“Ihe Ọ Bụla Nwere Oge”
“Ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe.”—EKLISIASTIS 3:1.
1. Olee ihe isi ike ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe, na gịnịkwa ka nke a dugaworo n’ọnọdụ ụfọdụ?
NDỊ mmadụ na-asịkarị, “Agaara m emewo ya kemgbe.” Ma ọ bụ ikekwe mgbe ihe mecharala, ha asị, “Agaara m echeretụ.” Mmeghachi omume ndị dị otú ahụ na-egosi ihe isi ike ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe n’ịmara oge kwesịrị ekwesị iji mee ihe ụfọdụ. Erughị eru a emewo ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya dakpọọ. O dugawo ná ndakpọ olileanya na obi nkoropụ. Nke kasịkwa njọ, o belatawo okwukwe ụfọdụ ndị nwere n’ebe Jehova na nzukọ ya nọ.
2, 3. (a) N’ihi gịnị ka ịnakwere mkpebi Jehova banyere oge ji bụrụ ihe amamihe? (b) Olee echiche ziri ezi anyị kwesịrị inwe banyere mmezu amụma Bible?
2 N’ịbụ onye nwere amamihe na nghọta nke ụmụ mmadụ na-enweghị, Jehova nwere ikike nke ibu ụzọ mara ihe ga-esi n’omume ọ bụla apụta, ma ọ bụrụ na ọ chọọ. Ọ pụrụ ịmara “ikpeazụ site na mbụ.” (Aịsaịa 46:10) N’ihi ya, ọ pụrụ ịhọrọ oge kasị mma iji mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime n’ehieghị ụzọ. Ya mere, kama ịtụkwasị obi n’echiche ngụkọ oge anyị bụ́ nke nwere ntụpọ, anyị ga-abụ ndị nwere amamihe ịnakwere mkpebi Jehova banyere oge!
3 Dị ka ihe atụ, ndị Kraịst tozuru okè na-eji iguzosi ike n’ihe echere oge Jehova maka imezu amụma Bible ụfọdụ. Ha na-agba mbọ n’ozi ya, na-eburu nnọọ ụkpụrụ ahụ dị n’Abụ Ákwá 3:26 n’uche mgbe nile, bụ́: “Ọ dị mma ka mmadụ chere nzọpụta Jehova, derekwa duu n’ichere ya.” (Tụlee Habakuk 3:16.) N’otu mgbe ahụ, ha kwenyesiri ike na mmezu ikpe Jehova a mara ọkwa ya, “ọ bụrụ na ọ laa azụ, . . . ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakuk 2:3.
4. Olee otú Emọs 3:7 na Matiu 24:45 kwesịrị isi nyere anyị aka iji ndidi na-echere Jehova?
4 N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị aghọtachaghị akụkụ Bible ụfọdụ ma ọ bụ nkọwa ndị e nyere ná mbipụta dị iche iche nke Watch Tower, ọ̀ dị ihe mere anyị ga-eji ghara inwe ndidi? Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ichere oge Jehova maka ime ka ihe doo anya. “N’ezie Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.” (Emọs 3:7) Lee nkwa magburu onwe ya ọ bụ! Ma anyị aghaghị ịghọta na Jehova na-ekpughe izu nzuzo ya n’oge o lere anya dị ka oge kwesịrị ekwesị. N’ihi nzube ahụ, Chineke enyela “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ikike inye ndị ya “ihe [ime mmụọ] e ji azụ ha n’oge ya.” (Matiu 24:45, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-echegbubiga onwe anyị ókè, ma ọ bụkwanụ na-enwe mgbakasị ahụ, n’ihi na a kọwaghị ihe ụfọdụ n’ụzọ zuru ezu. Kama nke ahụ, anyị pụrụ inwe obi ike na ọ bụrụ na anyị ejiri ndidi chere Jehova, ọ ga-eweta ihe dị mkpa “n’oge ya,” site n’aka ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi.
5. Uru dị aṅaa ka ịtụle Eklisiastis 3:1-8 ga-aba?
5 Eze Solomọn nwere amamihe kwuru banyere ihe 28 dịgasị iche, bụ́ ndị nke ọ bụla n’ime ha nwere “oge” ya. (Eklisiastis 3:1-8) Ịghọta ihe okwu Solomọn pụtara na ihe ọ na-egosi ga-enyere anyị aka ịmara oge e kwesịrị na oge a na-ekwesịghị ime ihe ụfọdụ, site n’otú Chineke si ele ha anya. (Ndị Hibru 5:14) N’aka nke ya, nke ahụ ga-enye anyị ohere ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na ya.
“Mgbe Ịkwa Ákwá, na Mgbe Ịchị Ọchị”
6, 7. (a) Gịnị na-eme ka ndị na-enwe nchegbu taa ‘na-akwa ákwá’? (b) Olee otú ụwa si anwa ibelata ọnọdụ ọjọọ nke ọ nọ na ya?
6 Ọ bụ ezie na e nwere “mgbe ịkwa ákwá, na mgbe ịchị ọchị,” olee onye nke abụọ ahụ na-adịghị amasị karịa nke mbụ ahụ? (Eklisiastis 3:4) Ọ dị mwute ikwu na anyị na-ebi n’ụwa nke kasị ewetara anyị ihe ga-eme ka anyị kwaa ákwá. Usoro mgbasa ozi na-ebukarị akụkọ ndị na-akụda mmụọ. Obi na-amapụ anyị n’ụjọ mgbe anyị na-anụ banyere ndị na-eto eto na-agba ụmụ akwụkwọ ibe ha égbè n’ụlọ akwụkwọ, banyere ndị nne na nna na-emetọ ụmụ ha, banyere ndị na-eyi ọha egwu na-egbu ma ọ bụ na-akwarụ ndị aka ha dị ọcha ahụ, nakwa banyere ihe ndị a sị na ha bụ ọdachi na-emere onwe ha na-ala ndụ ụmụ mmadụ na ihe onwunwe n’iyi. Anyị amaghị ka ọ bụ ụmụaka agụụ na-ahịọ anya ka ọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ ka anyị ga-ekiri na telivishọn. Okwu ndị a na-amabughị dị ka nhichapụ agbụrụ, ọrịa AIDS, agha ndị e ji nje lụọ, na El Niño bụzi ihe na-akpata nchegbu n’uche na n’obi anyị—nke ọ bụla n’ụzọ nke ya.
7 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ụwa taa jupụtara n’ọdachi na obi mgbu. Otú o sina dị, dị ka a ga-asị na ọ bụ iji belata ịdị oké njọ nke ọnọdụ ahụ, site n’oge ruo n’oge ụlọ ọrụ na-emepụta ihe ntụrụndụ na-ewepụta ihe ndị na-enweghị isi ma dị njọ, bụ́ ndị na-egosikarị ihe rụrụ arụ na ihe ike, ndị e mepụtara iji raba anyị n’ileghara nhụsianya ndị ọzọ na-enwe anya. Ma a gaghị ewere mmụọ ejighị ihe akpọrọ ihe nke okwu nzuzu na ọchị ezé nke ntụrụndụ dị otú ahụ na-akpalite dị ka ezi ọṅụ. Ọṅụ nke bụ́ mkpụrụ nke mmụọ Chineke bụ nnọọ ihe ụwa Setan na-apụghị inye.—Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Efesọs 5:3, 4.
8. Ọ̀ bụ ịkwa ákwá ka ọ bụ ịchị ọchị ka ndị Kraịst taa kwesịrị ibute ụzọ? Kọwaa.
8 N’ịmata ọnọdụ ọjọọ ụwa nọ na ya, anyị pụrụ ịghọta na taa abụtụghị oge a ga-eji ịchị ọchị kpọrọ oké ihe. Ọ bụghị oge ibi ndụ nanị maka ntụrụndụ ma ọ bụ ikwe ka “ikpori ndụ” na-ebute nchụso ihe ime mmụọ ụzọ. (Tụlee Eklisiastis 7:2-4.) “Ndị na-eji ụwa mee ihe” kwesịrị ịdị “ka ha ejibigaghị ya ókè,” ka Pọl onyeozi kwuru. N’ihi gịnị? N’ihi na “ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.” (1 Ndị Kọrint 7:31) Ezi ndị Kraịst na-adị ndụ kwa ụbọchị na-amatazu ịdị mkpa nke oge anyị bi n’ime ha.—Ndị Filipaị 4:8.
N’agbanyeghị na Ha Na-akwa Ákwá, Ha Na-enwe Obi Ụtọ n’Ezie!
9. Ọnọdụ dị aṅaa dị mwute ka e nwere n’oge bu Iju Mmiri ahụ ụzọ, oleekwa ihe nke a pụtara nye anyị taa?
9 Ndị biri ndụ n’oge Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ enweghị echiche ziri ezi banyere ndụ. Ha nọ na-ebiri ndụ ha kwa ụbọchi ma jụ ịkwa ákwá n’ihi “ihe ọjọọ nke mmadụ [bụ́ nke] hiri nne n’ụwa,” jiri enweghị mmasị na-ekiri ihe na-emenụ ka “ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” (Jenesis 6:5, 11) Jisọs zoro aka n’ọnọdụ ahụ dị mwute, ma buo amụma banyere omume yiri nke ahụ n’ebe ndị nke oge anyị nọ. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopụ ha nile; otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:38, 39.
10. Olee otú ụmụ Israel dịrị ndụ n’oge Hagaị si gosi na ha ejighị oge Jehova kpọrọ ihe?
10 N’oge Hagaị, n’ihe dị ka afọ 1,850 mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ọtụtụ ụmụ Israel gosipụtara ejighị ihe kpọrọ ihe yiri nke ahụ maka ihe ime mmụọ. N’ịbụ ndị tinyere oge dị ukwuu n’ịchụso ọdịmma onwe onye, ha aghọtaghị na oge ha bi n’ime ya bụ oge ibute ọdịmma Jehova ụzọ. Anyị na-agụ, sị: “Ndị nke a sịrị, Oge ịbịa erughị, bụ́ oge iwu ụlọ Jehova. Okwu Jehova wee si n’aka Hagaị, bụ́ onye amụma, bịa, sị, Ọ̀ bụ oge unu nwere, unu onwe unu, ibi n’ụlọ unu a machitere osisi, mgbe ụlọ a bụ mkpọmkpọ ebe? Ma ugbu a, otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Tụkwasịnụ obi unu n’ụzọ nile unu.”—Hagaị 1:1-5.
11. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ onwe anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
11 Dị ka Ndịàmà Jehova taa, bụ́ ndị nwere ibu ọrụ na ihe ùgwù n’ihu Jehova dị ka ụmụ Israel nke oge Hagaị, anyị ga-emekwa nke ọma ịtụkwasị obi anyị n’ụzọ anyị nile, na-eme ya n’ụzọ iji ihe akpọrọ ihe. Ànyị ‘na-akwa ákwá’ n’ihi ọnọdụ ụwa na nkọcha ha na-ewetara aha Chineke? Ọ̀ na-ewute anyị mgbe ndị mmadụ na-agọnahụ ịdị adị nke Chineke ma ọ bụ mgbe ha ji ịgba isi akwara na-eleghara ụkpụrụ ezi omume ya anya? Ànyị na-emeghachi omume dị ka ndị ahụ a kara akara bụ́ ndị Ezikiel hụrụ n’ọhụụ afọ 2,500 gara aga? Anyị na-agụ banyere ha, sị: “Jehova wee sị [nwoke ahụ ji mpi ink nke odeakwụkwọ], Gabiga n’etiti obodo a, n’etiti Jerusalem, kaa akara n’egedege ihu nke ndị ahụ ndị na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme n’etiti ya.”—Ezikiel 9:4.
12. Olee ihe Ezikiel 9:5, 6 pụtara nye ndị mmadụ taa?
12 Ihe ihe ndekọ a pụtaara anyị taa na-edo anya mgbe anyị gụrụ ntụziaka e nyere ndị ikom isii ahụ ji anyụike agha: “Sonụ ya gabiga n’obodo a, tigbuokwa: anya unu emela ebere, unu enwekwala ọmịiko: gbusịsịanụ okenye na okorobịa na nwa agbọghọ na-amaghị nwoke na ụmụntakịrị na ndị inyom: ma unu abịarula nso onye ọ bụla nke akara ahụ dị ya n’ihu; ma n’ebe nsọ m ka unu ga-esi malite.” (Ezikiel 9:5, 6) Anyị ịlanarị mkpagbu ukwu ahụ ji ọsọ na-abịaru nso na-adabere n’anyị ịghọta na taa bụ n’ụzọ bụ́ isi, mgbe ịkwa ákwá.
13, 14. (a) Ụdị ndị dị aṅaa ka Jisọs na-asị na ha bụ ndị obi ụtọ dịịrị? (b) Kọwaa ihe mere i ji chee na nkọwa a dabara nnọọ adaba n’ebe Ndịàmà Jehova nọ.
13 N’ezie, eziokwu ahụ bụ́ na ndị ohu Jehova ‘na-akwa ákwá’ banyere ọnọdụ dị mwute nke ihe omume ụwa adịghị egbochi ha inwe obi ụtọ. Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie ha bụ ìgwè kasị enwe obi ụtọ n’ụwa. Jisọs nyere ihe ndabere maka inwe obi ụtọ mgbe ọ sịrị: “[Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, NW] . . . ndị na-eru újú: . . . ndị dị nwayọọ n’obi: . . . ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ na ya: . . . ndị ebere: . . . ndị dị ọcha n’obi: . . . ndị na-eme ka mmadụ na ibe ha dị n’udo: . . . ndị e sogbuworo n’ihi ezi omume.” (Matiu 5:3-10) E nwere ihe àmà hiri nne iji gosi na nkọwa a ka daba adaba n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, n’ozuzu ha, karịa ka o si daba n’ebe òtù okpukpe ọ bụla ọzọ nọ.
14 Ndị Jehova obi dị ụtọ nwere ihe mere ha ga-eji ‘na-achị ọchị’ karịsịa kemgbe e weghachiri ezi ofufe na 1919. N’ụzọ ime mmụọ, ha nwere ụdị ahụmahụ ahụ na-enye obi ụtọ nke ndị si Babilọn lọta na narị afọ nke isii T.O.A., nwere: “Mgbe Jehova mere ka ndị na-alọta na Zaịọn lọta, anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. Mgbe ahụ ọchị na-eju anyị ọnụ, iti mkpu ọṅụ na-ejukwa anyị ire: . . . Jehova emeworo anyị ihe ukwu; anyị na-aṅụrị ọṅụ.” (Abụ Ọma 126:1-3) Ma, ọbụna ka ha na-achị ọchị n’ụzọ ime mmụọ, Ndịàmà Jehova ji amamihe na-eburu ịdị mkpa nke oge ndị a n’uche. Ozugbo ụwa ọhụrụ ahụ bịara, ndị bi n’ụwa ‘ejidekwa ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,’ mgbe ahụ oge ga-eruwo mgbe ịchị ọchị ga-anọchi ịkwa ákwá ruo mgbe nile ebighị ebi.—1 Timoti 6:19; Mkpughe 21:3, 4.
“Mgbe Ịgbakụ, na Mgbe Ịnọrọ Mgbakụ n’Ebe Dị Anya”
15. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ji eme nhọrọ n’ụdị ndị enyi ha na-eme?
15 Ndị Kraịst na-eme nhọrọ banyere ụdị ndị ha na-eme enyi. Ha na-eburu ịdọ aka ná ntị Pọl n’uche: “Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Eze Solomọn maara ihe kwukwara, sị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.
16, 17. Olee otú Ndịàmà Jehova si ele ọbụbụenyi, ime mkpapụ, na alụmdi na nwunye anya, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
16 Ndị ndị ohu Jehova na-ahọrọ dị ka ndị enyi bụ ndị hụrụ Jehova na ezi omume ya n’anya otú ha onwe ha si hụ ya. Ọ bụ ezie na ha na-enwe ekele na ọṅụ ná mkpakọrịta nke ha na ndị enyi ha, ha na-eji amamihe ezere echiche nke ịnakwere ihe ọ bụla na nke ime ihe masịrị onye banyere ime mkpapụ, bụ́ nke a na-ahụkarị ná mba ụfọdụ taa. Kama imikpu onwe ha na ya dị ka mkpori ndụ na-adịghị emerụ ahụ, ha na-ele ime mkpapụ anya dị ka nzọụkwụ siri ike na-eduga n’alụmdi na nwunye bụ́ nke e kwesịrị iwere nanị mgbe mmadụ dị njikere n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ uche, na n’ụzọ ime mmụọ—nakwa mgbe o nweere onwe ya n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro—ịbanye ná mmekọrịta na-adịgide adịgide.—1 Ndị Kọrint 7:36.
17 Ụfọdụ pụrụ iche na ọ bụ ihe mgbe ochie bụ́ inwe echiche dị otú ahụ banyere ime mkpapụ na alụmdi na nwunye. Ma Ndịàmà Jehova adịghị ekwe ka nrụgide ndị ọgbọ metụta ụdị ndị enyi ha na-ahọrọ ma ọ bụ mkpebi ndị ha na-eme banyere ime mkpapụ na alụmdi na nwunye. Ha maara na “a [na-agụ] amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.” (Matiu 11:19) Jehova na-ama ihe kasị mma mgbe nile, n’ihi ya ha na-eji ndụmọdụ ya nke ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị” akpọrọ ihe. (1 Ndị Kọrint 7:39; 2 Ndị Kọrint 6:14) Ha na-ezere iji ọsọ abanye n’alụmdi na nwunye na-enwe echiche hiere ụzọ nke bụ́ na ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ nkewa bụ nhọrọ ndị a na-anabata ma ọ bụrụ na alụmdi na nwunye ahụ adakpọọ. Ha na-ewepụta oge ha ịchọ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị, na-aghọta na ozugbo ha kwere nkwa ọlụlụ, ha anọrọla n’okpuru iwu Jehova bụ́: “Ya mere ha abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ, kama ọ bụ otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”—Matiu 19:6; Mak 10:9.
18. Gịnị pụrụ ịbụ ihe a pụrụ iji malite alụmdi na nwunye obi ụtọ?
18 Alụmdi na nwunye bụ nkwekọrịta na-adịru ogologo ndụ mmadụ nke kwesịrị ka e jiri nlezianya mee atụmatụ maka ya. Nwoke ga-eji ezi uche jụọ onwe ya, sị, ‘Nwanyị a ò kwesịrị m n’ezie?’ Ma ihe ọzọ dị mkpa o kwesịrị ịjụ onwe ya bụ, ‘Èkwesịrị m nwanyị a n’ezie? Àbụ m onye Kraịst tozuru okè nke pụrụ igbo mkpa ime mmụọ ya?’ Mmadụ abụọ ahụ na-abanye n’alụmdi na nwunye nwere ibu ọrụ nke ịkwụrụ chịm n’ụzọ ime mmụọ n’ihu Jehova, na-enwe ikike nke iwulite nkekọ alụmdi na nwunye bụ́ ịgba nke Chineke ga-anakwere. Ọtụtụ puku ndị di na nwunye bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịgba akaebe na n’ihi mmesi ọ na-emesi ike inye enye karịa ịnara anara, ozi oge nile bụ ihe magburu onwe ya iji malite alụmdi na nwunye obi ụtọ.
19. N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst ji anọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye?
19 Ụfọdụ ndị Kraịst ‘na-anọrọ mgbakụ n’ebe dị anya’ site n’ịhọrọ ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi ozi ọma ahụ. (Eklisiastis 3:5) Ndị ọzọ na-ahapụ alụmdi na nwunye ruo mgbe ha chere na ha eruola eru n’ụzọ ime mmụọ inweta di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị. Ma ka anyị chetakwa ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye bụ́ ndị nkekọ na uru nke alụmdi na nwunye na-agụ agụụ ma ha achọtabeghị onye òtù. Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ọjụjụ ha jụrụ imebi ụkpụrụ Ya ná nchụso ha na-achụso alụmdi na nwunye. Anyị ga-emekwa nke ọma inwe ekele maka iguzosi ike n’ihe ha na inye ha nkwado kwesịrị ekwesị nke ruuru ha.
20. N’ihi gịnị ka ọbụna ndị lụrụ di na nwunye ji ‘anọrọ mgbakụ n’ebe dị anya’ mgbe ụfọdụ?
20 Ò kwesịrị ka ọbụna ndị lụrụ di na nwunye ‘nọrọ mgbakụ n’ebe dị anya’ mgbe ụfọdụ? Ihe àmà na-egosi na o kwesịrị n’ọnọdụ ụfọdụ, n’ihi na Pọl kwuru, sị: “Nke a ka m na-ekwu, ụmụnna m, e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ, ka ndị nwere nwunye wee dị ka ha enweghị site n’ugbu a.” (1 Ndị Kọrint 7:29) N’ihi ya, ibu ọrụ ọchịchị Chineke aghaghị ibute ụzọ tupu ọṅụ na ngọzi nke alụmdi na nwunye mgbe ụfọdụ. Inwe echiche ziri ezi banyere okwu a agaghị emebi nkekọ alụmdi na nwunye kama ọ ga-eme ka o sie ike n’ihi na ọ na-enye aka ichetara mmadụ abụọ ahụ na Jehova aghaghị ịbụ mgbe nile onye bụ́ isi na-eme ka mmekọrịta ha kwụrụ chịm.—Eklisiastis 4:12.
21. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikpe ndị di na nwunye ikpe n’ihe banyere ịmụ ụmụ?
21 Tụkwasị na nke a, ụfọdụ di na nwunye ajụwo ịmụ ụmụ iji nwerekwuoro onwe ha ịnọgide na-ejere Chineke ozi. Nke a achọwo ha ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà, Jehova ga-akwụghachikwa ha ụgwọ n’ihi ya. Otú ọ dị, ọ bụ ezie na Bible na-agba ume ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi ozi ọma ahụ, o kwughị okwu kpọmkwem banyere ịnọ n’amụghị nwa n’ihi otu nzube ahụ. (Matiu 19:10-12; 1 Ndị Kọrint 7:38; tụlee Matiu 24:19 na Luk 23:28-30.) N’ihi ya, ndị lụrụ di na nwunye aghaghị imere onwe ha mkpebi na-adabere n’ọnọdụ nakwa ná mmetụta akọ na uche ha. Ihe ọ sọrọ mkpebi ahụ ya bụrụ, e kwesịghị ịkatọ di na nwunye.
22. Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mata?
22 Ee, “ihe ọ bụla nwere oge, mgbe dịkwaara ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe.” Ọbụna e nwere “mgbe agha, na mgbe udo.” (Eklisiastis 3:1, 8) Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mata nke ugbu a bụ oge ya n’ime ha abụọ.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mara na “ihe ọ bụla nwere oge”?
◻ Gịnị mere taa ji bụrụ n’ụzọ bụ́ isi, “mgbe ịkwa ákwá”?
◻ Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ‘na-akwa ákwá,’ gịnị mere ha ji enwe obi ụtọ n’ezie?
◻ Olee otú ụfọdụ ndị Kraịst si egosi na ha na-ele oge a anya ịbụ “mgbe ịnọrọ mgbakụ n’ebe dị anya”?
[Foto ndị dị na peeji nke 6, 7]
Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ‘na-akwa ákwá’ n’ihi ọnọdụ ụwa . . .
. . . ha bụ n’ezie ndị kasị enwe obi ụtọ n’ụwa
[Foto dị na peeji nke 8]
Ozi oge nile bụ ihe ndabere magburu onwe ya maka alụmdi na nwunye obi ụtọ