ISI NKE 43
Olee Ndị Bụ Ụmụnne Anyị?
N’OTU oge, Onye Ozizi Ukwu ahụ jụrụ otu ajụjụ na-eju anya. Ọ jụrụ, sị: “Ònye bụ nne m, olee ndị bụkwa ụmụnne m ndị ikom?” (Matiu 12:48) Ị̀ ga-azali ajụjụ ahụ?— Ikekwe, ị ma na aha nne Jizọs bụ Meri. Ma, ị̀ ma aha ụmụnne ya ndị nwoke?— Ò nwekwara ụmụnne ndị nwanyị?—
Bible kwuru na aha ụmụnne Jizọs ndị nwoke bụ “Jems na Josef na Saịmọn na Judas.” Jizọs nwekwara ụmụnne ndị nwanyị ndị dị ndụ mgbe ọ nọ na-eme nkwusa. Ebe Jizọs bụ nwa mbụ, ọ bụ ya tọrọ ha nile.—Matiu 13:55, 56; Luk 1:34, 35.
Ụmụnne Jizọs ndị nwoke hà bụkwa ndị na-eso ụzọ ya?— Bible na-ekwu na ná mmalite ha “adịghị egosipụta okwukwe na ya.” (Jọn 7:5) Otú ọ dị, ka oge na-aga, Jems na Judas (onye a na-akpọkwa Jud) ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya, ha dekwara ọbụna ụfọdụ akwụkwọ n’ime Bible. Ị̀ ma akwụkwọ ndị ha dere?— Ee, ọ bụ akwụkwọ Jems na Jud.
Ọ bụ ezie na a kpọghị aha ụmụnne Jizọs ndị nwanyị n’ime Bible, anyị ma na o nwere ụmụnne ndị nwanyị abụọ ma ọ dịkarịa ala. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ha karịrị abụọ. Ụmụnne ya ndị nwanyị ndị a hà ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya?— Bible agwaghị anyị, ya mere anyị amaghị. Ma, ị̀ ma ihe mere Jizọs ji jụọ ajụjụ ahụ bụ́, “Ònye bụ nne m, olee ndị bụkwa ụmụnne m ndị ikom?”— Ka anyị lee.
Jizọs anọwo na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ihe mgbe otu onye napụrụ ya okwu n’ọnụ wee, sị: “Nne gị na ụmụnne gị ndị ikom guzo n’èzí, na-achọ ịgwa gị okwu.” Ya mere, Jizọs ji ohere ahụ kụziere ha otu ihe mmụta dị mkpa site n’ịjụ ajụjụ ahụ na-eju anya: “Ònye bụ nne m, olee ndị bụkwa ụmụnne m ndị ikom?” Ọ gbatịrị aka ya n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ wee zaa ya, kwuo n’olu dara ụda, sị: “Lee! Nne m na ụmụnne m ndị ikom!”
Mgbe ahụ Jizọs kọwara ihe o bu n’uche, na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, nakwa nwanne m nwanyị, nakwa nne m.” (Matiu 12:47-50) Nke a na-egosi mmetụta ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ. Ọ na-akụziri anyị na ndị na-eso ụzọ ya dị ka ezigbo ụmụnne na nne nye ya.
Ole ndị ka Jizọs sị na ọ bụ ha bụ ụmụnne ya?
N’oge ahụ ụmụnne Jizọs ndị nwoke—Jems, Josef, Saịmọn, na Judas—ekweghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. Ọ ga-abụrịrị na ha ekwetaghị ihe mmụọ ozi Gebriel gwara nne ha. (Luk 1:30-33) Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na ha mesoro Jizọs mmeso ọjọọ. Onye ọ bụla nke na-eme otú ahụ abụghị ezigbo nwanne. Ọ̀ dị onye ọ bụla ị ma mesoworo nwanne ya mmeso ọjọọ?—
Bible na-akọrọ anyị banyere Ịsọ na Jekọb na otú Ịsọ si wee nnukwu iwe nke na ọ sịrị: ‘M ga-egbu Jekọb nwanne m.’ Egwu tụrụ nne ha, bụ́ Rebeka, nke ukwuu nke na o zipụrụ Jekọb ka Ịsọ ghara igbu ya. (Jenesis 27:41-46) Otú ọ dị, ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị Ịsọ gbanwere, ọ makụkwara Jekọb ma sutụ ya ọnụ.—Jenesis 33:4.
Ka oge na-aga, Jekọb mụtara ụmụ nwoke 12. Ma ụmụ Jekọb ndị nwoke, ndị mere okenye karị, ahụghị nwanne ha nke nta bụ́ Josef n’anya. Ha kwosoro ya ekworo n’ihi na ọ bụ nwa nke nna ha kasị hụ n’anya. Ya mere, ha resịrị ya ndị na-azụ ahịa ohu, bụ́ ndị nọ na-aga Ijipt. Ha gwaziri nna ha na anụ ọhịa egbuola Josef. (Jenesis 37:23-36) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe jọgburu onwe ya?—
Mgbe oge na-aga, ihe ụmụnne Josef mere wutere ha. Ya mere, Josef gbaghaara ha. Ị̀ hụrụ otú Josef si yie Jizọs?— Ndịozi Jizọs gbahapụrụ ya mgbe ọ nọ ná nsogbu, ọbụna Pita gọrọ na ya amaghị onye ọ bụ. N’agbanyeghị nke ahụ, dị ka Josef, Jizọs gbaghaara ha nile.
Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta site n’ihe Ken mere Ebel?
Ọzọkwa, e nwere ụmụnne abụọ bụ́ Ken na Ebel. Anyị pụkwara isi na ha mụta ihe. Chineke hụrụ n’ime obi Ken na ọ hụghị nwanne ya nwoke n’anya n’ezie. Ya mere, Chineke gwara Ken na o kwesịrị ịgbanwe omume ya. A sị na Ken hụrụ Chineke anya n’ezie, ọ gaara aṅa ntị. Ma, ọ hụghị Chineke n’anya. Otu ụbọchị Ken sịrị Ebel: “Ka anyị jee n’ọhịa.” Ebel sooro Ken jewe. Mgbe nanị ha nọ n’ime ọhịa, Ken kụsiri nwanne ya nwoke ihe ike nke na o gburu ya.—Jenesis 4:2-8.
Bible na-agwa anyị na e nwere otu ihe pụrụ iche anyị kwesịrị ịmụta na nke ahụ. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— ‘Nke a bụ ozi ahụ unu nụworo site ná mmalite: Anyị kwesịrị inwe ịhụnanya maka ibe anyị; ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ.’ Ya mere ndị bụ́ ụmụnne kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya. Ha ekwesịghị ịdị ka Ken.—1 Jọn 3:11, 12.
Gịnị mere na ọ dịghị mma ịdị ka Ken?— Ọ bụ n’ihi na Bible na-ekwu na o ‘si n’ajọ onye ahụ,’ bụ́ Setan bụ́ Ekwensu. Ebe Ken mere omume ka Ekwensu, ọ dị nnọọ ka a ga-asị na ọ bụ Ekwensu bụ nna ya.
Ị̀ hụla ihe mere o ji dị mkpa ịhụ ụmụnne gị n’anya?— Ọ bụrụ na ị hụghị ha n’anya, ụmụ ònye ka ị na-eṅomi?— Ọ bụ ụmụ Ekwensu. Ị gaghị achọ ịbụ nwa Ekwensu, ka ị̀ ga-achọ?— Ya mere, olee otú ị pụrụ isi gosipụta na ị chọrọ ịbụ nwa Chineke?— Ọ bụ site n’ịhụ ụmụnne gị n’anya n’ezie.
Ma gịnị bụ ịhụnanya?— Ịhụnanya bụ mmetụta miri emi nke dị n’ime anyị bụ́ nke na-eme ka anyị chọọ imere ndị ọzọ ihe ọma. Anyị na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya mgbe obi dị anyị mma n’ebe ha nọ na mgbe anyị na-emere ha ihe ọma. Olee ndị bụkwa ụmụnne anyị ndị anyị kwesịrị ịhụ n’anya?— Cheta, Jizọs kụziri na ọ bụ ndị mejupụtara ezinụlọ ahụ buru ibu nke Ndị Kraịst.
Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị hụrụ nwanne gị n’anya?
Olee otú ọ dịruru mkpa ka anyị hụ ụmụnna anyị ndị a bụ́ Ndị Kraịst n’anya?— Bible na-ekwu, sị: “Onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, apụghị ịdị na-ahụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụbeghị.” (1 Jọn 4:20) Ya mere, anyị apụghị ịhụ nanị mmadụ ole na ole n’ime ezinụlọ Ndị Kraịst n’anya. Anyị aghaghị ịhụ ha nile n’anya. Jizọs sịrị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Ị̀ hụrụ ụmụnna nile n’anya?— Cheta na ọ bụrụ na ị hụghị ha n’anya, ị pụghị ịhụ Chineke n’anya n’ezie.
Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’ezie?— Ọ bụrụ na anyị hụrụ ha n’anya, anyị agaghị adị na-ezere ha n’ihi na anyị achọghị ka anyị na ha kwurịta okwu. Anyị ga na-emeso ha nile dị ka ndị enyi anyị. Anyị ga na-emere ha ihe ọma mgbe nile ma dị njikere isoro ha na-ekerịta ihe. Ọ bụrụkwa na ha enwee nsogbu mgbe ọ bụla, anyị ga-enyere ha aka n’ihi na anyị bụ n’ezie otu nnukwute ezinụlọ.
Mgbe anyị hụrụ ụmụnna anyị nile n’anya n’ezie, gịnị ka ọ na-egosi?— Ọ na-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ. Ọ́ bụghị ya bụ ihe anyị chọrọ ịbụ?—
E kwukwara banyere igosi ụmụnna anyị ịhụnanya ná Ndị Galeshia 6:10 nakwa na 1 Jọn 4:8, 21. Gịnị ma ị sapeta Bible gị gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a?