Ndị Ntorobịa Ndị Na-echeta Onye Kere Ha
“Chetakwa Onye keworo gị n’ụbọchị nile ị dị n’okorobịa.”—EKLISIASTIS 12:1.
1. Okwu ndị dị aṅaa nke onye dị afọ 11 na-ekpughe na Onye Kere anyị dị adị n’ezie nye ya?
LEE ka o si maa mma mgbe ndị na-eto eto na-ekwu okwu ma na-eme omume n’ụzọ na-egosi na ha weere Jehova Chineke dị ka onye dị adị n’ezie bụ́ onye ha nwere mmasị n’ebe ọ nọ ma chọọ ime obi ụtọ! Otu nwa okoro dị afọ 11 kwuru, sị: “Mgbe m nọ nanị m ma lepụ anya na window, m na-ahụ otú ihe okike Jehova si dị ebube. Mgbe ahụ m na-arọ nrọ otú Paradaịs ga-esi maa mma n’ọdịnihu nakwa banyere otú m pụrụ isi metụ ụmụ anụmanụ aka mgbe ahụ.” (Aịsaịa 11:6-9) Ọ gbakwụnyere: “Mgbe m nọ nanị m, m na-ekpegara Jehova ekpere. Amaara m na ọ gaghị eweso m iwe maka ịgwa ya okwu mgbe nile. Amaara m na ọ nọ n’ebe ahụ mgbe nile na-ele m anya.” Onye Okike anyị ọ̀ dị adị n’ezie nye gị dị ka ọ dị nye nwa okoro a?
Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Chineke Dị Adị n’Ezie Nye Gị?
2. (a) Olee otú Onye Kere anyị pụrụ isi ghọọ onye dị adị n’ezie nye gị? (b) Òkè dị aṅaa ka ndị nne na nna pụrụ ikere n’inyere ụmụ ha aka ịghọta na Chineke bụ onye dị adị n’ezie?
2 Ka Jehova na nkwa ya nile wee dị adị n’ezie nye gị, ị ghaghị ibu ụzọ mụta banyere ya na ọdịnihu dị ebube ọ na-eche gị n’ihu n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Bible na-akọwa. (Mkpughe 21:3, 4) Ọ bụrụ na ndị mụrụ gị akụziworo gị banyere ihe ndị a, i nwere ihe mere ị ga-eji enwe ekele n’ihi na nke a na-eme ka i nwee ike ịṅa ntị n’iwu ahụ e nyere n’ike mmụọ nsọ: “Chetakwa Onye keworo gị.” (Eklisiastis 12:1, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Otu onye ntorobịa kwuru banyere ọzụzụ ndị mụrụ ya nyere ya na nwata, sị: “Ihe ọ bụla ná ndụ na-alaghachite mgbe nile n’ebe Jehova nọ. Nke a bụ ihe bụ isi dị ná ncheta m na-echeta Onye Kere m.” Otu nwa agbọghọ ọzọ kwuru, sị: “M ga-anọgide na-enwe ekele nye ndị mụrụ m maka ịkụziri m na Jehova bụ onye dị adị n’ezie. Ha gosiri m otú m ga-esi hụ ya n’anya ma gwa m banyere ọṅụ nke ijere ya ozi oge nile.”
3, 4. Gịnị pụrụ inyere gị aka iche banyere Jehova dị ka onye dị adị n’ezie?
3 Ma, ọ na-esiri ọtụtụ ike iche banyere Chineke dị ka onye dị adị n’ezie nke nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ọ̀ na-esiri gị ike? E nyeere otu onye ntorobịa aka iche banyere Chineke n’ụzọ metụtara ya onwe ya site n’okwu a dị n’Ụlọ Nche: “Ayi amagh otu Jehova Chineke ra n’ibù n’anu aru ya.” Otú ọ dị, ịdị ukwuu Chineke adịghị adabere n’otú ọ hà ma ọ bụ n’ọdịdị ya, dị ka ahịrịokwu na-esonụ n’Ụlọ Nche ahụ kwuru: “Idi-uku-Ya n’ezie di n’ibu udi Chineke nke ọ bu,” n’ezie, Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, nwere ọmịiko, na-ahụ n’anya, ma na-agbaghara.a (Ọpụpụ 34:6; Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 86:5; Jemes 5:11) Ị̀ bịawo were Jehova dị ka ụdị onye ahụ, enyi ị tụkwasịrị obi onye ị pụrụ isoro nwee mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa?—Aịsaịa 41:8; Jemes 2:23.
4 Jisọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya nke oge mbụ aka isoro Chineke nwee mmekọrịta onwe onye. N’ihi ya, mgbe Jọn onyeozi dere banyere mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe nke ọ tụrụ anya ya, Jọn kwuru, sị: “Anyị ga-abụ ndị yiri [Chineke]; n’ihi na anyị ga-ahụ Ya otú Ọ dị.” (1 Jọn 3:2; 1 Ndị Kọrint 15:44) A pụkwara inyere ndị ntorobịa taa aka iwere Chineke dị ka onye dị adị n’ezie, onye ha pụrụ ịmara nke ọma ọ bụ ezie na ha apụghị ịhụ ya anya n’onwe ha. Otu nwa okorobịa kwuru, sị: “Ndị mụrụ m nyeere m aka icheta Jehova site n’ịjụ ọtụtụ ajụjụ, dị ka, ‘Gịnị ka Jehova ga-ekwu? Olee otú ị ga-esi kọwaa ya n’okwu nke aka gị? Gịnị ka nke ahụ pụtara?’” Ọ̀ bụ na ajụjụ ndị dị ka ndị a adịghị eme ka anyị chee echiche banyere mmekọrịta onwe anyị na Chineke?
Ihe Icheta Pụtara
5. Ihe atụ ndị dị aṅaa nke Bible na-egosi na icheta mmadụ gụnyere ihe karịrị icheta aha ya?
5 Ịṅa ntị n’iwu ahụ, bụ́ ‘Chetakwa, Onye keworo gị,’ pụtara ihe karịrị nanị iche echiche banyere Jehova. Ọ gụnyere ime ihe, ime ihe na-atọ ya ụtọ. Mgbe omempụ ahụ rịọrọ Jisọs, ‘Cheta m mgbe ọ bụla Ị ga-abịa n’alaeze Gị,’ ọ chọrọ ka Jisọs mee ihe karịrị icheta aha ya. Ọ chọrọ ka Jisọs mee ihe, ịkpọlite ya n’ọnwụ. (Luk 23:42) N’otu aka ahụ, Josef ahụ a tụrụ mkpọrọ tụrụ anya ụfọdụ ihe a ga-emere ya mgbe ọ gwara onye na-eburu Fero iko ka o cheta ya n’ihu Fero. Mgbe Job rịọkwara Chineke, sị, ‘Cheta m,’ Job nọ na-arịọ na n’otu oge n’ọdịnihu, Chineke ga-eme ihe iji kpọlite ya n’ọnwụ.—Job 14:13; Jenesis 40:14, 23.
6. Olee otú okwu Hibru maka “cheta” si enye echiche nke mmetụta ịhụnanya maka ihe ma ọ bụ onye e chetara?
6 Otu akwụkwọ sịrị na okwu Hibru ahụ a sụgharịrị “cheta” na-enyekarị echiche nke “mmetụta ịhụnanya nke uche na ime ihe nke na-eso ncheta ihe agakọ.” Echiche ahụ nke “mmetụta ịhụnanya” na-enye n’okwu ahụ bụ́ “cheta” bụ nke a pụrụ ịhụ n’iti mkpu nke “ìgwè ndị gwara ọgwa” n’ọzara, sị: ‘Anyị na-echeta azụ̀ nke anyị na-eri n’Ijipt!’ Dị ka Job rịọrọ ka Chineke jiri ihu ọma cheta ya, otú ahụ ka Hezekaịa, Nehemaịa, Devid, na ọbụ abụ a na-akpọghị aha sikwa rịọ ka Jehova jiri mmetụta ịhụnanya cheta ha maka ikwesị ntụkwasị obi ha.—Ọnụ Ọgụgụ 11:4, 5; 2 Ndị Eze 20:3; Nehemaịa 5:19; 13:31; Abụ Ọma 25:7; 106:4.
7. Ọ bụrụ na anyị ejiri mmetụta ịhụnanya cheta Chineke, olee otú nke a ga-esi metụta àgwà anyị?
7 Ya mere anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘Anyị ji mmetụta ịhụnanya na-echeta Onye Kere anyị ma na-ezere ime ihe ọ bụla ga-akpasu ya iwe ma ọ bụ ga-ewetara ya ihe mgbu?’ Otu onye ntorobịa kwuru, sị: “Nne m nyeere m aka ịmata na Jehova nwere mmetụta, mgbe m dịkwa na nwata, amaara m na omume m metụtara ya.” (Abụ Ọma 78:40-42) Onye ọzọ kọwara, sị: “Amaara m na ihe m na-eme ga-enye aka ma ọ bụ ga-egbochi azịza nye ịma aka nke Setan mara Jehova. Achọrọ m ime ka obi Jehova ṅụrịa, ya mere nke ahụ nyeere m aka ma nọgide na-enyere m aka taa.”—Ilu 27:11.
8. (a) Nchụso dị aṅaa ga-egosi na anyị ji mmetụta ịhụnanya na-echeta Jehova? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ndị ntorobịa ga-eji amamihe tụlee?
8 N’ezie, n’ajọ ụwa nke a, ọ naghị adị mfe mgbe nile icheta Jehova site n’ikere òkè zuru ezu n’ọrụ na-atọ ya ụtọ. Ma lee otú ọ ga-esi dị mma ma ọ bụrụ na ị pụrụ iṅomi Timoti na-eto eto nke narị afọ mbụ—ka a gharazie ịkpọtụ aha ọtụtụ puku ndị ntorobịa na-atụ egwu Chineke taa—site n’ịchụso ije ozi ndị Kraịst oge nile dị ka onye ozi ọsụ ụzọ! (Ọrụ 16:1-3; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:2) Otú ọ dị, a pụrụ ịjụ, sị, Ị̀ ga-enwe ike ịkwado onwe gị n’ozi ọsụ ụzọ? Ọ̀ bụrụkwa na ị lụọ di ma ọ bụ nwunye, ị̀ ga-enwe nkà iji nye ndị nọ n’ezinụlọ gị ihe na-akpa ha? (1 Timoti 5:8) Ndị a bụ ajụjụ dị mkpa, ọ dịkwa oké mkpa na i chebasiiri ha echiche ike.
Agụmakwụkwọ Nwere Nzube
9. Mkpebi dị aṅaa na-eche ndị ntorobịa ihu banyere agụmakwụkwọ ụwa?
9 Ka ọha mmadụ na-agbagwojukwu anya, ọ pụrụ ịdị mkpa inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu nke agụmakwụkwọ iji nweta ọrụ zuru ezu iji kwadoo onwe gị n’ọrụ ọsụ ụzọ. Ọ pụrụ ịbụ na ị rịbawo ama na ọbụna ndị nwere agụmakwụkwọ mahadum aghaghị ịgụkwu akwụkwọ iji nweta nkà ọhụrụ nke ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ taa na-eji akpọrọ ihe. Ya mere agụmakwụkwọ hà aṅaa ka unu ndị na-eto eto bụ́ ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ga-achụso? E kwesịrị ime mkpebi ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-eburu iwu ahụ e nyere n’ike mmụọ nsọ n’uche: ‘Chetakwa Onye keworo gị.’
10. Gịnị bụ agụmakwụkwọ kasị mma anyị pụrụ inweta?
10 Otú ọ dị, ị ga-achọ ịchụso ihe ọbụna ọtụtụ ọkachamara nke ụwa weere dị ka agụmakwụkwọ kasị mma—nke a na-enweta site n’iji nlezianya mụọ Okwu Chineke. Onye Germany na-ede ihe bụ́ Johann Wolfgang von Goethe kwuru, sị: “Ka mmụba ọgụgụ isi nke [ụmụ mmadụ] na-adịwanye ukwuu karị, otú ahụ ka ọ na-ekwekwa omume n’ụzọ zuru ezu karị iji Bible eme ihe ma dị ka ntọala ma dị ka ngwá ọrụ nke agụmakwụkwọ.” Ee, ịmụ Bible ga-akwadebe gị n’ụzọ ka mma maka ndụ karịa ka agụmakwụkwọ ọ bụla ọzọ ga-eme!—Ilu 2:6-17; 2 Timoti 3:14-17.
11. (a) Gịnị bụ ọrụ kasị mkpa anyị pụrụ ịrụ? (b) Gịnị mere otu onye ntorobịa ji họrọ ịgụtụ akwụkwọ?
11 Ebe ọ bụ na ihe ọmụma nke Chineke na-enye ndụ, ọrụ kasị mkpa ị pụrụ ịrụ taa bụ isoro ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma ahụ. (Ilu 3:13-18; Jọn 4:34; 17:3) Otú ọ dị, iji mee nke a n’ụzọ dị irè, ọ dị gị mkpa ịbụ onye e ziri ihe n’ụzọ ndị bụ isi. Ọ dị gị mkpa inwe ike iche echiche nke ọma, ikwu okwu n’ezi uche, nakwa ịgụ na ide ihe nke ọma—nkà ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ. Ya mere were ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ gị kpọrọ ihe, dị ka Tracy, otu onye ntorobịa na Florida, U.S.A., mere, bụ́ onye nwetara akara kasị mma mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu. O kwupụtara olileanya ya, sị: “Anọwo m mgbe nile na-enwe dị ka ihe mgbaru ọsọ m ịbụ onye na-ejere Chineke m bụ́ Jehova ozi oge nile, enwekwara m olileanya na agụmakwụkwọ m ga-enyere m aka iru ihe mgbaru ọsọ a.”
12. Ọ bụrụ na a họrọ inwekwu agụmakwụkwọ ụwa, nzube dị aṅaa ka ọ pụrụ inye aka imezu?
12 Ì chewo echiche ihe mere i ji na-aga akwụkwọ? Ọ̀ bụ n’ụzọ bụ isi iji kwadebe onwe gị ịghọ onye ozi dị irè nke Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-achọ ichesi echiche ike banyere otú agụmakwụkwọ gị si na-emezu nzube a n’ụzọ dị mma. Mgbe i sooro ndị mụrụ gị kparịtasịa ya, a pụrụ ikpebi na i kwesịrị ịchụso agụmakwụkwọ gafere nke kasị nta iwu chọrọ. Ụdị agụmakwụkwọ ntụkwasị ahụ pụrụ inyere gị aka inweta ọrụ iji kwadoo onwe gị ma nyekwa gị oge na ume iji kerezuo òkè n’ọrụ Alaeze.—Matiu 6:33.
13. Olee otú ndị Russia abụọ bụ́ ndị Kraịst ndị chọrọ inwetakwu agụmakwụkwọ si gosi nzube ha ná ndụ?
13 Ụfọdụ ndị na-achọ inwetakwu agụmakwụkwọ na-eje ozi oge nile ọbụna mgbe ha na-agụkwu akwụkwọ. Tụlee banyere Nadia na Marina, ụmụ agbọghọ abụọ nọ n’afọ iri na ụma bi na Moscow, Russia. E mere ha abụọ baptism n’April 1994, ha malitekwara ije ozi dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ inyeaka. Ntakịrị oge mgbe nke ahụ gasịrị ha gụsịrị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu ma debanye aha ha n’usoro ihe ọmụmụ ime ndekọ ego nke na-ewe afọ abụọ. Na May 1995 ha malitere ọsụ ụzọ oge nile, ma ha nọgidere na-enwe nkezi akara ule kasị mma n’ihe ọmụmụ ha nke ime ndekọ ego. Ọzọkwa, ha nwere ike iduzi, n’etiti ha abụọ, nkezi nke ọmụmụ Bible 14 kwa izu mgbe ha ka na-aga akwụkwọ. Ụmụ agbọghọ ahụ na-enwe olileanya na agụmakwụkwọ ha n’ọmụmụ ime ndekọ ego ga-eme ka ha nwee ike inweta ọrụ dị mma, ka ha wee nwee ike ịkwado onwe ha n’ozi oge nile.
14. N’agbanyeghị ọ̀tụ̀tụ̀ nke agụmakwụkwọ ụwa anyị họọrọ, gịnị kwesịrị ịbụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị?
14 Ọ bụrụ na ị chụsoo agụmakwụkwọ ụwa gabiga ihe iwu chọrọ, jiri amamihe nyochaa ihe mere i ji na-eme otú ahụ. Ọ̀ bụ iji meere onwe gị aha ma nweta ụba ihe onwunwe? (Jeremaịa 45:5; 1 Timoti 6:17) Ka ọ̀ bụ ihe mgbaru ọsọ gị iji inwetakwu agụmakwụkwọ gị kerekwuo òkè n’ụzọ zuru ezu n’ozi Jehova? Lydia, otu onye ntorobịa họọrọ ịgụkwu akwụkwọ, kwupụtara nlekwasị anya mara mma n’ihe ime mmụọ, na-akọwa, sị: “Ndị ọzọ na-achụso agụmakwụkwọ dị elu ma kwee ka ịhụ ihe onwunwe n’anya gbochie ha, ha echefuwokwa Chineke. Nye m, mmekọrịta mụ na Chineke bụ ihe kasị mkpa.” Lee àgwà kwesịrị ịja mma nke ahụ bụ nye anyị nile!
15. Ọzụzụ dị iche iche dị aṅaa nke agụmakwụkwọ ka e nwere n’etiti ndị Kraịst narị afọ mbụ?
15 N’ụzọ dị ịrịba ama, ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere nzụlite agụmakwụkwọ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ndị ozi bụ́ Pita na Jọn bụcha ndị e weere dị ka “ndị na-amaghị ihe na ndị na-amụtaghị akwụkwọ hie nne” n’ihi na a zụghị ha n’ụlọ akwụkwọ ndị rabaị. (Ọrụ 4:13) N’aka nke ọzọ, Pọl onyeozi nwetara ihe a pụrụ iji tụnyere agụmakwụkwọ mahadum taa. Ma, Pọl ejighị agụmakwụkwọ ahụ dọrọ mmasị gaa n’ebe onwe ya nọ; kama nke ahụ, ọ bụ ihe bara uru mgbe o mere nkwusa nye ndị nọ n’ọkwá dị iche iche nke ndụ. (Ọrụ 22:3; 1 Ndị Kọrint 9:19-23; Ndị Filipaị 1:7) N’otu aka ahụ, Manaen, onye “a zụkọrọ ya na Herọd, bụ́ tetrarch,” so n’ime ndị butere ụzọ n’ọgbakọ Antiọk.—Ọrụ 13:1.
Gịnị Mere Ị Ga-eji Were Ego Gị Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe?
16. (a) Gịnị mere ọ pụrụ iji sikwuo ike icheta Onye Kere anyị ma anyị jiri ụgwọ? (b) Olee otú otu n’ime ilu Jisọs si na-ekpughe ịdị mkpa nke iche echiche tupu anyị emefuo ego?
16 Ọ bụrụ na i jighị ego gị mee ihe n’ụzọ amamihe, ọ pụrụ isikwuru gị ike icheta Onye Kere gị site n’ime ihe na-atọ ya ụtọ. N’ihi na ọ bụrụ na i jide ụgwọ, a pụrụ ikwu na i nwere nna ukwu ọzọ. Bible na-akọwa, sị: “Gbaziri ego, ị bụkwa ohu onye gbazinyere gị ya.” (Ilu 22:7, Today’s English Version) Otu n’ime ilu Jisọs mere ka mkpa nke iche echiche tupu anyị emefuo ego pụta ìhè. “Ònye n’ime unu,” ka Jisọs kwuru, “nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma o nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya? Ka ndị nile ndị na-ahụ ya wee ghara ịmalite ime ya ihe ọchị ma eleghị anya, mgbe ọ tọsịrị ntọala ya, ma o nweghị ike iwuzu ya.”—Luk 14:28, 29.
17. Gịnị mere ọ na-eji esikarị ike ịchịkwa mmefu ego mmadụ?
17 Ya mere, n’ụzọ amamihe, ị ga-agbalị ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ ‘ịghara iji onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya.’ (Ndị Rom 13:8) Ma nke a rara ahụ omume, karịsịa mgbe ihe ndị ọhụrụ a nọgidere na-emepụta na-eche gị ihu bụ́ nke ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-azọrọ na ha dị gị mkpa n’ezie. Otu nna, bụ́ onye gbalịworo inyere ụmụ ya aka igosi nghọta, kwuru, sị: “Anyị etinyewo oge dị ukwuu n’ikwurịta ihe bụ mkpa na ihe bụ ihe a chọrọ.” Ụlọ akwụkwọ n’ozuzu ha akụzibeghị ụdị ihe ndị ahụ, na-enye ntakịrị ntụziaka ma ọ bụrụ na ọ dị nke e nyedịrị n’otú a ga-esi eji ego eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. “Anyị na-agụsị akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu na-ama banyere isosceles triangle karịa otú e si echekwa ego,” ka otu onye ọrụ ebere kwuru. Gịnịzi pụrụ inyere gị aka imefu ego n’ụzọ amamihe?
18. Gịnị bụ isi ihe dị n’iji ego eme ihe n’amamihe, n’ihi gịnịkwa?
18 Ịṅa ntị n’agbamume ahụ bụ́, ‘Chetakwa Onye keworo gị,’ bụ isi ihe dị n’iji ego gị eme ihe n’ụzọ amamihe. Nke a bụ n’ihi na mgbe i rubere isi n’iwu ahụ, ihe mbụ ị na-eme bụ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, mmetụta ịhụnanya gị maka ya na-emetụtakwa otú i si emefu ego gị. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, ị ga-agbalị ghara ikwe ka ihe ị chọrọ gbochie gị iji mkpụrụ obi gị dum nye Chineke nsọpụrụ. (Matiu 16:24-26) Ị ga-agbalịsi ike ime ka anya gị ‘na-ele otu ebe,’ ya bụ, na-elekwasị anya nke ọma n’Alaeze Chineke na ime ihe ọ na-achọ. (Matiu 6:22-24) Ị ga-esi otú a bịa were ndụmọdụ Chineke ahụ bụ́ “sọpụrụ Jehova site n’akụ̀ gị” dị ka ihe ùgwù na-enye ọṅụ.—Ilu 3:9.
Ndị Ntorobịa Kwesịrị Nṅomi
19. Olee otú ndị ntorobịa n’oge gara aga siworo cheta Onye Kere ha?
19 N’ụzọ na-eme obi ụtọ, ọtụtụ ndị ntorobịa, n’oge gara aga na ugbu a, echetawo Onye Kere ha. Nwatakịrị bụ́ Samuel nọgidesiri ike n’ozi ụlọikwuu n’agbanyeghị mmetụta rụrụ arụ nke ndị o so na-eje ozi. (1 Samuel 2:12-26) Nwanyị na-adọrọ adọrọ nke na-anwa ọnwụnwa, bụ́ nwunye Pọtịfa, apụghị ịrata nwa okoro bụ́ Josef ịkwa iko. (Jenesis 39:1-12) Ọ bụ ezie na ọ bụ “nwata,” Jeremaịa ji obi ike mee nkwusa n’ihu mmegide siri ike. (Jeremaịa 1:6-8) Otu nwa agbọghọ nta Israel duziri ọchịagha bụ́ onye Siria n’atụghị egwu ịchọ enyemaka n’Israel, n’ebe ọ pụrụ ịmụ ihe banyere Jehova. (2 Ndị Eze 5:1-4) Daniel na-eto eto na ndị enyi ya jigidere okwukwe ha mgbe e lere ha ule n’iwu Chineke banyere nri. Ndị ntorobịa bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego họkwaara ịbụ ndị a tụbanyere n’oké ọkụ kama imebi iguzosi ike n’ihe ha nye Chineke site n’ịkpọ isiala n’ihu otu ihe onyinyo.—Daniel 1:8, 17; 3:16-18; Ọpụpụ 20:5.
20. Olee otú ọtụtụ ndị ntorobịa siworo cheta Onye Kere ha taa?
20 Taa ihe karịrị 2,000 ndị ntorobịa nọ n’afọ 19 ruo 25 na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova dị na New York State, U.S.A. Ha bụ nanị otu akụkụ dị nta nke ọtụtụ iri puku nke ndị na-eto eto bụ́ ndị na-echeta Onye Kere ha n’ụwa nile. Dị ka Josef oge ochie, ha ajụwo imebi ịdị ọcha nke omume ha. Ọtụtụ erubeworo Chineke isi karịa mmadụ mgbe a manyere ha ịhọrọ onye ha ga-efe. (Ọrụ 5:29) Na 1946 na Poland, Henryka Zur dị afọ 15 bụ onye e mekpọrọ ọnụ mgbe ọ jụrụ ime omume ikpere arụsị nke okpukpe. “Chee n’ime onwe gị ihe ọ bụla ọ masịrị gị,” ka otu onye n’ime ndị mekpọrọ ya ọnụ kwuru, “nanị mee akara nke obe nke Katọlik.” N’ihi na ọ jụrụ, a dọkpụụrụ ya banye n’oké ọhịa ma gbagbuo ya, na-ejisi olileanya ya e ji n’aka nke ndụ agwụghị agwụ ike!b
21. Ọ̀kpụkpọ òkù ndị dị aṅaa ka ọ ga-abụ ihe amamihe ịnara, na-arụpụta gịnị?
21 Lee ka ndị na-eto eto chetaworo Jehova n’ime narị afọ ndị a na-aghaghị isiworị mee ka obi ya ṅụrịa! Ị̀ ga-azaghachi n’ọkpụkpọ òkù ya, bụ́ ‘Chetakwa Onye keworo gị’? N’ezie o kwesịrị ịbụ onye i chetara! Chee echiche kwa ụbọchị banyere ihe nile o mewooro gị ma ka ga-eme, narakwa ọkpụkpọ òkù ya bụ́: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”—Ilu 27:11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ụlọ Nche, May 1954, peji nke 68.
b Lee 1994 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 217-218, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú a pụrụ isi nyere ndị ntorobịa aka iwere Chineke dị ka onye dị adị n’ezie?
◻ Gịnị ka icheta Onye Kere gị pụtara?
◻ Nzube dị aṅaa ka agụmakwụkwọ anyị kwesịrị imezu?
◻ Gịnị mere o ji dị mkpa iji ego eme ihe n’ụzọ amamihe?
◻ Ndị ntorobịa dị aṅaa kwesịrị ka i ṅomie ha?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ì chewo echiche banyere ihe mere i ji na-aga akwụkwọ?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ị̀ na-amụta iji ego eme ihe n’ụzọ amamihe?