Isi 19
“Agha nke Oké Ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” nke Dị Nso
1. (a) Gịnị ka mba dị iche iche ga-arụgide Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile ide n’isi nso “n’akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova,” gịnịkwa ka akwụkwọ ahụ bụ? (b) Site n’agha dị aṅaa ka akwụkwọ ahụ ga-eru ná ndezu ya dị ebube?
MBA nile, n’ikpeazụ mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịaruwo mgbe ha na-arụgide Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile idenye akụkụ ikpeazụ dị ebube “n’akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova.” (Ọnụ Ọgụgụ 21:14) Akwụkwọ nkịtị ahụ bụ ihe ndekọ nke agha ndị Jehova buuru ndị ya. Ihe àmà na-egosi na Mosis gụrụ ya. Ọ pụrụ ịbụ na ihe akwụkwọ ahụ ji malite bụ ihe ịga nke ọma Abraham nwere n’agha o buru megide ndị eze ahụ dọkpụụrụ Lọt, na-enwe Jehova dị ka onye buuru Abraham agha. (Jenesis 14:1-16, 20) Mgbe na-adịghị anya ugbu a, a ga-eji ndenye isiakwụkwọ ọhụrụ mee ka ‘akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova’ nwee njedebe dị ebube—akụkọ mmeri ya kasị dịrị ebube. Nke ahụ ga-abụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” n’Amagedọn, nke ikpeazụ n’ihe banyere usoro ihe nke a. (Mkpughe 16:14, 16) “Akwụkwọ” ahụ dum ga-egosi na e meribeghị Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile n’ọgụ, ma ọ bụ n’ibu agha mgbe ọ bụla.
2, 3. (a) Kemgbe mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst, gịnị bụworo eziokwu n’ihe banyere Jehova ibu “agha”? (b) Gịnị ga-akpali Jehova iburu ndị ohu ya agha n’oge anyị?
2 N’ezie, site ná mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst ruo ugbu a, Jehova ejiwo ihe ndị ọzọ na-abụghị agha chebe ndị ya. Ọ dịbeghị mgbe Jehova buuru ndị Kraịst bụ́ ndịàmà ya agha dị ka o meere Israel n’okpuru Iwu Mosis. Ma oge ga-abịa n’ọdịnihu dị nso mgbe ọ ga-esite n’ụzọ nke ibu agha lụọ ọgụ maka ndị ohu ya nke oge a raara ndụ ha nye ya. Gịnị ga-akpali agha ahụ n’Amagedọn?
3 Tupu ntiwapụ nke agha Chineke, a ga-ebibiworị Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Setan bụ Ekwensu na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ na-enweghị mmasị n’okpukpe, bụ́ ndị bibiri Babilọn Ukwu ahụ ga-akpọ eziokwu ahụ bụ́ na Ndịàmà Jehova ga-abụ nanị òtù okpukpe ga-alanarị asị. Ndị ọchịchị ụwa agaghị eruteworị ihe mgbaru ọsọ ha nke inweta ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. Ya mere, ugbu a, ha ga-aga n’ihu ná mwakwasị ahụ kasịnụ megide ndị na-efe Jehova, onye ha gọnarịrị ma lelịa ọkaaka eluigwe na ala ya! Otú a ha ga na-alụ ọgụ n’ezie megide Chineke.—Mkpughe 17:14, 16; tụlee Ọrụ 5:39.
“Jehova nke Usuu Nile nke Ndị Agha” Amaliteghachi Ọrụ Agha
4. (a) Olee otú Jehova ga-esi meghachi omume n’ihe banyere mbuso agha nke Gọg? (b) Gịnị ka mmeghachi omume ahụ ga-egosipụta n’ikwekọ n’aha ahụ bụ “Jehova nke usuu nile nke ndị agha”?
4 Setan bụ Ekwensu, bụ́ Gọg nke Megọg ihe atụ, ga-eme atụmatụ mwakwasị nke a megide ndị Jehova. Mgbe Gọg ga-eji ìgwè mmadụ ya nke na-ekweghị na Chineke mee ihe ịwakwasị ndị Jehova, ịkwakọrọ ihe onwunwe ha na ibibi ha, Jehova ga-azọbata ụkwụ ma buoro ndị ya agha, dị ka e buru n’amụma n’Ezikiel 38:2, 12, 18-20. E bukwara amụma banyere mmeghachi omume Jehova na Zekaraịa 14:3: “Jehova ga-apụkwa, buso mba ahụ nile agha, dị ka n’ụbọchị o buru agha n’ụbọchị ịlụ ọgụ.” N’ụzọ a Chineke nke Bible ga-enye mba nile nke oge a ihe àmà na ya kabụ Chineke nke Na-ebu Agha, dị nnọọ ka ọ bụ n’ụbọchị nke Israel oge ochie, mgbe a kọwara ya dị ka “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” 260 ugbo, dị ka e dekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Abụ Ọma 24:10; 84:12.
5, 6. (a) Agha dị aṅaa na-etiwapụ ugbu a, ònye kwa na-eduru ndị agha nke eluigwe banye n’ọgbọ agha? (b) Akụkọ dị aṅaa ka Jọn onyeozi na-akọ banyere ndị agha nke eluigwe ịbanye n’ọgbọ agha?
5 Mgbe “oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” rutere, ọ ga-abụ oge maka “agha” ahụ nke ga-aka ụbọchị ahụ akara. Jehova ga-enye Ọchịagha ya Kasịnụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ihe ịrịba ama. N’aha Jehova, ya na ndị agha nke eluigwe nke ìgwè ndị mmụọ ozi mejupụtara ga-awụbanye n’ibu agha, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’elu ịnyịnya agha. (Jud 14, 15) Dị ka onye na-akọ ihe na-eme n’agha, Jọn onyeozi na-enye anyị akụkọ mmeri ntipịa ahụ tupu o mee, nke Ọchịagha Kasịnụ nke Jehova ga-enwe ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’:
6 “M wee hụ eluigwe ka o ghewooro oghe; ma lee, ịnyịnya ọcha dị, na onye na-anọkwasị ya, bụ́ onye a na-akpọ Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Onye Eziokwu; ọ bụkwa n’ezi omume ka ọ na-ekpe ikpe, na-ebukwa agha. Anya ya abụọ bụrụkwa ire ọkụ, ọ na-ekpukwa ọtụtụ okpueze n’isi ya . . . Usuu nile nke ndị agha ndị dị n’eluigwe wee soo ya n’elu ịnyịnya ọcha, na-eyi ezi ákwà ọcha, nke dị ọcha na-enwukwa enwu. Mma agha dị nkọ na-esikwa n’ọnụ ya pụta, ka o wee were ya tigbuo mba nile: ya onwe ya ga-ewerekwa mkpanaka nke ígwè zụọ ha dị ka atụrụ: ya onwe ya na-azọkwa ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. O nwekwara aha e dekwasịworo n’elu uwe ya na n’elu apata ụkwụ ya, Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile.”—Mkpughe 19:11-16.
7. Gịnị ka ịzọ ebe nzọcha mkpụrụ vine ihe atụ ahụ nke ọnụma Chineke bụ ihe atụ ya nye mba dị iche iche?
7 Eze Ọchịagha Kasịnụ ahụ, Jisọs Kraịst, na-edu ndị agha nke eluigwe na njem agha nke na-eduga ná mmeri megide ndị iro nile jikọtara onwe ha ọnụ n’Amagedọn. Ọ na-eme ka ọgbọ agha ahụ bụrụ ebe nzọcha mkpụrụ vine buru ibu! Ebe Eze kachasị ndị eze nile “na-azọkwa ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” nke a bụ ihe àmà na-egosi na a ga-etipịa mba nile kpam kpam. A ga-awụba ha dị ka mkpụrụ vine chara acha n’ime oké “ebe nzọcha mkpụrụ vine” ahụ ebe “ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” ga-adakwasị ha, na-eme ka e tipịa ha. Ndị agha nke eluigwe ga-esonye n’ịzọ “ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke.”—Mkpughe 14:18-20.
8. Olee otú Jehova si kọwaa ụzọ akọ ya dị iche iche nke o ji ebu agha?
8 Ndịàmà Jehova n’elu ala agaghị ebuli “mma agha” megide ìgwè ahụ dị ukwuu nke Gọg, kama ọ bụ Jehova. Nke a bụ agha ya! Ugbu a kwa n’ikpeazụ, mba nile nke ụwa nke a nweworo ọganihu nkà mmụta sayensị ga-ahụ ya n’agha! Gee ntị ka ọ na-akọwa ụzọ akọ ndị ọ ga-eji mee ihe n’agha: “M ga-akpọkwa mma agha ka ọ dakwasị ya [Gọg] n’ugwu m nile, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta): mma agha onye ọ bụla ga na-emegide nwanne ya. Mụ na ya ga-ekpekwa ikpe n’ajọ ọrịa na-efe efe na n’ọbara; ọ bụkwa oké mmiri ozuzo na-ezobiga ókè, na oké akụ́ mmiri igwe, na ọkụ, na brimstone, ka m ga-eme ka ha zokwasị ya, zokwasịkwa usuu nile nke ndị agha ya, zokwasịkwa ọtụtụ ndị dị iche iche so ya. M ga-emekwa onwe m ka m dị ukwuu, m ga-edokwa onwe m nsọ, mee ka a mara mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezikiel 38:21-23.
E Jiri Ngwá Agha Dị Iche Iche nke Chineke Mee Ihe Megide Ndị Iro
9. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ngwá agha e ji ebu agha bụ́ ndị Jehova ga-eji mee ihe megide ndị iro ya?
9 Dị ka ngwá agha ibu agha, Jehova ga-eji ike nke okike mee ihe: idei mmiri nke oké mmiri ozuzo, akụ́ mmiri igwe nke ibu ha ga-egbuli mmadụ, ozuzo nke àmụ̀mà ọkụ na brimstone, mmiri na-asọlite n’ike site n’ime ala, àmụ̀mà mmiri ndị na-adasi ụda ike. Ná mgbukepụ nke ihe Chineke ji egbu ndị iro ya, ìhè ya ga-adị oké ike n’ehihie na n’abalị nke na anyanwụ nkịtị na ọnwa ga-adị ka ọ bụ na ha adịkwaghị mkpa ọzọ maka inye ìhè. Ọ ga-adị ka à ga-asị na ha kwụ otu ebe, na-akwụsị ịrụ ọrụ dị ka ihe ndị na-enye ìhè kama na-enye akụ́ ụta ndị na-enwu ọkụ nke Jehova ohere igosipụta ike nke inye ìhè ha. (Habakuk 3:10, 11) Jehova nwere ihe ndị dị n’okike n’ụba, ndị ọ ga-eji buo agha.—Joshua 10:11; Job 38:22, 23, 29.
10. Dị ka Zekaraịa 14:12 si kwuo, gịnị ọzọ ka Jehova ga-eji mee ihe “n’ụbọchị ịlụ ọgụ” ahụ nke na-abịa?
10 “N’ụbọchị ịlụ ọgụ” ahụ na-abịa, Jehova ga-ejikwa ọrịa na-efe efe na “ihe otiti” mee ihe. Onye amụma bụ́ Zekaraịa dere banyere nke a, sị: “Nke a ga-abụkwa ihe otiti nke Jehova ga-eji tie ndị nile dị iche iche ndị busoworo Jerusalem agha: anụ ahụ ha nile n’otu n’otu ga-atasị ata mgbe ha onwe ha na-eguzo n’ụkwụ ha, anya ha ga-atasịkwa ata n’oghere ha, ire ha ga-atasịkwa ata n’ọnụ ha.”—Zekaraịa 14:12.
11. Gịnị ga-eme mgbe “ihe otiti” ahụ dakwasịrị ndị agha ahụ na-awakwasị ndị Jehova?
11 Ma “ihe otiti” ahụ ọ̀ ga-abụ n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ na ọ gaghị abụ, ọ ga-emechi ọnụ nile mepere emepe ikwu okwu iyi egwu nke na-eme ka a tụọ egwu! Ire ga-atakọsịkwa atakọsị! Ike ịhụ ụzọ ga-akwụsị, nke na ndị mwakwasị ahụ anya ha na-enwu ka ọkụ ga na-eti ihe ka ndị ìsì. Anya ga-atakpọsị! Uru anụ ahụ nke ndị agha ahụ dị ike ga-atụfu ike ha ka ha na-eguzo n’ụkwụ ha—ọ bụghị mgbe ha na-atọgbọ n’ala dị ka ozu. Anụ ahụ nke na-ekpuchi ọkpụkpụ ha ga-atakpọsị!—Tụlee Habakuk 3:5.
12. Olee otú “ihe otiti” ahụ ga-esi metụta ogige agha na ngwá agha dị iche iche nke ndị iro ahụ?
12 “Ihe otiti” ahụ ga-ada na mberede n’ogige agha ha. A ga-eme ka ụgbọ ala ndị ha ji ebu agha ghara ịgbakwa! (Zekaraịa 14:15; tụlee Ọpụpụ 14:24, 25.) Otú ngwá agha ha ga-esi bụrụ nke na-abaghị n’ihe ka e gosiri n’okwu ndị ahụ nke Zekaraịa 14:6: “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na ìhè agaghị adị, ìhè na-enwu enwu ga-agbachi.” Ìhè si n’eluigwe nke ihu ọma Chineke agaghị amụkwasị ha. Ìhè mmadụ mere nke sayensị ọgbara ọhụrụ agaghị ewepụ ọchịchịrị nke enweghị ihu ọma Chineke. A ga-eme ka ihe nile e ji ebu agha ghara ịrụ ọrụ, dị ka à ga-asị na oyi emewo ka ha kpọọ nkụ—kpụkọta ọnụ.
13. Gịnị ga-atụkwasị ihe n’ihe egwu ahụ nke Jehova ga-akpali n’etiti ndị mwakwasị ahụ?
13 Ihe a nile zuru ezu ịtụ egwu! Ma ihe na-atụkwasị ihe n’ihe iyi egwu ahụ bụ ọgba aghara Chineke ga-akpali n’etiti ndị ahụ na-eme mwakwasị. A ga-emebi ịdị n’otu ha megide Ndịàmà Jehova. Dị ka ndị na-alụrịta ọgụ iji mee ihe ọchị, bụ́ ndị kpu okpu na-eme ka a ghara ịhụ ụzọ n’ọgbọ egwuregwu ndị Rom, ha ga-etirịta ibe ha ihe n’ahụghị ụzọ. Ọgba aghara ahụ na-eweta ọnwụ ga-agbasazu ebe nile ka ha na-egburịta onwe ha.—Zekaraịa 14:13.
14. (a) Ókè hà aṅaa ka ndị a ga-egbu ga-eburu n’ibu n’oge ahụ, oleekwa otú nnụnụ na anụ ọhịa dị iche iche ga-esi kere òkè n’uru nke mmeri Jehova? (b) Àgwà dị aṅaa ka ndị lanarịrịnụ ga-enwe n’ebe “ndị Jehova gburu” nọ?
14 Igbu mmadụ n’ìgwè n’ụbọchị ahụ kasị ụbọchị nile ga-adị ukwuu, n’ihi na ìgwè ndị agha ga-anọ n’akụkụ Gọg n’ọgbọ agha ahụ ga-adị ukwuu. (Mkpughe 19:19-21) Nke ahụ ga-abụ n’ezie esemokwu zuru ụwa, n’ihi na ọ dịghị akụkụ nke ụwa ga-agbanarị mbibi ahụ. Ọzọkwa, a gaghị eli ndị e gburu n’Amagedọn n’ili ndị nwere akara a ga-eji cheta ha. Ụdị nnụnụ ọ bụla na anụ ọhịa ga-ekere òkè n’uru mmeri Chineke, n’otu oge ahụkwa, nye aka n’ime ka ụwa dị ọcha pụọ n’ọtụtụ ozu ga-aghasasị ebe nile n’elu ala dị ka nri ihe ọkụkụ, a gaghị akwara ha ákwá, a gaghị eli ha, ha ga-abụ ihe a na-asọ oyi nye ndị lanarịrịnụ. (Ezikiel 39:1-5, 17-20; Mkpughe 19:17, 18) “Ndị Jehova gburu” ga-enwetawororịị onwe ha ọnọdụ e wedara n’ala ruo mgbe ebighị ebi.—Jeremaịa 25:32, 33; Aịsaịa 66:23, 24.
E Mee Ka Aha Jehova Maa Mma
15. Ihe omume dị aṅaa nke pụtara ìhè ka a ga-emezuworị mgbe ahụ, mmetụta dịkwa aṅaa ka ọ ga-enwe n’aha Jehova?
15 Otú a, “Jehova nke usuu nile nke ndị agha” site n’aka Ọchịagha ya Kasịnụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-enwetara onwe ya otuto ebighị ebi. Mgbe ahụ a ga-emezuworị ihe omume kasị ukwuu nke akụkọ ihe mere eme nke eluigwe na ụwa—iwepụ ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova n’ụta na ido aha nsọ ya nsọ. (Ezikiel 38:23; 39:6, 7) Jehova ga-emere onwe ya aha karịrị ihe ọ bụla a kọwara “n’akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova” na n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru nke Bible Nsọ. (Tụlee Aịsaịa 63:12-14.) Lee ụdị aha mara mma Jehova ga-emere onwe ya site ná mmeri ya dị ebube ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’! N’ụzọ obi ụtọ ndị nile hụrụ aha ahụ n’anya ga-etozi ya ruo mgbe ebighị ebi, na-abụ abụ otuto ya!
16. N’ihi “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” bụ́ nke dị nso, ekpere dị aṅaa ka a na-ekpe n’ihi “oké ìgwè mmadụ” ahụ?
16 Mgbe ahụ, gaa n’ihu banye n’ọgbọ agha ahụ, Oo Jehova nke usuu nile nke ndị agha, gị na eze Ọkpara gị bụ Jisọs Kraịst nọ n’akụkụ gị! (Abụ Ọma 110:5, 6) Kwee ka ndị àmà gị kwesịrị ntụkwasị obi n’elu ala jiri ite egwú ọṅụ hụrụ mmeri gị na-enweghị atụ site n’aka Eze gị bụ Jisọs Kraịst ‘n’agha oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.’ Kwee ka “oké ìgwè mmadụ” ahụ jiri ọṅụ ‘si n’oké mkpagbu ahụ pụta’ ịbụ ndị àmà gị nke elu ụwa ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 7:14) N’okpuru nlekọta ịhụnanya gị, kwee ka ha lanarị banye n’Ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ nke agha na-adịghị na ya, nke “Onyeisi Udo” gị ahụ na-enwe mmeri. Kwee ka ha bụụrụ ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilite ihe àmà a na-ahụ anya nke iwepụ ọkaaka ahụ ruuru gị n’ụta, n’eluigwe na n’ala nile. Ekele dịrị gị maka ide akụkụ ikpeazụ ahụ dị ebube nke ‘akwụkwọ agha dị iche iche nke Jehova.’ Ruo mgbe nile ebighị ebi, kwee ka ihe ndekọ nke a nke mmeri gị na-enweghị atụ dịgide n’ihe ndekọ nke akụkọ ihe mere eme nke eluigwe na ala!
[Foto dị na peeji nke 156, 157]
“Jehova nke usuu nile nke ndị agha” ga-alụ agha megide mba nile