Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/1 p. 13-18
  • Ịgọpụrụ Okwukwe Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịgọpụrụ Okwukwe Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Meenụ Ka Mmadụ Nile Mara Ezi Uche Unu”
  • Mgbe Ịgba Nkịtị, Mgbe Ikwu Okwu
  • Gịnị Banyere Mgbasa Nkwulu
  • Ịgọpụrụ Ozi Ọma ahụ n’Ụzọ Iwu
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Anagide Nkọcha Ihu Ọha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndị A Kpọrọ Asị n’Ihi Okwukwe Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ndịàmà Jehova Hà Bụ Òtù Nzuzo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ndị Kraịst Na Ọha Mmadụ Nke Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/1 p. 13-18

Ịgọpụrụ Okwukwe Anyị

“Doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka Onyenwe unu: bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu.”—1 PITA 3:15.

1, 2. N’ihi gịnị ka mmegide na-adịghị eju Ndịàmà Jehova anya, ma gịnị ka ha na-achọ?

N’IHE ka n’ọtụtụ mba, a mazuuru Ndịàmà Jehova dị ka ndị na-akwụwa aka ọtọ, na-ebi ndụ dị ọcha. Ọtụtụ na-ele ha anya dị ka ezi ndị agbata obi bụ́ ndị na-adịghị akpata nsogbu ọ bụla. Ma, n’ụzọ na-emegide onwe ya, ndị Kraịst a hụrụ udo n’anya enwetawo mkpagbu na-ezighị ezi—n’oge agha nakwa n’oge udo. Mmegide dị otú ahụ adịghị eju ha anya. N’ezie, ha na-atụ anya ya. E kwuwerị, ha maara na ‘a kpọrọ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi asị’ na narị afọ mbụ O.A., ya mere n’ihi gịnị ka ndị na-agbalị ịbụ ezi ụmụazụ Kraịst taa kwesịrị iji tụọ anya ka e mesoo ha n’ụzọ dị iche? (Matiu 10:22) E wezụga nke ahụ, Bible na-asị: “A ga-esogbukwa ndị nile ndị na-achọ ịdị ndụ n’ụzọ ịsọpụrụ Chineke n’ime Kraịst Jisọs.”—2 Timoti 3:12.

2 Ndịàmà Jehova adịghị achọ mkpagbu, ihe isi ike—nhá, ịtụ mkpọrọ, ma ọ bụ mmeso obi ọjọọ—bụ́ ndị ọ pụrụ iweta, adịghịkwa atọ ha ụtọ. Ha na-achọ ‘ibi obi udo na nke dị nwayọọ’ ka ha wee nwee ike ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’enweghị ihe mgbochi. (1 Timoti 2:1, 2) Ha nwere ekele maka nnwere onwe okpukpe ha nwere n’ihe ka n’ọtụtụ ala iji nọgide na-ekpe okpukpe ha, ha na-ejikwa akọ na uche eme ihe ọ bụla ha pụrụ ime ‘ka ha na mmadụ nile na-adị n’udo,’ gụnyere ndị ọchịchị bụ́ mmadụ. (Ndị Rom 12:18; 13:1-7) N’ihi gịnịzi ka ha ji bụrụ ndị ‘a kpọrọ asị’?

3. Gịnị bụ otu ihe mere e jiworo kpọọ Ndịàmà Jehova asị n’ụzọ na-ezighị ezi?

3 N’ụzọ bụ́ isi, a kpọwo Ndịàmà Jehova asị n’ụzọ na-ezighị ezi n’ihi otu ihe ahụ mere e ji kpagbuo ndị Kraịst oge mbụ. Nke mbụ, Ndịàmà Jehova na-eme ihe kwekọrọ na nkwenkwe okpukpe ha n’ụzọ ndị mere ka ụfọdụ ghara inwe mmasị n’ebe ha nọ. Dị ka ihe atụ, ha ji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ma ndị mmadụ na-aghọtahiekarị ịnụ ọkụ n’obi ha, na-ele ime nkwusa ha anya dị ka “iji aka ike na-eme ntọghata.” (Tụlee Ọrụ 4:19, 20.) Ha na-anọpụkwa iche n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị na agha nke mba dị iche iche dị, mgbe ụfọdụkwa e jiriwo ihie ụzọ were nke a ịpụta na Ndịàmà bụ ụmụ amaala na-adịghị eguzosi ike n’ihe.—Maịka 4:3, 4.

4, 5. (a) Olee otú Ndịàmà Jehova siworo bụrụ ndị e boro ebubo ụgha dị iche iche? (b) Olee ndị bụ́ isi kpaliteworo mkpagbu nke ndị ohu Jehova mgbe mgbe?

4 Nke abụọ, Ndịàmà Jehova abụwo ndị e boro ebubo ụgha dị iche iche—ụgha ndị pụtara ìhè na nkọwa ndị a hịgharịrị ahịgharị nke nkwenkwe ha. N’ihi ya, a wakpowo ha n’ụzọ na-ezighị ezi n’ala ụfọdụ. Ọzọkwa, n’ihi na ha na-achọ ọgwụgwọ n’ejighị ọbara mee ihe bụ́ nke kwekọrọ n’ọchịchọ ha irubere iwu Bible bụ́ ‘ịhapụ ọbara’ isi, e kwuwo n’ụzọ na-ezighị ezi na ha bụ “ndị na-egbu ụmụaka” na “òtù nzuzo na-egbu onwe ha.” (Ọrụ 15:29) Ma nke bụ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova na-ewere ndụ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ha na-achọkwa inweta nlekọta ahụ ike kasị mma dịnụ maka ha na ụmụaka ha. Ebubo bụ́ na ọtụtụ ụmụ Ndịàmà Jehova na-anwụ kwa afọ n’ihi ịjụ mmịnye ọbara bụ nnọọ nke na-enweghị ihe ndabere. Ọzọkwa, n’ihi na eziokwu Bible adịghị enwe otu ụdị mmetụta ahụ n’ebe ndị òtù nile nke ezinụlọ nọ, e bowo Ndịàmà ebubo itisa ezinụlọ. Ma, ndị maara Ndịàmà Jehova maara na ha na-ele ndụ ezinụlọ anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa, na-agbalịkwa ịgbaso iwu Bible bụ́ ka di na nwunye na-ahụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù nakwa ka ụmụaka na-erubere ndị mụrụ ha isi ma hà bụ ndị kwere ekwe ma ọ bụ na ha abụghị.—Ndị Efesọs 5:21–6:3.

5 Ọtụtụ mgbe, ndị bụ́ isi na-akpalite mkpagbu nke ndị ohu Jehova bụ ndị mmegide okpukpe bụ́ ndị jiworo mmetụta ha nwere n’ebe ndị ọchịchị na ụlọ ọrụ mgbasa ozi nọ mee ihe ịnwa ịkwụsị ọrụ Ndịàmà. Olee otú anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova, kwesịrị isi meghachi omume nye mmegide dị otú ahụ—ma ọ̀ bụ n’ihi nkwenkwe na ihe ndị anyị na-eme ma ọ bụ n’ihi ebubo ụgha dị iche iche?

“Meenụ Ka Mmadụ Nile Mara Ezi Uche Unu”

6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa inwe echiche ziri ezi banyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst?

6 Iji malitegodị, ọ dị anyị mkpa inwe echiche ziri ezi—echiche Jehova—banyere ndị na-enweghị nkweta okpukpe anyị. Ma ọ bụghị ya, anyị pụrụ ịkpatara onwe anyị ibu iro ma ọ bụ nkọcha site n’aka ndị ọzọ n’ụzọ na-enweghị isi. “Meenụ ka mmadụ nile mara [ezi uche, NW] unu,” ka Pọl onyeozi dere. (Ndị Filipaị 4:5) N’ihi ya, Bible na-agba anyị ume inwe echiche guzoziri eguzozi banyere ndị na-anọghị n’ọgbakọ ndị Kraịst.

7. Gịnị ka idebe onwe anyị “n’enweghị ntụpọ site n’ụwa” gụnyere?

7 N’otu akụkụ, Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume n’ụzọ doro anya “idebe onwe [anyị] n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.” (Jemes 1:27; 4:4) Okwu ahụ bụ́ ‘ụwa’ n’ebe a, dị ka ọ dị n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ n’ime Bible, na-ezo aka n’ìgwè ụmụ mmadụ ma e wezụga ezi ndị Kraịst. Anyị bi n’etiti ọha mmadụ a; anyị na-ezute ha n’ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’agbata obi. (Jọn 17:11, 15; 1 Ndị Kọrint 5:9, 10) Ma, anyị na-edebe onwe anyị n’enweghị ntụpọ site n’ụwa site n’izere omume, okwu, na àgwà ndị na-emegide ụzọ ezi omume Chineke. Ọ dịkwa mkpa ka anyị ghọta ihe ize ndụ dị n’iso ụwa nke a na-akpachi anya, karịsịa iso ndị ahụ na-egosipụta oké nlelị maka ụkpụrụ Jehova.—Ilu 13:20.

8. N’ihi gịnị ka ndụmọdụ ahụ bụ́ ịnọ n’enweghị ntụpọ site n’ụwa na-ejighị enye anyị ihe ndabere ọ bụla maka ileda ndị ọzọ anya?

8 Otú ọ dị, ndụmọdụ ahụ bụ́ ịnọgide n’enweghị ntụpọ site n’ụwa adịghị enye anyị ihe ndabere ọ bụla maka iwetu nnọọ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ala. (Ilu 8:13) Cheta ihe atụ nke ndị ndú okpukpe ndị Juu, bụ́ nke a tụlere n’isiokwu bu ụzọ. Ụdị okpukpe ha wepụtara enwetaghị ihu ọma Jehova; ọ tụnyeghịkwa ụtụ n’ezi mmekọrịta ha na ndị na-abụghị ndị Juu. (Matiu 21:43, 45) Site n’ịbụ ndị ezi omume n’anya onwe ha, ndị ikom a na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè ledara ndị Jentaịl anya. Anyị adịghị enwe echiche na-agbasapụghị agbasapụ dị otú ahụ, na-emeso ndị na-abụghị Ndịàmà ihe n’ụzọ nlelị. Dị ka Pọl onyeozi, ọchịchọ anyị bụ ka ndị nile na-anụ ozi Bible nke eziokwu nweta ihu ọma Chineke.—Ọrụ 26:29; 1 Timoti 2:3, 4.

9. Echiche ziri ezi, nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro kwesịrị inwe mmetụta dị aṅaa n’ụzọ anyị si ekwu okwu banyere ndị na-ekweghị ihe anyị kweere?

9 Echiche guzoziri eguzozi, nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro kwesịrị imetụta ụzọ anyị si ekwu okwu banyere ndị na-abụghị Ndịàmà. Pọl tụziiri Taịtọs ka o chetara ndị Kraịst nọ n’àgwàetiti Krit “ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ghara ịbụ ndị na-alụ ọgụ, ka ha nwee obiọma, na-egosi ịdị nwayọọ nile n’ebe mmadụ nile nọ.” (Taịtọs 3:2) Rịba ama na ndị Kraịst agaghị ekwulu “onye ọ bụla”—ọbụnadị ndị na-abụghị ndị Kraịst nọ na Krit, ndị a maara ụfọdụ n’ime ha maka ịgha ụgha, iribiga ihe ókè, na umengwụ ha. (Taịtọs 1:12) Ya mere ọ ga-abụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị anyị iji okwu ndị na-eweda ala eme ihe mgbe anyị na-ezo aka n’ebe ndị na-ekweghị n’ihe anyị kweere nọ. Omume nke ile onwe anyị anya dị ka ndị ka ndị ọzọ mma agaghị adọta ndị ọzọ n’ofufe Jehova. Kama nke ahụ, mgbe anyị na-ele ndị ọzọ anya ma na-emeso ha n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ezi uche dị na ha nke Okwu Jehova, anyị ‘na-achọ ozizi Chineke mma.’—Taịtọs 2:10.

Mgbe Ịgba Nkịtị, Mgbe Ikwu Okwu

10, 11. Olee otú Jisọs si gosi na ya maara mgbe bụ́ (a) “mgbe ịgba nkịtị”? (b) “mgbe ikwu okwu”?

10 E nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu,” ka Eklisiastis 3:7 na-ekwu. N’ebe a ka e nweziri ihe ịma aka: ikpebi mgbe a ga-agbachi ndị mmegide nkịtị na mgbe a ga-ekwupụ okwu iji gọpụrụ okwukwe anyị. Anyị pụrụ ịmụta ihe dị ukwuu site n’ihe nlereanya nke otu onye zuru okè mgbe nile n’inwe ezi uche—Jisọs. (1 Pita 2:21) Ọ maara mgbe bụ́ “mgbe ịgba nkịtị.” Dị ka ihe atụ, mgbe ndị isi nchụàjà na ndị okenye boro ya ebubo ụgha n’ihu Paịlet, Jisọs ‘azaghị ihe ọ bụla.’ (Matiu 27:11-14) Ọ chọghị ikwu ihe ọ bụla nke pụrụ igbochi mmezu nke nzube Chineke n’ebe ọ nọ. Kama nke ahụ, ọ họọrọ ikwe ka ihe ndị o meworo kwuo n’onwe ha. Ọ maara na ọbụnadị eziokwu agaghị agbanwe uche na obi mpako ha. Ya mere o leghaara ebubo ha anya, na-ajụ ịkwụsị ịgba nkịtị ya nke nwere nzube.—Aịsaịa 53:7.

11 Otú ọ dị, Jisọs makwaara mgbe bụ “mgbe ikwu okwu.” N’otu oge, o ji nkwuwa okwu gwasie ndị na-akatọ ya okwu ike n’ihu ọha, na-agbagha ebubo ụgha ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nwara ịkatọ ya n’ihu ìgwè mmadụ site n’ibo ya ebubo nke iji ike Beelzebul achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, Jisọs họọrọ ịghara ikwe ka ebubo ụgha ahụ dịgide. N’iji arụmụka na-eri ọnụ na ihe atụ dị ike mee ihe, o kpuru ụgha ahụ ihu. (Mak 3:20-30; leekwa Matiu 15:1-11; 22:17-21; Jọn 18:37) N’ụzọ yiri nke ahụ, mgbe a kpụụrụ Jisọs gaa n’ihu Sanhedrin, mgbe nraranye na njide ya gasịrị, Onyeisi Nchụàjà bụ́ Kaịafas ji aghụghọ kwuo, sị: “Ewere m Chineke dị ndụ gbaa Gị iyi, ka Ị gwa anyị ma Gị onwe gị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke.” Nke a kwa bụ “mgbe ikwu okwu,” n’ihi na a pụrụ ịghọtawo ịgba nkịtị ya dị ka ngọpụ nke ọbụbụ ọ bụ Kraịst ahụ. Ya mere Jisọs zara, sị: “Mụ onwe m bụ Ya.”—Matiu 26:63, 64; Mak 14:61, 62.

12. Olee ọnọdụ ndị kwaliri Pọl na Banabas iji anyaike kwuo okwu n’Aikọniọm?

12 Tụleekwa ihe nlereanya Pọl na Banabas. Ọrụ 14:1, 2 na-ekwu, sị: “N’Aikọniọm, . . . ha abụọ bakọrọ n’ụlọ nzukọ nke ndị Juu, wee kwuo okwu n’ụzọ nke mere ka oké ìgwè mmadụ, ma ndị Juu ma ndị Grik, kwere na Jisọs. Ma ndị Juu ndị na-ekwenyeghị kpaliri mkpụrụ obi ndị mba ọzọ, mee ka ha jọọ njọ n’ebe ụmụnna n’ime Kraịst nọ.” The New English Bible na-agụ, sị: “Ma ndị Juu a na-atọghataghị kpaliri ndị Jentaịl ma mebie obi ha n’ebe ndị Kraịst nọ.” N’enweghị afọ ojuju n’ịjụ ozi ahụ n’onwe ha, ndị Juu bụ́ ndị mmegide malitere mkpọsa na-enweghị isi, na-anwa ime ka ndị Jentaịl nwee ajọ mbunobi megide ndị Kraịst.a Lee otú ịkpọasị ha kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst na-aghaghị imiworị emi! (Tụlee Ọrụ 10:28.) Nke a, ka Pọl na Banabas chere, bụ “mgbe ikwu okwu,” ka ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ghara inwe nkụda obi n’ihi nkọcha ọha na eze. “Ya mere ha [Pọl na Banabas] nọgidere n’ebe ahụ oge dị anya, na-ekwuwa okwu n’ime Onyenwe anyị,” bụ́ onye gosipụtara nkwado ya site n’inye ha ike ime ihe ịrịba ama ọrụ ebube dị iche iche. Nke a mere ụfọdụ ịnọ ‘n’akụkụ ndị Juu, na ụfọdụ ịnọkwa n’akụkụ ndị ozi Jisọs’.—Ọrụ 14:3, 4.

13. N’ime ihe banyere nkọcha, olee mgbe na-abụkarị “mgbe ịgba nkịtị”?

13 Oleezinụ otú anyị kwesịrị isi meghachi omume mgbe a kọchara anyị? Ihe nile dabeere n’ọnọdụ ndị dịnụ. Ọnọdụ ụfọdụ na-achọ ka anyị tinye ụkpụrụ ahụ bụ́ na e nwere “mgbe ịgba nkịtị” n’ọrụ. Nke a na-adị otú ahụ karịsịa mgbe ndị mmegide kpọrọ ekwo nkụ na-anwa iduba anyị n’arụmụka ndị na-enweghị isi. Anyị agaghị echefu na ụfọdụ ndị mmadụ achọghị nnọọ ịmara eziokwu ahụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:9-12) Ịgbalị isoro ndị ahụ obi ha jiworo nganga dịkwasị n’ekweghị ekwe tụgharịa uche bụ igbu oge. Karịa nke ahụ, ọ bụrụ na anyị emikpuo onwe anyị n’ịrụ onye ọ bụla na-ebo anyị ebubo ụgha ụka, anyị pụrụ ịghọ ndị a dọpụrụ uche ha pụọ n’ọrụ ka nnọọ mkpa na nke na-enye ụgwọ ọrụ karị—nke inyere ndị nwere obi eziokwu aka bụ́ ndị chọrọ ịmụta eziokwu Bible n’ezie. Ya mere mgbe anyị zutere ndị mmegide bụ́ ndị kpebisiri ike ịgbasa ụgha banyere anyị, ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ: ‘Na-eze ha.’—Ndị Rom 16:17, 18; Matiu 7:6.

14. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ ịgọpụrụ okwukwe anyị n’ihu ndị ọzọ?

14 N’ezie, nke a adịghị apụta na anyị adịghị agọpụrụ okwukwe anyị. E kwuwerị, e nwekwara “mgbe ikwu okwu.” Anyị na-echegbu onwe anyị n’ụzọ ziri ezi banyere ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị e kpugheworo nye ajọ nkọcha banyere anyị. Anyị dị njikere inye ndị ọzọ nkọwa doro anya banyere nkweta anyị si n’obi; n’ezie anyị na-anabata ohere ahụ. Pita dere, sị: “Doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka Onyenwe unu: bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:15) Mgbe mmadụ ndị nwere ezi mmasị jụrụ maka ihe nnwapụta nke nkwenkwe ndị ahụ anyị ji kpọrọ ihe, mgbe ha jụrụ ajụjụ banyere ebubo ụgha ndị mmegide welitere, ọ bụ ibu ọrụ anyị ịgọpụrụ okwukwe anyị, na-enye azịza ndị bụ́ ọkpọka dabeere na Bible. Tụkwasị na nke a, ezi àgwà anyị pụrụ ikwu ihe dị ukwuu. Ka ndị na-ahụ anyị bụ́ ndị nwere obi ghere oghe na-arịba ama na anyị na-agbalị n’ezie ịdị ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke, ha pụrụ ịhụ ozugbo na ebubo ndị e boro anyị bụ ụgha.—1 Pita 2:12-15.

Gịnị Banyere Mgbasa Nkwulu

15. Gịnị bụ otu ihe atụ nke otú ụlọ ọrụ mgbasa ozi siworo gbasaa ihe ọmụma na-ezighị ezi banyere Ndịàmà Jehova?

15 N’oge ụfọdụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi agbasawo ihe ọmụma na-ezighị ezi banyere Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe atụ, n’August 1, 1997, otu akwụkwọ akụkọ Russia bipụtara otu isiokwu nkwulu na-azọrọ, n’ime ihe ndị ọzọ, na Ndịàmà na-achọ kpọmkwem ka ndị òtù ha ‘jụ nwunye, di, na nne na nna ha ma ọ bụrụ na ha aghọtaghị, na ha ekweghịkwa n’ihe ha kweere.’ Onye ọ bụla maara Ndịàmà Jehova n’ezie maara na ebubo ahụ bụ ụgha. Bible na-egosi na ndị Kraịst ga-emeso ndị òtù ezinụlọ ha na-ekweghị ekwe ihe n’ịhụnanya nakwa ná nkwanye ùgwù, Ndịàmà na-agbalịkwa ịgbaso ntụziaka ahụ. (1 Ndị Kọrint 7:12-16; 1 Pita 3:1-4) N’agbanyeghị nke ahụ, e bipụtara isiokwu ahụ, e sikwa otú a nye ọtụtụ ndị na-agụ ya ihe ọmụma na-abụghị eziokwu. Olee otú anyị pụrụ isi gọpụrụ okwukwe anyị mgbe e boro anyị ebubo ụgha?

16, 17, na igbe dị na peji nke 16. (a) Gịnị ka Ụlọ Nche kwuru n’otu oge banyere imeghachi omume nye ihe ọmụma na-abụghị eziokwu a gbasara n’usoro mgbasa ozi? (b) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova pụrụ imeghachi omume nye akụkọ ndị na-adịghị mma a kọrọ n’usoro mgbasa ozi?

16 N’ebe a kwa, e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.” Ụlọ Nche si otú a kwuo ya n’otu oge: “Ma ànyị na-eleghara akụkọ ndị na-abụghị eziokwu anya ma ọ bụ jiri ụzọ ndị ziri ezi na-agbachitere eziokwu na-adabere n’ọnọdụ ndị dịnụ, onye kpalitere nkatọ ahụ, na ihe bụ nzube ya.” N’ọnọdụ ụfọdụ ọ pụrụ ịkasị mma ileghara akụkọ ndị na-adịghị mma anya, si otú ahụ ghara ime ka a gbasakwuo ụgha ndị ahụ.

17 N’ọnọdụ ndị ọzọ ọ pụrụ ịbụ “mgbe ikwu okwu.” A pụrụ inyewo onye nta akụkọ a pụrụ ịtụkwasị obi ihe ọmụma na-abụghị eziokwu banyere Ndịàmà Jehova, ọ pụkwara ịnabata ihe ọmụma bụ́ eziokwu banyere anyị. (Lee igbe bụ́ “Ịgbazi Otu Nkọjọ.”) Ọ bụrụ na okwu ndị na-adịghị mma a gbasara n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi kpalitere ajọ mbunobi nke na-egbochi ọrụ ime nkwusa anyị, ndị nnọchiteanya nke alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society pụrụ ibute ụzọ iji gọpụrụ eziokwu ahụ n’ụzọ ụfọdụ ndị dabara adaba.b Dị ka ihe atụ, a pụrụ ikenye ndị okenye ruru eru iwepụta ihe ndị bụ eziokwu, dị ka n’usoro ihe omume TV, bụ́ ebe apụtaghị pụrụ inye echiche na Ndịàmà Jehova enweghị azịza. Ndịàmà n’otu n’otu na-eji amamihe na-akwado ntụzi nke Watch Tower Society na ndị nnọchiteanya ya n’okwu ndị dị otú ahụ.—Ndị Hibru 13:17.

Ịgọpụrụ Ozi Ọma ahụ n’Ụzọ Iwu

18. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị dị anyị mkpa ịnata ọchịchị nke ụmụ mmadụ ikike iji mee nkwusa? (b) Usoro dị aṅaa ka anyị na-agbaso mgbe a na-enyeghị anyị ikike ime nkwusa?

18 Ikike e nyere anyị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke sitere n’eluigwe. E nyewo Jisọs, bụ́ onye nyere anyị ikike ịrụ ọrụ a, “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18-20; Ndị Filipaị 2:9-11) N’ihi ya, ọ dịghị anyị mkpa ịnata ọchịchị nke ụmụ mmadụ ikike iji mee nkwusa. Ya bụrụgodị otú ahụ, anyị na-aghọta na inwe nnwere onwe okpukpe na-enye aka n’ịgbasa ozi Alaeze ahụ. N’ala ebe anyị nweere onwe anyị ikpe okpukpe anyị, anyị ga-eji usoro iwu mee ihe iji chebe ya. N’ebe ndị a na-enyeghị anyị nnwere onwe dị otú ahụ, anyị ga-agbalị inweta ya, dị ka iwu si dị. Nzube anyị abụghị mgbanwe ọha na eze, kama “ngọpụ nke ozi ọma na ime ka o guzosie ike.”c—Ndị Filipaị 1:7.

19. (a) Gịnị ka anyị ‘inyeghachi Chineke ihe nke Chineke’ pụrụ ịrụpụta? (b) Gịnị ka anyị kpebisiri ike ime?

19 Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị matara Jehova dị ka Eze Eluigwe na Ala. Iwu ya kasị elu. Anyị na-eji akọ na uche erubere ọchịchị mmadụ isi, si otú ahụ ‘na-enyeghachi Siza ihe nke Siza.’ Ma anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla nọchiere anyị ụzọ n’imezu ibu ọrụ ka nnọọ mkpa—‘inyeghachi Chineke ihe nke Chineke.’ (Matiu 22:21) Anyị ghọtara nke ọma na ime otú ahụ ga-eme ka anyị bụrụ ndị mba nile ‘ga-akpọ asị,’ ma anyị na-anakwere nke a dị ka akụkụ nke ihe ịbụ onye na-eso ụzọ na-efu. Ihe ndekọ ikpe nke Ndịàmà Jehova na narị afọ nke 20 bụ ihe akaebe nye mkpebisi ike anyị ịgọpụrụ okwukwe anyị. Site n’enyemaka na nkwado Jehova, anyị ga-anọgide ‘n’ahapụghị izi ihe na izisa ozi ọma.’—Ọrụ 5:42.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Matthew Henry’s Commentary on the Whole Bible na-akọwa na ndị mmegide bụ́ ndị Juu “mere ya ọrụ ha ịma ụma jekwuru [ndị Jentaịl] nile dị otú ahụ ha maara, ma kwuo ihe nile uche na obi ilu ha pụrụ ichepụta, iji tinye n’ime ha ọ bụghị nanị nlelị kama echiche na-ezighị ezi banyere Iso Ụzọ Kraịst.”

b Mgbe e bipụtasịrị isiokwu nkwulu ahụ n’akwụkwọ akụkọ Russia ahụ (nke a kpọtụrụ uche na paragraf nke 10), Ndịàmà Jehova tinyere akwụkwọ na-arịọ Òtù Ikpe President Mba Russia Maka Esemokwu Ndị Metụtara Mgbasa Ozi ka a tụleghachi ebubo ụgha ahụ e boro n’isiokwu ahụ. Na nso nso a ụlọikpe ahụ wepụtara mkpebi ikpe nke nyere akwụkwọ akụkọ ahụ ahụhụ maka ibipụta isiokwu nkọcha ahụ.—Lee Teta!, December 8, 1998, peji nke 12-13.

c Lee Isiokwu bụ́ “Ichebe Ozi Ọma ahụ n’Ụzọ Iwu,” dị na peji nke 19-22.

Ị̀ Na-echeta

◻ N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji bụrụ ndị ‘a kpọrọ asị’?

◻ Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị na-ekweghị na nkwenkwe okpukpe anyị anya?

◻ N’ime ihe banyere ndị mmegide, ihe nlereanya dị aṅaa ziri ezi ka Jisọs setịpụrụ?

◻ Mgbe a kọchara anyị, olee otú anyị pụrụ isi tinye ụkpụrụ ahụ bụ́ na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu” n’ọrụ?

[Igbe dị na peeji nke 16]

Ịgbazi Otu Nkọjọ

“Na Yacuiba, Bolivia, otu ìgwè na-ekwu okwuchukwu dokwara ka otu ụlọ ọrụ TV gosi otu ihe nkiri nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ ndị si n’ezi ofufe dapụ mepụtara ya. N’ihi mmetụta ọjọọ usoro ihe omume ahụ nwere, ndị okenye kpebiri ileta ụlọ ọrụ TV abụọ ma kweta ịkwụ ha ụgwọ ka ha gosi ọha na eze ihe nkiri vidio ndị bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name na The Bible—A Book of Fact and Prophecy. Mgbe ọ hụsịrị vidio Society ndị ahụ, onye nwe otu ụlọ ọrụ redio were iwe megide nkọjọ ahụ e mere n’usoro ihe omume nke ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ ma kwuo na ya ga-amara Ndịàmà Jehova ọkwa n’efu banyere mgbakọ distrikti ha na-abịanụ. Ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ dị elu dị ka ọ na-adịtụbeghị, ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu malitekwara ịjụ ajụjụ ndị sitere n’ezi obi mgbe Ndịàmà letara ha n’ozi.”—1997 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, peji nke 61-62.

[Foto dị na peeji nke 17]

N’otu oge, Jisọs gbaghara ebubo ụgha nke ndị na-akatọ ya n’ihu ọha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya