“Jehova Na-enye Amamihe”
OLEE nchụso ndị na-eri oge na ike gị? Mkpa gị ọ̀ bụ imere onwe gị ezi aha? Ị̀ na-emikpu onwe gị n’ịkpakọba akụ̀? Gịnị banyere ịchụso ọzụzụ n’ọrụ ụfọdụ ma ọ bụ ịzụlite nkà n’otu ihe ọmụmụ ma ọ bụ karị? Iwulite mmekọrịta dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ ọ̀ dị gị mkpa? Inwe ezi ahụ ike ọ̀ bụ nchegbu gị bụ́ isi?
Ihe a nile dị n’elu pụrụ iyi ka ha nwere abamuru ụfọdụ. Ma gịnị dị mkpa karịsịa? Bible na-aza, sị: “Isi ihe ka amamihe bụ; nweta amamihe.” (Ilu 4:7) Ya mere olee otú anyị pụrụ isi nweta amamihe, gịnịkwa bụgasị abamuru ya? Isi nke abụọ nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-enye azịza ya.
‘Tọọrọ Amamihe Ntị Gị n’Ala’
Eze Solomọn nwere amamihe nke Israel oge ochie ji okwu ịhụnanya yiri nke nna, na-ekwu, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nara okwu ọnụ m nile, ọ bụrụkwa na i zobe ihe nile m nyere n’iwu n’ebe ị nọ; ịtọrọ amamihe ntị gị n’ala, wee wezụga obi gị inwe [mmata]; ee, ọ bụrụ na ọ bụ [nghọta] ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ [mmata] ka ị na-eweliri olu gị; ọ bụrụ na ị chọọ ya dị ka ọlaọcha, ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-egwupụta ya: mgbe ahụ ka ị ga-aghọta egwu Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke ka ị ga-achọta.”—Ilu 2:1-5.
Ị̀ na-ahụ ebe ibu ọrụ nke inweta amamihe dabeere? N’amaokwu ndị a, okwu ahụ bụ́ “ọ bụrụ na ị” pụtara ugboro atọ. N’ụzọ doro anya, ọ bụ ihe dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị ịchọ amamihe na ihe ndị na-enyere ya aka—mmata na nghọta. Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ ‘nara’ ma “zobe” n’ikike ncheta anyị okwu amamihe ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ. N’ihi nke a, ọ dị anyị mkpa ịmụ Bible.
Amamihe bụ ikike nke itinye ihe ọmụma Chineke na-enye n’ọrụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Leekwa ụzọ dị ebube Bible si enye amamihe! Ee, o nwere okwu amamihe, dị ka ndị ahụ e dekọrọ n’akwụkwọ Ilu na Eklisiastis, ọ dịkwa anyị mkpa ịṅa ntị n’okwu ndị a. Anyị na-ahụkwa n’ime Bible ọtụtụ ihe atụ ndị na-egosi abamuru ndị na-esite n’itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ na ọnyà ndị dị n’ileghara ha anya. (Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndekọ banyere Gihezi dị anyaukwu, bụ́ onye na-ejere Elaịsha onye amụma ozi. (2 Ndị Eze 5:20-27) Ọ́ dịghị akụziri anyị amamihe dị n’izere anyaukwu? Gịnịkwa banyere ọdachi ahụ si ná nleta ndị yiri nke na-adịghị emerụ ahụ nke ada Jekọb bụ́ Daịna letara “ụmụ ndị inyom ala” Kenean, pụta? (Jenesis 34:1-31) Ọ̀ bụ na anyị adịghị aghọta ozugbo nzuzu dị ná mkpakọrịta ọjọọ?—Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33.
Ịtọrọ amamihe ntị n’ala na-agụnye inweta mmata na nghọta. Dị ka Webster’s Revised Unabridged Dictionary si kwuo, mmata bụ “ike ma ọ bụ ikike nke uche bụ́ nke o ji ama ọdịiche dị n’etiti otu ihe na ibe ya.” Mmata nke kwekọrọ n’ụzọ nke Chineke bụ ikike nke ịma ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ na ịhọrọzi ụzọ ziri ezi. Ọ gwụla ma anyị ‘na-ewezụga obi anyị’ inweta mmata ma ọ bụ na-achọsi ike inweta ya, ànyị pụrụ isi aṅaa nọgide ‘n’ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ’? (Matiu 7:14; tụlee Deuterọnọmi 30:19, 20.) Ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ na-enye mmata.
Olee otú anyị pụrụ isi ‘kpọkuo nghọta’—ikike nke ịhụ otú akụkụ dị iche iche nke otu ihe si metụta ibe ha na ihe ahụ n’ozuzu ya? N’ezie, afọ ndụ na ahụmahụ bụ ihe ndị pụrụ inyere anyị aka ịzụlite nghọta ka ukwuu—ma ọ bụchaghị otú ahụ. (Job 12:12; 32:6-12) “Ana m aghọta ihe karịa ndị okenye,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru, “n’ihi na ihe ịrịba ama Gị [Jehova] nile ka m chebeworo.” Ọ bụkwara, sị: “Mkpughepụ okwu Gị nile na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.” (Abụ Ọma 119:100, 130) Jehova bụ “Onye ochie ahụ,” o nwekwara nghọta gabigara ókè karịa nke ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Daniel 7:13) Chineke pụrụ inye onye na-enweghị uche nghọta, na-eme ka o nwee ike inwe àgwà ahụ ọbụna karịa ndị tọrọ ya. Ya mere, anyị kwesịrị ịdị uchu n’ịmụ na n’itinye Okwu Chineke, bụ́ Bible, n’ọrụ.
Okwu ndị dị ka “nara,” “zobe,” ‘kpọkuo,’ “chọọ,” ‘gwupụta,’ na-esochi nkebi ahịrịokwu ahụ e kwuru ugboro ugboro bụ́ “ọ bụrụ na ị” n’okwu mmeghe nke isi nke abụọ nke Ilu. N’ihi gịnị ka onye dere ya ji jiri okwu ndị a na-emesiwanye ihe ike mee ihe? Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “[N’ebe a] onye amamihe ahụ na-emesi ike mkpa ọ dị iji ịdị uchu na-achụso amamihe.” Ee, anyị aghaghị iji ịdị uchu na-achụso amamihe na àgwà ndị e jikọrọ ya na ha—mmata na nghọta.
Ị̀ Ga-etinye Mgbalị A Chọrọ?
Otu ihe bụ́ isi n’ịchụso amamihe bụ iji ịdị uchu na-amụ Bible. Otú ọ dị, ihe ọmụmụ a kwesịrị ịbụ ihe karịrị nnọọ igụ ihe nanị iji nweta ihe ọmụma. Ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ n’ụzọ nwere nzube bụ akụkụ dị oké mkpa nke ịmụ Akwụkwọ Nsọ. Inweta amamihe na mmata na-agụnye ịtụgharị uche n’otú anyị pụrụ isi jiri ihe anyị na-amụta dozie nsogbu ma mee mkpebi. Inweta nghọta na-achọ ịtụgharị uche n’otú ihe ọmụmụ ọhụrụ ahụ si kwekọọ n’ihe anyị mabu. Ònye bụ onye na-agaghị ekweta na iji ntụgharị uche dị otú ahụ na-amụ Bible chọrọ oge na mgbalị siri ike? Oge na ume a na-etinye yiri nke ahụ a na-etinye mgbe a ‘na-achọ ọlaọcha na akụ̀ zoro ezo.’ Ị̀ ga-etinye mgbalị a chọrọ? Ị̀ ‘ga-azụchapụta oge’ iji mee otú ahụ?—Ndị Efesọs 5:15, 16.
Tụlee akụ̀ dị ukwuu na-echere anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi gwubamie n’ime Bible. Leenụ, anyị ga-achọta “ihe ọmụma Chineke”—ihe ọmụma bụ́ ịgba, na-adịghị agbanwe agbanwe, ma na-enye ndụ, nke Onye Okike anyị! (Jọn 17:3) “Egwu Jehova” bụkwa akụ̀ a ga-enweta. Lee ka iji nsọpụrụ na-atụ ya egwu a si bụrụ ihe bara uru! Egwu ziri ezi nke ịkpasu ya iwe aghaghị ịchịkwa akụkụ nile nke ndụ anyị, na-eme ka ihe ime mmụọ na-emetụta ihe nile anyị na-eme.—Eklisiastis 12:13.
Ọchịchọ siri ike nke ịchọ na igwupụta akụ̀ ime mmụọ kwesịrị ịdị na-ere ka ọkụ n’obi anyị. Iji mee ka ihe anyị na-achọ ka mfe, Jehova ewepụtala ngwá ọrụ ndị magburu onwe ha e ji egwupụta ihe—akwụkwọ eziokwu ndị na-abịa n’oge ha bụ́ Ụlọ Nche na Teta!, nakwa akwụkwọ ndị ọzọ dabeere na Bible. (Matiu 24:45-47) Iji kụziere anyị ihe n’Okwu na n’ụzọ ya, Jehova edokwawokwa nzukọ ndị Kraịst. Ọ dị anyị mkpa ịgachi ha anya, na-aṅa ntị nke ọma n’ihe a na-ekwu, na-etinye mgbalị siri ike iji tinye uche n’echiche ndị bụ́ isi ma zobe ha, na-echebakwara mmekọrịta anyị na Jehova echiche n’ụzọ miri emi.—Ndị Hibru 10:24, 25.
Ị Gaghị Ada
Mgbe mgbe, ọchịchọ a na-achọ akụ̀ ndị e liri n’ala, ọlaedo, ma ọ bụ ọlaọcha na-aghọ ihe na-enweghị isi. Ọ gaghị adị otú ahụ n’ihe banyere ọchịchọ a na-achọ akụ̀ ime mmụọ. N’ihi gịnị? “Jehova na-enye amamihe,” ka Solomọn na-emesi anyị obi ike, “n’ọnụ Ya ka ihe ọmụma na [mmata] si apụta.”—Ilu 2:6.
A maara Eze Solomọn nke ọma maka amamihe ya. (1 Ndị Eze 4:30-32) Akwụkwọ Nsọ na-ekpughe na o nwere ihe ọmụma banyere ihe dị iche iche, gụnyere ihe ọkụkụ, anụmanụ, ọdịdị mmadụ, na Okwu Chineke. Mmata o gosipụtara dị ka eze na-eto eto n’idozi esomokwu ahụ dị n’etiti ndị inyom abụọ, bụ́ ndị onye ọ bụla n’ime ha na-azọrọ na ọ bụ ya mụrụ otu nwatakịrị, nyere aka ime ka a mara ya ná mba nile. (1 Ndị Eze 3:16-28) Olee ebe o si nweta oké mmụta ya? Solomọn kpegaara Jehova ekpere maka “amamihe na ihe ọmụma” nakwa ikike nke “ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.” Jehova nyere ya ihe ndị a.—2 Ihe E Mere 1:10-12; 1 Ndị Eze 3:9.
Anyị onwe anyị kwa kwesịrị ikpe ekpere maka enyemaka Jehova ka anyị ji ịdị uchu na-amụ Okwu ya. Ọbụ abụ ahụ kpere ekpere, sị: “Zi m ụzọ Gị, Jehova; m ga-ejegharị n’eziokwu Gị: mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha Gị.” (Abụ Ọma 86:11) Jehova nabatara ekpere ahụ, n’ihi na o mere ka e dekọọ ya n’ime Bible. Anyị pụrụ inwe obi ike na ọ ga-aza ekpere anyị ji ezi obi na-ekpe n’esepụghị aka maka enyemaka ya iji chọta akụ̀ ime mmụọ ndị dị na Bible.—Luk 18:1-8.
Solomọn na-akọwapụta, sị: “Ọ na-ezobere ndị ziri ezi nzube ihe, ọ bụ ọta ndị na-eje ije n’izu okè nwere; iche okporo ụzọ nile nke ikpe, ọ bụkwa ụzọ ndị ebere Ya ka Ọ na-edebe. Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ezi omume na ikpe, na izi ezi nile, ee, ezi ụzọ ọ bụla.” (Ilu 2:7-9) Lee mmesighachi obi ike nke a bụ! Ọ bụghị nanị na Jehova na-ewere ezi amamihe enye ndị ji ezi obi na-achọ ya kamakwa ọ na-aghọrọ ndị ziri ezi ọta nchebe n’ihi na ha na-egosipụta ezi amamihe ma jiri iguzosi ike n’ihe na-eme ihe kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya. Ka anyị soro n’etiti ndị Jehova na-enyere aka ịghọta “ezi ụzọ ọ bụla.”
Mgbe ‘Ihe Ọmụma Ga-adị Ụtọ’
Ọmụmụ Bible onwe onye—otu ihe dị oké mkpa maka ịchọ amamihe—abụchaghị atụmanya dị ụtọ nye ọtụtụ ndị. Dị ka ihe atụ, Lawrence dị afọ 58 na-ekwu, sị: “Ejiriwo m aka m rụọ ọrụ mgbe nile. Ịmụ ihe na-esiri m ike.” Michael dị afọ 24, bụ́ onye na-enweghị mmasị n’ịmụ ihe n’ụlọ akwụkwọ, na-ekwu, sị: “Aghaghị m ịmanye onwe m ịnọdụ ala mụọ ihe.” Ma, a pụrụ ịzụlite ọchịchọ ịmụ ihe.
Tụlee ihe Michael mere. Ọ na-akọ, sị: “Enyere m onwe m ọzụzụ ịmụ ihe ruo ọkara awa kwa ụbọchị. N’oge na-adịghị anya apụrụ m ịhụ mmetụta ọ na-enwe n’àgwà m, ajụjụ ndị m na-aza ná nzukọ ndị Kraịst, na ná mkparịta ụka mụ na ndị ọzọ. Ugbu a, ọ na-adị m ka oge ịmụ ihe m ruo eruo, adịghịkwa m achọ ka ihe ọ bụla dabata n’oge ahụ.” Ee, ọmụmụ ihe onwe onye na-aghọ ihe a malitere nụwa ụtọ ya mgbe anyị hụrụ ọganihu anyị na-enwe. Lawrence tinyekwara onwe ya n’ọmụmụ Bible, ka oge na-agakwa, o jewere ozi dị ka okenye n’otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova.
Ọ na-ewe mgbalị siri ike iji mee ka ọmụmụ ihe onwe onye bụrụ ihe a na-anụ ụtọ ya. Otú ọ dị, abamuru ndị dị na ya hiri nne. “N’ihi na amamihe ga-aba n’obi gị, ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụ obi gị ụtọ,” ka Solomọn na-ekwu, “izuzu ga na-eche gị nche, nghọta ga-echebe gị.”—Ilu 2:10, 11.
“Ịnapụta Gị n’Ụzọ Onye Ọjọọ”
N’ụzọ dị aṅaa ka amamihe, ihe ọmụma, izuzu, na nghọta ga-esi bụrụ ihe nchebe? “[Ha ga-anapụta] gị n’ụzọ onye ọjọọ,” ka Solomọn na-ekwu, “n’aka mmadụ na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ; bụ́ ndị na-ahapụ okporo ụzọ nile nke izi ezi, ka ha wee jee ije n’ụzọ nile nke ọchịchịrị; ndị na-aṅụrị ime ihe ọjọọ, ha na-etegharị egwú ọṅụ n’ịgbakụta Chineke azụ nke onye ọjọọ; ndị okporo ụzọ nile ha gbagọrọ agbagọ, ha na-esihiekwa n’ụzọ nile ha.”—Ilu 2:12-15.
Ee, ndị ji ezi amamihe akpọrọ ihe na-ezere iso onye ọ bụla “na-ekwu okwu ịgbakụta Chineke azụ,” ya bụ, ihe ndị megidere ihe bụ́ eziokwu na ihe ziri ezi, akpakọrịta. Izuzu na nghọta na-enye nchebe pụọ n’ebe ndị na-ajụ eziokwu nanị iji jee ije n’ụzọ nile nke ọchịchịrị nọ nakwa pụọ n’ebe ndị na-esihie esihie na ndị omume ọjọọ na-atọ ụtọ nọ.—Ilu 3:32.
Lee ekele anyị pụrụ inwe na ezi amamihe na àgwà ndị ọzọ ha na ya na-agakọ na-echebekwa anyị pụọ n’ụzọ ọjọọ nke ndị ikom na ndị inyom rụrụ arụ! Solomọn na-agbakwụnye na àgwà ndị a gaje “ịnapụta gị n’aka nwanyị [ala ọzọ, “NW”], n’aka nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu ire ụtọ; nke na-ahapụ di o nwere n’agbọghọ, ọgbụgba ndụ nke Chineke ya kwa, o chezọwo ya: n’ihi na ụzọ ịrịdaru ọnwụ ka ụlọ ya bụ, ọ bụkwa ụzọ ịrịdaru n’ebe ndị na-adịghị ndụ nọ ka ụzọ ya nile bụ. Ndị nile ndị na-abakwuru ya, ha adịghị alata, ha adịghị erukwa okporo ụzọ nile nke ndụ.”—Ilu 2:16-19.
A na-akọwa “nwanyị ala ọzọ,” nwanyị akwụna, dị ka onye na-ahapụ “di o nwere n’agbọghọ.”a (Tụlee Malakaị 2:14.) O chezọọla mmachibido a machibidoro ịkwa iko nke ndị lụrụ di na nwunye nke bụ́ akụkụ nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. (Ọpụpụ 20:14) Ụzọ ya nile na-eduga n’ọnwụ. Ndị so ya akpakọrịta nwere ike ghara ‘iru okporo ụzọ nile nke ndụ’ ma ọlị, ebe ọ bụ na ka oge na-aga, ha pụrụ iru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha na-enweghịzi ike ịlọghachi, ya bụ ọnwụ, bụ́ nke ha na-apụghị isi na ya lọghachi. Onye nwere nghọta na izuzu na-ama ihe ụrà nile nke omume rụrụ arụ ma jiri amamihe na-ezere ịdaba na ha.
“Ndị Ziri Ezi Ga-ebi n’Ụwa”
N’ịchịkọta ebumnobi o ji nye ndụmọdụ ya banyere amamihe, Solomọn na-ekwu, sị: “Ka i wee jee ije n’ụzọ ndị dị mma, debekwa okporo ụzọ nile nke ndị ezi omume.” (Ilu 2:20) Lee nzube magburu onwe ya amamihe na-emezu! Ọ na-enyere anyị aka ibi ndụ obi ụtọ na nke na-eju afọ bụ́ nke Chineke na-anakwere.
Tụleekwa ngọzi ndị dị ebube na-echere ndị ‘na-eje ije n’ụzọ ndị dị mma.’ Solomọn gara n’ihu, na-asị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:21, 22) Ka i soro n’etiti ndị zuru okè bụ́ ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume Chineke ruo mgbe ebighị ebi.—2 Pita 3:13.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a E ji okwu ahụ bụ́ “onye ala ọzọ” mee ihe n’ebe ndị gbakụtara ihe Iwu ahụ kwuru azụ nọ wee si otú ahụ kewapụ onwe ha n’ebe Jehova nọ. N’ihi ya, a na-ezo aka na nwanyị akwụna—ọ bụchaghị onye mba ọzọ—dị ka “nwanyị ala ọzọ.”
[Foto dị na peeji nke 26]
Solomọn kpere ekpere maka amamihe. Anyị kwesịrị ime otú ahụ