọ pụtara ime olileanya Alaeze ahụ ihe bụ isi ná ndụ anyị. Anyị aghaghị ibi ndụ kwekọrọ n’eziokwu Alaeze ahụ. Anyị aghaghị ịbụ ndị a na-ekewaghị ekewa n’idebe ọdịmma nile nke Alaeze n’ọnọdụ mbụ, na-anụ ọkụ n’obi dị ka ohere ndị anyị nwere iji gbaara eziokwu Alaeze ahụ àmà si dị, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs. (Matiu 6:33; Jọn 18:37) Anyị apụghị iji ọkara oge anyị jee ije n’eziokwu ahụ, na-enye nanị ije ozi egbugbere ọnụ efu ma mgbe ahụ na-eme ihe na-atọ onwe anyị ụtọ site n’iji aghụghọ na-etinye aka ná ntụrụndụ gabigara ókè ma ọ bụ ịbanye n’ọrụ na-eri oge ma ọ bụ ịbụ “ohu . . . Akụ.” (Matiu 6:24) Anyị pụrụ ifu n’otu n’ime ụzọ nta ndị ahụ, na-enweghị ike ma ọlị ịlọghachi ‘n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ.’ Ka anyị ghara ịkpafu site n’ụzọ ahụ! (Matiu 7:13, 14) Onye Ozizi Kasị Ukwuu, bụ́ Jehova, site n’Okwu na nzukọ ya, na-enye ìhè n’ụzọ ahụ, na-asị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya; mgbe unu na-eche ihu n’aka nri, na mgbe unu na-eche ihu n’aka ekpe.”—Aịsaịa 30:21.

Egwu nke Kwesịrị Ekwesị

7. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka obi anyị “dị n’otu”?

7 Ekpere Devid na-aga n’ihu n’amaokwu nke 11: “Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” Dị ka Devid, anyị kwesịrị ịchọ ka obi anyị bụrụ nke a na-ekewaghị ekewa, nke zuru ezu, n’ime uche Chineke. Nke a kwekọrọ na ndụmọdụ Mosis bụ: “Ma ugbu a, Israel, gịnị ka Jehova, bụ́ Chineke gị, na-arịọ n’aka gị, ma ọ bụghị ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke gị, ije ije n’ụzọ ya nile, na ịhụ ya n’anya, na iwere obi gị nile na mkpụrụ obi gị nile fee Jehova, bụ́ Chineke gị, ofufe, idebe ihe nile Jehova nyere n’iwu, na ụkpụrụ ya nile, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa ka o wee dịrị gị mma?” (Deuterọnọmi 10:12, 13) Ọ bụ n’ezie maka ọdịmma anyị ka anyị wụpụ obi na mkpụrụ obi anyị n’ife Jehova. Anyị si otú a na-egosi egwu kwesịrị ekwesị maka aha ya di ebube. Aha Jehova pụtara n’ụzọ nkịtị “Ọ Na-eme Ka Ọ Dịrị,” karịsịa n’ihe banyere imezu nzube ya nile dị ebube. Ọ na-egosikwa ịbụisi ya kasị elu n’eluigwe na ụwa nile. Iji ụjọ ịdị ukwuu Chineke na-efe ya, egwu ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ agaghị akwachapụ anyị. A gaghị ekewa obi anyị ekewa. Kama nke ahụ, anyị ga-atụ egwu ime ihe ọ bụla ga-ewute Jehova, Onyeikpe Kasị Elu na Eze Onyenwe anyị, onye ji ndụ anyị nile kpọmkwem n’aka ya.—Aịsaịa 12:2; 33:22.

8, 9. (a) Gịnị ka “esiteghị n’ụwa” pụtara? (b) Nzọụkwụ ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị iwere n’ihi na anyị bụ “ihe nkiri”?

8 Ọbụna n’okpuru nkọcha na mkpagbu, anyị ga-agbaso ihe nlereanya Jisọs nke atụghị egwu n’abụghị akụkụ nke ụwa ọjọọ dị anyị gburugburu. (Jọn 15:17-21) Nke a apụtaghị na ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị ibi ndụ nke ị nọpụrụ onwe ha iche ma ọ bụ zopụ onwe ha n’ebe obibi ndị mọnk. Jisọs kwuru n’ekpere nye Nna ya, sị: “Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha n’ụwa, kama ka i debe ha ka ha pụọ n’aka ajọ onye ahụ. Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa. Were eziokwu doo ha nsọ: okwu gị bụ eziokwu. Dị ka i zigara m n’ime ụwa, mụ onwe m zigakwara ha n’ime ụwa.” (Jọn 17:15-18) Dị ka Jisọs, e zigara anyị ịkpọsa eziokwu Alaeze. Jisọs bụ onye a pụrụ ịbịakwute. Ụzọ izi ihe ya na-eme ka ndị mmadụ nwee ntụrụndụ. (Tụlee Matiu 7:28, 29; 11:28, 29; Jọn 7:46.) O kwesịrị ịdị otú ahụ n’ebe anyị nọ.

9 Ọbụbụenyi anyị nke ịdị na-emere ndị ọzọ ihe, ejiji na ọdịdị dị mma n’anya, mkparịta ụka obi ọma na nke dị ọcha, kwesịrị ime ka ndị obi ha ziri ezi na-anabata anyị na ozi anyị. Anyị aghaghị ịjụ ịdị nkịrịka, uwe na-adịghị mma, mkpakọrịta ndị pụrụ iduga n’itinye aka n’ihe ụwa, na ụzọ ndụ omume rụrụ arụ na nke na-enweghị ụkpụrụ nke anyị na-ahụ n’ụwa dị anyị gburugburu. Ebe “e mere anyị ihe nkiri nye ụwa na ndị mmụọ ozi na mmadụ,” ọrụ e kenyere anyị ije ozi na ibi ndụ dị ka ndị Kraịst kwesịrị nṅomi bụ nke anyị ga na-arụ 24 hour dum kwa ụbọchị. (1 Ndị Kọrint 4:9; Ndị Efesọs 5:1-4; Ndị Filipaị 4:8, 9; Ndị Kọlọsi 4:5, 6) Obi anyị aghaghị ịdị n’otu iji mee nke a.

10. Olee otú Jehova si echeta ndị mere ka obi ha dịrị n’otu n’ije ozi dị nsọ?

10 Jehova ga-echeta anyị bụ́ ndị mere ka obi anyị dịrị n’otu ịtụ egwu aha Jehova, na-atụgharị uche ná nzube ya ndị dị ebube ma jiri ozi ya dị nsọ na-emeju ndụ anyị. “N’ihi na Jehova, anya ya na-ejegharị n’ụwa nile, igosi onwe ya onye dị ike n’akụkụ ndị obi ha zuru okè n’ebe ọ nọ.” (2 Ihe Emere 16:9) Ka ọ na-ezo aka n’ụzọ amụma n’ụbọchị anyị, Malakaị 3:16 na-agụ, sị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha ya, akwụkwọ ncheta n’ihu ya.” Ka obi anyị dịrị n’otu n’egwu ahụ dị mma nke Jehova!

Ebere Jehova

11. Olee otú a ga-esi gosipụta ebere Jehova n’ebe ndị ebere nọ?

11 Lee ka ekpere Devid si bụrụ nke sitere n’ala ala obi!: “M ga-eji obi m nile kelee gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW”], Chineke; m ga-asọpụrụkwa aha gị ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi na ebere gị dị ukwuu n’ahụ m; i siwo n’ala mmụọ nke dịchasị ala napụta mkpụrụ obi m.” (Abụ Ọma 86:12, 13) Na nke ugbo abụọ ya n’abụ ọma a, Devid na-eto Jehova maka ebere Ya—ezi ịhụnanya Ya. Ịhụnanya nke a buru ibu nke ukwuu nke na ọ pụrụ inye nzọpụta n’ọnọdụ ndị yiri ka ọ bụ na e nweghị ụzọ mgbapụ. Mgbe Sọl na-achụgharị ya n’ime ọzara, ọ pụrụ ịdịworị Devid ka ọ bụ ya gbere igbe gaa n’otu akụkụ nwụọ. O yiri ka iche ala mmụọ nke dịchasị ala ihu—ime ime nke ala ili. Ma Jehova napụtara ya! N’otu ụzọ ahụ, mgbe mgbe Jehova anapụtawo ndị na-ejere ya ozi n’oge a n’ụzọ ndị dị ebube, ọ kwagidewokwa ndị na-anọgide n’iguzosi ike n’ezi ihe bụ́ ndị tachiworo obi n’ikwesị ntụkwasị obi ọbụna ruo ọnwụ. Ndị ebere nile ga-enweta ụgwọ ọrụ ha, ọbụna site ná mbilite n’ọnwụ ma ọ dị mkpa.—Tụlee Job 1:6-12; 2:1-6, 9, 10; 27:5; 42:10; Ilu 27:11; Matiu 24:9, 13; Mkpughe 2:10.b

12. Olee otú ndị ụkọchukwu siworo bụrụ ndị nganga na ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji, gịnị ga-abụkwa ihe nkwụghachi ụgwọ ha?

12 Banyere ndị mmegide, Devid bere ákwá kwuo, sị: “Chineke, ndị nganga ebiliwo imegide m, nzukọ ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji achọwokwa mkpụrụ obi m, ha edoghịkwa gị n’ihu ha.” (Abụ Ọma 86:14) Taa, ndị mkpagbu ahụ agụnyewo ndị ụkọchukwu nke Krisendọm. Ndị a na-ekwu na ha na-efe Chineke ma na-eji ùtú aha bụ “Onyenwe anyị” na-edochi aha ya dị nsọ, na-akọwakwa ya dị ka Atọ n’Ime Otu dị omimi nke ọ na-adịghị n’ezie ebe e kwuru ya n’ime Bible. Lee ihe nganga ọ bụ! Tụkwasị na nke ahụ, ha na-anwa ịkwali ndị ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị ịmachibido Ndịàmà Jehova iwu ma tụọ ha mkpọrọ, dị ka a ka na-eme n’ọtụtụ mba gburugburu ụwa n’ụzọ na-eju anya. Ndị a na-eyi uwe mwụda bụ́ ndị na-ekwulu aha Chineke ga-anata ụgwọ ọrụ ha, tinyere akụkụ nile yiri akwụna nke Babilọn Ukwu ahụ.—Mkpughe 17:1, 2, 15-18; 19:1-3.

13. Àgwà dịgasị aṅaa ka Jehova na-egosi n’ime ka a mara ịdị mma ya?

13 N’ụzọ dị iche nke na-enye obi ụtọ, ekpere Devid gara n’ihu ịsị: “Ma gị onwe gị, Onyenwe anyị [“Jehova,” “NW”], bụ Chineke nke nwere obi ebere, onye dịkwa amara, nke na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, nke na-abakwa ụba n’ebere na eziokwu.” (Abụ Ọma 86:15) N’ọtụtụ kasị elu n’ezie ka àgwà ndị dị otú ahụ nke Chineke anyị dị. Okwu ndị ahụ na-akpọghachi anyị azụ gaa n’Ugwu Saịnaị mgbe Mosis rịọrọ ka ya hụ ebube Jehova. Jehova zaghachiri, sị: “Mụ onwe m ga-eme ka ịdịmma m nile gabiga n’ihu gị, m ga-akpọkwa òkù banyere aha Jehova n’ihu gị.” Ma ọ dọrọ Mosis aka ná ntị, sị: “Ị pụghị ịhụ ihu m anya: n’ihi na mmadụ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ.” Ka e mesịrị, Jehova rịdatara n’igwe ojii, na-akpọsa, sị: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu.” (Ọpụpụ 33:18-20; 34:5, 6) Devid hotara okwu ndị a n’ekpere ya. Àgwà ndị dị otú ahụ nke Jehova pụtara ihe dị nnọọ ukwuu nye anyị karịa ngosi ọ bụla n’ụzọ a na-ahụ anya! Site n’ahụmahụ nke anyị, ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe ekele maka ịdịmma Jehova dị ka e nyere ihe atụ ya n’ọmarịcha àgwà ndị a?

“Ihe Ịrịba Ama Banyere Ezi Ihe”

14, 15. Olee otú Jehova si arụpụtara ndị na-ejere ya ozi “ihe ịrịba ama banyere ịdị mma ya”?

14 Devid rịọkwara ọzọ maka ngọzi Jehova, na-asị: “Chee m ihu, mekwaara m amara; nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa nwoke nke ohu gị nwanyị. Meere m ihe ịrịba ama banyere ezi ihe ị ga-emere m; ka ndị na-akpọ ma asị wee hụ ya, ka ihere wee mee ha, n’ihi na gị onwe gị Jehova, enyeworo m aka, kasiekwa m obi.” (Abụ Ọma 86:16, 17) Devid matara na dị ka ‘nwa nwoke nke ohu nwanyị Jehova,’ ya onwe ya aghaghị ịdịrị Jehova. Otú ahụ ka ọ dịịrị anyị nile taa bụ́ ndị rarawooro ndụ anyị nye Jehova na ndị na-abụ ohu n’ije ozi ya. Anyị nwere mkpa nke ume nzọpụta Jehova site na mmụọ nsọ ya. N’ihi ya, anyị na-arịọ Chineke anyị ịrụpụta n’ime anyị “ihe ịrịba ama banyere ezi ihe.” Ezi ihe Jehova jikọtara àgwà ọma ndị anyị tụleworo. N’ịdabere na nke a, olee ihe ịrịba ama, ma ọ bụ ihe ngosi, anyị pụrụ ịtụ anya ka Jehova nye anyị?

15 Jehova bụ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè,” ọ na-emesapụkwa aka, dị ka Jisọs mesiri anyị obi ike, n’inye ‘ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’ (Jemes 1:17; Luk 11:13) Mmụọ nsọ—lee oké ihe dị oké ọnụ ahịa sitere n’aka Jehova ọ bụ! Site na mmụọ nsọ, Jehova na-enye ọṅụ nke obi, ọbụna n’oge mkpagbu. Otú a, ndị ozi Jisọs, mgbe a na-ekpe ikpe igbu ha, pụrụ iji ọṅụ kpọsaa na Chineke na-enye ndị na-erubere ya isi dị ka onye ọchịchị mmụọ nsọ. (Ọrụ 5:27-32) Ọṅụ nke mmụọ nsọ nọgidere na-arụpụtara n’ime ha “ihe ịrịba ama banyere ezi ihe.”—Ndị Rom 14:17, 18.

16, 17. (a) Ihe ịrịba ama dị aṅaa banyere ezi ihe ka Jehova nyere Pọl na Banabas? (b) Ihe ịrịba ama dị aṅaa ka e nyere ndị Tesalọnaịka a kpagburu?

16 N’oge njem ozi ala ọzọ ha gabiga Asia Minor, Pọl na Banabas zutere ihe isi ike, ọbụna mkpagbu siri ike. Mgbe ha kwusara ozi ọma n’Antịọk nke Pisidia, ndị Juu jụrụ ozi ha. N’ihi ya, ha chigharịkwuuru ndị mba ọzọ. Gịnị si na ya pụta? “Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ nke a, ha ṅụrịa, nyekwa okwu Chineke otuto; ha wee kwere na Jisọs, ka ha hà, bụ́ ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi.” Ma ndị Juu kpalitere ọgba aghara nke na a chụpụrụ ndị ozi ala ọzọ ahụ pụọ ná mba ahụ. Ha na ndị ọhụrụ kwere ekwe hà nwere obi ịda mbà banyere nke a? Ee e ma ọlị! Kama nke ahụ, “ndị na-eso ụzọ Jisọs wee jupụta n’ọṅụ na mmụọ nsọ.” (Ọrụ 13:48, 52) Jehova nyere ha ihe ịrịba ama ahụ nke ezi ihe ya.

17 E mesịa, a kpagburu ọgbakọ dị na Tesalọnaịka. Nke a dubara Pọl onyeozi n’ide akwụkwọ ozi nke nkasi obi, na-aja ntachi obi ha n’okpuru mkpagbu mma. Ha “weere ọṅụ nke mmụọ nsọ nara okwu ahụ nke ọma n’ime ọtụtụ mkpagbu.” (1 Ndị Tesalọnaịka 1:6) “Ọṅụ nke mmụọ nsọ” nọgidere na-agba ha ume dị ka ihe ịrịba ama pụtara ìhè site n’aka Chineke onye dị obi ebere, na-emekwa amara, nke na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, jupụtakwa n’ebere na eziokwu.

18. Olee otú ụmụnna anyị n’Ọwụwa Anyanwụ Europe siworo gosipụta ekele maka ezi ihe Jehova?

18 N’oge ndị a, Jehova egosipụtawo ezi ihe ya n’ebe ụmụnna anyị na-ekwesị ntụkwasị obi n’Ọwụwa Anyanwụ Europe nọ, na-emenye ndị kpọworo ha asị—ndị na-akpagbu ha na mbụ—ihere. Ọ bụ ezie na a tọhapụrụ ha n’oge na-adịbeghị anya gara aga site n’ọtụtụ iri afọ nke mmegide, ezi ụmụnna anyị ndị a ka ga-anọgide na-atachi obi, n’ihi na ọtụtụ na-eche oké ihe isi ike ọnọdụ akụ na ụba ihu. Otú ọ dị, ‘ọṅụ ha nke mmụọ nsọ’ na-akasi ha obi. Olee ọṅụ ka ukwuu ha pụrụ inwewo karịa n’iji nnwere onwe ndị ha nwetara ọhụrụ n’ịgbasawanye àmà ahụ? Ọtụtụ ndị na-ege ha ntị, dị ka akụkọ a na-enweta banyere mgbakọ na baptism ndị e mere na-egosi.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 9:31.

19. Olee otú anyị pụrụ isi mee okwu ndị dị n’Abụ Ọma 86:11 nke anyị?

19 Ihe nile a tụleworo n’isiokwu nke a na nke bu ụzọ na-ekpeghachi ekpere sitere n’ala ala obi nke Devid kpegaara Jehova: “Zi m ụzọ gị, Jehova; . . . mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.” (Abụ Ọma 86:11) Ka anyị mee okwu ndị ahụ nke isiokwu anyị dịịrị afọ 1993 nke anyị ka anyị ji obi dum na-arụ ọrụ ná nkwado nke ọdịmma nile nke Alaeze ahụ n’igosi obi ekele maka ezi ihe na-adịghị agwụ agwụ nke otu Chineke anyị, Eze Onyenwe anyị bụ́ Jehova.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka “mkpụrụ” ahụ e buru n’amụma, Jisọs bụ onye nketa nke alaeze Devid wee si otú ahụ bụrụ “Nwa Devid” ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ime mmụọ.—Jenesis 3:15; Abụ Ọma 89:29, 34-37.

b Maka ihe atụ ndị nke oge a, lee Yearbook of Jehovah’s Witnesses, mbipụta ndị nke 1974, peji nke 113-212; 1985, peji nke 194-197; 1986, peji nke 237-238; 1988, peji nke 182-185; 1990, peji nke 171-172; 1992, peji 174-181.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻Gịnị ka anyị na-egosipụta site n’ikpe ekpere sị, “Zi m ụzọ gị, Jehova”?

◻Gịnị ka ime ka obi anyị dị n’otu ịtụ egwu aha Jehova pụtara?

◻Olee otú Jehova ga-esi gosipụta ebere ya n’ebe ndị ebere ya nile nọ?

◻Olee otú Jehova si arụpụtara anyị “ihe ịrịba ama banyere ezi ihe”?

[Igbe dị na peeji nke 16]

Isiokwu dịịrị afọ 1993: “Zi m ụzọ gị, Jehova; . . . mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.”—Abụ Ọma 86:11.

[Foto dị na peeji nke 15]

Jehova bụ oké nkume na ebe e wusiri ike nye ndị na-agazi ije n’eziokwu

[Foto dị na peeji nke 18]

Ná Mgbakọ Mba Nile nke “Ndị Na-enye Ihe” nke Ndịàmà Jehova na St. Petersburg, Russia, na June, 46,214 mmadụ bịara, e mekwara 3,256 baptism. Lee ka o si dị ebube na ndị a na-eji ezi ihe Jehova na-eme ihe, na-enwe “ọṅụ nke mmụọ nsọ”!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya