Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • “Ọ Bụ Jehova Bụ́ Chineke Gị Ka I Kwesịrị Ife Ofufe”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • “Daa n’Ala Fee M Ofufe”

      8. N’ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Jizọs, olee otú o si gosi ihe ọ chọrọ?

      8 Gụọ Matiu 4:8-11. N’ọnwụnwa nke atọ Setan nwara Jizọs, o kwuru hoo haa ihe ọ chọrọ, kama ịgbawa okwu gburugburu. Setan gosiri Jizọs “alaeze niile nke ụwa na ebube ha” (o nwere ike ịbụ n’ọhụụ). Ma, o gosighị ya ihe ndị na-adịghị mma na ya. Ọ sịziri Jizọs: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.”b Ihe Setan chọrọ bụ ofufe. Ọ chọrọ ka Jizọs hapụ Nna ya werezie yanwa bụ́ Setan ka chi ya. Ihe Setan chọrọ inye Jizọs yiri ihe ga-eme ka ihe dịrị Jizọs mfe. Ihe ọ na-ekwu bụ na ya ga-enye Jizọs ikike niile na akụnụba niile dị n’ụwa nakwa na Jizọs agaghị ata ahụhụ ọ bụla. A gaghị ekpuwe ya okpu ogwu, a gaghị apịa ya ụtarị, a gaghịkwa akpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ. Ọ bụghị egwuregwu ka Setan na-egwu. Jizọs makwa na ọ bụ Setan ka ọchịchị niile dị n’ụwa dị n’aka. (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) N’eziokwu, Setan ga-achọ inye Jizọs ihe ọ bụla ga-emeli ka Jizọs hapụ ife Nna ya ezigbo ofufe.

      Ebe otu ezinụlọ na-enwe ofufe ezinụlọ.

      IGBE 1A: Gịnị Bụ Ofufe?

      9. (a) Gịnị ka Setan chọrọ ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe mee? Oleekwa otú o si anwa anyị? (b) Gịnị na gịnị bụ ofufe? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Gịnị Bụ Ofufe?”)

      9 Taa, Setan chọkwara ka anyị fewe ya, ma ànyị ma ụma na-efe ya ma ọ̀ bụ na anyị amaghị ụma. Ebe ọ bụ “chi nke oge a,” ọ bụ ya ka ofufe ndị nọ n’okpukpe niile so na Babịlọn Ukwu ahụ na-agara. (2 Kọr. 4:4) Ma ofufe ọtụtụ ijeri mmadụ ndị na-ekpe okpukpe ụgha na-efe ya ezurughị ya. Ọ chọrọ ka ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe nupụrụ Chineke isi. Ọ na-anwa anyị ka anyị chụwa akụnụba, bụrụkwa ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ụwa kama ịgbawa mbọ ka anyị na-ebi ndụ otú Ndị Kraịst kwesịrị ibi, nke nwere ike ime ka anyị ‘taa ahụhụ n’ihi na anyị na-eme ihe dị mma.’ (1 Pita 3:14) Ọ bụrụ na Setan anwata anyị, anyị ahapụ ife Chineke ezigbo ofufe sorozie ụwa Setan, ọ pụtara na anyị na-akpọrọ Setan isiala, na-efe ya ma jiri ya mere chi. Olee otú anyị ga-esi merie ụdị ọnwụnwa a?

      10. Gịnị ka Jizọs mere mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa nke atọ? Gịnị mere o ji mee otú ahụ?

      10 Legodị ihe Jizọs mere mgbe Setan nwara ya ọnwụnwa nke atọ. Jizọs gosiri na ya jisiri Jehova aka ike. Ọ chụpụrụ Onye ọnwụnwa ahụ ozugbo, sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan!” Jizọs meziri ihe o meburu n’ọnwụnwa nke mbụ na nke abụọ. O kwuru ihe dị n’akwụkwọ Diuterọnọmi, n’ebe aha Chineke gbara. Ọ sịrị: “E dere, sị: ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi.’” (Mat. 4:10; Diut. 6:13) Jizọs si otú a gosi na ya achọghị ịbụ onye ukwu n’ụwa a, nke ọ na-agaghịkwanụ abụ ogologo oge, n’agbanyeghị na ọ gaara eme ka ọ ghara ịta ahụhụ o mechara taa. Ọ ghọtara na ọ bụ naanị Nna ya ka e kwesịrị ife ofufe, ghọtakwa na ọ bụrụgodị na ya efee Setan naanị otu ugboro, ọ pụtara na ọ bụzi Setan ka ọ na-erubere isi. Jizọs kpebisiri ike na ya agaghị eme Onye ọnwụnwa ahụ chi ya. Ebe ọ bụ na Jizọs emeghị ihe Ekwensu chọrọ, ‘Ekwensu hapụrụ ya.’c

      Foto dị iche iche: Ebe Jizọs na-emeri ọnwụnwa. 1. Ebe Jizọs nọ ọdụ n’ala ịkpa Judia bụ́ okwute okwute na-atụgharị uche. 2. Ebe Jizọs guzo n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ. 3. Ebe Jizọs ji obi ike kwuo, sị, ‘Si ebe a pụọ, Setan!’

      “SI EBE A PỤỌ, SETAN!” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

      11. Olee otú anyị nwere ike isi merie Setan na ọnwụnwa ya?

      11 Ọ bụ anyị ga-ekpebi ma ànyị ga-emeri ọnwụnwa ụwa ọjọọ Setan na-anwa anyị, otú Jizọs mere. Jehova nyere anyị onyinye magburu onwe ya, ya bụ, ikike ikpebiri onwe anyị ihe anyị chọrọ ime. N’ihi ya, e nweghị onye nwere ike ịmanye anyị ka anyị kwụsị ife Chineke ezigbo ofufe. Onye ọnwụnwa ahụ enweghịdị ike ịmanye anyị, n’agbanyeghị na ọ bụ mmụọ na-akpa ike. Ọ bụrụ na anyị ‘alụsosie Setan ọgụ ike, siekwa ike n’okwukwe,’ ihe anyị na-asị ya bụ: “Si ebe a pụọ, Setan!” (1 Pita 5:9) Cheta na mgbe Setan hapụrụ Jizọs bụ mgbe Jizọs jirila obi ike gosi na ya achọghị ya. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Na-alụsonụ Ekwensu ọgụ. Ọ ga-esikwa ebe unu nọ gbapụ.”—Jems 4:7.

      Foto dị iche iche: Imeri ọnwụnwa. 1. Ebe otu nwanna nwaanyị na-edozi otu ọnụ ụlọ na họtel, ya ahụ ọla ndị nọrọ n’ọnụ ụlọ ahụ chefuru. 2. Ebe otu nwanna nwoke nọ n’ụlọ akwụkwọ hapụrụ ụmụ agbọghọ abụọ na-akpịnyere ya anya gawara onwe ya. 3. Ebe otu nwanna nwoke jụrụ isonyere ndị enyi ya mbụ na-akpọ ya ka ọ bịa soro ha ṅụọ mmanya na sịga ma gbaa chaa chaa.

      Ọ bụ anyị ka ọ dị n’aka ikpebi ma ànyị ga-emeri ọnwụnwa ụwa ọjọọ Setan na-anwa anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11, 19)

      Onye Iro nke Na-achọghị Ka E Fee Chineke Ezigbo Ofufe

      12. Olee otú Setan si gosi n’Iden na ọ bụ ya bụ onye iro na-achọghị ka e fee Chineke ezigbo ofufe?

      12 Ọnwụnwa ikpeazụ Setan nwara Jizọs gosiri na ọ bụ ya bụ onye iro mbụ na-achọghị ka e fee Chineke ezigbo ofufe. Ọtụtụ puku afọ gara aga, Setan nọ n’ogige Iden gosi nke mbụ ya na ofufe a na-efe Jehova adịghị ya mma n’obi. N’ihi ya, o duhiere Iv, Iv emezie ka Adam nupụrụ Jehova isi. Setan si otú a chịwazie ha ma na-agwa ha ihe ha na-eme. (Gụọ Jenesis 3:1-5; 2 Kọr. 11:3; Mkpu. 12:9) N’eziokwu, Setan ghọrọ chi ha, ha abụrụ ndị na-efe ya, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ha amachaghị onye na-eduhie ha. Mgbe Setan mere ka e nupụrụ Chineke isi, ihe o mere abụghị naanị ịma ọchịchị Chineke aka ma ọ bụ ikwu na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịchị, ọ gbakwara ofufe Chineke mgba okpuru. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ?

  • “Ọ Bụ Jehova Bụ́ Chineke Gị Ka I Kwesịrị Ife Ofufe”
    A Maliteghachila Ife Jehova Ezigbo Ofufe
    • b Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru gbasara ihe ahụ Setan kwuru, sị: ‘E ji ọnwụnwa mbụ ahụ a nwara Adam na Iv ma nwata ha mata onye ha ga-ahọrọ ime uche ya. Ọ̀ ga-abụ Setan ka ọ̀ ga-abụ Chineke? Onye ọ bụla e mere uche ya, e feela ya ofufe. N’eziokwu, Setan mere onwe ya chi nke ga-anọchi onye naanị ya bụ Chineke.’

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya