Isi nke Asaa
Laghachinụ n’Ofufe Jehova
1. Gịnị bụ aha arụsị abụọ n’ime arụsị ndị bụ́ isi nke Babilọn, gịnịkwa ka e buru n’amụma banyere ha?
MGBE a ga-eme ka Israel jee biri n’ala ọzọ na Babilọn, okpukpe ụgha ga-agba ya gburugburu. N’oge Aịsaịa, ndị Jehova ka nọ n’ala ha, ha nwekwara ụlọukwu ahụ na ndị nchụàjà. Ma, ọtụtụ n’ime ndị so ná mba Chineke, bụ́ nke raara onwe ya nye adabawo n’ikpere arụsị. Ya mere, ọ dị oké mkpa ịkwadebe ha tupu oge eruo ka chi ụgha dị iche iche nke Babilọn wee ghara imenye ha ụjọ ma ọ bụ ha abụrụ ndị a nwara ife ha ofufe. N’ihi ya, n’ikwu okwu n’ụzọ amụma banyere abụọ n’ime chi ndị bụ́ isi nke Babilọn, Aịsaịa na-ekwu, sị: “Bel ehuruwo ala, Nebo amakpuwo amakpu; arụsị nile ha dị n’elu anụmanụ na n’elu anụ ụlọ: ihe nile unu [bugharịrị] bụ ihe e boro ebo, ha bụ ibu e boro anụ na-ada mbà.” (Aịsaịa 46:1) Bel bụ arụsị bụ́ isi nye ndị Kaldea. A na-asọpụrụ Nebo dị ka chi nke amamihe na mmụta. A na-ahụ nkwanye ùgwù nke ọtụtụ ndị nwere maka chi abụọ a n’eziokwu ahụ bụ na a na-ewebata aha ha n’ime ọtụtụ aha aka nke ndị Babilọn—Belshaza, Nabopolassar, Nebukadneza, na Nebuzaradan, n’ịkpọ nanị ole na ole.
2. Olee otú e si mesie adịghị ike nke chi dị iche iche nke Babilọn ike?
2 Aịsaịa na-ekwu na Bel “ehuruwo ala” nakwa na Nebo “amakpuwo amakpu.” A ga-eweda chi ụgha ndị a ala. Mgbe Jehova ga-eweta ikpe ya megide Babilọn, chi ndị a agaghị enwe ike ịgbatara ndị na-efe ha ọsọ enyemaka. Ha agaghịdị azọpụtali onwe ha! A gakwaghị na-ebugharị Bel na Nebo ná ngagharị ndị dị nsọpụrụ, dị ka n’oge ememe Afọ Ọhụrụ nke Babilọn. Kama nke ahụ, ndị na-efe ha ga-ebupụ ha dị ka ibu nkịtị. Ịkwa emo na nkọcha ga-anọchi ito ha na ịsọpụrụ ha.
3. (a) Gịnị ga-eju ndị Babilọn anya? (b) Gịnị ka a pụrụ ịmụta taa site n’ihe mere chi dị iche iche nke Babilọn?
3 Lee ihe ijuanya ọ ga-abụrụ ndị Babilọn ịmata na arụsị ha ndị ha ji kpọrọ ihe bụ ibu arọ efu nke anụmanụ ndị ike gwụrụ ga-ebupụ! N’otu aka ahụ taa, chi ndị dị n’ụwa—ihe ndị mmadụ na-atụkwasị obi na ihe ndị ha na-emefuru ike ha, ọbụnakwa na-enye ndụ ha—bụ ihe efu. Akụ̀ na ụba, ngwá agha, ihe ụtọ, ndị ọchịchị, ala nna mmadụ ma ọ bụ ihe nnọchianya ha, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ aghọwo ihe ndị a na-efe ofufe. A ga-ekpughe abaghị n’ihe nke chi ndị dị otú ahụ mgbe oge nke Jehova ruru.—Daniel 11:38; Matiu 6:24; Ọrụ 12:22; Ndị Filipaị 3:19; Ndị Kọlọsi 3:5; Mkpughe 13:14, 15.
4. N’echiche dị aṅaa ka chi dị iche iche nke Babilọn ‘makpu amakpu’ ma “huru ala”?
4 N’imekwu ka ọdịda chi dị iche iche nke Babilọn ga-ada kpam kpam pụta ìhè, amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ha amakpuwo, huru ala n’otu; ha apụghị ime ka ibu wezụga onwe ya, kama ha onwe ha alawo ná ndọta n’agha.” (Aịsaịa 46:2) Chi dị iche iche nke Babilọn yiri ka ha ‘makpu amakpu’ ma “huru ala” dị ka a ga-asị na e merụrụ ha ahụ n’agha ma ọ bụ bụrụ ndị na-adịghị ike n’ihi ime agadi. Ha apụghị ọbụna ime ka ibu nke anụ ndị na-ebu ha dị mfe ma ọ bụ meere ha ụzọ mgbapụ. Ya mere, ndị ha na Jehova nọ n’ọgbụgba ndụ, ọ bụ ezie na e ji ha eji na Babilọn, hà kwesịrị inye ha nsọpụrụ ọ bụla? Ee e! N’otu aka ahụ, ndị ohu Jehova e tere mmanụ, ọbụna mgbe e ji ha eji n’ụzọ ime mmụọ, asọpụrụghị chi ụgha dị iche iche nke “Babilọn Ukwu ahụ,” bụ́ ndị na-egbochilighị ọdịda ya na 1919, ha agaghịkwa azọpụtali ya pụọ n’ọdachi ga-adakwasị ya n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ.—Mkpughe 18:2, 21; Matiu 24:21.
5. Olee otú ndị Kraịst taa si ezere ihie ụzọ ahụ ndị Babilọn na-ekpere arụsị hiere?
5 O nweghị ụdị arụsị ọ bụla nke ezi ndị Kraịst taa na-akpọrọ isiala. (1 Jọn 5:21) Obe, chaplet, na foto ndị senti adịghị eme ka e nwekwuo ike ịgakwuru Onye Okike. Ha apụghị ịrịọchitere anyị arịrịọ. Na narị afọ nke mbụ, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ụzọ kwesịrị ekwesị nke isi na-efe Chineke mgbe o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ́ bụghị site na Mụ. Ọ bụrụ na unu [arịọ] ihe ọ bụla n’aha m, nke ahụ ka M ga-eme.”—Jọn 14:6, 14.
“Ndị E Buru Ebu Site n’Akpa Nwa”
6. Olee otú Jehova si dị iche na chi nke mba dị iche iche?
6 Ebe o kpugheworo abaghị n’ihe nke ife chi arụsị dị iche iche nke Babilọn ofufe, Jehova gwara ndị ya, sị: “Geenụ m ntị, unu ụlọ Jekọb, na ụlọ Israel nile fọdụrụ afọdụ, unu ndị bụ ibu e boro ebo site n’afọ nne unu, ndị e buru ebu site n’akpa nwa.” (Aịsaịa 46:3) Lee ọdịiche dị n’etiti Jehova na ihe oyiyi ndị a pịrị apị nke Babilọn! Chi dị iche iche nke Babilọn apụghị imere ndị na-efe ha ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ dị ebe ha ga-aga, ọ bụ anụ na-ebu ibu ga-ebuga ha. N’ụzọ dị nnọọ iche, Jehova anọwo na-ebu ndị ya. Ọ nọwo na-enyere ha aka “site n’akpa nwa,” malite n’oge e guzobere mba ahụ. Iji obi ụtọ na-echeta na Jehova buuru ha kwesịrị ịgba ndị Juu ahụ ume izere ife arụsị ofufe na ịtụkwasị ya obi dị ka Nna ha na Enyi ha.
7. Olee otú nlekọta ịhụnanya Jehova na-elekọta ndị na-efe ya ofufe si karịa ọbụna nlekọta nne na nna bụ́ mmadụ na-elekọta ụmụ ha?
7 Jehova ka nwere okwu obiọma ọ ga-agwa ndị ya: “Ọzọ, ruo agadi Mụ onwe m bụ Onye ahụ, ruokwa isi awọ Mụ onwe m ga-eku unu n’aka: Mụ onwe m emewo, Mụ onwe m ga-ebukwa; ee, Mụ onwe m ga-eku n’aka meekwa ka unu wepụga onwe unu.” (Aịsaịa 46:4) Nlekọta Jehova na-elekọta ndị ya karịrị nke nne na nna bụ́ mmadụ, bụ́ ndị kasị elebara ụmụ ha anya. Ka ụmụaka na-etolite, ibu ọrụ ndị mụrụ ha nwere n’ebe ha nọ pụrụ ịdị na-ebelatakwu. Mgbe ndị mụrụ ha mere agadi, ọtụtụ mgbe ụmụaka ahụ na-elekọta ha. Ọ dịghị mgbe ọ na-adị otú ahụ n’ebe Jehova nọ. Ọ dịghị mgbe ọ na-akwụsị ilekọta ụmụ ya bụ́ mmadụ—ọbụna mgbe ha mere agadi. Ndị na-efe Chineke taa na-atụkwasị Onye Okike ha obi ma hụ ya n’anya, na-enwetakwa nkasi obi dị ukwuu n’ihe ndị a e kwuru n’amụma Aịsaịa. Ọ dịghị mkpa ka ha na-echegbu onwe ha banyere ụbọchị ma ọ bụ afọ ndị fọdụụrụ ha ịnọ n’ime usoro ihe a. Jehova na-ekwe nkwa ịnọgide “na-eku” ndị agadi, na-enye ha ume dị ha mkpa iji tachie obi ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ ga-ekuru ha, wusie ha ike, ma mee ka ha wepụga onwe ha.—Ndị Hibru 6:10.
Kpachara Anya Maka Arụsị Dị Iche Iche nke Oge A
8. Mmehie dị aṅaa nke na-enweghị ihe ngọpụ ka ndị obobo Aịsaịa meworo?
8 Cheedị mmechu ihu nke na-echere ndị Babilọn bụ́ ndị tụkwasịrị obi n’arụsị dị iche iche, bụ́ ndị na-agaghị aba uru ọ bụla! Israel hà kwesịrị ikwenye na a pụrụ iji chi ndị ahụ tụnyere Jehova? Ọ dịghị ma ọlị. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Jehova na-ajụ, sị: “Ònye ka unu ga-asị na M yiri ya, na Mụ na ya [ha] nhata, na Mụ dị ka ya, ka anyị wee yie?” (Aịsaịa 46:5) Lee ihe na-enweghị ngọpụ ọ bụ na ụfọdụ n’ime ndị obodo Aịsaịa echigharịwo gaa n’ife ihe oyiyi ndị na-adịghị ekwu okwu, ndị na-adịghị ndụ, na ndị na-apụghịkwa inye aka ofufe! Nye mba maara Jehova, ịtụkwasị obi n’ihe oyiyi na-adịghị ndụ, bụ́ ndị na-enweghị ihe nchebe, ndị ọ bụ ụmụ mmadụ mere, bụ ihe nzuzu n’ezie.
9. Kọwaa echiche iberibe nke ụfọdụ ndị na-ekpere arụsị.
9 Tụlee echiche iberibe nke ndị na-ekpere arụsị. Amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Ndị ahụ ndị na-awụfu ọlaedo n’akpa, ndị na-atụkwa ọlaọcha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ha na-egote onye nnụcha ọla, o wee mee ya ka ọ bụrụ chi: ha na-ada kpuo ihu n’ala, ee, ha na-akpọ isiala.” (Aịsaịa 46:6) Dị ka a ga-asị na arụsị dara oké ọnụ nwere ike ịzọpụta mmadụ karịa nke e ji osisi mee, ndị na-efe ha adịghị ele ego anya n’ihu n’ịrụ chi ha. Ma, n’agbanyeghị otú mgbalị e tinyere na ha haruru ma ọ bụ otú ha daruru n’ọnụ, arụsị na-adịghị ndụ ka bụ arụsị na-adịghị ndụ, ọ gafeghị ya.
10. Olee otú e si kọwaa abatụghị n’ihe nke ife arụsị ofufe?
10 N’imekwu ka nzuzu dị n’ife arụsị ofufe pụta ìhè, amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ha na-ebuli ya n’ubu, na-ebu ya, wee dọba ya n’ọnọdụ ya, o wee guzo; ọ gaghị esi n’ebe ya pụọ: ee, mmadụ ga-etiku ya mkpu, ma ọ gaghị aza, ọ gaghị azọpụta ya n’ahụhụ ya.” (Aịsaịa 46:7) Lee ihe nzuzu ọ bụ ikpegara ihe oyiyi nke na-apụghị ịnụ ihe ma ọ bụ ime ihe ekpere! Onye ọbụ abụ ahụ kọwara nnọọ nke ọma abaghị n’ihe nke ihe ndị dị otú ahụ a na-efe ofufe: “Arụsị nile ha bụ ọlaọcha na ọlaedo, ọrụ aka mmadụ. Ha nwere ọnụ, ma ha adịghị ekwu okwu; ha nwere anya abụọ, ma ha adịghị ahụ ụzọ; ha nwere ntị abụọ, ma ha adịghị anụ ihe; ha nwere imi, ma ha adịghị anụta ísì; ha nwere aka ha abụọ, ma ha adịghị ebitụ ihe; ha nwere ụkwụ ha abụọ, ma ha adịghị eje ije; ha adịghị ewere akpịrị ha mee ụṅara. Ndị na-eme ha ga-adị ka ha; Ee, onye ọ bụla nke na-atụkwasị ha obi.”—Abụ Ọma 115:4-8.
‘Nwee Obi Ike’
11. Gịnị ga-enyere ndị na-akwụghị otu ebe aka ‘inwe obi ike’?
11 Ebe o gosipụtaworo abaghị n’ihe nke ife arụsị ofufe, Jehova gwaziri ndị ya ihe ndị mere ha kwesịrị iji jeere ya ozi: “Chetanụ nke a, [ka unu wee nwee obi ike, NW]: meenụ ka ọ bịaghachi n’obi, unu ndị njehie. Chetanụ ihe mbụ nile site na mgbe ebighị ebi gara aga: n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otu efu dị ka Mụ onwe m.” (Aịsaịa 46:8, 9) Ndị na-eme ha fetụ ezi ofufe ha ekpetụrụ arụsị kwesịrị icheta akụkọ ihe mere eme. Ha kwesịrị iburu ihe dị iche iche Jehova meworo n’uche. Nke a ga-enyere ha aka inwe obi ike ma mee ihe ziri ezi. Ọ ga-enyere ha aka ịlaghachi n’ife Jehova ofufe.
12, 13. Mgba dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst nọ na ya, oleekwa otú ha pụrụ isi merie?
12 A ka chọrọ agbamume a taa. Dị ka ndị Israel, ndị Kraịst bụ́ ndị nwere obi eziokwu aghaghị ịlụ ọgụ megide ọnwụnwa na ezughị okè nke ha. (Ndị Rom 7:21-24) Ọzọkwa, ha na onye iro a na-adịghị ahụ anya, nke siri oké ike, na-agba mgba n’ụzọ ime mmụọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ịgba mgba anyị abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide ịbụ ndị isi nile, imegide ịchịisi nile, imegide ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.”—Ndị Efesọs 6:12.
13 Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-eme ihe nile ha nwere ike ime iji mee ka ndị Kraịst si n’ezi ofufe pụọ. Iji busoo ya agha ma merie, ọ dị ndị Kraịst mkpa ịgbaso ndụmọdụ Jehova ma nwee obi ike. N’ụzọ dị aṅaa? Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “Yikwasịnụ ihe agha nile nke Chineke, ka unu wee pụọ iguzogide ihe nile ekwensu na-ezupụta.” Jehova adịghị eziga ndị ohu ya n’ọgbọ agha n’ejikereghị ha nke ọma. Ihe agha ime mmụọ ha na-agụnye “ọta nke bụ́ okwukwe, nke [ha] ga-apụ imenyụ àkụ́ ụta nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ n’ime ya.” (Ndị Efesọs 6:11, 16) Ndị Israel bụ ndị njehie n’ihi na ha leghaara ndokwa ime mmụọ ndị Jehova meere ha anya. A sị na ha tụgharịrị uche n’ọrụ ndị dị ike Jehova rụrụ ugboro ugboro n’ihi ha, ọ dịghị mgbe ha gaara atụgharị gaa n’ife arụsị ofufe bụ́ nke na-asọ oyi. Ka anyị mụta ihe site n’ihe mere ha ma kpebisie ike ịghara ma ọlị ịbụ ndị na-akwụghị otu ebe n’ọgụ nke ime ihe ziri ezi.—1 Ndị Kọrint 10:11.
14. N’ikike dị aṅaa ka Jehova na-ezo aka iji gosi na ọ bụ ya bụ nanị ezi Chineke ahụ?
14 Jehova bụ onye “na-egosi ikpeazụ site na mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.” (Aịsaịa 46:10) Olee chi ọzọ a pụrụ iji tụnyere Jehova na nke a? Ikike ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu bụ ihe àmà dị ịrịba ama nke ọbụbụ Onye Okike bụ Chineke. Otú ọ dị, a chọrọ ihe karịrị ilepụ anya n’ihu iji jide n’aka na ihe ndị e buru n’amụma mezuru. Okwu bụ́ “ndụmọdụ m ga-eguzosi ike” na-emesi ike enweghị mgbanwe nke nzube Chineke e meworo ka o guzosie ike. Ebe Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè, ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’eluigwe na ụwa nke pụrụ igbochi ya imezu uche ya. (Daniel 4:35) Ya mere, anyị pụrụ ijide n’aka na amụma ọ bụla na-emezubeghị ga-emezu n’ezie n’oge nke Chineke.—Aịsaịa 55:11.
15. Olee ihe atụ dị ịrịba ama e mere ka anyị mata nke ikike Jehova nwere ikwu ihe ga-eme n’ọdịnihu?
15 Amụma Aịsaịa meziri ka anyị mata otu ihe atụ dị ịrịba ama nke ikike Jehova nwere ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu nakwa imezu ihe ndị o kwuru: “[Onye] na-esi n’ọwụwa anyanwụ kpọọ udele, na-esikwa n’ala dị anya kpọọ onye ga-eme ndụmọdụ m: ee, ekwuwo m, M ga-emekwa ka o mee; ezubewo m, M ga-emekwa ya.” (Aịsaịa 46:11) Dị ka onye “na-egosi ikpeazụ site na mbụ” Jehova Chineke ga-ahazigharị ihe omume ụmụ mmadụ iji mezuo ndụmọdụ ya. Ọ ga-akpọ Saịrọs ‘site n’ọwụwa anyanwụ,’ ma ọ bụ Peasia nke dị n’ọwụwa anyanwụ, bụ́ ebe isi obodo Saịrọs kasị nwee mmasị na ya, bụ́ Pasargadae, ga-adị. Saịrọs ga-adị “ka udele,” na-ebekwasị Babilọn na mberede nakwa na mgbe a na-atụghị anya ya.
16. Olee otú Jehova si kwado ojiji e ji mmezu nke amụma ya banyere Babilọn n’aka?
16 A kwadoro ojiji e ji mmezu nke amụma Jehova banyere Babilọn n’aka site n’okwu bụ́, “ekwuwo m, M ga-emekwa ka o mee.” Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekwekarị nkwa n’echeghị ya eche, Onye Okike adịghị ahapụ imezu ihe o kwuru. N’ihi na Jehova bụ Chineke “Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha,” anyị pụrụ ijide n’aka na ọ bụrụ na o “zubewo” ya, ọ “ga-emekwa ya.”—Taịtọs 1:2.
Obi Ndị Na-enweghị Okwukwe
17, 18. Ole ndị ka a pụrụ ịkọwa dị ka “ndị dị ike n’obi” (a) n’oge ochie? (b) taa?
17 Ọzọkwa, Jehova chere ihu n’ebe ndị Babilọn nọ n’ụzọ amụma, na-asị: “Geenụ m ntị, unu ndị dị ike n’obi, ndị nọpụrụ ezi omume n’ebe dị anya.” (Aịsaịa 46:12) Okwu bụ́ “ndị dị ike n’obi” na-akọwa ndị na-agba isi akwara na ndị nọgidesiri ike ná mmegide ha na-emegide uche Chineke. N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ndị Babilọn nọ ebe dị anya site n’ebe Chineke nọ. Asị ha kpọrọ Jehova na ndị ya kpaliri ha ibibi Jerusalem na ụlọukwu ya na ịkpụrụ ndị bi n’ime ya gaa ala ọzọ.
18 Taa, ndị nwere obi abụọ na obi na-adịghị ekwenye ekwenye na-eji ịgba isi akwara ajụ ịṅa ntị n’ozi Alaeze ahụ, bụ́ nke a na-ekwusa n’elu ụwa dum mmadụ bi. (Matiu 24:14) Ha achọghị ikweta na Jehova bụ onye o ruuru ịbụ Eze. (Abụ Ọma 83:18; Mkpughe 4:11) Ebe obi ha “nọpụrụ ezi omume n’ebe dị anya,” ha na-eguzogide ma na-emegide uche ya. (2 Timoti 3:1-5) Dị ka ndị Babilọn, ha na-ajụ ịṅa Jehova ntị.
Nzọpụta Chineke Agaghị Anọ Ọdụ
19. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova ga-esi rụọ ọrụ ezi omume n’ihi Israel?
19 Okwu mmechi nke Aịsaịa isi 46 na-eme ka àgwà dị iche iche nke Jehova pụta ìhè: “Ewetawo m ezi omume m nso, ọ gaghị adị n’ebe dị anya, nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ; M wee nye nzọpụta n’ime Zaịọn, nyekwa Israel ịma mma m.” (Aịsaịa 46:13) Chineke ịtọhapụ Israel ga-abụ ezi omume. Ọ gaghị ekwe ka ndị ya gbuo oge n’ala ọzọ. Nzọpụta Zaịọn ga-abịa n’oge kwesịrị ekwesị, ọ ‘gaghị anọ ọdụ.’ Mgbe a tọhapụsịrị ha site n’ịbụ ndị e ji eji, ndị Israel ga-aghọ ihe nkiri nye mba ndị gbara ha gburugburu. Mgbapụta Jehova ga-agbapụta mba ya ga-abụ ihe akaebe nke ike nzọpụta ya. A ga-ekpughe abaghị n’ihe nke chi Babilọn bụ́ Bel na Nebo ka mmadụ nile hụ ya, kpughee adịghị ike ha.—1 Ndị Eze 18:39, 40.
20. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi jide n’aka na ‘nzọpụta Jehova agaghị anọ ọdụ’?
20 Na 1919, Jehova mere ka a tọhapụ ndị ya ná ndọrọ n’agha ime mmụọ. Ọ nọghị ọdụ. Ihe omume ahụ, tinyere ihe ndị mere n’oge ochie mgbe Saịrọs meriri Babilọn, na-agba anyị ume taa. Jehova ekwewo nkwa iweta ajọ usoro ihe a ná njedebe, gụnyere ofufe ụgha ya. (Mkpughe 19:1, 2, 17-21) N’ile ihe anya dị ka mmadụ si ele ya, ụfọdụ ndị Kraịst pụrụ iche na nzọpụta ha anọọla ọdụ. Otú ọ dị, ndidi Jehova nwere ruo n’oge nke ya iji mezuo nkwa ahụ bụ n’ezie ezi omume. E kwuwerị, “[Jehova ezubeghị] ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Ya mere, jide n’aka na dị ka ọ dị n’oge nke Israel oge ochie, ‘nzọpụta agaghị anọ ọdụ.’ N’ezie, ka ụbọchị nzọpụta ahụ na-adịwanye nso, Jehova nọgidere jiri ịhụnanya na-akpọ òkù, sị: “Chọọnụ Jehova mgbe a na-achọta Ya, kpọkuonụ Ya mgbe Ọ nọ nso: onye na-emebi iwu, ya hapụ ụzọ ya, onye na-eme ajọ ihe, ya hapụ echiche ya nile: ya laghachikwutekwa Jehova, Ọ ga-enwekwa obi ebere n’ahụ ya; ya laghachikwutekwa Chineke anyị, n’ihi na Ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụba.”—Aịsaịa 55:6, 7.
[Foto ndị dị na peeji nke 94]
Chi dị iche iche nke Babilọn echebeghị ya pụọ ná mbibi
[Foto ndị dị na peeji nke 98]
Ndị Kraịst taa aghaghị ịkpachara anya maka arụsị ndị nke oge a
[Foto ndị dị na peeji nke 101]
Nwee obi ike iji mee ihe ziri ezi