Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/15 p. 14-19
  • ‘Nyere M Aka n’Ebe Ọ Dị M Mkpa Inwekwu Okwukwe!’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Nyere M Aka n’Ebe Ọ Dị M Mkpa Inwekwu Okwukwe!’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ikpe Ekpere Ka Okwukwe Ghara Ịda Ada
  • Iji Okwukwe Chee Ule Ndị Na-abịanụ Ihu
  • Okwukwe Iji Mee Ka Ahụ Dị Anyị Mma
  • ‘Ndị A Zọpụtara Site n’Okwukwe’
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/15 p. 14-19

‘Nyere M Aka n’Ebe Ọ Dị M Mkpa Inwekwu Okwukwe!’

‘Nna nwatakịrị ahụ nọ na-asị, Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe ọ dị m mkpa inwekwu okwukwe!’—MAK 9:24.

1. Gịnị mere ka otu onye bụ nna tie mkpu, sị, ‘Nyere m aka n’ebe ọ dị m mkpa inwekwu okwukwe’?

NNA nke nwata ahụ mmụọ ọjọọ na-akpa ike n’ahụ guzo n’ihu Jisọs Kraịst. Lee nnọọ ka o si gụsie nwoke ahụ agụụ ike ka a gwọọ obere nwa ya! Ndị na-eso ụzọ Jisọs enweghị okwukwe zuru ezu iji chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, ma nna ahụ tiri mkpu, sị: ‘Enwere m okwukwe! Nyere m aka n’ebe ọ dị m mkpa inwekwu okwukwe!’ Site n’ike Chineke nyere ya, Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o wusiri okwukwe nna nwa okoro ahụ ike.—Mak 9:14-29.

2. N’ihe banyere okwukwe, n’ụzọ abụọ dịgasị aṅaa ka ihere na-adịghị eme ndị Kraịst?

2 Dị ka nna nwa okoro ahụ nke nwere olileanya, ohu Jehova nke na-eguzosi ike n’ihe adịghị eme ihere ikwu, sị: “Enwere m okwukwe!” Ndị na-akwa emo pụrụ ịgọnarị ike nke Chineke, ịbụ eziokwu nke Okwu ya, na ọbụna ịdị adị ya. Ma ezi ndị Kraịst na-adị njikere ikwere na ha nwere okwukwe na Jehova Chineke. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ha na-agwa Nna ha nke eluigwe okwu na nzuzo n’ekpere, ndị a pụkwara ịrịọ arịrịọ, sị: ‘Nyere m aka n’ebe ọ dị m mkpa inwekwu okwukwe!’ Ha na-emekwa nke a n’emeghị ihere, na-amara na ọbụna ndị ozi Jisọs Kraịst rịọrọ arịrịọ, sị: “Tụkwasịrị anyị okwukwe.”—Luk 17:5.

3. Gịnị bụ ihe dị mkpa banyere otú Jọn si jiri okwu ahụ bụ “okwukwe” mee ihe n’Oziọma ya, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji kwesị ekwesị?

3 Karịsịa, Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nwere ọtụtụ ihe ikwu banyere okwukwe. N’eziokwu, Oziọma Jọn ji ụdị okwu Grik dị iche iche ndị metụtara “okwukwe” mee ihe ihe karịrị 40 pasenti karịa Oziọma atọ ndị ọzọ ahụ ma a chịkọta ha ọnụ. Site n’iji ngwaa ahụ na-eme ihe mgbe nile, Jọn mesiri ya ike na inwe okwukwe abụghị ihe zuru ezu; igosipụta ya bụ ihe dị mkpa. Mgbe ọ na-ede ihe n’ihe dị ka afọ 98 O.A., ọ hụrụ ajọ mmetụta ndapụ n’ezi ofufe ka ọ na-achọ ịmata ndị Kraịst n’ọnyà, bụ́ ndị dara mbà n’okwukwe. (Ọrụ 20:28-30; 2 Pita 2:1-3; 1 Jọn 2:18, 19) Ya mere, ọ dị oké mkpa igosipụta okwukwe, inye ihe àmà ya site n’ọrụ dị iche iche nke nsọpụrụ Chineke. Oge ihe isi ike na-eche ha n’ihu.

4. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na ọ dịghị ihe ndị nwere okwukwe na-apụghị ime?

4 Okwukwe na-enyere ndị Kraịst aka ịnagide ihe isi ike ọ bụla. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na ọ bụrụ na ha enwee “okwukwe dị ka mkpụrụ mustard,” ọ dịghị ihe ha na-agaghị enwe ike ime. (Matiu 17:20) N’ụzọ dị otú ahụ, o mesiri ya ike, bụ́ ike okwukwe nwere, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ. Jisọs si otú a mesie ike, ọ bụghị ihe ụmụ mmadụ pụrụ ime, kama ihe mmụọ Chineke, ma ọ bụ ike ọrụ ya, pụrụ ime. Ndị ọ na-eduzi adịghị eme ka ụmụ obere ihe mgbochi na ihe isi ike ghọọ oké ihe. Itinye amamihe nke mmụọ Chineke na-enye n’ọrụ na-enyere ha aka idebe ihe n’ọnọdụ kwesịịrị ha. Ọbụna nsogbu ndị siri ike na-ebelata mgbe e ji ike na-enye nkwado nke okwukwe mesoo ha.—Matiu 21:21, 22; Mak 11:22-24; Luk 17:5, 6.

Ikpe Ekpere Ka Okwukwe Ghara Ịda Ada

5-7. (a) Okwu ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere okwukwe ka Jisọs kwuru mgbe o guzobere Ememe Ncheta ahụ? (b) Olee ụzọ okwukwe Pita si nyere ya aka iwusi ụmụnna ya ike?

5 Na 33 O.A., Jisọs sooro ndị na-eso ụzọ ya mee Ememe Ngabiga ahụ nke ikpeazụ ya. Mgbe ahụ, mgbe ọ chụpụsịrị Judas Iskarịọt, o guzobere Ememe Ncheta ahụ, na-asị: “Mụ onwe m na-agbakwa ndụ inye unu alaeze, dị ka Nna m gbara ndụ inye m . . . Saịmọn, Saịmọn, lee, Setan rịọtara unu, ka ọ yọchaa unu dị ka ọka: ma mụ onwe m rịọrọ arịrịọ banyere gị, ka okwukwe gị ghara ịgwụ agwụ: gị onwe gị, mgbe ị ga-echigharịworị, gị meekwa ka ụmụnna gị guzosie ike.”—Luk 22:28-32.

6 Jisọs kpere ekpere ka okwukwe Saịmọn Pita ghara ịda ada. Ọ bụ ezie na Pita ji inwebiga obi ike ókè nyaa isi na ya agaghị agọnarị Jisọs mgbe ọ bụla, n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, o mere nke ahụ ugbo atọ. (Luk 22:33, 34, 54-62) N’eziokwu, mgbe e gburu Onye ọzụzụ atụrụ ahụ dị ka e buru n’amụma, a chụsara ìgwè atụrụ ahụ. (Zekaraịa 13:7; Mak 14:27) Otú ọ dị, mgbe Pita siri ná ndaba ọ dabara n’ọnyà nke ịtụ egwu nwetaghachi onwe ya, o wusiri ụmụnna ime mmụọ ya ike. O welitere okwu banyere ịchọta onye a ga-eji dochie anya Judas Iskarịọt ahụ nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi. N’ịnọ dị ka ọnụ na-ekwuru ndị ozi ahụ na Pentikọst 33 O.A., Pita jiri nke mbụ n’ime “mkpịsị ugodi” ndị ahụ Jisọs nyere ya wee mee ihe, na-emeghere ndị Juu ụzọ ịghọ ndị so n’Alaeze ahụ. (Matiu 16:19; Ọrụ 1:15–2:41) Setan arịọwo ka o nweta ndị ozi ahụ ka o wee yọchaa ha dị ka ọka, ma Chineke mere ka e jide n’aka na okwukwe ha adaghị mbà.

7 Cheedị nnọọ echiche otú ahụ dịrị Pita mgbe ọ nụrụ ka Jisọs sịrị: “Mụ onwe m rịọrọ arịrịọ banyere gị, ka okwukwe gị ghara ịgwụ agwụ.” Cheedị nnọọ echiche! Onyenwe ya na Nna ya ukwu ekpewo ekpere ka okwukwe Pita ghara ịda. Ọ daghịkwa, ma ọ bụ gwụsịa. N’eziokwu, n’’ụbọchị Pentikọst ahụ, Pita na ndị ọzọ ghọrọ ndị mbụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ịghọ ụmụ ime mmụọ nke Chineke, ndị ha na Kraịst gaje iketakọ ihe n’ebube nke eluigwe. Ebe mmụọ nsọ na-arụ ọrụ n’ahụ ha mgbe ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụbeghị mbụ, ha pụrụ igosipụta mkpụrụ ya, gụnyere okwukwe, dị ka ha na-emetụbeghị na mbụ. Lee nnọọ azịza dị ebube ọ bụ nye arịrịọ ha bụ́: “Tụkwasịrị anyị okwukwe.”—Luk 17:5; Ndị Galetia 3:2, 22-26; 5:22, 23.

Iji Okwukwe Chee Ule Ndị Na-abịanụ Ihu

8. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke bịara n’ezi oge ka nzukọ a nyeworo anyị n’ihe banyere mmezu nke 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3?

8 N’imezu amụma Bible, n’oge na-adịghị anya anyị gaje ịnụ mkpu ahụ nke bụ “Udo na ntụkwasị obi.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:3) Nke a ọ̀ pụrụ itinye okwukwe anyị n’ule? Ee, n’ihi na anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị ọ bịara na mberede, bụ́ ihe ahụ yiri ihe ịga nke ọma nke mba nile pụrụ inwe n’iweta udo. Ma anyị agaghị ekere òkè ná mmụọ nke ndị na-akpọsa udo dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị eburu n’uche na Jehova Chineke adịghị eji nke ọ bụla n’ime òtù dị iche iche nke ụwa nke a eme ihe iji mezuo nke ahụ. O nwere ụzọ nke ya ọ ga-esi weta ezi udo, nke ahụ bụkwa nanị site n’Alaeze ya nke dị n’okpuru Jisọs Kraịst. N’ihi ya, n’agbanyeghị ihe ịga nke ọma ọ bụla mba nile pụrụ inwe n’iguzobe udo, ọ ga-abụ ihe na-adịru nwa oge, bụrụkwa ihe mkpuchi na-abụghị ezie. Iji nyere anyị aka ịnọ na nche n’ihe banyere nke a, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ga-anọgide na-ebipụta ịdọ aka ná ntị ndị bịara n’ezi oge ka ndị ohu Jehova wee ghara ịbụ ndị ọ bịakwutere na mberede, bụ́ mkpọsa ụgha ahụ gaje ịbịa nke “Udo na ntụkwasị obi” site n’ọnụ mba dị iche iche nke usoro ihe ochie nke a.—Matiu 24:45-47.

9. N’ihi gịnị ka mbibi Babilọn Ukwu ahụ ji chọọ obi ike na okwukwe n’aka anyị?

9 Mkpu ahụ nke “Udo na ntụkwasị obi” ga-abụ ihe àmà maka ‘mbibi mberede’ ịbịakwasị Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. (Mkpughe 17:1-6; 18:4, 5) Nke a ga-etinyekwa okwukwe ndị Kraịst n’ule. Ebe okpukpe ụgha na-adakpọsị, Ndịàmà Jehova hà ga-anọgidesi ike n’okwukwe? N’ezie ha ga-eme otú ahụ. Ihe omume nke a—nke bụ ihe a na-atụghị anya ya, ihe a na-apụghịkwa ịghọta aghọta nye ihe ka n’ọtụtụ mmadụ—agaghị abụ mmadụ kpatara ya. Ụmụ mmadụ aghaghị ịma na n’ezie, ọ bụ ikpe Jehova, iji doo aha ahụ nsọ, bụ́ nke okpukpe ụgha metọworo ruo ogologo oge. Ma olee ụzọ ụmụ mmadụ pụrụ isi mara ma ọ bụghị ma mmadụ ọ̀ gwara ha? Ọ̀ bụkwa ole ndị, ma e wezụgakwa Ndịàmà Jehova, pụrụ ịbụ ndị a tụrụ anya ịgwa ha otú ahụ?—Tụlee Ezikiel 35:14, 15; Ndị Rom 10:13-15.

10. Olee ụzọ mbuso agha Gọg megide ndị Jehova ga-esi bụrụkwa ule nke okwukwe?

10 Ndịàmà Jehova e tere mmanụ, na ndị na-esonyere ha, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala enwewo obi ike dị mkpa iji gwa ndị ọzọ banyere mmezu ahụ dị oké nso nke ihe Jehova kpere n’ikpe megide Babilọn Ukwu ahụ na akụkụ nile ọzọ nke usoro ihe Setan. (2 Ndị Kọrint 4:4) N’ọnọdụ ya dị ka Gọg nke ala Megọg, nke na-egosi ọnọdụ ọ nọ na ya ugbu a, bụ́ nke e wedara n’ala, Setan ga-edupụta usuu ndị agha elu ala ya maka mwakwasị zuru ezu megide ndị Chineke. A ga-etinye okwukwe e nwere n’ike nchebe nke Chineke n’ebe Ndịàmà Jehova nọ n’ule. Ma anyị pụrụ inwe okwukwe na dị ka Okwu Chineke buru n’amụma, Jehova ga-anapụta ndị ya.—Ezikiel 38:16; 39:18-23.

11, 12. (a) Gịnị mere ka e jide n’aka na a ga-azọpụta Noa na ezinụlọ ya n’oge Iju Mmiri ahụ? (b) Gịnị ka ọ na-agaghị adị mkpa ka anyị chegbuo onwe anyị banyere ya n’oge mkpagbu ukwu ahụ?

11 Taa, anyị amaghị kpọmkwem ụzọ Jehova ga-esi chebe ndị ya n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ, ma nke a abụghị ihe mere a ga-eji nwee obi abụọ ma ọ̀ ga-emekwa otú ahụ. (Matiu 24:21, 22) Ọnọdụ nke ndị ohu Chineke nke oge a ga-adị ka nke ahụ Noa na ezinụlọ ya chọtara onwe ha na ya n’oge Iju Mmiri ahụ. N’ịbụ ndị e mechibidoro n’ime ụgbọ ahụ, ebe mmiri mbibi ahụ na-erugharị erugharị nọ ha gburugburu, ma eleghị anya oké egwu tụrụ ha n’ihi ngosipụta nke a nke ike Chineke, ha aghaghị ikpesiwokwarị ekpere ike. E nweghị ihe ọ bụla dị n’Akwụkwọ nsọ nke na-egosi na ha chegburu onwe ha ma jụọ onwe ha, sị: ‘Ụgbọ a ò siri ike ruo n’ókè zuru ezu ịnagide ike mbibi nke a? Ànyị nwere nri ga-ezuru anyị ruo mgbe Iju Mmiri ahụ ga-agabiga? Ànyị ga-enwe ike ịnagide ọnọdụ ndị gbanwere agbanwe n’elu ụwa mgbe ọ gasịrị?’ Ihe ndị mere mgbe nke a gasịrị gosiri na nchegbu ndị dị otú ahụ ga-abụworị ndị na-enweghị isi.

12 Iji wee jide n’aka na a ga-azọpụta ha, ọ dị mkpa ka Noa na ezinụlọ ya gosipụta okwukwe. Nke a pụtara ịgbaso ntụziaka nile na nduzi nile nke mmụọ nsọ Chineke. N’oge mkpagbu ukwu ahụ, ọ ga-adịkwa nnọọ mkpa otú ahụ ka anyị gbasoo nduzi nile nke mmụọ nsọ ahụ, rubekwa isi ná ntụziaka nile Jehova nyere site ná nzukọ ya. Mgbe ahụ, anyị agaghị enwe ihe ọ bụla mere anyị ga-eji chegbuo onwe anyị ma jụọ, sị: ‘Olee ụzọ a ga-esi gboo mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ anyị? Ndokwa dị aṅaa ka a ga-emere ndị meworo agadi na ndị ahụ ọ dị mkpa inye nlekọta ahụ ike ma ọ bụ ọgwụgwọ pụrụ iche? Olee ụzọ Jehova ga-esi mee ka o kwe anyị omume ịlanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?’ Site n’okwukwe siri ike, ndị ohu Jehova nile na-eguzosi ike n’ihe ga-ahapụrụ ya ihe nile, bụ́ onye nwere ike ịhazi ihe nke ọma.—Tụlee Matiu 6:25-33.

13. Ozugbo mkpagbu ukwu ahụ malitere, n’ihi gịnị ka okwukwe yiri nke Abraham ga-eji dị anyị mkpa?

13 Ozugbo mkpagbu ukwu ahụ maliteworo, ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-ewusiwanye okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ ike nke ukwuu. E kwuwerị, anyị ga-ahụ na Jehova na-emezu ihe o kwuworo na ya ga-eme. Anyị ga-anọ jiri anya anyị na-ahụ mmezu nke ihe o kpere n’ikpe! Ma anyị onwe anyị, ànyị ga-enwe okwukwe zuru ezu ikwere na mgbe a na-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ, na Chineke ga-echebe ndị nke ya? Ànyị ga-adị ka Abraham, onye nwere okwukwe na ‘Onye Ikpe ụwa nile ga-eme ihe ziri ezi,’ na-aghara ibibikọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume?—Jenesis 18:23, 25.

14. Ajụjụ dịgasị aṅaa kwesịrị ịkpali anyị ịtụle okwukwe anyị, rụsiekwa ọrụ ike iji wusie ya ike?

14 Lee nnọọ ka o si dị mkpa ka anyị wulite okwukwe anyị elu ugbu a! Ebe ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a dị oké nso ugbu a, ka anyị kwere ka mmụọ Chineke kpalie anyị “n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile.” (2 Pita 3:11-14) Mgbe ahụ, echiche na-enye nsogbu ndị yiri ndị a agaghị na-ata anyị ahụhụ n’oge mkpagbu ukwu ahụ: ‘Èruru m eru ịnata nchebe Jehova? Àpụrụ m imeworị ihe dị ukwuu karị n’ijere ya ozi? Àrụsiri m ọrụ ike ruo n’ókè zuru ezu iji yikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ”? Àbụ m ụdị onye Jehova chọrọ n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?’ Ajụjụ ndị dị otú ahụ na-akpali iche echiche kwesịrị ime ka anyị tụlee okwukwe anyị, rụsiekwa ọrụ ike iji wusie ya ike ugbu a!—Ndị Kọlọsi 3:8-10.

Okwukwe Iji Mee Ka Ahụ Dị Anyị Mma

15. Gịnị ka Jisọs gwara ndị ahụ ọ gwọrọ mgbe ụfọdụ, ma n’ihi gịnị ka nke a na-adịghị akwado iji okwukwe agwọ ọrịa nke oge a?

15 Jisọs emeghị ka ọrụ ịgwọ ọrịa ọ rụrụ dịịrị nanị ndị nwere okwukwe. (Jọn 5:5-9, 13) Ya mere, ọrụ ọ rụrụ adịghị enye nkwado ọ bụla maka ozizi ahụ na-adabereghị n’akwụkwọ nsọ nke bụ iji okwukwe agwọ ọrịa. N’eziokwu, mgbe ụfọdụ Jisọs gwara ndị ahụ ọ gwọrọ, sị: “Okwukwe gị azọpụtawo gị.” (Matiu 9:22; Mak 5:34; 10:52; Luk 8:48; 17:19; 18:42) Ma site n’ikwu nke a, ọ na-ezo aka n’ihe bụ eziokwu doro anya: A sị na ndị ahụ na-arịa ọrịa enweghị okwukwe n’ike Jisọs nwere ịgwọ ọrịa, ha agaraghị abịakwute ya rịị maka ọgwụgwọ.

16. Usoro ihe omume ịgwọ ọrịa dị aṅaa ka Jisọs na-eduzi taa?

16 Taa, Jisọs Kraịst na-eduzi usoro ihe omume nke ọgwụgwọ ime mmụọ, ihe karịrị 4,000,000 ndị mmadụ edebewokwa onwe ha n’ọnọdụ irite uru site na ya. Dị ka Ndịàmà Jehova, ha na-enwe ahụ ike ime mmụọ n’agbanyeghị ahụ esighị ike ndị ha pụrụ inwe n’anụ ahụ. Ndị Kraịst e tere mmanụ n’etiti ha nwere olileanya nke eluigwe, ha ‘na-elekwasịkwa anya n’ihe na-adịru ebighị ebi ndị a na-adịghị ahụ anya.’ (2 Ndị Kọrint 4:16-18; 5:6, 7) Ndị Kraịst ndị nwere olileanya elu ala na-elepụkwa anya ịhụ ọrụ ndị dị ebube nke ọgwụgwọ anụ ahụ ndị a ga-arụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.

17, 18. Ndokwa dị aṅaa nke Jehova ka a kọwara ná Mkpughe 22:1, 2, oleekwa ụzọ o si dị mkpa inwe okwukwe iji rite uru site na ya?

17 Jọn onyeozi zoro aka ná ndokwa ndị Chineke mere maka ndụ ebighị ebi n’okwu ndị ahụ dị ná Mkpughe 22:1, 2: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ pụta, n’etiti ama ya. N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” “Mmiri nke ndụ” ahụ gụnyere Okwu Chineke nke eziokwu na ndokwa ọ bụla ọzọ Jehova meworo iji napụta ụmụ mmadụ na-erube isi site ná mmehie na ọnwụ ma nye ha ndụ ebighị ebi n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. (Ndị Efesọs 5:26; 1 Jọn 2:1, 2) Mgbe ha nọ n’elu ala, 144,000 ndị na-eso ụzọ Jisọs e tere mmanụ na-aṅụ ndokwa ndị Chineke meworo site na Kraịst dị ka mmiri, a na-akpọkwa ha “osisi oak nke ezi omume.” (Aịsaịa 61:1-3; Mkpughe 14:1-5) Ha amịpụtawo mkpụrụ ime mmụọ dị ukwuu n’elu ala. Dị ka ndị e meworo ka ha bilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe, n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, ha ga-ekere òkè n’ikesa uru nke ihe mgbapụta ahụ nke ga-arụ ọrụ maka “ime ka ahụ dị mba nile ike” site ná mmehie na ọnwụ.

18 Ruo n’ókè okwukwe anyị nwere ná ndokwa ndị a nke Chineke siruru ike, otú ahụ ka anyị ga-adịkwu njikere ịgbaso nduzi nke mmụọ ya ikere òkè na ha. Ihe àmà gosiri na izu òkè anụ ahụ ga-abịa ka mmadụ na-etinye okwukwe n’ebe Kraịst nọ, na-enwekwa ọganihu ime mmụọ. Ọ bụ ezie na a ga-ejiworị ụzọ ọrụ ebube gwọọ mmadụ ahụ esighị ike ọ bụla bụ isi, ọ ga na-abịaru izu okè nso ka ọ na-eme ihe ziri ezi. Ọ ga-anọgide na-ekere òkè ná ndokwa Chineke mere maka ọgwụgwọ site n’àjà Kraịst. Ya mere, okwukwe ga-enwe mmetụta n’anyị ịbụ ndị a gwọrọ, ndị e mekwara ka ha zuo okè n’ụzọ anụ ahụ.

‘Ndị A Zọpụtara Site n’Okwukwe’

19. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa iguzosi ike n’okwukwe?

19 Ruo mgbe chi ọbụbọ nke ụwa ọhụrụ Chineke ga-ewepụ ọchịchịrị nke ajọ usoro ihe dị ugbu a ruo mgbe ebighị ebi, lee nnọọ ka o si dị oké mkpa ka ndị ohu Jehova nọgide na-eguzosi ike n’okwukwe! Mmadụ “ndị na-ekweghị ekwe” ka a ga-atụba n’ime “ọdọ ọkụ na brimstone” ahụ, bụ́ ọnwụ nke abụọ. A sị nnọọ na ọ dịkarịala anya, nke a ga-ewere ọnọdụ mgbe ule ikpeazụ ahụ nke ga-abịa n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst gasịrị. (Mkpughe 20:6-10; 21:8) Lee nnọọ ka ọ ga-esi bụrụ ihe ngọzi nye ndị ahụ nọgidere na-egosipụta okwukwe ha ma dịrị ndụ inweta ọṅụ site n’ọdịnihu ebighị ebi!

20. Olee ụzọ 1 Ndị Kọrint 13:13 ga-esi nwee ihe pụrụ iche ọ pụtara n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst?

20 Mgbe ahụ, okwu ndị a nke Pọl nke dị ná 1 Ndị Kọrint 13:13 ga-enwe ihe pụrụ iche ha pụtara: “Ugbu a ka okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.” Ọ gaghị adịkwa anyị mkpa ọzọ inwe okwukwe na nkwa amụma ahụ dị na Jenesis 3:15 ga-abụ ihe mere eme, ma ọ bụkwanụ inwe olileanya na a ga-emezu ya. Nke ahụ ga-emeworị. Dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, anyị ga-anọgide na-enwe olileanya na Jehova, na-enwe okwukwe n’ebe ya na Ọkpara ya nọ, na-ahụkwa ha n’anya dị ka ndị kpatara mmezu nke amụma nke a. Ọzọkwa, ịhụnanya dị omimi na ekele sitere n’ala ala obi maka nzọpụta anyị ga-ekekọta anyị n’ebe Chineke nọ ná nraranye a na-apụghị imebi emebi ruo mgbe nile ebighị ebi.—1 Pita 1:8, 9.

21. Gịnị ka anyị kwesịrị ime taa ka anyị wee bụrụ ‘ndị e sitere n’okwukwe zọpụta’?

21 Site ná nzukọ ya a na-ahụ anya, Jehova emewo ndokwa ndị dị ebube iji wusie okwukwe ike. Jiri ha nile mee ihe n’ụzọ zuru ezu. Na-eje nzukọ nile nke ndị Chineke, na-ekerekwa òkè na ha. (Ndị Hibru 10:24, 25) Mụsie Okwu ya na akwụkwọ ndị Kraịst na-ebipụta ike. Rịọ Jehova arịrịọ maka mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ṅomie okwukwe nke ndị ahụ ji obi umeala na-edu ndú n’ime ọgbakọ. (Ndị Hibru 13:7) Guzogide ọnwụnwa nile nke ụwa. (Matiu 6:9, 13) Ee, mee ka mmekọrịta onwe onye dị n’etiti gị na Jehova dịwanye omimi n’ụzọ ọ bụla kwere omume. Karịsịa ihe nile, nọgide na-egosipụta okwukwe. Mgbe ahụ, ị pụrụ iso ná ndị ahụ na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, nwetakwa nzọpụta, n’ihi na Pọl kwuru, sị: “Ọ bụ amara ka e jiworo zọpụta unu, site n’okwukwe; nke a esiteghịkwa n’onwe unu: ọ bụ onyinye Chineke.”—Ndị Efesọs 2:8.

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Ule okwukwe dịgasị aṅaa na-eche anyị n’ihu ugbu a?

◻ N’ụzọ abụọ dị aṅaa ka okwukwe anyị pụrụ isi mee ka ahụ dị anyị mma?

◻ Dị ka 1 Pita 1:9 si kwuo, ruo ogologo oge ha aṅaa ka anyị na-aghaghị ijigide okwukwe anyị?

◻ Ndokwa dịgasị aṅaa ka anyị nwere iji wusie okwukwe anyị ike?

[Foto dị na peeji nke 15]

Dị ka nna ahụ onye Jisọs gwọrọ nwa ya nwoke, ị̀ na-enwe mkpa onwe onye nke inwekwu okwukwe?

[Foto dị na peeji nke 17]

Okwukwe yiri nke Noa na ezinụlọ ya ga-adị mkpa iji gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya