AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EKLIZIASTIS 7-12
“Cheta Onye Okike Ukwu Gị n’Oge Ị Bụ Okorobịa”
Jiri ike na amamihe i nwere n’oge okorobịa jeere Onye Okike Ukwu gị ozi
Ọtụtụ ndị na-eto eto nwere ikike ha ga-eji rụọ ọrụ ndị siri ike n’ọgbakọ Jehova
Ndị na-eto eto kwesịrị iji oge ha na ike ha jeere Jehova ozi tupu nká abịa
Sọlọmọn ji ihe atụ dị iche iche kọwaa nsogbu ya na nká so aga
Amaokwu nke 3: “Mgbe anya gbaworo ndị inyom na-elepụ anya na windo ọchịchịrị”
Ha anaghịzi ahụcha ụzọ
Amaokwu nke 4: “Mgbe olu ụmụ nwaanyị niile na-abụ abụ na-adịkwaghị adapụta adapụta”
Ha anaghịzi anụcha ihe
Amaokwu nke 5: “Mkpụrụ osisi kepa agbawaakwa”
Nri anaghịzi atọcha ha ụtọ