Chịkwaa Mmụọ Gị!
‘OTU onyeọkà n’ịgwọ ọrịa uche achọpụtawo na ndị na-ewe iwe, ndị na-achọpụtakarị mmejọ, nwere okpukpu ise ihe ize ndụ nke ịnwụ tupu ha agbaruo 50 afọ karịa ndị dị jụụ, ndị na-atụkwasịkwa ndị ọzọ obi.’ Otú ahụ ka akwụkwọ akụkọ The New York Times nke January 17, 1989, kọrọ. Dr. Redford B. Williams, bụ onye prọfesọ na Duke University Medical Center nke dị na Durham, North Carolina, ‘dabeere n’ọtụtụ ihe ọmụmụ dị iche iche wee mee nchọpụta ya ahụ.’ Ma, akwụkwọ akụkọ Times ahụ kọrọ na ‘Ọ sịrị na obi ndị na-atụkwasị ndị ọzọ obi na-adị ogologo oge karị n’ihi na a na-echebe ha pụọ ná mmetụta ọjọọ nile nke usoro akwara ahụ ihe na-emetụtakarị ngwa ngwa.’
Iwe pụrụ ịmụbawanye ike ọbara ji asọgharị n’ahụ, kpata nsogbu nke iku ume, nweekwa mmetụta ọjọọ ndị ọzọ. Oké iwe pụrụ imebisị usoro iche echiche, ihe na-esi na ya apụta na-abụkarịkwa oge nke ịda mbà dị ukwuu nke echiche. Mmetụta iwe na-enwe n’ahụ ike ime mmụọ mmadụ dịkwa njọ. Ka a sịkwa ihe mere Bible ji kwuo, sị: ‘Ndụ nke anụ ahụ ka obi [nke dị nwayọọ, NW] bụ.’ (Ilu 14:30) Ee, ọ bụ ihe na-enye ezi ahụ ike ịchịkwa mmụọ gị. Ma rịba ama ihe ndị ọzọ mere a ga-eji mee otú ahụ.
Gbasoo Ụzọ nke Amamihe
Onye ọ bụla uche ya zuru okè ga-achọ ime ihe n’amamihe. Otu ụzọ a ga-esi mee nke a bụ site n’igosipụta njide onwe onye. N’ihe banyere nke a, Ilu 29:11 na-asị: ‘Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.’
N’ime Bible, okwu ahụ bụ ‘mmụọ’ na-ezokarị aka n’àgwà bụ isi nke na-akpali mmadụ ịgbaso otu ụzọ. ‘Onye nzuzu’ na-eme ka mmụọ ya nile pụta ìhè, n’ihi na o nweghị ike ịchịkwa ya. Ọ na-ekwe ka iwe ya tiwapụ n’echeghị echiche ọ bụla banyere ihe ndị ọ ga-arụpụta. Mmụọ nke dị n’ime onye nzuzu pụrụ ibu ụzọ mee ka o nwee ihu mgbarụ. Mgbe ahụ, mmụọ ya pụrụ igosipụta onwe ya n’okwu dị ike na n’ihe omume ndị bụ nke nzuzu.
Otú ọ dị, onye maara ihe ‘na-eme ka mmụọ ya dajụọ.’ Ọ na-achịkwa ya, jirikwa nlezianya na-enyocha ihe pụrụ ịdapụta ma ọ bụrụ na o nye iwe ohere. Ọbụna ma a sị na e nwere ezi ihe kpatara ọ ga-eji wee iwe, ọ na-aghọta na ya pụrụ imebi ihe ma ọ bụrụ na ya emee ihe ozugbo ahụ mgbe ọ ka nọ n’ọnọdụ uche ahụ nke a kpasuru iwe. Ya mere, ọ na-egosipụta njide onwe onye wee jighachi onwe ya azụ site n’igosipụta iwe ya n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya nke a na-akparaghị ókè. Ọ na-elegara Jehova anya maka enyemaka, ma eleghị anya na-ekpe ekpere dị ngwa n’ime obi ya. N’ikpeazụ, n’ịbụ maka ọdịmma nke mmadụ nile o metụtara, onye ahụ maara ihe na-enwe ike ime ka iwe ya dajụọ, wee tụgharịa uche n’ụzọ ezi uche dị na ya n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ nsọ nakwa n’uche Chineke. Ọzọkwa, onye maara ihe na-aghọta na ya ekwesịghị iburu iwe n’obi n’ihi na nke ahụ pụrụ ime ka ihe ghara ịdị na-emetụta ya n’ahụ o wee banye n’ụzọ ime ihe nke amamihe na-adịghị ya, malitekwa ime mmehie.
Onye maara ihe na-etinyekwa ndụmọdụ Pọl onyeozi n’ọrụ, nke bụ: ‘Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu: enyekwala Ekwensu ụzọ.’ (Ndị Efesọs 4:26, 27) Ọ bụrụ na ọ dị ihe merenụ nke kwesịrị ịkpasu gị iwe, anọgidela ná mkpasu iwe, na-ekwe ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ n’ọnọdụ ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na site n’ime otú ahụ, ị na-enye Ekwensu ohere iji gị mee ihe, ma eleghị anya na-akpali gị ime ihe dị njọ, meekwa ka ị ghara inweta nnwapụta Chineke. (Abụ Ọma 37:8, 9) Kama nke ahụ, chịkwaa mmụọ gị ma mee ihe ngwa ngwa iji dozie ihe isi ike ndị pụrụ ịkpaliworị iwe gị.—Matiu 18:15-17.
Nwee Mmụọ Dị Nwayọọ
Otu ilu ọzọ sịrị: ‘Onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma: ọzọ, onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.’ (Ilu 17:27) Onye nwere ihe ọmụma nke Okwu Chineke ‘na-egbochi okwu ọnụ ya,’ ọ naghị ekwekwa ka okwu ya na-aga aghara aghara, na-asọpụta ka mmiri, karịsịa mgbe e mere ya ihe mwute. N’ịbụ onye bu mmekọrịta ya na Jehova n’uche, nakwa ọnọdụ kwesịịrị ya ná nzukọ Chineke, ọ gaghị ekwe ka okpomọkụ nke iwe merie ya. Kama nke ahụ, ‘onye nghọta’ na-agbalị ịdị jụụ, bụrụkwa onye guzoziri eguzozi n’echiche ya. Ọ bụrụ na i nwee mmụọ dị otú ahụ, gị onwe gị pụkwara imeri ọnọdụ ndị ga-eduba onye nzuzu ná mmehie.
N’ụzọ kwekọrọ na nke a, anyị na-agụ, sị: ‘Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ nwere ọtụtụ nghọta: ma onye nwere obi ọkụ na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ.’ (Ilu 14:29) Enweghị ndidi mgbe a kpaliri mmetụta pụrụ iduje n’ime ihe nzuzu. Lee nnọọ ka o si dị mma karị ịtụle ihe okwu ma ọ bụ àgwà a na-achịkwaghị achịkwa pụrụ ịrụpụta! Ma ọ bụghị otú ahụ, mmadụ pụrụ ime ihe n’enweghị ndidi ma mee ihe amamihe na-adịghị na ya, wee si otú a ‘na-ebuli uche gbagọrọ agbagọ.’ Ya mere, bụrụ ‘onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,’ dị ka Chineke bụ, ị ga-ezerekwa omume nke enweghị ndidi na ndị amamihe na-adịghị na ha.—Ọpụpụ 34:6.
Zere Mpako
N’ihi mpako, mmadụ pụrụ ịkwụsị ịdị na-echebara ndị ọzọ echiche, ọbụna na-abụ onye a kpasuru iwe ọsọ ọsọ. Ya mere, anyị na-agụ, sị: ‘Onye iwe na-akpali iseokwu, ọzọ, onye na-enwe ọnụma hie nne na-ejehie hie nne.’ (Ilu 29:22) Ọ bụrụ na mmadụ adịghị achịkwa mmụọ ya, ma bụrụ ‘onye iwe,’ ọ pụrụ ‘ịkpali iseokwu,’ ọbụna n’etiti ndị enyi. Mmadụ nke ‘na-enwe ọnụma hie nne na-ejehie [kwa] hie nne.’ Ee, ọ ghaghị ime mmehie—bụ́ ihe onye maara ihe nke na-atụkwa egwu Chineke ga-achọ izere.
Echefukwala na Jehova adịghị ele mpako na iji nganga na-egosipụta iwe anya ọma. (Ilu 16:18) Ọ dị mma karịa ịchọ enyemaka Chineke iji nagide ọnwụnwa, meekwa ihe n’obi dị umeala kama ikwe ka iwe mpako ma ọ bụ ọnụma rikpuo mmadụ.—Ilu 29:23.
Mee Ihe n’Ịdị Nwayọọ
Ọ dị mkpa igosi obi umeala ma ọ bụrụ na onye nọ n’ọkwá dị elu abaara gị mba. N’oge dị otú ahụ, gịnị pụrụ ịbụ mkpali mbụ ị ga-enwe? Ma eleghị anya ọ bụ ịzaghachi site n’okwu dị oké ngwa nke a na-echebaraghị ezi echiche. Ma Bible nyere ndụmọdụ, sị: ‘Ọ bụrụ na mmụọ nke onye na-achị achị ebilie imegide gị, ahapụla ọnọdụ gị; n’ihi na ime nwayọọ na-eme ka mmehie ukwu dị iche iche kwụsị.’ (Eklisiastis 10:4) Lee nnọọ ka o si bụrụ ihe amamihe karị iji olu dị nwayọọ zaghachi! N’eziokwu, ‘ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.’ (Ilu 15:1) Ọ chọrọ njide onwe onye iji zaghachi n’ụzọ dị nwayọọ, ma ụzọ amamihe nke a na-edozi nsogbu, na-akwalitekwa mmekọrịta nke udo.
Ọ bụrụ na a baara gị mba n’adịghị ihe ọjọọ ọ bụla i mere, anyị na-enwe olileanya na onye ahụ nọ n’ọkwá ga-enye gị ohere ịkọwa ihe merenụ. Otú ọ dị, e kwesịrị iji mmụọ dị nwayọọ nye nkọwa ọ bụla dị mkpa, na-enwe olileanya na a ga-edozi echiche ọ bụla na-ezighị ezi e nwere. Ọ ga-adị mkpa ka onye ahụ nọ n’ọkwá chịkwaa mmụọ nke ya iji wee nụrụ nkọwa dị otú ahụ, nke a ga-egosikwa na o nwere amamihe na ike.
Ma onye Kraịst ọ̀ nọ n’ọkwá dị elu ma ọ bụ na ọ nọghị, o kwesịrị icheta na ‘obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bula nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.’ (Ilu 25:28) Onye na-enweghị mmụọ dị nwayọọ nke na-adịghị achịkwa mmụọ ya nọ n’ihe ize ndụ nye mwabata nke echiche ndị na-ezighị ezi ndị pụrụ ịkpali ya ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Jisọs Kraịst, bụ́ onye setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè bụ ‘onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi.’ (Matiu 11:29) Karịsịa, ịdị nwayọọ bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke, nke ndị Kraịst kwesịrị ikpe ekpere maka ya.—Luk 11:13; Ndị Galetia 5:22, 23.
N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Mmụọ Gị?
Okwu ndị dị nwayọọ na-adị anyị mma, ma ọtụtụ mgbe anyị adịghị amata ihe kpalitere oké ntiwapụ nke iwe. Ee, mmadụ nke na-adịghị agbaso ezi ụkpụrụ pụrụ ọbụna inwe ihe ịga nke ọma n’ikpuchi iwe ya na mkpebi o meworo imegwara onye ọzọ ihe maka ihe e mere ya n’ezie ma ọ bụ nke o chere na e mere ya! N’ụzọ ihu abụọ, ọ pụrụ ịnọ na-echere mgbe ohere ga-adapụtara ya iji kwuo ihe na-emerụ ahụ banyere onye ahụ o wuliteworo ịkpọasị n’ebe ọ nọ. O doro anya na onye Kraịst ekwesịghị ikwe ka mmụọ dị otú ahụ wulite n’ime onwe ya, n’ihi na Jọn onyeozi dere, sị: ‘Onye na-akpọ nwanna ya asị nọ n’ọchịchịrị ahụ, na-ejegharịkwa n’ime ọchịchịrị ahụ, ọ mataghịkwa ebe ọ na-aga, n’ihi na ọchịchịrị ahụ mere ka anya ya kpuo ìsì.’ Jọn kwukwara, sị: ‘Onye ọ bụla nke na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ: unu matakwara na ọ dịghị ogbu mmadụ ọ bụla nwere ndụ ebighị ebi na-adịgide n’ime ya.’—1 Jọn 2:11; 3:15.
Ọ bụrụ na mpako, ihu abụọ, ma ọ bụ àgwà asọpụrụghị Chineke ndị ọzọ abụrụ nke e kpuchiri, ihe mkpuchi dị otú ahụ adịghị aghọgbu Chineke. Ọbụna ime nzọrọ n’olu dara ụda ma ọ bụ ime ngosipụta nke ezi omume onwe onye apụghị ikpuchi ihe dị n’ime obi n’anya Chineke. Ilu 16:2 na-asị: ‘Ụzọ nile nke onye ọ bụla dị ọcha n’anya ya: ma onye na-atụzi mmụọ nile nke mmadụ ka Jehova bụ.’ A naghị aghọgbu Chineke aghọgbu.
Ya mere, maka ọdịmma nke gị onwe gị nakwa maka ihe dị n’Akwụkwọ nsọ, bụ́ ndị anyị tụleworo, dịrị ka Jisọs na ndị ọzọ ndị nwere amamihe, bụ́ ndị zereworo mpako ma mee ihe n’ịdị nwayọọ. Mee ihe nile ị pụrụ ime iji chịkwaa mmụọ gị!