Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 8/15 p. 4-7
  • Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ike
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndokwa nke Iwu Mosis
  • Nanị Ihe Ndabere Dị n’Iwu Maka Ịgba Alụkwaghịm
  • A Kụọ Mkpụrụ nke Nsogbu Ezinụlọ
  • Kpazienụ Ihe Akpazie
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Mee Alụmdi na Nwunye Gị Njikọ Na-adịgide Adịgide
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 8/15 p. 4-7

Ụzọ E Si Eme Ka Nkekọ Alụmdi Na Nwunye Sie ike

“Ò ZIRI ezi n’iwu ka nwoke hapụ nwunye ya n’ihi ihe nile ọ bụla?” ka ndị Farisii jụrụ, bụ́ ndị na-agbalị ịmata Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, n’ọnyà. Ọ zara ajụjụ ha site n’izo aka n’alụmdi na nwunye mbụ nke mmadụ ma guzobe ụkpụrụ n’okwu ahụ: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”

Ndị Farisii rụrụ ụka na Mosis mere ndokwa maka ịgba alụkwaghịm site n’ikwu ka e nye “akwụkwọ nkewa.” Jisọs zaghachiri ha, sị: “Ọ bụ n’ihi obi etili unu ka Mosis kwere ka unu hapụ nwunye unu: ma site ná mmalite a dịghị eme otú a. Ma asị m unu, Onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ, ọ na-akwa iko.”—Matiu 19:3-9.

Na mbụ, alụmdi na nwunye gaara abụ nkekọ na-adịgide adịgide. Ọbụna ọnwụ agaraghị ekewa di na nwunye mbụ ahụ, n’ihi na e kere ha dị ka ụmụ mmadụ zuru okè ịdị ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, ha mehiere. Mmehie ha mebiri alụmdi na nwunye mmadụ. Onye iro ahụ bụ́ ọnwụ malitere ikewa di na nwunye. Chineke na-ele ọnwụ anya dị ka ọgwụgwụ nke alụmdi na nwunye, dị ka anyị na-agụ na Bible: “E kewo nwunye n’ahụ di ya ka oge di ya nọ ná ndụ hà; ma a sị na di ya adawo n’ụra ọnwụ, o nweere onwe ya ịlụ di ọ na-achọ; ma ọ bụ nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Nke a dị nnọọ iche pụọ n’echiche okpukpe ndị dị ka suttee, bụ́ ebe a na-aranye ma ọ bụ na-amanye onye bụ nwunye iji ọkụ gbagbuo onwe ya n’oge di ya nwụrụ ná nkwenkwe nke na nkekọ alụmdi na nwunye ahụ ga-anọ na-aga n’ihu n’ụwa ha ọzọ.

Ndokwa nke Iwu Mosis

N’oge e nyere Iwu Mosis, mmekọrịta alụmdi na nwunye adakpọwo n’ókè nke na Jehova, n’ihi obi ime etili nke ndị Israel, mere ndokwa maka ịgba alụkwaghịm. (Deuterọnọmi 24:1) Ọ bụghị nzube Chineke ka ndị Israel jiri iwu nke a nke ịgba nwunye ha alụkwaghịm mee ihe na-ezighị ezi n’ihi njehie ndị dị nta, dị ka ọ pụtara ìhè site n’iwu o nyere nke na ha ga-ahụ mmadụ ibe ha n’anya dị ka onwe ha. (Levitikọs 19:18) Ọbụna inye akwụkwọ ịgba alụkwaghịm jere ozi dị ka ihe mgbochi n’ihi na, dị ka akụkụ nke usoro ide akwụkwọ ahụ, di nke na-achọ ịgba alụkwaghịm aghaghị ijekwuru ndị ikom nwere ikike, bụ́ ndị ga-agba mbọ ịhụ na e kpeziri okwu ahụ. Ee e, Chineke enyeghị iwu a iji guzobe ikike ọ bụla mmadụ nwere ịgba nwunye ya alụkwaghịm “n’ihi ihe nile ọ bụla.”—Matiu 19:3.

Otú ọ dị, ndị Israel mesịrị leghara nzube nke iwu ahụ anya ma jiri ahịrị okwu nke a mere ihe mgbakwasị ụkwụ ịgba alụkwaghịm n’ihe ndabere ọ bụla masịrị mkpali ha. Ka ọ na-erule na narị afọ nke ise T.O.A., ha na-aghọ aghụghọ n’ebe nwunye ha lụrụ n’okorobịa nọ, na-agba ha alụkwaghịm n’ihi ihe nile ọ bụla. Jehova gwara ha okwu n’olu dị ike na ya kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị. (Malakaị 2:14-16) Ọ bụ n’ihi ọnọdụ ndị a mere Jisọs ji katọọ ịgba alụkwaghịm dị ka ndị Israel si eme ya n’ụbọchị ya.

Nanị Ihe Ndabere Dị n’Iwu Maka Ịgba Alụkwaghịm

Otú ọ dị, Jisọs hotara otu ihe ndabere dị n’iwu maka ịgba alụkwaghịm: ịkwa iko. (Matiu 5:31, 32; 19:8, 9) Okwu a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ịkwa iko” gụnyere ụdị mmekọahụ nile ọ bụla na-ezighị ezi nke na-abụghị n’ime alụmdi na nwunye kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ site n’isoro nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ma ọ bụ onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe gị ma ọ bụ anụmanụ mee ya.

Ọbụna ma nke ahụ mee, Jisọs adịghị atụ aro ịgba alụkwaghịm site n’aka ndị na-ekwesịghị ntụkwasị. Ọ bụ ihe dịịrị onye nke aka ya dị ọcha ịtụle ihe ndị pụrụ isi na ya pụta wee kpebie ma ọ chọrọ ịgba alụkwaghịm. Ndị nwunye na-eche echiche ịgba alụkwaghịm n’ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ nke a pụkwara ịchọ ịtụle okwu Chineke mgbe o kpere nwanyị mbụ ahụ ikpe maka mmehie ya. Tinyere ikpe ọnwụ ahụ, Chineke gwara Iv hoo haa, sị: “N’ebe di gị nọ ka ọchịchọ gị ga-adị, ya onwe ya ga-achịkwa gị.” (Jenesis 3:16) Akwụkwọ bụ́ Commentary on the Old Testament, nke C. F. Keil na F. Delitzsch dere, na-akọwa “ọchịchọ” nke a dị ka “agụụ siri ike nke yiri nnọọ ọrịa.” A pụrụ ikweta na ọchịchọ nke a esichaghị ike otú ahụ n’ime nwunye ọ bụla, ma mgbe nwunye aka ya dị ọcha na-atụle ịgba alụkwaghịm, ọ ga-abụrụ ya amamihe ịtụle mkpa mmetụta uche nke ụmụ nwanyị ketara site n’aka Iv. Otú ọ dị, ebe ịkwa iko n’akụkụ nke onye ikpe mara pụrụ iduga n’onye nke aka ya dị ọcha ibute ọrịa ndị a na-ebusa site ná mmekọahụ, gụnyere AIDS, ụfọdụ ekpebiwo ịgba alụkwaghịm dị ka Jisọs kọwara.

A Kụọ Mkpụrụ nke Nsogbu Ezinụlọ

Obi ịkpọ nkụ ndị mmadụ na-achọta mmalite ya ná mmehie ahụ di na nwunye mbụ ahụ mere megide Chineke. (Ndị Rom 5:12) A kụrụ mkpụrụ ọgba aghara ezinụlọ mgbe di na nwunye mbụ ahụ mehiere megide Nna ha nke eluigwe. N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe otu agwọ nwara nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv, iri site n’osisi ahụ a machibidoro iwu, ọ gara nnọọ n’ihu iri mkpụrụ ahụ. Ọ bụ nanị mgbe o mesiworo oké mkpebi ahụ ka ọ gwara di ya banyere ihe agwọ ahụ gwaworo ya. (Jenesis 3:6) Ee, o mewo ihe n’esoghị di ya kwurịta okwu. Nke a bụ ụdị mbụ nke nsogbu ọtụtụ ezinụlọ taa na-eche ihu—enweghị nkwurịta okwu sitere n’obi.

E mesịa, mgbe ihe sitere ná mmehie ha chere ha ihu, ma Adam ma Iv gbasoro otu ụzọ ime ihe ahụ nke ọtụtụ di na nwunye na-agbaso taa mgbe ha nọ ná nsogbu, ya bụ, ịta ndị ọzọ ụta. Nwoke mbụ ahụ, Adam, tara ma nwunye ya ma Jehova ụta maka ihe o meworo, na-asị: “Nwanyị ahụ nke i nyere m ka mụ na ya biri, ya onwe ya nyere m mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, m wee rie.” Nwanyị ahụ n’akụkụ nke ya sịrị: “Agwọ ahụ rafuru m, m wee rie.”—Jenesis 3:12, 13.

Ikpe ọmụma Jehova kwupụtara n’isi Adam na Iv bukwara amụma ihe ọzọ ná nsogbu ndị ga-ebilite. Banyere mmekọrịta ya na di ya, Jehova gwara Iv, sị: “Ya onwe ya ga-achịkwa gị.” Ọtụtụ ndị bụ di taa, dị ka Isao a kpọtụrụ aha n’isiokwu mbụ anyị, na-achị ndị nwunye ha n’ụzọ obi ọjọọ n’echeghị echiche banyere mmetụta nwunye ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị bụ nwunye na-enwe ọchịchọ maka mmasị di ha. Mgbe a na-emezughị ọchịchọ ahụ, ndị bụ nwunye pụrụ ịchọ iji ike nweta mmasị ahụ ma mee ihe n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Ebe ọtụtụ ndị bụ di na-achị achị, ọtụtụ ndị nwunye bụrụkwa ndị na-enwe ọchịchọ, ịchọ ọdịmma onwe onye na-ejupụta, udo na-efepụkwa. N’otu akwụkwọ isiokwu ya bụ́ “Ụzọ E Si Enyocha Ịgba Alụkwaghịm nke Taa,” Shunsuke Serizawa sịrị: “Ọ bụrụ na anyị elelịa ịdị ike dị ná mkpọrọgwụ isiokwu a nke ‘ime ihe onye chọrọ,’ ya bụ, idebe mmasị ndị nke onwe onye n’ọnọdụ mbụ, ọ ga-aghọ na mberede ihe na-agaghị ekwe omume inyocha ịgba alụkwaghị m ndị e nwere taa.”

Otú ọ dị, Jehova enyewo nduzi n’Okwu ya ka ndị lụrụ di na nwunye nwee ike inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke obi ụtọ alụmdi na nwunye ọbụna n’ọnọdụ ezughị okè ha. Isao gbasoro nduzi Chineke, ọ na-enwekwa ndụ ezinụlọ obi ụtọ ugbu a. Ka anyị lee otú ụkpụrụ dị iche iche nke Bible si enyere ndị mmadụ aka ime ka nkekọ alụmdi na nwunye ha sie ike.

Kpazienụ Ihe Akpazie

N’ọtụtụ alụmdi nwunye, enweghị nkwurịta okwu, ọchịchọ ịta ndị ọzọ ụta, na àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-eme ka o siere di na nwunye ike ịghọta mmetụta uche ibe ha. “Dabere n’ikerịta mmetụta, ịnọ nso chọrọ oké ntụkwasị obi. Taakwa ntụkwasị obi dị ụkọ,” ka onye nnyocha bụ́ Caryl S. Avery na-ekwu. Nnukọba nke mmetụta ndị miri emi e kerịtara na-ewulite ntụkwasị obi dị otú ahụ. Nke a chọrọ nkwurịta okwu sitere n’ala ala obi n’etiti di na nwunye.

Ilu ji ihe atụ na-agba ume ikerịta echiche ndị miri emi, na-asị: “Mmiri nke miri emi ka ndụmọdụ n’obi mmadụ bụ; ma onye nghọta ga-adọpụta ya.” (Ilu 20:5) Di na nwunye aghaghị inwe nghọta ma dọpụta echiche ndị dị n’ime ime obi onye ha lụrụ. Ka e were na obi adịghị nwunye gị ma ọ bụ di gị mma. Kama ịzaghachi, sị: “Ụbọchị taa sikwaara mụ onwe m ike,” gịnị ma ị jụọ n’obi ọma, sị: “Ụbọchị taa ò siere gị ike? Gịnị mere?” Ọ pụrụ iwe oge na mgbalị ige onye ị lụrụ ntị, ma ọ na-enyekarị obi ụtọ karị, na-eju afọ karị, na-echebekwa oge karị itinye oge n’ụzọ dị otú ahụ kama ileghara di ma ọ bụ nwunye gị anya ma chee oké mmetụta uche ndị ga-ebilite n’ọdịnihu ihu.

Iji nweta ntụkwasị obi, onye ọ bụla aghaghị ịdị na-ekwu eziokwu ma na-anwa ịkọwapụta mmetụta n’ụzọ onye nke ọzọ pụrụ ịghọta. “Na-ekwunụ eziokwu,” ka Okwu Chineke na-agba ume, “n’ihi na anyị na-abụrịta ihe dị n’ahụ ibe anyị.” (Ndị Efesọs 4:25) Ikwu eziokwu chọrọ nghọta. Ka e were na nwunye na-eche na a dịghị aṅa ya ntị. Tupu o kwuo okwu, o kwesịrị ịtụle ilu ahụ bụ́: “Onye na-egbochi okwu ọnụ ya maara ihe ọmụma: ọzọ, onye mmụọ ya jụụrụ ajụrụ bụ onye nghọta.” (Ilu 17:27) Kama ibo di ya ebubo, “Ọ dịghị mgbe ị na-ege m ntị!” ọ ga-aka mma iji ịdị jụụ kọwapụta mmetụta ya tupu obi nkoropụ na mmechu ihu ejupụta ya obi. Ma eleghị anya ọ pụrụ ikpughe otú ọ dị ya site n’ikwu ihe dị ka, “Amaara m na i ji ọrụ n’aka, ma inwekwu oge iso gị nọrọ ga-eme m obi ụtọ nke ukwuu.”

N’ezie, “mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” (Ilu 15:22) Di ma ọ bụ nwunye gị hụrụ gị n’anya, ma nke ahụ apụtaghị na ọ pụrụ ịma ihe dị gị n’uche. Ị ghaghị iji ụzọ akọ mee ka di ma ọ bụ nwunye gị mara mmetụta gị. Nke a ga-enyere unu aka, dị ka di na nwunye bụ́ ndị Kraịst, ime nhazigharị ịhụnanya iji ‘debe ịdị n’otu nke mmụọ nsọ n’ime ihe okike nke bụ́ udo.’—Ndị Efesọs 4:2, 3.

Were Kazuo dị ka ihe atụ, bụ́ di nwunye ya na-achị nke nwere oké ọchịchọ maka ịgba chaa chaa. Ọ chọtara onwe ya ka ụgwọ ruru ọtụtụ narị puku dollar na-anyịgbu ya. Site n’ibite ego iji kwuo ụgwọ ya, o mikpukwuru n’apịtị ahụ. O wee malite ịmụ Bible ma mesịa nweta obi ike ịgwa nwunye ya maka nsogbu ya nile. Ọ dị njikere iche ebubo ya dị iche iche ihu. Otú ọ dị, o juru ya anya mgbe nwunye ya, onye nọworo na-amụ Bible ogologo oge karị, ji ịdị jụụ zaghachi: “Ka anyị nwaa ịchọta ụzọ isi kwụpụ ụgwọ ndị ahụ.”

Na-amalite ụbọchị nke na-eso, ha letara ndị ha ji ụgwọ wee malite ịkwụ ụgwọ ha ji, ọbụna ree ụlọ ha. O were ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu afọ iji kwụsịa ụgwọ nile. Gịnị gbanwere Kimie, bụ́ nwunye ya? Ọ sịrị: “Okwu ndị a na-achọta ná Ndị Filipaị isi 4, amaokwu nke 6 na 7, bụ nnọọ eziokwu. ‘Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.’” O kwukwasịrị: “Otu enyi m, n’ijuanya otú m si enwe ihu ọchị n’agbanyeghị ihe isi ike nile, malitere iso m na-amụ Bible.” E meworị Kazuo na nwunye ya baptism, ha na-enwekwa ugbu a ndụ ezinụlọ obi ụtọ.

Gụnyere ịtụkwasịrịta onwe ha obi site n’ikwu eziokwu, di na nwunye ndị nwere ahụmahụ ndị ahụ dị n’elu mere otu ihe na-enyere ndị di na nwunye aka idozi nsogbu ezinụlọ ha. Ha soro Onye Mmalite ndokwa alụmdi na nwunye, Jehova Chineke, kwurịta okwu. N’agbanyeghị nrụgide na ihe isi ike nile ndị di na nwunye pụrụ iche ihu, ọ ga-eji udo Chineke nke kachasị uche nile gọzie ha ma mee ihe nile ha pụrụ ime iji tinye ụkpụrụ ya dị iche iche n’ọrụ ma hapụ ihe fọrọ n’aka ya. Ikpekọ ekpere ọnụ na-enye aka karịsịa. Onye bụ di kwesịrị ibute ụzọ ma ‘wụpụta obi ya’ n’ihu Chineke, na-achọ nduzi na ntụzi ya ná nsogbu ọ bụla ya na nwunye ya pụrụ ịdị na-eche ihu. (Abụ Ọma 62:8) Jehova Chineke ga-anụ nnọọ ekpere ndị dị otú ahụ.

Ee, o kwere omume imesiwanye ihe nkekọ alụmdi na nwunye ike. Ọbụna ugbu a, ka anyị ji ezughị okè anyị nile na-ebi n’ime ọha mmadụ na-agba aghara, ndị lụrụ di na nwunye pụrụ ịchọta ọṅụ dị ukwuu ná mmekọrịta ha. Ị pụrụ ịchọtakwu aro ndị dị irè na ndụmọdụ Chineke n’akwụkwọ bụ́ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara. Ọzọkwa, ndị di na nwunye na-arụsi ọrụ ike itinye ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ nwere olileanya nke ịbụ ndị e kekọtara ọnụ n’ịhụnanya n’ime ụwa ọhurụ na-abịaru nso nke Chineke mere.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya