‘Ohu Ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi’ Na Òtù Na-Achị Isi Ya
“Ònye kwa bụ ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya?”—MATIU 24:45.
1. N’ihi gịnị ka Jehova ji dị njikere inyefe ike ọchịchị, ọ̀ bụkwa nye onye n’ụzọ bụ isi ka o meworo otú a?
JEHOVA bụ Chineke nke na-eme ihe n’usoro. Ọ bụkwa Isi Iyi nke ịchịisi nile iwu kwadoro. N’ịbụ onye obi siri ike ná nsọpụrụ nke ihe ndị o kere eke na-ekwesị ntụkwasi obi, Jehova dị njikere ikenye ndị ọzọ ọrụ ichiisi. Onye nke o kenyeworo ọrụ nke ịchịisi kasị ukwuu bụ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. N’ezie, Chineke “dokwara ihe nile n’okpuru ụkwụ ya abụọ, ọ bụkwa ya onwe ka o mere ka ọ bụrụ isi n’elu ihe nile n’ebe nzukọ ya nọ.”—Ndị Efesọs 1:22.
2. Gịnị ka Pọl kpọrọ ọgbakọ ndị Kraịst, ọ bụkwa onye ka Kraịst nyefere ike ọchịchị?
2 Pọl onyeozi kpọrọ ọgbakọ ndị Krịast “ezinụlọ Chineke” ma kwuo na Ọkpara Jehova nke na-ekwesi ntụkwasi obi, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ onye e mere onyeisi n’ezinụlọ nke a. (1 Timoti 3:15; Ndị Hibru 3:6) Kraịst onwe ya na-ekenyekwa ndị nọ n’ezinụlọ Chineke ọrụ ịchịisi. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’okwu Jisọs nke e dekọrọ na Matiu 24:45-47. O kwuru, sị: “Ònye kwa bụ ohu ahụ kwesịri ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya? [Obi ụtọ, NW] na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otu ahụ. N’ezie a sị m unu, na ọ ga-eme ya onyeisi ihe nile o nwere.”
Onye Na-elekọta Ụlọ Nke Narị Afọ Mbụ
3. Olee ndị mejupụtara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ọ bụkwa aha dị aṅaa ka a na-akpọ ha n’otu n’otu?
3 Site n’ọmụmụ anyị ji nlezi anya na-amụ Akwụkwọ nsọ, anyị maara na ndị òtù ezinụlọ Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ n’ozuzu ha n’otu oge ọ bụla mejupụtara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasi ya obi, nke nwekwara uche,” “onye ahụ na-achi ezinụlọ,” ma ọ bụ “onye na-elekọta ụlọ.” N’otu n’otu, a na-akpọ ndị nọ n’ime ezinụlọ Chineke ‘ndị òtù ezinụlọ’ ma ọ bụ ‘òtù ndị ozi.’—Matiu 24:45; Luk 12:42; Reference Bible, nkọwa ala ala peji.
4. Mgbe na-adịghi anya tupu ọnwụ ya, ajụjụ dị aṅaa ka Jisọs jụrụ, ò jikwa onwe ya tụnyere onye?
4 Ọnwa ole na ole tupu ọnwụ ya, Jisọs jụrụ ajụjụ nke a, nke e dekọrọ na Luk 12:42, sị: “Ònye kwa bụ onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka atụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya ga-eme [onye nlekọta nke òtù ndị ozi ya, NW] inye ha òkè nri ha n’oge ya?” Mgbe ahụ, ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya, Jisọs ji onwe ya tụnyere otu nwoke nke na-akwado ịga njem dị anya, onye kpọkọtara ndị ohu ya ma were ihe nile o nwere nye ha n’aka.—Matiu 25:14.
5. (a) Olee mgbe Jisọs kenyere ndị ọzọ ọrụ ilekọta ihe ndị o nwere? (b) Ọrụ ọzọ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị ahụ gaje ịghọ akụkụ nke òtù onye na-elekọta ụlọ ya?
5 Olee mgbe Jisọs kenyere ndị ọzọ ọrụ nke ilekọta ihe ndị o nwere? Nke a mere mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. N’okwu ya ahụ anyị maara nke ọma dị na Matiu 28:19, 20, Jịsọs nyere ndị ahụ gaje ịghọ òtù onye nlekọta ụlọ ya ọrụ sara mbara nke izi ihe na ime ndị na-eso ụzọ. Site n’ịgba àmà n’otu n’otu “ruokwa ebe ụwa sọtụrụ,” ndị ozi ahụ ga-eme ka ubi nke ije ozi ala ọzọ saa mbara, bụ nke Jisọs maliteworo ọrụ na ya n’oge o jere ozi n’elu ala. (Ọrụ 1:8) Nke a gụnyere ha ịrụ ọrụ dị ka “[ndị nnọchianya, NW] n’ọnọdụ Kraịst.” Dị ka “ndị na-achị ezinụlọ n’ihe omimi nke Chineke,” ha ga-eme ndị na-eso ụzọ, nyekwa ha nri ime mmuo.—2 Ndị Kọrint 5:20; 1 Ndị Kọrint 4: 1,2
Òtù Na-achị Isi Nke Ezinụlọ Ahụ
6. Gịnị ka mmụọ Chineke kpaliri” òtù onye ahụ na-achị ezinụlọ nke narị afọ mbụ inye?
6 N’ozuzu ha, ndị Kraịst e jiri mmụọ nsọ tee mmanụ ga-abụ òtù onye na-achị ezinụlọ nke onyenwe ha, ma ọ bụ onye na-elekọta ụlọ, nke e kenyere ọrụ inye ndị òtù nke ezinụlọ Chineke n’otu n’otu nri ime mmụọ n’oge ya. N’agbata afọ 41 O.A. na 98 O.A., ndị so n’òtù onye ahụ na-achị ezinụlọ na narị afọ mbụ depụtara ihe ndekọ ise nke akụko ihe mere eme, iri akwụkwọ ozi abụọ na otu, na akwụkwọ Mkpughe maka ọdịmma nke ụmụnna ha. Ihe odide ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ nwere n’ime ha ezi nri ime mmụọ maka ndị òtù ahụ, ya bụ, ndị e tere mmanụ nke ezinụlọ Chineke n’otu n’otu.
7. Ọ̀ bụ n’ihi nzube dị aṅaa ka Kraịst ji họpụta ọnụ ọgụgụ ndị ikom dị nta site n’òtù ohu ahụ?
7 Ọ bụ ezie na ndị Kraịst nile e tere mmanụ n’ozuzu ha mejupụtara ezinụlọ Chineke, e nwere ihe àmà dị ukwuu nke na-egosi na Kraịst si n’òtù ohu ahụ họrọ ọnụ ọgụgụ mmadụ ole na ole ije ozi dị ka òtù na-achị isi a na-ahụ anya. Akụkọ ihe mere eme oge gboo nke ọgbakọ ahụ na-egosi na ndị ozi iri na abụọ ahụ, tinyere Mataịas, bụ ntọala nke òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ ahụ. Ọrụ Ndị Ozi 1:20-26 na-enye anyị ihe na-egosi nke a. N’okwu metụtara idochi Judas Iskarịọt, e zoro aka ahụ ‘n’ọrụ nlekọta ya’ na “ije ozi na ọrụ onye ozi” ya.
8. Gịnị ka ibu ọrụ dị iche iche nke òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ gụnyere?
8 Ọrụ nlekọta dị otú ahụ gụnyere ibu ọrụ nke ndị ozi ahụ nwere ịhọpụta mmadụ ndị ruru eru ịnọ n’ọnọdụ ije ozi na ịhazi ije ozi ahụ. Ma o metụtara ihe ọzọ. Ọ gụnyekwara izi ihe na ime ka izi ihe ndị dị n’ozizi doo anya. N’imezu nkwa Jisọs nke dị na Jọn 16: 13, “mmụọ nke eziokwu” ahụ gaje iduzi nzukọ ndị Kraịst n’ụzọ na-aga n’ihu gaa n’eziokwu nile. Malite na mbụ, ndị ahụ nabatara okwu ahụ ma bụrụ ndị e mere baptism, bụ́ ndị Kraịst e tere mmanụ, nọgidere na-ejigide ‘ozizi nke ndị ozi.’ N’ezie, ihe mere e ji họpụta ndị ikom asaa a gbaara àmà ọma maka ọrụ ahụ dị mkpa nke ikesa nri nkịtị bụ ka “ndị ozi iri na abụọ ahụ” wee nwee ike inwere onwe ha ‘iji nọgidesie ike n’ekpere na n’ije ozi nke okwu Chineke.’—Ọrụ 2:42; 6:1-6.
9. Olee otú ọnụ ọgụgụ nke ndị mejupụtara òtù na-achị isi nke oge gboo si belata ruo iri na otu, ma olee ihe yiri ka ọ̀ bụ ya mere na e meghị ka ọnụ ọgụgụ ahụ bịaghachi n’iri na abuo ozugbo ahụ?’
9 Na mbụ o yiri ka ọ bụ nanị ndị ozi Jisọs mejupụtara òtù na-achị isi ahụ. Ma ọ̀ gaje ịnọgide na-adị otú ahụ? N’ihe dị ka afọ 44 O.A., Herọd Agripa nke mbụ gburu Jemes onyeozi, bụ nwanne Jọn. (Ọrụ 12:1, 2) O doro anya na ọ dịghị mgbalị ọ bụla e mere iji dochie ya dị ka onyeozi, dị ka e mere n’ọnọdụ Judas. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke a bụ n’ihi na Jemes nwụrụ n’ikwesị ntụkwasị obi, bụrụ onye nke mbụ nwụrụ n’etiti ndị ozi iri na abụọ ahụ. N’aka nke ọzọ, Judas bụ ajọ onye nrafu, ma dịkwa mkpa ka e dochie ya iji mee ka ọnụ ọgụgụ nke nkume ntọala Israel ime mmụọ ahụ bụrụghachị ịri na’abụọ.—Ndị Efesọs 2:20; Mkpughe 21:14.
10. Òle mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si mee ka òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ bukwuo ibu, oleekwa otú Kraịst si jiri ya mee ihe iji duzie ezinụlọ Chineke?
10 Ndị mbụ so n’òtù na-achị isi nke narị afọ mbụ ahụ bụ ndị ozi, mmadụ ndị ha na Jisọs soro jegharịa, bụrụkwa ndị àmà nke ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya. (Ọrụ 1:21, 22) Ma ọnọdụ nke a ga-emesị gbanwee. Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ndị Kraịst ndị ọzọ, bụ ndị ikom nwetara iru eru ime mmụọ ma bụrụ ndị a họpụtara dị ka ndị okenye n’ọgbakọ dị na Jerusalem. Ka ọ na-erule afọ 49 O.A. ma ọ dịkarịa anya, òtù na-achị isi ahụ asawo mbara ịgụnye, ọ bụghị nanị ndị ozi ahụ nọ ndụ kama kwa ndị okenye ole na ole ndị ọzọ nọ na Jerusalem. (Ọrụ 15:2) Ya mere ọnụ ọgụgụ nke ndị nọ n’òtù na-achị isi ahụ abụghị ihe a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, kama o doro anya na Chineke duziri ihe nile ịhụ na ọ gbanwere iji kwesị ọnọdụ dị iche iche nke ndị ya. Kraịst, bụ́ Onye Isị na-arụsi ọrụ ike nke nzukọ ahụ ji òtù na-achị isi nke a e mere ka o bukwuo ibu mee ihe idozi okwu ozizi dị mkpa banyere ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu ibi úgwù na ido onwe ha n’okpuru Iwu Moses. Òtù na-achị isi ahụ dere otu akwụkwọ ozi na-akọwa mkpebi ya ma zipụ iwu dị iche iche ndị a ga-edebe.—Ọrụ 15:23-29.
Oge Onye ahụ Na-elekọta Ụlọ Ga-eme Mpịazi
11. Ụmụnna hà nwere ekele maka idu ndú ahụ siri ike nke òtù ahụ na-achị isi guzobere, oleekwa ihe na-egosi na Jehova gọziri ndokwa nke a?
11 N’otu n’otu, nakwa dị ka ọgbakọ dị iche iche, ndị Kraịst oge gboo nwere ekele maka nduzi nke a siri ike nke òtù na-achi isi nyere. Mgbe ọgbakọ dị na Siria n’Antiọk gụsịrị akwụkwọ ozi sitere n’aka òtù na-achị isi ahụ, obi tọrọ ha ụtọ maka agbamume ahụ. Ka ọgbakọ ndị ọzọ na-anata ozi ndị ahụ ma na edebe iwu ndị ahụ nile, ha ‘nọgidere bụrụ ndị e mere ka okwukwe ha siwanye ike ma na-amụba n’ọnụ ọgụgụ kwa ụbọchị’ (Ọrụ 16:5) N’ụzọ pụtara ìhè, Chineke gọziri ndokwa nke a.—Ọrụ 15:30, 31.
12, 13. Ihe omume ndị dị aṅaa ka Jisọs buru amụma ha n’ilu ya nke maịna na talenti ndị ahụ?
12 Ma ka anyi lee anya n’akụkụ ọzọ nke okwu nke a dị mkpa. N’ihe atụ ya nke ego maịna ndị ahụ, Jisọs jị onwe ya tụnyere otu nwoke a mazuru aha ya, bụ́ onye gara njem n’otu ala dị anya ije natara onwe ya ike ọchịchị, ma mesịa lọghachite. (Luk 19:11, 12) Dị ka ihe si ná mbilite n’ọnwụ ya na 33 O.A. pụta, e buliri Jisọs Kraịst elu gaa n’aka nri nke Chineke, bụ́ ebe ọ ga-anọ ruo mgbe e debere ndị iro ya dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ dịrị ụkwụ ya abụọ.—Ọrụ 2:33-35.
13 N’ihe atụ yiri nke ahụ, bụ́ ilu nke talenti ndị ahụ, Jisọs kwuru na mgbe oge dị anya gasịrị, onyenwenụ ahụ bịara ka ya na ndị ohu ya nwee mpịazi. Onyenwenụ ahụ gwara ohu ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “I kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ụmụ ihe ole na ole, m ga-eme gị onyeisi ọtụtụ ihe: baa n’ọṅụ nke onyenwe gị.” Ma banyere ohu ahụ nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ọ sịrị: “Ọbụna ihe o nwere ka a ga-anapụ ya. Tụpụ ohu a na-abaghị n’ihe n’ọchịchịrị nke èzí.”—Matiu 25:21-23, 29, 30.
14. Gịnị ka Jisọs tụrụ anya ya n’aka ndị ohu ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ?
14 Mgbe oge dị anya gasịrị—ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị afọ iri na itoolu—e nyere Kraịst ike ọchịchị na 1914, ná ngwụsị nke ‘oge a kara aka nke ndị mba ọzọ.’ (Luk 21:24) Na nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, ya na ndị ohu ya, bụ́ ndị Kraịst e ji mmụọ tee mmanụ ‘bịara wee mee mpiazi.’ (Matiu 25:19) Gịnị ka Jisọs tụrụ anya n’aka ha n’otu n’otu nakwa n’ozuzu ha? Ọrụ nke onye ahụ na-achị ezinụlọ dịgidere dị ka ọ dịworo eri narị afọ mbụ ahụ. Kraist enyewo talenti dị iche iche n’aka ndị mmadụ n’otu n’otu—”dị ka ike nke aka ya hà.” Otú a, Jisọs tụrụ anya mmadụ irụpụta ihe otú ike ya hà. (Matiu 25:15) Ụkpụrụ ahụ dị ná 1 Ndị Kọrint 4:2, dabara na nke a, nke na-ekwu, sị: “Ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-achị ezinụlọ bụ, ka a hụ onye ọ bụla na o kwesịrị ntụkwasị obi.” Itinye talenti ndị ahụ n’ọrụ pụtara iji ikwesị ntụkwasị obi na-eme ihe dị ka “ndị nnọchianya” nke Chineke, ime ndị na-eso ụzọ ma na-ekesara ha eziokwu ime mmụọ dị iche iche.—2 Ndị Kọrint 5:20.
“Ohu” Ahụ na Òtù Na-achị Isi Ya ka Mgbe Ikpeazụ ahụ Na-abịaru Nso
15. (a) Gịnị ka Jisọs tụrụ anya ya n’aka onye na-elekọta ezinụlọ ya nke a chịkọtara ọnụ? (b) Gịnị na-egosi na Kraịst tụrụ anya n’aka òtù ohu ahụ ịdị na-eme nke a tupu ọ abịa ileta ezinụlọ ya?
15 N’ozuzu ha, Jisọs tụrụ anya n’aka ndị Kraịst e tere mmanụ ka ha na-arụ ọrụ dị ka ndị na-achị ezinụlọ na-ekwesị ntụkwasị obi, na-enye òtù ndị ozi ya “òkè nri ha n’oge ya.” (Luk 12:42) Dị ka ọ dị na Luk 12:43, Jisọs kwuru, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abia, o ga-ahụ ya ka ọ na-eme otú a!” Nke a na-egosi na ruo oge ụfọdụ tupu Kraịst abịa isoro ndị ohu ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ mee mpịazi, ha anọworị na-ekesa nri ime mmụọ nye ndị òtù nke nzukọ ndị Kraịst, bụ́ ezinụlọ Chineke. Òle ndị ka Kraịst hụrụ ka ha na-eme otú ahụ mgbe ọ lọghachitere n’ike ọchịchị na 1914, ma gaa n’ihu n’ileta ulo Chineke na 1918?—Malakaị 3:1-4; Luk 19:12; 1 Pita 4:17.
16. Mgbe Kraịst bịara ileta ezinụlọ nke Chineke na 1918, n’ihi gịnị ka ọ na-ejighị hụ chọọchị dị iche iche nke Krisendọm ka ha nọ na-enye nrị ime mmụọ n’oge ya?
16 Ka ogologo oge ahụ nke Jisọs nọ n’aka nri Jehova na-echere bịaruru ọgwụgwụ ya, o ji nwayọọ nwayọọ pụta ìhè onye ọ bụ ya na-enye ihe Kraịst nwere nri ime mmụọ ọbụna tupu 1914. Ì chere na ọ bụ chọọchị nịle nke Krịsendọm? Ọ dịghị ma ọlị, n’ịhị na ha mikpuru onwe ha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha dịrị njikere ịbụ ngwa ọrụ mba dị iche iche ga-eji mee ihe ịgbasapụ ala ndị ha na-achị, ha agbalịwokwa imekarị ibe ha n’ihe iji gosi ụtụ ha na-atụnye, wee sị otú a na-agba ume ịhụ mba n’anya. N’oge na-adịghị anya, nke a tụkwasịrị ha oké ikpe ọmuma ọbara, ya bụ, mgbe ha nyere ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị aka ha dị n’agha ụwa nke mbụ nkwado ha siri ike. N’ụzọ ime mmụọ, omume ọgbara ọhụrụ emewo ka okwukwe ha daa mba. Ọgba aghara ime mmụọ bụ nke dapụtara n’ihi na ọtụtụ n’ime ndị ndú okpukpe ha ghọrọ ndị oké nkatọ na ozizi evolushọn rikpuru ngwa ngwa. Ọ dịghị nri ime mmụọ ọ bụla a pụrụ ịtụ anya ya site n’aka ndị ndú okpukpe Krisendọm!
17. N’ihi gịnị ka Kraịst ji jụ ụfọdụ ndị Kraịst e tere mmanụ, gịnị kwa ka ọ rụpụtaara ha?
17 N’otu aka ahụ, ọ dịghị nri ime mmụọ ọ bụla dị mma nke na-abịa site n’aka ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị ọ dịkarịrị mkpa inweta nzọpụta onwe onye karịa iji talenti nke onyenwe ha wee rụpụta ihe. Ha ghọrọ ndị “dị umengwụ,” ndị na-ekwesịghị ekwesị ilekọta ihe onwunwe nke onyenwe ha. N’ihi ya, a tụbara ha “n’ọchịchịrị nke èzí,” bụ́ ebe chọọchị nile nke Krisendọm ka nọ. —Matiu 25:24-30.
18. Olee ndị Onyenwenụ ahụ hụrụ ka ha na-enye òtù ndị ozi ya nri ime mmụọ n’oge ya, gịnị kwa na-egosi nke a?
18 Ya mere, mgbe ọ bịara ileta ndị ohu ya na 1918, olee ndị Onyenwenụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst hụrụ ka ha na-enye òtù ndị ozi ya òkè nrị ha n’oge ya? Ọ dị mma, n’oge ahụ, ọ̀ bụ onye mere ka ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu nwee nghọta ziri ezi nke àjà mgbapụta ahụ, aha Chineke, na ọnụnọ Kraịst bụ nke a na-adịghị ahụ anya, na mkpa nke 1914 dị? Ònye kpugheworo okwu ụgha banyere Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, ọkụ ala mmụọ? Ọ̀ bụkwa onye dọworo aka ná ntị banyere ihe ize ndụ ndị dị n’ozizi evolushọn na mgbaasi? Ihe ndị mere eme na-egosi na ọ bụ ìgwè ndị Kraist ahụ e tere mmanụ ndị ọ bụ ha na-ahụ maka mbipụta nke maga-zin ahụ bụ Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, nke a na-akpọ Ụlọ Nche Ikwuputa Alaeze Jehova ugbu a.
19. Olee otú òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi si gosipụta onwe ya tupu 1918, n’ụzọ dị aṅaa ka o siworo kesaa nri ime mmụọ, ọ bụkwa eri ole mgbe?
19 N’ime mbipụta ya nke November 1, 1944, Ụlọ Nche (Bekee) kwuru, si: “Na 1878, iri afọ anọ tupu ọbịbịa Onyenwe anyi bịara n’ụlọ nsọ ahụ na 1918, e nwere òtù ndị Kraịst nwere obi eziokwu, ndị e doro nsọ, ndị kewapụrụ pụọ n’òtù ndị ụkọchukwu na òtù nile nke ndị ndú okpukpe ma bụrụ ndị chọrọ ịnọ n’Iso Ụzọ Kraist n’ezie . . . N’afọ na-esonu, ya bụ, na July, 1879, ka eziokwu ahụ nke Chineke sitere n’aka Kraịst na-enye dị ka ‘nri na-abia n’oge ya’ wee bụrụ nke e kesara n’oge nile nye ezinụlọ ya nile nke ụmụ e doro nsọ, a malitere ibipụta magazin nke a, bụ Ụlọ Nche.”
20. (a) Olee otú Òtù Na-achị Isi nke oge a si pụta? (b) Gịnị ka ndị òtù nke Òtù Na-achị Isi nọ na-eme, ọ bụkwa n’okpuru nduzi nke onye?
20 Mgbe ọ na-enye nkọwa banyere mmalite nke Òtù Na-achì Isi nke oge a, mtbipụta nke Ụlọ Nche (Bekee) nke December 15, 1971, kọwara, sị: “mgbe afọ ise gasiri [na 1884] e guzobere Zion’s Watch Tower Tract Society, o jekwara ozi dị ka ‘ụlọ ọrụ’ ikesa nri ime mmụọ nye ọtụtụ puku nke mmadụ ndị ji obi eziokwu na-achọ imara Chineke ma ghọta Okwu ya . . . Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị raara onwe ha nye ma mee baptism sonyeere Society ahụ n’isi ụlọ ọrụ ya dị na Pennsylvania. Ma hà nọ n’òtù ndị nlekọta ma ọ bụ na ha anọghi, ha wepụtara onwe ha maka ọrụ pụrụ iche nke òtù ‘ohu ahụ kwesiri ntụkwasi obi nke nwekwara uche.’ Ha nyere aka n’izụ na n’iduzi òtù ohu ahụ, ya mere òtù na-achị isi si otú a wee pụta. Nke a doro anya na ọ bụ n’okpuru nduzi nke ike ọrụ Jehova a na-adịghị ahụ anya, ma ọ bụ mmụọ nsọ ya. Ọzọ, ọ bụkwa n’okpuru nduzi nke Onye Isi nke nzukọ ndị Kraist, bụ́ Jisọs Kraist.”
21 Na 1918 mgbe Jisọs Kraịst letara ndị ahụ na-ekwu na ha bụ ndị ohu ya, ọ hụrụ òtù ndị Kraist zuru ụwa ọnụ ndị na-ebipụta eziokwu Bible ndị eji eme ihe ma n’ime nzukọ ahụ ma n’èzí n’ọrụ nkwusa ahụ. Na 1919 o mere n’ezie dị ka Kraist buru n’amụma, si: “[Obi ụtọ, NW] na-adịri ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-abia, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otú a. N’ezie asi m unu, na ọ ga-eme ya onyeisi ihe nile o nwere.” (Matiu 24:46, 47) Ezi ndị Kraịst ndị a banyere n’ọṅụ nke Onyenwe ha. Ebe ha gosiworo na ha ‘kwesịrị ka a tụkwasi ha obi n’ụmụ ihe ole na ole,’ onyenwenụ ahụ họpụtara ha ịbụ ‘ndị isi n’ọtụtụ ihe.’ (Matiu 25:21) Ohu ahụ kwesịri ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi ya kwadoro akwado, dị njikere maka ihe omume e mere ka ọ bakwuo ụba. Lee obi ụtọ anyị kwesịrị inwe na nke a dị otú a n’ihi na ndị Kraist na-ekwesị ntụkwasị obi na-erite uru dị ukwuu site n’ọrụ nke ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi ya nke na-arụsi ọrụ ike!
Isi Ihe Ndị A Ga-echeta
◻ Onye bụ Onyeisi nke ezinụlọ Chineke, onye kwa ka Onye nke a nyefere ike ịchịisi?
◻ Ọrụ e jikotara aka nwee dị aṅaa ka Kraịst nyere òtù ohu ahụ?
◻ Òtù ọzọ dị aṅaa ka e nwere n’ime òtù ohu ahụ, gịnị bụkwa kpọmkwem ọrụ ya?
◻ Mgbe Kraịst bịara ileta ezinụlo Chineke, ònye nọ na-enye ndị òtù ya nri ime mmụo?
◻ Olee otú Òtù Na-achị Isi nke oge a si pụta?
21. (a) Olee ndị Kraịst hụrụ ka ha na-ekesa nri ime mmụọ, oleekwa otú o si kwụghachi ha ụgwọ? (b) Gịnị nọ na-echere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na Òtù Na-achị Isi ya?
[Foto dị na peeji nke 10]
“Ohu” ahụ nke narị afọ mbụ nwere òtù na-achị isi nke ndị mejupụtara ya bụ ndị ozi ahụ na ndị okenye nọ n’ọgbakọ Jerusalem