Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 5/1 p. 27-31
  • Ịnọgidesi Ike Na-ejere Kraịst Bụ́ Eze Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịnọgidesi Ike Na-ejere Kraịst Bụ́ Eze Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eze nke Na-akpali Ndị Mmadụ Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Ya
  • Iru Eru Ịbụ Onye Kraịst Ga-achị
  • Ndị Kraịst Ga-achị Ga-erube Isi n’Iwu Ya
  • Ule E Ji Ama Ma Ndị Kraịst Ga-achị Hà Kwụsikwara Ike n’Akụkụ Ya
  • Nkwụghachi Ụgwọ Ga-adịru Ebighị Ebi nke Ndị Na-akwadosi Eze ahụ Ike Ga-enweta
  • Ị̀ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi nye Eze Ọhụrụ nke Ụwa?
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • “Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Lee Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Imeri Ihe Ịma Aka nke Iguzosi Ike n’Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 5/1 p. 27-31

Ịnọgidesi Ike Na-ejere Kraịst Bụ́ Eze Ozi

“Ọ bụkwa ya ka e nyere ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee Ya.”—DANIEL 7:14.

1, 2. Olee otú anyị si mara na ọchịchị Alaeze Kraịst erughị ebe nile n’afọ 33 O.A.?

OLEE onye ọchịchị nke pụrụ ịnwụrụ ndị ọ na-achị ma dịghachi ndụ iji chịwakwa dị ka eze? Oleekwa eze nke pụrụ ibi n’ụwa ma mee ka ndị ọ na-achị tụkwasị ya obi ma na-akwado ọchịchị ya, ma mesịa gaa eluigwe, sizie ebe ahụ na-achị ha? Ọ bụ nanị Jizọs Kraịst pụrụ ime nke a, ọbụna mee karị. (Luk 1:32, 33) Na Pentikọst 33 O.A., mgbe Kraịst nwụsịrị, bilite n’ọnwụ, ma rịgoro n’eluigwe, Chineke ‘mere ya onyeisi nke ihe nile n’ebe ọgbakọ ahụ dị.’ (Ndị Efesọs 1:20-22; Ọrụ 2:32-36) Kraịst si otú a malite ịchị, ma ọchịchị ya erughị ebe nile. Ndị mbụ ọ nọ na-achị bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, bụ́ ndị mejupụtara Izrel ime mmụọ, “Izrel nke Chineke.”—Ndị Galeshia 6:16; Ndị Kọlọsi 1:13.

2 Ka ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri atọ ka Pentikọst nke afọ 33 O.A. gasịrị, Pọl onyeozi mesiri ya ike na ọchịchị Alaeze Kraịst erubeghị ebe nile, kama nke ahụ, Ọ nọ “n’aka nri Chineke, malite mgbe ahụ gaa n’ihu na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya dị ka ihe mgbakwasị maka ụkwụ ya.” (Ndị Hibru 10:12, 13) Ka ọ na-eruzi ná ngwụsị nke narị afọ mbụ Oge Anyị, Jọn onyeozi katarala ahụ́ hụrụ ka Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova, na-echi Kraịst Jizọs Eze nke Alaeze eluigwe ahụ e hiwere ọhụrụ. (Mkpughe 11:15; 12:1-5) Taa, anyị pụrụ ịtụle ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na Kraịst malitere ịchị dị ka Eze Mezaịa n’eluigwe na 1914.a

3. (a) Olee akụkụ ọhụrụ nke ozi ọma ahụ bụ́ nke pụtaworo ìhè kemgbe 1914? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

3 Kemgbe 1914, ozi ọma ahụ enweela akụkụ ọhụrụ na-akpali nnọọ mmasị. Kraịst anọwo na-arụsi ọrụ ike dị ka eze nke Alaeze eluigwe Chineke ọ bụ ezie na ọ na-achị “n’etiti ndị iro [ya].” (Abụ Ọma 110:1, 2; Matiu 24:14; Mkpughe 12:7-12) Ọzọkwa, gburugburu ụwa, ndị na-akwadosi ọchịchị ya ike ji obi ha na-erubere ya isi site n’ikere òkè n’ọrụ nkụzi Bible zuru ụwa ọnụ bụ́ nke a na-enwebeghịkwa ụdị ya kemgbe ụwa. (Daniel 7:13, 14; Matiu 28:18) Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ya bụ “ụmụ nke alaeze ahụ,” na-eje ozi dị ka “ndị nnọchiteanya nọ n’ọnọdụ Kraịst.” Ìgwè “atụrụ ọzọ” na-amụba amụba nke Kraịst, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi nke Alaeze Chineke, na-akwadosi ha ike. (Matiu 13:38; 2 Ndị Kọrint 5:20; Jọn 10:16) Ya bụrụgodị otú ahụ, ọ dị anyị mkpa n’otu n’otu inyocha onwe anyị iji mara ma ànyị na-erubere Kraịst isi n’ezie. Ànyị kwụsiri nnọọ ike n’akụkụ ya? Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwado Eze nke na-achị n’eluigwe? Ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ndị mere anyị ga-eji kwụsie ike n’akụkụ Kraịst.

Eze nke Na-akpali Ndị Mmadụ Ịkwụsi Ike n’Akụkụ Ya

4. Gịnị ka Jizọs mere dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze mgbe o jere ozi n’ụwa?

4 Ihe mere anyị ji akwụsi ike n’akụkụ Kraịst bụ n’ihi ihe o meere anyị nakwa n’ihi àgwà ya ndị magburu onwe ha. (1 Pita 1:8) Mgbe ọ nọ n’ụwa, Jizọs dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, gosiri n’ụzọ dị nta ihe ọ ga-eme n’ụwa nile ma ya chịwa dị ka Eze mgbe oge Chineke ruru. O nyere ndị agụụ ji nri. Ọ gwọrọ ndị ọrịa, ndị ìsì, ndị nwere nkwarụ, ndị ntị chiri na ndị ogbi. Ọbụna ọ kpọlitere ụfọdụ ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 15:30, 31; Luk 7:11-16; Jọn 6:5-13) Tụkwasị na nke ahụ, ịma banyere otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa na-enyere anyị aka ịmata àgwà ndị o nwere dị ka Onye ga-achị ụwa n’ọdịnihu—nke kasị pụta ìhè n’ime ha bụ ụdị ịhụnanya o nwere bụ́ nke kpaliri ya ịchụ onwe onye n’àjà. (Mak 1:40-45) A kọrọ na Napoléon Bonaparte kwuru banyere nke a, sị: “Aleksanda, Siza, Charlemagne, na mụ onwe m guzobere alaeze ukwu dị iche iche, ma n’elu gịnị ka anyị dabeere nchepụta nile nke oké ọgụgụ isi anyị? Ọ bụ n’ime ihe n’ike. Ọ bụ nanị Jizọs Kraịst mere ntọala alaeze ya n’elu ịhụnanya, n’oge a kwa, ọtụtụ nde ndị mmadụ ga-achọ ịnwụ maka Kraịst.”

5. N’ihi gịnị ka ụdị onye Jizọs bụ ji adọrọ mmasị ndị mmadụ?

5 N’ihi na Jizọs nwere obi dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, ozizi ya na-ewuli elu na obiọma ya mere ka ndị nọ ná nsogbu na ndị a na-ebogbu n’ibu nwee ume ọhụrụ. (Matiu 11:28-30) Ahụ́ na-eru ụmụaka ala ma ya na ha nọrọ. Ndị ikom nwere nghọta ma dị umeala n’obi ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 4:18-22; Mak 10:13-16) N’ihi na ọ bụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-akwanyere ha ùgwù, ọtụtụ ndị inyom na-atụ egwu Chineke, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha jiri oge, ike, na ihe onwunwe ha lekọta ya ka ọ na-eje ozi ya, kwụsiri ike n’akụkụ ya.—Luk 8:1-3.

6. Olee mmetụta dị nro Jizọs gosipụtara mgbe Lazarọs nwụrụ?

6 Kraịst gosipụtara na ya nwere nnọọ mmetụta dị nro mgbe ezigbo enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ. Újú Meri na Mata nọ na-eru metụrụ nnọọ Jizọs n’ahụ́ ruo n’ókè nke na ọ sụrụ ude, ‘anya mmiri agbaakwa ya n’anya.’ Nke ahụ ‘nyere ya nsogbu n’obi’ ma kpatara ya obi mgbawa na iru újú n’agbanyeghị na ọ maara na ya ga-eme ka Lazarọs dịghachi ndụ n’oge na-adịghị anya. Ịhụnanya na ọmịiko kpaliziri Jizọs iji ikike Chineke nyere ya mee ihe ma kpọlite Lazarọs n’ọnwụ.—Jọn 11:11-15, 33-35, 38-44.

7. N’ihi gịnị ka Jizọs ji ruo eruo ka anyị kwụsie ike n’akụkụ ya? (Leekwa igbe dị na peeji nke 31.)

7 Otú Jizọs si nnọọ hụ ihe ziri ezi n’anya ma kpọ ihu abụọ na ajọ omume asị na-eme ka anyị na-akwanyere ya ùgwù. Ugboro abụọ o ji obi ike chụpụ ndị anyaukwu na-ere ihe n’ụlọ nsọ. (Matiu 21:12, 13; Jọn 2:14-17) Tụkwasị na nke ahụ, mgbe ọ bụ mmadụ n’ụwa, ọ tara ụdị ahụhụ dị iche iche, bụ́ nke mere ka ọ ghọta n’onwe ya nrụgide na nsogbu ndị anyị na-eche ihu. (Ndị Hibru 5:7-9) Jizọs makwaara otú ọ na-adị mmadụ ma a kpọ ya asị ma kpee ya ikpe na-ezighị ezi. (Jọn 5:15-18; 11:53, 54; 18:38–19:16) N’ikpeazụ, o ji obi ike kwere ịnwụ ọnwụ ahụhụ iji mezuo uche Nna ya ma nye ndị ọ ga-achị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Àgwà ndị dị otú a Kraịst nwere hà adịghị akwali gị ịnọgide na-akwụsi ike n’akụkụ ya ma na-ejere ya ozi? (Ndị Hibru 13:8; Mkpughe 5:6-10) Gịnị ka a chọrọ ka mmadụ mee tupu ya abụrụ onye Kraịst bụ́ Eze ga-achị?

Iru Eru Ịbụ Onye Kraịst Ga-achị

8. Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị Kraịst ga-achị?

8 Chebara ihe a e ji tụnyere mmadụ iru eru ịbụ onye Kraịst ga-achị echiche: Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịghọ nwa amaala nke mba ọzọ, e nwere ihe ụfọdụ bụ́ isi a na-achọkarị ya n’aka. A pụrụ ịchọ ka ndị ahụ chọrọ ịghọ ụmụ amaala nke mba ọzọ bụrụ ndị na-akpa àgwà ọma ma nwee ezigbo ahụ́ ike. N’otu aka ahụ, ndị Kraịst ga-achị kwesịrị inwe nnọọ àgwà ọma. Mmekọrịta ha na Chineke kwesịkwara isi ike.—1 Ndị Kọrint 6:9-11; Ndị Galeshia 5:19-23.

9. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị kwụsiri ike n’akụkụ Kraịst?

9 Jizọs Kraịst chọkwara ka ndị ọ ga-achị kwụsie ike n’akụkụ ya ma na-akwadosi Alaeze ya ike. O kwesịkwara ekwesị ka ọ chọọ ihe ndị dị otú a. Ha na-egosi na ha kwụsiri ike n’akụkụ Kraịst site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị ọ kụziri mgbe ọ nọ n’ụwa dị ka Onye A Họpụtara Ịbụ Eze. Dị ka ihe atụ, ha na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na uche Chineke ụzọ karịa ihe onwunwe. (Matiu 6:31-34) Ha na-agbalịsikwa ike ibi ndụ dị ka Kraịst ọbụna ma à sị na ihe na-esiri ha ezigbo ike. (1 Pita 2:21-23) Ọzọkwa, ndị Kraịst na-achị na-agbaso ihe nlereanya ya site n’ibute ụzọ n’imere ndị ọzọ ihe ọma.—Matiu 7:12; Jọn 13:3-17.

10. Olee otú mmadụ pụrụ isi gosipụta na ya kwụ n’akụkụ Kraịst (a) n’ime ezinụlọ na (b) n’ime ọgbakọ?

10 Ụmụazụ Jizọs na-egosikwa na ha kwụsiri ike n’akụkụ Kraịst site n’igosipụta àgwà ya n’ime ezinụlọ ha. Dị ka ihe atụ, ndị di na-egosi na ha kwụ n’akụkụ Eze eluigwe ha site n’imeso ndị nwunye ha na ụmụ ha ihe dị ka Kraịst si emeso ọgbakọ ya. (Ndị Efesọs 5:25, 28-30; 6:4; 1 Pita 3:7) Ndị nwunye na-egosi na ha kwụ n’akụkụ Kraịst site n’omume ha dị ọcha nakwa site n’igosipụta “mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ.” (1 Pita 3:1-4; Ndị Efesọs 5:22-24) Ụmụaka na-akwadosi Kraịst ike mgbe ha na-agbaso ihe nlereanya ya nke irube isi. Mgbe Jizọs na-eto eto, ọ nọgidere na-erubere ndị mụrụ ya isi n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Luk 2:51, 52; Ndị Efesọs 6:1) Ndị Kraịst na-achị na-agbalịsi ike ịkwado ya site ‘n’igosi mmetụta maka onye ọzọ, na-enwe mmetụta ụmụnna,’ nakwa site ‘n’inwe obi ọmịiko.’ Ha na-agbalịsi ike ịdị ka Kraịst, “na-adị umeala n’obi, ghara ịkwụghachi ihe ọjọọ maka ihe ọjọọ, nkwujọ maka nkwujọ.”—1 Pita 3:8, 9; 1 Ndị Kọrint 11:1.

Ndị Kraịst Ga-achị Ga-erube Isi n’Iwu Ya

11. Olee iwu ndị Kraịst ga-achị ga na-erube isi na ha?

11 Dị nnọọ ka ndị chọrọ ịbụ ụmụ amaala nke mba ọzọ na-erube isi n’iwu nke mba ahụ, ndị Kraịst ga-achị na-erube isi ‘n’iwu nke Kraịst’ site n’ibi ndụ kwekọrọ n’ihe nile Jizọs kụziri na ihe ndị o nyere n’iwu. (Ndị Galeshia 6:2) Ha na-eji obi ha nile ebi ndụ kwekọrọ ‘n’iwu nke eze ahụ’ banyere ịhụnanya. (Jems 2:8) Gịnị ka iwu ndị a gụnyere?

12, 13. Olee otú anyị si anọgide jiri obi anyị nile na-erube isi ‘n’iwu nke Kraịst’?

12 Ndị Kraịst na-achị ezughị okè, ha na-emehiekwa ihe mgbe ụfọdụ. (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya, ha kwesịrị ịnọgide na-azụlite “mmetụta ụmụnna nke ihu abụọ na-adịghị ya” ka ha wee ‘na-enwe ịhụnanya siri ike n’ebe ibe ha nọ site n’obi.’ (1 Pita 1:22) “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya,” Ndị Kraịst na-eji obi ha etinye iwu nke Kraịst n’ọrụ site ‘n’ịnọgide na-anagiderịta ibe ha ma na-agbaghara ibe ha kpam kpam.’ Irube isi n’iwu a na-enyere ha aka ileghara emezighị emezi nke ndị ọzọ anya ma mee ka ha chọta ezi ihe mere ha ga-eji na-ahụ ibe ha n’anya. Ọ̀ dịghị amasị gị iso ndị na-eyikwasị onwe ha ịhụnanya, nke bụ́ “ihe nkekọ zuru okè,” iji gosi na ha ji obi ha nile na-akwado Eze anyị na-ahụ n’anya anọkọ?—Ndị Kọlọsi 3:13, 14.

13 Ọzọkwa, Jizọs kọwara na ịhụnanya o gosiri karịrị nnọọ ịhụnanya ndị mmadụ na-enwe n’ebe ibe ha nọ. (Jọn 13:34, 35) Ọ bụrụ na ndị anyị hụrụ n’anya bụ nanị ndị hụrụ anyị n’anya, anyị emeghị “oké ihe.” Ọ bụrụ na ọ bụ nanị ndị hụrụ anyị n’anya ka anyị hụrụ n’anya, ịhụnanya anyị agaghị ezu ezu. Jizọs gbara anyị ume iṅomi ịhụnanya Nna ya site n’inwe ịhụnanya ụkpụrụ na-achịkwa ọbụna n’ebe ndị iro anyị nọ, bụ́ ndị kpọrọ anyị asị ma na-akpagbu anyị. (Matiu 5:46-48) Ịhụnanya a ga-akpalikwa ndị Alaeze ahụ ga-achị ịnọgidesi ike na-eji obi ha nile na-arụ ọrụ ahụ bụ́ isi e kenyere ha. Olee ọrụ ọ bụ?

Ule E Ji Ama Ma Ndị Kraịst Ga-achị Hà Kwụsikwara Ike n’Akụkụ Ya

14. Olee ihe mere ọrụ nkwusa ji dị oké mkpa?

14 Ugbu a, ndị Alaeze Chineke ga-achị nwere ọrụ dị oké mkpa nke ‘ịgba àmà nke ọma banyere alaeze Chineke.’ (Ọrụ 28:23) Ọ dị nnọọ oké mkpa ka e mee nke ahụ n’ihi na Alaeze Mezaịa ga-eme ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịbụ eze. (1 Ndị Kọrint 15:24-28) Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-enye ndị na-anụ ya ohere ịghọ ndị Alaeze Chineke ga-achị. Ọzọkwa, ihe Kraịst bụ́ Eze ga-eji kpee ụmụ mmadụ ikpe bụ ihe ha mere mgbe ha nụrụ ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-10) Ya mere, ụzọ bụ́ isi anyị si egosi na anyị kwụ n’akụkụ Kraịst bụ site n’irube isi n’iwu o nyere ka a gwa ndị ọzọ banyere Alaeze ahụ.—Matiu 28:18-20.

15. Olee ihe mere e ji ele ikwesị ntụkwasị obi Ndị Kraịst ule?

15 N’ezie, Setan na-eji ụzọ nile o nwere ike eme ihe iji mee ka a ghara ikwusa ozi ọma ahụ, ndị ọchịchị bụ́ mmadụ adịghịkwa erubere ọchịchị Kraịst nke Chineke nyere ya isi. (Abụ Ọma 2:1-3, 6-8) N’ihi ya, Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Ya mere, ụmụazụ Kraịst na-alụ agha ime mmụọ bụ́ nke na-etinye ikwesị ntụkwasị obi ha n’ule.—2 Ndị Kọrint 10:3-5; Ndị Efesọs 6:10-12.

16. Olee otú ndị Alaeze ahụ ga-achị si akwụghachi “Chineke ihe nke Chineke”?

16 Ka o sina dị, Ndị Alaeze Chineke ga-achị na-anọgide na-akwụsi ike n’akụkụ eze ha a na-adịghị ahụ anya ma na-erubekwara ndị ọchịchị bụ́ mmadụ isi. (Taịtọs 3:1, 2) Jizọs kwuru, sị: “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:13-17) N’ihi nke a, Ndị Kraịst ga-achị na-erubere iwu gọọmenti nke na-emegideghị iwu Chineke isi. (Ndị Rom 13:1-7) Otú ọ dị, mgbe ụlọikpe ukwu nke ndị Juu nyere iwu megidere nke Chineke site n’ịgwa ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ndị na-ezo ụzọ Jizọs ji nkwanye ùgwù jụ ime ihe ha kwuru ma gwa ha na ha “aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ 1:8; 5:27-32.

17. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji jiri obi ike na-eche ule na-abịara anyị n’ihi ịkwụsi ike n’akụkụ Kraịst ihu?

17 N’eziokwu, ọ chọrọ obi ike n’aka ndị Kraịst ga-achị iji nọgide na-akwụsi ike n’akụkụ Eze ha n’agbanyeghị mkpagbu. Ka o sina dị, Jizọs kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu, jirikwa ụgha na-ekwu ụdị ihe ọjọọ ọ bụla megide unu n’ihi m. Na-aṅụrịnụ ọṅụ, na-amalikwanụ elu n’ọṅụ, ebe ọ bụ na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.” (Matiu 5:11, 12) Ụmụazụ Kraịst oge mbụ bịara ghọta na okwu ndị ahụ bụ eziokwu. Ọbụna mgbe a pịara ha ihe n’ihi na ha nọgidere na-ezi ozi ọma banyere Alaeze ahụ, ha ṅụrịrị ọṅụ “n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya. Kwa ụbọchị kwa, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.” (Ọrụ 5:41, 42) E kwesịrị ka a jaa gị mma mgbe ị na-egosipụta otu mmụọ ahụ nke ịkwụsi ike n’akụkụ Kraịst ka ị na-edi ihe isi ike, ọrịa, ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya, ma ọ bụ mmegide.—Ndị Rom 5:3-5; Ndị Hibru 13:6.

18. Gịnị ka ihe Jizọs gwara Pọntịọs Paịlet na-egosi?

18 Mgbe ọ ka bụ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze, Jizọs kọwaara Pọntiọs Paịlet bụ́ gọvanọ ndị Rom, sị: “Alaeze m abụghị akụkụ nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ akụkụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara alụ ọgụ ka a ghara inyefe m n’aka ndị Juu. Ma, dị ka ihe si dịrị, alaeze m esiteghị n’ebe a.” (Jọn 18:36) N’ihi ya, ndị Alaeze eluigwe ga-achị adịghị ebu ngwá agha iji gbuo onye ọ bụla, ha adịghịkwa etinye aka n’agha ụmụ mmadụ na-alụ. Ha na-akwụsi ike n’akụkụ “Onyeisi Udo,” ha adịtụghị etinye aka n’ihe omume ndị na-akpata nkewa n’ụwa.—Aịsaịa 2:2-4; 9:6, 7.

Nkwụghachi Ụgwọ Ga-adịru Ebighị Ebi nke Ndị Na-akwadosi Eze ahụ Ike Ga-enweta

19. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ga-achị ji nwee obi ike na ọdịnihu ga-aka mma?

19 Ndị na-akwadosi Kraịst, bụ́ “Eze nke ndị eze” ike, nwere obi ike na ọdịnihu ga-aka mma. Ha na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ọ ga-egosipụta ike ọchịchị ya karịrị nke mmadụ ọ bụla. (Mkpughe 19:11–20:3; Matiu 24:30) Ndị fọdụrụ ‘n’ụmụ nke alaeze ahụ’ bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-atụsi anya ike maka ihe nketa ha dị oké ọnụ ahịa, nke bụ́ iso Kraịst bụrụ eze n’eluigwe. (Matiu 13:38; Luk 12:32) “Atụrụ ọzọ” bụ́ ndị kwụsi ike n’akụkụ Kraịst na-echesi nnwapụta nke Eze ha ike mgbe ọ ga-ekwupụta, sị: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziworo, ketanụ alaeze [Paradaịs elu ala] ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.” (Jọn 10:16; Matiu 25:34) N’ihi ya, ka ndị nile Alaeze ahụ ga-achị kpebisie ike ịnọgide na-akwụsi ike n’akụkụ Kraịst bụ́ Eze.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee Reasoning From the Scriptures, “Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji ekwu na e hiwere Alaeze Chineke na 1914?” peeji nke 95-97, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ihi gịnị ka Kraịst ji ruo eruo ka anyị kwụsie ike n’akụkụ ya?

• Olee otú ndị Kraịst ga-achị si egosi na ha kwụsi ike n’akụkụ ya?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịkwụsi ike n’akụkụ Kraịst bụ́ Eze?

[Igbe dị na peeji nke 31]

ÀGWÀ NDỊ ỌZỌ MAGBURU ONWE HA KRAỊST NWERE

Eleghị mmadụ anya n’ihu—Jọn 4:7-30.

Ọmịiko—Matiu 9:35-38; 12:18-21; Mak 6:30-34.

Ịhụnanya ịchụ onwe onye n’àjà—Jọn 13:1; 15:12-15.

Ikwesị ntụkwasị obi—Matiu 4:1-11; 28:20; Mak 11:15-18.

Obi ebere—Mak 7:32-35; Luk 7:11-15; Ndị Hibru 4:15, 16.

Ezi uche—Matiu 15:21-28.

[Foto dị na peeji nke 29]

Anyị na-egosi na anyị ji obi anyị nile na-erubere “iwu nke Kraịst” isi site n’ịhụ ibe anyị n’anya

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Àgwà Kraịst ọ̀ na-akpali gị ịkwụsi ike n’akụkụ ya ma na-ejere ya ozi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya