“Mgbe Udo” Dị Nso!
“Ihe ọ bụla nwere oge, . . . mgbe agha, na mgbe udo.”—EKLISIASTIS 3:1, 8.
1. Ọnọdụ dị aṅaa na-emegide onwe ya ka e nweworo na narị afọ nke 20 n’ihe banyere agha na udo?
ENWERE ezi ihe mere udo ji agụ ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agụụ. Narị afọ nke 20 enweela udo dị nta karịa narị afọ ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme. Ọ na-emegide onwe ya n’ihi na ọ dịbeghị mgbe e mere ihe dị nnọọ ukwuu iji nweta udo. E guzobere Njikọ Mba Nile na 1920. Na 1928 “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile nke ụwa . . . n’ikweta ịjụ iji agha emere ngwá ọrụ nke ụkpụrụ ime ihe mba,” kwadoro Nkwekọrịta Kellogg-Briand, bụ́ nke otu akwụkwọ kpọrọ “nke kasị ukwuu n’usoro mgbalị ndị e mere iji weta udo mgbe a lụsịrị Agha Ụwa Mbụ.” E mesịa, na 1945 e guzobere òtù Mba Ndị Dị n’Otu iji dochie anya Njikọ Mba Nile bụ́ nke ike gwụrụla.
2. Gịnị ka a sị na ọ bụ ihe mgbaru ọsọ nke Mba Ndị Dị n’Otu, ruokwa n’ókè hà aṅaa ka o nweworo ihe ịga nke ọma?
2 Dị ka Njikọ ahụ, ihe a sị na ọ bụ ihe mgbaru ọsọ nke Mba Ndị Dị n’Otu bụ iweta udo ụwa. Ma ihe ịga nke ọma ya abụwo nke a kpaara ókè. N’eziokwu, ọ dịghị ebe ọ bụla a na-alụ agha haruru ka agha ụwa mbụ na nke abụọ n’ụwa. Otú o sina dị, ọtụtụ agha katụ nta ka na-anapụ ọtụtụ narị puku udo nke uche ha, ihe onwunwe ha, nakwa mgbe mgbe ndụ ha. Ànyị pụrụ ịnwa inwe olileanya na Mba Ndị Dị n’Otu pụrụ ịgbanwe narị afọ nke 21 ịbụ “mgbe udo”?
Ihe Ndabere Maka Ezi Udo
3. Gịnị mere ezi udo na ịkpọasị apụghị ịgakọ?
3 Inwe udo n’etiti ndị mmadụ na mba dị iche iche na-achọ ihe karịrị nnọọ ikwe ibe nọrọ. Ọ̀ dị onye ya na onye ọ kpọrọ asị pụrụ ịnọ n’udo n’ezie? Ọ dịghị onye ọ bụ dị ka 1 Jọn 3:15 si kwuo: “Onye ọ bụla nke na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ.” Dị ka ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya na-egosi, ọ naghị ara ahụ oké ịkpọasị aghọọ ime ihe ike.
4. Nanị ole ndị pụrụ inwe udo, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
4 Ebe Jehova bụ “Chineke nke udo,” ọ bụ nanị ndị hụrụ Chineke n’anya ma nwee nkwanye ùgwù miri emi n’ebe ụkpụrụ ezi omume ya dị pụrụ inwe udo. N’ụzọ doro anya, Jehova adịghị enye mmadụ nile udo. “Ọ dịghị udo ndị na-emebi iwu nwere, ka Chineke m sịrị.” Nke a bụ n’ihi na ndị na-emebi iwu adịghị ekwe ka mmụọ nsọ Chineke, nke udo bụ otu n’ime mkpụrụ ya, na-eduzi ha.—Ndị Rom 15:33; Aịsaịa 57:21; Ndị Galetia 5:22.
5. Gịnị ka ezi ndị Kraịst na-agaghị echetụdị n’echiche?
5 Ibuso mmadụ ibe ha agha—dị ka ndị sị na ha bụ ndị Kraịst meworo mgbe mgbe, karịsịa na narị afọ nke 20—bụ ihe ezi ndị Kraịst na-agaghị echetụdị n’echiche. (Jemes 4:1-4) N’ezie, ha na-alụ agha megide ozizi ndị na-emebi aha Chineke, ma nzube e ji alụ agha a bụ iji nyere ndị mmadụ aka, ọ bụghị iji merụọ ha ahụ. Ịkpagbu ndị ọzọ n’ihi ndịrịta iche okpukpe ma ọ bụ imerụ ha ahụ n’ihi ihe ndị metụtara ịhụ mba n’anya ekwekọghị nnọọ n’ezi Iso Ụzọ Kraịst. “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà,” ka Pọl tụziiri ndị Kraịst nọ na Rom, “unu na mmadụ nile na-adị n’udo.”—Ndị Rom 12:17-19; 2 Timoti 2:24, 25.
6. Olee nanị ebe a pụrụ ịchọta ezi udo taa?
6 Taa, ọ bụ nanị n’etiti ezi ndị na-efe Jehova Chineke ka a na-ahụ udo nke Chineke na-enye. (Abụ Ọma 119:165; Aịsaịa 48:18) Esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla adịghị emebi ịdị n’otu ha, ebe ọ bụ na n’ebe nile, ha na-anọpụ iche na ndọro ndọrọ ọchịchị. (Jọn 15:19; 17:14) Ebe ọ bụ na ha “[zuru] okè n’otu uche ahụ na n’otu izù ahụ,” ọ dịghị ndịrịta iche okpukpe na-eyi udo ha egwu. (1 Ndị Kọrint 1:10) Udo nke Ndịàmà Jehova na-enwe bụ ọrụ ebube nke oge a, nke Chineke rụrụ n’ikwekọ ná nkwa ya bụ́: “M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.”—Aịsaịa 60:17; Ndị Hibru 8:10.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee “Mgbe Agha”?
7, 8. (a) N’agbanyeghị na ha nọ n’udo, olee otú Ndịàmà Jehova si ele oge a anya? (b) Gịnị bụ ihe agha bụ́ isi nke ibu agha ndị Kraịst?
7 N’agbanyeghị na ha nọ n’udo, Ndịàmà Jehova ka na-ewere oge a ịbụ “mgbe agha” n’ụzọ bụ́ isi. N’ezie, ọ bụghị agha nkịtị, ebe ọ bụ na iji ike amanye ndị mmadụ ịnakwere ozi Bible ga-emegide ọkpụkpọ òkù Chineke bụ́ “onye na-achọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 22:17, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) O nweghị ihe dị ka iji ike eme ntọghata n’ebe a! Agha Ndịàmà Jehova na-alụ bụ kpọmkwem nke ime mmụọ. Pọl dere, sị: “Ihe agha nke ibu agha anyị abụghị nke anụ ahụ, kama ha sitere na Chineke bụ́ ihe pụrụ ịkwada ebe e wusiri ike.”—2 Ndị Kọrint 10:4; 1 Timoti 1:18.
8 Nke bụ́ isi n’ime “ihe agha nke ibu agha anyị” bụ “mma agha nke Mmụọ Nsọ, nke bụ́ okwu Chineke.” (Ndị Efesọs 6:17) Mma agha a dị ike. “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izù nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Site n’iji mma agha a na-eme ihe, ndị Kraịst na-enwe ike iweda “ihe a na-atụle n’obi, na ihe nile ọ bula dị elu nke e weliri elu imegide ọmụma Chineke.” (2 Ndị Kọrint 10:5) Ọ na-enyere ha aka ikpughe ozizi ụgha, omume ndị na-emerụ ahụ, na nkà ihe ọmụma ndị na-egosipụta amamihe mmadụ kama ịbụ nke Chineke.—1 Ndị Kọrint 2:6-8; Ndị Efesọs 6:11-13.
9. Gịnị mere na anyị apụghị ịkụda aka n’agha anyị na-alụso anụ ahụ na-emehie emehie?
9 Ụdị agha ime mmụọ ọzọ bụ nke a na-alụso anụ ahụ na-emehie emehie. Ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya Pọl, bụ́ onye kwetara, sị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.” (1 Ndị Kọrint 9:27) A gbara ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ume ime ka ‘ihe nile dị ha n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.’ (Ndị Kọlọsi 3:5) Onye so dee Bible bụ́ Jud gbakwara ndị Kraịst ume ‘ịgbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ nke e nyere ndị nsọ n’aka nanị otu mgbe idebe.’ (Jud 3) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji mee otú ahụ? Pọl na-aza, sị: “A sị na unu na-adị ndụ dị ka anụ ahụ si chọọ, unu gaje ịnwụ; ma ọ bụrụ na unu na-ewere Mmụọ Nsọ mee ka omume ahụ nwụọ, unu ga-adị ndụ.” (Ndị Rom 8:13) N’ihi okwu a doro anya, anyị apụghị ịkụda aka n’agha anyị na-alụso ọchịchọ ọjọọ.
10. Gịnị mere na 1914, gịnị ka ọ ga-eduga na ya n’ọdịnihu dị nso?
10 Ihe ọzọkwa mere a pụrụ iji ele oge a anya dị ka mgbe agha bụ na “ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere” dị nso. (Aịsaịa 61:1, 2) Na 1914, oge Jehova ruru maka iguzobe Alaeze Mesaịa na inye ya ikike ịlụso usoro ihe Setan agha n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Oge e nyere maka ụmụ mmadụ ịnwale ọchịchị nke onwe ha nke aka Chineke na-adịghị na ya gwụrụ mgbe ahụ. Kama ịnakwere Onye Ọchịchị Mesaịa nke Chineke, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ nọgidere na-ajụ ya, ọbụna dị ka ihe ka ọtụtụ mere na narị afọ mbụ. (Ọrụ 28:27) Ya mere, n’ihi mmegide Alaeze, a rụgidewo Kraịst ‘inwe ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro ya.’ (Abụ Ọma 110:2) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Mkpughe 6:2 na-ekwe nkwa na ọ ‘ga-emeri.’ Ọ ga-eme nke a ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile, nke a na-akpọ n’asụsụ Hibru Ha-Magedọn.’—Mkpughe 16:14, 16.
Ugbu A Bụ “Mgbe Ikwu Okwu”
11. Gịnị mere Jehova jiworo nwee nnọọ ndidi, ma gịnị ga-emesị bịa?
11 Afọ 85 agafeela kemgbe oké mgbanwe malitere n’ihe omume mmadụ na 1914. Jehova enweela nnọọ ndidi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. O mewo ka Ndịàmà ya mara nke ọma banyere ịdị ngwa nke ọnọdụ ahụ. Ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ nọ n’ihe ize ndụ. O kwesịrị ka a dọọ ìgwè mmadụ a aka ná ntị n’ihi na “Onyenwe anyị . . . [ezubeghị] ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Otú o sina dị, n’oge na-adịghị anya, “mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, Ya na ndị mmụọ ozi nke ike Ya,” ga-abịa. Mgbe ahụ, ndị nile ma ụma jụ ozi Alaeze Chineke ga-enweta ‘ịbọ ọ́bọ̀’ ahụ, nke Jisọs ga-abọ “n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.
12. (a) N’ihi gịnị ka ịkọ nkọ banyere mgbe mkpagbu ukwu ahụ pụrụ ịmalite ji bụrụ ihe na-abaghị uru? (b) Ihe ize ndụ dị aṅaa ka Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere ya n’akụkụ a?
12 Olee mgbe Jehova ga-akwụsị inwe ndidi? Ọ dịghị uru ịkọ nkọ ọ bụla banyere mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ pụrụ ịmalite bara. Jisọs kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge awa ahụ.” N’aka nke ọzọ, ọ dụrụ ọdụ, sị: “Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. . . . Unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:21, 36, 42, 44) N’ikwu ya n’ụzọ doro anya, nke a pụtara na anyị kwesịrị ịnọ na nche kwa ụbọchị banyere ihe ndị na-eme n’ụwa ma na-eburu ntiwapụ nke mkpagbu ukwu ahụ n’uche. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-5) Lee ka o si dị ize ndụ iche na anyị pụrụ iselata aka, na-ebi ihe a sị na ọ bụ ndụ ntụsara ahụ, na-echere ịhụ ihe ndị ga-emenụ! Jisọs kwuru, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnya.” (Luk 21:34) Anyị pụrụ ijide nke a n’aka: A gaghị anọgide na-ejichi “ifufe anọ” nke mbibi ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ nke “ndị mmụọ ozi anọ” nke Jehova na-ejighachi azụ ugbu a.—Mkpughe 7:1-3.
13. Gịnị ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ isii ghọtaworo?
13 N’iburu ụbọchị mpịazi a ji ọsọ na-abịaru nso n’uche, okwu Solomọn banyere inwe “mgbe ikwu okwu” na-enwe ihe pụrụ iche ọ pụtara. (Eklisiastis 3:7) N’ịbụ ndị ghọtaworo na ugbu a bụ n’ezie mgbe ikwu okwu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde Ndịàmà Jehova isii ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu banyere ịdị ebube nke ọbụbụeze Chineke, na-adọkwa aka ná ntị banyere ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya. Ha na-enye onwe ha n’afọ ofufo n’ụbọchị a nke usuu ndị agha Kraịst.—Abụ Ọma 110:3; 145:10-12.
Ndị Na-ekwu Okwu “Udo, Ma Udo Adịghị”
14. Ndị amụma ụgha dị aṅaa ka e nwere na narị afọ nke asaa T.O.A.?
14 Na narị afọ nke asaa T.O.A., ndị amụma Chineke bụ́ Jeremaịa na Ezikiel kpọsara ozi ikpe Chineke megide Jerusalem maka ụzọ isi ike ya n’inupụrụ Chineke isi. Mbibi ahụ ha buru n’amụma weere ọnọdụ na 607 T.O.A., ọ bụ ezie na ndị ndú okpukpe dị ike bụ́ ndị a ma ama ekwuwo ihe megidere ihe ndị amụma Chineke kwuru. Ndị ndú okpukpe a gosipụtara na ha bụ “ndị amụma nzuzu [bụ́ ndị] . . . [wezụgara ndị Chineke], sị, Udo; ma udo adịghị.”—Ezikiel 13:1-16; Jeremaịa 6:14, 15; 8:8-12.
15. È nwere ndị amụma ụgha dị otú ahụ taa? Kọwaa.
15 Dị ka “ndị amụma nzuzu” nke oge ahụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị ndú okpukpe taa adịghịkwa adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ụbọchị ikpe Chineke nke na-abịanụ. Kama nke ahụ, ha na-eme ka e nwee nchekwube na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche ga-emesị weta udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ịbụ ndị nwere ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ ụmụ mmadụ ụtọ karịa Chineke, ha na-agwa ndị na-abịa ụka ha ihe ha chọrọ ịnụ kama ịkọwa na e guzobewo Alaeze Chineke nakwa na Eze Mesaịa ya ga-enwezu mmeri ya n’oge na-adịghị anya. (Daniel 2:44; 2 Timoti 4:3, 4; Mkpughe 6:2) Dị ka ndị amụma ụgha, ha onwe ha na-ekwukwa okwu “udo, ma udo adịghị.” Ma nkweta ha ga-aghọ oké ụjọ na mberede n’oge na-adịghị anya mgbe ha na-aghaghị iche oké iwe nke Onye ahụ ha kọwahieworo, onye ha wetawokwaara aha ya oké nkọcha, ihu. A ga-eti ndị ndú nke alaeze ụwa nke okpukpe ụgha bụ́ ndị a kọwara n’ime Bible dị ka nwanyị na-akwa iko ajọ ihe otiti, ka ha na-eti mkpu udo ha na-eduhie eduhie.—Mkpughe 18:7, 8.
16. (a) Gịnị ka e jiworo mara Ndịàmà Jehova? (b) Olee otú ha si dị iche n’ebe ndị na-eti mkpu “udo, ma udo adịghị,” nọ?
16 Na ihe ka ukwuu ná ndị ndú a ma ama bụ́ ndị dị ike nọgidere na-ekwe nkwa ihu abụọ ha banyere udo adịghị akụda obi ike nke ndị ahụ nwere okwukwe ná nkwa Chineke banyere ezi udo. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, a marala Ndịàmà Jehova dị ka ndị ji iguzosi ike n’ihe na-agbachitere Okwu Chineke, ndị ji obi ike na-emegide okpukpe ụgha, na ndị ji mkpebisi ike na-akwado Alaeze Chineke. Kama iji okwu ire ụtọ banyere udo na-eme ka ndị mmadụ rahụọ ụra, ha ji ịdị uchu na-agbalị ịkpọte ha ka ha mara na ugbu a bụ mgbe agha.—Aịsaịa 56:10-12; Ndị Rom 13:11, 12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:6.
Jehova Akwụsị Ịgba Nkịtị
17. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na Jehova ga-akwụsị ịgba nkịtị n’oge na-adịghị anya?
17 Solomọn kwukwara, sị: “Onye ezi omume na onye na-emebi iwu ka Chineke ga-ekpe: n’ihi na mgbe dịịrị ihe ọ bụla a na-eme.” (Eklisiastis 3:17) Ee, Jehova nwere oge maka ime ihe e kpere n’ikpe megide okpukpe ụgha na “ndị eze nke ụwa [bụ́ ndị] na-eguzo onwe ha . . . imegide Jehova, na imegide onye Ya e tere mmanụ.” (Abụ Ọma 2:1-6; Mkpughe 16:13-16) Ozugbo oge ahụ ruru, oge “ịgba nkịtị” Jehova ga-agwụ. (Abụ Ọma 83:1; Aịsaịa 62:1; Jeremaịa 47:6, 7) Ọ ga-esite n’ọnụ Eze Mesaịa ya nọkwasịrịla n’ocheeze, bụ́ Jisọs Kraịst, ‘kwuo okwu’ n’olu o doro anya na ọ bụ nanị ya ka ndị na-emegide ya na-anụ: “Jehova ga-apụta dị ka dike; dị ka onye agha ka Ọ ga-akpọte ekworo: Ọ ga-eti mkpu agha, ee, Ọ ga-eti oké mkpu agha; n’imegide ndị iro Ya ka Ọ na-eme Onwe ya dike. Edebewo m ọnụ m duu site na mgbe ebighị ebi gara aga; ana m agba nkịtị, jisie onwe m ike: dị ka nwanyị ime na-eme, otú a ka M ga-asụ ude, kuo ume ngwa ngwa, kusie ume ike n’otu. M ga-eme ugwu na ugwu nta ka ha kọọ akọ, ihe ọkụkụ ha nile ka M ga-emekwa ka ọ kpọnwụọ; M ga-emekwa osimiri ka ha ghọọ àgwàetiti, meekwa ka ọdọ mmiri nile takọọ. M ga-emekwa ka ndị ìsì jee ije n’ụzọ ha na-amaghị; n’okporo ụzọ ha na-amaghị ka M ga-eme ka ha zọọ ije: M ga-eme ka ọchịchịrị bụrụ ìhè n’ihu ha, meekwa ebe gbagọrọ agbagọ ka ha guzozie. Ihe ndị a ka M ga-eme, M gaghị ahapụkwa ha.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Aịsaịa 42:13-16.
18. N’echiche dị aṅaa ka ndị Chineke ‘ga-agba nkịtị’ n’oge na-adịghị anya?
18 Mgbe Jehova ‘ga-ekwu okwu’ iji gbachitere ịbụ Chineke ya, ọ gaghị adịzi ndị ya mkpa ikwu okwu iji gbachitere onwe ha. Ọ ga-abụ oge nke ha “ịgba nkịtị.” Okwu ndị a ga-adị irè dị ka ha dịịrị ndị ohu Chineke n’oge gara aga: “Ọ bụghị unu ga-enwe ibu agha n’agha nke a: guzonụ onwe unu, guzo, hụ nzọpụta Jehova n’etiti unu.”—2 Ihe E Mere 20:17.
19. Ihe ùgwù dị aṅaa ka ụmụnna ime mmụọ Kraịst ga-enwe n’oge na-adịghị anya?
19 Lee oké mmeri a ga-emeri Setan na nzukọ ya! Ụmụnna Kraịst e mere ka ha dị ebube ga-ekere òkè ná mmeri kpụ ọkụ n’ọnụ maka ezi omume, n’ikwekọ ná nkwa bụ́: “Ma Chineke nke udo ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu ọsọ ọsọ.” (Ndị Rom 16:20) Oge udo ahụ a nọ na-echere eri oge emesịwo ruo nso.
20. Gịnị ka oge ya ga-eru n’oge na-adịghị anya?
20 Lee ka ndụ nke ndị nile nọ n’ụwa bụ́ ndị lanarịrị oké ngosipụta a nke ike Jehova ga-esi bụrụ nke a gọziri agọzi! N’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie bụ́ ndị oge mbilite n’ọnwụ ha ga-eruwo, ga-esonyere ha. Ọchịchị Puku Afọ Kraịst ga-abụ n’ezie “mgbe ịkụ ihe n’ubi, . . . mgbe ịgwọ ọrịa; . . . mgbe iwu ụlọ; . . . mgbe ịchị ọchị; . . . mgbe ite egwú; . . . mgbe ịgbakụ, . . . mgbe ịhụ n’anya.” Ee, ọ ga-abụkwa “mgbe udo” ruo mgbe ebighị ebi!—Eklisiastis 3:1-8; Abụ Ọma 29:11; 37:11; 72:7.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Gịnị bụ ihe ndabere maka udo na-adịgide adịgide?
◻ N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji ewere oge a dị ka “mgbe agha”?
◻ Olee mgbe ndị Chineke ‘ga-ekwu okwu,’ oleekwa mgbe ha ‘ga-agba nkịtị’?
◻ Olee otú Jehova ga-esi kwụsị ịgba nkịtị, ọ bụkwa ole mgbe?
[Igbe/Foto dị na peeji nke 13]
Jehova Nwere Oge Maka
◻ ịdọta Gọg ịwakpo ndị Chineke.—Ezikiel 38:3, 4, 10-12
◻ itinye ya n’obi ndị ọchịchị bụ́ mmadụ ibibi Babilọn Ukwu ahụ.—Mkpughe 17:15-17; 19:2
◻ ọlụlụ nwanyị Nwa Atụrụ ahụ.—Mkpughe 19:6, 7
◻ ịmalite agha Ha-Magedọn.—Mkpughe 19:11-16, 19-21
◻ ike Setan agbụ iji malite Ọchịchị Puku Afọ Jisọs.—Mkpughe 20:1-3
E depụtara ihe omume ndị a nanị n’usoro e si hota ha n’Akwụkwọ Nsọ. Anyị pụrụ ijide n’aka na ihe omume ise ahụ dum ga-emezu n’usoro Jehova kpebiri nakwa kpọmkwem n’oge o kpebiri.
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ọchịchị puku afọ Kraịst ga-abụ n’ezie mgbe . . .
ịchị ọchị . . .
ịgbakụ . . .
ịhụ n’anya . . .
ịkụ ihe n’ubi . . .
ite egwú . . .
iwu ụlọ . . .