Ụzọ E Si Enweta Ndụ Ezinụlọ Na-aga Nke Ọma
“ANYỊ nwere njikọ ezinụlọ na-adakpọ adakpọ,” ka otu onye so zọọ ọkwá onye isi ala United States n’afọ gara aga kwuru. N’ezie, ọ̀tụ̀tụ̀ nke ndakpọ ezinụlọ na-awụ akpata oyi. “Mgbanwe ndị harukwara otú ahụ n’ihe ndekọ ọnọdụ akụ na ụba na ụlọ ọrụ mmepụta ihe n’otu ogologo oge ahụ,” ka magazin bụ́ Fortune na-akọ, “ga-eme ka anyị na-ele sọ n’anya ná mgbagwoju anya.”
Ọbụna ezinụlọ ndị na-anwa ịgbaso ụkpụrụ ndị dị na Bible na-enwekarịkwa mmetụta dị njọ. Afọ ole na ole gara aga, otu onye bu ezi ihe n’uche gwara onye Kraịst ibe ya bụ́ nna nke ụmụ isii na-erubeghị afọ iri na atọ, sị: “Ị pụrụ ịtụ anya anọ n’ime ụmụ gị ifu banye n’ụwa.” Ma, nna a ekweghị na nke a ga-eme ọbụna otu n’ime ụmụ ya. Ọ kọwara ihe kpatara ya.
“Ụmụ anyị abụghị nke anyị n’ezie,” ka o kwuru. “Jehova Chineke nyefere ha n’aka mụ na nwunye m ilekọta, ‘ihe nketa,’ ma ọ bụ onyinye, sitere n’aka ya. O kwukwara na ọ bụrụ na anyị azụlite ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ‘ha agaghị esi na ya wezụga onwe ha.’ Ya mere anyị agbalịwo mgbe nile ilekọta ha dị ka hà bụ nke Jehova.”—Abụ Ọma 127:3; Ilu 22:6.
Nna a gosipụtara n’ebe a ụzọ e si enweta ndụ ezinụlọ na-aga nke ọma—nne na nna kwesịrị ilekọta ụmụ ha dị ka hà na-elekọta ihe onwunwe Chineke. Ebe nke a na-apụtaghị na ụmụ ga-agbaso nduzi ọma unu n’ihe nile, unu nwere ibu ọrụ nke ilekọta ụmụaka Chineke nyefeworo unu.
Ibu Ọrụ Siri Ike
Ị na-enye nlekọta a nke ọma site ná nkwanye ùgwù dị ukwuu na nchegbu miri emi, ọ bụghị n’elezighị anya ma ọ bụ n’enweghị mmasị. Ị na-arụzu ya site n’ịmara na ị ga-aza Chineke ajụjụ maka ihe nketa ya, ma ọ bụ onyinye, o nyere gị. Ọ dịghị mkpa ịdị na-anwalegharị ụzọ dị iche iche isi zụlite nwata. Nanị ihe ndị nne na nna chọrọ bụ ntụziaka Chineke dị ka e nyere n’Okwu ya, bụ́ Bible, ha kwesịkwara iji nlezianya gbasoo ndị a.
Nke a bụ ntụziaka Jehova Chineke ya: “Ị ga-ejisikwa ike izi [okwu m] ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ. Ị ga-ekekwa ha n’elu aka gị ka ha bụrụ ihe ịrịba ama, ha ga-abụkwa mkpọnihu n’etiti anya gị abụọ. Ị ga-edekwasịkwa ha n’awara ụzọ abụọ nke ụlọ gị, na n’ọnụ ụzọ ámá gị nile.” Bible gbakwara ume, sị: “Ndị bụ nna, . . . na-azụpụta [ụmụ unu] n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Deuterọnọmi 6:7-9; Ndị Efesọs 6:4.
Ya mere ilekọta ụmụaka chọrọ nlebara anya kwa ụbọchị; ee, ọ pụtara adịghị aka ntagide n’inye ha oge gị na karịsịa ịhụnanya na nchegbu gị miri emi. Ndị nne na nna na-enye ụmụ ha ihe ndị a bụ isi dị mkpa na-eme ihe Chineke kwuru na ọ dị mkpa iji nwee ndụ ezinụlọ na-aga nke ọma.
Ì kwere na nke a bụ ịchọ oké ihe? Ọtụtụ ndị nne na nna site n’omume ha na-egosi na ha chere otú ahụ. Ma, onyinye ndị a sitere n’aka Chineke—ụmụ gị—kwesịrị inweta nlebara anya pụrụ nnọọ iche.
Ụzọ Isi Lekọta Ha
N’ụzọ amamihe, tụlee ihe atụ nke ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụmụaka. Otu magazin, n’akụkọ dị n’ihu ya bụ́ “Ezinụlọ Ndị Dị Ịtụnanya,” depụtara ihe anọ dị mkpa n’inwe ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ndị na-eto eto: “[1] Nkwurịta okwu n’oge nri nke na-akpali inyocha ọgụgụ isi, [2] ịgụ akwụkwọ ndị dị mma, [3] mkpali nke ndị na-echepụta ihe kwesịrị nṅomi, [4] echiche nke na e nwere omenala ezinụlọ a ga-akwado.”—U.S.News & World Report, December 12, 1988.
Banyere “nkwurịta okwu n’oge nri,” cheta na Chineke nyere ndị nne na nna ntụziaka izi ụmụ ha ihe mgbe ha na-anọdụ ala n’ụlọ. N’ezinụlọ gị, ùnu na-erikọ nri ọnụ, si otú a na-ewepụta ohere kwa ụbọchị maka mkpakọrịta na nkwurịta okwu na-akpali akpali? Oge ndị dị otú ahụ dị oké mkpa nye ụmụaka, bụrụ ihe ha na-echeta, na-enye ha echiche nke ịkwụrụsi ike na nchebe. Otu nwata dị afọ isii kwuru na ya na-enwe mmasị n’oge nri “n’ihi na ị gaghị na-echegbu onwe gị banyere onye ọzọ,” ebe ọ bụ na mmadụ nile nọkọrọ ọnụ.
Gịnị banyere ọdịdị nke nkwurịta okwu n’oge nri unu? Ọ̀ na-abụkarị banyere ihe ndị dị ‘n’akwụkwọ ndị dị mma,’ gụnyere Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị na-atụle ozi anyị na-ejere Chineke ma ọ bụ ihe ndị metụtara ihe ndị Chineke kere? Tinyere nkwurịta okwu dị otú a n’oge nri, site n’usoro ihe omume nke ịmụ ihe mgbe nile, ọ dị mkpa ka ndị nne na nna zụlite n’ime ụmụ ha ịhụnanya maka Jehova na iwu ezi omume ya nile.
“Irikọ nri ọnụ mgbe nile abụghị nsogbu,” ka nna nke ụmụ isii a kpọtụrụ aha na mbụ kọwara. “Nke a na-abịara onwe ya, o mekwara ka anyị dị n’otu. Ma inwe usoro ọmụmụ Bible mgbe nile siri ike.” N’ihi oké ike ọgwụgwụ ná ngwụsị nke ụbọchị ọrụ siri ike, mgbe ụfọdụ ụra na-eburu ya n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Ma, ọ dịghị mgbe ọ hapụrụ iduziri ụmụ ya ọmụmụ Bible mgbe nile, ọ na-ekwunyekwara ha okwu n’otu n’otu mgbe nile ma na-ege ha ntị ruo ogologo oge.
E wezụga ibute ụzọ ná nkwurịta okwu n’oge nri na ime ka a gụọ akwụkwọ ndị dị mma, ị̀ na-ahụ na ụmụ gị natara “mkpali nke ndị na-echepụta ihe kwesịrị nṅomi”? Eziokwu bụ na ime ndokwa ka ụmụ gị na-esonyere ndị na-eṅomi nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, Jisọs Kraịst, mgbe nile dị oké mkpa ma ọ bụrụ na ha ga-aghọ ndị toruru ogo mmadụ bụ́ ndị na-enwe ihe ịga nke ọma.
N’ikpeazụ, gịnị banyere “echiche nke na e nwere omenala ezinụlọ a ga-akwado”? Ọ dị ụmụ gị mkpa ịghọta na e nwere ụkpụrụ dị iche iche nke ezinụlọ a na-atụ anya ka ha kwado—na a dịghị anabata ụdị akparamagwa, okwu, uwe, omume ụfọdụ, na ihe ndị ọzọ, na ha na-emebikwa omenala ezinụlọ. Ọ dị mkpa ka ha mata na imebi omenala ezinụlọ bụ oké ihe—na ọ ga-ewute gị nke ukwuu, dị ka o wutere nna ochie ahụ bụ Jekọb, onye ụmụ ya ndị ikom site n’akparamagwa ha na-eweta ihere mere ka o ‘sie ísì n’etiti ndị bi n’ala ahụ.’—Jenesis 34:30.
Nna ụmụ isii ahụ nke lere ụmụ ya anya dị ka ihe onwunwe Chineke mesiri “omenala ezinụlọ” ike karịsịa. Mgbe mgbe o so ụmụ ya atụgharị uche banyere ụzọ ụkpụrụ ezinụlọ n’uwe, ejiji, nnọpụiche site n’ụzọ nile nke ụwa si kwekọọ ná mmụọ na nduzi nke Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke. N’ihi oge, ịhụnanya, nchegbu mmiri emi, dị ukwuu o nyere ha—ịbụ ndị a zụrụ n’ụzọ ha ga-ejeso—ụmụ isii dum ahụ azaghachiwo site ‘n’ịghara isi n’ime ya wezụga onwe ha.’—Ilu 22:6.
Gburugburu ụwa, e nwere ọtụtụ puku nke njikọ ezinụlọ ndị dị otú ahụ siri ike. Lee aha otuto ndị a na-ewetara Onye Okike ha, leekwa aha ụgwọ ọrụ ọ bụụrụ nne na nna na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha nanị, ndị na-ahụ n’anya! Ka afọ na-agabiga, ụmụaka riteworo uru site ná mgbalị nile nke ndị mụrụ ha na-enwewanye ekele maka nne na nna ndị dị otú a. Biko tụlezie akụkọ nke otu nwanyị nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere, rịbakwa ama ihe mmụta ndị bara uru a pụrụ ịmụta na ya.