Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ụwa Anyị?
“Ọ dịghị narị afọ dị n’akụkọ nke dị ka narị afọ nke 20 n’ihe banyere ajọ ime ihe ike ọha, n’ọgụ ụfọdụ a lụworo, ìgwè ndị gbara ọsọ ndụ a kpataworo, ọtụtụ nde ndị e gburu n’agha, na ego buru ibu e mefuworo maka ‘nchebe,’” ka World Military and Social Expenditures 1996 na-ekwu. Ọ̀ dị mgbe ọnọdụ a ga-agbanwe?
Pita onyeozi chetaara ndị Kraịst otu nkwa nke Chineke kwere ọtụtụ narị afọ gara aga, sị: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) Okwu ndị yiri ndị ahụ bụ akụkụ nke amụma Aịsaịa ná mbụ. (Aịsaịa 65:17; 66:22) Israel oge ochie hụrụ mmezu ya mbụ mgbe e weghachiri mba ahụ n’ala nkwa ha ka ha nọsịrị ná ndọrọ n’agha na Babịlọn ruo afọ 70. Site n’ikwughachi nkwa nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ,” Pita gosiri na a ka ga-emezu amụma ahụ ọbụna n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka nnọọ ebube—n’ụwa nile!
Nguzobe nke ọnọdụ ezi omume n’ụwa nile bụ uche Chineke, a ga-ewetakwa ya site n’Alaeze eluigwe ya, na-enwe Kraịst dị ka Eze. “Mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ezu dị otú ahụ n’ụwa bụ ihe Jisọs kụziiri ụmụazụ ya ka ha na-atụ anya ya, na-ekpekwa ekpere maka ya n’ihe a na-akpọkarị Ekpere Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe, ma ọ bụ Ekpere Onyenwe anyị, na-asị: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9, 10.
Ị̀ ga-enwe ọṅụ ibi n’ime ụwa nke ezi omume dị na ya yiri nke dị n’eluigwe? Nke ahụ bụ olileanya Bible na-enye onye ọ bụla nke sitere n’obi ya dum na-achọ ịmara Chineke ma bie ndụ kwekọrọ n’ụzọ ezi omume ya.