Jụ Echiche Efu Nile nke Ụwa, Chụsoo Ịdị Adị Nile nke Alaeze
“Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—MATIU 6:33.
1. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Okwu Chineke na-enye banyere obi ihe atụ, oleekwa otu n’ime ụzọ ndị bụ isi o si eduhie anyị?
“KARỊA ihe ndebe gị nile chebe obi gị; n’ihi na site na ya ka mpụta nile nke ndụ dị.” (Ilu 4:23) N’ihi gịnị ka o ji dịrị mkpa onye amamihe bụ́ Eze Solomọn inye ịdọ aka ná ntị nke a? N’ihi na “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) Otu n’ime ụzọ ndị bụ isi obi ihe atụ anyị pụrụ isi duhie anyị bụ site n’ime ka anyị nọgide na-eche echiche efu nile nke ụwa. Ma gịnị bụ echiche efu nile? Ọ bụ echiche dị iche iche nke ihe na-adịghị adị, ịrọ nrọ ehihie, uche ịdị na-awagharị n’ihe n’abaghị n’ihe. Mgbe nrọ ehihie ndị a ghọrọ echiche efu nke ụwa, ọ bụghị nanị na ha bụ ihe ịtụfu oge nkịtị kama ha bụkwa ihe na-emerụ ahụ nke ukwuu. N’ihi ya, anyị aghaghị ịjụ ha kpam kpam. N’ezie, ọ bụrụ na anyị kpọrọ mmebi iwu asị dị ka Jisọs kpọrọ ya, anyị ga-eche obi anyị nche megide ịdị na-eche echiche efu nile nke ụwa.—Ndị Hibru 1:8, 9.
2. Gịnị bụ echiche efu nile nke ụwa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka anyị kwesịrị ịjụ ha?
2 Ma gịnị bụ echiche efu nile nke ụwa? Ha bụ echiche efu nile nke e ji mara ụwa nke a nke na-atọgbọ n’ike Setan. Banyere ya, Jọn onyeozi dere, sị: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjoọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi [“ngosipụta efu nke ihe mmadụ nwere,” NW], esiteghị na Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.” (1 Jọn 2:16; 5:19) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị ịjụ echiche efu nile nke ụwa? N’ihi na echiche efu nile dị otú ahụ na-akpali echiche ọchịchọ onwe onye n’uche na n’obi. Ịrọ nrọ ehihie banyere ime ihe ọjọọ pụrụ ịbụ iji uche na-amụgharị ihe mmadụ ga-eme eme n’ezie. Jemes, onye na-eso ụzọ dọrọ anyị aka ná ntị sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụwooro ime, o wee mụpụta mmehie: mmehie ahụ, mgbe o tozuru okè, o wee mụpụta ọnwụ.”—Jemes 1:14, 15.
Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị
3. Ọnọdụ nke ònye na-enye ihe ịdọ aka ná ntị mbụ nke ihe mmerụ ahụ dị n’echiche efu nile nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị?
3 Ka anyị tụlee ihe atụ ndị na-egosi ihe mere na a ghaghị ịjụ echiche efu nile nke ụwa. Ọnọdụ nke Setan Ekwensu na-enye ihe atụ nke mbụ nke ihe mmerụ ahụ iche echiche efu nke ọdịmma onwe onye nanị pụrụ ịrụpụta. O nyere ohere ka echiche nke ọdịmkpa onwe onye bilite n’obi ya ruo n’ókè nke na o nwere anyaukwu maka ọkwá pụrụ iche nke Jehova dị ka Ọkaaka Eluigwe na Ala, wee chọọ ka e fee ya ofufe. (Luk 4:5-8) Ọ̀ bụghị echiche efu nke ihe na-adịghị adị? Ọ bụ ya n’ezie! A ga-anwapụta nke ahụ gabiga ajụjụ ọ bụla mgbe e kere Setan agbụ ruo otu puku afọ, karịsịakwa mgbe a tụbara ya n’ime “ọdọ ọkụ” ahụ, bụ́ ọnwụ nke abụọ ahụ.—Mkpughe 20:1-3, 10.
4. Olee otú Setan si duhie Iv?
4 Anyị nwere ihe atụ ịdọ aka ná ntị ọzọ n’ihe banyere ọnọdụ nke nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv. Ná mgbalị Setan imezu ọchịchọ ya, ọ ghọgburu Iv site n’itinye n’uche ya echiche efu ahụ nke bụ na ọ bụrụ na o rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, na ọ gaghị anwụ ọnwụ kama na ọ ga-adị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ. Echiche efu ahụ ọ̀ bụ nke ihe na-adịghị adị, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị? N’ezie ọ bụ, dị ka anyị pụrụ ịhụ site n’ọmụma ikpe nke Jehova mara Iv na di ya, bụ Adam, mgbe ọ gbara ha ajụjụ ma maa ha ikpe. Dị ka ihe si n’ime ya pụta, ha tụfuru ohere nke ibi ndụ n’ime Paradaịs maka onwe ha na maka ụmụ ha nile na-ezughị okè.—Jenesis 3:1-19; Ndị Rom 5:12.
5. Gịnị kpatara ọdịda nke ụfọdụ ụmụ Chineke bụ ndị mmụọ ozi, gịnịkwa ka ọ rụpụtaara ha?
5 Anyị nwekwara ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke ụfọdụ ndị ikom Chineke bụ́ ndị mmụọ ozi. (Jenesis 6:1-4) Kama ịbụ ndị ngọzi dị iche iche ha na-enweta n’eluigwe n’ihu Jehova juru afọ, ha chere echiche efu banyere ndị inyom nọ n’elu ala na otu ọ ga-esi tọọ ụtọ iso ha nwee mmekọahụ. N’ihi ịrụ ọrụ n’echiche efu ndị a, a tụbawo ndị mmụọ ozi ndị ahụ nupụrụ isi ugbu a n’ime ọchịchịrị ime mmụọ nke Tatarọs, na-eche mbibi ha n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ nke Jisọs Kraịst.—2 Pita 2:4, NW; Jude 6; Mkpughe 20:10.
Jụ Echiche Efu Nile nke Ụwa
6, 7. N’ihi gịnị ka echiche efu nile nke ụwa banyere ihe onwunwe a na-ahụ anya ji bụrụ ihe na-emerụ ahụ na ihe na-eduhie eduhie?
6 Ka anyị tụlee ugbu a otu n’ime echiche efu nile a kasị nwee ebe nile na nke kasị dịrị ize ndụ, nke Setan na-akwalite. Site n’ụdị mgbasa ozi ọ bụla, a na-anwa anyị iche echiche efu nile nke ụwa. Ihe na-akpatakarị ihe ndị a bụ ọchịchọ ịba ọgaranya. N’onwe ya, ọ dịghị ihe dị njọ n’inwe akụ̀. Abraham, Job, na Eze Devid, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke bara ọgaranya nke ukwuu, ma ha enweghị oké ọchịchọ maka ịba ụba nke ihe onwunwe. Iche echiche efu nile nke ihe onwunwe kpaliri ụmụ mmadụ ịrụgbu onwe ha n’ọrụ ruo ọtụtụ afọ iji nweta akụ̀. Echiche efu ndị dị otú ahụ na-akpalikwa ha itinye aka n’ụdị nile nke ịgba chaa chaa, dị ka iji ọsọ ịnyịnya eti ébé na ịzụta tiketi lọtrị. Ka anyị ghara inwe echiche ụgha ọ bụla banyere akụ̀. Ọ bụrụ na anyị echee na ịba ụba nke ihe onwunwe ga-eme ka anyị nọrọ ná ntụkwasị obi, tụlee ilu nke a na-ekwu ihe mere eme: “Akụ̀ adịghị aba uru n’ụbọchị nke nrubiga ókè nke iwe: ma ezi omume na-anapụta n’ọnwụ.” (Ilu 11:4) N’ezie, ihe onwunwe a na-ahụ anya agaghị aba uru n’ịlanarị “mkpagbu ukwu” ahụ.—Matiu 24:21; Mkpughe 7:9, 14.
7 Ihe onwunwe a na-ahụ anya pụrụ iduhie anyị n’ụzọ dị mfe. Ọ bụ n’ihi nke ahụ mere e ji gwa anyị, sị: “Akụ̀ ọgaranya bụ obodo ya siri ike, ọ dịkwa ka mgbidi dị elu n’ime ntụgharị obi ya nile.” (Ilu 18:11) Ee, nanị “n’ime ntụgharị obi ya nile,” n’ihi na akụ̀ a na-ahụ anya na-enye nchebe dị nta n’oge oké ọnụ ahịa ịrị elu, ndakpọ akụ na ụba, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ ọrịa na-adịghị ala ala. Jisọs Kraịst dọrọ aka ná ntị megide ihe nzuzu dị n’ịtụkwasị ihe onwunwe a na-ahụ anya obi. (Luk 12:13-21) Anyị nwekwara okwu ịdọ aka ná ntị Pọl onyeozi: “N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:10.
8. Ruo ókè ha aṅaa ka echiche efu nile nke ụwa n’ihe banyere mmekọahụ bara ụba, ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka ndị a na-eche mmadụ n’ihu?
8 Echiche efu ndị ọzọ nile na-emetụta mmekọahụ rụrụ arụ. Ókè ọdịdị mmadụ na-ezughị okè na-enwe mmasị ịdịgide n’echiche efu nile ka a pụrụ ịhụ site ná njupụta nke okwu rere ure a na-enweta ugbu a site n’ịkpọtụ nọmba telifon ụfọdụ na ịṅa ntị n’ozi ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Na United States, ije ozi dị iche iche e ji telifonu eje, bụ́ ndị na-akpali agụụ mmekọahụ bụ ugbu a azụmahịa na-enye ọtutụ ijeri dollar. Ọ bụrụ na anyị ga-ekwe ka uche anyị dịgide ná mmekọahụ rụrụ arụ, ọ̀ bụ na anyị agaghị abụ ndị ihu abụọ, na-adị nanị ka ndị Kraịst dị ọcha n’elu? Ọ̀ bụ na enweghịkwa ihe ize ndụ nke na ụdị echiche efu nile dị otú ahụ pụrụ iduga ná mmekọahụ rụrụ arụ? Nke a emewo, ọ rụpụtawokwa n’ụfọdụ ịbụ ndị a chụpụrụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst n’ihi ịkwa iko nke ndị na-alụghị di na nwunye ma ọ bụ nke ndị lụrụ di na nwunye. N’iburu n’uche okwu Jisọs dị na Matiu 5:27, 28, ọ̀ bụ na ndị nile na-anọgide n’ụdị echiche efu nile dị otú ahụ enweghị ikpe ọmụma nke ikwa iko nke ndị lụrụ dị na nwunye n’obi ha?
9. Ndụmọdụ ọma ndị dị aṅaa ka Akwụkwọ nsọ nwere iji dọọ anyị aka ná ntị megide echiche efu nile nke ụwa?
9 Iji mee ihe megidere ọchịchọ nke obi anyị na-emehie emehie itinye aka n’ụdị echiche efu nile dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka anyị buru n’uche ịdọ aka ná ntị Pọl: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” (Ndị Hibru 4:13) N’oge nile, anyị ga-achọ ịdị ka Mosis, onye “nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ onye ahụ nke a na-apụghị ịhụ ya anya.” (Ndị Hibru 11:27) Ee, anyị aghaghị ịnọgide na-agwa onwe anyị na echiche efu nile nke ụwa adịghị atọ Jehova ụtọ, ọ pụkwara nanị ịrụpụta mmerụ ahụ nye onwe anyị. Anyị aghaghị ịdị na-echegbu onwe anyị banyere ịzụlite mkpụrụ nile nke mmụọ nsọ Chineke, karịsịa njide onwe onye, n’ihi na anyị apụghị ịgbanarị eziokwu ahụ bụ na ọ bụrụ na anyị aghaa mkpụrụ nye anụ ahụ, anyị ga-ewe mmebi site n’anụ ahụ dị ka ihe ubi.—Ndị Galetia 5:22, 23; 6:7, 8.
Ịdị Adị Nile nke Alaeze
10, 11. (a) Eziokwu ndị dị aṅaa na-akwado ịdị adị nke Onye Okike? (b) Olee ihe nnwapụta e nwere na Bible bụ n’ezie Okwu Chineke? (c) Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere maka ịdị adị nke Eze nke Alaeze Chineke?
10 Ụzọ kasị mma e si ajụ echiche efu nile nke ụwa bụ site n’ịnọgide na-achụso ịdị adị nile nke Alaeze. Ịdị adị nile nke Alaeze bụ́ nke Chineke na-ewepụta dị nnọọ iche n’ebe echiche efu nile nke ụwa dị. Chineke ọ̀ dị adị n’ezie? E nweghị ajụjụ ọ bụla banyere ịdị adị ya. Ihe okike anya na-ahụ na-agbara eziokwu ahụ àmà. (Ndị Rom 1:20) A na-echetara anyị ihe e kwuru n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga n’akwụkwọ bụ́ The Divine Plan of the Ages, nke Watch Tower Society bipụtara. O kwuru, sị: “Onye ahụ nke pụrụ iji ígwè e ji ahụ ihe dị anya bụ́ telescope leba anya ná mbara ígwè, ma ọ bụ jiri nanị anya nkịtị ya, wee hụ n’ebe ahụ ịdị ukwuu nke okike, ọdịdị ya, ịma mma ya, ịdị n’usoro, nkwekọ na ọdịdị dị iche iche, ma n’agbanyeghị nke a na-arụ ụka na Onye Okike nke ihe ndị a karịrị ya ukwuu n’amamihe na n’ike, ma ọ bụ onye pụrụ iche na nwa oge na ụdị ịdị n’usoro dị otú a bịara ná mberede, n’enweghị Onye Okike, atụfuwo n’ụzọ dị ukwuu otú a ma ọ bụ elegharawo ike ịtụgharị uche anya nke na a ga-ezi ezi ile ya anya dị ka ihe Bible kpọrọ ya, onye nzuzu (onye na-eleghara ntụgharị uche anya ma ọ bụ onye na-enweghị echiche).”—Abụ Ọma 14:1.
11 Anyị na-amụta ihe nile banyere Alaeze ahụ n’ime Bible Nsọ. Bible, ọ̀ bụ n’ezie Okwu Chineke e dere ede? Ọ bụ ya n’ezie, dị ka a pụrụ ịhụ site na nkwekọ ya, izi ezi ya n’ihe banyere sayensị, na ike o nwere ịgbanwe ndụ ndị mmadụ na karịsịa site ná mmezu ya nke amụma dị iche iche.a Gịnị banyere Eze nke Alaeze Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst? Ọ̀ dịrị adị n’ezie? Ihe ndekọ nke Oziọma ndị ahụ na akwụkwọ ozi ndị ahụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke e ji mmụọ nsọ Chineke kpalie odide ha na-agba àmà n’ụzọ a na-apụghị ịrụ ụka na n’ụzọ dara ụda na Jisọs Kraịst bụ onye dịrị adị n’akụkọ ihe mere eme. Banyere ịdị adị Jisọs n’akụkọ ihe mere eme, e nwekwara ihe àmà nke akwụkwọ Talmud nke ndị Juu, bụ́ nke na-ezo ya aka dị ka onye. Otú a ka ọ dịkwa ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ ndị Juu na ndị Rom nke narị afọ mbụ O.A.
12, 13. Eziokwu ndị dị aṅaa na-agba àmà ịdị adị nke Alaeze Chineke?
12 Gịnị banyere ịdị adị nke Alaeze ahụ n’onwe ya? Krisendọm na-eleghara ya anya n’ụzọ dị ukwuu, dị ka mkpesa nke onye òtù a ma ama nke chọọchị Presbyterian na-egosi: “N’ezie, o ruwo ihe karịrị iri afọ atọ kemgbe m geworo onye ụkọchukwu ntị ka ọ na-anwa ịkọwara ndị ya ịdị adị nke Alaeze ahụ.” Ma, ido aha Jehova nsọ site n’Alaeze ahụ bụ isiokwu nke Okwu Chineke. Chineke n’onwe ya kwere nkwa mbụ maka Alaeze, na-asị: “Iro ka ma ga-etinyekwa n’etiti gị na nwanyị ahụ, na n’etiti mkpụru gị na mkpụrụ ya: mkpụrụ ahụ ga-echifịa gị n’isi, gị onwe gị ga-echifịa ya n’ikiri ụkwụ.” (Jenesis 3:15) Alaeze ahụ bụ ihe mba Israel sere onyinyo ya, karịsịa n’oge ọchịchị nke Eze Solomọn. (Abụ Ọma 72) Ọzọkwa, Alaeze ahụ bụ isiokwu nke nkwusa Jisọs. (Matiu 4:17) O mere ka ọ pụta n’ilu ya dị iche iche, dị ka ndị ahụ dị na Matiu isi 13. Jisọs gwara anyị ka anyị kpee ekpere maka Alaeze ahụ ma nọgide buru ụzọ na-achọ ya. (Matiu 6:9, 10, 33) N’ezie, a kpọtụrụ Alaeze Chineke aha ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 150 ugbo n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.
13 Alaeze ahụ bụ ọchịchị dị adị, nke nwere ike na ịchịisi, ọ ga-emezukwa ezi ihe nile a tụrụ anya ha. O nwere usoro iwu, bụ́ ndị a na-achọta na Bible. Alaeze ahụ emeworị ka ọtụtụ ihe dịrị adị. O nwere ndị na-eguzosi ike n’ihe nọ n’okpuru ya—ihe karịrị 4,000,000 Ndịàmà nke Jehova. Na 211 ala dị iche iche ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, ná mmezu nke Matiu 24:14. N’afọ ije ozi ha nke 1991, ha tinyere 951,870,021 hour n’ikwusa ozi Alaeze ahụ. Ọrụ nke a na-arụpụta ihe ndị a hụrụ anya na-adịgide adịgide ka ọtụtụ ìgwè mmadụ na-amụ ‘asụsụ dị ọcha’ nke eziokwu Bible.—Zefanaịa 3:9.
Ịchụso Ịdị Adị Nile nke Alaeze
14. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka nghọta anyị maka ịdị adị nke Alaeze ahụ sikwuo ike?
14 Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi chụsoo ịdị adị nile nke Alaeze? Olileanya anyị aghaghị ịbụ nke e wusiri ike n’ihe ido anya siri ike. Ụwa ọhụrụ nke Chineke kwere ná nkwa aghaghị ịbụ ihe dị adị nye anyị. (2 Pita 3:13) Anyị aghaghịkwa inwe okwukwe ná nkwa ahụ nke bụ na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na nke a abụghị iche echiche efu? Ọ bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-eme mgbe oge Chineke ruru, n’ihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme bụ́ ya ịgha ụgha. (Taịtọs 1:1, 2; Ndị Hibru 6:18) Ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche ná nkwa ndị ahụ. Iji uche anyị na-ahụ onwe anyị n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke na ịma ụtọ ngọzi ya dị iche iche abụghị echiche efu na-adịghị adị, kama ọ na-enye ihe àmà nke okwukwe. Dị ka Pọl kọwara ya, “okwukwe bụ ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) Ka anyị mee ka okwukwe anyị sie ike site n’iji Okwu Chineke na akwụkwọ dị iche iche nke ndị Kraịst na-azụ onwe anyị, bụ́ ndị na-enyere anyị aka ịghọta na itinye ya n’ọrụ. Otú anyị na-etinye oge kakwa ukwuu n’ịgwa ndị ọzọ banyere Alaeze ahụ, n’ụlọ n’ụlọ na ná mberede, otú ahụ ka anyị ga-eme ka okwukwe anyị sie ike karị ma mee ka olileanya anyị dị ọhụrụ n’ime ya.
15. Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere banyere ije ozi nke ndị Kraịst?
15 Ọ dịkwa anyị mkpa ịrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ n’ịdị adị nile nke Alaeze site n’ime ka ọdịdị ije ozi anyị dịkwuo mma. Ebe a ka nwere ihe dị ukwuu ime, olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? (Matiu 9:37, 38) Okwu ahụ bụ eziokwu na ọ dịghị onye meworo okenye nke ukwuu na ọ pụghị ịmụ ihe. N’agbanyeghị afọ ole anyị nọworo na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ, anyị pụrụ ime ka ọ dịkwuo mma. Site n’ịdịkwu irè n’iji Okwu Chineke na-eme ihe, anyị na-anọ n’ọnọdụ ka mma inwe ike inyere ndị ọzọ aka ịnụ oku nke Eze ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. (Tụlee Jọn 10:16.) Mgbe anyị tụlere na ọ metụtara ọdịnihu ebighị ebi nke ndị mmadụ, anyị kwesịrị ịchọ ịrụzu ókèala anyị ọrụ nke ọma iji nye ha ọhere ọtụtụ mgbe igosipụta ebe ha kwụ, dị ka “atụrụ” ma ọ bụ “ụmụ ewu.” (Matiu 25:31-46) N’ezie, nke ahụ pụtara inwe ihe ndekọ e ji nlezianya dee nke ndị ahụ na-anọghị n’ụlọ na karịsịa nke ndị nwere mmasị n’ozi Alaeze ahụ.
Nọgide Na-achụso Alaeze Ahụ
16. Olee ndị setịpụworo ezi ihe nlereanya n’ịchụso ịdị adị nile nke Alaeze, oleekwa otú ha si “na-enweta” Alaeze ahụ?
16 A chọrọ ezi mgbalị iji nọgide na-achụso ịdị adị nile nke Alaeze. Ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi nke ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ ọ̀ naghị agba anyị ume? Ha anọwo na-achụso ịdị adị nke Alaeze ruo ọtụtụ iri afọ. A kọwara nchụso nke a n’okwu Jisọs: “Site n’oge Jọn Onye Na-eme Baptism ruo ugbu a alaeze eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ndị mmadụ na-achụso, ndị ahụkwa na-achụso ya na-aga n’ihu na-enweta ya.” (Matiu 11:12, NW) N’ebe a, echiche dị na ya abụghị nke ndị iro inweta Alaeze ahụ. Kama, nke a na-emetụta ọrụ nke ndị ahụ gaje ịba n’Alaeze ahụ. Otu onye ọkà mmụta Bible sịrị: “N’ụzọ dị otú a ka a kọwara ndọlị na mgbalịsi ike e ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme, nke a na-apụghị iguzogide eguzogide, ịchụso alaeze Mesaịa ahụ na-abịanụ.” Ndị ahụ e tere mmanụ ahapụbeghị ime mgbalị n’ime Alaeze ahụ nke ha. A chọrọ mgbalị siri ike yiri nke ahụ n’aka “atụrụ ọzọ” ahụ ka ha wee ruo eruo dị ka ndị nọ n’elu ala nke Alaeze eluigwe nke Chineke ga-achị.—Jọn 10:16.
17. Gịnị ga-abụ òkè nke ndị ahụ na-achụso echiche efu nile nke ụwa?
17 N’ezie, anyị na-ebi n’oge pụrụ iche nke e nwere ohere. Ndị ahụ na-achụso echiche efu nile nke ụwa ga-eteta n’ụra otu ụbọchị ịhụ ịdị adị nke na-egbu mgbu. A kọwara nke ọma ihe ga-abụ òkè ha n’okwu ndị a: “Ọ ga-adịkwa ka mgbe onye agụụ na-agụ na-arọ nrọ, ma, lee, ọ na-eri ihe; o wee teta, ma mkpụrụ obi ya gbaara aka: ma ọ bụ dị ka mgbe onye akpịrị na-akpọ nkụ na-arọ nrọ, ma lee, ọ na-aṅụ mmiri; o wee teta, ma lee, ọ dawo mbà, mkpụrụ obi ya na-achọsikwa ihe ike.” (Aịsaịa 29:8) N’ụzọ doro anya, echiche efu nile nke ụwa agaghị eme mgbe ọ bụla ka onye ọ bụla nwee afọ ojuju na obi ụtọ.
18. N’iburu n’uche ịdị adị nke Alaeze ahụ, ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịgbaso, na-eburu olileanya dị aṅaa n’uche?
18 Alaeze Jehova bụ ihe dị adị. Ọ na-achịsi ike, ebe ajọ usoro ihe dị iche iche nke a na-eche mbibi dị nso nke na-adịgide adịgide ihu. Ya mere, jiri ndụmọdụ Pọl mee ihe: “Ka anyị ghara ịrahụ ụra, dị ka ndị fọdụrụ, kama ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:6) Ka anyị tụkwasị obi na uche anyị n’ịdị adị dị iche iche nke Alaeze ma si otú a nweta ngọzi ebighị ebi dị iche iche. Ka ọ bụrụkwa òkè anyị ịnụ ka Eze nke Alaeze ahụ na-asị anyị: “Bịanụ ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.”—Matiu 25:34.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị bụ echiche efu nile nke ụwa, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji jụ ha?
◻ Ihe atụ ndị dị aṅaa na-egosi nzuzu dị n’iche echiche efu nile nke ụwa?
◻ Eziokwu ndị dị aṅaa na-anwapụta ịdị adị nke Onye Okike, Okwu ya e dere ede, Jisọs Kraịst, na Alaeze ahụ?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi mee ka okwukwe anyị n’ebe ịdị adị nile nke Alaeze ahụ nọ siwanye ike?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ihe na-akpatakarị echiche efu nke ụwa bụ oké ọchịchọ maka ihe onwunwe a na-ahụ anya
[Foto dị na peeji nke 16]
Ikwusa ozi ọma bụ otu ụzọ e si achụso ịdị adị nile nke Alaeze
[Foto dị na peeji nke 17]
Ị̀ na-achụso ịdị adị nile nke Alaeze site n’ịdị uchu n’ịmụ Okwu Chineke?