Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 15 p. 189-207
  • Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Agwọ Yiri Ọkụ Na-efe Efe” Megide Filistia
  • E Kpochapụ Moab
  • “Moab” nke Oge A Alaa n’Iyi
  • Damaskọs Aghọọ Obo Ihe Dara Ada
  • Obi Ike Zuru Ezu n’Ebe Jehova Nọ
  • Etiopia Ewetara Jehova Onyinye
  • Obi Alọọ Ijipt Mmiri
  • Ihe Ịrịba Ama na Ihe Àmà Nye Jehova
  • ‘Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị M Bụ’
  • Na-echere Jehova
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Ọ Dịghị Enyemaka A Ga-enweta Site n’Ụwa A
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Aka Jehova Adị Elu
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • “Onye Obibi Ya Agaghị Asị, Ana M Arịa Ọrịa”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 15 p. 189-207

Isi nke Iri na Ise

Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche

Aịsaịa 14:24-19:25

1. Mkpọsa dị aṅaa nke ikpe ọmụma megide Asiria ka Aịsaịa dekọrọ?

JEHOVA pụrụ iji mba ndị ọzọ nye ndị ya ahụhụ maka ajọ omume ha. O megodị otú ahụ, ọ dịghị agbaghara mba ndị ahụ obi ọjọọ ha na-ekwesịghị ekwesị, mpako ha, na obi ilu ha nwere n’ebe ezi ofufe dị. N’ihi ya, ogologo oge tupu o mee, ọ kpaliri Aịsaịa idekọ “ibu e boro Babilọn.” (Aịsaịa 13:1) Otú ọ dị, Babilọn ga-abụ ihe iyi egwu n’ọdịnihu. N’oge Aịsaịa, Asiria na-emegbu ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ. Asiria bibiri alaeze ebe ugwu nke Israel, bibiekwa akụkụ dị ukwuu nke Juda. Ma mmeri Asiria nwere ebe ọ ga-ejedebe. Aịsaịa na-ede, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha aṅụwo iyi, sị, N’ezie dị ka M cheworo, otú a ka ọ ga-adị . . . na M ga-etipịa Asiria n’ala m, ọ bụkwa n’elu ugwu m nile ka M ga-azọ ya ụkwụ: yoke ya ga-esikwa n’olu ha wezụga onwe ya, ibu ya ga-esi n’elu ubu ha wezụga onwe ya.” (Aịsaịa 14:24, 25) Oge na-adịghị anya ka Aịsaịa busịrị amụma a, e wepụrụ ihe iyi egwu nke Asiria n’obodo Juda.

2, 3. (a) N’oge ochie, megide ole ndị ka Jehova setịrị aka ya? (b) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na Jehova na-esetị aka ya megide “mba nile”?

2 Otú ọ dị, gịnị banyere mba ndị ọzọ bụ́ ndị iro nke ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ? A ghaghị ikpekwa ha ikpe. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Nke a bụ [ndụmọdụ ahụ a na-adụ megide elu] ụwa nile: nke a bụkwa aka ahụ nke a na-esetị n’ahụ mba nile. N’ihi na Jehova nke usuu nile nke ndị agha [adụwo ọdụ]; ònye ga-emebikwa ya? aka Ya esetịwokwa; ònye ga-emekwa ka ọ laghachi azụ”? (Aịsaịa 14:26, 27) “Ndụmọdụ” Jehova abụghị okwu ịdọ aka ná ntị nkịtị. Ọ bụ ihe o kpebisiri ike ime, iwu ya. (Jeremaịa 49:20, 30) “Aka” Chineke bụ ike ya nọ n’ọrụ. N’amaokwu ndị ikpeazụ nke Aịsaịa isi nke 14 nakwa n’isi nke 15 ruo 19, ndụmọdụ Jehova bụ megide Filistia, Moab, Damaskọs, Etiopia, na Ijipt.

3 Otú ọ dị, Aịsaịa na-ekwu na aka Jehova setịrị esetị megide “mba nile.” N’ihi ya, ọ bụ ezie na amụma ndị a nke Aịsaịa bu ụzọ mezuo n’oge ochie, ụkpụrụ ha na-emetụtakwa “mgbe ọgwụgwụ,” mgbe Jehova ga-esetị aka ya megide alaeze nile nke ụwa. (Daniel 2:44; 12:9; Ndị Rom 15:4; Mkpughe 19:11, 19–21) Ogologo oge tupu o mee, Chineke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Jehova, ji obi ike kpughee ndụmọdụ ya. Ọ dịghị onye pụrụ ime ka aka ya setịrị esetị laghachi azụ.—Abụ Ọma 33:11; Aịsaịa 46:10.

“Agwọ Yiri Ọkụ Na-efe Efe” Megide Filistia

4. Olee ihe ụfọdụ a kọwara ná nkwupụta okwu Jehova megide Filistia?

4 E bu ụzọ lebara ndị Filistia anya. “N’afọ ọnwụ eze, bụ́ Ehaz, ka [nkwupụta okwu] a dị. Aṅụrịla ọṅụ, gị Filistia, ka ị hà, n’ihi na a nyajiwo ndele nke na-eti gị rịị: n’ihi na ihe nke ga-esi na mkpọrọgwụ agwọ pụta bụ ubí, mkpụrụ ya ga-abụkwa agwọ yiri ọkụ na-efe efe.”—Aịsaịa 14:28, 29.

5, 6. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Ụzaịa si dị ka agwọ nye ndị Filistia? (b) Gịnị ka Hezekaịa ghọrọ n’ebe ndị Filistia nọ?

5 Eze Ụzaịa dị ike ruo n’ókè nke iguzogide iyi egwu Filistia. (2 Ihe E Mere 26:6–8) Nye ha, o yiri agwọ, ndele ya nọgidekwara na-akụta onye agbata obi ahụ na-enweghị omume enyi. Mgbe Ụzaịa nwụsịrị—‘a nyajiri ndele ya’—Jotam kwesịrị ntụkwasị obi chịrị, ‘ma ndị ahụ ka nọ na-ebibi onwe ha.’ Ka e mesịrị, Ehaz ghọrọ eze. Ihe gbanwere, ndị Filistia nwere ihe ịga nke ọma n’ibuso Juda agha. (2 Ihe E Mere 27:2; 28:17, 18) Otú ọ dị, ugbu a, ihe na-agbanwe ọzọ. Na 746 T.O.A., Eze Ehaz nwụrụ, Hezekaịa na-eto eto nọchikwara n’ocheeze. Ọ bụrụ na ndị Filistia chere na ihe ga-anọgide na-agaziri ha, ha na-ehie ụzọ nke ukwuu. Hezekaịa ghọrọ onye iro wetaara ha ọnwụ. N’ịbụ onye si n’eriri Ụzaịa (“mkpụrụ” nke sitere ná “mkpọrọgwụ” ya), Hezekaịa dị ka “agwọ yiri ọkụ na-efe efe”—na-eme mwakpo dị oké ngwa, na-awakpo dị ka àmụ̀mà, ma na-ere ka ọkụ, dị ka a ga-asị na ọ na-atanye ndị o nwetara nsí n’ahụ.

6 Nke a bụ nkọwa kwesịrị ekwesị a kọwara eze ọhụrụ ahụ. “[Hezekaịa] tigburu ndị Filistia ruo Geza na ókèala ya nile.” (2 Ndị Eze 18:8) Dị ka ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme Eze Senakerib nke Asiria si kwuo, ndị Filistia ghọrọ ndị Hezekaịa na-achị. “Ndị na-enweghị ike”—alaeze Juda nke e mere ka ọ ghọọ nke na-adịghị ike—bịara nọrọ ná ntụkwasị obi ma nwee ihe onwunwe n’ụba, ebe Filistia nọ n’oké ụnwụ.—Gụọ Aịsaịa 14:30, 31.

7. Olee nkwupụta okwukwe nke Hezekaịa na-aghaghị ime nye ndị nnọchianya ahụ nọ na Jerusalem?

7 O yiri ka e nwere ndị nnọchianya nọ na Juda mgbe ahụ—ikekwe na-achọ ka ya na ha jikọọ aka megide Asiria. Gịnị ka e kwesịrị ịgwa ha? “Gịnịkwa ka mmadụ ga-aza ndị ozi nke mba?” Hezekaịa ò kwesịrị ịchọ nchebe ná njikọ aka nke ndị ala ọzọ? Ee e! O kwesịrị ịgwa ndị ozi ahụ sị: “Jehova atọwo ntọala Zaịọn, ọ bụkwa n’ime ya ka ndị e wedara n’ala nke ndị Ya ga-agbaba.” (Aịsaịa 14:32) Eze ahụ aghaghị ịtụkwasị Jehova obi. Ntọala Zaịọn siri ike. Obodo ahụ ga-anọgide na-abụ ebe nchebe pụọ n’ihe iyi egwu nke Asiria.—Abụ Ọma 46:1–7.

8. (a) Olee otú mba ụfọdụ taa siworo dị ka Filistia? (b) Dị ka o mere n’oge ochie, gịnị ka Jehova meworo iji nyere ndị ya aka taa?

8 Dị ka Filistia, mba ụfọdụ taa na-emegide ndị na-efe Chineke ofufe n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. E tinyewo ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Jehova n’ụlọ mkpọrọ na n’ogige ịta ahụhụ. A machibidowo ha iwu. E gbuwo ọtụtụ n’ime ha. Ndị mmegide ka nọgidere ‘na-emegide mkpụrụ obi onye ezi omume.’ (Abụ Ọma 94:21) Nye ndị iro ha, ìgwè ndị Kraịst a pụrụ iyi “ndị na-enweghị ike” na “ndị ogbenye.” Otú ọ dị, site n’enyemaka Jehova, ha na-enweta ụbara ihe ime mmụọ, ebe ndị iro ha nọ n’oké ụnwụ. (Aịsaịa 65:13, 14; Emọs 8:11) Mgbe Jehova setịrị aka ya megide ndị Filistia nke oge a, ndị a “na-enweghị ike” ga-anọ ná nchebe. N’ebee? Ná mkpakọrịta nke ha na “ezinụlọ Chineke,” nke Jisọs bụ nkuku ntọala ya e ji n’aka. (Ndị Efesọs 2:19, 20) Ha ga-anọkwa n’okpuru nchebe nke “Jerusalem nke dị n’eluigwe,” bụ́ Alaeze eluigwe nke Jehova, nke Jisọs Kraịst bụ Eze ya.—Ndị Hibru 12:22; Mkpughe 14:1.

E Kpochapụ Moab

9. Ole ndị ka e mere nkwupụta okwu ọzọ megide, oleekwa otú ndị a si gosi na ha bụ ndị iro nke ndị Chineke?

9 E nwere onye agbata obi ọzọ Israel nwere n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ—Moab. N’adịghị ka ndị Filistia, ndị Moab bụ ndị ikwu nke Israel, ebe ha si n’eriri nke nwa nwanne Abraham bụ́ Lọt. (Jenesis 19:37) N’agbanyeghị njikọ ahụ, Moab anọworị na-ebuso Israel iro. Dị ka ihe atụ, laa azụ n’oge Mosis, eze Moab goro onye amụma bụ́ Belam, na-atụ anya na ọ ga-akọcha ndị Israel. Mgbe nke ahụ kụrụ afọ n’ala, Moab jiri omume rụrụ arụ na ofufe Beal mata ndị Israel n’ọnyà. (Ọnụ Ọgụgụ 22:4–6; 25:1–5) Ka a sịkwanụ ihe mere Jehova ji kpalie Aịsaịa ugbu a idetu “[nkwupụta okwu megide] Moab”!—Aịsaịa 15:1a.

10, 11. Gịnị ga-eme Moab?

10 E buru amụma Aịsaịa megide ọtụtụ obodo na ógbè dị na Moab, gụnyere A, Kia (ma ọ bụ Kia-hareset), na Dibon. (Aịsaịa 15:1b, 2a) Ndị Moab ga-eru újú maka mbadamba mkpụrụ vine nke Kia-hareset, nke bụ́ ma eleghị anya isi ihe obodo ahụ na-emepụta. (Aịsaịa 16:6, 7 ) A ga-eti Sibma na Jeza, bụ́ ndị a ma ama n’ịkụ vine, ihe otiti. (Aịsaịa 16:8–10) Eglat-shelishiya, nke aha ya pụrụ ịpụta “Nwa Agbọghọ Ehi Gbara Afọ Atọ,” ga-adị ka nwa ehi siri ike nke na-akwa ákwá iru újú. (Aịsaịa 15:5) Ahịhịa nke ala ahụ ga-akpọnwụ ebe “mmiri Dimon” ga-ejupụta n’ọbara n’ihi ogbugbu e gburu ndị Moab. “Mmiri Nimrim” ga-aghọ “nanị ebe tọgbọrọ n’efu,” n’ụzọ ihe atụ ma ọ bụ n’ụzọ nkịtị—ma eleghị anya n’ihi na ndị agha bụ́ ndị iro gbochiri mmiri iyi ha.—Aịsaịa 15:6–9.

11 Ndị Moab ga-eke onwe ha ákwà mkpe, bụ́ ákwà iru újú. Ha ga-akpụchasị isi ha iji gosi ihere na ịkwa ákwá. Ha ‘ga-ebipụ’ afụ ọnụ ha, na-egosi oké ihe mgbu na mweda n’ala. (Aịsaịa 15:2b–4) O metụtara Aịsaịa n’onwe ya nke ukwuu, ebe o ji n’aka na ihe ndị a e kpere n’ikpe ga-emezu. Dị ka eriri ụbọ akwara na-ama jijiji, obi ebere ruru ya ná ngịrị afọ n’ihi ozi ahụhụ ahụ megide Moab.—Aịsaịa 16:11, 12.

12. Olee otú e si mezuo ihe ndị Aịsaịa kwuru megide Moab?

12 Olee mgbe a ga-emezu amụma a? N’oge na-adịghị anya. “Nke a bụ okwu ahụ nke Jehova kwuru banyere Moab na mgbe gara aga. Ma ugbu a Jehova ekwuwo, sị, N’afọ atọ, dị ka afọ onye e goro ọrụ, ka a ga-elelị nsọpụrụ Moab, ya na ìgwè mmadụ ya nile bara ụba; ndị fọdụrụ ga-adịkwa nta nke ukwuu, n’adịghị ike.” (Aịsaịa 16:13, 14) N’ikwekọ na nke a, e nwere ihe ochie ndị e gwupụtara n’ala, ndị bụ́ ihe àmà na-egosi na Moab tara nnukwute ahụhụ na narị afọ nke asatọ T.O.A., nakwa na mmadụ ebighị n’ọtụtụ n’ime obodo ya. Tiglat-pilesa nke Atọ gụnyere Salamanu nke Moab ná ndị ọchịchị tụọrọ ya ụtụ. Senakerib natara ụtụ site n’aka Kammusunadbi, bụ́ eze Moab. Ndị eze Asiria bụ́ Isa-hadọn na Ashurbanipal zoro aka n’ebe ndị eze Moab bụ́ Musuri na Kamashaltu nọ dị ka ndị ha na-achị. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị Moab kwụsịrị ịdị adị dị ka otu ndị. A chọtawo obodo ndị e bibiri ebibi bụ́ ndị e chere na ha bụ nke Moab, ma e gwupụtabeghị ọtụtụ ihe àmà a na-ahụ anya banyere onye a bụ onye iro dị ike nke Israel n’otu oge.

“Moab” nke Oge A Alaa n’Iyi

13. Nzukọ dị aṅaa taa ka a pụrụ iji tụnyere Moab?

13 Taa, e nwere nzukọ zuru ụwa ọnụ nke yiri Moab oge ochie. Ọ bụ Krisendọm, bụ́ akụkụ bụ́ isi nke “Babilọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:5) Ma Moab ma Israel si n’eriri nna Abraham, bụ́ Tira. N’otu aka ahụ, Krisendọm, dịkwa ka ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ taa, na-azọrọ na ha malitere site ná nzukọ Kraịst nke narị afọ mbụ. (Ndị Galetia 6:16) Otú ọ dị, Krisendọm—dị ka Moab—rụrụ arụ, na-akwalite omume rụrụ arụ n’ụzọ ime mmụọ na ofufe nke chi ndị ọzọ na-abụghị otu ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. (Jemes 4:4; 1 Jọn 5:21) Dị ka otu òtù, ndị ndú nke Krisendọm na-emegide ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ.—Matiu 24:9, 14.

14. N’agbanyeghị ndụmọdụ Jehova megide “Moab” nke oge a, olileanya dị aṅaa dịịrị ndị mmadụ nọ n’ime nzukọ ahụ?

14 E mesịrị kpochapụ Moab. Otu ihe ahụ ga-emekwa Krisendọm. Jehova, n’iji ihe ya na Asiria bụ otu ihe n’oge a eme ihe, ga-eme ka e bibie ya. (Mkpughe 17:16, 17) Otú ọ dị, olileanya dịịrị ndị nọ na “Moab” a nke oge a. Ka ọ nọ na-ebu amụma megide Moab, Aịsaịa kwuru, sị: “A ga-emekwa ka otu ocheeze guzosie ike n’ebere, otu onye ga-anọkwasịkwa ya n’eziokwu, n’ụlọikwuu Devid; bụ́ onye na-ekpe ikpe, na-achọkwa ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume.” (Aịsaịa 16:5) Na 1914, Jehova mere ka ocheeze Jisọs guzosie ike, bụ́ Onye Ọchịchị nke sitere n’eriri Eze Devid. Ọbụbụeze Jisọs bụ ngosipụta nke ebere ịhụnanya Jehova, n’imezukwa ọgbụgba ndụ Chineke na Eze Devid gbara, ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 72:2; 85:10, 11; 89:3, 4; Luk 1:32) Ọtụtụ ndị dị nwayọọ n’obi ahapụwo “Moab” nke oge a ma doo onwe ha n’okpuru Jisọs iji nweta ndụ. (Mkpughe 18:4) Lee ihe nkasi obi ọ bụụrụ ndị a ịmata na Jisọs ‘ga-akọrọ mba nile [ihe ikpe ziri ezi bụ]’!—Matiu 12:18; Jeremaịa 33:15.

Damaskọs Aghọọ Obo Ihe Dara Ada

15, 16. (a) Omume mmegide dịgasị aṅaa ka Damaskọs na Israel mesoro Juda, gịnịkwa ka ọ rụpụtaara Damaskọs? (b) Ònye ka a gụnyere ná nkwupụta okwu ahụ megide Damaskọs? (ch) Gịnị ka ndị Kraịst taa pụrụ ịmụta site n’ihe atụ nke ndị Israel?

15 Aịsaịa dekọziri “[nkwupụta okwu megide] Damaskọs.” (Gụọ Aịsaịa 17: 1–6.) Damaskọs, nke dị n’ebe ugwu nke Israel, bụ “isi Siria.” (Aịsaịa 7:8) N’oge ọchịchị Eze Ehaz nke Juda, Rezin nke Damaskọs na Peka nke Israel jikọrọ aka wakpoo Juda. Otú ọ dị, n’ihi arịrịọ Ehaz rịọrọ ya, Tiglat-pilesa nke Atọ nke Asiria busoro Damaskọs agha, merie ya ma mee ka ọtụtụ n’ime ndị bi n’ime ya jee biri n’ala ọzọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Damaskọs kwụsịrị ịbụrụ Juda ihe iyi egwu.—2 Ndị Eze 16:5–9; 2 Ihe E Mere 28:5, 16.

16 Ma eleghị anya, n’ihi njikọ aka nke Israel na Damaskọs, nkwupụta okwu Jehova megide Damaskọs na-agụnyekwa okwu ikpe megide alaeze ebe ugwu ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi. (Aịsaịa 17:3–6) Israel ga-adị ka ubi nwere ntakịrị ọka n’oge owuwe ihe ubi ma ọ bụ osisi olive nke mkpụrụ siworo n’alaka ya dapụsịa. (Aịsaịa 17:4–6) Lee ihe atụ na-akpali iche echiche nke ahụ bụụrụ ndị raara onwe ha nye Jehova! Ọ na-atụ anya ofufe a na-ekewaghị ekewa ma na-anabata nanị ozi dị nsọ nke sitere n’ala ala obi. Ọ kpọkwara ndị na-emegide ụmụnna ha asị.—Ọpụpụ 20:5; Aịsaịa 17:10, 11; Matiu 24:48–50.

Obi Ike Zuru Ezu n’Ebe Jehova Nọ

17, 18. (a) Olee otú ụfọdụ ndị n’Israel si meghachi omume ná nkwupụta okwu Jehova, ma gịnị bụ mmeghachi omume ha n’ozuzu ha? (b) Olee otú ihe ndị na-eme taa si yie ndị mere n’oge Hezekaịa?

17 Aịsaịa na-ekwu ugbu a, sị: “N’ụbọchị ahụ ka mmadụ ga-ele Onye keworo ya anya ọma, anya ya abụọ ga-elekwasịkwa Onye Nsọ nke Israel. Ma ọ gaghị ele ebe ịchụàjà ahụ nile anya ọma, bụ́ ọrụ aka ya, ọ bụghịkwa ihe mkpịsị aka ya meworo ka ọ ga-ele anya, ma ọ bụ Asherim, ma ọ bụ arụsị anyanwụ ya nile.” (Aịsaịa 17:7, 8) Ee, ụfọdụ ndị n’Israel ṅara ntị ná nkwupụta okwu ịdọ aka ná ntị nke Jehova. Dị ka ihe atụ, mgbe Hezekaịa ziri ozi ma kpọọ ndị bi n’Israel ka ha bịa sonyere Juda n’ime Ememe Ngabiga, ụfọdụ ndị Israel nabatara ya ma mee njem gaa n’ebe ndịda iji sonyere ụmụnna ha n’ofufe dị ọcha. (2 Ihe E Mere 30:1–12) Ma, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị bi n’Israel kwara ndị gara zie ozi ịkpọ òkù ahụ emo. Mba ahụ esiwo n’ezi ofufe dapụ n’ụzọ na-enweghị ngwọta. N’ihi ya, e mezuru ndụmọdụ Jehova megide ya. Asiria bibiri obodo dị iche iche nke Israel, ala ahụ ghọkwara nke tọgbọrọ n’efu, ebe ịta nri ya adịghị emepụta ihe.—Gụọ Aịsaịa 17:9–11.

18 Olee banyere taa? Israel bụ mba si n’ezi ofufe dapụ. N’ihi ya, ụzọ Hezekaịa si gbalịa inyere ndị nọ ná mba ahụ aka ịlaghachi n’ezi ofufe na-echetara anyị otú ezi ndị Kraịst taa si agbalị inyere ndị nọ ná nzukọ ahụ si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ Krisendọm, aka. Kemgbe 1919, ndị ozi “Israel nke Chineke” zipụrụ agawo na Krisendọm nile, na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha bịa kere òkè n’ezi ofufe. (Ndị Galetia 6:16) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ajụwo. Ọtụtụ akwawo ndị ozi ahụ emo. Otú ọ dị, ụfọdụ aṅawo ntị. Ha eruwo ọtụtụ nde ugbu a n’ọnụ ọgụgụ, ha na-enwekwa obi ụtọ ‘ilekwasị Onye Nsọ nke Israel anya,’ bụrụ ndị ọ na-ezi ihe. (Aịsaịa 54:13) Ha akwụsịwo ife ofufe n’ebe ịchụàjà na-adịghị nsọ—nrara nye chi mmadụ mere na ịtụkwasị ha obi—ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-echigharịkwuru Jehova. (Abụ Ọma 146:3, 4) Dị ka onye ya na Aịsaịa dịkọrọ ndụ, bụ́ Maịka kwuru, onye ọ bụla n’ime ha na-asị: “Ma mụ onwe m, n’ime Jehova ka m ga-eche nche nke ọma; m ga-echere Chineke nke nzọpụta m: Chineke m ga-anụ olu m.”—Maịka 7:7.

19. Ole ndị ka Jehova ga-abara mba, gịnịkwa ka nke a ga-apụtara ha?

19 Lee ka ha si dị iche ná ndị na-atụkwasị obi n’ebe mmadụ na-anwụ anwụ nọ! Oké ntiwapụ nke ime ihe ike na ọgba aghara na-emekpa ihe a kpọrọ mmadụ ahụ na mgbe ikpeazụ a. “Oké osimiri” nke ụmụ mmadụ ahụ na-erughị ala, nke na-enupụ isi na-akpali enweghị afọ ojuju na ime oké mgbanwe. (Aịsaịa 57:20; Mkpughe 8:8, 9; 13:1) Jehova ‘ga-abara’ ìgwè mmadụ a na-eme mkpọtụ “mba.” Alaeze eluigwe ya ga-ebibi nzukọ nakwa onye ọ bụla na-akpata nsogbu, ndị a ‘ga-agbalagakwa n’ebe dị anya dị ka ihe a na-efegharị gburugburu n’ihu oké ifufe.’—Aịsaịa 17:12, 13; Mkpughe 16:14, 16.

20. N’agbanyeghị ịbụ ndị mba ọzọ ‘lụtara ihe ha n’agha,’ obi ike dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst nwere?

20 Gịnị ga-esi na ya pụta? Aịsaịa na-ekwu, sị: “Na mgbe anyasị lee, oké egwu dị: tutu ụtụtụ eruo ọ dịghị. Nke a bụ òkè nke ndị na-apụnara anyị ihe; na ihe ruuru ha n’ife nza, bụ́ ndị na-alụta ihe anyị n’agha.” (Aịsaịa 17:14) Ọtụtụ ndị na-alụta ihe ndị Jehova n’agha, na-emeso ha ihe n’ụzọ ọjọọ na n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. N’ihi na ha abụghị—ha achọghịkwa ịbụ—akụkụ nke okpukpe ndị bụ́ isi n’ụwa, ndị nkatọ nwere ajọ mbunobi na ajọ ndị mmegide na-ele ezi ndị Kraịst anya dị ka anụ oriri. Ma ndị Chineke nwere obi ike na “ụtụtụ” ahụ mgbe mkpagbu ha ga-akwụsị na-eru nso n’ike n’ike.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6–9; 1 Pita 5:6–11.

Etiopia Ewetara Jehova Onyinye

21, 22. Olee mba ọzọ natara nkwupụta okwu ikpe, oleekwa otú e si mezuo okwu Aịsaịa ndị sitere n’ike mmụọ nsọ?

21 Etiopia, nke dị n’ebe ndịda nke Ijipt, ebusowo Juda agha, ọ dịkarịa ala, ugboro abụọ. (2 Ihe E Mere 12:2, 3; 14:1, 9–15; 16:8) Ugbu a, Aịsaịa na-ebu amụma ikpe ọmụma megide mba ahụ, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ala ụ̀zụ̀ nile nke ọtụtụ nkù, nke dị n’ofe osimiri nile nke Etiopia.” (Gụọ Aịsaịa 18:1–6.)a Jehova nyere iwu na a ‘ga-ebipụ, wezụga, ma gbuchapụ’ Etiopia.

22 Akụkọ ihe mere eme ụwa na-agwa anyị na ná ngwụsị narị afọ nke asatọ T.O.A., Etiopia meriri Ijipt ma chịa ya ruo ihe dị ka afọ 60. Ndị eze ukwu bụ́ Isa-hadọn na Ashurbanipal nke Asiria wakpochara ya. Site ná mbibi Ashurbanipal bibiri Thebes, Asiria doro Ijipt n’okpuru ya, si otú a mee ka ọchịchị ndị Etiopia na-achị na Ndagwurugwu Naịl bịa ná njedebe. (Leekwa Aịsaịa 20:3–6.) Gịnị banyere n’oge a?

23. Òkè dị aṅaa ka “Etiopia” nke oge a na-ekere, n’ihi gịnịkwa ka a ga-eji bibie ya?

23 N’amụma Daniel banyere “mgbe nke ọgwụgwụ,” a kọwara “eze Ugwu” ahụ nke na-alụkarị ọgụ dị ka nke Etiopia na Libia ga-eso “na nzọụkwụ ya,” ya bụ, ịgbaso ntụzi ya. (Daniel 11:40–43) E hotakwara Etiopia dị ka nke so n’usuu ndị agha “Gọg, nke ala Megọg.” (Ezikiel 38:2–5, 8) A ga-ebibi usuu ndị agha Gọg, gụnyere eze ugwu, mgbe ha wakporo mba Jehova nke dị nsọ. N’ihi ya, Jehova ga-esetịkwa aka ya megide “Etiopia” nke oge a n’ihi mmegide ọ na-emegide ọbụbụeze Jehova.—Ezikiel 38:21–23; Daniel 11:45.

24. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova siworo nweta “onyinye” site n’aka mba dị iche iche?

24 Otú ọ dị, amụma ahụ na-ekwukwa, sị: “Na mgbe ahụ ka a [ga-ewetara] Jehova nke usuu nile nke ndị agha [onyinye], nke bụ́ otu ndị dị ogologo dịkwa larịị n’ahụ, nke sitekwara n’otu ndị dị egwu site ná mmalite ya gaa n’ihu . . . ruo ọnọdụ aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha, bụ́ ugwu Zaịọn.” (Aịsaịa 18:7 ) Ọ bụ ezie na mba dị iche iche adịghị anabata ọbụbụeze Jehova, mgbe ụfọdụ ha emewo ihe n’ụzọ baara ndị Jehova uru. N’ala ụfọdụ, ndị ọchịchị etiwo iwu ma nye mkpebi ikpe ụlọikpe, na-enye ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe Jehova ofufe ikike iwu kwadoro. (Ọrụ 5:29; Mkpughe 12:15, 16) E nwekwara onyinye ndị ọzọ. “Gị ka ndị eze [ga-ewetara onyinye. . . . Arịa ndị e ji ọla bronze mee] ga-esi n’Ijipt pụta; Etiopia ga-esetịrị Chineke aka ya abụọ ngwa ngwa [n’onyinye].” (Abụ Ọma 68:29–31) Taa, ọtụtụ nde ndị “Etiopia” nke oge a, bụ́ ndị na-atụ egwu Jehova na-eweta “onyinye” n’ụdị ofufe. (Malakaị 1:11) Ha na-ekere òkè ná nnukwute ọrụ ahụ nke ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’ụwa nile. (Matiu 24:14; Mkpughe 14:6, 7) Lee onyinye mara mma ọ bụ inye Jehova!—Ndị Hibru 13:15.

Obi Alọọ Ijipt Mmiri

25. Iji mezuo Aịsaịa 19:1-11, gịnị mere Ijipt oge ochie?

25 Ndị agbata obi kasị dịrị Juda nso n’ebe ndịda bụ Ijipt, ndị bụworo ndị iro nke ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ruo ogologo oge. Aịsaịa isi nke 19 na-akọ banyere ọgba aghara dị n’Ijipt n’oge Aịsaịa dị ndụ. E nwere agha obodo n’Ijipt, “obodo megide obodo, alaeze megide alaeze.” (Aịsaịa 19:2, 13, 14) Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-enye ihe àmà na-egosi na e nwere usoro ndị eze na-achị akụkụ dị iche iche nke mba ahụ otu mgbe ahụ bụ́ ndị na-asọrịta mpi. Amamihe nke ndị Ijipt ji na-etu ọnụ, nakwa ‘ihe efu na ndị ntamu’ ha nile, azọpụtaghị ha “n’aka onye nwe ha na-eme ihe ike.” (Aịsaịa 19:3, 4) Asiria, Babilọn, Peasia, Gris, na Rom merichara Ijipt. Ihe a nile merenụ mezuru amụma ndị dị n’Aịsaịa 19:1–11.

26. Ná mmezu ka ukwuu, olee otú ndị bi ‘n’Ijipt’ nke oge a ga-esi meghachi omume n’ihe Jehova ga-eme n’imezu ihe o kpere n’ikpe?

26 Otú ọ dị, n’ime Bible, Ijipt na-esekarị onyinyo ụwa Setan. (Ezikiel 29:3; Joel 3:19; Mkpughe 11:8) N’ihi ya, “[nkwupụta okwu megide] Ijipt” bụ́ nke Aịsaịa mere, ò nwere mmezu ka ukwuu? O nwere n’ezie! Okwu mmeghe nke amụma ahụ kwesịrị ime ka onye ọ bụla ṅaa ntị: “Lee, n’igwe ojii nke na-agba ọsọ ka Jehova na-anọkwasị dị ka ịnyịnya, O wee bịaruo Ijipt: ihe efu nile nke Ijipt ga-emekwa mkpatụ n’ihu Ya, obi Ijipt ga-alọkwa ya mmiri n’etiti ya.” (Aịsaịa 19:1) Jehova ga-eme ihe n’isi nso megide nzukọ Setan. N’oge ahụ, a ga-achọpụta na chi nile nke usoro ihe a bụ ihe efu. (Abụ Ọma 96:5; 97:7) “Obi Ijipt ga-alọkwa ya mmiri” n’ụjọ. Jisọs buru amụma banyere oge ahụ, sị: “Mkpagbu nke mba dị iche iche ga-adịkwa, ndị nọ n’obi abụọ n’ihi mbigbọ nke oké osimiri na ebili mmiri; mmadụ na-atụbọ site n’egwu, sitekwa n’ile anya ihe na-abịakwasị n’elu ụwa dum mmadụ bi.”—Luk 21:25, 26.

27. Nkewa dị aṅaa nke ime obodo ka e buru n’amụma maka “Ijipt,” oleekwa otú nke a si emezu taa?

27 Banyere oge ga-eduga ná mmezu nke ihe o kpere n’ikpe, Jehova na-ekwu n’ụzọ amụma, sị: “M ga-akwalikwa Ijipt megide Ijipt: ha ga-ebukwa agha, onye ọ bụla megide nwanne ya, onye ọ bụla megidekwa ibe ya, obodo megide obodo, alaeze megide alaeze.” (Aịsaịa 19:2) Kemgbe e guzobere Alaeze Chineke na 1914, mba ibili megide mba na alaeze ibili megide alaeze akawo “ihe ịrịba ama nke [ọnụnọ Jisọs]” akara. Mgbuchapụ nke otu ebo, oké mgbukpọ nke agbụrụ, na ihe a sị na ọ bụ mkpocha agbụrụ atawo isi ọtụtụ nde mmadụ na mgbe ikpeazụ a. “Ihe mgbu” ndị dị otú ahụ ga-aka njọ ka ọgwụgwụ na-erukwu nso.—Matiu 24:3, 7, 8.

28. N’ụbọchị ikpe, gịnị ka okpukpe ụgha ga-enwe ike ime iji zọpụta usoro ihe a?

28 “E wee wụsị mmụọ Ijipt n’etiti ya; ndụmọdụ ya ka M ga-elodakwa: ha ga-ajụkwa ihe efu nile ha ase, jụọkwa ndị ntamu ha, jụọkwa ndị na-ajụ mmụọ ihe, jụọkwa ndị dibịa afa.” (Aịsaịa 19:3) Mgbe Mosis gakwuuru Fero, e menyere ndị nchụàjà nke Ijipt ihere, n’ịbụ ndị na-apụghị ịma ike Jehova aka. (Ọpụpụ 8:18, 19; Ọrụ 13:8; 2 Timoti 3:8) N’otu aka ahụ, n’ụbọchị ikpe, okpukpe ụgha agaghị azọpụtali usoro ihe a rụrụ arụ. (Tụlee Aịsaịa 47:1, 11–13.) N’ikpeazụ, Ijipt bịara nọrọ n’okpuru “onye nwe ha na-eme ihe ike,” bụ́ Asiria. (Aịsaịa 19:4) Nke a na-ese onyinyo ọdịnihu olileanya na-adịghị na ya nke na-eche usoro ihe a ihu.

29. Mgbe ụbọchị Jehova bịara, olee uru ndị ọchịchị ga-aba?

29 Otú ọ dị, gịnị banyere ndị ndú ọchịchị? Hà pụrụ inye aka? “Nanị ndị gbagọrọ agbagọ n’uche ha ka ndị isi Zoan bụ; ndụmọdụ nke ndị maara ihe n’ime ndị ndụmọdụ Fero aghọwo ndụmọdụ anụ ọhịa.” (Gụọ Aịsaịa 19:5–11.) Lee ka o si bụrụ ihe iberibe inwe olileanya na ndị ndụmọdụ bụ́ mmadụ ga-aba uru ọ bụla n’ụbọchị ikpe! Ọbụna n’agbanyeghị amamihe ụwa nile ha nwere, amamihe Chineke kọrọ ha. (1 Ndị Kọrint 3:19) Ha ajụwo Jehova ma chigharịkwuru ihe ha sị na ọ bụ sayensị, nkà ihe ọmụma, ego, ihe ụtọ, na chi ndị ọzọ. N’ihi ya, ha amaghị nzube Chineke. E duhiewo ha, ha nọkwa ná mgbagwoju anya. Ọrụ ha nile bụ n’efu. (Gụọ Aịsaịa 19:12–15.) “Ihere emewo ndị maara ihe, ha atụwo ụjọ, e wee jide ha: lee, okwu Jehova ka ha jụworo; ọ̀ bụkwa aha amamihe gịnị ka ha nwere?”—Jeremaịa 8:9.

Ihe Ịrịba Ama na Ihe Àmà Nye Jehova

30. N’ụzọ dị aṅaa ka ‘ala Juda ga-esi ghọọrọ Ijipt ihe anya ajụ’?

30 Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ndị ndú “Ijipt” bụ ndị na-enweghị ike dị “ka ndị inyom,” a ka nwere ndị ụfọdụ na-achọ amamihe Chineke. Ndị Jehova e tere mmanụ na ndị ibe ha ‘na-ekwusa ịdị mma nile nke Chineke.’ (Aịsaịa 19:16; 1 Pita 2:9) Ha na-eme ihe nile ha nwere ike ime iji dọọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere mbibi na-abịanụ nke a ga-ebibi nzukọ Setan. N’ịtụ anya ọnọdụ a, Aịsaịa na-asị: “Ala Juda ga-aghọkwara Ijipt anya ajụ, onye ọ bụla nke a na-ehotara ya Ijipt ga-atụ oké egwu, n’ihi nzube nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha, nke Ya onwe ya na-ezube megide ya.” (Aịsaịa 19:17) Ndị ozi Jehova kwesịrị ntụkwasị obi na-aga agwa ndị mmadụ eziokwu—gụnyere ịma ọkwa ihe otiti ndị Jehova buru n’amụma. (Mkpughe 8:7–12; 16:2–12) Nke a na-enye ndị ndú okpukpe nke ụwa nsogbu n’obi.

31. Olee otú e si sụọ “asụsụ Kenean” n’obodo dị iche iche nke Ijipt (a) n’oge ochie? (b) n’oge a?

31 Olee ihe na-eju anya ga-esi n’ọrụ mkpọsa a pụta? “N’ụbọchị ahụ obodo ise ga-adị n’ala Ijipt ndị na-asụ asụsụ Kenean, ndị na-aṅụrụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha iyi; Obodo nkwada ka a ga-akpọ otu n’ime ha.” (Aịsaịa 19:18) N’oge ochie, o yiri ka e mezuru amụma a mgbe ndị Juu gbagara Ijipt sụrụ asụsụ Hibru n’obodo ya dị iche iche. (Jeremaịa 24:1, 8–10; 41:1–3; 42:9–43:7; 44:1) Taa, e nwere ndị nọ n’ókèala “Ijipt” nke oge a, bụ́ ndị mụtaworo ịsụ “asụsụ dị ọcha” nke eziokwu Bible. (Zefanaịa 3:9, NW) A na-akpọ otu n’ime obodo ihe atụ ise ahụ “Obodo nkwada,” na-egosi na otu akụkụ nke ‘asụsụ ahụ dị ọcha’ metụtara ikpughe na ‘ịkwada’ nzukọ Setan.

32. (a) Olee “ebe ịchụàjà” dị n’etiti ala Ijipt? (b) Olee otú ndị e tere mmanụ si yie “ogidi” dị n’akụkụ ókèala Ijipt?

32 N’ihi ọrụ mkpọsa nke ndị Jehova, n’ezie a ga-amata aha ukwu Ya n’ime usoro ihe a. “N’ụbọchị ahụ ebe ịchụàjà ga-adịrị Jehova n’etiti ala Ijipt, otu ogidi n’akụkụ ókèala ya ga-adịkwara Jehova.” (Aịsaịa 19:19) Okwu ndị a na-ezo aka n’ọnọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị ha na Chineke nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ. (Abụ Ọma 50:5) Dị ka “ebe ịchụàjà,” ha na-achụ àjà ha; dị ka “ide na ntọala nke eziokwu,” ha na-agbara Jehova àmà. (1 Timoti 3:15; Ndị Rom 12:1; Ndị Hibru 13:15, 16) Ha nọ “n’etiti ala” ahụ, bụrụ ndị a na-ahụ—ha na “atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị ibe ha—n’ihe karịrị mba na àgwàetiti oké osimiri 230. Ma ha “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 10:16; 17:15, 16) Ha na-eguzo, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, n’ókèala nke ụwa a na Alaeze Chineke, dịrị njikere ịgafere ókèala ahụ ma nweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.

33. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị e tere mmanụ si bụrụ “ihe ịrịba ama” na “ihe àmà” ‘n’Ijipt’?

33 Aịsaịa gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ ga-abụkwara Jehova nke usuu nile nke ndị agha ihe ịrịba ama na ihe àmà n’ala Ijipt: n’ihi na ha ga-etiku Jehova n’ihi ndị mmegbu, Ọ ga-ezitekwara ha onye nzọpụta na onye ga-alụrụ ha ọgụ, O wee napụta ha.” (Aịsaịa 19:20) Dị ka “ihe ịrịba ama” na “ihe àmà,” ndị e tere mmanụ na-ebute ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ ma na-ebuli aha Jehova elu n’usoro ihe a. (Aịsaịa 8:18; Ndị Hibru 2:13) A pụrụ ịnụ ákwá nke ndị a na-emegbu emegbu n’ụwa nile, ma n’ozuzu ha, ọchịchị ụmụ mmadụ apụghị inyere ha aka. Otú ọ dị, Jehova ga-ezite Onye Nzọpụta Ukwu, bụ́ Eze Jisọs Kraịst, ịtọhapụ ndị nile dị nwayọọ n’obi. Mgbe ụbọchị ikpeazụ ndị a bịara ná njedebe n’agha Amagedọn, ọ ga-ewetara ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke ahụ efe na ngọzi ebighị ebi.—Abụ Ọma 72:2, 4, 7, 12–14.

34. (a) Olee otú “ndị Ijipt” ga-esi bịa mara Jehova, àjà na onyinye dịkwa aṅaa ka ha ga-enye ya? (b) Olee mgbe Jehova ga-eti “Ijipt” ihe, ọgwụgwọ dịkwa aṅaa ga-esochi ya?

34 Ka ọ dịgodị, ọ bụ uche Chineke ka mmadụ nile nweta ezi ihe ọmụma ma bụrụ ndị a zọpụtara. (1 Timoti 2:4) N’ihi ya, Aịsaịa na-ede, sị: “Jehova ga-emekwa ka Ijipt mara Ya, ndị Ijipt ewee mara Jehova n’ụbọchị ahụ; ha ga-ejikwa àjà na onyinye ịnata ihu ọma fee Ya, ha ga-ekwekwa Jehova nkwa, kwụghachikwa ya. Jehova ga-etikwa Ijipt ihe, na-eti, na-agwọkwa; ha ga-alaghachikwutekwa Jehova, O wee kwe ka ha rịọta ihe ha na-arịọ, Ọ ga-emekwa ka ahụ dị ha mma.” (Aịsaịa 19:21, 22) Ndị si ná mba nile dị n’ụwa Setan, bụ́ ndị “Ijipt” n’otu n’otu, ga-abịa mara Jehova ma chụọrọ ya àjà, bụ́ “mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta nye aha Ya.” (Ndị Hibru 13:15) Ha na-ekwe Jehova nkwa site n’ịrara onwe ha nye ya, ha na-emezukwa nkwa ha site n’ibi ndụ nke iji iguzosi ike n’ihe na-eje ozi. Mgbe “ihe” ahụ Jehova ga-eti usoro ihe a n’Amagedọn gasịrị, ọ ga-eji Alaeze ya gwọọ ihe a kpọrọ mmadụ. N’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Jisọs, a ga-ebuli ihe a kpọrọ mmadụ elu gaa n’izu okè ime mmụọ, nke uche, nke omume, na nke anụ ahụ—ọgwụgwọ n’ezie!—Mkpughe 22:1, 2.

‘Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị M Bụ’

35, 36. Iji mezuo Aịsaịa 19:23–25, njikọ dịgasị aṅaa malitere ịdị n’oge ochie n’etiti Ijipt, Asiria, na Israel?

35 Onye amụma ahụ hụziri ihe ndị dị ịrịba ama ga-eme: “N’ụbọchị ahụ ụzọ a tụliri atụli ga-adị site n’Ijipt wee ruo Asiria, Asiria ewee baa n’Ijipt, Ijipt ga-abakwa n’Asiria: ndị Ijipt ga-esoro ndị Asiria fee ofufe. N’ụbọchị ahụ ka Israel ga-eme Ijipt na Asiria atọ, ọ ga-abụ ngọzi n’etiti ụwa: n’ihi na Jehova nke usuu nile nke ndị agha agọziwo ya, sị, Onye a gọziri agọzi ka ọ bụ, bụ Ijipt nke bụ́ ndị m, na Asiria nke bụ́ ọrụ aka m abụọ, na Israel nke bụ́ ihe nketa m.” (Aịsaịa 19:23–25) Ee, otu ụbọchị, Ijipt na Asiria ga-enwe mmekọrịta enyi na enyi. N’ụzọ dị aṅaa?

36 N’oge gara aga, mgbe Jehova napụtara ndị ya site ná mba dị iche iche, o meere ha ụzọ a tụliri atụli nke na-eduga ná nnwere onwe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Aịsaịa 11:16; 35:8–10; 49:11–13; Jeremaịa 31:21) Ntakịrị mmezu nke amụma a weere ọnọdụ ka e merisịrị Babilọn, mgbe a kpọghachitere ndị e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ n’Ala Nkwa ahụ site n’Asiria na Ijipt, tinyere Babilọn. (Aịsaịa 11:11) Ma gịnị banyere oge a?

37. Olee otú ọtụtụ nde mmadụ taa si ebi ndụ dị ka a ga-asị na e nwere ụzọ a tụliri atụli dị n’etiti “Asiria” na “Ijipt”?

37 Taa, ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ ahụ e tere mmanụ bụ “ngọzi n’etiti ụwa.” Ha na-akwalite ezi ofufe ma na-ekwusara ndị nọ ná mba nile ozi Alaeze ahụ. Ụfọdụ n’ime mba ndị a yiri Asiria, nwee omume ịlụ agha. Mba ndị ọzọ na-emesapụ aka karị, ma eleghị anya dị ka Ijipt—nke bụ́ n’otu oge “eze nke Ndịda” ahụ dị n’amụma Daniel. (Daniel 11:5, 8) Ọtụtụ nde mmadụ ndị sitere ná mba ndị nwere omume ịlụ agha na ná mba ndị na-emesapụ aka karị abatawo n’ụzọ nke ezi ofufe. N’ụzọ dị otú a, ndị sitere ná mba nile dị n’otu ‘n’ife ofufe.’ Nkewa n’ihi mba adịghị n’etiti ndị a. Ha hụrụ ibe ha n’anya, a pụkwara ikwu n’ezie na ‘Asiria bara n’Ijipt, Ijipt abaakwa n’Asiria.’ O yiri ka a ga-asị na e nwere ụzọ a tụliri atụli nke si n’otu ebe gaa n’ọzọ.—1 Pita 2:17.

38. (a) Olee otú Israel ga-esi mee “Ijipt na Asiria atọ”? (b) N’ihi gịnị ka Jehova ga-eji kwuo, sị, ‘Ndị a gọziri agọzi ka ndị m bụ’?

38 Otú ọ dị, olee otú Israel si mee “Ijipt na Asiria atọ”? Ná mmalite nke “mgbe ọgwụgwụ,” ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ejere Jehova ozi n’ụwa bụ ndị so ‘n’Israel nke Chineke.’ (Daniel 12:9; Ndị Galetia 6:16) Kemgbe afọ ndị 1930, oké igwe mmadụ nke “atụrụ ọzọ,” bụ́ ndị nwere olileanya elu ala apụtawo. (Jọn 10:16a; Mkpughe 7:9) N’ịbụ ndị si ná mba dị iche iche—ndị Ijipt na Asiria sere onyinyo ha pụta—ha na-enuga n’ụlọ ofufe nke Jehova ma na-akpọ ndị ọzọ òkù isonyere ha. (Aịsaịa 2:2–4) Ha na-arụ otu ọrụ nkwusa ahụ ụmụnna ha e tere mmanụ na-arụ, na-atachi obi n’otu ụdị ule ahụ, na-egosipụta otu ụdị ikwesị ntụkwasị obi na iguzosi ike n’ezi ihe ahụ, na-erikọkwa nri n’otu tebụl ime mmụọ. N’ezie, ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ bụ ‘otu ìgwè atụrụ, otu onye ọzụzụ atụrụ.’ (Jọn 10:16b) Ọ̀ dị onye pụrụ ịrụ ụka na Jehova, n’ịhụ ịnụ ọkụ n’obi na ntachi obi ha, nwere obi ụtọ n’ọrụ ha? Ka a sịkwa ihe mere o ji gọzie ha, sị: ‘Ndị a gọziri agọzi ka ndị m bụ’!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ndị ọkà mmụta ụfọdụ na-ekwu na okwu ahụ bụ́ “ala ụ̀zụ̀ nile nke ọtụtụ nkù” na-ezo aka n’igurube nke na-abịakwasị Etiopia site n’oge ruo n’oge. Ndị ọzọ na-akọwapụta na okwu Hibru maka “ụ̀zụ̀ ife efe,” bụ́ tsela·tsalʹ, yiri aha ndị Galla, bụ́ ndị Hamite bi n’Etiopia nke oge a, gụrụ odudu nke bụ́ tsaltsalya.

[Foto dị na peeji nke 191]

Ndị dike Filistia ka ha na-awakpo ndị iro ha (ihe a tụrụ atụ si Ijipt nke dịwara malite na narị afọ nke 12 T.O.A.)

[Foto dị na peeji nke 192]

Dike ma ọ bụ chi ndị Moab nke a tụrụ na nkume (agbata narị afọ nke 11 na nke 8 T.O.A.)

[Foto dị na peeji nke 196]

Dike ndị Siria nke nọ n’elu camel (narị afọ nke itoolu T.O.A.)

[Foto dị na peeji nke 198]

“Oké osimiri” nke ụmụ mmadụ na-enupụ isi na-akpali enweghị afọ ojuju na ime oké mgbanwe

[Foto dị na peeji nke 203]

Ike ndị nchụàjà nke Ijipt erughị nke Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya