Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 6 p. 61-72
  • Jehova Chineke Emeere Ihe Fọdụrụnụ Ebere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Chineke Emeere Ihe Fọdụrụnụ Ebere
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ihe Opupu Jehova”
  • Ihe Fọdụrụnụ Aghọọ Ihe Dị Nsọ Nye Jehova
  • Nkwa Nlekọta Ịhụnanya
  • Na-echere Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Nzọpụta na Ịṅụrị Ọṅụ n’Oge Ọchịchị Mesaịa
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Tegharịakwanụ Egwú Ọṅụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi n’Ihi Ihe nke Mụ Onwe M Na-eke”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 6 p. 61-72

Isi nke Isii

Jehova Chineke Emeere Ihe Fọdụrụnụ Ebere

Aịsaịa 4:2-6

1, 2. Aịsaịa onye amụma buru amụma dị aṅaa banyere Juda na Jerusalem?

OKÉ ifufe efekwasị ógbè mmadụ bijupụtara. Oké ifufe, oké mmiri ozuzo, na oké idei mmiri ebibiri ihe gafere ebe buru ibu n’ala ahụ, bibie ụlọ, bibie ihe ndị a kọrọ n’ubi, ma laa ọtụtụ ndụ n’iyi. Ma n’oge na-adịghị anya ifufe ahụ kwụsịrị, e nweekwa oge dị jụụ mgbe mbibi ahụ gasịrị. Nye ndị lanarịrịnụ, ọ bụ oge idozigharị na iwughachi ihe.

2 Aịsaịa onye amụma buru ihe yiri nke ahụ n’amụma banyere Juda na Jerusalem. Oké mmiri ozuzo nke ikpe Chineke na-adịwanye ajọ nso—o nwekwara ezi ihe kpatara ya! Ajọ omume nke mba ahụ dị ukwuu. Ma ndị ọchịchị ma ndị obodo ahụ ejiriwo ikpe na-ezighị ezi na mwụfu ọbara mejupụta ala ahụ. Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova kpughere ajọ omume Juda ma dọọ aka ná ntị na Ya ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ mba ahụ na-enupụ isi. (Aịsaịa 3:25) A ga-eme ka ala Juda tọgbọrọ n’efu kpam kpam mgbe oké ifufe a gasịrị. Atụmanya ahụ aghaghị iwuteworị Aịsaịa.

3. Ozi ọma dị aṅaa dị n’ozi ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị n’Aịsaịa 4:2-6?

3 Ma e nwere ozi ọma dịnụ! Oké ifufe nke ikpe ezi omume Jehova ga-agabiga, ihe fọdụrụnụ ga-alanarịkwa. Ee, a ga-eji ebere belata ikpe Jehova megide Juda! Ozi sitere n’ike mmụọ nsọ nke Aịsaịa ziri bụ́ nke e dekọrọ n’Aịsaịa 4:2-6 na-elepụ anya n’oge a a gọziri agọzi. Ọ dị ka a ga-asị na anyanwụ si n’urukpuru waa; ọnọdụ gbanwere site n’ịhụ na ịnụ banyere amamikpe—nke a kọwara n’Aịsaịa 2:6–4:1—gaa n’ala mara mma e mere ka ọ dị ọhụrụ ya na ndị mmadụ.

4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji tụlee amụma Aịsaịa banyere mweghachi nke ihe fọdụrụnụ?

4 Amụma Aịsaịa banyere mweghachi nke ihe fọdụrụnụ na ịnọ ná ntụkwasị obi ha mgbe ọ gasịrị na-enwekwa mmezu ha n’oge anyị—“n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a.” (Aịsaịa 2:2-4) Ka anyị tụlee ozi a bịara n’oge ya, n’ihi na ọ bụghị nanị na o nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ amụma kamakwa ọ na-akụziri anyị banyere ebere Jehova na otú anyị pụrụ isi nweta ya n’otu n’otu.

“Ihe Opupu Jehova”

5, 6. (a) Olee otú Aịsaịa si kọwaa oge udo ga-esochi ọgba aghara na-abịanụ? (b) Gịnị ka okwu bụ́ “ihe opupu” pụtara, gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere ala Juda?

5 Ụda olu Aịsaịa aghọọ nke na-adọrọ adọrọ ka ọ na-ele anya gabiga oké ifufe ahụ na-abịanụ gaa n’oge dị jụụ karị. Ọ na-ede, sị: “N’ụbọchị ahụ ka ihe opupu nke Jehova ga-aghọ ihe mara mma na ihe nsọpụrụ, mkpụrụ nke ala ga-aghọkwara ndị Israel gbapụrụ agbapụ mbili elu na ịma mma.”—Aịsaịa 4:2.

6 N’ebe a Aịsaịa na-ekwu okwu banyere mweghachi. Mkpọaha Hibru a sụgharịrị ịbụ “ihe opupu” na-ezo aka ‘n’ihe pulitere epulite, ome, alaka.’ A na-ejikọta ya na ọganihu, mmụba, na ngọzi sitere n’aka Jehova. Ya mere Aịsaịa na-enye olileanya—ntọgbọrọ n’efu ahụ na-abịanụ agaghị adịru ebighị ebi. Site ná ngọzi Jehova, ala Juda ahụ baburu ọgaranya ga-amịpụtaghachi mkpụrụ n’ụba.a—Levitikọs 26:3-5.

7. N’ụzọ dị aṅaa ka ihe opupu Jehova ga-esi bụrụ ‘maka ịma mma na nsọpụrụ’?

7 Aịsaịa ji okwu ndị doro anya kọwaa ịdị ebube nke mgbanwe ahụ dị n’ihu. Ihe opupu ahụ nke Jehova ga-abụ ‘maka ịma mma na nsọpụrụ.’ Okwu bụ́ ‘ịma mma’ na-echetara anyị ịma mma nke Ala Nkwa ahụ mgbe Jehova nyere ya Israel ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. Ọ mara mma nke ukwuu nke na e weere ya dị ka “ịma mma [“ọla,” New American Bible] nke ala nile.” (Ezikiel 20:6) N’ụzọ dị otú a okwu Aịsaịa na-emesi ndị ahụ obi ike na a ga-eme ka ala Juda nweghachi ebube na ịma mma mbụ ya. N’ezie, ọ ga-adị ka okpu ọla n’ụwa.

8. Olee ndị ga-anọ ya ikiri ịma mma e weghachiri eweghachi nke ala ahụ, oleekwa otú Aịsaịa si kọwaa mmetụta ha?

8 Otú ọ dị, olee ndị ga-anọ ya ikiri ịma mma e weghachiri eweghachi nke ala ahụ? “Ndị Israel gbapụrụ agbapụ,” ka Aịsaịa na-ede. Ee, ụfọdụ ga-alanarị mbibi ahụ na-emenye ihere e buru ụzọ buo n’amụma. (Aịsaịa 3:25, 26) Ihe fọdụrụ ná ndị ahụ lanarịrịnụ ga-alaghachi na Juda ma soro wughachi ya. Nye ndị a ga-alaghachinụ—“ndị gbapụrụ agbapụ”—ụbara ihe nke ala ha e weghachiri eweghachi ga-emepụta ga-aghọ “ihe a ga-eji na-anya isi na ihe mara mma.” (Aịsaịa 4:2; nkọwa ala ala peji nke NW) Echiche ọhụrụ nke obi ụtọ ga-anọchi mweda n’ala nke mbibi kpatara.

9. (a) N’imezu okwu Aịsaịa, gịnị mere na 537 T.O.A.? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na “ndị gbapụrụ agbapụ” na-agụnye ụfọdụ ndị a mụrụ n’ala ọzọ? (Lee nkọwa ala ala peji.)

9 Dị nnọọ ka Aịsaịa si kwuo, oké ifufe nke ikpe bịara na 607 T.O.A. mgbe ndị Babilọn bibiri Jerusalem, ọtụtụ ndị Israel nwụkwara. Ụfọdụ lanarịrị ma bụrụ ndị a kpụụrụ gaa Babilọn, e wezụga ebere Chineke, a garaghị enwe otu onye ga-alanarị. (Nehemaịa 9:31) N’ikpeazụ, e mere ka Juda tọgbọrọ n’efu. (2 Ihe E Mere 36:17-21) Mgbe ahụ, na 537 T.O.A., Chineke nke ebere mere ka “ndị gbapụrụ agbapụ” laghachi na Juda iji weghachi ezi ofufe.b (Ezra 1:1-4; 2:1) A kọwara nchegharị sitere n’ala ala obi nke ndị a e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị na-alọtanụ n’ụzọ mara mma n’Abụ Ọma nke 137, bụ́ nke e dere ma eleghị anya n’oge ndọrọ n’agha ahụ ma ọ bụ ntakịrị oge mgbe ọ gasịrị. Mgbe ha laghachiri na Juda ha kọrọ ma kụọ mkpụrụ n’ala ahụ. Cheedị otú ọ na-aghaghị ịdịworị ha mgbe ha hụrụ na Chineke na-agọzi mgbalị ha, na-eme ka ala ahụ puo ihe opupu dị ka “ubi Iden a gbara ogige” nke na-emepụta ihe!—Ezikiel 36:34-36.

10, 11. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Ndị Mmụta Bible si bụrụ ndị a dọọrọ n’agha gaa na “Babilọn Ukwu ahụ” ná mmalite nke narị afọ nke 20? (b) Olee otú Jehova si gọzie ihe fọdụrụ ná ndị Israel ime mmụọ ahụ?

10 Mweghachi yiri nke ahụ ewerewo ọnọdụ n’oge anyị. Ná mmalite narị afọ nke 20, Ndị Mmụta Bible, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, ghọrọ ndị a dọọrọ n’agha n’ụzọ ime mmụọ gaa na “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:5) Ọ bụ ezie na ha ajụwo ọtụtụ ozizi nke okpukpe ụgha, Ndị Mmụta Bible ka nwere echiche na omume ụfọdụ nke ndị Babilọn. N’ihi mmegide nke ndị ụkọchukwu kpaliri, a tụrụ ụfọdụ n’ime ha mkpọrọ n’ụzọ nkịtị. E mere ka ala ime mmụọ ha—ógbè okpukpe, ma ọ bụ nke ime mmụọ ha—tọgbọrọ n’efu.

11 Ma n’oge opupu ihe ubi nke 1919, Jehova meere ndị a fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ebere. (Ndị Galetia 6:16) Ọ hụrụ nchegharị ha na ọchịchọ ha ife ya ofufe n’eziokwu, ya mere o mere ka a tọhapụ ha na mkpọrọ nkịtị a tụrụ ha, nke kakwa mkpa, ná ndọrọ n’agha ime mmụọ. E weghachiri ndị a “gbapụrụ agbapụ” n’ala ime mmụọ Chineke nyere ha, bụ́ nke o mere ka o puo ihe opupu n’ụba. Ala ime mmụọ a enwewokwa ọdịdị na-adọrọ adọrọ, nke mara mma, bụ́ nke dọtaworo ọtụtụ nde ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke isonyere ihe ahụ fọdụrụnụ n’ezi ofufe.

12. Olee otú okwu Aịsaịa si mesie ebere Jehova meere ndị ya ike?

12 Ihe ndị Aịsaịa kwuru n’ebe a na-emesi ebere Chineke meere ndị ya ike. Ọ bụ ezie na dị ka otu mba, ndị Israel gbakụtara Jehova azụ, o meere ihe fọdụrụnụ nwere nchegharị ebere. Anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ịmara na ọbụna ndị mere mmehie dị oké njọ pụrụ iji olileanya laghachikwute Jehova. Ndị nwere nchegharị ekwesịghị ịdị na-eche na Jehova apụghị imere ha ebere, n’ihi na ọ dịghị ajụ obi tiwara etiwa. (Abụ Ọma 51:17) Bible na-emesi anyị obi ike, sị: “Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere. Dị ka nna si enwe obi ebere n’ahụ ụmụ ya, otú a ka Jehova nwere obi ebere n’ahụ ndị na-atụ egwu Ya.” (Abụ Ọma 103:8, 13) N’ezie, Chineke na-eme ebere otú a kwesịrị ịnara otuto anyị nile!

Ihe Fọdụrụnụ Aghọọ Ihe Dị Nsọ Nye Jehova

13. Dị ka e dekọrọ n’Aịsaịa 4:3, olee otú Aịsaịa si kọwaa ihe ahụ fọdụrụ Jehova ga-emere ebere?

13 E meela ka anyị mata banyere ihe ahụ fọdụrụnụ Jehova ga-emere ebere, ma ugbu a Aịsaịa na-akọwa ha n’ụzọ sara mbara karị. Ọ na-ede, sị: “Ọ ga-erukwa, na onye e meworo ka ọ fọdụ na Zaịọn, na onye fọdụrụ na Jerusalem, onye nsọ ka a ga-akpọ ya, bụ́ onye ọ bụla nke e deworo ya n’akwụkwọ ịdị ndụ n’ime Jerusalem.”—Aịsaịa 4:3.

14. Olee ndị bụ ‘ndị e mere ka ha fọdụ’ na ‘ndị ahụ fọdụrụ,’ n’ihi gịnịkwa ka Jehova ga-eji meere ha ebere?

14 Olee ndị bụ ndị “e meworo ka [ha] fọdụ” na ndị ahụ “fọdụrụ”? Ha bụ ndị gbapụrụ agbapụ e hotara n’amaokwu bu ụzọ—ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị a ga-ekwe ka ha laghachi na Juda. Ugbu a Aịsaịa na-egosi ihe Jehova ga-eji meere ha ebere—ha ‘ga-adị nsọ nye ya.’ (NW) Ịdị nsọ pụtara “erughị unyi ma ọ bụ ịdị ọcha n’ụzọ okpukpe; ido iche.” Ịdị nsọ na-agụnye erughị unyi, ma ọ bụ ịdị ọcha, n’okwu na n’omume, iru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ Jehova nke ihe ziri ezi na ihe kwesịrị ekwesị. Ee, Jehova ga-emere ndị dị ‘nsọ nye ya’ ebere, ọ ga-ekwekwa ka ha laghachi ‘n’obodo nsọ’ ahụ, bụ́ Jerusalem.—Nehemaịa 11:1.

15. (a) Okwu bụ́ “e deworo ya n’akwụkwọ ịdị ndụ n’ime Jerusalem” na-echetara anyị ihe dị aṅaa ndị Juu na-eme? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa kwesịrị nchebara echiche ka okwu Aịsaịa bụ?

15 Ndị a fọdụrụnụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi hà ga-anọgide n’ebe ahụ? Aịsaịa na-ekwe nkwa na a ga-edeba aha ha “n’akwụkwọ ịdị ndụ n’ime Jerusalem.” Nke a na-echetara anyị ihe ndị Juu na-eme bụ́ inwe ihe ndekọ e ji nlezianya na-eme banyere ezinụlọ na ebo dị iche iche nke Israel. (Nehemaịa 7:5) Ịbụ onye e debanyere aha ya n’akwụkwọ ndekọ ihe pụtara na onye ahụ dị ndụ, n’ihi na mgbe mmadụ nwụrụ, a na-ewepụ aha ya. N’ebe ndị ọzọ n’ime Bible, anyị na-agụ banyere akwụkwọ ndekọ ihe nke ihe atụ, nke nwere aha ndị Jehova ji ndụ kwụọ ụgwọ ọrụ. Ma a na-edenye aha n’akwụkwọ a dabere n’ihe ụfọdụ, n’ihi na Jehova pụrụ ‘ihichapụ’ aha na ya. (Ọpụpụ 32:32, 33; Abụ Ọma 69:28) Mgbe ahụ, okwu Aịsaịa bụ ịdọ aka ná ntị nke kwesịrị ichebara echiche—ndị ahụ laghachirinụ pụrụ ịnọgide na-ebi n’ala ha e weghachiri eweghachi nanị ma ọ bụrụ na ha anọgide na-adị nsọ n’anya Chineke.

16. (a) Gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị o kwere ka ha laghachi Juda na 537 T.O.A.? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ebere Jehova meere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ alaghị n’iyi?

16 Na 537 T.O.A., ihe ahụ fọdụrụnụ bụ́ ndị laghachiri na Jerusalem ji nzube dị ọcha laghachi—iweghachi ezi ofufe. Ọ dịghị onye ọ bụla tinyere aka n’ihe omume okpukpe nke ndị ọgọ mmụọ ma ọ bụ omume na-adịghị ọcha ndị Aịsaịa dọsiri aka ná ntị ike banyere ha nke ruru eru ịlaghachi. (Aịsaịa 1:15-17) Ọ bụ nanị ndị Jehova lere anya dị ka ndị dị nsọ pụrụ ịlaghachi na Juda. (Aịsaịa 35:8) N’otu aka ahụ, kemgbe a tọhapụrụ ha ná ndọrọ n’agha ime mmụọ na 1919, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, bụ́ ndị ọtụtụ nde nke “atụrụ ọzọ”—ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala, sonyewooro ugbu a—emewo mgbalị dị ukwuu ịdị nsọ n’anya Chineke. (Jọn 10:16) Ha ewepụsịwo n’etiti onwe ha ozizi na omume ndị Babilọn. N’otu n’otu, ha na-agbalị ịrapara n’ụkpụrụ dị elu nke omume ọma nke Chineke. (1 Pita 1:14-16) Ebere Jehova meere ha alaghị n’iyi.

17. Aha ole ndị ka Jehova na-ede “n’akwụkwọ nke ndụ” ya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

17 Cheta na Jehova rịbara ndị dị nsọ n’Israel ama nakwa na o ‘deturu aha ha n’akwụkwọ maka ndụ.’ Taakwa, Jehova na-arịba ama mgbalị anyị na-eme ịdị ọcha n’uche na n’ahụ ka anyị ‘na-eche ahụ anyị dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ.’ (Ndị Rom 12:1) Chineke na-edetukwa aha ndị nile na-agbaso ụdị ụzọ ndụ ahụ “n’akwụkwọ nke ndụ” ya—ihe ndekọ ihe atụ nke nwere aha ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi, n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala. (Ndị Filipaị 4:3; Malakaị 3:16) Mgbe ahụ, ka anyị mee ike anyị nile ịnọgide na-adị nsọ n’anya Chineke, n’ihi na mgbe ahụ ka anyị pụrụ ime ka aha anyị dịgide “n’akwụkwọ” ahụ dị oké mkpa.—Mkpughe 3:5.

Nkwa Nlekọta Ịhụnanya

18, 19. Dị ka Aịsaịa 4:4, 5 si kwuo, nsacha dị aṅaa ka Jehova ga-asacha, oleekwa otú a ga-esi mee ya?

18 Aịsaịa gosiziri otú ndị bi n’ala ahụ e weghachiri eweghachi ga-esi ghọọ ndị dị nsọ nakwa ngọzi ndị na-echere ha. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe Onyenwe anyị ga-asachapụworị unyi ụmụ ndị inyom Zaịọn, ṅachapụkwa ọbara Jerusalem n’etiti ya, site na Mmụọ nke ikpe, na site na Mmụọ nke mkpochapụ. Jehova ga-ekekwa n’elu ebe ahụ nile guzosiri ike nke ugwu Zaịọn, na n’elu mkpọkọta ya nile, igwe ojii na anwụrụ ọkụ n’ehihie, na onwunwu nke ọkụ na-ere ere n’abalị: n’ihi na n’elu ebube nile ka a ga-agbasa ihe mkpuchi.”—Aịsaịa 4:4, 5.

19 Tupu mgbe ahụ, Aịsaịa baara “ụmụ ndị inyom Zaịọn” mba, bụ́ ndị ji ihe ịchọ mma ha ji eme ngosi zochie ịrụ arụ nke omume ha. O kpughekwara ikpe ọmụma ọbara nke ndị ahụ n’ozuzu ha, na-agba ha ume ka ha sachaa onwe ha. (Aịsaịa 1:15, 16; 3:16-23) Otú ọ dị, n’ebe a, ọ na-elepụ anya n’ihu gaa n’oge Chineke n’onwe ya ‘ga-asachapụworị unyi,’ ma ọ bụ omume ọjọọ ahụ, ma ‘sachapụ ntụpọ ọbara’ ahụ. (Aịsaịa 4:4, New International Version) Olee otú a ga-esi mee nsacha a? Site na “Mmụọ nke ikpe” na “Mmụọ nke mkpochapụ.” Mbibi ahụ na-abịanụ nke a ga-ebibi Jerusalem na ime ka e jee biri n’ala ọzọ na Babilọn ga-abụ ntiwapụ nke ikpe Chineke na oké iwe ya n’ahụ mba na-adịghị ọcha. Ihe fọdụrụnụ bụ́ ndị lanarịrị ọdachi ndị a ma lọta ga-abụworị ndị e meworo ka ha dị umeala n’obi, ndị a nụchara anụcha. Ọ bụ ya mere ha ga-eji dị nsọ nye Jehova ma bụrụ ndị e meere ebere.—Tụlee Malakaị 3:2, 3.

20. (a) Gịnị ka okwu bụ́ “igwe ojii,” “anwụrụ ọkụ,” na “ọkụ na-ere ere” na-echetara anyị? (b) N’ihi gịnị ka ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị e mere ka ha dị ọcha na-ekwesịghị iji tụọ ụjọ?

20 Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa, na-ekwe nkwa na ya ga-elekọta ndị a fọdụrụnụ e mere ka ha dị ọcha n’ịhụnanya ya. Okwu bụ́ “igwe ojii,” “anwụrụ ọkụ,” na “ọkụ na-ere ere” na-echetara anyị otú Jehova si lekọta ndị Israel mgbe ha hapụsịrị Ijipt. ‘Ogidi ọkụ na igwe ojii’ chebere ha pụọ n’aka ndị Ijipt na-achụ ha; o dukwara ha n’ọzara. (Ọpụpụ 13:21, 22; 14:19, 20, 24) Mgbe Jehova gosipụtara onwe ya n’Ugwu Saịnaị, ugwu ahụ nile “na-akwụ anwụrụ.” (Ọpụpụ 19:18) Ya bụrụ otú ahụ, ndị ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ bụ́ ndị e mere ka ha dị ọcha ekwesịghị ịtụ ụjọ. Jehova ga-abụ Onye Nchebe ha. Ọ ga-anọnyere ha ma hà gbakọtara ọnụ n’ebe obibi ha ma ọ bụ zukọta ná mkpọkọta ndị dị nsọ.

21, 22. (a) À na-ewukarị ụlọ ntu, ma ọ bụ ụlọ ahịhịa, maka gịnị? (b) Olileanya dị aṅaa ka e chere ihe ahụ fọdụrụnụ e mere ka ha dị ọcha n’ihu?

21 Aịsaịa mechiri nkọwa ya banyere nchebe Chineke site n’ilekwasị anya ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ọ na-ede, sị: “Ụlọ ntu ga-adịkwa ịbụ ndò n’ehihie ịpụ n’okpomọkụ, na ịbụ ebe mgbaba, na ịbụ ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo na ịpụ na mmiri ozuzo nile.” (Aịsaịa 4:6) A na-ewukarị ụlọ ntu, ma ọ bụ ụlọ ahịhịa, n’ubi vine ma ọ bụ n’ubi iji nye ndò a chọsiri ike n’anwụ na-achasi ike nke oge ọkọchị na pụọ n’oyi na ifufe nke oge udu mmiri.—Tụlee Jona 4:5.

22 Mgbe oké okpomọkụ nke mkpagbu na oké ifufe nke mmegide chere ha ihu, ihe ahụ fọdụrụnụ e mere ka ha dị ọcha ga-ahụ na Jehova bụ Isi Iyi ha nke nchebe, nke ịnọ ná ntụkwasị obi, na ebe mgbaba. (Abụ Ọma 91:1, 2; 121:5) E si otú a chee n’ihu ha olileanya mara mma: Ọ bụrụ na ha ahapụ nkwenkwe na omume ndị na-adịghị ọcha nke Babilọn, nyefee onwe ha maka nsacha nke ikpe Jehova, ma gbalịa ịnọgide na-adị nsọ, ha ga-anọgide n’enweghị ihe ga-eme ha, dị ka a ga-asị na ha nọ ‘n’ụlọ ntu’ nke nchebe Chineke.

23. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo gọzie ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na ndị ibe ha?

23 Rịba ama na nsacha bu ụzọ bịa, e mesịa ngọzi. Nke a abụrụwo eziokwu n’oge anyị. Laa azụ na 1919 ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ ji ịdị umeala n’obi nyefee onwe ha ka a nụchaa ha, Jehova “sachapụkwara” adịghị ọcha ha. Kemgbe ahụ, “oké ìgwè mmadụ” nke atụrụ ọzọ ekwewokwa ka Jehova sachaa ha. (Mkpughe 7:9) N’ịbụ ndị a sachaworo, a gọziwo ihe ahụ fọdụrụ na ndị ibe ha—Jehova akpọbatawo ha ná nlekọta nchebe ya. Ọ dịghị eji ọrụ ebube egbochi okpomọkụ nke mkpagbu ma ọ bụ oké ifufe nke mmegide ịbịakwasị ha. Ma ọ na-echebe ha, dị ka a ga-asị na ọ na-ewuru ha ‘ụlọ ntu maka ndò na maka izopụ n’oké mmiri ozuzo.’ N’ụzọ dị aṅaa?

24. Olee otú o si pụta ìhè na Jehova agọziwo ndị ya dị ka otu nzukọ?

24 Tụlee nke a: Ụfọdụ n’ime gọọmenti ndị kasị ike e nweworo n’akụkọ ihe mere eme amachibidowo ọrụ ime nkwusa nke Ndịàmà Jehova iwu ma ọ bụ gbalịa ikpochapụ ha kpam kpam. Ma, Ndịàmà akwụrụwo chịm ma nọgide na-eme nkwusa n’esepụghị aka! N’ihi gịnị ka mba ndị dị ike ji ghara inwe ike ịkwụsị ọrụ nke ìgwè mmadụ a a pụrụ ịsị na ha dị ntakịrị, ndị yikwara ndị na-enweghị ihe nchebe? N’ihi na Jehova edebewo ndị ohu ya dị ọcha ‘n’ụlọ ntu’ nke nchebe nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịkwatu!

25. Gịnị ka inwe Jehova dị ka Onye Nchebe anyị pụtara nye anyị n’otu n’otu?

25 Olee banyere anyị n’otu n’otu? Inwe Jehova dị ka Onye Nchebe anyị apụtaghị na anyị na-adị ndụ nke enweghị nsogbu n’ime usoro ihe a. Ọtụtụ ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-enweta oké nsogbu, ndị dị ka ịda ogbenye, ọdachi ndị na-emere onwe ha, agha, ọrịa, na ọnwụ. Mgbe anyị na-enwe nsogbu ndị dị otú ahụ, ka anyị ghara ichefu na Chineke anyị nọnyeere anyị. Ọ na-echebe anyị n’ụzọ ime mmụọ, na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa—ọbụna “ọkịka nke ike”—iji nagide ule n’ikwesị ntụkwasị obi. (2 Ndị Kọrint 4:7) N’ịbụ ndị nọ ná nchebe n’ihu ya, ọ dịghị mkpa anyị ịtụ ụjọ. E kwuwerị, ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-eme ike anyị iji doo onwe anyị nsọ n’anya ya, ọ dịghị ihe ‘ga-enwe ike ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.’—Ndị Rom 8:38, 39.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-atụ aro na nkebi ahịrịokwu bụ́ “ihe opupu Jehova” bụ izo aka n’ebe Mesaịa nọ, bụ́ onye na-agaghị abịa ruo mgbe e weghachisịrị Jerusalem. Na Targum ndị dị n’asụsụ Aramaic, nkọwa nke okwu a na-agụ, sị: “Mesaịa [Kraịst] nke Jehova.” N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Jeremaịa mesịrị jiri otu mkpọaha Hibru ahụ (tseʹmach) mee ihe mgbe ọ na-ekwu banyere Mesaịa ahụ dị ka “Ihe opupu nke na-eme ezi omume” e mere ka o puoro Devid.—Jeremaịa 23:5; 33:15.

b “Ndị gbapụrụ agbapụ” gụnyere ụfọdụ ndị a mụrụ n’ala ọzọ. A pụrụ iwere ndị a dị ka ndị “gbapụrụ agbapụ,” ebe ọ bụ na a garaghị amụworị ha ma ọlị ma a sị na ndị nna nna ha alanarịghị mbibi ahụ.—Ezra 9:13-15; tụlee Ndị Hibru 7:9, 10.

[Foto dị na peeji nke 63]

Oké ifufe nke ikpe Chineke na-abịakwasị Juda

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya