Wezụga Obi Gị Inwe Nghọta
“Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.”—ILU 2:6.
1. Olee otú anyị pụrụ isi wezụga obi anyị inwe nghọta?
JEHOVA bụ Onye Nkụzi Ukwu anyị. (Aịsaịa 30:20, 21) Ma gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji rite uru site ‘n’ihe ọmụma Chineke’ nke e kpughere n’Okwu ya? N’otu akụkụ, anyị aghaghị ‘iwezụga obi anyị inwe nghọta’—nwee ọchịchọ sitere n’obi inweta na igosipụta àgwà a. Iji mee nke a, anyị aghaghị ilegara Chineke anya, n’ihi na onye amamihe ahụ sịrị: “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta.” (Ilu 2:1-6) Gịnị bụ ihe ọmụma, amamihe, na nghọta?
2. (a) Gịnị bụ ihe ọmụma? (b) Olee otú ị ga-esi kọwaa amamihe? (ch) Gịnị bụ nghọta?
2 Ihe ọmụma bụ ịmata ihe ndị bụ ezie a mụtara site n’ahụmahụ, nkiri anya, ma ọ bụ ọmụmụ ihe. Amamihe bụ ikike nke itinye ihe ọmụma n’ọrụ. (Matiu 11:19) Eze Solomọn gosipụtara amamihe mgbe ndị inyom abụọ sịrị na ọ bụ ha nwe otu nwa ahụ, o jikwa ihe ọmụma ya banyere otú nne si arara onwe ya nye nwa ya wee kpezie esemokwu ahụ. (1 Ndị Eze 3:16-28) Nghọta bụ “ịdị nkọ n’ime mkpebi.” Ọ bụ “ike ma ọ bụ ikike nke uche nke o ji amata ọdịiche otu ihe n’ebe ibe ya dị.” (Webster’s Universal Dictionary) Ọ bụrụ na anyị ewezụga obi anyị inwe nghọta, Jehova ga-enye anyị ya site n’Ọkpara ya. (2 Timoti 2:1, 7) Ma olee otú nghọta pụrụ isi metụta akụkụ dị iche iche nke ndụ?
Nghọta na Okwu Anyị
3. Olee otú ị ga-esi kọwaa Ilu 11:12, 13 na ihe ọ pụtara ịbụ onye “obi amamihe kọrọ”?
3 Nghọta na-enyere anyị aka ịmara na e nwere “mgbe ịgba nkịtị na mgbe ikwu okwu.” (Eklisiastis 3:7) Àgwà a na-emekwa ka anyị kpachara anya banyere ihe anyị na-ekwu. Ilu 11:12, 13 na-asị: “Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya, obi amamihe kọrọ ya: ma onye nghọta na-agba nkịtị. Onye na-ejegharị dị ka onye na-agba àmà ọjọọ na-ekpughe izu nzuzo: ma onye mmụọ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ekpuchi okwu.” Ee, nwoke ma ọ bụ nwanyị na-eleda onye ọzọ anya, “obi amamihe kọrọ ya.” Dị ka onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Wilhelm Gesenius si kwuo, onye dị otú ahụ “enweghị nghọta.” O nweghị ike ime ezi mkpebi, ijikwa okwu bụ́ “obi” mee ihe na-egosi na àgwà ọma nke mmadụ ime dị ụkọ. Ọ bụrụ na onye sị na ya bụ onye Kraịst eburu àsị̀rị̀ ya gaa n’ókè nke nkwutọ ma ọ bụ nkatọ, ndị okenye a họpụtara ahọpụta aghaghị ime ihe iji kwụsị ọnọdụ ọjọọ nke a n’ọgbakọ.—Levitikọs 19:16; Abụ Ọma 101:5; 1 Ndị Kọrint 5:11.
4. Gịnị ka ndị Kraịst nwere nghọta ma kwesị ntụkwasị obi na-eme banyere ihe ọmụma nzuzo?
4 N’adịghị ka ndị “obi amamihe kọrọ,” ndị nwere “nghọta” na-agba nkịtị mgbe o kwesịrị ekwesị ime otú ahụ. Ha adịghị akọsa izu nzuzo. (Ilu 20:19) Ịmara na okwu a gbahapụrụ ọnụ kwuo pụrụ imebi ihe, ndị nwere nghọta ‘na-ekwesị ntụkwasị obi ná mmụọ.’ Ha na-eguzosi ike n’ihe nye ndị kwere ekwe ibe ha, ha adịghịkwa ekpughe okwu nzuzo ndị pụrụ itinye ha n’ihe ize ndụ. Ọ bụrụ na ndị Kraịst nwere nghọta enweta ụdị ihe ọmụma nzuzo ọ bụla metụtara ọgbakọ, ha na-ezochi ya ruo mgbe nzukọ Jehova hụrụ na o kwesịrị ekwesị ime ka a mara ya site n’ụzọ nke ya nke mbipụta.
Nghọta na Àgwà Anyị
5. Olee otú ‘ndị nzuzu’ si ele ime ihe nzube ọjọọ anya, n’ihi gịnịkwa?
5 Ilu Bible na-enyere anyị aka iji nghọta eme ihe ma na-ezere àgwà na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, Ilu 10:23 na-asị: “Ọ dịrị onye nzuzu dị ka igwuri egwú, bụ́ ime ihe nzube ọjọọ: otú a ka amamihe dịkwaara onye nghọta.” Ndị ime ihe nzube ọjọọ dịrị “ka igwuri egwú” adịghị ahụ ịdị njọ nke ụzọ ha, na-agụpụkwa Chineke dị ka onye mmadụ nile na-aghaghị ịza ajụjụ. (Ndị Rom 14:12) ‘Ndị nzuzu’ dị otú ahụ na-arụ arụ n’echiche ha ruo n’ókè nke iche na Chineke adịghị ahụ ihe ọjọọ ha. Site n’àgwà ha, ha na-ekwu n’ụzọ ọzọ, sị: “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.” (Abụ Ọma 14:1-3; Aịsaịa 29:15, 16) N’abụghị ndị ụkpụrụ Chineke na-eduzi, ha enweghị nghọta, ha enweghịkwa ike ikpebi okwu n’ụzọ ziri ezi.—Ilu 28:5.
6. N’ihi gịnị ka ime ihe nzube ọjọọ ji bụrụ ihe nzuzu, oleekwa otú anyị ga-esi lee ya anya ma ọ bụrụ na anyị nwere nghọta?
6 “Onye nghọta” na-amata na ihe nzube ọjọọ abụghị “igwuri egwú,” ihe ntụrụndụ. Ọ maara na ọ na-ewute Chineke, nweekwa ike imebi mmekọrịta anyị n’ebe ọ nọ. Àgwà dị otú ahụ dị nzuzu n’ihi na ọ na-anapụ ndị mmadụ ùgwù onwe onye, na-ebibi alụmdi na nwunye, na-emebi ma uche ma ahụ, na-edujekwa n’enweghị ihe ime mmụọ. Ya mere ka anyị wezụga obi anyị inwe nghọta ma zere ihe nzube ọjọọ ma ọ bụ omume rụrụ arụ n’ụdị ọ bụla.—Ilu 5:1-23.
Nghọta na Mmụọ Anyị
7. Gịnị bụ ụfọdụ mmetụta iwe na-enwe n’anụ ahụ?
7 Iwezụga obi anyị inwe nghọta na-enyekwara anyị aka ịchịkwa mmụọ anyị. “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nwere ọtụtụ nghọta,” ka Ilu 14:29 na-ekwu, “ma onye nwere obi ọkụ na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ.” Otu ihe mere onye nwere nghọta ji agbalị izere iwe a na-achịkwaghị achịkwa bụ na ọ na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ anyị n’ụzọ anụ ahụ. Ọ pụrụ ime ka ọ̀tụ̀tụ̀ nke ọbara dị elu ma kpata nsogbu iku ume. Ndị dọkịta ezowo aka n’iwe na ọnụma dị ka mmetụta uche ndị na-eme ka nrịanrịa ndị dị ka asthma, ọrịa akpụkpọ ahụ, nsogbu mgbari nri, na ọnyá afọ ka njọ ma ọ bụ na-akpata ha.
8. Ịdị obi ọkụ pụrụ iduga na gịnị, ma olee otú nghọta pụrụ isi nyere anyị aka n’ọnọdụ a?
8 Ọ bụghị nanị iji zere imebi ahụ ike anyị mere anyị ji kwesị iji nghọta mee ihe, ‘gharakwa ịdị na-ewe iwe ọsọ ọsọ.’ Ịdị obi ọkụ pụrụ iduga n’omume nzuzu ndị anyị ga-akwa ụta ha. Nghọta na-eme ka anyị tụlee ihe pụrụ isi n’okwu a na-akwaghị ngá ma ọ bụ omume a na-echeghị eche wee si otú a na-echebe anyị pụọ ‘n’ibuli uche gbagọrọ agbagọ’ site n’ime ihe amamihe na-adịghị na ya. Nghọta na-enyere anyị aka karịsịa ịghọta na ọnụma pụrụ imebi usoro iche echiche anyị, nke na anyị apụghị iji mkpebi ziri ezi mee ihe. Nke a ga-emebi ikike anyị ime uche Chineke ma dị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. Ee, ịdaba n’iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-ebibi ihe n’ụzọ ime mmụọ. N’ezie, a gụnyekọrọ “ọnụma” n’etiti “ọrụ nile nke anụ ahụ” jọgburu onwe ha nke ga-egbochi anyị iketa Alaeze Chineke. (Ndị Galetia 5:19-21) Mgbe ahụ, dị ka ndị Kraịst nwere nghọta, ka anyị ‘na-anụ ihe ọsọ ọsọ, n’adịghị ngwa ikwu okwu, n’adịghị ngwa iwe iwe.’—Jemes 1:19.
9. Olee otú nghọta na ịhụnanya ụmụnna pụrụ isi nyere anyị aka idozi esemokwu?
9 Ọ bụrụ na iwe ewee anyị, nghọta nwere ike ịpụta na anyị kwesịrị ịgbachi nkịtị iji zere esemokwu. Ilu 17:27 na-asị: “Onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma: ọzọ, onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.” Nghọta na ịhụnanya ụmụnna ga-enyere anyị aka ịhụ mkpa nke ịchịkwa mkpali nke ikwu ihe na-akpasu iwe n’echeghị echiche. Ọ bụrụ na ntiwapụ nke iwe ewereworị ọnọdụ, ịhụnanya na ịdị umeala n’obi ga-akwali anyị ịrịọ mgbaghara ma dozie ihe. Ma gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ akpasuwo anyị iwe. Mgbe ahụ ka anyị gwa ya okwu nanị ya n’ụzọ dị nwayọọ ma dị obi umeala, na-enwekwa nzube bụ isi nke ịkwalite udo.—Matiu 5:23, 24; 18:15-17.
Nghọta na Ezinụlọ Anyị
10. Òkè dị aṅaa ka amamihe na nghọta na-ekere ná ndụ ezinụlọ?
10 Ọ dị ndị òtù ezinụlọ mkpa igosi amamihe na nghọta, n’ihi na àgwà ndị a ga-ewulite ezinụlọ. Ilu 24:3, 4 na-ekwu, sị: “Amamihe ka e ji ewu ụlọ; ọ bụkwa nghọta ka e ji eme ka o guzosie ike: sitekwa n’ihe ọmụma ka ime ụlọ ya nile na-ejupụta n’akụ̀ nile dị oké ọnụ ahịa dịkwa ụtọ.” Amamihe na nghọta dị ka blọkụ dị mma e ji ewu ndụ ezinụlọ na-aga nke ọma. Nghọta na-enyere nne na nna bụ́ ndị Kraịst aka ịdọpụta echiche na nchegbu nke ụmụ ha. Onye nwere nghọta na-enwe ike inwe nkwurịta okwu, ige ntị na ịghọta mmetụta na echiche nke onye òtù ọlụlụ ya.—Ilu 20:5.
11. Olee otú nwanyị a lụ alụ nke nwere nghọta si ‘ewu ụlọ ya’?
11 Ajụjụ adịghị ya na amamihe na nghọta dị oké mkpa maka ndụ ezinụlọ obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, Ilu 14:1 na-asị: “Nwanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya: ma nwanyị nke gbagọrọ agbagọ n’uche ya ji aka ya abụọ akwada ya.” Nwanyị a lụ alụ nke maara ihe ma nwee nghọta nke na-edo onwe ya n’okpuru di ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-arụsi ọrụ ike maka ọdịmma nke ezinụlọ, ọ ga-esikwa otú ahụ nye aka n’iwulite ezinụlọ ya. Otu ihe nke ‘ga-ewu ụlọ ya’ bụ na ọ na-ekwu ihe dị mma banyere di ya mgbe nile wee si otú a na-amụba nkwanye ùgwù ndị ọzọ nwere n’ebe di ya nọ. Nwanyị na-ejidekwa onwe ya nke ọma, nke nwere nghọta bụ́ onye na-atụ Jehova egwu nsọpụrụ na-ewetara onwe ya otuto.—Ilu 12:4; 31:28, 30.
Nghọta na Ụzọ Anyị ná Ndụ
12. Olee otú ndị “obi amamihe kọrọ” si ele nzuzu anya, n’ihi gịnịkwa?
12 Nghọta na-enyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’ihe omume anyị nile. E gosiri nke a n’Ilu 15:21, nke na-asị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụụrụ onye obi amamihe kọrọ ọṅụ: ma onye nghọta na-eme ka ije ije ya zie ezi.” Olee otú anyị ga-esi ghọta ilu a? Ụzọ gbagọrọ agbagọ, ma ọ bụ nke nzuzu, bụụrụ ndị ikom, ndị inyom, na ndị na-eto eto na-enweghị uche ihe ọṅụ. “Obi amamihe kọrọ” ha, ha enweghị ezi nzube, dịrịkwa nzuzu nke na ha na-aṅụrịrị uche gbagọrọ agbagọ ọṅụ.
13. Gịnị ka Solomọn ghọtara banyere ịchị ọchị na ihe na-adịghị mkpa?
13 Eze Solomọn nke Israel nwere nghọta mụtara na ihe na-adịghị mkpa abachaghị uru. O kwetara, sị: “Mụ onwe m sịrị n’obi m, Biko, bịa, m ga-eji ọṅụ nwaa gị; gị lekwasịkwa ezi ihe anya: ma lee, nke ahụ bụkwa ihe efu. Ekwuru m okwu banyere ịchị ọchị, sị, Ọ na-awị ara: m kwukwara okwu banyere ọṅụ, sị, Gịnịkwa ka ọ na-eme?” (Eklisiastis 2:1, 2) Dị ka nwoke nwere nghọta, Solomọn chọpụtara na aṅụrị na ịchị ọchị nanị adịghị eju afọ, n’ihi na ha adịghị arụpụta ezi obi ụtọ nke na-adịgide adịgide. Ịchị ọchị pụrụ inyere anyị aka ichefu nsogbu anyị ruo nwa oge, ma mgbe e mesịrị ha pụrụ ịpụtaghachi ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu. Solomọn nwere ike ikwu n’izi ezi banyere ịchị ọchị dị ka ‘ịwị ara.’ N’ihi gịnị? N’ihi na ịchị ọchị nzuzu na-ekpuchi mkpebi ziri ezi. Ọ pụrụ ime ka anyị leghara okwu ndị dị oké mkpa anya. A pụghị izo aka n’ụdị ịṅụrị ọṅụ nke e ji mara okwu na omume onye njakịrị dị ka nke na-arụpụta ihe bara uru. Ịghọta ihe ahụmahụ Solomọn nwere n’ịchị ọchị na aṅụrị pụtara na-enyere anyị aka izere ịbụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.”—2 Timoti 3:1, 4.
14. Olee otú onye nghọta si ‘eme ka ije ije ya zie ezi’?
14 Olee otú o si bụrụ na onye nghọta “na-eme ka ije ije ya zie ezi”? Nghọta ime mmụọ na itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ na-eduzi ndị mmadụ n’ụzọ ziri ezi, nke guzo n’agbagọghị agbagọ. Nsụgharị Byington na-ekwu n’ezoghị ọnụ, sị: “Nzuzu bụ obi ụtọ nye onye na-enweghị ụbụrụ, ma onye nwere ọgụgụ isi ga-aga n’ụzọ na-agbagọghị agbagọ.” “Onye nghọta” na-eme ka ụzọ ijeụkwụ ya guzozie, nweekwa ike ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ n’ihi itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ.—Ndị Hibru 5:14; 12:12, 13.
Legara Jehova Anya Mgbe Nile Maka Nghọta
15. Gịnị ka anyị na-amụta site n’Ilu 2:6-9?
15 Iji gbasoo ụzọ ziri ezi ná ndụ, ọ dị anyị nile mkpa ịnakwere ezughị okè anyị ma legara Jehova anya maka nghọta ime mmụọ. Ilu 2:6-9 na-ekwu, sị: “Jehova na-enye amamihe; n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na nghọta si apụta: Ọ na-ezobere ndị ziri ezi nzube ihe, ọ bụ ọta ndị na-eje ije n’izu okè nwere; iche okporo ụzọ nile nke ikpe, ọ bụkwa ụzọ ndị ebere Ya ka Ọ na-edebe. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ezi omume na ikpe, na izi ezi nile, ee, ezi ụzọ ọ bụla.”—Tụlee Jemes 4:6.
16. N’ihi gịnị ka e ji ghara inwe amamihe, nghọta, ma ọ bụ ndụmọdụ n’imegide ihu Jehova?
16 Ịnakwere ndabere anyị dabeere na Jehova, ka anyị jiri obi umeala ghọta uche ya site n’inyobami anya n’ime Okwu ya. O nwere amamihe n’echiche kasịnụ, ndụmọdụ ya bakwara uru mgbe nile. (Aịsaịa 40:13; Ndị Rom 11:34) N’ezie, ndụmọdụ ọ bụla na-emegide ya abaghị uru. Ilu 21:30 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị amamihe dị, ọ dịghịkwa nghọta dị, ọ dịghịkwa ndụmọdụ dị, ná ncherịta ihu Jehova.” (Tụlee Ilu 19:21.) Nanị nghọta ime mmụọ, nke a zụlitere site n’ịmụ Okwu Chineke site n’enyemaka mbipụta ndị e wepụtara site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ga-enyere anyị aka ịchụso ụzọ kwesịrị ekwesị ná ndụ. (Matiu 24:45-47) Ya mere ka anyị duzie ụzọ ndụ anyị ikwekọ na ndụmọdụ Jehova, na-amata na n’agbanyeghị otú ndụmọdụ dị iche si yie nke bara uru, ya na Okwu ya apụghị ịha nhata.
17. Gịnị pụrụ isi na ya pụta ma ọ bụrụ na e nye ndụmọdụ na-ezighị ezi?
17 Ndị Kraịst nwere nghọta ndị na-enye ndụmọdụ ghọtara na o kwesịrị ịdaberesi ike n’Okwu Chineke nakwa na a chọrọ ọmụmụ Bible na ntụgharị uche tupu ha azaa ajụjụ. (Ilu 15:28) Ọ bụrụ na a zara ajụjụ n’ụzọ na-ezighị ezi banyere ihe ndị dị oké mkpa, oké mmerụ ahụ pụrụ isi na ya pụta. N’ihi ya, ndị okenye bụ́ ndị Kraịst nwere mkpa nghọta, ha kwesịkwara ikpe ekpere maka nduzi Jehova mgbe ha na-agbalị inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka n’ụzọ ime mmụọ.
Jupụta ná Nghọta Ime Mmụọ
18. Ọ bụrụ na nsogbu ebilite n’ọgbakọ, olee otú nghọta pụrụ isi nyere anyị aka ijigide nguzozi ime mmụọ anyị?
18 Iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, “nghọta n’ihe nile” dị anyị mkpa. (2 Timoti 2:7) Ịmụsi Bible ike na ikwekọ ná nduzi nke mmụọ na nzukọ Chineke ga-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị ga-eme mgbe ọnọdụ ndị pụrụ iduba anyị n’ụzọ ọjọọ chere anyị ihu. Dị ka ihe atụ, were ya na e nwere ihe a na-emeghị otú anyị chere na e kwesịrị isi mee ya n’ọgbakọ. Nghọta ime mmụọ ga-enyere anyị aka ịhụ na nke a abụghị ihe mere anyị ga-eji kwụsị iso ndị Jehova na-akpakọrịta ma kwụsị ijere Chineke ozi. Cheedị echiche banyere ihe ùgwù anyị nwere ijere Jehova ozi, banyere nnwere onwe ime mmụọ anyị na-anụ ụtọ ya, banyere ọṅụ anyị pụrụ inweta site n’ozi anyị dị ka ndị mkpọsa Alaeze. Nghọta ime mmụọ na-eme ka anyị nweta echiche kwesịrị ekwesị na ịghọta na anyị raara onwe anyị nye Chineke, kwesịkwa ijiri mmekọrịta anyị na ya kpọrọ ihe, n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ na-eme. Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe anyị nwere ike ime n’ụzọ ọchịchị Chineke ịhụ banyere otu nsogbu, ọ dị anyị mkpa iji ndidi chere Jehova ka o dozie ọnọdụ ahụ. Kama ịkwụsị ma ọ bụ ịdaba n’obi nkoropụ, ka anyị “chere Chineke.”—Abụ Ọma 42:5, 11.
19. (a) Gịnị bụ isi ihe dị n’ekpere Pọl maka ndị Filipaị? (b) Olee otú nghọta pụrụ isi nyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe n’ụzọ zuru ezu?
19 Nghọta ime mmụọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke na ndị ya. Pọl gwara ndị Kraịst na Filipaị, sị: “Nke a ka m na-ekpekwa ekpere, ka ịhụnanya unu wee na-ababigakwa ókè karị nke ukwuu n’ime mmazu na nghọta nile; ka unu wee nwaa ihe ha na ibe ha dị iche; ka unu wee dị ọcha n’obi gharakwa ịsụ ngọngọ ruo ụbọchị nke Kraịst.” (Ndị Filipaị 1:9, 10) Iji na-eche echiche nke ọma, “mmazu na nghọta nile” dị anyị mkpa. Okwu Grik a sụgharịrị “nghọta” n’ebe a pụtara “nghọta omume nke dị nkọ.” Mgbe anyị mụtara ihe, anyị kwesịrị ịghọta njikọ o nwere n’ebe Chineke na Kraịst nọ na ịtụgharị uche n’ụzọ o si eme ka ụdị onye Jehova bụ na ndokwa ya pụta ìhè. Nke a na-akwalite nghọta anyị na ekele anyị maka ihe Jehova Chineke na Jisọs Kraịst mewooro anyị. Ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ihe n’ụzọ zuru ezu, nghọta ga-enyere anyị aka ịmata na anyị agaghị agbahapụ okwukwe anyị ma ọlị n’ihe nile dị mkpa anyị mụtaworo banyere Chineke, Kraịst, na nzube Chineke.
20. Olee otú anyị pụrụ isi jupụta ná nghọta ime mmụọ?
20 Anyị ga-ejupụta ná nghọta ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ka Okwu Chineke na echiche na omume anyị na-ekwekọ mgbe nile. (2 Ndị Kọrint 13:5) Ime nke a n’ụzọ imeziwanye ihe na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi, ghara ịdabere n’echiche onwe onye ma na-akatọ ndị ọzọ. Nghọta ga-enyere anyị aka irite uru site ná mgbazi olu ma na-ejide n’aka ihe ndị ka mkpa. (Ilu 3:7) Mgbe ahụ, n’inwe ọchịchọ nke ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, ka anyị na-achọ ịbụ ndị jupụtara n’ezi ihe ọmụma nke Okwu ya. Nke a ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ziri ezi na ihe ọjọọ, mata ihe dị mkpa n’ezie, ma jiri iguzosi ike n’ihe rapara ná mmekọrịta anyị dị oké ọnụ ahịa n’ebe Jehova nọ. Ihe a nile kwere omume ma ọ bụrụ na anyị ewezụga obi anyị inwe nghọta. Ma, e nwere ihe ọzọ dị mkpa. Anyị aghaghị ikwe ka nghọta chebe anyị.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji wezụga obi anyị inwe nghọta?
◻ Olee otú nghọta pụrụ isi metụta okwu na àgwà anyị?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka nghọta pụrụ inwe na mmụọ anyị?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji legara Jehova anya maka nghọta?
[Foto dị na peeji nke 13]
Nghọta na-enyere anyị aka ịchịkwa mmụọ anyị
[Foto dị na peeji nke 15]
Eze Solomọn nwere nghọta matara na ihe na-adịghị mkpa adịghị eju afọ n’ezie