Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-1 isi 9 p. 101-116
  • Tụkwasị Jehova Obi n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tụkwasị Jehova Obi n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iche Otu Mkpebi Ihu
  • Ọ Gafere Nnọọ Agha Dị n’Etiti Mba na Mba
  • Mmesi Obi Ike Ịhụnanya nke Jehova
  • Site n’Inwe Obi Abụọ Gaa ná Nnupụisi
  • Ihe Ịrịba Ama nke Immanuel
  • Ihe Ndị Ọzọ Ga-esi n’Ekwesịghị Ntụkwasị Obi Pụta
  • Amụma Ndị A Kapịrị Ọnụ
  • “Mmiri” Ndị Na-ebibi Ihe
  • Atụla Egwu—“Chineke Nọnyeere Anyị”
  • “Ihe Ịrịba Ama” na “Ihe Ebube”
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Onye Amụma Oge Ochie nke Nwere Ozi Maka Oge A
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
  • Inwe Obi Ụtọ Na Jehova Na-egosi Anyị Ụzọ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ndụmọdụ Jehova Megide Mba Dị Iche Iche
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ I
ip-1 isi 9 p. 101-116

Isi nke Itoolu

Tụkwasị Jehova Obi n’Agbanyeghị Ihe Isi Ike

Aịsaịa 7:1–8:18

1. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst taa ga-eji rite uru site n’inyocha Aịsaịa isi nke 7 na nke 8?

AỊSAỊA isi nke 7 na nke 8 na-egosi mmeghachi omume abụọ dị iche. Aịsaịa na Ehaz bụcha ndị òtù nke mba raara onwe ha nye Jehova; ha abụọ nwechara ọrụ Chineke kenyere ha, otu bụ onye amụma, onye nke ọzọ bụ eze Juda; ha abụọ chekwara otu ihe iyi egwu ahụ ihu—mwakwasị nke ndị agha bụ́ ndị iro ka Juda ike. Otú ọ dị, Aịsaịa ji inwe obi ike n’ebe Jehova nọ chee ihe iyi egwu ahụ ihu, ebe Ehaz tụrụ ụjọ. Gịnị mere mmeghachi omume ha ji dị iche iche? Ebe ọ bụ na ndị iro nwere obi ilu gbakwara ndị Kraịst gburugburu taa, o kwesịrị ka ha nyochaa isiakwụkwọ abụọ a nke Aịsaịa iji chọpụta ihe mmụta ndị dị na ha.

Iche Otu Mkpebi Ihu

2, 3. Olee otú Aịsaịa si chịkọta okwu ọnụ n’okwu mmeghe ya?

2 Dị nnọọ ka onye na-ese ihe nke ji akara ole na ole esepụta otú ihe osise ọhụrụ ga-adị, Aịsaịa ji okwu ole na ole doro anya nke na-egosi mmalite na ngwụsị nke ihe ndị ọ gaje ịkọ wee malite akụkọ ya: “O ruo, n’ụbọchị Ehaz nwa Jotam, nwa Ụzaịa, bụ́ eze Juda, na Rezin, bụ́ eze Siria, rịgoro, ya na Peka nwa Remalaịa, bụ́ eze Israel, ruo Jerusalem, ibu agha megide ya.”—Aịsaịa 7:1.

3 Ọ bụ na narị afọ nke asatọ T.O.A. Ehaz anọchiwo nna ya, bụ́ Jotam, dị ka eze na Juda. Rezin, bụ́ eze Siria, na Peka, bụ́ eze nke alaeze ebe ugwu nke Israel, wakporo Juda, ndị agha ha wakpokwara ya n’ụzọ dị njọ. E mesịa, ha ga-anọchibido Jerusalem n’onwe ya. Otú ọ dị, nnọchibido ahụ ga-akụ afọ n’ala. (2 Ndị Eze 16:5, 6; 2 Ihe E Mere 28:5-8) N’ihi gịnị? Anyị ga-achọpụta nke ahụ ka oge na-aga.

4. Gịnị mere obi Ehaz na ndị ya ji jupụta n’ụjọ?

4 Ná mmalite agha ahụ, ‘e gosiri ụlọ Devid, sị, Siria na-ezu ike n’elu Efraim. Obi ya na obi ndị ya wee mee mkpatụ, dị ka osisi nile nke oké ọhịa si eme mkpatụ n’ihu ifufe.’ (Aịsaịa 7:2) Ee, ọ tụrụ Ehaz na ndị obodo ya ụjọ ịnụ na ndị Siria na ndị Israel ejikọwo aka nakwa na ndị agha ha amawo ụlọikwuu ha ugbu a n’ala Efraim (Israel). Ha nọ ebe ga-ewe iji ụkwụ gaa ije ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ site na Jerusalem!

5. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Chineke taa si yie Aịsaịa?

5 Jehova gwara Aịsaịa, sị: “Biko, pụọ izute Ehaz, gị onwe gị, na Shea-jashub nwa gị, ruo nsọtụ ụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị n’elu, ruo ụzọ a tụliri atụli nke ọhịa ọsụ ákwà.” (Aịsaịa 7:3) Cheedị nnọọ echiche! N’oge eze ahụ kwesịrị ịdị na-achọgharị onye amụma Jehova ma na-achọ nduzi, onye amụma ahụ aghaghị ije chọta eze ahụ! N’agbanyeghị nke ahụ, Aịsaịa ji obi ya nile rubere Jehova isi. N’otu aka ahụ, ndị Chineke taa na-eji obi ha nile aga achọ ndị na-atụ ụjọ n’ihi nrụgide nile nke ụwa a. (Matiu 24:6, 14) Lee ka o si enye obi ụtọ na kwa afọ ọtụtụ narị puku mmadụ na-anabata nleta nke ndị a na-ekwusa ozi ọma, ha na-ejidekwa ogwe aka Jehova nke na-enye nchebe!

6. (a) Ozi dị aṅaa nke na-enye obi ike ka onye amụma bụ́ Aịsaịa ziri Eze Ehaz? (b) Olee ọnọdụ dị taa?

6 Aịsaịa hụrụ Ehaz n’azụ mgbidi Jerusalem, bụ́ ebe eze ahụ, n’ịkwadebe maka nnọchibido ahụ a na-atụ anya ya, nọ na-enyocha ebe obodo ahụ si enweta mmiri. Aịsaịa ziri ya ozi Jehova: “Lezie anya, nọrọkwa jụụ; atụla egwu, ka obi gị gharakwa ịtụ ụjọ, site n’ọdụdụ abụọ ndị a nke ọlọkọ ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ, n’ihi iwe dị ọkụ nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaịa.” (Aịsaịa 7:4) Mgbe ndị mwakpo ahụ bibiri Juda na mbụ, iwe ha dị ọkụ ka ire ọkụ. Ugbu a ha bụ nanị ‘ọdụdụ abụọ nke ọlọkọ ọkụ na-akwụ anwụrụ ọkụ.’ Ọ dịghị mkpa ka Ehaz tụọ Eze Rezin nke Siria ma ọ bụ Eze Peka nke Israel, bụ́ nwa Remalaịa, ụjọ. Otú ahụ ka ọ dị taa. Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ndú Krisendọm akpagbuwo ezi ndị Kraịst n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Otú ọ dị, ugbu a Krisendọm yiri ọlọkọ ọkụ nke fọrọ nke nta ka o resịa. Oge fọdụụrụ ya dị ntakịrị.

7. N’ihi gịnị ka aha Aịsaịa na nke nwa ya nwoke ji bụrụ ihe na-enye olileanya?

7 N’oge Ehaz, ọ bụghị nanị ozi Aịsaịa kamakwa ihe aha Aịsaịa na nke nwa ya nwoke pụtara mere ka ndị tụkwasịrị Jehova obi nwee olileanya. N’eziokwu, Juda nọ n’ihe ize ndụ, ma aha ahụ bụ́ Aịsaịa, nke pụtara “Nzọpụta nke Jehova,” na-egosi na Jehova ga-agbapụta ha. Jehova gwara Aịsaịa ka ọ kpọrọ nwa ya nwoke bụ́ Shea-jashub jee, bụ́ onye aha ya pụtara “Nanị Ihe Fọdụrụnụ Ga-alọta.” Ọbụna mgbe alaeze Juda mesịrị daa, Chineke ga-eji obi ebere kpọghachite ihe fọdụrụnụ n’ala ahụ.

Ọ Gafere Nnọọ Agha Dị n’Etiti Mba na Mba

8. N’ihi gịnị ka mwakpo a ga-awakpo Jerusalem ji gafee agha dị n’etiti mba na mba?

8 Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa, kpughere atụmatụ agha nke ndị iro Juda. Lee ihe ha na-eme atụmatụ ya: “Ka anyị rịgoo imegide Juda, ka anyị meekwa ka ike gwụsịa ya, ka anyị wapuoro onwe anyị ya, mee ka otu onye bụrụ eze n’etiti ya, bụ́ nwa Tabeel.” (Aịsaịa 7:5, 6) Ndị Siria na ndị Israel ahụ jikọrọ aka na-eme atụmatụ imeri Juda na iji onye masịrị ha dochie Ehaz, bụ́ nwa Devid. N’ụzọ doro anya, mwakpo ahụ a ga-awakpo Jerusalem agafeela ugbu a agha dị n’etiti mba na mba. Ọ ghọọla ọgụ dị n’etiti Setan na Jehova. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova Chineke na Eze Devid gbara ndụ, si otú a na-emesi ya obi ike na ụmụ ya ga-achị ndị Jehova. (2 Samuel 7:11, 16) Lee mmeri Setan ga-enwe ma ọ bụrụ na o nwee ike itinye eze dị iche n’ocheeze ahụ dị na Jerusalem! Ọ pụrụ ọbụna imebi nzube Jehova bụ́ ka usoro ọmụmụ Devid mụpụta onye nketa na-adịgide adịgide, “Onyeisi Udo” ahụ.—Aịsaịa 9:6, 7.

Mmesi Obi Ike Ịhụnanya nke Jehova

9. Mmesi obi ike dịgasị aṅaa kwesịrị inye Ehaz nakwa ndị Kraịst taa obi ike?

9 Atụmatụ ndị Siria na ndị Israel na-eme ọ̀ ga-aga nke ọma? Ee e. Jehova kwuru, sị: “Ọ gaghị eguzosi ike, ọ gaghị adịkwa.” (Aịsaịa 7:7) Site n’ọnụ Aịsaịa, Jehova na-ekwu na ọ bụghị nanị na nnọchibido nke Jerusalem ga-akụ afọ n’ala kama na “tutu [iri afọ isii na ise] eruzuo a ga-etipịa Efraim, ka ọ ghara ịbụ otu ndị.” (Aịsaịa 7:8) Ee, tupu afọ 65 agwụsịa Israel agakwaghị adị dị ka otu ndị.a Mmesi obi ike a, ya na oge a kapịrị ọnụ e kwuru ọ ga-emezu, kwesịrị inye Ehaz obi ike. N’otu ụzọ ahụ, ndị Chineke taa bụ ndị a na-ewusi ike site na ha ịmara na oge na-agwụnahụ ụwa Setan.

10. (a) Olee otú ezi ndị Kraịst taa pụrụ isi ṅomie Jehova? (b) Olee ihe Jehova na-ekwe nkwa imere Ehaz?

10 Ma eleghị anya ihu Ehaz gosiri na o kwetaghị, ebe Jehova na-ekwu site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Ọ bụrụ na unu adịghị ekwe, n’ezie unu agaghị ekwesị ntụkwasị obi.” Jehova, n’ihi inwe ndidi ya, “wee gwakwa Ehaz okwu ọzọ.” (Aịsaịa 7:9, 10) Lee ezi ihe nlereanya ọ bụ! Taa, ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị adịghị anabata ozi Alaeze ahụ ngwa ngwa, anyị kwesịrị iṅomi Jehova site ‘n’ịgwa ha okwu ọzọ’ mgbe anyị na-aga ugboro ugboro. Jehova gwaziri Ehaz, sị: “Rịọrọ onwe gị ihe ịrịba ama n’aka Jehova, bụ́ Chineke gị; rịọ ya n’ebe miri emi, ma ọ bụ n’ebe dị elu nke dị n’elu.” (Aịsaịa 7:11) Ehaz pụrụ ịrịọ ihe àmà, Jehova ga-emekwa ya iji mesie ya obi ike na Ọ ga-echebe ụlọ Devid.

11. Mmesi obi ike dị aṅaa dị n’okwu Jehova bụ́ ‘Chineke gị’?

11 Rịba ama na Jehova kwuru, sị: ‘Rịọ ihe ịrịba ama n’aka Chineke gị.’ Jehova nwere obiọma n’ezie. Dị ka a kọrọ, Ehaz amalitelarị ife chi ụgha dị iche iche ofufe ma na-eme omume ndị na-asọ oyi nke ndị ọgọ mmụọ. (2 Ndị Eze 16:3, 4) N’agbanyeghị nke ahụ, n’agbanyeghịkwa omume ịtụ ụjọ nke Ehaz, Jehova ka kpọrọ onwe ya Chineke Ehaz. Nke a na-emesi anyị obi ike na Jehova adịghị ajụ ụmụ mmadụ ngwa ngwa. Ọ dị njikere inyere ndị mehierenụ ma ọ bụ ndị okwukwe ha daworo mbà aka. Mmesi obi ike a nke ịhụnanya Chineke ọ̀ ga-eme ka Ehaz nakwere enyemaka Jehova?

Site n’Inwe Obi Abụọ Gaa ná Nnupụisi

12. (a) Omume mpako dị aṅaa ka Ehaz nwere? (b) Kama ichigharịkwuru Jehova, ònye ka Ehaz gakwuuru maka enyemaka?

12 Ehaz ji ịgba isi akwara zaa, sị: “M gaghị arịọ, m gaghị anwakwa Jehova.” (Aịsaịa 7:12) Ihe Ehaz na-eme n’ebe a abụghị irube isi n’iwu ahụ kwuru, sị: “Unu anwala Jehova, bụ́ Chineke unu.” (Deuterọnọmi 6:16) Ọtụtụ narị afọ ka ọ gasịrị, Jisọs hotara otu iwu ahụ mgbe Setan nwara ya. (Matiu 4:7) Otú ọ dị, n’ihe banyere Ehaz, Jehova na-akpọ ya òkù ịgaghachi n’ezi ofufe, ọ na-ekwekwa ya nkwa ime ka okwukwe ya sie ike site n’ime otu ihe ịrịba ama. Otú ọ dị, Ehaz họọrọ ịchọ nchebe n’ebe ọzọ. Ma eleghị anya ọ bụ n’oge a ka eze ahụ zigaara Asiria ego buru ibu, na-arịọ enyemaka iji megide ndị iro ya si n’ebe ugwu. (2 Ndị Eze 16:7, 8) Ka ọ dịgodị, ndị agha Siria na Israel gbara Jerusalem gburugburu, nnọchibido ahụ malitekwara.

13. Mgbanwe dị aṅaa ka anyị na-ahụ n’amaokwu nke 13, na-egosi gịnị?

13 N’iburu enweghị okwukwe nke eze ahụ n’uche, Aịsaịa na-asị: “Biko, nụrụnụ, ụlọ Devid; ọ̀ bụ ihe nta na unu na-eme ka ike gwụ mmadụ, na unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke m?” (Aịsaịa 7:13) Ee, ịdị na-enupụrụ ya isi mgbe nile pụrụ ịgwụ Jehova ike. Rịbakwa ama na onye amụma ahụ kwuziri “Chineke m,” ọ bụghị “Chineke gị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ndị ahụ n’ụzọ dị iche.) Mgbanwe nke na-agba àmà ihe ọjọọ! Mgbe Ehaz jụrụ Jehova ma chigharịkwuru Asiria, ohere ọma o nwere ịmaliteghachi mmekọrịta ya na Chineke funahụrụ ya. Ya adịla mgbe anyị ga-akwụsị iso Chineke na-enwe mmekọrịta site n’imebi nkwenkwe anyị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ iji nweta uru ndị na-adịghị adịte anya.

Ihe Ịrịba Ama nke Immanuel

14. Olee otú Jehova si gosi iguzosi ike ya n’ebe ọgbụgba ndụ ya na Devid dị?

14 Jehova nọgidere na-eguzosi ike n’ebe ọgbụgba ndụ ya na Devid dị. E kwere nkwa inye otu ihe ịrịba ama, a ga-enye otu ihe ịrịba ama! Aịsaịa gara n’ihu, sị: “Onyenwe anyị onwe ya ga-enye unu ihe ịrịba ama; lee, nwa agbọghọ ahụ dị ime, ọ gajekwa ịmụ nwa nwoke, ọ ga-akpọkwa aha ya Immanuel. Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka nwa okoro ahụ ga-eri, mgbe ọ maara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọpụta ezi ihe. N’ihi na tutu nwa okoro ahụ amara ịjụ ihe ọjọọ na ịhọpụta ezi ihe, a ga-ahapụ ala ahụ nke ike eze ha abụọ gwụsịworo gị onwe gị.”—Aịsaịa 7:14-16.

15. Olee ajụjụ abụọ amụma banyere Immanuel na-aza?

15 Nke a bụ ozi ọma nye onye ọ bụla na-atụ ụjọ na ndị mwakpo ahụ ga-eme ka usoro ndị eze sitere n’eriri Devid bịa ná njedebe. “Immanuel” pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.” Chineke nọnyeere Juda, ọ gaghịkwa ekwe ka e mebie ọgbụgba ndụ ya na Devid. Ọzọkwa, a gwara Ehaz nakwa ndị obodo ya ọ bụghị nanị ihe Jehova ga-eme kamakwa mgbe ọ ga-eme ya. Tupu nwa okoro ahụ bụ́ Immanuel etoruo ogo ịma ihe dị iche n’ezi ihe na ihe ọjọọ, a ga-ebibi mba ndị ahụ bụ́ ndị iro ha. Nke a mezukwara!

16. Ọ̀ pụrụ ịbụ n’ihi gịnị ka Jehova ji hapụ ịkọwa onye bụ́ Immanuel n’oge Ehaz?

16 Bible ekwughị onye ọ bụ ya mụrụ Immanuel. Ma ebe nwata ahụ bụ́ Immanuel ga-abụ ihe ịrịba ama, Aịsaịa mesịakwa kwuo na ya na ụmụ ya bụ “ihe ịrịba ama,” ọ pụrụ ịbụ na Immanuel bụ nwa onye amụma ahụ. (Aịsaịa 8:18) Ikekwe Jehova emeghị ka a mata onye Immanuel bụ n’oge Ehaz ka o wee ghara ịdọpụ uche ọgbọ ndị dị n’ihu n’ebe Immanuel Ka Ukwuu nọ. Ònye ka ọ bụ?

17. (a) Ònye bụ Immanuel Ka Ukwuu, gịnịkwa ka ọmụmụ ya na-egosi? (b) N’ihi gịnị ka ndị Chineke pụrụ iji tie taa, sị, “Chineke nọnyeere anyị”?

17 E wezụga n’akwụkwọ Aịsaịa, aha ahụ bụ́ Immanuel pụtara nanị otu ugboro n’ime Bible, na Matiu 1:23. Jehova kpaliri Matiu iji amụma banyere ọmụmụ Immanuel mee ihe n’ihe banyere ọmụmụ Jisọs, bụ́ Onye Nketa ziri ezi nke ocheeze Devid. (Matiu 1:18-23) Ọmụmụ nke Immanuel nke mbụ bụ ihe ịrịba ama na-egosi na Chineke ahapụbeghị ụlọ Devid. N’otu aka ahụ, ọmụmụ nke Jisọs, bụ́ Immanuel Ka Ukwuu, bụ ihe ịrịba ama na-egosi na Chineke ahapụbeghị ihe a kpọrọ mmadụ ma ọ bụ ọgbụgba ndụ Alaeze nke ya na ụlọ Devid gbara. (Luk 1:31-33) Ebe onye nnọchiteanya bụ́ isi nke Jehova nọ ugbu a n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, Matiu pụrụ ikwu n’eziokwu, sị, ‘Chineke nọnyeere anyị.’ Taa, Jisọs na-achị dị ka Eze eluigwe, ọ nọnyekwaara nzukọ ya dị n’elu ala. (Matiu 28:20) N’ezie, ndị Chineke nwere ihe ọzọ mere ha ga-eji were obi ike tie, sị: “Chineke nọnyeere anyị!”

Ihe Ndị Ọzọ Ga-esi n’Ekwesịghị Ntụkwasị Obi Pụta

18. (a) N’ihi gịnị ka ihe ndị Aịsaịa kwuziri ji na-emenye ndị na-ege ya ntị ụjọ? (b) Olee ihe ndị gaje ime n’isi nso?

18 Ọ bụ ezie na okwu ya ndị ikpeazụ na-akasi obi, ihe ọzọ Aịsaịa kwuru menyere ndị na-ege ya ntị ụjọ: “Jehova ga-eme ka ụbọchị bịakwasị n’ahụ gị na n’ahụ ndị gị, na n’ahụ ụlọ nna gị, bụ́ ụbọchị nke na-abịaghị site n’ụbọchị Efraim wezụgara onwe ya n’ahụ Juda; ọbụna eze Asiria.” (Aịsaịa 7:17) Ee, ọdachi na-abịa, ọ bụkwa site n’aka eze Asiria. Atụmanya nke ịbụ ndị Asiria a ma ama n’ihi obi ọjọọ ha chịrị aghaghị ịkpatawororị Ehaz na ndị ya ehighị ụra abalị ọtụtụ mgbe. Ehaz chere na imeta Asiria enyi ga-eme ka o nwere onwe ya pụọ n’aka Israel na Siria. N’ezie, eze Asiria ga-eme ihe Ehaz rịọrọ ya site n’imesịa wakpo Israel na Siria. (2 Ndị Eze 16:9) Ma eleghị anya ọ bụ nke a mere a ga-eji manye Peka na Rezin ịkwụsị nnọchibido ha nọchibidoro Jerusalem. Otú a, ndị Siria na ndị Israel jikọrọ aka ewegharalighị Jerusalem. (Aịsaịa 7:1) Otú ọ dị, Aịsaịa na-agwazi ndị na-ege ya ntị bụ́ ndị ụjọ ji na Asiria, nke ha nwere olileanya na ọ ga-echebe ha, ga-aghọ onye ga-emegbu ha!—Tụlee Ilu 29:25.

19. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ihe omume a ghọrọ ihe akụkọ na-enye ndị Kraịst taa?

19 Nye ndị Kraịst taa, e nwere ịdọ aka ná ntị dị n’akụkọ a mere eme. Mgbe a na-arụgide anyị, a pụrụ ịnwa anyị imebi ụkpụrụ ndị Kraịst, si otú a na-ajụ nchebe Jehova. Nke a bụ elepụghị anya n’ihu, ọbụna mmadụ igbu onwe ya, dị ka e mere ka ọ pụta ìhè site n’ihe ndị ọzọ Aịsaịa kwuru. Onye amụma ahụ gara n’ihu ịkọwa ihe mwakpo ahụ ndị Asiria ga-awakpo ga-eme ala ahụ na ndị bi na ya.

20. Olee ndị bụ́ “ijiji” na “aṅụ,” gịnịkwa ka ha ga-eme?

20 Aịsaịa kewara ihe ndị o kwupụtara ụzọ anọ, nke ọ bụla na-ebu amụma ihe ga-eme “n’ụbọchị ahụ”—ya bụ, ụbọchị Asiria ga-awakpo Juda. “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na Jehova ga-akpọkọta ijiji nke dị ná nsọtụ osimiri Naịl nile nke Ijipt òkù, kpọọkwa aṅụ nke dị n’ala Asiria. Ha ga-abịakwa, ha nile ga-ebekwasịkwa na ndagwurugwu nile nke ebe dị mkputamkpu, na n’ime mgbawa nile nke nkume nile dị elu, na n’ogwu nile, na n’ọzara nile.” (Aịsaịa 7:18, 19) A ga-adọrọ uche nke usuu ndị agha Ijipt na Asiria, ndị dị ka ìgwè ijiji na aṅụ, gaa n’Ala Nkwa ahụ. Nke a agaghị abụ mwakpo ga-adịru nanị nwa oge. “Ijiji” na “aṅụ” ahụ ga-ebiri ebiri, na-amụba n’akụkụ nile nke ala ahụ.

21. N’ụzọ dị aṅaa ka eze Asiria ga-esi yie agụba?

21 Aịsaịa gara n’ihu, na-asị: “N’ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-eji agụba nke e gotara egota n’ofe nile nke Osimiri, bụ́ eze Asiria, kọpụ isi na ajị ụkwụ: ọbụna afụ ọnụ ka ọ ga-akọchapụkwa.” (Aịsaịa 7:20) Ugbu a, ọ bụ nanị Asiria, ndị kasị eyi ha egwu, ka e hotara. Ehaz goro eze Asiria ka ọ “kọpụ” Siria na Israel. Otú ọ dị, ‘agụba a e gotara egota’ nke sitere n’ógbè Yufretis ga-eche ihu ‘n’isi’ Juda ma kọpụ ya kpam kpam, ọbụna na-akọchapụ afụ ọnụ ya!

22. Ihe atụ dịgasị aṅaa ka Aịsaịa ji gosi ihe ndị ga-esi ná mwakpo nke Asiria ga-eme n’oge na-adịghị anya site na mgbe ahụ pụta?

22 Gịnị ga-esi na ya pụta? “Ọ ga-erukwa, n’ụbọchị ahụ, na otu onye ga-edebe otu nwa agbọghọ ehi nke ìgwè ehi ya, na nne atụrụ abụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya ndụ; ọ ga-erukwa, site n’ọtụtụ mmiri ara ha ga-agba, na ọ ga-eri mmiri ara rahụrụ arahụ: n’ihi na mmiri ara rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ ka onye ọ bụla nke fọdụrụ n’etiti ala nke a ga-eri.” (Aịsaịa 7:21, 22) Mgbe ndị Asiria ‘kọpụsịworo’ ala ahụ, ọ ga-afọdụ nnọọ mmadụ ole na ole nke na a ga-achọ ọnụ ọgụgụ dị nta nke anụmanụ iji nweta ihe oriri. A ga-eri “mmiri ara rahụrụ arahụ na mmanụ aṅụ”—ọ dịghị ihe ọzọ, a gaghị aṅụ mmanya, a gaghị eri achịcha, a gaghị eri ihe oriri ndị ọzọ bụ́ isi. Dị ka ọ̀ bụ iji mesie ntọgbọrọ n’efu ahụ ike, Aịsaịa kwuru ugboro atọ na n’ebe e nweburu ala bara uru, nke na-emepụta nri, a ga-enwezi ogwu na uké na ahịhịa. ‘Akụ́ na ụta’ ga-adị ndị na-aga ná mpụga obodo mkpa iji chebe onwe ha pụọ n’aka anụ ọhịa ndị zoro n’alụghụlụ. Ubi ndị a sụchara asụcha ga-aghọ ebe ehi na atụrụ na-azọtọ. (Aịsaịa 7:23-25) Amụma a malitere imezu n’oge Ehaz.—2 Ihe E Mere 28:20.

Amụma Ndị A Kapịrị Ọnụ

23. (a) Gịnị ka e nyere Aịsaịa iwu ka o mee ugbu a? (b) Olee otú e si nwapụta ihe ịrịba ama nke mbadamba ihe ahụ?

23 Aịsaịa laghachiri ugbu a n’ọnọdụ dị mgbe ahụ. Ka ndị agha jikọrọ aka ọnụ nke Siria na Israel ka nọchibidoro Jerusalem, Aịsaịa na-akọ, sị: “Jehova wee sị m, Were n’onwe gị otu oké mbadamba ihe, ji[ri]kwa ihe mmadụ ji ede ihe odide dekwasị ya, Nke a dịịrị Maha-shalal-hash-baz; M ga-emekwa ka ndị àmà nke kwesịrị ntụkwasị obi nọọrọ m n’àmà, bụ́ Ụraịa onye nchụàjà, na Zekaraịa nwa Jeberekaịa.” (Aịsaịa 8:1, 2) Aha ahụ bụ́ Maha-shalal-hash-baz pụtara “Mee Ngwa, Ihe Nkwata! Ọ Bịawo Ngwa Ngwa Ịkwakọrọ Ihe.” Aịsaịa gwara ndị ikom abụọ a na-akwanyere ùgwù n’obodo ka ha bụrụ ndị akaebe n’odide o dere aha a ná mbadamba ihe, ka ha wee gbaa akaebe n’ọdịnihu banyere izi ezi nke ihe odide a. Otú ọ dị, ihe ịrịba ama nke abụọ ga-anwapụta ihe ịrịba ama nke a.

24. Mmetụta dị aṅaa ka ihe ịrịba ama nke Maha-shalal-hash-baz kwesịrị inwe n’ahụ ndị Juda?

24 Aịsaịa na-ekwu, sị: “M wee bakwuru nwunye m, bụ́ amụma nwanyị; o wee tụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Jehova wee sị m, Kpọọ aha ya Maha-shalal-hash-baz. N’ihi na tutu nwata ahụ amara ịkpọ, sị, Nna m, na, Nne m, a ga-ebulaga akụ̀ Damaskọs na ihe Sameria a kwatara n’agha n’ihu eze Asiria.” (Aịsaịa 8:3, 4) Ma oké mbadamba ihe ahụ ma nwatakịrị nwoke ahụ a mụrụ ọhụrụ ga-abụcha ihe àmà na n’oge na-adịghị anya Asiria ga-awakpo ndị na-emegide Juda, bụ́ Siria na Israel. Olee mgbe? Tupu nwatakịrị nwoke ahụ enwee ike ikwu okwu ndị mbụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka na-amụta ikwu—“Nna” na “Nne.” Amụma dị otú ahụ a kapịrị ọnụ kwesịrị ime ka ndị ahụ nwee obi ike n’ebe Jehova nọ. Ma ọ bụkwanụ ọ pụrụ ime ka ụfọdụ ndị kwaa Aịsaịa na ụmụ ya emo. Nke ọ bụla ọ bụkwa, okwu amụma Aịsaịa mezuru.—2 Ndị Eze 17:1-6.

25. Myirịta dịgasị aṅaa dị n’agbata oge Aịsaịa na ugbu a?

25 Ndị Kraịst pụrụ ịmụta ihe site n’ịdọ aka ná ntị Aịsaịa nyere ugboro ugboro. Pọl onyeozi mere ka anyị mata na n’ihe omume a ghọrọ ihe akụkọ, Aịsaịa sere onyinyo Jisọs Kraịst, ụmụ Aịsaịa sekwara onyinyo ndị na-eso ụzọ Jisọs e tere mmanụ. (Ndị Hibru 2:10-13) Jisọs, site n’ọnụ ụmụazụ ya e tere mmanụ nọ n’elu ala, anọwo na-echetara ezi ndị Kraịst mkpa ọ dị ‘ịmụrụ anya’ n’oge ndị a dị oké egwu. (Luk 21:34-36) N’otu mgbe ahụkwa, a na-adọ ndị mmegide na-achọghị ichegharị aka ná ntị banyere mbibi ha na-abịanụ, ọ bụ ezie na ha na-ejikarị ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ emere ihe ọchị. (2 Pita 3:3, 4) Mmezu e mezuru amụma ndị nwere oge n’ụbọchị Aịsaịa bụ ihe imesi obi ike na usoro ọgụgụ oge nke Chineke debere maka oge anyị ‘aghaghịkwa ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.’—Habakuk 2:3.

“Mmiri” Ndị Na-ebibi Ihe

26, 27. (a) Olee ihe omume ndị Aịsaịa buru amụma banyere ha? (b) Gịnị ka ihe ndị Aịsaịa kwuru na-egosi maka ndị ohu Jehova taa?

26 Aịsaịa gara n’ihu n’ịdọ aka ná ntị ya: “N’ihi na ndị nke a ajụwo mmiri Shaịloa nke na-aga nwayọọ, ma obi ụtọ ha dị n’ebe Rezin na nwa Remalaịa nọ; ọbụna n’ihi nke a, lee, Onyenwe anyị na-eme ka mmiri Osimiri rịgokwasị ha, bụ́ mmiri nke dị ike dịkwa ọtụtụ, ọbụna eze Asiria na ebube ya nile: ọ ga-arịgokwasịkwa ebe ya nile mmiri si eru, rusaa ụsọ ya nile: ọ ga-erurukwa baa na Juda; ọ ga-eruchi, gabigakwa; ọbụna n’olu ka ọ ga-eru; nsetịpụ nku ya abụọ ga-abụkwa ihe jupụtara obosara ala gị, Immanuel.”—Aịsaịa 8:5-8.

27 “Ndị nke a,” alaeze ebe ugwu nke Israel, jụrụ ọgbụgba ndụ Jehova na Devid gbara. (2 Ndị Eze 17:16-18) Nye ha, o yiri ihe na-esighị ike dị ka mmiri Shaịloa nke na-adịghị agasi ike, bụ́ ebe Jerusalem si enweta mmiri. Ha na-aṅụrị ọṅụ n’agha ha busoro Juda. Ma ha ga-enwetarịrị ntaramahụhụ maka nleda anya a. Jehova ga-ahapụ ndị Asiria ka ha ‘ruchie,’ ma ọ bụ rikpuo, Siria na Israel, dị nnọọ ka Jehova ga-esi kwe ka akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị ugbu a nke ụwa ruchie ógbè nke okpukpe ụgha n’isi nso. (Mkpughe 17:16; tụlee Daniel 9:26.) Aịsaịa kwuziri na “mmiri” ahụ na-eto eto “ga-erurukwa baa na Juda,” ruo kpọmkwem “n’olu” ya, ruo Jerusalem, bụ́ ebe isi (eze) Juda na-achị.b N’oge anyị a ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ ndị bibiri okpukpe ụgha ga-abịakwasịkwa ndị ohu Jehova n’otu aka ahụ, gbaa ha gburugburu ruo “n’olu.” (Ezikiel 38:2, 10-16) Gịnị ga-esi na ya pụta? Gịnị mere n’oge Aịsaịa? Ndị Asiria hà ruuru gafere mgbidi obodo ahụ ma kpochapụ ndị Chineke? Ee e. Chineke nọnyeere ha.

Atụla Egwu—“Chineke Nọnyeere Anyị”

28. N’agbanyeghị oké mgbalị ndị iro ha na-eme, gịnị ka Jehova na-emesi Juda obi ike banyere ya?

28 Aịsaịa na-adọ aka ná ntị, sị: “Jọọnụ njọ, unu ndị dị iche iche [bụ́ ndị na-emegide ndị ha na Chineke gbara ndụ], ma a ga-etipịa unu; ṅakwaanụ ntị, unu ndị nile nọ n’ebe dị anya nke ụwa: keenụ ihe n’úkwù unu, ma a ga-etipịa unu. Dụrịtanụ onwe unu ọdụ, ma a ga-emebi ya; kwuonụ okwu, ma ọ gaghị eguzosi ike: n’ihi na Chineke nọnyeere anyị.” (Aịsaịa 8:9, 10) Afọ ụfọdụ n’ihu, n’oge ọchịchị nke nwa Ehaz kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Hezekaịa, okwu ndị a mezuru. Mgbe ndị Asiria yiri Jerusalem egwu, mmụọ ozi Jehova tigburu 185,000 n’ime ha. N’ụzọ doro anya, Chineke nọnyeere ndị ya nakwa usoro ndị eze sitere n’eriri Devid. (Aịsaịa 37:33-37) N’oge agha Amagedọn ahụ na-abịanụ, Jehova n’otu aka ahụ ga-ezipụ Immanuel Ka Ukwuu ọ bụghị nanị ka o tipịa ndị iro Ya kamakwa ka ọ napụta ndị nile na-atụkwasị Ya obi.—Abụ Ọma 2:2, 9, 12.

29. (a) Olee otú ndị Juu nọ n’oge Ehaz si dị iche ná ndị nke nọ n’oge Hezekaịa? (b) N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova taa ji ezere ịbanye ná njikọ aka okpukpe na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị?

29 N’adịghị ka ndị Juu nọ n’oge Hezekaịa, ndị ha na Ehaz dịkọrọ ndụ enweghị okwukwe ná nchebe Jehova. Ha ka nwee mmasị ná njikọ aka, ma ọ bụ “izu mmegide,” nke ha na ndị Asiria dị ka ihe nchebe pụọ n’aka ndị Siria na ndị Israel jikọrọ aka. Otú ọ dị, “aka” Jehova kpaliri Aịsaịa ikwu okwu megide ‘ụzọ ndị nke a,’ ma ọ bụ ihe zuru ebe nile. Ọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Unu agaghị atụkwa egwu ihe ha na-atụ egwu ya, unu agaghị amakwara ya jijiji. Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Ya ka unu ga-edo nsọ; Ya onwe ya bụrụkwa ihe unu na-atụ egwu, Ya onwe ya bụrụkwa ihe na-eme ka unu maa jijiji.” (Aịsaịa 8:11-13) N’iburu nke a n’uche, ndị ohu Jehova taa na-anọ na nche megide isoro òtù okpukpe na njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche gbakọọ izu ma ọ bụ tụkwasị ha obi. Ndị ohu Jehova nwere obi ike zuru ezu n’ike nchebe Chineke. E kwuwerị, ọ bụrụ na ‘Jehova dịnyeere anyị, gịnị ka mmadụ ga-eme anyị?’—Abụ Ọma 118:6.

30. Gịnị ga-abịakwasị ndị na-adịghị atụkwasị Jehova obi?

30 Aịsaịa gara n’ihu ikwughachi na Jehova ga-abụ “ebe nsọ,” ihe nchebe, nye ndị na-atụkwasị ya obi. N’ụzọ dị iche, ndị jụrụ ya “ga-asụkwa ngọngọ, wee daa, e wee tipịa ha, ha ga-amakwa n’ọnyà, e wee nwụde ha”—ngwaa ise ndị kọwara n’ụzọ doro anya ihe ga-abịakwasị ndị na-atụkwasịghị Jehova obi. (Aịsaịa 8:14, 15) Na narị afọ mbụ, ndị jụrụ Jisọs sụkwara ngọngọ ma daa. (Luk 20:17, 18) Ihe yiri nke ahụ ga-eme ndị jụrụ taa irubere Eze eluigwe ahụ e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, bụ́ Jisọs, isi.—Abụ Ọma 2:5-9.

31. Olee otú ezi ndị Kraịst taa pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Aịsaịa na nke ndị na-ege ntị n’ihe ọ na-akụzi?

31 N’oge Aịsaịa, ọ bụghị mmadụ nile sụrụ ngọngọ. Aịsaịa na-ekwu, sị: “Kechie ihe àmà, kaa iwu akara n’etiti ndị mmụta m. M ga-echerekwa Jehova, Nke na-ezonahụ ụlọ Jekọb ihu Ya, m ga-elekwa anya Ya.” (Aịsaịa 8:16, 17) Aịsaịa na ndị na-aṅa ntị n’ihe ọ na-akụzi agaghị agbahapụ Iwu Chineke. Ha nọgidere na-atụkwasị Jehova obi, ọ bụ ezie na ndị ibe ha dị isi ike jụrụ ime otú ahụ wee si otú a mee ka Jehova zochiere ha ihu ya. Ka anyị gbasoo ihe nlereanya nke ndị na-atụkwasị Jehova obi ma kpebisie ike dị ka ha ịrapagidesi ike n’ofufe dị ọcha!—Daniel 12:4, 9; Matiu 24:45; tụlee Ndị Hibru 6:11, 12.

“Ihe Ịrịba Ama” na “Ihe Ebube”

32. (a) Olee ndị taa bụ ‘ihe ịrịba ama na ihe ebube’? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji dị iche n’ụwa?

32 Aịsaịa kpọsara ugbu a, sị: “Lee, mụ onwe m na ụmụ nke Jehova nyeworo m ịbụ ihe ịrịba ama na ịbụ ihe ebube n’etiti Israel site na Jehova nke usuu nile nke ndị agha, Onye bi n’ugwu Zaịọn.” (Aịsaịa 8:18) Ee, Aịsaịa, Shea-jashub, na Maha-shalal-hash-baz bụcha ihe ịrịba ama nke nzube Jehova maka Juda. Taa, Jisọs na ụmụnna ya e tere mmanụ bụ n’otu aka ahụ ihe ịrịba ama. (Ndị Hibru 2:11-13) “Oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” na-esonyekwara ha n’ọrụ ha. (Mkpughe 7:9, 14; Jọn 10:16) N’ezie, ihe ịrịba ama na-aba uru nanị ma ọ bụrụ na ọ dị iche n’ihe ndị gbara ya gburugburu. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst na-arụzu ọrụ e nyere ha nke ịbụ ihe ịrịba ama nanị ma ọ bụrụ na ha dị iche n’ụwa a, na-atụkwasị Jehova obi ha nile ma jiri anyaike na-ekwusa nzube ya.

33. (a) Gịnị ka ezi ndị Kraịst kpebisiri ike ime? (b) N’ihi gịnị ka ezi ndị Kraịst ga-eji nwee ike iguzosi ike?

33 Mgbe ahụ, ka mmadụ nile na-edebe ụkpụrụ Chineke, ọ bụghị nke ụwa a. Nọgide na-adị iche n’atụghị egwu—dị ka ihe ịrịba ama—jiri ọrụ ahụ e nyere Aịsaịa Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, na-aga n’ihu: “[Kpọsaa] afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ . . . na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.” (Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:17-21) N’ezie, mgbe mmiri Asiria ruchiri ụwa—ọ bụrụgodị na o ruo anyị n’olu—a gaghị ekpochapụ ezi ndị Kraịst. Anyị ga-eguzosi ike n’ihi na “Chineke nọnyeere anyị.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere mmezu nke amụma a, lee Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peji nke 62 na 758, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b E jikwa Asiria tụnyere nnụnụ nke nku ọ gbasapụrụ agbasapụ “jupụtara obosara ala gị.” Ya mere, n’ebe ọ bụla ala ahụ dịruru, ndị agha Asiria ga-anọju na ya.

[Foto dị na peeji nke 103]

Aịsaịa kpọ Shea-jashub jee mgbe o ziri Ehaz ozi Jehova ziri

[Foto dị na peeji nke 111]

N’ihi gịnị ka Aịsaịa ji dee “Maha-shalal-hash-baz” n’elu mbadamba ihe?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya