N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nọrọ Na Nche Megide Ikpere Arụsị?
“Ụmụntakịrị m, cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.”—1 JỌN 5:21.
1. N’ihi gịnị ka ofufe nke Jehova ji ghara ịbụ ikpere arụsị?
JEHOVA abụghị arụsị ígwè, osisi, ma ọ bụ nkume. A pụghị idebe ya n’ụlọ nsọ elu ala. Ebe ọ bụ Mmụọ pụrụ ime ihe nile, nke ụmụ mmadụ na-apụghị ịhụ anya, ọ gaghị ekwe omume ime onyinyo ya. Ya mere, ofufe dị ọcha nke Jehova aghaghị ịbụ nke ikpere arụsị na-adịghị ma ọlị.—Ọpụpụ 33:20; Ọrụ 17:24; 2 Ndị Kọrint 3:17.
2. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka o kwesịrị ka anyị tụlee?
2 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-efe Jehova, mgbe ahụ, ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Gịnị bụ ikpere arụsị? Olee ụzọ ndị ohu Jehova siworo nwee ike izere ya n’oge gara aga? N’ihi gịnịkwa ka a ga-eji nọrọ na nche megide ikpere arụsị n’oge a?’
Ihe Bụ Ikpere Arụsị
3, 4. Olee ụzọ a pụrụ isi kọwaa ikpere arụsị?
3 N’ozuzu ya, ikpere arụsị metụtara ememe ma ọ bụ ịgọ mmụọ. Ikpere arụsị bụ nsọpụrụ, ịhụnanya, ofufe, ma ọ bụ oké nkwanye ùgwù a na-enye arụsị. Gịnịkwa bụ arụsị? Ọ bụ onyinyo, ihe nnọchianya nke ihe, ma ọ bụ ihe ngosipụta, nke ihe a na-enye ofufe. Dị ka ọ na-adịkarị, ikpere arụsị bụ nke a na-emere ike dị adị ma ọ bụ nke e echere na ọ dị elu karị, bụ́ nke e kwetara na o nwere ndụ (mmadụ, anụmanụ, ma ọ bụ nzukọ). Ma a pụkwara ikpere arụsị n’ihe banyere ihe ndị na-adịghị ndụ (ikike ma ọ bụ ihe e kere eke na-adịghị ndụ).
4 N’ime Akwụkwọ Nsọ, okwu Hibru ndị na-ezo aka n’arụsị na-emesikarị ike ihe na-abaghị uru, ma ọ bụ ha bụ okwu mweda n’ala. N’etiti ndị a, e nwere okwu ndị a sụgharịrị ịbụ “onyinyo a pịrị apị ma ọ bụ e mere eme” (n’ụzọ nkịtị, ihe a tụrụ atụ); “ihe, onyinyo, ma ọ bụ arụsị” (ihe a kpụrụ akpụ ma ọ bụ a wụrụ awụ); “arụsị jọgburu onwe ya”; “arụsị efu” (n’ụzọ nkịtị, ihe efu); na “arụsị na-asọ oyi.” A na-asụgharị okwu Grik ahụ bụ eiʹdo·lon ịbụ “arụsị.”
5. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọ bụghị onyinyo nile bụ arụsị?
5 Ọ bụghị onyinyo nile bụ arụsị. Chineke n’onwe ya gwara ụmụ Israel ka ha mee cherub ọlaedo abụọ maka igbe ọgbụgba ndụ ahụ na iji ihe mara mma chọọ ihe nnọchianya nke mmụọ ndị dị otú ahụ e kere eke mma bụ́ ndị dị n’ebe mkpuchi ime nke ákwà ụlọ ntu iri e nwere maka ụlọ ikwuu ahụ na ákwà mkpuchi na-ekewa Ebe Nsọ pụọ n’Ebe Kasị Nsọ. (Ọpụpụ 25:1, 18; 26:1, 31-33) Ọ bụ nanị ndị nchụàjà na-eje ozi hụrụ ihe nnọchianya ndị a ndị jere ozi n’ụzọ bụ isi dị ka ihe ngosipụta nke cherub eluigwe. (Tụlee Ndị Hibru 9:24, 25.) Ọ pụtara ìhè na ihe nnọchianya cherub nke ụlọ ikwuu ahụ abụghị ndị a na-enye nsọpụrụ ofufe, ebe ndị mmụọ ozi na-eme ezi omume n’onwe ha na-apụghị ịnakwere ofufe.—Ndị Kọlọsi 2:18; Mkpughe 19:10; 22:8, 9.
Ụzọ Jehova Si Ele Ikpere Arụsị Anya
6. Gịnị bụ echiche Jehova banyere ikpere arụsị?
6 Ndị ohu Jehova na-anọ na nche megide ikpere arụsị n’ihi na ọ na-emegide omume ikpere arụsị nile. Chineke nyere ụmụ Israel iwu ka ha ghara ime onyinyo dị ka ihe a ga-enye nsọpụrụ ma fee ha ofufe. N’ime Iwu Iri ahụ ka a na-achọta okwu ndị a: “Emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo, na-ewere ajọ omume nke ndị bụ nna leta ụmụ ha, leta ụmụ ụmụ nke atọ, letakwa nke anọ, nke ndị na-akpọ m asị; ma ana m emere [otu puku ụmụ ụmụ] ebere, bụ́ nke ndị na-ahụ m n’anya, na-edebekwa ihe nile m nyere n’iwu.”—Ọpụpụ 20:4-6.
7. N’ihi gịnị ka Jehova ji emegide ikpere arụsị nile?
7 N’ihi gịnị ka Jehova ji emegide ikpere arụsị nile? N’ụzọ bụ isi ọ bụ n’ihi na ọ na-achọ ofufe a na-akpaghịrị ókè, dị ka e gosipụtara n’elu na nke abụọ n’ime Iwu Iri ahụ. Ọzọkwa, o kwuru site n’ọnụ Aịsaịa onye amụma ya, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, m gaghị enyekwa arụsị dị iche iche a pịrị apị otuto m.” (Aịsaịa 42:8) N’otu oge, ikpere arụsị mere ka ụmụ Israel ma n’ọnyà ruo n’ókè nke na “ha weere ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọrọ ndị mmụọ ọjọọ àjà.” (Abụ Ọma 106:36, 37) Ọ bụghị nanị na ndị na-ekpere arụsị na-agọnahụ na Jehova bụ ezi Chineke kamakwa ha na-eme ihe maka ọdịmma nile nke Onye Iro ya bụ isi, bụ́ Setan, ya na ndị mmụọ ọjọọ.
Ịnọgidesi Ike n’Okpuru Ule
8. Ule dị aṅaa ka ndị Hibru atọ ahụ bụ́ Shedrak, Mishak, na Abednego chere ihu?
8 Ịnọgidesi ike n’ihe nye Jehova na-emekwa ka anyị nọrọ na nche megide ikpere arụsị. E gosipụtara nke a site n’ihe ahụ mere eme nke e dekọrọ na Daniel isi nke 3. Iji wee mee ememe nguzobe nke oké onyinyo ọlaedo o guzobeworo, eze Babilọn bụ́ Nebukadneza kpọkọrọ ndị isi ọchịchị nke alaeze ukwu ya. Ndị ọ kpọkọrọ gụnyere Shedrak, Mishak, na Abednego—ndị Hibru atọ bụ́ ndị nlekọta nke ókèala ọchịchị nke Babilọn. Ndị nile nọ n’ebe ahụ gaje ịkpọ isiala n’ihu onyinyo ahụ mgbe ha nụrụ ụda nke otu ngwá egwú. Nke a bụ mgbalị nke onye bụ chi Babilọn n’ezie, bụ́ Setan, mere ime ka ndị Hibru atọ ahụ kpọọ isiala n’ihu otu onyinyo nọchiri anya Alaeze Ukwu Babilọn. Cheedị echiche na ị nọ n’ebe ihe ahụ na-eme.
9, 10. (a) Ndị Hibru atọ ahụ weere nguzo dị aṅaa, oleekwa ụzọ e si kwụghachi ha ụgwọ? (b) Agbamume dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova pụrụ inweta site n’omume nke ndị Hibru atọ ahụ?
9 Lee! Ndị Hibru atọ ahụ na-eguzo ọtọ. Ha chetara iwu Chineke nke megidere ime na ife arụsị ma ọ bụ onyinyo a pịrị apị. Nebukadneza nyere ha iwu—kpọọ isiala ma ọ bụ nwụọ! Ma n’ịnọgidesi ike n’ihe nye Jehova, ha sịrị: “A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ onye anyị onwe anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị, ọ bụ n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu na n’aka gị, eze, ka ọ ga-anapụta anyị. Ma a sị na ọ pụghị ịnapụta anyị, ka ị mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.”—Daniel 3:16-18.
10 A tụbara ndị ohu a na-anọgidesi ike n’ihe nke Chineke n’ime ọkụ ahụ nke na-enwu ajọ onwunwu. N’ịbụ onye o juru anya ịhụ ka mmadụ anọ na-ejegharị n’ime ọkụ ahụ, Nebukadneza kpọrọ ndị Hibru atọ ahụ òkù, ha wee pụta n’emerụghị ahụ. N’ihi nke ahụ eze ahụ tiri mkpu, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abednego bụ, onye ziteworo mmụọ ozi ya [onye nke anọ nọ n’ime ọkụ ahụ], wee napụta ndị ohu ya ndị tụkwasịrị ya obi, ọ bụkwa okwu eze ka ha gbanweworo, wee rara ahụ ha nye, ka ha wee ghara ife ma ọ bụ ịkpọ isiala nye chi ọ bụla, ma ọ bụghị Chineke ha. . . . Ọ dịghị chi ọzọ nke pụrụ ịnapụta otú a.” (Daniel 3:28, 29) Iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị Hibru atọ ahụ na-enye agbamume ka Ndịàmà Jehova nke oge a na-anọgidesi ike n’ihe nye Chineke, jigide nnọpụiche n’ebe ụwa dị, ma zere ikpere arụsị.—Jọn 17:16.
A Na-ekpegbu Arụsị n’Ụlọikpe
11, 12. (a) Ihe ndekọ dị aṅaa nke metụtara Jehova na chi arụsị dị iche iche ka Aịsaịa dekọrọ? (b) Olee ihe chi nile nke mba dị iche iche mere mgbe Jehova mara ha aka?
11 Ihe ọzọ mere a ga-eji nọrọ na nche megide ikpere arụsị bụ na ịsọpụrụ arụsị abaghị uru. Ọ bụ ezie na ụfọdụ arụsị ndị mmadụ mere pụrụ iyi ka ha dị ndụ—ọtụtụ mgbe na-enwe ọnụ, anya, na ntị—ha apụghị ikwu okwu, ịhụ ụzọ, ma ọ bụ ịnụ ihe, ha apụghịkwa imere ndị na-efe ha ihe ọ bụla. (Abụ Ọma 135:15-18) E gosipụtara nke a na narị afọ nke asatọ T.O.A., mgbe onye amụma Chineke dekọrọ n’Aịsaịa 43:8-28 ihe bụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, okwu ikpe dị n’etiti Jehova na chi arụsị dị iche iche. Na ya ndị Chineke bụ́ Israel nọ n’otu akụkụ, mba ụwa ndị ọzọ nọkwa n’akụkụ nke ọzọ. Jehova mara chi ụgha dị iche iche nke mba nile aka ikwu “ihe mbụ nile,” ya bụ ibu amụma ziri ezi. Ọ dịghị nke ọ bụla pụrụ ime otú ahụ. N’iche ndị ya ihu, Jehova sịrị: “Unu onwe unu bụkwa ndịàmà m . . . mụ onwe m bụkwa Chineke.” Mba dị iche iche apụghị ịnwapụta na chi ha dị adị tupu Jehova ma ọ bụ na ha pụrụ ibu amụma. Ma Jehova buru amụma banyere mbibi Babilọn na ntọhapụ nke ndị ya e ji eji.
12 Ọzọkwa, ndị ohu Chineke ọ napụtara ga-asị, dị ka a kọwara n’Aịsaịa 44:1-8, na ha bụ ndị “Jehova nwere.” Ya onwe ya sịrị: “Mụ onwe m bụ onye mbụ, mụ onwe m bụkwa onye ikpeazụ; ọ dịghịkwa Chineke ọ bụla dị ma e wezụga nanị mụ onwe m.” E nweghị okwu mgbagha ọ bụla sitere n’ọnụ chi arụsị ndị ahụ. “Unu bụkwa ndịàmà m,” ka Jehova kwuru ọzọ banyere ndị ya, na-asịkwa: “Ọ̀ dị Chineke ọzọ dị ma e wezụga nanị mụ onwe m? Ee e, ọ dịghị Oké Nkume ọ bụla dị.”
13. Gịnị ka ikpere arụsị na-ekpughe banyere onye na-ekpere arụsị?
13 Anyị na-anọkwa na nche megide ikpere arụsị n’ihi na itinye aka na ya na-ekpughe enweghị amamihe. Site n’iji akụkụ nke osisi ọ họọrọ mee ihe, onye na-ekpere arụsị na-eme chi nke ọ ga-efe, sitekwa n’iji akụkụ ọzọ, ọ na-amụnye ọkụ o ji esi ihe oriri ya. (Aịsaịa 44:9-17) Lee ka o si bụrụ ihe nzuzu! Onye na-eme ma na-efe chi arụsị na-abụkwa onye ihere na-eme n’ihi ịbụ ndị na-enweghị ike inye ihe àmà doro anya nke na-egosi ọbụbụ ha bụ chi. Ma ọbụbụ Jehova bụ Chineke enweghị ihe ịrụ ụka, n’ihi na ọ bụghị nanị na o buru amụma banyere ntọhapụ nke ndị ya site na Babilọn kamakwa o mere ka nke a were ọnọdụ. Jerusalem ghọghachiri ebe mmadụ bi, e wughachiri obodo ndị dị na Juda, “ogbu mmiri” nke Babilọn—Osimiri Yufretis—takọsịkwara dị ka isi iyi nke nchebe. (Aịsaịa 44:18-27) Dị ka Chineke bukwara n’amụma, Saịrọs onye Peasia meriri Babilọn.—Aịsaịa 44:28-45:6.
14. N’Ụlọikpe Kasị Elu nke Eluigwe na Ala, gịnị ka a ga-anwapụta n’ụzọ na-adịgide adịgide?
14 E kpegburu chi arụsị ndị ahụ n’okwu ikpe metụtara ịbụ chi. Ihe dakwasịrị Babilọn aghaghịkwa ịdakwasị ihe yiri ya n’oge a, Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ya na chi ya nile, ihe onwunwe okpukpe, na ihe ikpere arụsị nile ga-apụ n’anya n’oge na-adịghị anya ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 17:12-18:8) N’Ụlọikpe Kasị Elu nke Eluigwe na Ala, a ga-anwapụta n’oge ahụ n’ụzọ na-adịgide adịgide na nanị Jehova bụ ezi Chineke nke na-adị ndụ, na ọ na-emezukwa Okwu amụma ya.
Àjà Ndị A Chụụrụ Ndị Mmụọ Ọjọọ
15. Gịnị ka mmụọ nsọ na òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ gosipụtara banyere ndị Jehova na ikpere arụsị?
15 Ndị Jehova na-anọkwa na nche megide ikpere arụsị n’ihi na a na-eduzi ha site ná mmụọ na nzukọ Chineke. Òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ nke ndị ohu Jehova gwara ndị Kraịst ibe ha, sị: “Ọ dị mmụọ nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma, ka anyị ghara ibo unu ibu arọ karị ihe ndị a dị mkpa: ka unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko; ọ bụrụ na unu edebe onwe unu ghara imetụ ihe ndị a aka, ọ ga-adịrị unu mma. Jisienụ ike.”—Ọrụ 15:28, 29.
16. N’okwu nke aka gị, olee ụzọ ị pụrụ isi kọwaa ihe Pọl kwuru banyere ihe ndị a chụrụ n’àjà nye arụsị?
16 Ihe ọzọ mere a ga-eji nọrọ na nche megide ikpere arụsị bụ iji zere mmekọrịta ndị mmụọ ọjọọ. Banyere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Pọl onyeozi gwara ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst, sị: “Gbanarịnụ ikpere arụsị. . . . Iko nke ngọzi ahụ nke anyị na-agọzi, ọ́ bụghị nnwekọ ọbara Kraịst? Achịcha ahụ nke anyị na-anyawa, ọ́ bụghị nnwekọ ahụ Kraịst? N’ihi na otu achịcha dị, anyị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma anyị bụ otu ahụ: n’ihi na anyị nile naeketa òkè n’otu achịcha ahụ. Leenụ Israel dị ka anụ ahụ si dị: ndị na-eri àjà, hà na ebe ịchụàjà adịghị enwekọ? Gịnịkwa ka m na-ekwu? Na ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị bụ ihe ọ bụla, ma ọ bụ na arụsị bụ ihe ọ bụla? Kama okwu m na-ekwu bụ, na ihe ndị mba ọzọ na-achụ n’àjà, ha na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghịkwa Chineke ka ha na-achụrụ: ma achọghị m ka unu ghọọ ndị unu na ndị mmụọ ọjọọ na-enwekọ. Unu apụghị ịṅụ iko Onyenwe anyị na iko ndị mmụọ ọjọọ: unu apụghị iketa table Onyenwe anyị na table ndị mmụọ ọjọọ. Ma ọ bụ ànyị na-akpasu Onyenwe anyị ekworo? Ànyị ka ya ike?”—1 Ndị Kọrint 10:14-22.
17. Na narị afọ mbụ O.A., n’okpuru ọnọdụ ndị dị aṅaa ka onye Kraịst pụrụ iri anụ a chụrụ n’àjà nye arụsị, n’ihi gịnịkwa?
17 E ji otu akụkụ nke anụmanụ chụọ àjà nye arụsị, ndị nchụàjà ketara otu akụkụ, onye ahụ na-efe ofufe nwetakwara ụfọdụ maka ememe. Otú ọ dị, a pụrụ ire akụkụ ụfọdụ nke anụ ahụ n’ahịa. Ọ bụ ihe na-adịghị mma onye Kraịst ịga n’ụlọ arụsị ije rie anụ ọ bụ ezie na o righị ya dị ka akụkụ nke ememe ahụ, n’ihi na nke a pụrụ ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ ma ọ bụ dọbata ya n’ofufe ụgha. (1 Ndị Kọrint 8:1-13; Mkpughe 2:12, 14, 18, 20) Ịchụ anụmanụ n’àjà nye arụsị agbanweghị anụ ahụ, ya mere onye Kraịst pụrụ ịzụrụ ụfọdụ n’ahịa. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-ajụ ase ebe e si nweta anụ e kunyere ya n’ụlọ mmadụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ asị na ọ bụrịị nke ‘a chụrụ n’àjà,’ ọ gaghị eri ya, iji zere ime ka onye ọ bụla sụọ ngọngọ.—1 Ndị Kọrint 10:25-29.
18. Olee ụzọ ndị na-eri ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị pụrụ isi soro ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe?
18 E chewo echiche ọtụtụ mgbe na mgbe ememe ịchụ àjà gasịrị, chi ahụ dị n’ime anụ ahụ ma banye n’ahụ nke ndị na-eri ya n’ememe oriri nke ndị na-efe ya. Dị ka ndị na-erikọ nri ọnụ na-ewulite ihe nkekọ n’etiti onwe ha, otú ahụ ka ndị na-eri n’anụ ndị ahụ e ji chụọ àjà bụ ndị na-enwekọ ihe n’ebe ịchụàjà ahụ, nweekwa mmekọrịta n’etiti ha na chi mmụọ ọjọọ ahụ nke arụsị ahụ nọchiri anya ya. Site n’ikpere arụsị dị otú ahụ, ndị mmụọ ọjọọ na-egbochi ndị mmadụ ife nanị ezi Chineke ahụ. (Jeremaịa 10:1-15) Ka a sịkwa ihe mere ndị Jehova ga-eji zere ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị! Ịnọgidesi ike n’ihe nye Chineke, ịnakwere nduzi sitere ná mmụọ nsọ na nzukọ ya, na ikpebisi ike izere itinye aka ná mmekọrịta nke mmụọ ọjọọ ghọkwara mkpali dị ike iji nọrọ na nche megide ikpere arụsị n’oge a.
N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa Ịnọ na Nche?
19. Ụdị ikpere arụsị dị aṅaa ka e nwere n’Efesọs oge ochie?
19 Ndị Kraịst na-eji ịdị uchu anọ na nche megide ikpere arụsị n’ihi na o nwere ụdị dị ọtụtụ, ọbụnakwa otu omume ikpere arụsị pụrụ imebi okwukwe ha. Jọn onyeozi gwara ndị kwere ekwe ibe ya, sị: “Cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị.” (1 Jọn 5:21) Ndụmọdụ nke a dị mkpa n’ihi na ọtụtụ ụdị nke ikpere arụsị gbara ha gburugburu. Jọn nọ n’Efesọs dee akwụkwọ ahụ, bụ́ obodo nke jupụtara n’ihe omume majik na akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme banyere chi ụgha dị iche iche. Efesọs nwere otu n’ime ihe ịtụnanya asaa nke ụwa—ụlọ nsọ nke Artemis, ebe mgbaba nye ndị omempụ nakwa ogige nke ememe rụrụ arụ. Onye ọkà ihe ọmụma bụ Heracleitus nke Efesọs ji ọwara ụzọ ahụ gbara ọchịchịrị e si abanye n’ebe ịchụàjà nke ụlọ nsọ tụnyere ọchịchịrị nke omume ọjọọ, o lekwara omume nke ndị nọ n’ụlọ nsọ ahụ anya dị ka nke dị njọ karịa nke anụ ọhịa. Otú a, ndị Kraịst nọ n’Efesọs aghaghị iguzosi ike megide ikpere ndị mmụọ ọjọọ, omume rụrụ arụ, na ikpere arụsị.
20. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa izere ọbụna ikpere arụsị nke kasị nta?
20 Ọ dị mkpa ka ndị Kraịst kpebisie ike izere ọbụna ikpere arụsị kasị dị nta n’ihi na nanị otu omume nke ịkpọ isiala nye Ekwensu ga-enye aka ịkwado ịma aka ya na ụmụ mmadụ agaghị anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’okpuru ule. (Job 1:8-12) Mgbe ọ na-egosi Jisọs “alaeze nile nke ụwa, na ebube ha,” Setan sịrị: “Ihe ndị a nile ka m ga-enye gị, ọ bụrụ na ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m.” Ọjụjụ Kraịst jụrụ kwadoro akụkụ Jehova n’ihe iseokwu ahụ metụtara ọkaaka eluigwe na ala ma mee ka Ekwensu ghọọ onye ụgha.—Matiu 4:8-11; Ilu 27:11.
21. N’ihe banyere onye ọchịchị alaeze ukwu Rom, gịnị ka ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi jụrụ ime?
21 Ndị na-eso ụzọ Jisọs oge mbụ emeghịkwa omume nke ịkpọ isiala nke ga-akwado akụkụ Setan n’ihe iseokwu ahụ. Ọ bụ ezie na ha nwere nsọpụrụ ziri ezi maka “ndị na-achị isi” nke gọọmenti, ha amụnyeghị ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ iji sọpụrụ onye ọchịchị alaeze ukwu Rom, ọbụna ma ọ bụrụ na ọ ga-akpata ọnwụ ha. (Ndị Rom 13:1-7) N’ihe banyere nke a, Daniel P. Mannix dere, sị: “Nanị ndị Kraịst ole na ole mebiri okwukwe ha, ọ bụ ezie na a na-ahapụ ebe ịchụàjà ọkụ na-enwu na ya mgbe mgbe n’ogige ahụ n’ebe ọ ga-adịrị ha mfe. Nanị ihe onye mkpọrọ ga-eme bụ ịghasatụ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ime ọkụ ahụ, a na-enyekwa ya Satifiketi Onye Chụrụ Àjà ma tọhapụ ya. E jikwa nlezianya kọwaara ya na ọ dịghị efe onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ; nanị ikwere n’àgwà onye bụ chi nke onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ nwere dị ka onye isi nke mba Rom. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ fọrọ nke nta ka a ghara inwe ndị Kraịst chọrọ iji ohere ahụ gbara isi onwe ha.” (Those About to Die, peji nke 137) Ọ bụrụ na a nwaa gị n’ụzọ yiri nke ahụ, ị̀ ga-eguzogide ikpere arụsị nile kpam kpam?
Ị̀ Ga-anọ na Nche Megide Ikpere Arụsị?
22, 23. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nọrọ na nche megide ikpere arụsị?
22 N’ụzọ doro anya, ndị Kraịst aghaghị ịnọ na nche megide ụdị nile nke ikpere arụsị. Jehova chọrọ ofufe a na-akpaghịrị ókè. Ndị Hibru atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị wepụtara ezi ihe nlereanya n’ọjụjụ ha jụrụ ime oké onyinyo ahụ nke eze Babilọn bụ́ Nebukadneza guzobere ihe a na-efe efe. N’okwu ikpe eluigwe na ala ahụ nke Aịsaịa onye amụma dekọrọ, nanị Jehova ka e gosipụtara ịbụ ezi Chineke nke na-adịkwa ndụ. Ndị Kraịst bụ ndịàmà ya n’oge mbụ zeere ihe ndị a chụrụ n’àjà nye arụsị. Ọtụtụ n’ime ha ndị nọgidesiri ike n’ihe adabaghị ná nrụgide nke ọbụna ime ihe ọ bụla bụ ikpere arụsị nke ga-aghọ ịgọnarị Jehova.
23 Mgbe ahụ, ebe ọ dị otú a, ị̀ na-anọ na nche megide ikpere arụsị n’onwe gị? Ị̀ na-enye Chineke ofufe a na-akpaghịrị ókè? Ị̀ na-akwado ọkaaka Jehova ma na-ebuli ya elu dị ka ezi Chineke nke na-adịkwa ndụ? Ya bụrụ otú ahụ, o kwesịrị ịbụ mkpebi gị ịnọgide na-eguzosi ike megide omume nile nke ikpere arụsị. Ma isi ihe ndị ọzọ dị aṅaa nke Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere gị aka ịnọ na nche megide ụdị ikpere arụsị ọ bụla?
Gịnị Bụ Uche Gị?
◻ Gịnị bụ ikpere arụsị?
◻ N’ihi gịnị ka Jehova ji emegide ikpere arụsị nile?
◻ Nguzo dị aṅaa ka ndị Hibru atọ ahụ weere banyere ikpere arụsị?
◻ Olee ụzọ ndị na-eri ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị pụrụ isi soro ndị mmụọ ọjọọ na-emekọ ihe?
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọrọ na nche megide ikpere arụsị?
[Foto dị na peeji nke 23]
Ọ bụ ezie na e yiri ndụ ha egwu, ndị Hibru atọ ahụ agaghị etinye aka n’ikpere arụsị