Udo Adịrịghị Ndị Ozi Ụgha!
“A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—ABỤ ỌMA 37:9, 11.
1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tụọ anya ịhụ ndị ozi, ma ndị eziokwu ma ndị ụgha, na “mgbe ọgwụgwụ”?
NDỊ ozi—ndị ụgha ka ọ̀ bụ ndị eziokwu? E nwere ụdị abụọ ahụ n’oge Bible. Ma gịnị banyere ụbọchị anyị? Na Daniel 12:9, 10, anyị na-agụ na onye ozi si n’eluigwe gwara onye amụma Chineke, sị: “E zobewo okwu ndị a, kachitekwa ha akara, ruo mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a. Ọtụtụ mmadụ ga-eme onwe ha ka ha dị ọcha, ha ga-eme onwe ha ka ha nwuo ọcha, a ga-anụchakwa ha; ma ndị na-emebi iwu ga-emebi iwu; ndị nile nke na-emebi iwu agaghị aghọtakwa ihe: ma ndị ahụ ndị nwere uche ga-aghọta.” Anyị na-ebi na “mgbe ọgwụgwụ” ahụ ugbu a. Ànyị na-ahụ ọdịiche doro anya dị n’etiti “ndị na-emebi iwu” na “ndị nwere uche”? N’ezie anyị na-ahụ!
2. Olee otú Aịsaịa 57:20, 21 si emezu taa?
2 N’isi nke 57, amaokwu nke 20 na 21, anyị na-agụ okwu onye ozi Chineke bụ́ Aịsaịa, sị: “Ndị na-emebi iwu dị ka oké osimiri nke na-amagharị amagharị: n’ihi na ọ pụghị ịdị jụụ, mmiri ya na-amapụtakwa ụrọ na apịtị. Ọ dịghị udo ndị na-emebi iwu nwere, ka Chineke m sịrị.” Lee ka okwu ndị a si kọwaa ụwa nke a nke ọma ka ọ na-abịaru narị afọ nke 21! Ọbụna na ụfọdụ na-ajụ, sị, ‘Ànyị ga-eru narị afọ nke ahụ ma ọlị?’ Gịnị ka ndị ozi nwere uche nwere ịgwa anyị?
3. (a) Ọdịiche dị aṅaa ka a na-enweta na 1 Jọn 5:19? (b) Olee otú e si kọwaa “ndị nwere uche” ná Mkpughe isi nke 7?
3 Jọn onyeozi nwere uche sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke. Na 1 Jọn 5:19, e kwuru, sị: “Anyị matara na anyị bụ ndị si na Chineke pụta, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Israel ime mmụọ ahụ dị 144,000, bụ́ ndị ihe fọdụrụ n’ime ha meworo agadi ka na-anọnyere anyị, dị iche n’ebe ụwa nke a dị. Ndị na-esonyere ndị a taa bụ “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta,” bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde ise, bụ́ ndị nwekwara uche. “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.” N’ihi gịnịkwa ka e ji akwụghachi ha ụgwọ? N’ihi na ha “sakwara uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ” site n’igosipụta okwukwe n’ihe mgbapụta Jisọs. Dị ka ndị ozi nke ìhè, ha “na-efekwa [Chineke] ofufe ehihie na abalị.”—Mkpughe 7:4, 9, 14, 15.
Ndị A Na-asị na Ha Bụ Ndị Ozi Udo
4. (a) N’ihi gịnị ka ndị ahụ a na-asị na ha bụ ndị ozi udo n’ụwa Setan ji bụrụ ndị na-aghaghị ịda? (b) Olee otú Ndị Efesọs 4:18, 19 si emezu taa?
4 Ma, gịnị banyere ndị ahụ a na-asị na ha bụ ndị ozi udo n’usoro ihe ụwa nke Setan? N’Aịsaịa isi nke 33, amaokwu nke 7, anyị na-agụ, sị: “Lee, dimkpa ha nile na-eti mkpu n’èzí: ndị ozi udo na-akwakpọ anya.” Lee ka nke a si bụrụ eziokwu banyere ndị ahụ na-agbaga ngwa ngwa site n’otu isi obodo ụwa gaa n’ọzọ, na-agbalị iweta udo! Lee ka o si bụrụ ihe na-enweghị isi! O si aṅaa dị otú ahụ? N’ihi na ha na-agbaso ihe nsogbu ụwa na-akpata mgba kama ịlụso ihe ndị bụ isi na-akpata ha ọgụ. Na nke mbụ, ha kpuru ìsì nye ịdị adị nke Setan, bụ́ onye Pọl onyeozi na-akọwa dị ka “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Setan akụwo mkpụrụ nke ajọ omume n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, nke mere na ihe ka ọtụtụ, gụnyere ọtụtụ n’ime ndị ọchịchị, na-ekwekọ ugbu a ná nkọwa dị ná Ndị Efesọs 4:18, 19: “E mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị n’ihi amaghị ihe dị n’ime ha, n’ihi na a na-eme ka obi ha mee etili; mmadụ ndị, ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, ha raara onwe ha nye n’aka agụụ ịkwa iko, ịrụpụta adịghị ọcha nile n’ime anyaukwu.”
5. (a) N’ihi gịnị ka òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ ji ada dị ka ndị na-eme udo? (b) Ozi dị aṅaa na-akasi obi ka Abụ Ọma 37 na-ezi?
5 Ọ dịghị ngwá ọrụ ọ bụla nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè nke pụrụ iwepụsị n’obi mmadụ anyaukwu, ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, na ịkpọasị nke juru ebe nile taa. Nanị Onye Okike anyị, Eze Onyenwe anyị Jehova, pụrụ ime nke ahụ! Ọzọkwa, ọ bụ nanị ndị dị umeala n’obi, bụ́ ndị ka nta n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, bụ ndị dị njikere ido onwe ha n’okpuru nduzi ya. A tụlere ihe ọ ga-apụtara ndị a na ndị ajọ omume bi n’ụwa n’Abụ Ọma 37:9-11: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”
6, 7. Ihe ndekọ dị aṅaa nke okpukpe ụwa na-egosi na ha enweghị ike ije ozi dị ka ndị ozi nke udo?
6 Mgbe ahụ, à pụrụ ịhụ ndị ozi nke udo n’etiti okpukpe dị iche iche nke ụwa a na-arịa ọrịa? Ọ dị mma, gịnị bụ ihe ndekọ okpukpe ruo ụbọchị taa? Akụkọ ihe mere eme na-egosi na okpukpe ekerewo òkè na, ee, ọbụna bụrụ onye mkpalite nke ọtụtụ mwụfu ọbara n’ime narị afọ nile. Dị ka ihe atụ, magazin bụ́ Christian Century nke izu August 30, 1995, n’ịkọ banyere oké ọgba aghara dị n’ebe bụbu Yugoslavia, kọrọ, sị: “Na Bosnia nke ndị Serbia na-achị, ndị ụkọchukwu na-anọ n’oche ihu nke ndị kpọrọ onwe ha nzukọ ndị isi, ha na-anọkwa n’ihu agha, ebe a na-agọzi ìgwè ndị agha dị iche iche na ọbụna ngwá agha tupu agha amalite.”
7 Otu narị afọ nke ozi ala ọzọ nke Krisendọm n’Africa enwebeghị ihe ka mma ọ rụpụtara, dịkwa ka e gosipụtara nke ọma na Rwanda, ala nke e kwenyere na ọ bụ 80 pasent ndị Katọlik. Akwụkwọ akụkọ The New York Times nke July 7, 1995, kọrọ, sị: “Golias, bụ́ magazin ndị Katọlik nkịtị nke na-adịghị ezo ọnụ e biri na Lyons [France], na-eme atụmatụ ịkpọ aha ndị ụkọchukwu Rwanda 27 ọzọ na ndị nọn anọ bụ́ ndị ọ sịrị na ha gburu ma ọ bụ gbaa ume ka e gbuo ọchụ e gburu na Rwanda n’afọ gara aga.” Òtù Ihe Ruuru Ndị Africa, bụ́ òtù na-ahụ maka ihe ruuru mmadụ nke dị na London, kwuru ihe a: “Ọbụna karịa ịgbachi nkịtị ya, chọọchị ndị ahụ aghaghị ịza ajụjụ maka nkere òkè nke ndị ụkọchukwu ya ụfọdụ, ndị pastọ na ndị nọn ná mgbukpọ nke agbụrụ ahụ.” Nke a yiri ọnọdụ dị n’Israel mgbe ezi onye ozi Jehova bụ́ Jeremaịa kọwara “ihere” nke Israel, tinyere ndị ndú ya, ndị nchụàjà ya, na ndị amụma ya, na-ekwukwasị: “N’ọnụ ọnụ uwe gị ka a chọtaworo ọbara nke mkpụrụ obi nke ndị ogbenye na-emeghị ihe ọjọọ.”—Jeremaịa 2:26, 34.
8. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jeremaịa bụ onye ozi nke udo?
8 A kpọwo Jeremaịa ọtụtụ ugboro onye na-ebu amụma ọdachi, ma a pụkwara ịkpọ ya onye ozi udo nke Chineke. O zoro aka n’ebe “udo” dị ọtụtụ ugboro dị ka Aịsaịa mere tupu ya. Jehova jiri Jeremaịa kwupụta amamikpe n’isi Jerusalem, na-asị: “Ihe ịkpasu iwe m na ịkpasu ọnụma m ka obodo a bụrụwooro m site n’ụbọchị mgbe ha wuru ya wee ruo taa; ka M wee si n’ihu m wezụga ya: n’ihi na ihe ọjọọ ahụ nile nke ụmụ Israel na nke ụmụ Juda, nke ha meworo ịkpasu m iwe, ha onwe ha, na ndị eze ha, na ndị isi ha, na ndị nchụàjà ha, na ndị amụma ha, na ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem.” (Jeremaịa 32:31, 32) Nke a sere onyinyo ikpe Jehova megide ndị ndú na ndị ụkọchukwu nọ na Krisendọm taa. Ka ezi udo wee dịgide, a ghaghị iwepụ ndị a na-akwalite ajọ ihe na ime ihe ike! N’ezie ha abụghị ndị ozi nke udo.
Òtù UN Ọ̀ Bụ Onye Na-eme Udo?
9. Olee otú UN siworo zọrọ na ya bụ onye ozi nke udo?
9 Òtù Mba Ndị Dị n’Otu ọ́ pụghị ịbụ ezi onye ozi nke udo? E kwuwerị, okwu mmalite nke akwụkwọ ụkpụrụ ịrụ ọrụ ya, e wepụtara na June 1945, nanị ụbọchị 41 tupu bọmbụ atọm ebibie Hiroshima, kwupụtara nzube ya: “ịzọpụta ọgbọ ndị na-abịa abịa pụọ n’ihe mgbu nke agha.” Mba 50 ndị e lere anya na ha ga-eso ná Mba Ndị Dị n’Otu gaje “ijikọta ume [ha] iji jigide udo na ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ.” Taa, òtù UN nwere mba 185 nọ na ya, ndị e kwere na ha raara onwe ha nye otu nzube ahụ.
10, 11. (a) Olee otú ndị ndú okpukpe siworo kwupụta nkwado ha na-enye UN? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka popu dị iche iche siworo kọwahie “Ozi Ọma nke Alaeze Chineke”?
10 Eri ọtụtụ afọ, e nyewo UN otuto n’olu dara ụda, karịsịa site n’ọnụ ndị ndú okpukpe. N’April 11, 1963, Popu John nke Iri Abụọ na Atọ bịanyere aka n’akwụkwọ ozi ya a kpọrọ “Pacem in Terris” (Udo n’Ụwa) nke o kwuru n’ime ya, sị: “Ọ bụ nzube anyị si n’ezi obi na òtù Mba Ndị Dị n’Otu—n’usoro ya na n’ihe onwunwe ya—pụrụ inwewanye ike ịnagide ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị ukwuu na ịdị ùgwù nke ọrụ ya.” Ka oge na-aga, na June 1965, ndị ndú okpukpe, nke e kwuru na ha na-anọchite anya ọkara nke ndị bi n’ụwa, mere ememe ụbọchị ọmụmụ nke 20 nke UN na San Francisco. Na 1965 kwa, Popu Paul nke Isii, n’otu nleta o mere na UN, kọwara ya dị ka “olileanya ikpeazụ e nwere maka nkwekọrịta na udo.” Na 1986, Popu John Paul nke Abụọ so rụọ ọrụ n’ịkwado Afọ Udo nke Mba Nile nke UN.
11 Ọzọ, ná nleta ya n’October 1995, popu kwupụtara, sị: “Taa anyị na-eme ememe Ozi Ọma nke Alaeze Chineke.” Ma ọ̀ bụ onye ozi Chineke nke ozi ọma nke Alaeze n’ezie? N’ikwu okwu banyere nsogbu ụwa, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ka anyị na-eche ihe ịma aka ndị a dị egwu ihu, olee otú anyị pụrụ isi ghara ịnakwere ọrụ nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu?” UN, kama ịbụ Alaeze Chineke, bụ nhọrọ nke popu.
Ihe Mere A Ga-eji ‘Kwakpọọ Anya’
12, 13. (a) Olee otú UN siworo mee ihe n’ụzọ a kọwara na Jeremaịa 6:14? (b) N’ihi gịnị ka e ji gụnyekọ idu ndú UN ná nkọwa dị n’Aịsaịa 33:7?
12 Ememe mgbaafọ nke 50 nke UN enweghị ike ikpughe ezi olileanya ọ bụla nke “udo n’ụwa.” Otu onye na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star nke Canada gosiri otu ihe kpatara ya, bụ́ onye dere, sị: “Òtù U.N. bụ ọdụm na-enweghị ezé, nke na-agbọ ụjá mgbe omume obi ọjọọ nke mmadụ chere ya ihu, ma ọ ghaghị ichere ka ndị òtù ya kwụnye ezé ya tupu o nwee ike ịta arụ.” Ọtụtụ mgbe ịta arụ ahụ abụrụwo nke dị nta nke ukwuu na nke bịara n’azụ oge nke ukwuu. Ndị ozi udo n’usoro ihe ụwa nke dị ugbu a, na karịsịa ndị ahụ nọ na Krisendọm, anọwo na-ekwughachi okwu ndị ahụ dị na Jeremaịa 6:14: “Ha wee gwọọ mgbaji ụkwụ na aka nke ndị m n’akpọghị ya ihe, sị, Udo, udo; mgbe udo na-adịghị.”
13 Odeakwụkwọ ukwu ndị sochiri ibe ha nke UN arụsiwo ọrụ ike, obi abụọ adịghịkwa ya na ọ bụ n’ezi obi, iji mee ka UN nwee ihe ịga nke ọma. Ma esemokwu dị mgbe nile n’etiti ndị òtù 185 bụ́ ndị nwere ebumnobi dịgasị iche banyere ụzọ ha ga-esi kwụsịlata agha, tụọ ụkpụrụ, ma hụ banyere ime ihe ego egbochiwo olileanya maka ịga nke ọma. N’akụkọ ozi mgbaafọ ya nke 1995, odeakwụkwọ ukwu nọ mgbe ahụ dere banyere “ihe na-egbu mgbu n’uche nke ọdachi nuklia zuru ụwa” nke na-adalata adalata dị ka ihe na-emeghe ụzọ maka “mba dị iche iche ịrụkọ ọrụ ọnụ gaa n’ọganihu akụ̀ na ụba na nke ọha na eze maka ihe dum a kpọrọ mmadụ.” Ma o kwukwasịrị: “N’ụzọ dị mwute, ihe ndekọ nke ihe ndị mere n’ụwa n’afọ ole na ole ndị gara aga emegidewo ihe ndị ahụ a na-elesi anya ya ike n’ụzọ dị ukwuu.” N’eziokwu, ndị ahụ na-ekwu na ha bụ ndị ozi nke udo “na-akwakpọ anya.”
14. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na UN dakpọrọ adakpọ ma n’ụzọ ego ma n’ụzọ omume? (b) Olee otú Jeremaịa 8:15 si emezu?
14 Otu isi akụkọ nke akwụkwọ akụkọ bụ́ The Orange County Register nke California na-agụ, sị: “Òtù U.N. Adakpọwo n’Ụzọ Ego, n’Ụzọ Omume.” Isiokwu ahụ kwuru na n’agbata 1945 na 1990, e nwewo ihe karịrị agha 80, na-egbu ihe karịrị nde mmadụ 30. O hotara onye dere mbipụta Reader’s Digest nke October 1995, bụ́ onye “na-akọwa na ihe e ji mara atụmatụ agha U.N. bụ ‘ndị ọchịagha na-amaghị ọrụ, ndị agha na-enweghị ezi àgwà, iso ndị mwakpo enwe nkwekọrịta, enweghị ike igbochi ihe ọjọọ na mgbe ụfọdụ ọbụna ịtụnye ụtụ n’ihe ahụ na-atụ egwu.’ Ọzọkwa, ‘ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịla ihe n’iyi, wayo, na mmetọ bụ ihe na-eri ọnụ.’” N’otu akụkụ a kpọrọ “Òtù U.N. n’Afọ 50,” The New York Times bu isi akụkọ bụ́ “Ejizighị Ihe Eme Ihe na Imefusi Ihe Na-erichapụ Ezi Ebumnobi nke U.N.” Akwụkwọ akụkọ The Times nke London, England, nwere otu isiokwu nke na-asị: “Esighị Ike n’Afọ Iri Ise—Usoro ihe omume mmega ahụ dị UN mkpa iji laghachi n’ọdịdị.” N’eziokwu, ọ bụ dị ka anyị na-agụ na Jeremaịa isi nke 8, amaokwu nke 15, sị: “Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya mgbe ọgwụgwọ, ma, lee, oké egwu.” Ihe iyi egwu nke oké mgbukpọ nuklia ka na-erugharịkwa n’isi ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ doro anya, UN abụghị onye ozi nke udo nke dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa.
15. Olee otú Babilọn oge ochie na ụmụ ya n’okpukpe siworo gosi na ha na-ebibi ihe ma na-akpata amaghị onwe onye?
15 Gịnị ga-esi n’ihe ndị a nile pụta? Okwu amụma Jehova ahapụghị obi abụọ ọ bụla. N’akụkụ mbụ, gịnị na-echere okpukpe ụgha nke ụwa bụ́ ndị ha na UN bụworo oké enyi ọtụtụ ugboro? Ha bụ ụmụ nke otu isi iyi nke ikpere arụsị, bụ́ Babilọn oge ochie. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, a na-akọwa ha ná Mkpughe 17:5 dị ka “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.” Jeremaịa kọwara ikpe ọmụma nke njikọ ihu abụọ nke a. Dị ka nwanyị na-akwa iko, ha aghọgbuwo ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa, na-aja UN mma gabiga ókè ma na-eso ndị òtù ya bụ ike ọchịchị dị iche iche na-enwe mmekọrịta rụrụ arụ. Ha abụrụwo ndị na-ekere òkè bụ isi n’agha dị iche iche nke akụkọ ihe mere eme. Otu onye na-enye nkọwa kwuru okwu na-ezo aka n’agha okpukpe n’India, sị: “Karl Marx zoro aka n’okpukpe dị ka ọgwụ opium nke ọha mmadụ. Ma okwu ahụ apụghị nnọọ izicha ezi n’ihi na opium bụ ọgwụ na-akụjụ ahụ, ọ na-eduje ndị mmadụ n’ọnọdụ nke amaghị onwe ha. Ee e, okpukpe ka yie ọgwụ ọjọọ bụ́ crack cocaine. Ọ na-ewepụta ime ihe ike dị egwu ma bụrụ ike na-ebibi ihe nke ukwuu.” Onye ahụ na-ede ihe ezichakwughị nnọọ ezi. Okpukpe ụgha bụ ma ihe na-akpata amaghị onwe onye ma ihe na-ebibi ihe.
16. N’ihi gịnị ka ndị nwere obi eziokwu ji kwesị isi na Babilọn Ukwu ahụ gbapụ? (Leekwa Mkpughe 18:4, 5.)
16 Mgbe ahụ, gịnị ka ndị nwere obi eziokwu kwesịrị ime? Onye ozi Chineke bụ́ Jeremaịa na-enye anyị azịza ya: “Sinụ n’etiti Babilọn gbalaga, wepụgakwanụ onwe unu n’otu n’otu. . . . N’ihi na mgbe ịbọ ọ́bọ̀ ka ọ bụụrụ Jehova.” Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ nde esiwo n’agbụ nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha gbapụ. Ị̀ bụ otu n’ime ndị a? Mgbe ahụ ị pụrụ ịghọta nke ọma ụzọ Babilọn Ukwu ahụ siworo nwee mmetụta n’ahụ mba nile nke ụwa: “Ụfọdụ n’ime mmanya vine ya ka mba dị iche iche ṅụworo; n’ihi nke a ka mba dị iche iche na-awị ara.”—Jeremaịa 51:6, 7.
17. Ikpe dị aṅaa ka a gaje imezu n’isi Babilọn Ukwu ahụ, gịnị ga-esochikwa ihe omume ahụ?
17 N’isi nso, Jehova ga-echigharị ndị “na-awị ara” nọ n’òtù UN ịwakwasị okpukpe ụgha, dị ka a kọwara ná Mkpughe 17:16: “Ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.” Nke a ga-aka akara mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ e zoro aka na ya na Matiu 24:21, nke ahụkwa ga-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasịnụ n’Amagedọn, bụ́ agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. Dị ka Babilọn oge ochie, Babilọn Ukwu ahụ ga-ezute ikpe ahụ e kwupụtara na Jeremaịa 51:13, 25: “Gị onye bi n’elu ọtụtụ mmiri, onye nwere ọtụtụ akụ̀, ọgwụgwụ gị abịawo, bụ́ ọ̀tụ̀tụ̀ nke uru gị na-ezighị ezi. Lee, Mụ na-emegide gị, gị ugwu na-ebibi ebibi, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), nke na-ebibi ụwa nile: M ga-esetịkwa aka m imegide gị, kpọredaa gị site na nkume gị nile dị elu, mee ka ị ghọọ ugwu e surere esure.” Mba ndị rụrụ arụ, ndị na-akpalite agha ga-eso okpukpe ụgha gaa ná mbibi ka ụbọchị iwe Jehova na-adakwasịkwa ha.
18. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka Aịsaịa 48:22 ka ga-emezu?
18 Ná 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3, a na-ekwu banyere ndị ajọ omume, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” Ndị a bụ ndị Aịsaịa kwuru banyere ha, sị: “Lee, . . . ndị ozi udo na-akwakpọ anya.” (Aịsaịa 33:7) N’ezie, dị ka anyị na-agụ n’Aịsaịa 48:22, “ọ dịghị udo dịịrị ndị na-emebi iwu, ka Jehova sịrị.” Ma ọdịnihu dị aṅaa na-echere ezi ndị ozi nke udo Chineke? Isiokwu anyị na-esonụ ga-ekwu.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ Okwu ndị dị aṅaa siri ike ka ndị amụma Chineke jiworo kpughee ndị ozi ụgha?
◻ N’ihi gịnị ka ngwá ọrụ ụmụ mmadụ dị iche iche ji ada n’ịgbalị iweta udo na-adịgide adịgide?
◻ Olee otú ezi ndị ozi nke udo si dị iche n’ebe ndị na-akwado UN nọ?
◻ Gịnị ka ndị dị umeala n’obi na-aghaghị ime iji wee ṅụrịa n’udo Jehova kwere ná nkwa?
[Foto dị na peeji nke 15]
Aịsaịa, Jeremaịa, na Daniel buchara amụma ọdịda nke mgbalị udo ndị mmadụ na-eme
[Foto dị na peeji nke 16]
“Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.”—Jọn onyeozi
[Foto dị na peeji nke 17]
“E mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha.”—Pọl onyeozi