Isi nke 42
Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ
1. Gịnị ka Jọn kọwara mgbe mmụọ ozi ahụ kpọọrọ ya laghachi ná mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ?
ỌHỤỤ nke a dị ebube nọgidere na-emeghe ka mmụọ ozi ahụ kpọọrọ Jọn laghachi ná mmalite nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ. Gịnị ka ọ kọwara? “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ.” (Mkpughe 21:1) Ọnọdụ ihe nkiri nke na-akpali akpali pụtara ìhè!
2. (a) Olee ụzọ amụma Aịsaịa banyere eluigwe na ụwa ọhụrụ si mezuo n’isi ndị Juu ahụ a kpọghachiri na 537 T.O.A.? (b) Ànyị si aṅaa mara na a ga-enwe mmezu ọzọ nke amụma Aịsaịa ahụ, oleekwa ụzọ e si mezuo nkwa nke a?
2 Ọtụtụ narị afọ tupu oge Jọn, Jehova agwaworị Aịsaịa, sị: “N’ihi na, lee, m gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbu nile, ha agaghị abatakwa n’obi.” (Aịsaịa 65:17; 66:22) Amụma nke a mezuru nke mbụ ya mgbe ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi lọghachiri na Jerusalem n’afọ 537 T.O.A. mgbe ha nọsịrị 70 afọ ná ndọta n’agha na Babilọn. Ná mweghachi ahụ, ha mejupụtara òtù ụmụ mmadụ e meworo ka ha dị ọcha, bụ́ “ụwa ọhụrụ,” n’okpuru usoro ọchịchị ọhụrụ, bụ́ “eluigwe ọhụrụ.” Otú ọ dị, Pita onyeozi zoro aka ná mmezu ọzọ nke amụma ahụ, na-asị: “Ma dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ya.” (2 Pita 3:13) Ugbu a, Jọn na-egosi na a gaje imezu nkwa nke a n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. “Eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ,” bụ́ usoro ihe a haziri ahazi nke Setan na ndokwa ọchịchị ya nile nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eduzi, ga-agabiga. “Oké osimiri” ahụ na-amagharị amagharị nke ihe a kpọrọ mmadụ na-emebi iwu, na-enupụkwa isi, ga-akwụsị ịdị adị. N’ọnọdụ ya ka a ga-enwe “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ”—bụ́ òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ n’elu ala nke dị n’okpuru ọchịchị ọhụrụ, bụ́ Alaeze Chineke.—Tụlee Mkpughe 20:11.
3. (a) Gịnị ka Jọn na-akọwa, gịnị bụkwa Jerusalem Ọhụrụ ahụ? (b) Ò si aṅaa bụrụ na Jerusalem Ọhụrụ ‘si n’eluigwe na-arịdata’?
3 Jọn gara n’ihu, sị: “M wee hụ obodo nsọ ahụ, bụ́ Jerusalem Ọhụrụ, ka ọ na-esi n’eluigwe rịdata, site n’ebe Chineke nọ, e doziwo ya dị ka nwanyị a na-alụ ọhụrụ nke a chọworo ya mma nye di ya.” (Mkpughe 21:2) Jerusalem Ọhụrụ bụ nwanyị Kraịst na-alụ ọhụrụ, nke ihe mejupụtara ya bụ ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, ndị a kpọlitekwara ịghọ ndị eze na ndị nchụàjà ha na Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube. (Mkpughe 3:12; 20:6) Dị nnọọ ka Jerusalem nke elu ala ghọrọ ọnọdụ nke ọchịchị n’Israel oge ochie, Jerusalem Ọhụrụ ahụ nke dị ebube na Di ya mejupụtara ọchịchị nke usoro ihe ọhụrụ ahụ. Nke a bụ eluigwe ọhụrụ ahụ. ‘Nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ si n’eluigwe rịdata,’ ọ bụghị n’ụzọ nkịtị, kama n’echiche nke bụ na ọ na-atụgharị wee chee ụwa ihu. Nwanyị ahụ Nwa Atụrụ ahụ na-alụ ọhụrụ ga-abụ onye na-enyere ya aka n’ime ka ọchịchị ezi omume nke na-achị ihe nile a kpọrọ mmadụ na-arụ ọrụ. Nke a bụ n’ezie ngọzi nye ụwa ọhụrụ ahụ!
4. Nkwa dị aṅaa ka Chineke kwere nke yiri nke ahụ o kwere mba Israel ahụ e guzobere ọhụrụ?
4 Jọn gara n’ihu ịgwa anyị, sị: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha.” (Mkpughe 21:3) Mgbe Jehova sooro mba Israel ahụ dị ọhụrụ n’oge ahụ banye n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, o kwere nkwa, sị: “M ga-etinye ebe obibi m n’etiti unu: mkpụrụ obi m agaghị asọkwa unu oyi. M ga na-ejegharị n’etiti unu, m ga-abụkwara unu Chineke, unu onwe unu ga-abụkwara m otu ndị.” (Levitikọs 26:11, 12) Ugbu a, Jehova na-ekwe ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi nkwa yiri nke ahụ. N’ime Ụbọchị Ikpe otu puku afọ ahụ, ha ga-abụrụ ya ndị pụrụ nnọọ iche.
5. (a) Olee ụzọ Chineke ga-esi binyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ime Ọchịchị Puku Afọ ahụ? (b) Olee ụzọ Chineke ga-esi biri n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ mgbe Ọchịchị Puku Afọ ahụ gasịrị?
5 N’oge Ọchịchị Puku Afọ ahụ, Jehova ‘ga-ebinyere’ ụmụ mmadụ ná ndokwa nke na-adị nwa oge, ebe ọ bụ na Ọkpara ya bụ eze, bụ́ Jisọs Kraịst na-anọchite anya ya. Otú ọ dị, n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ, mgbe Jisọs ga-enyeghachi Nna ya Alaeze ahụ, ọ gaghị adịkwa mkpa ọzọ inwe onye nnọchianya ma ọ bụ onye ogbugbo bụ eze. Jehova ga-ebinyere “ndị nke ya” n’ụzọ ime mmụọ n’ụzọ na-adịgide adịgide, na-emesokwa ha ihe n’esiteghị n’aka onye ọ bụla ọzọ. (Tụlee Jọn 4:23, 24.) Lee nnọọ ihe ùgwù dị elu nke a bụụrụ ihe a kpọrọ mmadụ e weghachiworo!
6, 7. (a) Nkwa dịgasị aṅaa dị ebube ka Jọn na-akọrọ anyị, oleekwa ndị ga-enwe ngọzi ndị ahụ? (b) Olee ụzọ Aịsaịa si kọwaa paradaịs nke bụ ma nke ime mmụọ ma nke a na-ahụ anya?
6 Jọn gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Ọzọkwa, a na-echetara anyị nkwa sitere n’ike mmụọ nsọ ndị e kwere n’oge gara aga. Aịsaịa nwekwara olileanya maka mgbe ọnwụ na iru újú na-agaghị adịkwa ọzọ, mgbe a ga-ejikwa ọṅụ dochie anya ịnọ ná mwute. (Aịsaịa 25:8; 35:10; 51:11; 65:19) Ugbu a, Jọn na-emesi ya ike na nkwa ndị a ga-enwe mmezu dị ebube n’ime Ụbọchị Ikpe otu puku afọ ahụ. Nke mbụ, oké ìgwè mmadụ ahụ ga-enweta ngọzi. “Nwa Atụrụ ahụ nke nọ n’etiti ocheeze ahụ,” ebe ọ nọgidere na-azụ ha dị ka atụrụ, “ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 7:9, 17) Ma, ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ, ndị tinyekwara okwukwe n’onyinye nile nke Jehova ga-emesịa soro ha nọrọ n’ebe ahụ, na-enweta ọṅụ na paradaịs nke bụ ma nke ime mmụọ ma nke a na-ahụ anya.
7 Aịsaịa kwuru, sị, “Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, ọ bụkwa ntị nke ndị ntị chiri ka a ga-emeghe.” Ee, “mgbe ahụ ka onye ngwụrọ ga-amali dị ka ele, ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.” (Aịsaịa 35:5, 6) Ọzọ, n’oge ahụkwa, “ha ga-ewukwa ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akụkwa ubi vine, rie mkpụrụ ha. Ha agaghị ewu ụlọ, onye ọzọ ebichie; ha agaghị akụ, onye ọzọ erie: n’ihi na dị ka ụbọchị nile nke osisi si dị, otú a ka ụbọchị nile nke ndị m ga-adị, ndị m họpụtaworo ga-enwekwa ihe aka ha rụtara mgbe dị anya nke ukwuu.” (Aịsaịa 65:21, 22) Ya mere, a gaghị efopụ ha site n’elu ala.
8. Gịnị ka Jehova n’onwe ya kwuru banyere nkwa ndị a dị ebube ịbụ ihe a pụrụ ịdabere na ha?
8 Lee nnọọ olileanya ndị dị ebube ndị na-ejupụta anyị n’uche mgbe anyị na-atụgharị uche ná nkwa ndị a! Onyinye ndị dị ebube na-echere ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi n’okpuru ọchịchị ịhụnanya nke eluigwe. Nkwa ndị ahụ hà dị mma nke ukwuu na ha apụghị ịbụ eziokwu? Hà bụ nanị nrọ efu nke agadi nwoke nke a chụlara n’agwaetiti Patmọs? Jehova n’onwe ya na-aza, sị: “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. O wee sị m, E mewo ha. Mụ onwe m bụ Alfa ahụ na Omega ahụ, mmalite na ọgwụgwụ.”—Mkpughe 21:5, 6a.
9. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji lee ngọzi ọdịnihu ndị a anya dị ka ihe e ji n’aka kpọmkwem na a ghaghị inweta mmezu ha?
9 Ọ bụ nnọọ dị ka à ga-asị na Jehova n’onwe ya na-abịanyere ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi aka n’akwụkwọ ikwe nkwa, ma ọ bụ akwụkwọ na-enye ike, inweta ngọzi ndị a n’ọdịnihu. Ònye ga-anwa anwa ịrụ Onye dị otú a nke na-ekwe nkwa ụka? Ee, nkwa ndị a nke Jehova bụ ihe e ji n’aka nke na ọ na-ekwu okwu banyere ha dị ka ha abụworị ihe mezuru emezu: “E mewo ha.” Ọ̀ bụ na Jehova abụghị “Alfa ahụ na Omega ahụ . . . , bụ́ onye na-adị adị, onye dịkwarịị, onye na-abịakwa, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile”? (Mkpughe 1:8) Ọ bụ ya n’ezie! Ya onwe ya kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ onye mbụ, mụ onwe m bụkwa onye ikpeazụ; ọ dịghịkwa Chineke ọ bụla dị ma e wezụga nanị mụ onwe m.” (Aịsaịa 44:6) N’ihi nke a, ọ pụrụ ịkpali ibu amụma dị iche iche, mezuokwa ha n’ụzọ zuru ezu. Lee ka nke a si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike! Ya mere o kwere nkwa, sị: “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ”! Kama ịnọ na-arụ ụka ma ihe ebube ndị a hà ga-eme eme n’ezie, anyị kwesịrị ịnọ na-eche, sị: ‘Gịnị ka ọ dị mkpa ka mụ onwe m mee iji keta ngọzi ndị dị otú ahụ?’
“Mmiri” nye Ndị Akpịrị Na-akpọ Nkụ
10. “Mmiri” dị aṅaa ka Jehova na-eche n’ihu ụmụ mmadụ, gịnịkwa ka ọ nọchiri anya ya?
10 Ọ bụ Jehova n’onwe ya kwuru, sị: “Mụ onwe m ga-enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri site n’isi iyi mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpughe 21:6b) Iji wee mejuo akpịrị ịkpọ nkụ ahụ, mmadụ aghaghị ịbụ onye maara mkpa ime mmụọ ya, dịkwa njikere ịnara “mmiri” ahụ nke Jehova na-enye. (Aịsaịa 55:1; Matiu 5:3) Ọ̀ bụ “mmiri” dị aṅaa? Jisọs n’onwe ya zara ajụjụ ahụ mgbe ọ na-agbara otu nwanyị àmà n’akụkụ olulu mmiri ahụ dị na Sameria. Ọ gwara ya, sị: “Onye ọ bụla nke ga-aṅụ mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi; kama mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi mmiri na-asụpụta hie nne ruo ndụ ebighị ebi.” “Isi iyi mmiri nke ndụ” ahụ na-asọpụta site n’ebe Chineke nọ site na Kraịst dị ka onyinye ya iji weghachi ihe a kpọrọ mmadụ bịa n’izu okè nke ndụ. Dị ka nwanyị onye Sameria ahụ, lee ka anyị kwesịrị isi nwee ịnụ ọkụ n’obi ịṅụ mmiri sitere n’isi iyi ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu! Dịkwa ka nwanyị ahụ, lee ka anyị kwesịrị isi dịrị njikere iwepụsị ọdịmma nile nke ụwa ka anyị wee nwee ike ịgwa ndị ọzọ ozi ọma ahụ!—Jọn 4:14, 15, 28, 29.
Ndị Nwere Mmeri
11. Nkwa dị aṅaa ka Jehova na-ekwe, ọ̀ bụkwa olee ndị ka okwu ndị ahụ bu ụzọ metụta?
11 Ndị ahụ na-aṅụ “mmiri” ahụ nke na-enye ndụ aghaghịkwa inwe mmeri, dị ka Jehova gara n’ihu ikwu, sị: “Onye na-emeri ga-eketa ihe ndị a; m ga-abụkwara ya Chineke, ya onwe ya ga-abụkwara m nwa.” (Mkpughe 21:7) Nkwa nke a yiri nkwa ahụ dị n’ozi e zigaara ọgbakọ asaa ahụ; ya mere, ọ ghaghị ịbụ na okwu ndị a bu ụzọ metụta ndị na-eso ụzọ e tere mmanụ. (Mkpughe 2:7, 11, 17, 26-28; 3:5, 12, 21) Ụmụnna ime mmụọ nke Kraịst n’ime ọgbọ nile ejiwo ịnụ ọkụ n’obi na-ele anya ihe ùgwù nke ịbụ akụkụ Jerusalem Ọhụrụ ahụ. Ọ bụrụ na ha emerie dị ka Jisọs meriri, a ga-emezu olileanya ha.—Jọn 16:33.
12. À ga-esi aṅaa mezuo nkwa Jehova nke dị ná Mkpughe 21:7 n’ebe oké ìgwè mmadụ ahụ dị?
12 Oké ìgwè mmadụ ndị si ná mba nile na-elegidekwa nkwa nke a anya. Ha onwe ha aghaghị inwekwa mmeri, nọgidesie ike n’ijere Chineke ozi ruo mgbe ha gabigara oké mkpagbu ahụ. Mgbe ahụ ha ga-abanye n’ihe nketa elu ala ha, bụ́ ‘alaeze ahụ e doziwooro ha site ná ntọala nke ụwa.’ (Matiu 25:34) A na-akpọ ndị a na ndị ọzọ so n’atụrụ elu ala nke Onyenwe anyị, bụ́ ndị gabigara ule ahụ a ga-enwe n’ọgwụgwụ puku afọ ahụ, “ndị nsọ.” (Mkpughe 20:9) Ha ga-enwe mmekọrịta dị nsọ nke nna na ụmụ ya n’etiti ha na Onye Okike ha, bụ́ Jehova Chineke, dị ka ndị òtù nke nzukọ eluigwe na ala ya.—Aịsaịa 66:22; Jọn 20:31; Ndị Rom 8:21.
13, 14. Iji wee keta nkwa Chineke ndị dị ebube, omume dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere kpam kpam, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
13 Ebe olileanya dị ebube otú a na-echere ha n’ihu, lee ka o si dị mkpa ka Ndịàmà Jehova nọ ugbu a nọgide na-adị ọcha pụọ n’ihe nile na-emerụ emerụ nke ụwa Setan! Ọ dị mkpa ka anyị guzosie ike, bụrụ ndị ụkwụ siri ike n’ala, ndị kpebisikwara ike na Ekwensu agaghị enwe ike ịdọrọ anyị mgbe ọ bụla banye n’ụdị òtù ahụ nke Jehova n’onwe ya kọwara n’ebe a, sị: “Ma ndị na-atụ ụjọ, na ndị na-ekweghị ekwe, na ndị arụ, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị na-agwọ nsí, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ na brimstone na-ere; nke bụ ọnwụ nke abụọ ahụ.” (Mkpughe 21:8) Ee, onye ahụ gaje iketa ihe aghaghị izere omume nile ndị merụworo usoro ihe ochie nke a. Ọ ghaghị inwe mmeri site n’ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị nrụgide na ọnwụnwa nile.—Ndị Rom 8:35-39.
14 Krisendọm, ọ bụ ezie na ọ na-azọrọ na ya bụ nwanyị ahụ Kraịst na-alụ ọhụrụ, bụ nke ihe e ji mara ya bụ omume nile ahụ rụrụ arụ Jọn kọwara n’ebe a. Ya mere ọ ga-agbada gaa ná mbibi ebighị ebi ya na akụkụ nile ndị ọzọ nke Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 18:8, 21) Otú ahụkwa ka onye ọ bụla n’ime ndị ahụ e tere mmanụ ma ọ bụ n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ onye malitere ime ajọ omume dị otú ahụ ma ọ bụkwa malite ịgba ya ume, chekwara mbibi ebighị ebi ihu. Ọ bụrụ na ha anọgide n’omume ndị a, ha agaghị enweta nkwa ndị ahụ. N’ime ụwa ọhụrụ ahụkwa, a ga-ebibi onye ọ bụla nke nwara iwebata omume ndị dị otú ahụ ngwa ngwa, o wee banye n’ọnwụ nke abụọ ahụ n’enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ.—Aịsaịa 65:20.
15. Olee ndị bụ ndị pụrụ iche dị ka ndị nwere mmeri, ọ̀ bụkwa ọhụụ dị aṅaa ka e ji weta akwụkwọ Mkpughe ná ngwụsị mara oké mma?
15 Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, na nwanyị ọ na-alụ ọhụrụ nke 144,000 ahụ, bụ́ Jerusalem Ọhụrụ, pụrụ nnọọ iche dị ka ndị mmeri. Ya mere, lee ka o si kwesị ekwesị na a ga-eweta akwụkwọ Mkpughe ná ngwụsị magburu onwe ya site n’ịhụ onyinyo ikpeazụ nke mara mma na-enweghị atụ nke Jerusalem Ọhụrụ ahụ! Ugbu a, Jọn na-akọwa otu ọhụụ ikpeazụ.
[Foto ndị dị na peeji nke 302]
N’ime òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ ahụ nọ n’elu ala, a ga-enwe ọrụ na-enye ọṅụ na mmekọrịta nke mmadụ nile