Icheta Ụbọchị Ndị Ikpeazụ nke Jisọs n’Ụwa
Ọ BỤ n’ụbọchị nke asaa n’ọnwa ndị Juu bụ́ Nisan n’afọ 33 O.A. Cheedị echiche na ị na-ahụ ihe ndị na-eme n’ógbè ndị Rom nke Judia. N’ịhapụ Jeriko na ahịhịa ndụ tojupụtara na ya, Jisọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya na-azọ ije n’ụzọ ájá uzuzu, nke gbagọrọ agbagọ. Ọtụtụ ndị njem ndị ọzọ na-agakwa Jerusalem maka Ememe Ngabiga ahụ a na-eme kwa afọ. Otú ọ dị, ihe karịrị ịrị ugwu a na-agwụ ike dị n’uche ndị na-eso ụzọ Kraịst.
Ndị Juu anọwo na-enwe ọchịchọ maka Mesaịa onye pụrụ iweta ahụ efe pụọ na yoke ndị Rom. Ọtụtụ kwere na Jisọs onye Nazaret bụ Onye Nzọpụta ahụ e chewere kemgbe. Ruo afọ atọ na ọkara, ọ nọwo na-ekwu okwu banyere Alaeze Chineke. Ọ gwọwo ndị ọrịa, nyekwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri. Ee, o wetaworo ndị ahụ nkasi obi. Ma ndị ndú okpukpe na-ewe iwe n’ihi nkatọ na-akpasu iwe Jisọs na-akatọ ha, ha kpebisikwara ike igbu ya. Ma, leenụ ya, ka ọ na-azọ ije dị ka onye ihe dị mkpa n’okporo ụzọ ahụ kpọrọ nkụ n’ihu ndị na-eso ụzọ ya.—Mak 10:32.
Ka anyanwụ na-ada n’azụ Ugwu Olive dị ha n’ihu, Jisọs na ndị enyi ya ruru obodo Betani, bụ́ ebe ha ga-anọ abalị isii ndị na-esonụ. Ndị nọ ebe ahụ ịnabata ha bụ ndị enyi ha ha hụrụ n’anya bụ́ Lazarọs, Meri, na Mata. Uhuruchi ahụ ghọrọ oge izu ike dị jụụ maka njem ahụ ha mere n’oké anwụ, bụrụkwa mmalite nke Ụbọchị Izu Ike nke Nisan 8.—Jọn 12:1, 2.
Nisan 9
Mgbe Ụbọchị Izu Ike ahụ gasịrị, ihe omume na-akpọtụ na Jerusalem. Ọtụtụ puku ndị ọbịa ezukọtaworị n’obodo ahụ maka Ememe Ngabiga. Ma ụzụ ahụ na-atụ nke anyị na-anụ karịrị otú ọ na-adị n’ụdị oge a n’afọ. Ìgwè mmadụ chọrọ ịma ihe na-aganụ na-enuga n’okporo ámá ndị dị warara gawara n’ọnụ ụzọ ámá obodo. Ka ha na-azọ ụzọ isi pụta n’ọnụ ụzọ ámá ahụ kpara akpa, leedị ihe kpọrọ ha ihu! Ọtụtụ ndị ọṅụ ji na-agbadata n’Ugwu Olive ahụ n’ụzọ sitere na Betfagi. (Luk 19:37) Gịnị ka ihe a nile pụtara?
Lee! Jisọs onye Nazaret na-anọkwasị n’elu nwa ịnyịnya ibu. Ndị mmadụ na-agbasa uwe n’okporo ụzọ ka ọ na-abịa. Ndị ọzọ na-efere ya igu nkwụ ndị ha gbajitere ọhụrụ ma na-eti mkpu ọṅụ, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị, bụ́ Eze nke Israel.”—Jọn 12:12-15.
Ka ìgwè mmadụ ahụ na-abịaru Jerusalem nso, Jisọs na-ele obodo ahụ anya ma nwee ọmịiko miri emi. Ọ malitere ịkwa ákwá, anyị na-anụkwa ka ọ na-ebu amụma na a ga-ebibi obodo a. Mgbe Jisọs bịarutere n’ụlọ nsọ ahụ mgbe nwa oge gasịrị, ọ na-ezi ìgwè mmadụ ahụ ihe ma na-agwọ ndị ìsì na ndị ngwụrọ na-abịakwute ya.—Matiu 21:14; Luk 19:41-44, 47.
Nke a emeghị ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’azụ. Lee oké iwe ji ha ịhụ ihe ndị dị egwu Jisọs na-eme na ọṅụ nke ìgwè mmadụ ahụ! N’enweghị ike izochi iwe ha, ndị Farisii kwuru, sị: “Onye ozizi, baara ndị na-eso ụzọ Gị mba.” “Asị m unu,” ka Jisọs na-azaghachi, “ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.” Tupu ọ na-apụ, Jisọs rịbara ama ahịa a na-azụ n’ụlọ nsọ ahụ.—Luk 19:39, 40; Matiu 21:15, 16; Mak 11:11.
Nisan 10
Jisọs abịarute n’ụlọ nsọ ahụ n’oge. Ụnyaahụ, ọ dịghị ihe pụrụ ime ka iwe ghara iwe ya n’ajọ mgbere ahịa e ji ofufe nke Nna ya, bụ́ Jehova Chineke, na-agba. Ya mere, site n’oké ịnụ ọkụ n’obi, ọ malitere ịchụpụ ndị na-azụ ma na-ere n’ụlọ nsọ ahụ. Mgbe ahụ o kpuru table nile nke ndị na-agbanwe ego ihu na oche nile nke ndị na-ere nduru. “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị,” ka Jisọs tiri ná mkpu, “A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere: ma unu onwe unu na-eme ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe.”—Matiu 21:12, 13.
Ndị isi nchụàjà, ndị odeakwụkwọ, na ndị isi ndị Juu apụghị ịnagide omume Jisọs na izi ihe ya n’ihu ọha. Lee ka o si agụsi ha ike igbu ya! Ma ìgwè mmadụ ahụ nọchiiri ha ụzọ n’ihi na ozizi Jisọs tụrụ ndị ahụ n’anya, ha nọkwa “Ya nso gburugburu, na-anụ okwu Ya.” (Luk 19:47, 48) Ka ọ na-eru mgbede, ọ tọrọ Jisọs na ndị enyi ụtọ iji ụkwụ gaghachi Betani ịga zuru ike abalị.
Nisan 11
Ọ bụ n’isi ụtụtụ, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya agafewakwala Ugwu Olive gawa Jerusalem. Ka ha na-erute n’ụlọ nsọ ahụ, ọ dị ndị isi nchụàjà na ndị okenye ọkụ n’ahụ ịga hụ Jisọs. Ihe ahụ o mere megide ndị na-agbanwe ego na ndị ahịa n’ụlọ nsọ ka dị ọhụrụ n’uche ha. Ndị iro ya ji ajọ ịkpọasị chọọ ịma, sị: “Ọ̀ bụ n’aha ike gịnị ka Ị na-eme ihe ndị a? ònye nyekwara Gị ike a?” “Mụ onwe m ga-ajụkwa unu otu okwu,” ka Jisọs gwagwaara ha. “Ọ bụrụ na unu agwa m ya, Mụ onwe m ga-agwakwa unu aha ike M ji eme ihe ndị a. Baptism nke Jọn, olee ebe o si pụta? ò sitere n’eluigwe, ma ọ bụ na o sitere n’aka mmadụ?” N’ịgbakọta izu ọnụ, ndị iro ya na-atụgharị uche, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, O sitere n’eluigwe; Ọ ga-asị anyị, N’ihi gịnịkwa ka unu na-ejighị kwe ya? Ma ọ bụrụ na anyị asị, O sitere n’aka mmadụ; anyị na-atụ egwu ìgwè mmadụ a; n’ihi na mmadụ nile na-agụ Jọn dị ka onye amụma.” N’enweghị ọnụ okwu, ha ji ike ọgwụgwụ zaa, sị: “Anyị amataghị.” Jisọs ji nwayọọ zaghachi, sị: “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu aha ike M ji eme ihe ndị a.”—Matiu 21:23-27.
Ndị iro Jisọs na-anwa ugbu a ime ka ọ ma n’ọnyà nke ikwu ihe ha pụrụ iji sị ka e jide ya. “Ò ziri ezi n’iwu,” ka ha na-ajụ, “ịtụ ụtụ nye Siza, ma ọ bụ na ó zighị ezi?” “Gosinụ m ego nke ụtụ,” ka Jisọs na-azaghachi. Ọ na-ajụ, sị: “Ònye nwe onyinyo a na ihe a e dekwasịrị ya?” “Siza nwe,” ka ha sịrị. N’ịza ihe juru ha anya, Jisọs kwuru n’ụzọ doro anya ka mmadụ nile wee nụ, sị: “Ya mere, nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.”—Matiu 22:15-22.
Ebe o jiworo ịrụ ụka na-enweghị mgbagha mechie ndị iro ya ọnụ, Jisọs gara n’ihu ugbu a ịkatọ ha nke ukwuu n’ihu ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya. Gee ntị ka ọ na-akatọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii n’atụghị ụjọ. “Unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị,” ka ọ na-asị, “n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.” N’anyaike, ọ na-ekwupụta ọtụtụ ahụhụ ga-adịrị ha, na-akọwa ha dị ka ndị ndú kpuru ìsì na ndị ihu abụọ. “Unu agwọ, unu ajụala,” ka Jisọs na-asị, “ùnu ga-esi aṅaa gbanarị ikpe nke [Gehena, NW]?”—Matiu 23:1-33.
Nkatọ ndị a na-akpasu iwe apụtaghị na Jisọs adịghị ahụ àgwà ọma nke ndị ọzọ. Mgbe e mesịrị, ọ na-ahụ ndị mmadụ ka ha na-atụnye ego n’igbe ego nke ụlọ nsọ. Lee ka o si metụ ya n’ahụ ịhụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ tụnyere ihe nile o ji biri—obere mkpụrụ ego abụọ bara ntakịrị uru! N’inwe ekele na-ekpo ọkụ, Jisọs gosiri na, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ tụnyewo ihe karịrị nke ndị nile wụnyere onyinye site “n’inwebiga akụ̀ ókè ha.” N’ọmịiko ya dị nro, Jisọs na-enwe ekele miri emi maka ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ime.—Luk 21:1-4.
Ugbu a Jisọs na-apụ n’ụlọ nsọ ahụ nke ikpeazụ ya. Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya kwuru okwu banyere ịdị ebube ya, na e “weererị nkume ọma na ihe e nyere Chineke dozie” ya. N’ijuanya nye ha, Jisọs na-azaghachi, sị: “Ụbọchị ga-abịa, nke a na-agaghị ahapụ otu nkume n’ebe a n’elu nkume ibe ya, nke a na-agaghị akwatu n’ala.” (Luk 21:5, 6) Ka ndị ozi ahụ so Jisọs na-apụ n’obodo ahụ juru na mmadụ, ha nọ na-eche ihe o nwere ike ibu n’uche.
Ntakịrị oge mgbe e mesịrị, Jisọs na ndị ozi ya nọdụrụ ala ma nụrụ ụtọ nke udo na ịdị jụụ nke Ugwu Olive. Ka ha nọ na-ekiri ịma mma nke ọdịdị Jerusalem na ụlọ nsọ ya, Pita, Jemes, Jọn, na Andru chọrọ ka e doo ha anya banyere amụma ahụ dị ịtụnanya nke Jisọs. “Gwa anyị,” ka ha na-asị, “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?”—Matiu 24:3, NW; Mak 13:3, 4.
Ná nzaghachi, Onye Ọkà Ozizi ahụ na-ebu otu amụma dị ịrịba ama. Ọ na-ebu amụma banyere oké agha, ala ọma jijiji, ụkọ ihe oriri, na ọrịa na-efe efe. Jisọs na-ebukwa amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ n’elu ụwa dum. “Mgbe ahụ,” ka ọ na-adọ aka ná ntị, “mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.”—Matiu 24:7, 14, 21; Luk 21:10, 11.
Ndị ozi anọ ahụ na-ege ntị nke ọma ka Jisọs na-atụle akụkụ ndị ọzọ nke ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya.’ Ọ na-emesi ike mkpa ọ dị ‘iche nche.’ N’ihi gịnị? “N’ihi na,” ka ọ na-ekwu, “unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—Matiu 24:42; Mak 13:33, 35, 37.
Nke a abụwo ụbọchị a na-agaghị echefu echefu nye Jisọs na ndị ozi ya. N’ezie, ọ bụ ụbọchị ikpeazụ nke ozi ihu ọha Jisọs tupu e jide ya, kpee ya ikpe, ma gbuo ya. Ebe chi na-achọ iji, ha malitere ịgaghachi n’ebe ahụ na-adịghị anya n’ugwu ahụ ịgawa Betani.
Nisan 12 na 13
Jisọs ji Nisan 12 nọnyere ndị na-eso ụzọ ya n’ụzọ dị jụụ. Ọ ghọtara na ndị ndú okpukpe na-achọsi ike igbu ya, ọ chọghịkwa ka ha gbochie ya ime Ememe Ngabiga ná mgbede echi. (Mak 14:1, 2) Echi ya, bụ́ Nisan 13, ndị mmadụ nọ na-eme ndokwa ikpeazụ maka Ememe Ngabiga. N’oge ehihie, Jisọs zipụrụ Pita na Jọn ịkwadebe Ememe Ngabiga maka ha n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu dị na Jerusalem. (Mak 14:12-16; Luk 22:8) Nwa oge tupu anyanwụ adaa, Jisọs na ndị ozi iri ndị ọzọ esonyere ha maka Ememe Ngabiga ikpeazụ ha.
Nisan 14, Mgbe Anyanwụ Dasịrị
Ìhè dị nro nke abalị sachiri Jerusalem ka ọnwa gbazuru agbazu na-apụta n’elu Ugwu Olive. N’otu ọnụ ụlọ e doziri edozi, Jisọs na mmadụ 12 ahụ na-ewere oche na table a kwadebere akwadebe. “Agụụ gụsiri m ike iso unu rie oriri ngabiga nke a mgbe Mụ aka-ahụghị ahụhụ,” ka o kwuru. (Luk 22:14, 15) Mgbe obere oge gasịrị, o juru ndị ozi ahụ anya ịhụ ka Jisọs biliri ma yipụ uwe mwụda ya chịsa n’otu akụkụ. N’iwere otu ákwà nhicha ahụ na efere mmiri dị, ọ malitere ịsa ha ụkwụ. Lee ihe mmụta a na-agaghị echefu echefu ọ bụ n’ije ozi obi umeala!—Jọn 13:2-15.
Otú ọ dị, Jisọs maara na otu n’ime ndị ikom a—Judas Iskariọt—emeworị ndokwa ịrara ya nye n’aka ndị ndú okpukpe. N’ụzọ kwere nghọta, ọ na-egbu ya mmụọ nke ukwuu. “Otu onye si n’etiti unu pụta ga-arara m nye,” ka ọ na-ekpughe. Nke a wutere ndị ozi ahụ nke ukwuu. (Matiu 26:21, 22) Mgbe ha mesịrị Ememe Ngabiga ahụ, Jisọs agwa Judas, sị: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.”—Jọn 13:27.
Ozugbo Judas pụwara, Jisọs ewebata otu oriri iji na-echeta ọnwụ ya na-abịaru nso. O weere otu ógbè achịcha na-ekoghị eko, kpee ekpere ekele, nyawaa ya, ma gwa mmadụ 11 ahụ ka ha rie. “Nke a bụ ahụ m,” ka ọ na-ekwu, “nke a na-enye n’ihi unu: na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” O wee were otu iko mmanya na-acha ọbara ọbara. Mgbe ọ gọzisịrị ya, o bunyere ha iko ahụ, na-agwa ha ka ha ṅụọ ihe dị n’ime ya. Jisọs na-agbakwụnye, sị: “Nke a bụ ọbara m nke ọgbụgba ndụ, nke a na-awụsịrị ọtụtụ mmadụ ka e wee gbaghara mmehie.”—Luk 22:19, 20; Matiu 26:26-28.
N’oge uhuruchi ahụ dị oké mkpa, Jisọs na-akụziri ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi ọtụtụ ihe mmụta bara uru, nke ịdị mkpa nke ịhụnanya ụmụnna sokwa na ha. (Jọn 13:34, 35) O mesiri ha obi ike na ha ga-anata “Onye nkasi obi,” bụ́ mmụọ nsọ. Ọ ga-echetara ha ihe nile ọ gwaworo ha. (Jọn 14:26) Mgbe e mesịrị n’uhuruchi ahụ, ọ ghaghị ịbụ na a gbara ha ume ịnụ ka Jisọs na-ekpe ekpere na-ekpo ọkụ n’ihi ha. (Jọn, isi nke 17) Mgbe ha bụsịrị abụ otuto, ha hapụrụ ọnụ ụlọ ụlọ elu ahụ wee soro Jisọs pụta n’ikuku oyi ime abalị ahụ.
N’ịgafe Ndagwurugwu Kedrọn, Jisọs na ndị ozi ya gawara n’otu n’ime ebe ha na-anọkarị, ogige Getsamane. (Jọn 18:1, 2) Ka ndị ozi ya nọ na-echere, Jisọs gapụtụrụ ntakịrị ikpe ekpere. Nrụgide o bu n’uche karịrị ihe a pụrụ iji okwu kọwaa ka ọ na-arịọsi Chineke arịrịọ ike maka enyemaka. (Luk 22:44) Nanị echiche nke nkọcha a ga-awụkwasị n’ezi Nna ya nke eluigwe ma ọ bụrụ na ọ daa na-egbu ya oké mgbu n’obi.
Jisọs ka kpesịrị nnọọ ekpere mgbe Judas Iskariọt bịarutere ya na ìgwè mmadụ ndị bu mma agha, osisi, na ọwa ọkụ. “Ekele, Rabaị,” ka Judas sịrị, na-esutụ Jisọs ọnụ n’ụzọ dị nro. Nke a bụ ihe mgbaàmà nye ndị ikom ahụ ijide Jisọs. Na mberede, Pita amịa mma agha ya wee bepụ ntị nke ohu onyeisi nchụàjà. “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya,” ka Jisọs na-ekwu ka ọ na-agwọ ntị nwoke ahụ. “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.”—Matiu 26:47-52.
Ihe a nile mere ngwa ngwa! E jidere Jisọs ma kee ya agbụ. N’ụjọ na ná mgbagwoju anya, ndị ozi ahụ gbahapụrụ Onyenwe ha ma gbalaga. A kpọgara Jisọs na nke Anas, bụbu onyeisi nchụàjà. E mesịa a kpọga ya na nke Kaịafas, bụ́ onyeisi nchụàjà ugbu a, ka e kpee ya ikpe. N’isi ụtụtụ ya, nzukọ Sanhedrin boro Jisọs ebubo ụgha ikwu okwu nkwulu. E mesịa, Kaịafas mere ka a kpọgara ya onye ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlat. O zigara Jisọs na nke Herọd Antipas, bụ́ onye ọchịchị Galili. Herọd na ndị nche ya na-akwa Jisọs emo. Mgbe ahụ e zighachiri ya na nke Paịlat. Paịlat nwapụtara na aka Jisọs dị ọcha. Ma ndị ndú okpukpe ndị Juu rụgidere ya ịma Jisọs ikpe ọnwụ. Mgbe a gwakasịchara ya okwu ahụ ma tie ya ihe, a kpụgara Jisọs na Gọlgọta bụ́ ebe e ji emeghị ebere kụdo ya ntú n’elu osisi ịta ahụhụ, o wee nwụọ ọnwụ na-egbu mgbu.—Mak 14:50–15:39; Luk 23:4-25.
Ọ gaara abụ ọdachi kasị ukwuu n’akụkọ ihe mere eme ma a sị na ọnwụ Jisọs napụrụ ya ndụ n’ụzọ na-adịgide adịgide. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, nke ahụ emeghị. Na Nisan 16, 33 O.A., ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya ịchọpụta na e siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya. Ka oge na-aga, ihe karịrị ndị mmadụ 500 nwere ike ịnwapụta na Jisọs dị ndụ ọzọ. Mgbe ụbọchị 40 nke mbilite n’ọnwụ ya gasịkwara, otu ìgwè nke ụmụazụ kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ ka ọ rịgoro n’eluigwe.—Ọrụ 1:9-11; 1 Ndị Kọrint 15:3-8.
Ndụ Jisọs na Gị
Olee otú nke a si emetụta gị—n’ezie, anyị nile? Ozi, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ Jisọs na-enye Jehova Chineke otuto, ha dịkwa oké mkpa maka mmezu nke oké nzube Ya. (Ndị Kọlọsi 1:18-20) Ha dị oké mkpa nye anyị n’ihi na a pụrụ ịgbaghara anyị mmehie anyị ná ndabere nke àjà Jisọs, anyị pụkwara isi otú a nwee mmekọrịta onwe onye n’ebe Jehova Chineke nọ.—Jọn 14:6; 1 Jọn 2:1, 2.
O metụtara ọbụna ndị nwụrụ anwụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. Mbilite n’ọnwụ Jisọs meghere ụzọ iji weghachi ha ná ndụ n’ụwa Paradaịs nke Chineke kwere ná nkwa. (Luk 23:39-43; 1 Ndị Kọrint 15:20-22) Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe ndị dị otú ahụ, anyị na-akpọ gị òkù ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’April 11, 1998, n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị.
[Igbe dị na peeji nke 6]
“Ọgba Ndị Na-apụnara Mmadụ Ihe”
JISỌS nwere ọtụtụ ihe mere ọ ga-eji kwuo na ndị ahịa ahụ dị anyaukwu agbanwewo ụlọ nsọ Chineke ịghọ “ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Matiu 21:12, 13) Iji kwụọ ụtụ isi ụlọ nsọ, ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ha sitere n’ala ndị ọzọ aghaghị ịgbanwe ego ala ha maka ego a na-anabata. N’akwụkwọ ya bụ́ The Life and Times of Jesus the Messiah, Alfred Edersheim na-akọwa na ndị na-agbanwe ego na-eguzobebu ahịa ha n’ógbè ndị Rom n’Adar 15, otu ọnwa tupu Ememe Ngabiga. Na-amalite n’Adar 25, ha kwagara n’ógbè ụlọ nsọ dị na Jerusalem irepụ ahịa n’etiti ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ha na-enubata nke ukwuu. Ndị nwe ahịa na-agbapụ aka ahịa nke ọma, na-ana ụgwọ maka otu ego ọ bụla a gbanwere. Aka Jisọs zoro n’ebe ha nọ dị ka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-atụ aro na ụgwọ ha dị oké elu nke na ha, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, na-ezunara ndị ogbenye ego.
Ụfọdụ apụghị iji anụmanụ ha ga-eji chụọ àjà bịa. Onye ọ bụla mere otú ahụ aghaghị ime ka ndị nnyocha lee anụmanụ ahụ ahụ n’ụlọ nsọ—n’ọnụ ego. N’achọghị ịnọ n’ihe ize ndụ nke anụmanụ ha si ebe dị anya jiri bịa ịbụ nke a jụrụ, ọtụtụ zụtara nke ndị Livaị “nwapụtara” site n’aka ndị ahịa ahụ rụrụ arụ nọ n’ụlọ nsọ. “A gbanweere ọtụtụ ndị ogbenye nọ n’ọkwá dị ala ego ha n’ọnụ ahịa gabigara ókè n’ebe ahụ,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu.
Ihe àmà na-egosi na Anas ahụ bụbu onyeisi nchụàjà na ezinụlọ ya nwere ihe ha na-erite n’aka ndị ahụ na-ere ahịa n’ụlọ nsọ. Ihe odide ndị rabaị na-ekwu banyere “Bazaa [ụlọ nsọ] nke ụmụ ndị ikom Anas.” Ụtụ a na-anata ndị ahụ na-agbanwe ego na site n’orire a na-ere ụmụ anụmanụ ná mbara ala ụlọ nsọ bụ otu n’ime ebe bụ isi ha si akpata ego. Otu ọkà mmụta na-ekwu na ihe ahụ Jisọs mere ịchụpụ ndị ahụ na-ere ahịa “bụ nke e zubere imetụta ọ bụghị nanị ùgwù nke ndị nchụàjà kama akpa ha.” N’agbanyeghị ihe kpatara ya, n’ezie ndị iro ya chọrọ igbu ya!—Luk 19:45-48.
[Chaatị dị na peeji nke 4]
Ụbọchị Ndị Ikpeazụ nke Ndụ Jisọs Dị Ka Mmadụ
Nisan 33 O.A. Ihe Ndị Mere Nwoke Kasị Ukwuu*
7 Friday Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya esi 101, para. 1
Jeriko gaa Jerusalem (Nisan 7
kwekọrọ na Sunday, April 5,
1998, ọ bụ ezie na ụbọchị ndị
Hibru na-amalite n’otu uhuruchi
ruo n’ọzọ)
8 Uhuruchi Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya 101, para. 2-4
Friday abịarute Betani; Ụbọchị Izu
Ike amalite
Saturday Ụbọchị Izu Ike (Monday, 101, para. 4
April 6, 1998)
9 Uhuruchi Iso Saịmọn onye ekpenta rikọọ 101, para. 5-9
Saturday nri; Meri etee Jisọs mmanụ nard;
ọtụtụ esi Jerusalem bịa ịhụ na
ịnụ olu Jisọs
Sunday Mbanye mmeri na Jerusalem; 102
na-ezi ihe n’ụlọ nsọ
10 Monday Ije na Jerusalem n’ezi oge; mee 103, 104
ka ụlọ nsọ dị ọcha; Jehova esi
n’eluigwe kwuo okwu
11 Tuesday Na Jerusalem, na-eji ihe atụ ezi 105 ruo 112,
ihe n’ụlọ nsọ; na-ama ndị Farisii para. 1
ikpe; na-arịba ama onyinye nke
nwanyị di ya nwụru; na-enye ihe
ịrịba ama nke ọnụnọ ya n’ọdịnihu
12 Wednesday Soro ndị na-eso ụzọ ya zuru ike 112, para. 2-4
ụbọchị na Betani; Judas emee
ndokwa nraranye
13 Thursday Pita na Jọn akwadebe maka Ememe 112, para. 5
Ngabiga na Jerusalem; Jisọs na ndị ruo 113,
ozi iri ndị ọzọ esonyere ha ná para. 1
mgbede (Saturday, April 11, 1998)
14 Uhuruchi Ememe Ngabiga; Jisọs asaa ụkwụ ndị 113, para. 2
Thursday ozi; Judas apụọ ịga rara Jisọs ruo 117
nye; Kraịst eguzobe Ememe Ncheta
nke ọnwụ ya (Mbge anyanwụ dasịrị,
Saturday, April 11, 1998)
Mgbe ọ Nraranye na njide n’ogige 118 ruo 120
gafesịrị Getsamane; ndị ozi agbalaga; ikpe
etiti abalị ikpe n’ihu ndị isi nchụàjà na
Sanhedrin; Pita agọnahụ Jisọs
Ọwụwa anyanwụ N’ihu Sanhedrin ọzọ; gaa na nke 121 ruo 127,
ruo ọdịda Paịlat, gaakwa na nke Herọd, para. 7
anyanwụ Friday gaghachi na nke Paịlat; a maa ya
ikpe ọnwu; kpọgbuo ya; lie ya
15 Saturday Ụbọchị Izu Ike; Paịlat enye ikike 127, para.
ka ndị nche chee ili Jisọs nche 8-10
16 Sunday A kpọlite Jisọs n’ọnwụ 128
* Nọmba e depụtara n’ebe a na-egosi isiakwụkwọ dị n’akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Maka chaatị nke nwezuru ntụaka Akwụkwọ Nsọ banyere ozi ikpeazụ nke Jisọs, lee “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial,” peji nke 290. Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara akwụkwọ ndị a.