Ị̀ Ga-esi Aṅaa Guzo n’Ihu Oche Ikpe Ahụ?
“Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya.”—MATIU 25:31.
1-3. Gịnị mere anyị ga-eji nwee olileanya dị mma banyere ikpe ziri ezi?
‘IKPE Ọ̀ MARA GỊ KA AKA GỊ Ọ̀ DỊ ỌCHA?’ Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya mgbe ha na-anụ akụkọ banyere ikpe ụfọdụ nke ụlọikpe. Ndị ikpe na ndị òtù ikpe pụrụ ịgbalị ịkwụwa aka ọtọ, ma à na-enwekarị ikpe ziri ezi? Ọ̀ bụ na ị nụbeghị banyere ikpe na-ezighị ezi na akwụwaghị aka ọtọ n’usoro ikpe ikpe? Ikpe na-ezighị ezi dị otú ahụ abụghị ihe ọhụrụ, dị ka anyị na-ahụ n’ihe atụ Jisọs nke dị na Luk 18:1-8.
2 N’agbanyeghị ahụmahụ i nweworo banyere ikpe ziri ezi nke ụmụ mmadụ, rịba nkwubi okwu Jisọs ama: “Chineke, Ọ́ gaghị ekpepụta ndị nke Ya a họpụtara, ndị na-akpọku Ya ehihie na abalị . . . ? Asị m unu, na Ọ ga-ekpepụta ha ọsọ ọsọ. Otú ọ dị, mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, Ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”
3 Ee, Jehova ga-ahụ na ndị ohu ya ga-emesịa nweta ikpe ziri ezi. O metụtakwara Jisọs, karịsịa ugbu a n’ihi na anyị na-ebi “na mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe ọjọọ nke dị ugbu a. N’isi nso Jehova ga-eji Ọkpara ya dị ike mee ihe iji hichapụ ajọ omume n’elu ala. (2 Timoti 3:1; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8; Mkpughe 19:11-16) Anyị pụrụ ịghọta òkè Jisọs site n’otu n’ime ihe atụ ndị ikpeazụ o nyere, bụ́ nke a na-akpọkarị ilu atụrụ na ụmụ ewu.
4. Olee otú anyị siworo ghọta oge ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ ga-emezu, ma n’ihi gịnị ka anyị ga-eji leba anya n’ilu ahụ ugbu a? (Ilu 4:18)
4 Anyị anọwo na-aghọta eri ogologo oge na ilu ahụ gosiri nnọdụ ala nke Jisọs dị ka Eze na 1914, kemgbe ahụkwa na-enye mkpebi ikpe dị iche iche—ndụ ebighị ebi maka ndị na-egosipụta onwe ha ịbụ ndị yiri atụrụ, ọnwụ na-adịgide adịgide maka ụmụ ewu. Ma ntụleghachi nke ilu ahụ na-ezo aka ná nghọta a gbanwere agbanwe banyere oge ọ ga-eme na ihe ọ na-egosi. Mmezigharị nke a na-emesi ike ịdị mkpa nke ọrụ nkwusa anyị na ihe mmeghachi omume nke ndị mmadụ pụtara. Iji hụ ebe mgbakwasị ụkwụ maka nghọta a ka mie emi nke ilu ahụ, ka anyị tụlee ihe Bible na-egosi banyere Jehova na Jisọs, ha abụọ dị ka Ndị Eze na Ndị Ikpe.
Jehova Dị Ka Onye Ikpe Kasị Ukwuu
5, 6. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ile Jehova anya dị ka ma Eze ma Onye Ikpe?
5 Jehova na-achị eluigwe na ala, na-enwe ike n’elu ihe nile. N’enweghị mmalite na ọgwụgwụ, ọ bụ “Eze nke mgbe nile.” (1 Timoti 1:17; Abụ Ọma 90:2, 4; Mkpughe 15:3) O nwere ikike inye ụkpụrụ iwu, ma ọ bụ iwu, na ịhụ na e debere ndị a. Ma ikike ya gụnyere ịbụ Onye Ikpe. Aịsaịa 33:22 na-asị: “Jehova bụ onye ikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ eze anyị; Ya onwe ya ga-azọpụta anyị.”
6 Ndị ohu Chineke amatawo Jehova eri ogologo oge dị ka Onye Ikpe nke okwu ikpe na esemokwu dị iche iche. Dị ka ihe atụ, mgbe “Onye ikpe ụwa nile” tụlesịworo ihe àmà e nwere banyere ajọ omume nke Sọdọm na Gọmọra, o kpebiri na ndị bi n’obodo ndị ahụ kwesịrị mbibi ma hụkwa na e mezuru ikpe ezi omume ahụ. (Jenesis 18:20-33; Job 34:10-12) Lee ka o kwesịrị isi mesie anyị obi ike ịmara na Jehova bụ Onye Ikpe ezi omume onye pụrụ imezu ikpe ya mgbe nile!
7. Olee otú Jehova si rụọ ọrụ dị ka Onye Ikpe n’imeso Israel ihe?
7 N’Israel oge ochie, mgbe ụfọdụ Jehova nyere mkpebi ikpe ozugbo. Ọ̀ bụ na a gaghị akasiworị gị obi laa azụ n’oge ahụ ịmara na Onye Ikpe zuru okè na-ekpebi okwu? (Levitikọs 24:10-16; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36; 27:1-11) Chineke nyekwara “ikpe” ndị dị mma n’ozuzu ha ịbụ ụkpụrụ maka ikpe ikpe. (Levitikọs 25:18, 19; Nehemaịa 9:13; Abụ Ọma 19:9, 10; 119:7, 75, 164; 147:19, 20) Ọ bụ “Onye ikpe nke ụwa nile,” ya mere o metụtara anyị nile.—Ndị Hibru 12:23.
8. Ọhụụ dị aṅaa metụtara ihe a na-ekwu ka Daniel hụrụ?
8 N’okwu a, anyị nwere akaebe nke “onye ji anya ya hụ ihe merenụ.” E nyere Daniel onye amụma ọhụụ nke ajọ anụ ọhịa ndị nọchitere anya ọchịchị ma ọ bụ alaeze ukwu dị iche iche. (Daniel 7:1-8, 17) O kwukwasịrị: “A tụdasịrị ocheeze dị iche iche, otu Onye ochie wee nọdụ ala: uwe Ya dị ọcha dị ka snow.” (Daniel 7:9) Rịba ama na Daniel hụrụ ocheeze dị iche iche ‘Onye ochie [Jehova] wee nọdụ ala.’ Jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe Daniel na-ahụ n’ebe a ọ̀ bụ ka Chineke na-aghọ Eze?’
9. Gịnị bụ otu n’ime ihe ‘ịnọdụ ala’ n’ocheeze pụtara? Nye ihe atụ.
9 Otú ọ dị, mgbe anyị gụrụ na mmadụ ‘nọdụrụ ala’ n’ocheeze, anyị pụrụ iche echiche banyere ya ịghọ eze, n’ihi na Bible na-eji okwu dị otú ahụ eme ihe mgbe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ: “Mgbe [Zimri] malitere ịbụ eze, mgbe ọ nọkwasịrị n’ocheeze ya, na o . . .” (1 Ndị Eze 16:11; 2 Ndị Eze 10:30; 15:12; Jeremaịa 33:17) Otu amụma banyere Mesaịa ahụ kwuru, sị: ‘Ọ ghaghị ịnọdụ ala na-achị n’ocheeze ya.’ N’ihi ya, ‘ịnọdụ n’ocheeze’ pụrụ ịpụta ịghọ eze. (Zekaraịa 6:12, 13) A kọwara Jehova dị ka Eze nke na-anọkwasị n’ocheeze. (1 Ndị Eze 22:19; Aịsaịa 6:1; Mkpughe 4:1-3) Ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi.” Ma, ka o gosipụtara akụkụ ọhụrụ nke ọkaaka, a pụrụ ikwu na ọ ghọọla Eze, dị ka a ga-asị na ọ na-anọkwasịghachi ọhụrụ n’ocheeze ya.—1 Ihe Emere 16:1, 31; Aịsaịa 52:7; Mkpughe 11:15-17; 15:3, NW; 19:1, 2, 6.
10. Gịnị bụ ọrụ bụ isi nke ndị eze Israel? Mee ihe atụ.
10 Ma e nwere otu isi ihe n’ebe a: Ọrụ bụ isi nke ndị eze oge ochie bụ ịnụrụ okwu ikpe na inye mkpebi ikpe. (Ilu 20:8; 29:14) Cheta mkpebi ikpe amamihe dị na ya nke Solomọn nyere mgbe ụmụ nwanyị abụọ na-azọ otu nwa ọhụrụ. (1 Ndị Eze 3:16-28; 2 Ihe Emere 9:8) Otu n’ime ihe owuwu nke ọchịchị ya bụ “ụzọ mbata nke ocheeze ebe ọ ga na-ekpe ikpe,” bụ nke a na-akpọkwa “ụzọ mbata ikpe.” (1 Ndị Eze 7:7) A kọwara Jerusalem dị ka ebe “e doworo ocheeze nile ikpe ikpe.” (Abụ Ọma 122:5) N’ụzọ doro anya, ‘ịnọkwasị n’ocheeze’ pụkwara ịpụta iji ike ikpe mee ihe.—Ọpụpụ 18:13; Ilu 20:8.
11, 12. (a) Gịnị ka Jehova ịnọdụ ala, bụ́ nke e hotara na Daniel isi nke 7, pụtara? (b) Olee otú akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ si akwado na Jehova na-anọdụ ala ikpe ikpe?
11 Ugbu a ka anyị laghachi n’ebe ahụ Daniel hụrụ ‘Onye ochie ahụ ka ọ nọdụrụ ala.’ Daniel 7:10 na-ekwukwasị: “Onye ikpe ahụ nọdụrụ ala, a saghekwara akwụkwọ dị iche iche.” Ee, Onye Ochie ahụ na-anọdụ ala inye mkpebi ikpe banyere ọchịchị ụwa na ikwupụta Nwa nke mmadụ dị ka onye ruru eru ịchị achị. (Daniel 7:13, 14) Mgbe ahụ anyị na-agụ na ‘Onye ochie ahụ bịara, ikpe lakwaara ndị nsọ ahụ,’ bụ́ ndị e kwupụtara na ha ruru eru isoro Nwa nke mmadụ chịa achị. (Daniel 7:22) N’ikpeazụ “Onye ikpe ahụ ga-anọdụ ala” wee nye mkpebi ikpe na-agaghị adịrị ike ụwa ikpeazụ mma.—Daniel 7:26.a
12 Ya mere, Daniel ịhụ ka Chineke ‘nọkwasịrị n’ocheeze’ pụtara Ya ịbịa nye mkpebi ikpe. Tupu mgbe ahụ Devid bụrụ abụ, sị: “I [Jehova] kpewo ikpe m ziri ezi na okwu ikpe m; Ị nọdụrụ n’ocheeze, bụrụ onye ikpe na-eme ezi omume.” (Abụ Ọma 9:4, 7) Joel dekwara, sị: “Ka mba nile teta, rịgota na ndagwurugwu Jehoshafat: n’ihi na n’ebe ahụ ka M [Jehova] ga-anọdụ ikpe mba nile bi gburugburu ikpe.” (Joel 3:12; tụlee Aịsaịa 16:5.) Ma Jisọs ma Pọl bara n’ọnọdụ ikpe bụ́ ebe mmadụ weere oche ịnụrụ okwu ikpe na inye mkpebi ikpe.b—Jọn 19:12-16; Ọrụ 23:3; 25:6.
Ọkwá Jisọs
13, 14. (a) Mmesi obi ike dị aṅaa ka ndị Chineke nwere na Jisọs gaje ịghọ Eze? (b) Olee mgbe Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze ya, n’echiche dịkwa aṅaa ka ọ malitere ịchị na 33 O.A. gaa n’ihu?
13 Jehova bụ ma Eze ma Onye Ikpe. Olee banyere Jisọs? Mmụọ ozi nke na-ama ọkwa ọmụmụ ya kwuru, sị: “Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: . . . alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.” (Luk 1:32, 33) Jisọs gaje ịbụ onye nketa na-adịgide adịgide nke ọbụbụeze Devid. (2 Samuel 7:12-16) Ọ gaje ịchị site n’eluigwe, n’ihi na Devid sịrị: “Ihe nke si n’ọnụ Jehova pụta na-asị onyenwe m [Jisọs], Nọdụ ala n’aka nri m. Ruo mgbe M ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ dịịrị ụkwụ gị abụọ. Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị.”—Abụ Ọma 110:1-4.
14 Olee mgbe nke ahụ ga-eme? Jisọs achịghị dị ka Eze n’oge ọ bụ mmadụ. (Jọn 18:33-37) Na 33 O.A., ọ nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ, ọ rịgookwa n’eluigwe. Ndị Hibru 10:12 na-asị: “Onye ahụ, mgbe O chererị otu àjà n’ihu Chineke n’ihi mmehie, O wee nọdụ n’aka nri Chineke mgbe nile.” Olee ikike Jisọs nwere? “[Chineke] meekwa ka Ọ nọdụ n’aka nri Ya n’ebe dị n’eluigwe, kachasị ha nile elu, bụ́ ịbụ onye isi, na ịchịisi, na ike, na ịbụ onyenwe mmadụ . . . O mere ka Ọ bụrụ isi n’elu ihe nile n’ebe nzukọ Ya nọ.” (Ndị Efesọs 1:20-22) N’ihi na Jisọs nwere n’oge ahụ ikike eze n’elu ndị Kraịst, Pọl pụrụ ide na Jehova “dọpụtara anyị n’ike nke ọchịchịrị, wee webiga anyị n’alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya Ya.”—Ndị Kọlọsi 1:13; 3:1.
15, 16. (a) N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo na Jisọs aghọghị Eze nke Alaeze Chineke na 33 O.A.? (b) Olee mgbe Jisọs malitere ịchị n’Alaeze Chineke?
15 Otú ọ dị, n’oge ahụ Jisọs emeghị ihe dị ka Eze na Onye Ikpe n’elu mba nile. Ọ nọdụrụ ala na-esote Chineke, na-echere oge ime ihe dị ka Eze nke Alaeze Chineke. Pọl dere banyere ya, sị: “Ọ̀ bụ ònye n’etiti ndị mmụọ ozi ka O kwuworo okwu banyere ya mgbe ọ bụla, sị, Nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe M ga-edo ndị iro Gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ Gị abụọ?”—Ndị Hibru 1:13.
16 Ndịàmà Jehova ebipụtawo ihe àmà dị ukwuu na oge nchere nke Jisọs gwụsịrị na 1914, mgbe ọ ghọrọ onye ọchịchị nke Alaeze Chineke n’eluigwe nke anya na-adịghị ahụ. Mkpughe 11:15, 18 na-asị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst Ya: Ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” “Mba nile wee wee iwe, iwe Gị wee bịa.” Ee, mba nile wesoro ibe ha iwe n’oge Agha Ụwa Mbụ. (Luk 21:24) Agha, ala ọma jijiji, ajọ ọrịa na-efe efe, ụkọ nri, na ihe ndị yiri ha ndị anyị hụworo kemgbe 1914 na-akwado na Jisọs na-achị achị ugbu a n’Alaeze Chineke, ọgwụgwụ ikpeazụ nke ụwa dịkwa nso.—Matiu 24:3-14.
17. Isi ihe ndị dị aṅaa ka anyị meworo ka ọ pụta ìhè rute ugbu a?
17 Ná ntụleghachi dị mkpirikpi: A pụrụ ikwu na Chineke na-anọkwasị n’ocheeze dị ka Eze, ma n’echiche ọzọ ọ pụrụ ịnọkwasị n’ocheeze ya ikpe ikpe. Na 33 O.A., Jisọs nọdụrụ ala n’aka nri Chineke, ọ bụkwa Eze nke Alaeze ahụ ugbu a. Ma Jisọs, nke na-achị ugbu a dị ka Eze, ọ̀ na-ejekwa ozi dị ka Onye Ikpe? N’ihi gịnịkwa ka nke a kwesịrị iji gbasa anyị, karịsịa n’oge a?
18. Olee ihe àmà e nwere na Jisọs ga-abụkwa Onye Ikpe?
18 Jehova, onye nwere ikike ịhọpụta ndị ikpe, họọrọ Jisọs dị ka Onye Ikpe nke ruru ụkpụrụ ndị Ọ chọrọ. Jisọs gosipụtara nke a mgbe ọ na-ekwu banyere ndị mmadụ ịghọ ndị dị ndụ n’ụzọ ime mmụọ: “Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama O werewo ikpe nile nye Ọkpara Ya.” (Jọn 5:22) Ma, ọrụ ikpe ikpe nke Jisọs karịrị ụdị ikpe ikpe ahụ, n’ihi na ọ bụ onye ikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. (Ọrụ 10:42; 2 Timoti 4:1) Pọl kwuru n’otu oge, sị: “[Chineke edebewo] otu ụbọchị, nke Ọ ga-ekpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka otu Nwoke [Jisọs] Ọ kara aka; O nyekwara mmadụ nile ihe ha ga-eji kwere nke a, ebe O mere ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”—Ọrụ 17:31; Abụ Ọma 72:2-7.
19. N’ihi gịnị ka o ji zie ezi ikwu banyere Jisọs dị ka onye na-anọdụ ala dị ka Onye Ikpe?
19 Ànyị si otú a zie ezi ikwubi na Jisọs na-anọdụ ala n’ocheeze ebube kpọmkwem n’ọkwá nke Onye Ikpe? Ee. Jisọs gwara ndị ozi ahụ, sị: “Ná nkegharị ahụ, mgbe Nwa nke mmadụ nọkwasịrị n’ocheeze ya dị ebube, unu ndị sowooro m, unu onwe unu kwa ga-anọkwasị n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.” (Matiu 19:28, NW) Ọ bụ ezie na Jisọs bụ ugbu a Eze nke Alaeze ahụ, ọrụ ya ọzọ e hotara na Matiu 19:28 ga-agụnye ịnọkwasị n’ocheeze iji kpee ikpe na Narị Afọ Iri ahụ. N’oge ahụ ọ ga-ekpe ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume. (Ọrụ 24:15) Ọ na-enye aka iburu nke a n’uche ka anyị na-eche ihu n’otu n’ime ilu Jisọs nke metụtara oge anyị na ndụ anyị.
Gịnị Ka Ilu ahụ Na-ekwu?
20, 21. Gịnị ka ndị ozi Jisọs jụrụ nke na-emetụta oge anyị, na-eduje n’ajụjụ dị aṅaa?
20 Ntakịrị oge tupu Jisọs anwụọ, ndị ozi ya jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Jisọs buru amụma banyere oké ihe omume ndị ga-ewere ọnọdụ n’ụwa tupu ‘ọgwụgwụ ahụ eruo.’ Ntakịrị oge tupu ọgwụgwụ ahụ eruo, mba nile “ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.”—Matiu 24:14, 29, 30.
21 Otú ọ dị, olee otú ihe ga-adịrị ndị nọ ná mba ndị ahụ mgbe Nwa nke mmadụ bịara n’ebube ya? Ka anyị chọpụta site n’ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ, nke ji okwu ndị a malite: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ.”—Matiu 25:31, 32.
22, 23. Isi ihe ndị dị aṅaa na-egosi na ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ amaliteghị mmezu ya na 1914?
22 Ilu nke a ò mezuru mgbe Jisọs nọdụrụ ala n’ike eze na 1914, dị ka anyị nọworo na-aghọta eri ogologo oge? Ọ dị mma, Matiu 25:34 na-ekwu banyere ya dị ka Eze, ya mere n’ụzọ ezi ìzù dị na ya ilu ahụ na-enwe mmezu ya kemgbe Jisọs ghọrọ Eze na 1914. Ma ikpe ikpe dị aṅaa ka o kpere ngwa ngwa mgbe nke ahụ gasịrị? Ọ bụghị ikpe “mba nile” ikpe. Kama nke ahụ, o chere ihu ya n’ebe ndị ahụ na-azọrọ na ha bụ ‘ụlọ Chineke’ dị. (1 Pita 4:17) N’ikwekọ na Malakaị 3:1-3, Jisọs, dị ka onye ozi nke Jehova, nyochara ndị Kraịst e tere mmanụ fọdụrụ n’elu ala n’ụzọ ikpe ikpe. Ọ bụkwa oge ịma Krisendọm ikpe, bụ́ ndị zọọrọ n’ụzọ ụgha ịbụ ‘ụlọ Chineke.’c (Mkpughe 17:1, 2; 18:4-8) Ma ọ dịghị ihe na-egosi na n’oge ahụ, ma ọ bụkwanụ, eri oge ahụ, na Jisọs nọdụrụ ala ikpe ndị nke mba nile ikpe n’ikpeazụ dị ka atụrụ ma ọ bụ ụmụ ewu.
23 Ọ bụrụ na anyị enyochaa ọrụ Jisọs n’ilu ahụ, anyị na-ahụ ya ka ọ na-ekpe mba nile ikpe n’ikpeazụ. Ilu ahụ adịghị egosi na ikpe ikpe dị otú ahụ ga-aga n’ihu ruo ogologo oge nke ọtụtụ afọ, dị ka a ga-asị na onye ọ bụla nke na-anwụ n’ime afọ iri ndị a gara aga bụ onye e kpebiri na o ruru eru inweta ọnwụ ebighị ebi ma ọ bụ ndụ ebighị ebi. O yiri ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nwụworo n’ime afọ iri ndị na-adịbeghị anya agaala n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 6:8; 20:13) Otú ọ dị, ilu ahụ na-egosi oge mgbe Jisọs ga-ekpe ndị nke “mba nile” ikpe bụ́ ndị nọ ndụ mgbe ahụ ma na-eche mmezu nke amamikpe ya ihu.
24. Olee mgbe ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ gaemezu?
24 N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ilu ahụ na-ezo aka n’ọdịnihu mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya. Ọ ga-anọdụ ala ikpe ndị dị ndụ n’oge ahụ ikpe. Mkpebi ikpe ya ga-adabere n’ihe ha gosipụtaworo na ha bụ n’onwe ha. N’oge ahụ, a ga-emeworị ka “ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu” pụta ìhè. (Malakaị 3:18) A ga-emezu ịma ikpe ahụ na mmezu ya kpọmkwem n’ime mkpirikpi oge. Jisọs ga-enye mkpebi ikpe ndị ziri ezi dabere n’ihe ndị pụtaworo ìhè banyere ndị mmadụ n’otu n’otu.—Leekwa 2 Ndị Kọrint 5:10.
25. Gịnị ka Matiu 25:31 na-egosi n’ikwu banyere Nwa nke mmadụ ịnọkwasị n’ocheeze ebube?
25 Nke a pụtaziri na Jisọs ‘ịnọkwasị n’ocheeze nke ebube Ya’ maka ikpe ikpe, bụ́ nke e hotara na Matiu 25:31, ga-emezu n’ọdịnihu mgbe Eze a dị ike ga-anọdụ ala ịma mba nile ikpe na imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ha. Ee, ọnọdụ ikpe ahụ metụtara Jisọs nke dị na Matiu 25:31-33, 46 bụ nke a pụrụ iji tụnyere ọnọdụ dị na Daniel isi nke 7, bụ́ ebe Eze ahụ na-achị achị, Onye Ochie ahụ, nọdụrụ ala ịrụ ọrụ ya dị ka Onye Ikpe.
26. Nkọwa ọhụrụ dị aṅaa nke ilu ahụ na-apụta ìhè?
26 Ịghọta ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ n’ụzọ dị otú a na-egosi na inye mkpebi ikpe banyere atụrụ na ụmụ ewu ahụ bụ n’ọdịnihu. Ọ ga-ewere ọnọdụ mgbe “mkpagbu” ahụ e hotara na Matiu 24:29, 30 tiwapụsịrị, Nwa nke mmadụ ‘bịakwa n’ebube ya.’ (Tụlee Mak 13:24-26.) Mgbe ahụ, ebe ajọ usoro ihe dum bịaworo ná njedebe ya, Jisọs ga-enwe nnọkọ ikpe ma nye mkpebi ikpe, mezuokwa ha.—Jọn 5:30; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:7-10.
27. Gịnị ka anyị kwesịrị inwe mmasị ịmara banyere ilu ikpeazụ Jisọs?
27 Nke a na-eme ka nghọta anyị banyere oge ilu Jisọs ga-emezu dowanye anya, bụ́ nke na-egosi mgbe a ga-ekpe atụrụ na ụmụ ewu ahụ ikpe. Ma olee otú o si emetụta anyị bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ? (Matiu 24:14) Ọ̀ na-eme ka ọrụ anyị ghara ịdịchakwa mkpa, ka ọ̀ na-eweta ibu ọrụ ka ukwuu? Ka anyị lee n’isiokwu na-esonụ otú o si emetụta anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ “Onye ikpe” na Daniel 7:10, 26 dịkwa n’Ezra 7:26 na Daniel 4:37; 7:22.
b Banyere ndị Kraịst ịkpụpụ ibe ha n’ụlọikpe, Pọl jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ ndị ikom a na-eleda anya n’ọgbakọ ka unu na-eme ndị ikpe [n’ụzọ nkịtị “ka unu na-eme ka ha nọkwasị n’oche”]?”—1 Ndị Kọrint 6:4, NW.
c Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 56, 73, 235-245, 260, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú Jehova si arụ ọrụ dị ka ma Eze ma Onye Ikpe?
◻ Olee ihe abụọ ‘ịnọdụ n’ocheeze’ pụrụ ịpụta?
◻ Gịnị ka anyị kwuru na mbụ banyere oge mmezu nke Matiu 25:31, ma olee ihe mgbakwasị ụkwụ e nwere maka nghọta a gbanwere agbanwe?
◻ Olee mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze ya, dị ka e gosiri na Matiu 25:31?