Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Olee Otú M Pụrụ Isi Nagide Ịrịasi Ọrịa Ike?
JASON dị nanị afọ 18, ma ugbu a o yiri ka ihe mgbaru ọsọ ya nile ná ndụ bụ ihe a na-apụghị inweta. O lewo anya ije ozi oge nile dị ka onye ozi ndị Kraịst, ma mgbe ahụ ọ chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa Crohn’s disease—ọrịa afọ mgbu nke na-agwụ ike. Otú ọ dị, taa, Jason na-anagide ọnọdụ ya nke ọma.
Ikekwe gị onwe gị na-agbaso nrịanrịa siri ike mgba. Ná mbipụta bu nke a ụzọ, Teta! tụlere ihe ịma aka nke ndị na-eto eto dị ka gị na-eche ihu.a Ka anyị leba anya ugbu a n’otú ị pụrụ isi jiri ọnọdụ gị mee ihe kasị mma.
Echiche Uche Dị Mma
Ịnagide nrịanrịa ọ bụla nke ọma na-agụnye echiche uche dị mma. Bible na-asị: “Mmụọ mmadụ ga-anagide ọrịa ya; ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu, ònye ga-eburu ya?” (Ilu 18:14) Echiche na mmetụta ndị na-akpata enweghị olileanya, nke enweghị nchekwube na-eme ka ọgwụgwọ sikwuo ike. Jason chọpụtara nke a ịbụ eziokwu.
Na mbụ, Jason aghaghị ịlụso mmetụta ndị na-adịghị mma ọgụ, dị ka iwe, bụ́ nke na-adọla ya azụ. Gịnị nyere aka? Ọ na-akọwa, sị: “Isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche na Teta! banyere ịda mbà n’obi nyeere m aka n’ezie ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi. Ugbu a ana m agbalị iche otu ụbọchị ihu n’otu oge.”b
Carmen dị afọ 17 mụtara n’otu aka ahụ ilekwasị anya n’akụkụ ndị dị mma. Ọ bụ ezie na ọ na-arịa ọrịa ọbara sickle-cell, ọ na-agụkọ ngọzi ya. “Ana m eche banyere ndị ọzọ ndị ka mụ njọ, ndị na-apụghịkwa ime ihe ndị m pụrụ ime,” ka ọ na-ekwu. “Ana m enwe obi ekele ọ bụghị imere onwe m oké ebere.”
Ilu 17:22 na-asị: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma.” Ụfọdụ pụrụ iche na ịchị ọchị ekwesịghị ekwesị mgbe e nwere nrịanrịa siri ike. Ma ịkpa ọchị obiọma na nnọkọrịta dị mma na-enye uche gị ume ọhụrụ ma na-amụba ọchịchọ gị ịdị ndụ. N’eziokwu, ọṅụ bụ àgwà Chineke, otu n’ime mkpụrụ nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22) Mmụọ ahụ pụrụ inyere gị aka inwe ọṅụ ọ bụ ezie na ị na-alụso nrịanrịa ọgụ.—Abụ Ọma 41:3.
Ịchọta Dọkịta nke Nwere Nghọta
Inwe dọkịta nke na-aghọta ndị na-eto eto na-enye aka nke ukwuu. Mkpa uche na nke mmetụta uche nke onye na-eto eto na-adịkarị iche pụọ ná nke onye toworo eto. Ashley dị nanị afọ iri mgbe ọ gara ụlọ ọgwụ maka ọgwụgwọ nke ajọ akpụ ụbụrụ. Dọkịta Ashley mesoro ya n’ụzọ ọmịiko na n’okwu ndị ọ pụrụ ịghọta. Ọ gwara ya otú nrịanrịa ya n’oge ọ bụ nwata si kwalie ya ịbụ dọkịta. O jiri nwayọọ ma n’ụzọ doro anya kọwaara ya ọgwụgwọ o zubere inye, ya mere ọ maara ihe ọ ga-atụ anya ya.
Gị na ndị mụrụ gị ga-achọ ịchọta ndị ọrụ ahụ ike na-akwanyere gị ùgwù na ndị na-aghọta mkpa gị. Ọ bụrụ na n’ihi ihe ụfọdụ ahụ eruchaghị gị ala n’ụzọ ezi uche dị na ya ná nlekọta ị na-enweta, ụjọ atụla gị ịgwa ndị mụrụ gị nchegbu gị.
Lụọ Ọgụ Maka Ahụ Ike Gị!
Ọ dịkwa mkpa na ị lụsoro nrịanrịa gị ọgụ n’ụzọ ọ bụla ị pụrụ. Dị ka ihe atụ, mụta ihe nile i nwere ike ịmụta banyere ọnọdụ gị. “Onye nwere ihe ọmụma na-eme ka ike nwee ume,” ka otu ilu Bible na-ekwu. (Ilu 24:5) Ihe ọmụma na-ewepụ egwu nke ihe a na-amaghị ama.
Ọzọkwa, onye na-eto eto nwere ihe ọmụma pụrụ itinyekwu onwe ya n’ọgwụgwọ ya, ọ nọkwa n’ọnọdụ ka mma ikwenyekọ na ya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịmụta na o kwesịghị ịkwụsị ịṅụ ọgwụ e nyere ya ma ọ bụrụ na dọkịta ekwughị otú ahụ. Carmen, onye e hotara n’elu, gụrụ akwụkwọ banyere ọrịa ọbara sickle-cell, dị ka ndị mụrụ ya mere. Ihe ha mụtara nyeere ha aka inweta ọgwụgwọ nke pụrụ inyere Carmen aka karịsịa.
Jụọ dọkịta gị ajụjụ ndị kpọrọ okwu aha—ihe karịrị otu ugbo ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa—ọ bụrụ na okwu ụfọdụ edochaghị gị anya. Kama ikwu ihe i chere na dọkịta chọrọ ịnụ, kọwaa n’eziokwu ihe ị na-eche na mmetụta gị. Dị ka Bible na-ekwu, “mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.”—Ilu 15:22.
N’otu oge Ashley yiri ka ọ naghị ekwurịta nnọọ okwu banyere nrịanrịa ya. Nanị nne ya ka ọ ga-agwa banyere ya. Otu onye ọrụ ebere maara ihe jụrụ ya iche, sị: “Ị̀ na-eche na a dịghị agwa gị ihe nile ma eleghị anya?” Ashley kwuru na ya chere otú ahụ. Ya mere nwanyị ahụ gosiri Ashley ihe ndekọ ọgwụgwọ ya ma kọwaara ya ha. Ọ gwakwara ndị dọkịta ka ha tinyekwuo oge n’ịgwa Ashley okwu kpọmkwem, kama nanị ikwu banyere ya. Site n’ịkọwa onwe ya n’ikpeazụ, Ashley nwere ike inweta enyemaka dị ya mkpa.
Nkwado Site n’Aka Ndị Nọ Gị Gburugburu
Mgbe onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ na-arịasi ọrịa ike, ọ na-aghọ okwu dịịrị ezinụlọ, nke na-achọ mgbalị e jikọrọ aka ọnụ eme. Ezinụlọ Ashley na ọgbakọ ndị Kraịst gbatara ịkwado ya. A na-echetara ọgbakọ mgbe mgbe na ọ nọ n’ụlọ ọgwụ. Ndị nọ n’ọgbakọ na-eleta ya mgbe nile, ha nyekwaara ezinụlọ ahụ aka n’ọrụ ụlọ na ná nkwadebe nke nri ruo mgbe ezinụlọ ahụ nwere ike ịlaghachi n’usoro ime ihe ha. Ụmụaka nọ n’ọgbakọ letara Ashley n’ụlọ ọgwụ mgbe ọrịa na-ejisighị ya ike inwe onye ọbịa. Nke a dị mma ọ bụghị nanị nye Ashley, kamakwa nye ndị enyi ya na-eto eto.
Otú ọ dị, tupu ndị ọzọ enwee ike inyere gị aka, ha aghaghị ịma na ọ dị gị mkpa. Carmen na-elegara ndị mụrụ ya na ndị okenye ọgbakọ anya maka nkwado mmetụta uche na nke ime mmụọ. Ọ na-atụkwa anya ka ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ndị nwere ụdị nkwenkwe ndị Kraịst o nwere nye ya nkwado. “Ha na-elebara m anya,” ka Carmen na-ekwu, “ana m enwekwa mmetụta nke ịbụ onye a na-elekọta.”
Ụlọ akwụkwọ gị nwere ike inye ndụmọdụ ahụ ike na ego nke na-enye aka, ha pụkwara ọbụna inye nkwado onwe onye ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, onye nkụzi Ashley gbara ndị klas ya ume idegara Ashley akwụkwọ na ileta ya. Ọ bụrụ na ndị nkụzi gị aghọtaghị ihe isi ike ndị ị na-eche ihu, ọ pụrụ ịdị ndị mụrụ gị mkpa iji nkwanye ùgwù soro ndị isi ụlọ akwụkwọ kwurịta ọnọdụ gị.
Jiri Uche na Ahụ Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe
Mgbe ị na-arịasi ọrịa ike, o nwere ike ị gaghị enwe ike ime ihe ọ bụla e wezụga itinye ume nile i nwere ná mgbake. Ọ bụrụ na ike agwụghị gị kpam kpam, e nwere ọtụtụ ihe ndị na-ewuli ewuli ị pụrụ ime. Jill Krementz na-ede akwụkwọ kwuru banyere ihe o deturu mgbe ọ na-eme nnyocha banyere akwụkwọ ya bụ́ How It Feels to Fight for Your Life, sị: “Ọ bụrụwo ihe mwute nye m ịdị na-agafe na paseji ụlọ ọgwụ eri afọ abụọ na ịhụworị ọtụtụ ụmụaka na-ekiri TV. Ọ dị anyị mkpa ịgba ndị na-eto eto ndị a ume ịgụkwu akwụkwọ. Àkwà ụlọ ọgwụ bụ ebe magburu onwe ya mmadụ iji ụbụrụ ya mee ihe.”
Ma ị̀ nọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ụlọ ọgwụ, iji ikike uche gị eme ihe pụrụ inyekarịrị gị aka ịgbake. Ị̀ nwalewo ide akwụkwọ ozi ma ọ bụ uri? Ise ihe? Gịnị banyere ịmụta ịkpọ ngwá egwú ma ọ bụrụ na ọnọdụ gị enye ohere ya? Ọbụna mgbe e nwere adịghị ike ahụ ike, e nwere ọtụtụ ihe a pụrụ ime. N’ezie, ihe kasị mma ị pụrụ ime bụ ịzụlite àgwà nke ikpegara Chineke ekpere na ịgụ Okwu ya, bụ́ Bible.—Abụ Ọma 63:6.
Ọ bụrụ na ọnọdụ gị enye ohere ya, mmega ahụ kwesịrị ekwesị pụkwara inyere gị aka ịgbake. N’ihi nke a ụlọ ọgwụ na-enwekarị usoro ọgwụgwọ mmega ahụ maka ndị ọrịa bụ́ ndị na-eto eto. N’ọtụtụ ọnọdụ, mmega ahụ kwesịrị ekwesị abụghị nanị na ọ na-akwalite mgbake anụ ahụ kamakwa ọ na-enye aka iwelite mmụọ gị.
Adala Mbà!
N’agbanyeghị nhụjuanya dị ukwuu, Jisọs kpegaara Chineke ekpere, tụkwasị Ya obi, ma tụkwasị uche n’ọdịnihu obi ụtọ ya kama n’ihe mgbu ya. (Ndị Hibru 12:2) Ọ mụtara ihe site n’ahụmahụ ya ndị siri ike. (Ndị Hibru 4:15, 16; 5:7-9) Ọ nakweere enyemaka na agbamume. (Luk 22:43) O lekwasịrị anya n’ọdịmma nke ndị ọzọ karịa n’ahụ erughị ala nke ya.—Luk 23:39-43; Jọn 19:26, 27.
Ọ bụ ezie na i nwere ike ịdị na-arịasi ọrịa ike, gị onwe gị kwa pụrụ ịbụ ihe mkpali nye ndị ọzọ. Maka akụkọ ụlọ akwụkwọ, nwanne nwanyị Ashley, bụ́ Abigail dere, sị: “Onye m kasị nwee mmasị n’ebe ọ nọ bụ nwanne m nwanyị. Ọ bụ ezie na ọ ghaghị ịga ụlọ ọgwụ, a gbaakwa ya ọgwụ ndị a na-esi n’akwara agba ma dụọ ya ntụtụ, ọ ka na-apụta na-amụmụ ọnụ ọchị!”c
Jason adabeghị mbà n’ihe mgbaru ọsọ ya, nanị na ọ hazigharịtụrụ ha. Ugbu a ihe mgbaru ọsọ ya bụ ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze Chineke. Dị ka ọ dị n’ọnọdụ Jason, o nwere ike ị gaghị enwe ike ime ihe nile ị chọrọ ime. Ihe dị mkpa bụ ịmụta ibi n’ụzọ kwekọrọ n’ịkpa ókè gị, ọ bụghị ichebebiga onwe gị ókè ma ọ bụ ịdị aghara. Dabere na Jehova inye gị amamihe na ume iji mee ihe kasị mma ị pụrụ ime. (2 Ndị Kọrint 4:16; Jemes 1:5) Chetakwa, oge ga-abịa mgbe ụwa a ga-aghọ paradaịs, ebe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ee, otu ụbọchị ị ga-enwe ahụ ike ọzọ!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
b Lee Ụlọ Nche, October 1, 1991, peji nke 15; March 1, 1990, peji nke 3-9; na Teta!, March 8, 1989, peji nke 11-24; November 8, 1987 (Bekee), peji nke 12-16.
c Leekwa Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, peji nke 116-127.
[Foto dị na peeji nke 25]
Nwanne ya nwanyị tọrọ ya bụ́ Abigail nwere mmasị n’obi ike Ashley