Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 9 p. 120-135
  • Jehova Na-ezi Anyị Ihe Maka Ọdịmma Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-ezi Anyị Ihe Maka Ọdịmma Anyị
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ibu Amụma Ihe Ndị Ọhụrụ
  • Jehova Na-egosipụta Njide Onwe Onye
  • “Mụ Onwe M Bụ Onye Mbụ, Mụ Onwe M Bụkwa Onye Ikpeazụ”
  • ‘Ṅaa Ntị n’Ihe Nile M Nyere n’Iwu!’
  • “Sinụ na Babilọn Pụọ”
  • Jehova—“Chineke nke Na-eme Ezi Omume na Onye Nzọpụta”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Okwu Amụma Nkasi Obi Ndị Metụtara Gị
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • “Unu Onwe Unu Bụ Ndị Àmà M”!
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ezi Chineke Ebuo Amụma Banyere Mgbapụta
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 9 p. 120-135

Isi nke Itoolu

Jehova Na-ezi Anyị Ihe Maka Ọdịmma Anyị

Aịsaịa 48:1-22

1. Olee otú ndị maara ihe si emeghachi omume n’ihe ndị Jehova kwuru?

MGBE Jehova kwuru okwu, ndị maara ihe na-eji oké nkwanye ùgwù na-ege ya ntị ma na-eme ihe ndị o kwuru. Ihe ọ bụla Jehova kwuru bụ maka abamuru anyị, o nwekwara mmasị dị ukwuu n’ọdịmma anyị. Dị ka ihe atụ, lee ka o si enye obi ụtọ ịtụle ụzọ Jehova si gwa ndị ya nke oge ochie, bụ́ ndị ha na ya nọ n’ọgbụgba ndụ okwu: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu!” (Aịsaịa 48:18) Uru a izi ihe Chineke bara, bụ́ nke a nwapụtaworo, kwesịrị ịkwali anyị ige ya ntị na ịgbaso nduzi ya. Ihe ndekọ e nwere banyere amụma mezuru emezu na-eme ka a ghara inwe obi abụọ ọ bụla banyere mkpebi Jehova kpebisiworo ike imezu nkwa ya dị iche iche.

2. Ole ndị ka e deere okwu ndị dị n’Aịsaịa isi 48, oleekwa ndị ọzọ pụrụ irite uru na ha?

2 Dị ka ihe àmà na-egosi, e dere ihe ndị ahụ e kwuru n’isi 48 nke akwụkwọ Aịsaịa n’ihi ndị Juu, bụ́ ndị a ga-eme ka ha jee biri na Babilọn. Ọzọkwa, ihe ndị a e kwuru nwere ozi nke ndị Kraịst taa na-apụghị ileghara anya. N’Aịsaịa isi 47, Bible buru amụma banyere ọdịda Babilọn. Ugbu a, Jehova na-akọwa ihe o bu n’uche banyere ndị Juu e mere ka ha jee biri n’obodo ahụ. Omume ihu abụọ nke ndị ya ọ họọrọ na ọjụjụ ha ji ịgba isi akwara jụ ikweta ná nkwa ya, wutere Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ chọrọ izi ha ihe maka ọdịmma ha. O buru ụzọ hụ oge nnụcha nke ga-eduga ná mweghachi nke ihe fọdụrụnụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ala nna ha.

3. Gịnị dị njọ n’otú Juda si efe ofufe?

3 Lee ókè ndị Jehova wezụgaruworo onwe ha pụọ n’ofufe dị ọcha! Okwu mmeghe nke Aịsaịa na-akpali iche echiche: “Nụrụnụ nke a, unu ụlọ Jekọb, ndị a na-akpọ n’aha Israel, ndị siwokwara ná mmiri Juda pụta; ndị ji aha Jehova aṅụ iyi, ọ bụkwa Chineke Israel ka ha na-ehota, ma ọ bụghị n’eziokwu, ọ bụghịkwa n’ezi omume. N’ihi na ha akpọwo onwe ha ndị sitere n’obodo nsọ, ọ bụkwa Chineke Israel ka ha daberewooro; Jehova usuu nile nke ndị agha bụ aha Ya.” (Aịsaịa 48:1, 2) Lee omume ihu abụọ nke ahụ bụ! ‘Iji aha Jehova na-aṅụ iyi’ bụ n’ụzọ doro anya nanị iji aha Chineke eme ihe n’ụzọ mmezu iwu. (Zefanaịa 1:5) Tupu e mee ka ha jee biri na Babilọn, ndị Juu na-efe Jehova “n’obodo nsọ,” bụ́ Jerusalem. Ma ofufe ha esighị ha n’obi. Obi ha dị anya n’ebe Chineke nọ, ife ofufe ha ‘abụghịkwa n’eziokwu, ọ bụghịkwa n’ezi omume.’ Ha enweghị ụdị okwukwe ndị nna ha ochie nwere.—Malakaị 3:7.

4. Ụdị ofufe dị aṅaa na-atọ Jehova ụtọ?

4 Ihe Jehova kwuru na-echetara anyị na ofufe ekwesịghị ịbụ ihe e ji emeju iwu. Ọ ghaghị isite n’obi. Ozi mmeju iwu efu—ikekwe nke a na-eme nanị iji mee ihe ga-atọ ndị ọzọ ụtọ—esoghị n’omume “nsọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:11) Mmadụ ịkpọ onwe ya onye Kraịst, n’onwe ya, adịghị eme ka ofufe ya bụrụ nke Chineke na-anakwere. (2 Timoti 3:5) Ịmata na Jehova dị adị dị oké mkpa, ma, ọ bụ nanị mmalite. Jehova chọrọ ofufe nke sitere ná mkpụrụ obi dum, nke ịhụnanya na ekele miri emi na-akpalikwa.—Ndị Kọlọsi 3:23.

Ibu Amụma Ihe Ndị Ọhụrụ

5. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime “ihe mbụ nile” Jehova buru n’amụma?

5 Ikekwe ọ dị ndị Juu ahụ nọ na Babilọn mkpa ka e chetaghachiri ha ihe ụfọdụ. N’ihi ya, Jehova chetaghachikwaara ha ọzọ na ya bụ Chineke nke na-ebu ezi amụma: “Ihe mbụ nile site na mgbe ochie ka M gosiworo; ọ bụkwa n’ọnụ m ka ha siri pụta, M wee mee ka a nụ ha: na mberede ka M mere ha, ha wee mee.” (Aịsaịa 48:3) “Ihe mbụ nile” bụ ihe ndị Chineke mezuworo emezu, dị ka ịtọhapụ ndị Israel site n’Ijipt na inye ha Ala Nkwa ahụ dị ka ihe nketa. (Jenesis 13:14, 15; 15:13, 14) Amụma ndị dị otú ahụ na-esi n’ọnụ Chineke apụta; ọ bụ ya na-eme ka e buo ha. Chineke na-eme ka ndị mmadụ nụ iwu ya, ihe ndị ha na-anụkwa kwesịrị ịkwali ha irube isi. (Deuterọnọmi 28:15) O mere ihe na mberede iji mezuo ihe o buru n’amụma. Eziokwu ahụ bụ́ na Jehova bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile na-eme ka e jide n’aka na e mezuru nzube ya.—Joshua 21:45; 23:14.

6. Ruo n’ókè ha aṅaa ka ndị Juu ghọworo ndị “na-ewezụga onwe ha ndị na-enupụkwa isi”?

6 Ndị Jehova aghọwo ndị “na-ewezụga onwe ha ndị na-enupụkwa isi.” (Abụ Ọma 78:8) Ọ gwara ha hoo haa, sị: “[Ndị] siri ike ka [unu] bụ, na . . . akwara ígwè ka olu [unu] bụ, na egedege ihu [unu] bụkwa ọla.” (Aịsaịa 48:4) Dị ka ọla, ndị Juu siri ike ịrọ—ha adịghị agbanwe agbanwe. Nke ahụ bụ otu ihe mere Jehova ji na-ekpughe ihe dị iche iche tupu ha emee. Ma ọ bụghị ya, ndị ya ga-ekwu banyere ihe ndị Jehova meworo, sị: “Arụsị m emewo ha, ọ bụkwa arụsị m a pịrị apị na arụsị m a wụrụ awụ nyere ha iwu.” (Aịsaịa 48:5) Ihe Jehova na-ekwu ugbu a, ọ̀ ga-enwe mmetụta ọ bụla n’ahụ ndị Juu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi? Chineke na-agwa ha, sị: “Ị nụwo ya; gị lee ihe a nile; unu onwe unu kwa, ùnu agaghị egosi ya? Emewo m ka ị nụrụ ihe ọhụrụ dị iche iche site n’ugbu a, bụ́ ihe e chebeworo na nzuzo, nke ị na-amaghị. Ugbu a ka e keworo ha, ọ bụghị site na mgbe ochie; ọzọ, tupu ụbọchị taa eruo ị nụghịkwa ha; ka i wee ghara ịsị, Lee, amaara m ha.”—Aịsaịa 48:6, 7.

7. Gịnị ka ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ na-aghaghị ikweta, gịnịkwa ka ha pụrụ ịtụ anya ya?

7 Ogologo oge tupu o mee, Aịsaịa deturu amụma banyere ọdịda Babilọn. Ugbu a e mere ka ha jee biri na Babilọn, e nyere ndị Juu iwu n’ụzọ amụma ka ha tụgharịa uche ná mmezu nke amụma ahụ. Hà pụrụ ịgọ agọ na Jehova bụ Chineke nke amụma mezuru emezu? Ebe ndị bi na Juda hụwokwara ma nụ na Jehova bụ Chineke nke eziokwu, ọ̀ bụ na ha agaghịkwa akpọsarịrị eziokwu a nye ndị ọzọ? Okwu Jehova e kpughere ekpughe na-ebu amụma banyere ihe ọhụrụ ndị na-emezubeghị, dị ka mmeri Saịrọs ga-emeri Babilọn na ntọhapụ nke ndị Juu. (Aịsaịa 48:14-16) Ihe omume ndị ahụ na-eju anya yiri ka ha mere na mberede. Ọ dịghị onye pụrụ ibuwo ụzọ hụ ha tupu ha emee nanị site n’inyocha ihe ndị na-ewere ọnọdụ n’ụwa. Ha bịara dị ka ha si n’elu daa. Ònye na-eme ka ihe ndị a mee? Ebe Jehova buru ha n’amụma ihe dị ka afọ 200 tupu ha emee, azịza ya doro anya.

8. Olee ihe ọhụrụ ndị ndị Kraịst taa na-atụ anya ha, n’ihi gịnịkwa ka ha ji nwee obi ike zuru ezu n’okwu amụma Jehova?

8 Ọzọkwa, Jehova na-emezu okwu ya n’ikwekọ n’usoro ọgụgụ oge nke ya. Amụma ndị mezuru emezu na-egosi ọbụbụ ọ bụ Chineke, ọ bụghị nanị nye ndị Juu n’oge ochie kamakwa nye ndị Kraịst taa. Ihe ndekọ banyere ọtụtụ amụma ndị e mezuru n’oge gara aga—“ihe mbụ nile”—bụ ihe mmesi obi ike na ihe ọhụrụ ndị Jehova kwere ná nkwa—‘oké mkpagbu’ ahụ na-abịanụ, nlanarị nke “oké ìgwè mmadụ” gabiga mkpagbu ahụ, “ụwa ọhụrụ,” na ọtụtụ ihe ndị ọzọ—ga-emezu. (Mkpughe 7:9, 14, 15; 21:4, 5; 2 Pita 3:13) Mmesi obi ike ahụ na-akwali ndị obi ha ziri ezi taa iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu okwu banyere ya. Ha na-enwekwa mmetụta nke onye ọbụ abụ ahụ nwere, bụ́ onye sịrị: “Ezisawo m ozi ọma nke ezi omume n’ime mkpọkọta Gị bara ụba; lee, adịghị m egbochi egbugbere ọnụ m abụọ.”—Abụ Ọma 40:9.

Jehova Na-egosipụta Njide Onwe Onye

9. Olee otú mba Israel siworo bụrụ “Onye na-ejehie ejehie site n’afọ nne ya”?

9 Ọjụjụ ndị Juu jụrụ ikweta amụma Jehova egbochiwo ha ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ya. Ọ bụ ya mere o ji gaa n’ihu ịgwa ha, sị: “Otú ọ dị, ị nụghị; ị maghịkwa; sitekwa na mgbe ochie ntị gị egheghị oghe: n’ihi na amaara m na ị na-aghọgbu aghọgbu nke ukwuu, ọzọ, Onye na-ejehie ejehie site n’afọ nne ya, ka a na-akpọ gị.” (Aịsaịa 48:8) Juda mechiri ntị ya ịnụ ozi obi ụtọ nke Jehova. (Aịsaịa 29:10) Otú ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ siworo mee omume na-egosi na mba ahụ bụ “Onye na-ejehie ejehie site n’afọ nne ya.” Malite mgbe a mụrụ ya nakwa n’akụkọ ihe mere eme ya nile, mba Israel enwewo ihe ndekọ nke nnupụisi. Njehie na aghụghọ bụ emezighị emezi riworo ndị ahụ ahụ, ha abụghị nanị mmehie ha na-eme mgbe ụfọdụ.—Abụ Ọma 95:10; Malakaị 2:11.

10. N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji gbochie onwe ya?

10 Ọ̀ bụ na olileanya adịghịzi ma ọlị? Ee e. Ọ bụ ezie na Juda anọwo na-enupụ isi ma na-aghọ aghụghọ, Jehova na-ekwu eziokwu ma kwesị ntụkwasị obi mgbe nile. N’ihi nsọpụrụ nke aha ukwu ya, ọ ga-akpara mwụpụ nke ọnụma ya ókè. Ọ na-ekwu, sị: “N’ihi aha m ka M na-eme ka iwe m nọọ ọdụ, ọ bụkwa n’ihi otuto m ka M na-egbochi ya n’ebe ị nọ, ka M wee ghara ibipụ gị.” (Aịsaịa 48:9) Lee ka o si dị iche! Ndị Jehova, ma Israel ma Juda, abụwo ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye ya. Ma Jehova ga-edo aha ya nsọ, na-eme ihe n’ụzọ iji wetara ya otuto na nsọpụrụ. N’ihi nke a, ọ gaghị ebipụ ndị ya ọ họpụtara.—Joel 2:13, 14.

11. N’ihi gịnị ka Chineke na-agaghị eji kwe ka e bibie ndị ya kpam kpam?

11 Ịba mba Chineke kpọtere ndị obi ha ziri ezi n’etiti ndị Juu ahụ e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ha wee kpebisie ike ịṅa ntị n’izi ihe ya. Nye ndị dị otú ahụ, nkwupụta okwu na-esonụ bụ nnọọ ihe na-emesi obi ike: “Lee, anụchawo m gị, ma ọ bụghị dị ka ọlaọcha; ahọpụtawo m gị n’oké ọkụ nke iweda n’ala. N’ihi Mụ onwe m, n’ihi Mụ onwe m, ka M ga-eme ya; n’ihi na lee ka e si mee ka aha m ghara ịdị nsọ nke ukwuu! M gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m.” (Aịsaịa 48:10, 11) Ahụmahụ ọjọọ ndị na-ele ule—dị ka a ga-asị na ọ bụ “n’oké ọkụ nke iweda n’ala”—ndị Jehova kweworo ka ha dakwasị ndị ya, anwalewo ma nụchaa ha, na-ekpughe ihe dị ha n’obi. Ihe yiri ya mere ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ mgbe Mosis gwara ndị nna nna ha, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, mere gị ka i jee [iri afọ anọ] ndị a n’ọzara, ka O wee weda gị n’ala, ịnwa gị, ka O wee mara ihe nke dị n’obi gị.” (Deuterọnọmi 8:2) N’agbanyeghị omume nnupụisi ha, Jehova ebibighị mba ahụ n’oge ahụ, ọ gaghịkwa ebibi mba ahụ kpam kpam ugbu a. N’ụzọ dị otú a, a ga-ebuli aha ya na nsọpụrụ ya elu. Ọ bụrụ na ndị ya alaa n’iyi n’aka ndị Babilọn, ọ ga-apụta na o mezughị ọgbụgba ndụ ya, a ga-emetọkwa aha ya. Ọ ga-adị ka Chineke nke Israel enweghị ike iji zọpụta ndị ya.—Ezikiel 20:9.

12. Olee otú e si nụchaa ezi ndị Kraịst n’oge Agha Ụwa Mbụ?

12 N’oge a kwa, nnụcha adịwo ndị Jehova mkpa. Laa azụ ná mmalite nke narị afọ nke 20, ọtụtụ n’ime ndị so ná ntakịrị ìgwè Ndị Mmụta Bible ji ezi ọchịchọ nke ime ihe na-atọ Chineke ụtọ jeere ya ozi, ma ụfọdụ nwere ebumnobi na-ezighị ezi, dị ka ọchịchọ ịbụ ndị a ma ama. Tupu ntakịrị ìgwè ahụ enwee ike ibute ụzọ ná nkwusa zuru ụwa ọnụ nke ozi ọma ahụ e buru n’amụma maka mgbe ọgwụgwụ, ọ ga-adị mkpa ka e mee ka ha dị ọcha. (Matiu 24:14) Malakaị onye amụma buru amụma na a ga-arụzu ọrụ nnụcha dị otú ahụ kpọmkwem n’ihe metụtara ọbịbịa Jehova ga-abịa n’ụlọ nsọ ya. (Malakaị 3:1-4) Ihe ndị o kwuru mezuru na 1918. Ezi ndị Kraịst gabigara oge ile ule siri oké ike mgbe Agha Ụwa Mbụ kpụ ọkụ n’ọnụ, ile ule ahụ dịgidere ruo mgbe a tụrụ Joseph F. Rutherford mkpọrọ, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, ya na ụfọdụ ndị ọrụ ya nọ n’isi. Ndị Kraịst ahụ nwere obi eziokwu ritere uru n’usoro nnụcha ahụ. Ha gabigara Agha Ụwa Mbụ, bụrụ ndị kpebisiri ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ijere Chineke ukwu ha ozi n’ụzọ ọ bụla o kwuru.

13. Olee otú ndị Jehova siworo meghachi omume ná mkpagbu n’afọ ndị gafeworonụ kemgbe Agha Ụwa Mbụ?

13 Eri oge ahụ, Ndịàmà Jehova echewo ụdị mkpagbu ndị kasị njọ ihu ugboro ugboro. Nke a emebeghị ka ha nwee obi abụọ banyere okwu Onye Okike ha. Kama nke ahụ, ha arịbawo ama ihe Pita onyeozi gwara ndị Kraịst a na-akpagbu n’oge ya: “E mere ka o wute unu n’ọnwụnwa dị iche iche . . . ka e wee hụ nnwapụta [nke okwukwe unu] na ọ na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ n’ime mkpughe nke Jisọs Kraịst.” (1 Pita 1:6, 7) Mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ adịghị ebibi iguzosi ike n’ezi ihe nke ezi ndị Kraịst. Kama nke ahụ, ọ na-ekpughe ịdị ọcha nke ebumnobi ha. Ọ na-eme ka okwukwe ha nwekwuo ọdịdị a nwapụtara anwapụta ma na-egosi ịdị omimi nke nraranye na ịhụnanya ha.—Ilu 17:3.

“Mụ Onwe M Bụ Onye Mbụ, Mụ Onwe M Bụkwa Onye Ikpeazụ”

14. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si bụrụ “onye mbụ” na “onye ikpeazụ”? (b) Olee ọrụ ndị dị ike Jehova ji “aka” ya rụzuo?

14 Ugbu a, Jehova ji obiọma na-arịọ ndị ha na ya nọ n’ọgbụgba ndụ, sị: “Gee m ntị, Jekọb, na Israel, bụ́ onye M kpọworo: Mụ onwe m bụ Onye ahụ; Mụ onwe m bụ onye mbụ, mụ onwe m bụkwa onye ikpeazụ. Ee, aka m atọwo ntọala ụwa, ọ bụkwa aka nri m setịpụworo eluigwe: ọ bụrụ na Mụ onwe m akpọọ ha òkù, ha ga-eguzo ọtọ n’otu.” (Aịsaịa 48:12, 13) N’adịghị ka mmadụ, Chineke na-adịru mgbe ebighị ebi, ọ dịghịkwa agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) Ná Mkpughe, Jehova kwupụtara, sị: “Mụ onwe m bụ Alfa ahụ na Omega ahụ, onye mbụ na onye ikpeazụ, mmalite na ọgwụgwụ.” (Mkpughe 22:13) Tupu Jehova, ọ dịghị Chineke pụrụ ime ihe nile nke dịnụ, ọ dịghịkwa nke ga-eso ya n’azụ. Ọ bụ ya bụ Onye Kasị Elu na Onye Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi, Onye Okike. “Aka” ya—ike ya nke nọ n’ọrụ—guzobere ụwa ma setịpụ eluigwe nke jupụtara na kpakpando. (Job 38:4; Abụ Ọma 102:25) Mgbe ọ kpọrọ ihe ndị o kere eke òkù, ha na-adị njikere ijere ya ozi.—Abụ Ọma 147:4.

15. N’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa ka Jehova jiworo ‘hụ Saịrọs n’anya’?

15 A kpọrọ ma ndị Juu ma ndị na-abụghị ndị Juu òkù dị mkpa, sị: “Chịkọtanụ onwe unu, unu nile, nụrụkwa; ònye n’etiti ha gosiworo ihe ndị a? Onye ahụ Jehova hụworo n’anya ga-eme ihe na-atọ Ya ụtọ na Babilọn, ọ bụkwa ogwe aka ya ga-adakwasị ndị Kaldea. Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, ekwuwo okwu; ee, akpọwo m ya: emewo m ka ọ bịa, ọ ga-emekwa ka ije ya gaa nke ọma.” (Aịsaịa 48:14, 15) Ọ bụ nanị Jehova nwere ike nile, nweekwa ike ibu amụma ihe ndị ga-eme n’ụzọ ziri ezi. Ọ dịghị nke ọ bụla n’etiti “ha,” bụ́ arụsị dị iche iche na-abaghị n’ihe, nke nwere ike ikpughe ihe ndị a. Ọ bụ Jehova, ọ bụghị arụsị ndị ahụ, “hụworo [ya, Saịrọs] n’anya”— ya bụ, Jehova ahọpụtawo ya maka otu nzube kpọmkwem. (Aịsaịa 41:2; 44:28; 45:1, 13; 46:11) O buruwo ụzọ hụ mpụta Saịrọs ga-apụta n’ihe omume ụwa, ọ kpọwokwa ya aha dị ka onye ga-emeri Babilọn n’ọdịnihu.

16, 17. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Chineke ebughị amụma ya na nzuzo? (b) Olee otú Jehova siworo kpọsaa nzube ya n’ihu ọha taa?

16 N’ụda olu dị ụtọ, Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “Bịakwutenụ m nso, nụrụnụ nke a; site na mgbe mbụ ọ bụghị na nzuzo ka M kwuworo okwu; site na mgbe ọdịdị ya, n’ebe ahụ ka M nọ.” (Aịsaịa 48:16a) E bughị amụma ndị sitere n’aka Jehova na nzuzo ma ọ bụ mee ka nanị mmadụ ole na ole mara ha. Ndị amụma Jehova bụ ndị na-ekwu okwu hoo haa n’aha Chineke. (Aịsaịa 61:1) Ha kwupụtara uche Chineke n’ihu ọha. Dị ka ihe atụ, ihe omume ndị metụtara Saịrọs abụghị ihe ọhụrụ nye Chineke ma ọ bụ ihe ndị ọ na-ebughị ụzọ hụ tupu ha emee. Ihe dị ka afọ 200 tupu ha emee, Chineke buru ha n’amụma n’ihu ọha site n’ọnụ Aịsaịa.

17 N’otu ụzọ ahụ taa, Jehova adịghị ezo nzube ya ezo. Ọtụtụ nde mmadụ n’ọtụtụ narị ala nakwa n’àgwàetiti nke oké osimiri na-akpọsa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, n’okporo ámá, na n’ebe ọ bụla ọzọ ha nwere ike, ịdọ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ na-abịanụ nke usoro ihe a na ozi ọma banyere ngọzi ndị gaje ịbịa n’oge ọchịchị Alaeze Chineke. N’eziokwu, Jehova bụ Chineke nke na-eme ka a mara nzube ya.

‘Ṅaa Ntị n’Ihe Nile M Nyere n’Iwu!’

18. Gịnị bụ ihe Jehova chọrọ maka ndị ya?

18 N’ịbụ onye mmụọ Jehova mere ka ọ dị ike, onye amụma ahụ kwupụtara, sị: “Onyenwe anyị Jehova ezitewo m, mụ na Mmụọ Ya. Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye mgbapụta gị na Onye Nsọ Israel: Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:16b, 17) Ngosipụta ịhụnanya a nke nlekọta Jehova kwesịrị imesighachi mba Israel obi ike na Chineke gaje ịnapụta ha na Babilọn. Ọ bụ Onye Mgbapụta ha. (Aịsaịa 54:5) Ihe Jehova chọrọ site n’ala ala obi ya bụ ka ndị Israel mezie mmekọrịta ha na ya ma ṅaa ntị n’ihe nile o nyere n’iwu. Ezi ofufe na-adabere n’irube isi ná ntụziaka Chineke. Ndị Israel enweghị ike ije ije n’ụzọ ziri ezi ọ gwụla ma a kụziere ha ‘ụzọ ha ga-ejeso.’

19. Arịrịọ dị aṅaa sitere n’obi ka Jehova na-arịọ?

19 E kwupụtara n’ụzọ mara mma ọchịchọ Jehova chọrọ ka ndị ya zere ọdachi ma nụ ụtọ ndụ: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu! udo gị ewee dịworịị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.” (Aịsaịa 48:18) Lee arịrịọ sitere n’obi nke Onye Okike pụrụ ime ihe nile na-arịọ! (Deuterọnọmi 5:29; Abụ Ọma 81:13) Kama ịbụ ndị a dọọrọ n’agha, ndị Israel pụrụ inwe udo nke ga-aba ụba dị ka mmiri nke na-eru n’osimiri. (Abụ Ọma 119:165) Ọrụ ezi omume ha pụkwara ịdị ọtụtụ dị ka mmali mmiri nile nke oké osimiri. (Emọs 5:24) Dị ka onye nwere mmasị n’ezie n’ebe ha nọ, Jehova na-arịọ ndị Israel arịrịọ, jiri ịhụnanya na-egosi ha ụzọ ha kwesịrị ije ije na ya. Ewo, a sị nnọọ na ha ga-aṅa ntị!

20. (a) Gịnị bụ ọchịchọ Chineke maka Israel n’agbanyeghị nnupụisi ha? (b) Gịnị ka anyị na-amụta banyere Jehova site n’otú o si mesoo ndị ya ihe? (Lee igbe dị na peeji nke 133.)

20 Ngọzi dịgasị aṅaa ga-abịa ma ọ bụrụ na Israel ga-echegharị? Jehova na-ekwu, sị: “Mkpụrụ gị ga-adịwokwarịị ka ájá, ụmụ nke si n’afọ gị pụta dị ka ụmụ ihe si n’afọ oké osimiri ahụ pụta: a gaghị ebipụworịị aha ya ma ọ bụ kpochapụ ya n’ihu m.” (Aịsaịa 48:19) Jehova na-echetara ndị ahụ nkwa o kwere bụ́ na mkpụrụ Abraham ga-adị ọtụtụ, “dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jenesis 22:17; 32:12) Otú ọ dị, ụmụ Abraham ndị a anọwo na-enupụ isi, ha ekwesịghịkwa inweta mmezu nke nkwa ahụ. N’ezie, ihe ndekọ ha adịwo nnọọ njọ nke na, dị ka Iwu Jehova si dị, ha kwesịrị ka e hichapụ aha ha dị ka otu mba. (Deuterọnọmi 28:45) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova achọghị ka e kpochapụ ndị ya, ọ chọghịkwa ịgbahapụ ha kpam kpam.

21. Ngọzi dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ inweta taa ma ọ bụrụ na anyị achọọ ntụziaka Jehova?

21 Ụkpụrụ ndị dị n’akụkụ ihe odide a dị ike na-emetụta ndị na-efe Jehova ofufe taa. Jehova bụ Isi Iyi nke ndụ, ọ makwaara karịa onye ọ bụla, otú anyị kwesịrị isi jiri ndụ anyị mee ihe. (Abụ Ọma 36:9) O nyewo anyị ụkpụrụ nduzi, ọ bụghị iji mee ka anyị ghara ikpori ndụ, kama ka ọ baara anyị uru. Ezi ndị Kraịst na-ege ntị site n’ịchọ ka Jehova zie ha ihe. (Maịka 4:2) Ntụziaka ya na-echebe ọnọdụ ime mmụọ anyị na mmekọrịta anyị na ya, ha na-echebekwa anyị pụọ ná mmetụta na-emerụ emerụ nke Setan. Mgbe anyị ghọtara ụkpụrụ ndị dị n’iwu Chineke, anyị na-ahụ na Jehova na-ezi anyị ihe maka ọdịmma anyị. Anyị na-achọpụta na “ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” A gaghịkwa ebipụ anyị.—1 Jọn 2:17; 5:3.

“Sinụ na Babilọn Pụọ”

22. Gịnị ka a gbara ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi ume ka ha mee, mmesi obi ike dịgasịkwa aṅaa ka e nyere ha?

22 Mgbe Babilọn dara, ọ̀ dị onye Juu ọ bụla ga-egosipụta ọnọdụ obi ziri ezi? Hà ga-eji mgbapụta Chineke gbapụtara ha mee ihe, laghachi n’ala ha, ma weghachi ofufe dị ọcha? Ee. Ihe ndị ọzọ Jehova kwuru na-egosi obi ike o nwere na nke a ga-eme. “Sinụ na Babilọn pụọ, gbanahụnụ ndị Kaldea; werenụ olu nke iti mkpu ọṅụ gosi, mee ka a nụrụ nke a, meenụ ka ọ pụta ìhè ruo nsọtụ ụwa: sịnụ, Jehova agbapụtawo ohu Ya, bụ́ Jekọb. Akpịrị akpọghị ha nkụ mgbe O mere ka ha jee ije n’ala kpọrọ nkụ: O mere ka mmiri si n’oké nkume rupụtara ha: ee, Ọ kpọwara oké nkume, mmiri wee sụpụta.” (Aịsaịa 48:20, 21) A na-agba ndị Jehova ume n’ụzọ amụma ka ha si na Babilọn pụọ n’egbughị oge. (Jeremaịa 50:8) A ghaghị ime ka a mara banyere mgbapụta ha ná nsọtụ nile nke ụwa. (Jeremaịa 31:10) Mgbe Ọpụpụ ha n’Ijipt gasịrị, Jehova gbooro ndị ya mkpa ha ka ha na-agabiga n’ala ndị ahụ bụ́ ọzara. N’otu aka ahụ, ọ ga-egboro ndị ya mkpa ha ka ha si Babilọn na-ala.—Deuterọnọmi 8:15, 16.

23. Olee ndị na-agaghị enweta udo nke Chineke na-enye?

23 E nwere ụkpụrụ ọzọ dị oké mkpa nke ndị Juu na-aghaghị iburu n’uche banyere ọrụ nzọpụta Jehova. Ndị nwere ọchịchọ ime ezi omume pụrụ ịta ahụhụ n’ihi mmehie ha, ma a gaghị ebibi ha. Otú ọ dị, ọ dị iche nye ndị ajọ omume. “Ọ dịghị udo dịịrị ndị na-emebi iwu, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 48:22) Ndị mmehie na-enweghị nchegharị agaghị enweta udo nke Chineke debeere ndị hụrụ ya n’anya. Ọrụ nzọpụta abụghị maka ndị mmebi iwu gbara isi akwara ma ọ bụ ndị na-ekweghị ekwe. Ọrụ ndị dị otú ahụ bụ nanị maka ndị nwere okwukwe. (Taịtọs 1:15, 16; Mkpughe 22:14, 15) Ndị mmebi iwu enweghị udo nke sitere n’aka Chineke.

24. Gịnị wetaara ndị Chineke ọṅụ n’oge a?

24 Na 537 T.O.A., ohere nke isi na Babilọn pụọ wetaara ndị Israel kwesịrị ntụkwasị obi oké ọṅụ. Na 1919, ntọhapụ a tọhapụrụ ndị Chineke ná ndọrọ n’agha na Babilọn mere ka ha ṅụrịa ọṅụ. (Mkpughe 11:11, 12) Ha nwere olileanya dị ukwuu, ha jikwa ohere ahụ mụbaa ọrụ ha. N’eziokwu, ọ chọrọ obi ike ka ntakịrị ìgwè ndị Kraịst ahụ jiri ohere ọhụrụ ndị ahụ nke ime nkwusa n’ime ụwa nke na-enweghị omume enyi, mee ihe. Ma site n’enyemaka Jehova, ha malitere ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na Jehova gọziri ha.

25. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na anyị ṅara ntị nke ọma n’iwu ezi omume nke Chineke?

25 Akụkụ a nke amụma Aịsaịa na-emesi ya ike na Jehova na-ezi anyị ihe maka ọdịmma anyị. Ọ dị oké mkpa na anyị ṅara ntị nke ọma n’iwu ezi omume nke Chineke. (Mkpughe 15:2-4) Ọ bụrụ na anyị echetara onwe anyị amamihe na ịhụnanya Chineke, ọ ga-enyere anyị aka ime ihe kwekọrọ n’ihe Jehova sịrị na o ziri ezi. Ihe nile o nyere n’iwu bụ maka abamuru anyị.—Aịsaịa 48:17, 18.

Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 133]

Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile Na-egbochi Onwe Ya

“M na-eme ka iwe m nọọ ọdụ . . . M na-egbochi [onwe m],” ka Jehova gwara ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ. (Aịsaịa 48:9) Okwu ndị dị otú ahụ na-enyere anyị aka ịhụ na Chineke na-esetịpụ ihe nlereanya zuru okè n’ejighị ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọlị. Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị onye nwere ike karịa Chineke. Ọ bụ ya mere anyị ji ezo aka n’ebe ọ nọ dị ka Onye nwere ike nile, Onye nwere ike ime ihe nile. O ji utu aha bụ́ “[Onye] Pụrụ Ime Ihe Nile” mee ihe n’ụzọ ziri ezi banyere onwe ya. (Jenesis 17:1) Ọ bụghị nanị na o nwere ike a na-akparaghị ókè, kama o nwere ikike nile n’ihi ọkwá ya dị ka Eze Onyenwe eluigwe na ala, bụ́ ndị o kere. Ọ bụ ya mere na ọ dịghị onye ga-anwa anwa tie aka ya ihe ma ọ bụ sị ya, “Gịnị ka I meworo?”—Daniel 4:35.

Otú ọ dị, Chineke adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ọbụna mgbe ọ dị mkpa ka o gosipụta ike ya megide ndị iro ya. (Nehum 1:3) Jehova pụrụ ‘ime ka iwe ya nọọ ọdụ,’ a kọwakwara ya n’ụzọ dabara adaba dị ka “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ” n’ihi na ịhụnanya—ọ bụghị iwe—bụ àgwà ya bụ́ isi. Mgbe o gosipụtara iwe ya, ọ na-abụ mgbe nile nke ezi omume, nke ziri ezi, na nke a chịkwara achịkwa.—Ọpụpụ 34:6; 1 Jọn 4:8.

N’ihi gịnị ka Jehova ji eme ihe otú a? N’ihi na ọ na-eme ka ike ya a na-akparaghị ókè na àgwà atọ ndị ọzọ bụ́ isi o nwere—amamihe, ikpe ziri ezi, na ịhụnanya—kwekọọ n’ụzọ zuru okè. Otú o si eji ike eme ihe na-ekwekọ mgbe nile n’àgwà ndị ọzọ a.

[Foto dị na peeji nke 122]

Ozi mweghachi nke Aịsaịa na-enyetụ ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ olileanya

[Foto dị na peeji nke 124]

Ndị Juu nwere àgwà nke ikwu na ọ bụ arụsị mere ihe ndị ọ bụ Jehova mere

1. Ishtar 2. Ihe e ji brik kpụọ bụ́ nke e ji ihe yiri ugegbe machite nke sitere n’Ụzọ Ngagharị nke Babilọn 3. Ihe oyiyi dragọn nke Marduk

[Foto dị na peeji nke 127]

‘Oké ọkụ nke iweda n’ala’ pụrụ ikpughe ma ebumnobi ndị anyị ji na-ejere Jehova ozi hà dị ọcha ka ọ bụ na ha adịghị

[Foto ndị dị na peeji nke 128]

Ezi ndị Kraịst echewo ụdị mkpagbu ndị kasị njọ ihu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya