-
Gịnị Bụ Alaeze Chineke?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Ihe kacha gbaa ọkpụrụkpụ e kwuru okwu gbasara ya na Baịbụl bụ Alaeze Chineke. Jehova ga-eji Alaeze ahụ eme ihe niile o bu n’obi kee ụwa. Gịnị ka Alaeze ahụ bụ? Olee otú anyị si mara na ọ chịwala ugbu a? Gịnị na gịnị ka o merela? Gịnịkwa ka ọ ga-eme n’ọdịnihu? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a nakwa n’isiokwu abụọ na-eso ya.
1. Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ònyekwa bụ Eze ya?
Alaeze ahụ bụ ọchịchị Jehova hiwere. Eze ya, bụ́ Jizọs Kraịst, nọ n’eluigwe na-achị. (Matiu 4:17; Jọn 18:36) Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “Ọ ga-achị . . . ruo mgbe ebighị ebi.” (Luk 1:32, 33) Ọ ga-achị ndị niile bi n’ụwa n’ihi na ọ bụ ya bụ Eze Alaeze Chineke.
2. Ole ndị ga-eso Jizọs chịa?
Ọ bụghị naanị Jizọs ga na-achị n’Alaeze Chineke. Ya na ndị si ‘n’ebo niile, ndị na-asụ asụsụ niile, ndị agbụrụ niile nakwa ndị mba niile ga na-achị ụwa.’ (Mkpughe 5:9, 10) Ole ka ndị ga-eso Kraịst achị dị? Ọtụtụ nde mmadụ aghọọla ndị na-eso ụzọ Jizọs kemgbe ọ bịachara n’ụwa. Ma, ọ bụ naanị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-aga eluigwe ma soro Jizọs chịa n’Alaeze Chineke. (Gụọ Mkpughe 14:1-4.) Ndị Kraịst ndị ọzọ ga-ebi n’ụwa, Alaeze ahụ ana-achị ha.—Abụ Ọma 37:29.
3. Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?
Ụfọdụ ndị ọchịchị na-agbalị ka ha rụọ ọrụ dị mma n’ọchịchị ha, ma, ike ha anaghị eru ịrụ ihe niile ha chọrọ ịrụ. Ka a na-eme ka a na-eme, ndị ọzọ anọchie ha. Ndị ahụ nọchiri ha nwere ike bụrụ ndị ọchịchị ọjọọ na-anaghị arụrụ ndị ha na-achị ọrụ. Ma, o nweghị onye ga-anọchi Eze Alaeze Chineke, bụ́ Jizọs. Chineke emeela “ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị.” (Daniel 2:44) Jizọs ga na-achị ụwa niile. Ọ gaghị na-emegbu ụfọdụ ndị, na-emenyere ndị ọzọ. Ọ hụrụ mmadụ niile n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe. Ọ na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ọ ga-akụzikwara ụmụ mmadụ ka ha na-emeso ibe ha otú yanwa si emeso ha, ya bụ, ka ha hụ ibe ha n’anya, jiri obiọma na-emeso ha ihe ma na-ekpe ikpe ziri ezi.—Gụọ Aịzaya 11:9.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere Alaeze Chineke ji kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma.
4. Alaeze Chineke ga-achị ụwa
O nweghị onye ọchịchị ike ya haruru ka nke Jizọs. Gụọnụ Matiu 28:18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ike Jizọs si kara ike mmadụ ọ bụla na-achị achị?
Ndị mmadụ na-agbanwekarị ndị na-achị ha. Onye ọchịchị nke ọ bụla na-enwekwa mpaghara ụwa ebe ọ na-achị. Olee maka Alaeze Chineke? Gụọnụ Daniel 7:14. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere o ji dị mma na ‘a gaghị ebibi’ Alaeze Chineke ebibi?
Gịnị mere o ji dị mma na ọ ga na-achị ụwa niile?
5. Alaeze Chineke ga-anọchirịrị ọchịchị ụmụ mmadụ
Olee ihe mere Alaeze Chineke ga-eji nọchie ọchịchị ụmụ mmadụ? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka ọchịchị ụmụ mmadụ kpataara anyị?
Gụọnụ Ekliziastis 8:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ì chere na Alaeze Chineke kwesịrị ịnọchi ọchịchị ndị mmadụ? Maka gịnị?
6. Ndị ọchịchị Alaeze Chineke ma otú ihe si dịrị anyị
Eze anyị, bụ́ Jizọs, nwere mgbe o biri n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-aghọtali “na anyị adịghị ike.” (Ndị Hibru 4:15) Jehova si “n’ebo niile, n’asụsụ niile, n’agbụrụ niile nakwa na mba niile” họpụta ezigbo Ndị Kraịst dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso Jizọs chịa n’Alaeze ya.—Mkpughe 5:9.
Otú a ị matara na Jizọs na ndị ga-eso ya achị ma otú ihe si dịrị ụmụ mmadụ ọ̀ na-akasi gị obi? Maka gịnị?
Jehova na-ahọpụta ụdị ndị dị iche iche, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya
7. Iwu Chineke nyere ndị Alaeze ya ga-achị ka iwu ndị mmadụ na-enye ndị ha na-achị mma
Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị kwesịrị ịbara ndị ha na-achị uru ma chebe ha. Alaeze Chineke nwekwara iwu ndị ọ na-achị kwesịrị ịna-edebe. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:9-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú i chere ụwa ga-adị ma mmadụ niile na-edebe iwu Chineke?a
Ì chere na Jehova kwesịrị ịgwa ndị Alaeze ya na-achị ka ha na-edebe iwu ndị o nyere ha? Maka gịnị?
Olee ihe gosiri na ndị na-anaghị edebe iwu ndị a nwere ike ịgbanwe?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 11.
Ndị ọchịchị na-eme iwu ndị ga-echebe ndị ha na-achị ma baara ha uru. Alaeze Chineke nwere iwu ndị ka iwu ụmụ mmadụ mere mma. Iwu ndị ahụ ga-echebe ndị Alaeze ahụ ga-achị, baakwara ha uru
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe bụ́ Alaeze Chineke.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-achị ụwa niile.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Ole ndị ga-abụ ndị eze Alaeze Chineke?
Olee otú Alaeze Chineke si kara ọchịchị ụmụ mmadụ mma?
Gịnị na gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị Alaeze ya ga-achị?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Jizọs kwuru gbasara ebe Alaeze ahụ dị.
Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji akwado Alaeze Chineke kama ịkwado ọchịchị ụmụ mmadụ?
Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, bụ́ ndị Jehova họpụtara ka ha na Jizọs chịa n’Alaeze ya.
Gịnị mere otu nwaanyị nọ mkpọrọ ji kweta na ọ bụ naanị Chineke ga-eme ka mmegbu ghara ịdị n’ụwa?
a Anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ n’ime iwu ndị ahụ ná Nkebi nke atọ n’akwụkwọ a.
-
-
Ihe Alaeze Chineke Ga-emere AnyịNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Alaeze Chineke na-achị achị ugbu a. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ọtụtụ ihe gbanwee n’ụwa. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere gị.
1. Olee otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi na ya?
Jizọs bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, bibiekwa ọchịchị ụmụ mmadụ n’agha Amagedọn. (Mkpughe 16:14, 16) N’oge ahụ, nkwa a dị na Baịbụl ga-emezuru n’isi. Baịbụl sịrị: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.” (Abụ Ọma 37:10) Jizọs ga-eji Alaeze ahụ mee ka udo dịrị ebe niile n’ụwa, a na-ekpekwa ikpe ziri ezi.—Gụọ Aịzaya 11:4.
2. Olee otú ndụ ga-adị mgbe uche Chineke ga-eme n’ụwa?
Alaeze Chineke chịwa ụwa “ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe ndị niile bi na ya bụ ndị ezi omume hụrụ ma Jehova ma mmadụ ibe ha n’anya. O nweghị onye ga-arịa ọrịa. Ha niile ga-adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
3. Olee ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị ma e bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ?
E bibicha ndị na-eme ihe ọjọọ, Jizọs ga-achị otu puku afọ. N’oge ahụ, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị ga-eso ya achị ga-eme ka ndị mmadụ zuo okè, gharakwa ịna-eme mmehie. Ná ngwụcha otu puku afọ ahụ, ụwa niile ga-abụ paradaịs mara ezigbo mma. Ndị niile bi na ya ga-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-erubere Jehova isi. Jizọs ga-enyeghachizi Nna ya, bụ́ Jehova, ọchịchị ka ọ chịrị gawa. N’oge ahụ, ‘a ga-edo aha Chineke nsọ’ otú a na-edotụbeghị ya na mbụ. (Matiu 6:9, 10) Ọ ga-edo ewu na ọkụkọ anya mgbe ahụ na Jehova bụ ezigbo onye ọchịchị, onye ihe gbasara ndị ọ na-achị na-emetụ n’obi. Jehova ga-ebibizi Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na onye ọ bụla ọzọ na-enupụrụ ya isi. (Mkpughe 20:7-10) Ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị ga-adịru mgbe ebighị ebi.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo ihe niile o kwuru na Baịbụl na ọ ga-emere anyị n’ọdịnihu.
4. Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị ụmụ mmadụ
Baịbụl kwuru na “mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.” (Ekliziastis 8:9) Jehova ga-eji Alaeze ya mee ka ọchịchị nchịgbu a kwụsị.
Gụọnụ Daniel 2:44 na 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs, ga-eme ndị ọchịchị na ndị niile na-akwado ha?
Olee otú ihe ị mụtarala gbasara Jehova na Jizọs si eme ka obi sie gị ike na ha agaghị emegbu onye ọ bụla?
5. O nweghị eze dị ka Jizọs
Jizọs, bụ́ Eze Alaeze Chineke, ga-emere ndị ọ ga na-achị n’ụwa ọtụtụ ihe ọma. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú Jizọs sirila gosi na inyere ndị mmadụ aka na-agụ ya agụụ nakwa na Chineke nyere ya ikike inyere ha aka.
Ihe ndị Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri anyị ihe ndị Alaeze Chineke ga-emere anyị. N’ihe ndị e depụtara ebe a Jizọs ga-emere anyị, olee ndị ị kacha atụ anya ịhụ mgbe ha ga-eme? Gụọnụ amaokwu Baịbụl ya na nkwa nke ọ bụla so ka unu mụtakwuo gbasara nkwa ahụ.
MGBE JIZỌS NỌ N’ỤWA, . . .
JIZỌS GA-ESI N’ELUIGWE . . .
ọ baara oké ifufe mba.—Mak 4:36-41.
mezie ihe niile ndị mmadụ mebirila n’ụwa.—Aịzaya 35:1, 2.
ọ rụrụ ọrụ ebube nye ọtụtụ puku mmadụ nri.—Matiu 14:17-21.
mee ka agụụ kwụsị n’ụwa.—Abụ Ọma 72:16.
ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa ha na-arịa.—Luk 18:35-43.
hụ na e nweghịzi onye na-arịa ọrịa.—Aịzaya 33:24.
ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ.—Luk 8:49-55.
kpọlite ndị nwụrụ anwụ, meekwa ka ọnwụ gharazie ịdị.—Mkpughe 21:3, 4.
6. Ihe Alaeze Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu magburu onwe ya
Alaeze Chineke ga-eme ka ọmarịcha ihe niile Jehova bu n’obi imere ụmụ mmadụ ruo ha aka. Ha ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ọ ga-abụ paradaịs. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ ihe ndị Jehova si n’aka Ọkpara ya na-eme iji mezuo ihe o bu n’obi.
Gụọnụ Abụ Ọma 145:16. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú obi dị gị ịmara na Jehova ga-eji “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ”?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ọ bụrụ na anyị niile agbakọọ aka na anyị ga-akwụsịli nsogbu ndị dị n’ụwa.
Olee nsogbu ndị Alaeze Chineke ga-akwụsị, ndị ọchịchị ụmụ mmadụ na-agaghị akwụsịli?
NCHỊKỌTA
Alaeze Chineke ga-eme ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ndị ga-ebikwa na ya bụ ndị ga na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee otú Alaeze Chineke ga-esi doo aha Chineke nsọ?
Olee ihe mere anyị ga-eji kwere na nkwa ndị dị na Baịbụl ga-emezu n’Alaeze Chineke?
N’ime ihe niile Alaeze Chineke ga-emere anyị, olee nke ị kacha atụ anya ya?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe Amagedọn bụ.
Chọpụta ihe ndị ga-eme n’oge Jizọs kpọrọ “oké mkpagbu.”—Matiu 24:21.
Chọpụta otú ezinụlọ nwere ike isi nọkọọ tụgharịa uche n’ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-emere ha n’ọdịnihu.
Gụọ isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Ihe Nọ Na-enye M Nsogbu n’Obi” ka ị hụ otú otu onye na-enupụburu ọchịchị isi si chọta ihe ọ na-achọ.
“Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2012)
-