Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 14 p. 172-188
  • Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘M Ga-eme Ka Ịdị Elu Dị Ala’
  • Ngwá Ọrụ Mbibi nke Chineke
  • “Ezumike Pụọ n’Ihe Mgbu Gị”
  • “Ilu” Megide Babilọn
  • “Dị Ka Ozu A Zọrọ Ụkwụ”
  • Okpukpe Ụgha—A Hụ Mbibi Ya Dị Ịrịba Ama Tupu O Mee
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 14 p. 172-188

Isi nke Iri na Anọ

Jehova Ewedaa Obodo Dị Mpako Ala

Aịsaịa 13:1–14:23

1. Ruo ogologo oge ha aṅaa n’ọdịnihu ka akwụkwọ Aịsaịa lepụrụ anya ugbu a?

E DERE akwụkwọ amụma bụ́ Aịsaịa na narị afọ nke asatọ T.O.A. n’oge ndị Asiria wakporo Ala Nkwa ahụ. Dị ka anyị hụworo n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ n’akwụkwọ ya, Aịsaịa buru amụma ziri nnọọ ezi banyere otú ihe ga-esi mee. Otú ọ dị, akwụkwọ ahụ lere anya gabiga oge Asiria ga na-achị. O buru amụma banyere nlaghachi nke ndị ha na Jehova nọ n’ọgbụgba ndụ site n’ala dị iche iche e mere ka ha jee biri, gụnyere Shaịna, bụ́ ebe Babilọn dị. (Aịsaịa 11:11) N’Aịsaịa isi nke 13, anyị na-ahụ amụma dị ịrịba ama nke ga-emepe ụzọ maka nlaghachi dị otú ahụ, mgbe o mezuru. E ji okwu ndị a malite amụma a: “Ibu e boro Babilọn, nke Aịsaịa nwa Emọz hụrụ.”—Aịsaịa 13:1.

‘M Ga-eme Ka Ịdị Elu Dị Ala’

2. (a) Olee otú Hezekaịa na Babilọn si mekọrịtawa ihe? (b) Gịnị bụ “ọkọlọtọ” ahụ a ga-ebuli?

2 Juda sooro Babilọn mekọrịtawa ihe n’oge Aịsaịa dị ndụ. Eze Hezekaịa rịasiri ọrịa ike ma mesịa gbakee. Ndị nnọchianya Babilọn bịara ikele ya maka mgbake ya, ma eleghị anya ná nzube nzuzo nke ime ka Hezekaịa sonyere ha n’agha ha na-ebuso Asiria. N’ụzọ amamihe na-adịghị na ya, Eze Hezekaịa gosiri ha akụ̀ ya nile. N’ihi ya, Aịsaịa gwara Hezekaịa na mgbe eze ahụ nwụsịrị, a ga-eburu akụ̀ na ụba ahụ nile gaa Babilọn. (Aịsaịa 39:1–7) E mezuru nke a na 607 T.O.A. mgbe e bibiri Jerusalem ma mee ka mba ahụ jee biri n’ala ọzọ. Otú ọ dị, ndị Chineke họpụtara agaghị anọ na Babilọn ruo mgbe ebighị ebi. Jehova buru amụma banyere otú ọ ga-esi mepee ụzọ maka nlaghachi ha. Ọ malitere, sị: “Bulienụ ọkọlọtọ n’elu ugwu nke osisi na-adịghị, welierenụ ha olu, feenụ aka, ka ha wee baa n’ọnụ ụzọ nile nke ndị a maara aha ha.” (Aịsaịa 13:2) “Ọkọlọtọ” ahụ bụ ike ọchịchị ụwa nke na-ebilite, nke ga-akwatu Babilọn n’ọkwá ya dị elu. A ga-ebuli ya “n’elu ugwu nke osisi na-adịghị”—ebe a ga na-ahụ nke ọma site n’ebe dị oké anya. N’ịbụ nke e nyere iwu ka o busoo Babilọn agha, ike ọchịchị ụwa ọhụrụ ahụ ga-eji ike gafere “n’ọnụ ụzọ nile nke ndị a maara aha ha,” ọnụ ụzọ ámá nke obodo ukwu ahụ, ọ ga-emerikwa ya.

3. (a) Olee ndị bụ “ndị e doworo nsọ,” ndị Jehova ga-akpọlite? (b) N’echiche dị aṅaa ka usuu ndị agha na-ekpere arụsị bụ ndị “e doworo nsọ”?

3 Jehova na-ekwu ugbu a, sị: “Mụ onwe m enyewo ndị m e doworo nsọ iwu, akpọwokwa m ndị dike m imezu ihe iwe m chọrọ, bụ́ ndị m na-aṅụrị ọṅụ agha n’ime mpako. Nụrụ olu ìgwè n’ugwu nile, yiri nke ndị bara ụba! nụrụ olu mkpọtụ alaeze nile nke mba nile a chịkọtaworo! Jehova nke usuu nile nke ndị agha na-agụkọta usuu ndị agha ibu agha.” (Aịsaịa 13:3, 4) Olee ndị bụ ndị a “e doworo nsọ,” ndị a họpụtara iweda Babilọn dị mpako ala? Ha bụ usuu ndị agha nile nke mba nile, “mba nile a chịkọtaworo.” Ha si n’akụkụ ebe ugwu nke dị anya wakwasị Babilọn. “Ha na-esi n’ala dị anya abịa, ná nsọtụ eluigwe.” (Aịsaịa 13:5) N’echiche dị aṅaa ka ha bụ ndị e doro nsọ? N’ezie, ọ bụghị n’echiche nke ịbụ ndị dị nsọ. Ha bụ usuu ndị agha na-ekpere arụsị, ndị na-enweghị mmasị n’ijere Jehova ozi. Otú ọ dị, n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ‘e doro nsọ’ pụtara “e doro iche maka Chineke iji eme ihe.” Jehova pụrụ ido ndị agha nke mba dị iche iche nsọ ma jiri oké ọchịchọ ha maka ọdịmma onwe ha nanị mee ihe iji gosipụta iwe ya. O ji Asiria mee ihe n’ụzọ dị otú a. Ọ ga-eji Babilọn meekwa ihe n’otu ụzọ ahụ. (Aịsaịa 10:5; Jeremaịa 25:9) Ọ ga-ejikwa mba ndị ọzọ nye Babilọn ntaramahụhụ.

4, 5. (a) Gịnị ka Jehova buru n’amụma ga-eme Babilọn? (b) Gịnị ka ndị ga-awakpo Babilọn ga-eme ihe banyere ha?

4 Babilọn abụrụbeghị ike ọchịchị ụwa na-achịnụ. N’agbanyeghị nke ahụ, n’ikwu okwu site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova lepụrụ anya hụ mgbe ọ ga-anọ n’ọkwá ahụ, o bukwara amụma banyere ọdịda ya. Ọ na-ekwu, sị: “Kwasienụ ákwá ike; n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso; dị ka mbibi nke sitere n’aka Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ ga-abịa.” (Aịsaịa 13:6) Ee, iti mkpu mwute ga-anọchi itu ọnụ nke Babilọn. N’ihi gịnị? N’ihi “ụbọchị Jehova,” ụbọchị mgbe Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ya.

5 Otú ọ dị, olee otú ọ ga-esi kwe omume ibibi Babilọn? Mgbe oge Jehova ruru maka nke a, obodo ahụ ga-eyi nke nọ ná nchebe. Usuu ndị agha ga-awakpo ya ga-ebu ụzọ mee ihe banyere Osimiri Yufretis nke bụ́ ihe nchebe ọ na-abụghị mmadụ mere, nke si n’etiti obodo ahụ gafere, nke e gbuwaara ụzọ ka ọ banye n’otu ọwa mmiri na-enye nchebe na iji bụrụ ebe obodo ahụ si enweta mmiri ọṅụṅụ. E nwekwara nnukwute mgbidi abụọ nke Babilọn, ndị yiri ndị a na-apụghị ịgafe agafe. Ọzọkwa, a ga-akwakọba ihe oriri n’ụba n’obodo ahụ. Akwụkwọ bụ́ Daily Bible Illustrations na-ekwu na Nabonidus—eze ikpeazụ nke Babilọn—“gbalịrị nke ukwuu ịkwaju ihe oriri n’obodo ahụ, e mekwara atụmatụ na o nwere ihe [oriri] nke ga-ezuru ndị bi n’ime ya ruo iri afọ abụọ.”

6. Gịnị ga-eme na mberede mgbe mwakpo ahụ e buru n’amụma megide Babilọn weere ọnọdụ?

6 Otú ọ dị, ọdịdị a na-ahụ anya pụrụ iduhie mmadụ. Aịsaịa na-ekwu, sị: “N’ihi nke a aka nile ga-akụda, obi ọ bụla nke mmadụ ga-alọkwa ya mmiri: ha ga-amakwa jijiji; ahụ ụfụ na ihe mgbu ka ha ga-enwezu; dị ka nwanyị ime na-eme, otú a ka ha ga-agbali: ọ ga-eju ha anya, otu n’ebe ibe ya nọ; ihu nke bụ nanị ire ọkụ ka ihu ha ga-abụ.” (Aịsaịa 13:7, 8) Mgbe usuu ndị agha ahụ na-enwe mmeri wakporo obodo ahụ, ihe mgbu mberede, nke na-egbusikwa mgbu ike ka nke nwanyị na-amụ nwa ga-anọchi ahụ iru ala nke ndị bi n’ime ya. Obi ga-efu ha n’ihi ụjọ. N’ịbụ ndị ike gwụrụ, aka ha ga-akụda, ha agaghị enwe ike ịzọ onwe ha. Ụjọ na ihe mgbu ga-eme ka ihu ha dị ka “ire ọkụ.” Ha ga-elerịta ibe ha anya ná mgbagwoju anya, na-eche otú obodo ukwu ha ga-esi daa.

7. Olee “ụbọchị Jehova” nke na-abịanụ, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụtara Babilọn?

7 Ka o sina dị, ọ ga-adarịrị. Ụbọchị mpịazi ga-abịakwasị Babilọn, bụ́ “ụbọchị Jehova,” nke ga-eweta ihe mgbu n’ezie. Onyeikpe kasị ukwuu ga-egosipụta iwe ya ma mezuo ihe e kpere n’ikpe nke kwesịrị ha n’ahụ ndị bi na Babilọn, bụ́ ndị na-eme mmehie. Amụma ahụ na-ekwu, sị: “Lee, ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị na-enweghị obi ebere, na-abịa, ya na nrubiga ókè nke iwe na iwe dị ọkụ; ime ka ala nke a ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu na ikpochapụ ndị mmehie n’ime ya.” (Aịsaịa 13:9) Olileanya adịghịrị Babilọn. O yiri ka a ga-asị na anyanwụ, ọnwa, na kpakpando akwụsịchaala inye ìhè. “N’ihi na kpakpando nile nke eluigwe na Orion ha nile agaghị eme ka ìhè ha nwuo: anyanwụ ga-agba ọchịchịrị n’ọwụwa ya, ọzọ, ọnwa agaghị eme ka ìhè ya tie.”—Aịsaịa 13:10.

8. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye iwu na Babilọn ga-ada?

8 N’ihi gịnị ka ihe dị otú ahụ ga-eji dakwasị obodo a dị mpako? Jehova na-ekwu, sị: “M ga-ewerekwa ihe ọjọọ ya leta elu ụwa dum mmadụ bi, werekwa ajọ omume ha leta ndị na-emebi iwu; M ga-emekwa ka mpako nke ndị nganga kwụsị, M ga-emekwa ịdị elu nke ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji ka ọ dị ala.” (Aịsaịa 13:11) Mwụpụ nke ọnụma Jehova ga-abụ ntaramahụhụ maka obi ọjọọ Babilọn nwere n’ebe ndị Chineke nọ. Ala ahụ dum ga-ata ahụhụ n’ihi ịdị njọ nke ndị Babilọn. Ndị ọchịchị aka ike a dị mpako agaghị amakwa Jehova aka ọzọ n’ihu ọha!

9. Gịnị ga-eme Babilọn n’ụbọchị Jehova ga-emezu ikpe ya?

9 Jehova na-ekwu, sị: “M ga-eme ka mmadụ dị ụkọ karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ọbụna mmadụ efu karịa ọlaedo ọma nke Ofia.” (Aịsaịa 13:12) Ee, ndị ga-afọdụ n’obodo ahụ ga-adị ole na ole, ọ ga-atọgbọrọ chakoo. Jehova gara n’ihu: “N’ihi ya ọbụna eluigwe ka m ga-eme ka ha maa jijiji, ụwa ga-emekwa mkpatụ pụọ n’ọnọdụ ya, n’ime nrubiga ókè nke iwe Jehova nke usuu nile nke ndị agha, na n’ụbọchị iwe Ya dị ọkụ.” (Aịsaịa 13:13) “Eluigwe” nke Babilọn, bụ́ ọtụtụ chi na chi nwanyị ya, ga-ama jijiji, bụrụ ndị na-apụghị inyere obodo ahụ aka n’oge ọ nọ ná mkpa. “Ụwa,” bụ́ Alaeze Ukwu Babilọn, ga-eme mkpatụ pụọ n’ọnọdụ ya, baa n’akụkọ ihe mere eme nanị dị ka alaeze ọzọ dara ada. “Ọ ga-erukwa, na ha ga-eche ihu, onye ọ bụla n’ebe ndị ya nọ, ha ga-agbalagakwa, onye ọ bụla ruo ala ya, dị ka mgbada a na-achụ achụ, na dị ka ìgwè ewu na atụrụ nke ọ na-adịghị onye na-achịkọta ha.” (Aịsaịa 13:14) Ndị ala ọzọ nile na-akwado Babilọn ga-ahapụ ya gbaa ọsọ, na-enwe olileanya iso ike ụwa ahụ na-emeri emeri malite mmekọrịta ọhụrụ. N’ikpeazụ Babilọn ga-enwe oké ihe mgbu nke obodo e meriri emeri na-enwe, oké ihe mgbu nke ọ kpataara ọtụtụ ndị ọzọ n’oge ọ nọ n’ebube: “Onye ọ bụla a na-achọta, a mapuo ya; onye ọ bụla a na-ejide, ọ daa site ná mma agha. A ga-atụpịakwa ụmụ ha na-aṅụ ara n’anya ha; a ga-apụnara ha ụlọ ha, merụọ ndị inyom ha.”—Aịsaịa 13:15, 16.

Ngwá Ọrụ Mbibi nke Chineke

10. Ònye ka Jehova ga-eji merie Babilọn?

10 Olee ike ọchịchị nke Jehova ga-eji mee ka Babilọn daa? Ihe dị ka afọ 200 tupu o mee, Jehova kpughere azịza ya: “Lee, M na-akpọte ndị Midia imegide ha, ndị na-adịghị agụ ọlaọcha n’ihe, ọlaedo kwa, ọ dịghị atọ ha ụtọ. Ụta ha na-atụpịakwa ụmụ okorobịa; ha adịghị enwekwa obi ebere n’ahụ mkpụrụ nke afọ; anya ha adịghị emekwara ụmụ ebere. Babilọn, bụ́ ihe mara mma nke alaeze nile, ịma mma nke mpako ndị Kaldea, ọ ga-adị ka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.” (Aịsaịa 13:17–19) Babilọn nke dị ebube ga-ada, ngwá ọrụ Jehova ga-ejikwa mezuo nke a ga-abụ usuu ndị agha si ná mba Midia dị anya, nke jupụtara n’ugwu.a N’ikpeazụ, Babilọn ga-atọgbọ n’efu dị ka obodo Sọdọm na Gọmọra, bụ́ ndị omume ha rụrụ arụ nke ukwuu.—Jenesis 13:13; 19:13, 24.

11, 12. (a) Olee otú Midia si ghọọ ike ọchịchị ụwa? (b) Àgwà dị aṅaa a na-adịghị ahụkebe ka amụma ahụ hotara banyere usuu ndị agha Midia?

11 N’oge Aịsaịa, ma Midia ma Babilọn nọcha n’okpuru Asiria. Ihe dị ka otu narị afọ n’ihu, na 632 T.O.A., Midia na Babilọn jikọrọ aka merie Nineve, bụ́ isi obodo Asiria. Nke a mepeere Babilọn ụzọ ịghọ ike ọchịchị ụwa na-achịnụ. Ọ maghị na Midia ga-ebibi ya mgbe ihe dị ka 100 afọ gasịrị! Ònye ma e wezụga Jehova Chineke pụrụ iji anyaike buo ụdị amụma ahụ?

12 Mgbe ọ na-eme ka a mara ngwá ọrụ mbibi ọ họọrọ, Jehova kwuru na usuu ndị agha Midia ‘adịghị agụ ọlaọcha n’ihe, ọlaedo kwa, ọ dịghị atọ ha ụtọ.’ Lee àgwà a na-adịghị ahụkebe ọ bụ n’etiti ndị agha obi tara mmiri n’ihi ịlụ agha! Ọkà mmụta Bible bụ́ Albert Barnes na-ekwu, sị: “N’ezie, ha dị ole na ole, bụ ndị agha na-eme mwakpo, ndị ọ na-abụghị olileanya nke inweta ihe nkwata kwaliri ha.” Usuu ndị agha Midia, hà gosiri na Jehova kwuru eziokwu na nke a? Ee. Tụlee ihe a e kwuru n’akwụkwọ bụ́ The Bible-Work, nke J. Glentworth Butler kwadebere: “N’adịghị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba ndị lụtụworo agha, ndị Midia nakwa karịsịa ndị Peasia, ji mmeri na ebube kpọrọ ihe karịa ọlaedo.”b N’ihi nke a, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ọ tọhapụrụ ndị Israel n’ebe ha bi n’ala ọzọ na Babilọn, onye ọchịchị Peasia bụ́ Saịrọs nyeghachiri ha ọtụtụ puku arịa ọlaedo na ọlaọcha ndị Nebukadneza kwakọọrọ n’ụlọukwu Jerusalem.—Ezra 1:7-11.

13, 14. (a) Ọ bụ ezie na ha enweghị mmasị n’ihe nkwata, gịnị ka ndị agha Midia na Peasia chọsiri ike? (b) Olee otú Saịrọs si merie ihe nchebe dị iche iche Babilọn ji etu ọnụ?

13 Ọ bụ ezie na ndị dike nke Midia na Peasia enwekebeghị mmasị n’ihe nkwata, ka o sina dị ha nwere oké ọchịchọ. Ha ezubeghị ka mba ọ bụla n’ụwa karịa ha. Ọzọkwa, Jehova tinyere “mbibi” n’ime obi ha. (Aịsaịa 13:6) N’ihi ya, n’iji ụta ígwè ha eme ihe—nke a pụrụ iji mee ihe ọ bụghị nanị iji gbapụ akụ́ kamakwa iji kụọ ndị agha bụ́ ndị iro ihe ma gwepịa ha, bụ́ ụmụ nke ndị nne bụ́ ndị Babilọn mụrụ—ha kpebisiri ike imeri Babilọn.

14 Ihe nchebe dị iche iche nke Babilọn egbochighị Saịrọs, bụ́ onye ndú nke usuu ndị agha Medo-Peasia. N’abalị nke October 5/6, 539 T.O.A., o nyere iwu ka e chee mmiri nke Osimiri Yufretis ihu n’ebe ọzọ. Mgbe mmiri ahụ talatatụrụ, ndị mwakpo ahụ zooro ezoro banye n’ime obodo ahụ, na-aga n’ọwa mmiri ahụ nke na-eru ha n’apata ụkwụ. Ha bịakwasịrị ndị bi na Babilọn na mberede, Babilọn dakwara. (Daniel 5:30) Jehova Chineke kpaliri Aịsaịa ibu amụma banyere ihe ndị a, na-eme ka obi abụọ ghara ịdị ya na ọ bụ Ya na-eduzi ihe na-emenụ.

15. Gịnị ga-eme Babilọn n’ọdịnihu?

15 Ruo n’ókè hà aṅaa ka a ga-ebibiru Babilọn? Gee ntị n’ihe Jehova kwupụtara: “Ọ gaghị abụ ebe obibi ọzọ ruo mgbe ebighị ebi; a gaghị ebikwa n’ime ya ruo ọgbọ nile: onye Arebia agaghị amakwa ụlọikwuu ya n’ebe ahụ; ndị ọzụzụ atụrụ agaghị emekwa ka atụrụ ha makpuo n’ebe ahụ. Ma anụ ọhịa dị iche iche bi n’ala kpọrọ nkụ ga-amakpu n’ebe ahụ; ụlọ ha ga-ejupụtakwa [n’ikwiikwii]; enyi nnụnụ ga-ebikwa n’ebe ahụ, mkpi ga-amalikwa elu n’ebe ahụ. Anụ ọhịa na-ebe ebe ga-azarịtakwa onwe ha n’ụlọ ọma ya nile, nkịta ọhịa kwa n’ụlọ ukwu nile nke ihe ụtọ: mgbe ya dịkwa nso ịbịa, a gaghị emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.” (Aịsaịa 13:20–22) A ga-ebibi obodo ahụ kpam kpam.

16. Ọnọdụ Babilọn nọ na ya ugbu a na-enye anyị obi ike dị aṅaa?

16 Nke a emeghị ozugbo na 539 T.O.A. N’agbanyeghị nke ahụ, taa o doro anya na ihe nile Aịsaịa buru n’amụma banyere Babilọn emezuwo. Babilọn “bụ ugbu a, ọ nọwokwa na-abụ kemgbe ọtụtụ narị afọ, ebe tọgbọrọ nnọọ n’efu, ọ bụkwa mkpọmkpọ ebe,” ka otu onye na-akọwa Bible kwuru. Ọ gbakwụnyeziri, sị: “Ọ gaghị ekwe omume ịhụ ebe a ma ghara icheta otú amụma Aịsaịa na Jeremaịa buru siworo nnọọ mezuo kpọmkwem.” O doro anya na ọ dịghị mmadụ ọ bụla nọ n’oge Aịsaịa nke pụrụ ibuworị amụma banyere ọdịda Babilọn na mbibi ya n’ikpeazụ. E kwuwerị, mmeri ndị Midia na Peasia meriri Babilọn weere ọnọdụ ihe dị ka afọ 200 mgbe Aịsaịa desịrị akwụkwọ ya! Mbibi ya n’ikpeazụ weere ọnọdụ ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị. Nke a ọ́ dịghị eme ka okwukwe anyị nwere na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ, sie ike? (2 Timoti 3:16) Ọzọkwa, ebe Jehova mezuru amụma dị iche iche n’oge gara aga, anyị pụrụ inwe obi ike zuru ezu na amụma Bible ndị na-emezubeghị ga-emezu n’oge nke Chineke.

“Ezumike Pụọ n’Ihe Mgbu Gị”

17, 18. Mmeri a ga-emeri Babilọn ga-arụpụtara Israel ngọzi dịgasị aṅaa?

17 Ọdịda Babilọn ga-ewetara Israel ahụ efe. Ọ ga-apụta ntọhapụ n’ojiji e ji ha nakwa ohere iji laghachi n’Ala Nkwa ahụ. N’ihi ya, Aịsaịa na-ekwu ugbu a, sị: “Jehova ga-enwe obi ebere n’ahụ Jekọb, Ọ ga-ahọpụtakwa Israel ọzọ, doo ha n’ala ha: ọbịa ga-araparakwa n’ahụ ha, ha ga-emekwa onwe ha ka ha na ụlọ Jekọb dịkọọ n’otu. Ndị nile dị iche iche ga-ekurukwa ha, mee ka ha bịaruo ọnọdụ ha: ụlọ Israel ga-eketakwa ha n’ala Jehova ịbụ ndị ohu na ịbụ ndị inyom na-eje ozi: ha ga-aghọkwa ndị na-adọta ndị na-adọta ha rịị n’agha n’agha; ha ga-enwekwa ike n’ahụ ndị na-achị ha rịị n’ihe ike.” (Aịsaịa 14:1, 2) N’ebe a “Jekọb” na-ezo aka n’Israel dum—ebo 12 ahụ dum. Jehova ga-emere “Jekọb” ebere site n’ikwe ka mba ahụ laghachi n’obodo ha. Ọtụtụ puku ndị ala ọzọ ga-esonyere ha, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha ga-ejere ndị Israel ozi dị ka ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ. Ndị Israel ụfọdụ ga-emesịa ọbụna nwee ike n’ahụ ndị jibu ha eji.c

18 Nhụjuanya nke ibi n’ala ọzọ agaghị adịkwa. Kama nke ahụ, Jehova ga-enye ndị ya “[ezumike] pụọ n’ihe mgbu [ha], na n’ihe mwute [ha], na n’ofufe ahụ siri ike nke e mere ka [ha] fee n’ime ya.” (Aịsaịa 14:3) N’ịbụ ndị e meworo ka ha nwere onwe ha pụọ n’ibu arọ nkịtị nke ịbụ ohu, ndị Israel agakwaghị enwe ihe mgbu na ihe mwute nke ibi n’etiti ndị na-efe chi ụgha. (Ezra 3:1; Aịsaịa 32:18) N’ikwu okwu banyere nke a, akwụkwọ bụ́ Lands and Peoples of the Bible na-asị: “Nye onye Babilọn, chi ya dị iche iche yiri ya n’àgwà ya nile jọkarịsịrị njọ. Ha bụ ndị ụjọ, ndị aṅụrụma na ndị iberibe.” Lee ahụ efe ọ bụ isi n’ọnọdụ okpukpe dị otú ahụ nke rụrụ arụ pụọ!

19. Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na ndị Israel ga-enweta mgbaghara Jehova, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?

19 Ka o sina dị, ebere Jehova na-adabere n’ihe ụfọdụ. Ndị ya aghaghị igosipụta mwute maka ajọ omume ha, bụ́ ihe mere Chineke ji taa ha ahụhụ nke ukwuu. (Jeremaịa 3:25) Nkwupụta sitere n’obi, nke e ji eziokwu mee ga-eme ka e nweta mgbaghara Jehova. (Lee Nehemaịa 9:6–37; Daniel 9:5.) Otu ụkpụrụ a bụkwa eziokwu taa. Ebe ọ bụ na “ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke na-adịghị emehie,” ebere Jehova dị anyị nile mkpa. (2 Ihe E Mere 6:36) Jehova, bụ́ Chineke na-eme ebere, ji ịhụnanya na-akpọ anyị ka anyị kwupụtara ya mmehie anyị, chegharịa, ma kwụsị omume ọjọọ ọ bụla, ka anyị wee bụrụ ndị a gwọrọ. (Deuterọnọmi 4:31; Aịsaịa 1:18; Jemes 5:16) Ọ bụghị nanị na nke a na-eme ka anyị nwetaghachi ihu ọma ya kamakwa ọ na-enye anyị nkasi obi.—Abụ Ọma 51:1; Ilu 28:13; 2 Ndị Kọrint 2:7.

“Ilu” Megide Babilọn

20, 21. Olee otú ndị agbata obi Babilọn si ṅụrịa ọṅụ n’ọdịda ya?

20 Ihe karịrị 100 afọ tupu Babilọn ebilie dị ka ike ọchịchị ụwa kasịnụ, Aịsaịa buru amụma otú ụwa ga-esi meghachi omume n’ọdịda ya. N’ụzọ amụma, o nyere ndị Israel iwu, bụ́ ndị a tọhapụrụ n’ojiji ndị Babilọn ji ha, sị: “Ị ga-atụ ilu a megide eze Babilọn, sị, Lee, otú onye na-achị n’ihe ike kwụsịworo! lee, otú obodo ọlaedo kwụsịworo! Jehova anyajiwo mkpanaka nke ndị na-emebi iwu, ndele nke ndị na-achị achị; nke weere ntigbu n’ewezụgaghị onwe ya etigbu ndị nile dị iche iche n’ime nrubiga ókè nke iwe, nke weere nsogbu a na-egbochighị azọgbu mba nile n’iwe.” (Aịsaịa 14:4–6) Babilọn emeworo nnọọ onwe ya aha dị ka onye mmeri, onye ọchịchị nchịgbu nke na-eme ka ndị nweere onwe ha ghọọ ndị ohu. Lee ka o si kwesị ekwesị na a ga-eji “ilu” ṅụrịa ọṅụ ọdịda ya, ilu nke ọ bụ usoro ndị eze Babilọn bụ ndị bụ́ isi a na-atụrụ ya—malite na Nebukadneza ma kwụsị na Nabonidus na Belshaza—ndị bụ́ ndị isi n’oge obodo ukwu ahụ nọ n’ebube ya!

21 Lee oké mmetụta nke ọdịda ya ga-enwe! “Ụwa nile ezuwo ike, dị jụụ: ha etiwawo mkpu ọṅụ. Ọbụna osisi fir aṅụrịwo ọṅụ megide gị, ha na osisi cedar nke Lebanọn, sị, Site na mgbe i dinaworo, onye mgbutu adịghị arịgota megide anyị.” (Aịsaịa 14:7, 8) Ndị eze nọ ná mba ndị gbara ha gburugburu dị ndị ọchịchị Babilọn ka osisi ndị ha ga-egbutu jiri mere ihe masịrị ha. Otú ọ dị, ihe ahụ nile ebiela. Onye mgbutu osisi, bụ́ Babilọn, egbutudewela osisi!

22. N’ụzọ uri, olee otú ọdịda nke usoro ndị eze Babilọn si metụta Sheol?

22 Ọdịda Babilọn bụ nnọọ ihe ịtụnanya nke na ili n’onwe ya mere mkpatụ: “[Sheol, NW] site n’okpuru emeworo gị mkpatụ izute gị n’ọbịbịa gị: ọ na-akpọtere gị ndị na-adịghị ndụ, bụ́ mkpi nile nke ụwa; o mewo ka eze nile nke mba nile si n’ocheeze ha bilie. Ha nile ga-aza, sị gị, Gị onwe gị kwa, è mewo ka ị ghara ịdị ike dị ka anyị? Ị̀ ghọwo onye yiri anyị? E mewo ka mbili elu gị rịdaruo [Sheol, NW], ya na olu une gị nile: n’okpuru gị ka a gbasaworo ikpuru, ihe mkpuchi gị bụkwa ikpuru.” (Aịsaịa 14:9–11) Lee nkọwa dị ike ọ bụ n’ụdị uri! Ọ dị ka a ga-asị na ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-akpọte ndị eze nile nwụrụ tupu usoro ndị eze Babilọn anwụọ ka ha kelee onye ọhụrụ ahụ bịaranụ. Ha na-akwa ike na-achị achị, bụ́ Babilọn, emo, bụ́ nke na-adịghị ike ugbu a, nke na-edina n’elu àkwà ikpuru kama idina n’elu àkwà dị oké ọnụ ahịa, bụ́ onye e ji ikpuru kpuchie kama iji ákwà mkpuchi dị oké ọnụ ahịa kpuchie ya.

“Dị Ka Ozu A Zọrọ Ụkwụ”

23, 24. Mpako dị aṅaa gabigara ókè ka ndị eze Babilọn gosiri?

23 Aịsaịa gara n’ihu n’ilu ahụ, sị: “Lee, otú i siworo n’eluigwe daa, gị Lusifa, nwa chi ọbụbọ! lee, otú e gbutuworo gị n’ala, gị onye na-eme ka ike gwụ mba nile!” (Aịsaịa 14:12) Mpako nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị kpaliri ndị eze Babilọn ibuli onwe ha elu karịa ndị gbara ha gburugburu. Dị ka kpakpando nke na-achasi ike n’igwe n’isi ụtụtụ, ha ji ike na ịbụisi eme ihe n’ụzọ mpako. Otu ihe kpatara nganga ahụ bụ mmeri Nebukadneza meriri Jerusalem, ihe Asiria na-emelighị. Ilu ahụ na-egosi usoro ndị eze Babilọn dị mpako dị ka ndị na-asị: “N’eluigwe ka m ga-arịgo, n’elu kpakpando nile nke Chineke ka m ga-ebuli ocheeze m; m ga-anọkwasịkwa n’ugwu nzukọ, na nsọtụ nile nke Ugwu: m ga-arịgo n’elu ebe nile dị elu nke igwe ojii; m ga-eyi Onye kachasị ihe nile elu.” (Aịsaịa 14:13, 14) Ọ̀ dị ikwubiga okwu ókè karịrị nke a?

24 N’ime Bible, e ji ndị eze sitere n’usoro ndị eze Devid tụnyere kpakpando. (Ọnụ Ọgụgụ 24:17) Malite na Devid gaa n’ihu, “kpakpando” ndị ahụ chịrị site n’elu Ugwu Zaịọn. Mgbe Solomọn wusịrị ụlọukwu ahụ na Jerusalem, aha ahụ bụ́ Zaịọn ghọrọ aha obodo ahụ dum. N’okpuru ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, iwu ji ụmụ nwoke nile bụ́ ndị Israel ịga Zaịọn ugboro atọ n’afọ. Otú a, ọ ghọrọ ‘ugwu nzukọ.’ Site n’ikpebi ido ndị eze Juda n’okpuru ya nakwa isi n’ugwu ahụ wepụ ha, Nebukadneza na-ekwupụta ebumnobi ya nke bụ́ ibuli onwe ya elu karịa “kpakpando” ndị ahụ. O nyeghị Jehova otuto maka mmeri o meriri ha. Kama nke ahụ, n’ezie, o ji mpako na-etinye onwe ya n’ọnọdụ Jehova.

25, 26. Olee otú usoro ndị eze Babilọn si nwụọ ọnwụ ihere?

25 Lee oké mgbanwe na-echere usoro ndị eze Babilọn dị mpako! E bulighị Babilọn elu ma ọlị karịa kpakpando nke Chineke. Kama nke ahụ, Jehova na-ekwu, sị: “Ruo [Sheol, NW] ka a ga-eme ka ị rịdaa, ruo nsọtụ nile nke olulu. Ndị na-ahụ gị ga-elegide gị anya, lekwasị gị anya, sị, Ọ̀ bụ nke a bụ nwoke ahụ nke na-eme ka ụwa maa jijiji, nke na-eme ka alaeze dị iche iche mee mkpatụ; nke mere elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ dị ka ọzara, nke kwadakwara obodo ya nile; nke na-atọpụghị ndị mkpọrọ ya ka ha laa?” (Aịsaịa 14:15–17) Usoro ndị eze ahụ nwere oké ọchịchọ ga-arịdaru Hedis (Sheol), dị nnọọ ka onye ọ bụla bụ́ mmadụ.

26 Oleezi ebe ike ahụ meriri alaeze dị iche iche, bibie ala na-emepụta nri, kwatuokwa ọtụtụ obodo a na-apụghị ịgụta ọnụ, ga-anọ? Olee ebe ike ụwa ahụ nke dọọrọ ndị mmadụ n’agha, gharakwa ikwe mgbe ọ bụla ka ha laa, ga-anọ? Leenụ, a gaghịdị eli usoro ndị eze Babilọn ezigbo olili! Jehova na-ekwu, sị: “Eze nile nke mba nile, ọbụna ha nile, edinawo n’ala n’ime nsọpụrụ, onye ọ bụla n’ụlọ ya. Ma gị onwe gị, e siwo n’ili gị tụpụ gị dị ka alaka nke bụ́ ihe arụ, yiri ndị e gburu egbu dị ka uwe, bụ́ ndị e jiworo mma agha dụpuo, ndị na-arịdaru nkume nke olulu; dị ka ozu a zọrọ ụkwụ. Gị na ha agaghị abụ otu n’olili, n’ihi na ala gị ka i bibiworo, ndị gị ka i gbuworo; mkpụrụ nke ndị na-eme ihe ọjọọ; a gaghị akpọ aha ha ruo mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 14:18–20) N’ụwa oge ochie, a na-ewere ya na ọ bụ ihe ihere ịghara ili eze n’ụzọ dị ùgwù. Ya mere, gịnị banyere usoro ndị eze nke Babilọn? Ọ bụ eziokwu na ma eleghị anya e liri ndị eze n’otu n’otu n’ụzọ dị ùgwù, ma a tụfuru usoro ndị eze nke alaeze ukwu ahụ bụ́ ndị sitere na Nebukadneza “dị ka alaka nke bụ́ ihe arụ.” Ọ dị ka a ga-asị na a tụbara usoro ndị eze ahụ n’ili a na-arịbaghị ama—dị ka onye agha nkịtị ji ụkwụ aga e gburu n’agha. Lee mweda n’ala ọ bụ!

27. N’ụzọ dị aṅaa ka ụmụ ndị Babilọn ga-amụ n’ọdịnihu ga-esi taa ahụhụ maka ajọ omume nke ndị bụ́ nna ha?

27 E ji iwu ikpeazụ e nyere ndị Midia na Peasia na-emeri emeri mechie ilu ahụ: “Dozierenụ ụmụ ya ebe ogbugbu n’ihi ajọ omume nke ndị bụ́ nna ha; ka ha wee ghara ibili, nweta ụwa, mee ka elu ụwa dum mmadụ bi jupụta n’obodo.” (Aịsaịa 14:21) Ọdịda Babilọn ga-adịru ebighị ebi. A ga-ekpochapụ usoro ndị eze Babilọn. A gaghị atụteghachi ya. Ụmụ ndị Babilọn ga-amụ n’ọdịnihu ga-ata ahụhụ n’ihi “ajọ omume nke ndị bụ́ nna ha.”

28. Gịnị kpatara mmehie nke ndị eze Babilọn, gịnịkwa ka anyị na-amụta site na nke a?

28 Ikpe a mara usoro ndị eze Babilọn nwere ihe mmụta bara uru nye anyị. Ihe kpatara mmehie nke ndị eze Babilọn bụ oké ọchịchọ ha na-enweghị mmeju. (Daniel 5:23) Obi ha jupụtara n’ọchịchọ maka ike. Ha chọrọ ịchị ndị ọzọ. (Aịsaịa 47:5, 6) Otuto sitere n’aka ụmụ mmadụ gụsikwara ha agụụ ike, bụ́ nke Chineke kwesịrị ịnara. (Mkpughe 4:11) Nke a bụ ịdọ aka ná ntị nye onye ọ bụla nwere ikike—ọbụna n’ọgbakọ ndị Kraịst. Oké ọchịchọ na mpako nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị bụ àgwà ndị Jehova na-agaghị anabata, site n’aka ndị mmadụ ma ọ bụ site n’aka mba ọ bụla.

29. Mpako na oké ọchịchọ nke ndị ọchịchị Babilọn bụ ngosipụta nke gịnị?

29 Mpako nke ndị ọchịchị Babilọn bụ ngosipụta nke mmụọ nke “chi nke oge a,” Setan bụ́ Ekwensu. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ọ na-agụsikwa ya agụụ ike inwe ike, ọ chọkwara ibuli onwe ya elu karịa Jehova Chineke. Dị ka o mere eze Babilọn na ndị o mere ka ha nọrọ n’okpuru ya, oké ọchịchọ ọjọọ nke Setan akpataworo ihe nile a kpọrọ mmadụ nhụsianya na ịta ahụhụ.

30. Olee Babilọn ọzọ e hotara n’ime Bible, mmụọ dịkwa aṅaa ka o gosiworo?

30 Ọzọkwa, n’akwụkwọ Mkpughe, anyị na-agụ banyere Babilọn ọzọ—“Babilọn ukwu ahụ.” (Mkpughe 18:2) Nzukọ a, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, egosiwokwa mmụọ mpako, nke mmegbu, na nke obi ọjọọ. N’ihi ya, ya onwe ya kwa aghaghị iche “ụbọchị Jehova” ihu, ma bụrụ nke e bibiri n’oge nke Chineke. (Aịsaịa 13:6) Kemgbe 1919, e zisawo gburugburu ụwa, ozi bụ́: “Ọ dawo, bụ́ Babilọn ukwu ahụ!” (Mkpughe 14:8) Mgbe ọ na-enweghị ike ijigide ndị Chineke ná ndọrọ n’agha, ọ dara. A ga-ebibi ya kpam kpam n’isi nso. Banyere Babilọn oge ochie, Jehova nyere iwu, sị: “Kwụghachinụ ya ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị; dị ka ihe nile si dị nke o meworo, meenụ ya otú a: n’ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.” (Jeremaịa 50:29; Jemes 2:13) Babilọn Ukwu ahụ ga-enweta amamikpe yiri ya.

31. Gịnị ga-eme Babilọn Ukwu ahụ n’isi nso?

31 N’ihi ya, okwu ikpeazụ Jehova kwuru n’amụma a nke dị n’akwụkwọ Aịsaịa na-emetụta ọ bụghị nanị Babilọn oge ochie kamakwa Babilọn Ukwu ahụ: “M ga-ebilikwa megide ha . . . M ga-ebipụkwa na Babilọn aha na ndị fọdụrụ, na ụmụ na ụmụ ụmụ . . . M ga-emekwa ya ka ọ ghọọ ihe nnweta nke ebinta, na ọdọ mmiri ọdọ mmiri; M ga-ewerekwa ázị́zà, bụ́ mkpochapụ, zachapụ ya.” (Aịsaịa 14:22, 23) Mkpọmkpọ ebe nke Babilọn oge ochie na-egosi ihe Jehova ga-eme Babilọn Ukwu ahụ n’isi nso. Lee ihe nkasi obi ọ bụụrụ ndị hụrụ ezi ofufe n’anya! Lee ihe agbamume ọ bụ ka anyị na-agbalịsi ike ịghara ikwe ka àgwà mpako, nganga, ma ọ bụ obi ọjọọ nke Setan tolite n’ime anyị mgbe ọ bụla!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ nanị Midia ka Aịsaịa kpọrọ aha, ma ọtụtụ mba ga-ejikọ aka imegide Babilọn—Midia, Peasia, Ilam, na mba ndị ọzọ dị nta karị. (Jeremaịa 50:9; 51:24, 27, 28) Mba ndị gbara ha gburugburu na-akpọ ma Midia ma Peasia “ndị Midia.” Ọzọkwa, n’oge Aịsaịa, Midia bụ ike ọchịchị na-achịnụ. Ọ bụ nanị n’oge ọchịchị Saịrọs ka Peasia chịwara.

b Otú ọ dị, o yiri ka ndị Midia na Peasia ha mesịrị nwee ịhụnanya dị ukwuu maka ndụ okomoko.—Esta 1:1–7.

c Dị ka ihe atụ, a họpụtara Daniel ịbụ onyeisi na Babilọn n’okpuru ndị Midia na Peasia. Ihe dịkwa ka afọ 60 ka e mesịrị, Esta ghọrọ nwunye Eze Ahasuerọs nke Peasia, Mọdekaị ghọkwara praịm minista nke Alaeze Ukwu Peasia dum.

[Foto dị na peeji nke 178]

Babilọn dara ada ga-abụ ebe obibi nke anụ ọhịa

[Foto ndị dị na peeji nke 186]

Dị ka Babilọn oge ochie, Babilọn Ukwu ahụ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya