Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g17 nke 4 p. 9
  • ‘Ezi Aha Dị Mma Karịa Akụ̀ Dị Ukwuu’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ezi Aha Dị Mma Karịa Akụ̀ Dị Ukwuu’
  • Teta!—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmadụ Ịdị Umeala n’Obi Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dịghị Ike Ka Ọ̀ Na-egosi na Ọ Dị Ike?
    Teta!—2007
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Ka E Doo Aha Gị Nsọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Gosi Ezi Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2017
g17 nke 4 p. 9
Onye na-arụzi ụgbọala a na-akwanyere ùgwù

Aha ọma mmadụ nwere na-eme ka ndị ọzọ tụkwasị ya obi ma na-akwanyekwara ya ùgwù

‘Ezi Aha Dị Mma Karịa Akụ̀ Dị Ukwuu’

NDỊ mmadụ anaghị eji aha ọma ha egwuri egwu. Ọ bụ ya mere mba ụfọdụ ji mee iwu megidere mmadụ imebi aha mmadụ ibe ya. Iwu ndị dị otú ahụ megidere mmadụ ikwu, ide, ma ọ bụ ịgbasa ozi ndị na-emebi aha mmadụ ibe ha. Ihe a na-echetara anyị ihe Baịbụl kwuru kemgbe gboo. Baịbụl sịrị: “Ọ dị mma ịhọrọ ezi aha karịa ịhọrọ akụ̀ dị ukwuu; amara dị mma karịa ọbụna ọlaọcha na ọlaedo.” (Ilu 22:⁠1) Ma, olee ihe anyị ga-eme iji nweta aha ọma, ndị mmadụ a na-akwanyekwara anyị ùgwù? E nwere ọtụtụ ọmarịcha ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka.

Dị ka ihe atụ, ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma isi nke 15. Mgbe a jụrụ ọ bụ abụ ahu, sị: “Ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu [Chineke]?” ọ zara, sị: “Ọ bụ onye . . . na-eme ezi omume, onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya. Ọ dịghị . . . ekwutọ mmadụ. Ọ dịghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ, ọ dịghịkwa akọcha onye ya na ya na-akpachi anya. N’anya ya, onye ọ bụla nke na-abaghị n’ihe bụ onye a jụrụ ajụ . . . Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya. . . . Ọ dịghịkwa eri ngarị.” (Abụ Ọma 15:​1-5) Ị̀ gaghị akwanyere onye na-akpa àgwà ọma ndị dị otú ahụ ùgwù?

Ihe ọzọ na-emekwa ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù bụ ịdị umeala n’obi. Ilu 15:33 kwuru, sị: “Ịdị umeala n’obi na-ebute otuto ụzọ.” Chetụgodị echiche: Ndị dị umeala n’obi hụ ebe ha anaghị emetacha, ha na-agbalịsi ike hụ na ha meziri ya. ha na-adịkwa njikere ịrịọ onye ha mejọrọ mgbaghara. (Jems 3:⁠2) Ma, ndị dị mpako anaghị eme otú ahụ, kama obere ihe ọ bụla, e mejọọla ha. Ilu 16:18 kwuru, sị: “Nganga na-abịa tupu nkụpịa, mmụọ mpako na-abịakwa tupu ịsụ ngọngọ.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ emebie aha gị? Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-eji iwe megwara onye ahụ ozugbo? Jụgodị onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na mụ agbalịwa ka m zọọ isi m, ọ̀ ga-eme ka ụgha ahụ e ji mebie aha m na-agbasakwu?’ Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ o nwere ike ịkacha mma iwega okwu ahụ n’ụlọ ikpe, ma Baịbụl gbara anyị ume, sị: “Ejila ọkụ ọkụ akpọ mmadụ ikpe.” Kama, “gị na mmadụ ibe gị kpezie okwu.” (Ilu 25:​8, 9)a Ime ihe a Baịbụl kwuru nwere ike ime ka anyị ghara ịga mefusiwe ego n’ụlọ ikpe.

Baịbụl abụghị akwụkwọ na-ekwu naanị gbasara okpukpe. Ọ bụ akwụkwọ e kwesịrị ịtụkwasị obi na-agwa anyị otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. Ndị niile na-eji okwu amamihe ya ebi ndụ na-akpa àgwà ndị ga na-ewetara ha aha ọma, na-emekwa ka a na-akwanyere ha ùgwù.

a Ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka idozi esemokwu dị na Matiu 5:​23, 24; 18:​15-17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya