Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 115 p. 266-p. 267 para. 3
  • Ememme Ngabiga Ikpeazụ Jizọs Mere Eruo Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ememme Ngabiga Ikpeazụ Jizọs Mere Eruo Nso
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ememe Ngabiga Ikpeazụ nke Jisọs Adịwo Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ememe Ngabiga Ikpeazụ nke Jisọs Adịwo Nso
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • “Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Icheta Ụbọchị Ndị Ikpeazụ nke Jisọs n’Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 115 p. 266-p. 267 para. 3
Ebe Judas bịakwutere ndị ndú okpukpe jụọ ha ihe ha ga-enye ya ka ọ rara Jizọs nye n’aka ha

ISI NKE 115

Ememme Ngabiga Ikpeazụ Jizọs Mere Eruo Nso

MATIU 26:1-5, 14-19 MAK 14:1, 2, 10-16 LUK 22:1-13

  • A KWỤRỤ JUDAS ISKARỊỌT ỤGWỌ KA Ọ RARA JIZỌS NYE

  • NDỊOZI JIZỌS ABỤỌ AKWADEBE IHE MAKA EMEMME NGABIGA

Jizọs akụzichaarala ndịozi ya anọ ha na ya nọ n’Ugwu Oliv ihe, zaakwa ha ajụjụ ha jụrụ ya gbasara oge ọnụnọ ya na ọgwụgwụ nke usoro ihe a.

Jizọs enwetụghị efe n’abalị iri na otu n’ọnwa Naịsan ahụ. O nwere ike ịbụ mgbe ha na-alaghachi ebe ha ga-ehi na Betani ka ọ gwara ndịozi ya, sị: “Unu maara na abalị abụọ taa, a ga-eme ememme ngabiga, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka a kpọgide ya n’osisi.”—Matiu 26:2.

O nwere ike ịbụ na Jizọs na ndịozi ya ji ụbọchị Wenezdee zuo ezigbo ike. N’ụbọchị Tuzdee, ọ katọrọ ndị ndú okpukpe ma gbaa ha n’anwụ. Ugbu a, ha na-achọ igbu ya. N’ihi ya, ọ pụtaghị n’ebe ọha mmadụ nọ n’abalị iri na abụọ n’ọnwa Naịsan ka ihe ọ bụla ghara igbochi ya na ndịozi ya ime Ememme Ngabiga ná mgbede echi ya ma anyanwụ dachaa. Ọ bụ ná mgbede echi ya ka abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan ga-amalite.

Ma ndị isi nchụàjà na ndị okenye ezughị ike tupu Ememme Ngabiga ahụ eruo. Ha zukọrọ na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Keyafas. Gịnị mere ha ji zukọta? Ọ bụ n’ihi na obi adịghị ha mma na Jizọs na-agba ha n’anwụ. N’ihi ya, ha gbara izu “iji ụzọ akọ jide Jizọs ma gbuo ya.” Ma, olee otú ha ga-esi jide ya gbuo? Oleekwa mgbe ha ga-eme ya? Ha kwuru, sị: “Ọ bụghị n’oge ememme a, ka a ghara inwe oké ọgba aghara n’etiti ìgwè mmadụ.” (Matiu 26:4, 5) Ụjọ na-atụ ha n’ihi na ihe Jizọs na-eme dị ọtụtụ ndị mma.

Ka ndị ndú okpukpe a na-eche ihe ha ga-eme, onye ha na-atụghị anya ya batara. Onye ahụ bụ otu n’ime ndịozi Jizọs aha ya bụ Judas Iskarịọt. Setan etinyela ya n’obi ya ịrara Onyenwe ya nye. Judas jụrụ ha, sị: “Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?” (Matiu 26:15) Ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihe a Judas gwara ha ma “kweta inye ya ego ọlaọcha.” (Luk 22:5) Ego ole ka ha kwetara inye ya? Ha ji obi ụtọ kweta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. Cheta na ọ bụ shekel iri atọ ka a na-akwụ n’isi ohu. (Ọpụpụ 21:32) Ego ole a ndị ndú okpukpe kwekọrịtara ịkwụ maka Jizọs gosiri na o nweghị ihe ha ji ya kpọrọ. Judas bidoziri “ịchọ ohere dị mma ọ ga-eji rara ya nye n’aka ha mgbe ìgwè mmadụ na-anọghị ya.”—Luk 22:6.

Abalị iri na atọ n’ọnwa Naịsan malitere mgbe anyanwụ dachara n’ụbọchị Wenezdee. Nke a bụkwa ụbọchị nke isii nakwa nke ikpeazụ Jizọs ga-ehi na Betani. N’echi ya, a ga-eme nkwadebe ikpeazụ a na-eme maka Ememme Ngabiga. A ga-enweta nwa atụrụ ka e nwee ike igbu ya ma hụọ ozu ya n’ọkụ ma abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan malite. Olee ebe ha ga-anọ eme Ememme Ngabiga a? Ònyekwa ga-akwadebere ha ya? Jizọs ekwubeghị ihe ọ bụla gbasara ihe ndị a. N’ihi ya, o nweghị otú Judas ga-esi eme ka ndị isi nchụàjà mara banyere ha.

Ebe Pita na Jọn na-eso nwoke bu udu mmiri

O nwere ike ịbụ n’ehihie Tọzdee ka Jizọs si na Betani zipụ Pita na Jọn ma sị ha: “Gaanụ kwadebere anyị nri ememme ngabiga ka anyị rie.” Ha jụrụ ya, sị: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebe ya?” Jizọs gwara ha, sị: “Mgbe unu banyere n’ime obodo, otu nwoke nke bu udu mmiri ga-ezute unu. Soronụ ya baa n’ime ụlọ nke ọ ga-abanye. Sịnụ onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị gị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa bụ́ ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri ememme ngabiga?”’ Nwoke ahụ ga-egosikwa unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu nke e doziri edozi. Kwadebenụ ya n’ebe ahụ.”—Luk 22:8-12.

Ọ ga-abụ na onye nwe ụlọ ahụ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs. O nwere ike ịbụ na ọ na-atụ anya ka Jizọs rịọ ya ka a nọrọ n’ụlọ ya mee ememme ahụ. Mgbe ndịozi Jizọs abụọ ahụ rutere Jeruselem, ha hụrụ ihe niile otú ahụ Jizọs si gwa ha ya. N’ihi ya, ha kwadebere nwa atụrụ na ihe ndị ọzọ ha na Jizọs na ndịozi ya ndị ọzọ ga-eji mee Ememme Ngabiga. Ha niile ga-adị mmadụ iri na atọ.

  • Olee ihe ọ ga-abụ na Jizọs mere n’ụbọchị Wenezdee, abalị iri na abụọ n’ọnwa Naịsan? Gịnị mere o ji mee otú ahụ?

  • Gịnị mere ndị ndú okpukpe ji zukọta? Gịnịkwa mere Judas ji gakwuru ha?

  • Ole ndị Jizọs dunyere Jeruselem na Tọzdee? Gịnị ka ha mere mgbe ha rutere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya