Oge Eruwo Iteta!
“EHIELA ụzọ banyere oge anyị bi n’ime ya; oge eruworị ka anyị si n’ụra anyị teta.” (Ndị Rom 13:11, Knox) Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Rom okwu ndị ahụ n’ihe dị ka afọ 14 tupu ajọ njedebe nke usoro ihe ndị Juu na 70 O.A. N’ihi na ha mụ anya n’ụzọ ime mmụọ, ndị Juu bụ́ ndị Kraịst anọghị na Jerusalem n’oge ahụ dị oké mkpa, ya mere ha gbanahụrụ ọnwụ ma ọ bụ ịgba ohu. Ma olee otú ha si mara na ha kwesịrị ịhapụ obodo ahụ kpam kpam?
Jisọs Kraịst adọwo aka ná ntị na ndị iro ga-agba Jerusalem gburugburu nakwa na a ga-atụda ndị bi n’ime ya n’ala. (Luk 19:43, 44) Mgbe nke a gasịrị, Jisọs nyere ụmụazụ ya kwesịrị ntụkwasị obi ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara nke na-esighị ike nghọta. (Luk 21:7-24) Nye ndị Kraịst ahụ bi na Jerusalem, ịgbahapụ obodo ukwu ahụ pụtara ịhapụ ebe obibi na ọrụ. Otú o sina dị, ịnọ na nche na mgbapụ ha chebere ndụ ha.
Mgbe Jisọs buru amụma banyere mbibi Jerusalem, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-abụ, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Ná nzaghachi ya, Jisọs ji ọnụnọ ya n’ọdịnihu tụnyere oge nke bu Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ nke ụbọchị Noa ụzọ. Jisọs kwuru na Iju Mmiri ahụ kpochapụrụ ndị nile na-emebi iwu. (Matiu 24:21, 37-39) O si otú a gosi na Chineke ga-etinye aka ọzọ n’ihe omume mmadụ. Ruo n’ókè hà aṅaa? Leenụ, ruo n’ókè nke iwepụ ajọ ụwa, ma ọ bụ otu usoro ihe dum! (Tụlee 2 Pita 3:5, 6.) Nke ahụ ọ̀ pụrụ ime n’oge anyị?
Ihe Nile Hà Ka Dị Otú Ha Dị?
Ọ bụ ndị Juu ole na ole nke narị afọ mbụ chetụdịrị n’echiche na a ga-ebibi obodo nsọ ha, bụ́ Jerusalem. Ụdị ekwenyeghị ekwenye ahụ ka a na-ahụtakarị n’etiti ndị bi nso n’ugwu na-agbawa agbawa ma bụrụ ndị na-ahụtụbeghị mgbawa. “Ọ bụghị n’oge ndụ m” bụ mmeghachi omume a na-ahụkarị mgbe e kwuru okwu ịdọ aka ná ntị. “Dị ka ọ na-adịkarị ugwu mgbawa na-eme n’ime narị afọ abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla,” ka onye ọkà n’ihe banyere ugwu mgbawa bụ́ Lionel Wilson na-akọwa. “Ị na-enwe nchegbu ma ndị mụrụ gị hà kwapụrụ n’ihi ugwu mgbawa. Ma ọ bụrụ na o mere nne na nna gị ochie, ọ bụzi akụkọ ifo.”
Otú ọ dị, ezi ihe ọmụma pụrụ inyere anyị aka ịmata ihe mgbaàmà nke ihe ize ndụ ma were ha kpọrọ ihe. N’ime ndị ahụ si n’Ugwu Pelée gbapụ, otu maara nke ọma banyere ugwu mgbawa ma ghọta ihe mgbaàmà nke ihe ize ndụ ndị ahụ. A kọwatakwara ụdị ihe mgbaàmà ahụ n’oge na-adịghị anya tupu Ugwu Pinatubo agbawaa. Onye ọkà n’ugwu mgbawa bụ́ onye leruru anya n’ike ndị a na-adịghị ahụ anya nke na-ebilite n’ime ugwu ahụ mere ka ndị bi n’ógbè ahụ kwenyesie ike ịhapụ ebe ahụ.
N’ezie, ụfọdụ ga-anọgide na-eleghara ihe mgbaàmà nke ihe ize ndụ anya ma sie ọnwụ na ọ dịghị ihe gaje ime. Ha pụrụ ọbụna ịkwa ndị mere ihe ozugbo emo. Pita onyeozi buru amụma na ụdị echiche ahụ ga-abụ ihe a na-ahụkarị n’oge anyị. “Unu buru ụzọ mara nke a,” ka o kwuru, “na ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka agụụ ihe ọjọọ nke aka ha si dị, na-asịkwa, Olee ebe nkwa nke ọbịbịa Ya dị? n’ihi na site n’ụbọchị nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.”—2 Pita 3:3, 4.
Ì kwere na anyị nọ na “mgbe ikpeazụ”? Na The Columbia History of the World, John A. Garraty na Peter Gay na-ajụ, sị: “Ànyị na-ahụ ndakpọsị nke mmepeanya anyị?” Mgbe ahụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme a na-atụle nsogbu nke ọchịchị, ịrị elu zuru ụwa ọnụ n’ime mpụ nakwa n’inupụrụ ọchịchị isi, ndakpọ nke ndụ ezinụlọ, ọdịda sayensị na nkà na ụzụ dara n’ịgwọta nsogbu ọha mmadụ, ọgba aghara nke ọchịchị, na nretọ zuru ụwa ọnụ nke omume na okpukpe. Ha na-ekwubi, sị: “Ọ bụrụ na ihe ndị a abụghị ihe mgbaàmà nke ọgwụgwụ doro anya, ha yichara ya nnọọ.”
Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na “ọgwụgwụ” dị ezi nso. Ee e, ọ dịghị mkpa ka anyị tụọ egwu maka ọgwụgwụ nke ụwa n’onwe ya, n’ihi na Bible na-asị na Chineke ‘atọwo ntọala ụwa n’elu ọnọdụ ya guzosiri ike, ka a ghara iwezụga ya n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 104:5) Ma, anyị kwesịrị ịtụ anya ọgwụgwụ dị ngwa nye ajọ usoro ihe ndị kpatawooro ihe a kpọrọ mmadụ oké nhụsianya. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị pụrụ ịhụ ọtụtụ akụkụ ndị doro anya bụ́ ndị e ji amata mgbe ikpeazụ nke usoro ihe a, dị ka Jisọs Kraịst si kọwaa ya. (Lee igbe bụ́ “Akụkụ Ụfọdụ nke Mgbe Ikpeazụ.”) Gịnị ma i were okwu Jisọs tụnyere ihe ndị na-eme n’ụwa? Ime otú ahụ pụrụ inyere gị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha maka onwe gị na ezinụlọ gị. Ma gịnị mere a ga-eji mee ihe ugbu a?
Ọ Dị Ezigbo Mkpa Ịmụrụ Anya
Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta sayensị pụrụ ịma mgbe ugwu mgbawa dị ezi nso, ha apụghị ikwu kpọmkwem mgbe ọ ga-eme. N’otu aka ahụ, banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, Jisọs sịrị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:36) Ebe ọ bụ na anyị amaghị kpọmkwem mgbe usoro ihe dị ugbu a ga-agwụ, Jisọs nyere anyị ịdọ aka ná ntị a: “Unu mara nke a, na ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararịị oge nche onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ekwekwa ka e gwupuo ụlọ ya. N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ [Jisọs] ga-abịa.”—Matiu 24:43, 44.
Okwu Jisọs na-egosi na ọgwụgwụ na-eweta mbibi nke usoro ihe a ga-abịakwasị ụwa a na mberede. Ọ bụrụgodị na anyị bụ ụmụazụ ya, ọ dị anyị mkpa ‘ịbụ ndị e doziworo.’ Ọnọdụ anyị dị ka nke onye nwe ụlọ bụ́ onye ọ pụrụ ime na mberede n’ihi na ọ maghị mgbe onye ohi ga-etiwabata n’ụlọ ya.
N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka, sị: “Unu onwe unu matara nke ọma na dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa. . . . Unu onwe unu, ụmụnna anyị, anọghị n’ọchịchịrị, ka ụbọchị ahụ wee jide unu na mberede dị ka onye ohi.” Pọl gbakwara ume, sị: “Ka anyị ghara ịrahụ ụra, dị ka ndị fọdụrụ, kama ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 4, 6, ntụaka ala ala peji nke NW) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịdị “na-eche nche nweekwa anya udo”?
N’adịghị ka mgbapụ nke ndị Kraịst narị afọ mbụ pụọ na Jerusalem, mgbapụ anyị gaa ná nchebe adịghị agụnye isi n’otu obodo pụọ. Mgbe ọ dụsịrị ndị kwere ekwe ibe ya nọ na Rom ọdụ ka ha si n’ụra teta, Pọl gbara ha ume ka ha “yipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị” ma ‘yikwasị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.’ (Ndị Rom 13:12, 14) Site n’ịgbasochi nzọụkwụ Jisọs anya, anyị ga-egosi onwe anyị dị ka ndị mụ anya banyere oge anyị, ịnọ na nche nke a n’ụzọ ime mmụọ ga-emekwa ka o kwe anyị mee inweta nchebe Chineke mgbe ajọ usoro ihe nke a ga-abịa ná njedebe.—1 Pita 2:21.
Ndị na-agbaso Jisọs Kraịst na-anụ ụtọ ndụ nwere nzube, nke na-ejukwa afọ. Ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova achọpụtawo na yoke nke ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst bụ nke na-adịghị egbu mgbu na nke na-enye ume ọhụrụ. (Matiu 11:29, 30, ntụaka ala ala peji nke NW) Nzọụkwụ mbụ n’ịghọ onye na-eso ụzọ bụ ‘ịmara Chineke na onye O zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.’ (Jọn 17:3) Ndịàmà na-eleta ọtụtụ nde ebe obibi kwa izu iji nyere ndị mmadụ aka inweta “mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ha ga-enwe obi ụtọ iduziri gị ọmụmụ Bible n’efu n’ebe obibi gị. Ka ị na-etokwa n’ihe ọmụma nke Okwu Chineke, obi abụọ adịghị ya na gị onwe gị ga-ekwenyekwa na oge anyị dị iche. N’ezie, oge eruwo isi n’ụra teta!
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]
Akụkụ Ụfọdụ nke Mgbe Ikpeazụ
“Mba ga-ebili imegide mba ọzọ”; ‘a ga-anapụ udo n’ụwa.’ (Matiu 24:7; Mkpughe 6:4)
Agha ụwa abụọ nke narị afọ a, tinyere ọtụtụ ọgụ ndị ọzọ, anapụwo udo n’ụwa. “Agha Ụwa Mbụ—e mesịakwa nke Abụọ—ghọrọ ndị dị iche n’agha nile ndị a lụburu,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ John Keegan na-ede, “ha dị iche n’ọ̀tụ̀tụ̀, n’ịkpụ ọkụ n’ọnụ, n’ịgbasa agbasa na mfu nke ihe onwunwe na mmadụ. . . . Agha Ụwa ndị ahụ gbukwuru ọtụtụ mmadụ, lakwuo ọtụtụ akụ̀ na ụba n’iyi, kpatakwa nhụjuanya ka ukwuu n’ógbè ka saa mbara nke ụwa karịa agha ọ bụla ọzọ bu ụzọ.” Agha na-emekpọ ndị inyom na ụmụaka ọnụ ugbu a karịa ndị soja. Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu gụkọtara na n’afọ iri gara aga, e gbuwo nde ụmụaka abụọ n’agha.
“Oké ụnwụ” (Matiu 24:7; Mkpughe 6:5, 6, 8)
Na 1996 ọnụ ahịa nke wheat na ọka rịrị elu nke ukwuu. Gịnị kpatara ya? Nkwakọba nke mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a n’ụwa adalatawo ruo nanị nke pụrụ izu maka ụbọchị 50, bụ́ ọnụ ọgụgụ kasị dị ala n’ihe ndekọ. Ịrị elu nke ọnụ ahịa ihe oriri ndị bụ́ isi pụtara na ọtụtụ narị nde nke ndị ogbenye ndị nọ n’ụwa—nke ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụaka—na-anọ agụụ alaba ụra.
“Ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche” (Matiu 24:7)
N’ime afọ 2,500 gara aga, nanị nke ọ bụla n’ime ala ọma jijiji itoolu egbuwo ihe karịrị 100,000 ndị mmadụ. Anọ n’ime ala ọma jijiji ndị a emewo kemgbe 1914.
“Ihe na-emebi iwu ga-aba ụba” (Matiu 24:12)
Ka narị afọ nke 20 na-abịa ná ngwụsị, mmebi iwu, ma ọ bụ ịda iwu, agbasawo ebe nile. Mwakpo nke ndị na-eyi ọha egwu n’ebe ndị nkịtị nọ, ndị ogbu ọchụ obi tara mmiri, na igbu ndị mmadụ n’ìgwè so n’akụkụ ndị jọgburu onwe ha nke mgbe ikpeazụ ndị a jupụtara n’ihe ike.
“Ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche” (Luk 21:11)
N’afọ ndị 1990, o yikarịrị ka nde mmadụ 30 ga-anwụ n’ihi ụkwara nta. Nje bacteria ndị na-ebu ọrịa na-eguzogidezi ọgwụ n’ụzọ dị ukwuu. Ịba, bụ́ ọrịa ọzọ na-egbu egbu, na-arịa ihe nọ n’agbata nde mmadụ 300 na 500 kwa afọ, na-egbukwa ihe dị ka nde 2. Ka ọ na-erule ọgwụgwụ nke iri afọ a, a na-atụ anya na ọrịa AIDS ga-akpata ọnwụ nke nde 1.8 n’otu afọ. “Taa ụmụ mmadụ na-ahụ ntiwapụ ọrịa ka ntiwapụ ọrịa nile,” ka State of the World 1996 na-ekwu.
“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14)
Na 1997, Ndịàmà Jehova tinyere ihe karịrị otu ijeri hour n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ihe karịrị nde Ndịàmà ise na-eji ozi a mgbe nile na-agakwuru ndị mmadụ n’ala 232.
Ebe E Si Nweta Foto]
FAO photo/B. Imevbore
U.S. Coast Guard photo
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ndị Kraịst si na Jerusalem gbapụ n’ihi na ha mụ anya n’ụzọ ime mmụọ