Ị̀ Na-echeta?
Ọ̀ tọwo gị ụtọ ịgụ mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-amasị gị icheta ihe ndị na-esonụ:
▫ Nnwapụta dị aṅaa na-emesi obi ike ka ọrụ dị iche iche nke mmụọ nsọ nyere na narị afọ nke mbụ?
Ọrụ ndị a nyere ihe àmà a na-ahụ anya na Chineke ejikwaghị ọgbakọ Israel dịworo 1,500 afọ eme ihe dị ka ndị ya pụrụ iche, kama na nnwapụta ya dịkwasịrị ugbu a ọgbakọ ọhụrụ ahụ nke ndị Kraịst, nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya guzobere. (Tụlee Ndị Hibru 2:2-4.)—8/15, peji nke 5.
▫ Gịnị na-akpata oké uto nke Ndịàmà Jehova na-enwe?
N’ụzọ bụ isi, nke a bụ n’ihi ngọzi Chineke. Ọ bụ ọrụ Chineke. Ihe Ndịàmà Jehova na-ezi n’ọrụ nkwusa ozi ọma ha dabeere na Bible. Ihe ọzọ kpatara ihe ịga nke ọma ha bụ ha ịnakwere Kraịst Jisọs kpam kpam dị ka Isi a họpụtara ahọpụta nke ọgbakọ ndị Kraịst.—9/1, peji nke 19.
▫ Gịnị mere Jehova ji meere Devid ebere n’ihe banyere oké mmehie ya n’ebe Batsheba nọ?
Nke a bụ n’ụzọ bụ isi n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze nke Chineke sooro Devid gbaa, ma ọ bụkwa n’ihi ịdị ebere nke Devid n’onwe ya na ezi nchegharị ya. (1 Samuel 24:4-7; 2 Samuel 7:12; 12:13; Abụ Ọma 51:1, 2, 17)—9/15, peji nke 10, 11.
▫ Ụdị ihe àmà atọ dị aṅaa ka Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-enye ná nkwado nke Jisọs ịbụ Mesaịa?
Usoro ọmụmụ Jisọs bụ ihe àmà nke mbụ. (Matiu 1:1-16; Luk 3:23-38) Ihe àmà ọzọ bụ amụma e mezuru. E nwere n’ụzọ nkịtị ọtụtụ amụma, ndị dị ka nke a na-ahụ na Daniel 9:25, bụ́ ndị na-egosipụta Jisọs ịbụ Mesaịa. Ihe àmà nke atọ bụ akaebe nke Chineke n’onwe ya; o ji olu okwu ya mee nke a ugboro atọ. (Matiu 17:5; Luk 3:21, 22; Jọn 12:28)—10/1, peji nke 10, 12.
▫ Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị, dị ka e dekọrọ na Matiu 24:37: “Dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị”?
Noa na-arụ ụgbọ ahụ ma na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị ruo ọtụtụ iri afọ tupu Iju Mmiri ahụ abịa kpochapụ usoro ụwa ahụ rụrụ arụ. N’otu aka ahụ, ọnụnọ Kraịst a na-adịghị ahụ anya na-adịru ọtụtụ iri afọ, bụ́ n’oge a ga-agba àmà n’ụwa dum, tupu ọ gwụsịakwa n’oké mbibi.—10/1, peji nke 16.
▫ Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ dị mkpa maka ezi ọmụmụ Bible ezinụlọ?
A ghaghị ịzụchapụta oge maka ọmụmụ ihe ahụ. Anyị ekwesịghị ikwere ka TV ma ọ bụ ihe ndọpụ uche ndị ọzọ wezụga ya. A ghaghị ịtụle mkpa dị iche iche nke ezinụlọ kpọmkwem. Jiri ajụjụ e ji ekwupụta uche mmadụ mee ihe iji hụ na ụmụaka ghọtara ihe ha na-amụ. (Matiu 17:25) Hụ na ọnọdụ dịnụ bụ nke ntụsara ahụ. Gosipụta ịnu ọkụ n’obi, hụ na onye ọ bụla keere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ.—10/15, peji nke 17.
▫ Ruo ókè hà aṅaa ka ndị Kraịst ga-echegbu onwe ha na a pụrụ itinyewo ihe ndị mejupụtara ọbara ná nri?
Ndị Kraịst kwesịrị izere inwe nchekasị nanị n’ihi ihe pụrụ ime ma ọ bụ ásị̀rị̀, ezi uche dịkwa mkpa ọbụna n’inyocha akwụkwọ nkọwa ihe ma ọ bụ ịjụ ndị na-ere anụ ajụjụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a maara na a na-eji ọbara eme ihe nke ukwuu n’ógbè ahụ—ma ọ bụ ná nri ma ọ bụ n’ịgwọ ọrịa—ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya irubere iwu Chineke isi izere ọbara. (Ọrụ 15:28, 29)—10/15, peji nke 30-31.
▫ Olee otú akwụkwọ Ilu si egosipụta ịdị omimi n’ụzọ ime mmụọ nke ụzọ izi ihe e jiri mee ihe n’Israel?
Akwụkwọ Ilu na-egosi na nzube ya bụ izi “onye na-enweghị uche” ihe ndị di elu dị ka amamihe, ịdọ aka ná ntị, nghọta, ezi uche, ezi ikpe, ịma ihe, ihe ọmụma, na izuzu—ihe a dum ‘n’egwu Jehova.’ (Ilu 1:1-7; 2:1-14)—11/1, peji nke 12.
▫ Echiche ziri ezi dị aṅaa banyere agụmakwụkwọ ka ndị na-eto eto kwesịrị inwe n’oge a?
Ndị Kraịst kwesịrị ile agụmakwụkwọ anya dị ka ihe e ji enweta ihe. Nzube ha na mgbe ikpeazụ ndị a bụ ijere Jehova ozi ruo ókè o kwere mee na n’ụzọ dị irè n’ije ozi oge nile ma ọ bụrụ na ha nwere ike.—11/1, peji nke 18.
▫ N’ihi gịnị ka Jehova ji chọọ ka mba Israel nye otu ụzọ n’ụzọ iri?
Nke mbụ, ka ha wee gosi n’ụzọ a na-ahụ anya obi ekele ha maka ịdịmma Jehova. Nke abụọ, ka ha wee nwee ike itinye ihe ná nkwado nke ndị Livaị, bụ́ ndị ga-enwezị ike itinye uche n’ọrụ e kenyere ha, gụnyere izi iwu ahụ. (Lee 2 Ihe Emere 17:7-9.)—12/1, peji nke 9.
▫ Gịnị bụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke a na-akpọ ndị Kraịst òkù iweta? (Malakaị 3:10)
Otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ na-anọchite anya akụkụ nke ihe bụ nke anyị nke anyị na-ewetara Jehova ma ọ bụ jiri mee ihe n’ozi ya. Nke a bụ ngosipụta nke ịhụnanya anyị maka ya na nghọta anyị ghọtara na anyị dịịrị ya.—12/1, peji nke 15.