Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwukwọ Anyị Na-ajụ
Matiu 28:17 ọ̀ pụtara na ụfọdụ ndị ozi nọgidere na-enwe obi abụọ ogologo oge mgbe Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie pụtara n’ihu ha?
Ee e, ọ dịghị mkpa anyị iru nkwubi okwu ahụ site na Matiu 28:16, 17, nke na-agụ, sị: “Ndị ikom iri na otu ahụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, ruo ugwu ebe Jisọs gwara ha. Mgbe ha hụrụ ya, ha wee kpọọ isi ala nye ya: ma ụfọdụ nwere obi abụọ.”
N’ezi oge tupu o mee, Jisọs gbalịrị inyere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta “na ọ ghaghị ije Jerusalem, na ịhụ ọtụtụ ahụhụ n’aka ndị okenye na ndi isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ, na a ghaghị igbu ya, meekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ.” (Matiu 16:21) Otú o sina dị, njide na ogbugbu ya mere ka ndị ahụ na-eso ụzọ nọrọ ná nkụda aka na mgbagwoju anya. Mbilite n’ọnwụ ya yiri ka ọ bụ ihe ijuanya. Mgbe o gosipụtakwara onwe ya n’ụdị mmadụ, na mbụ ụfọdụ “nọ n’ekweghị ekwe n’ihi ọnụ.” (Luk 24:36-41) Otú ọ dị, mpụta ndị ọ pụtara n’oge o bilitere n’ọnwụ nyeere ndị na-eso ụzọ ya nọ ya nso aka ịnakwere eziokwu nke mbilite n’ọnwụ ya; ọbụna Tọmas onyeozi kwetara na e mewo ka Jisọs bilie.—Jọn 20:24-29.
Mgbe nke ahụ gasịrị, ndị ozi 11 na-ekwesị ntụkwasị obi “gara Galili.” (Matiu 28:16; Jọn 21:1) Ka ha nọ n’ebe ahụ, Jisọs “mere ka ndị karịrị [narị ise] n’etiti ụmụnna anyị hụ ya anya n’otu mgbe.” (1 Ndị Kọrint 15:6) Ọ bụ n’ọnọdụ nke a ka Matiu 28:17 na-ekwu na “ụfọdụ nwere obi abụọ.” Ya mere ndị ahụ ka nwere obi abụọ pụrụ iso nnọọ n’etiti 500 ndị ahụ na-eso ụzọ.
Rịba ama okwu na-akpali mmasị nke C. T. Russell, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, kwuru banyere nke a:
“Anyị apụghị iche n’ụzọ ziri ezi na ndị ahụ nwere obi abụọ ga-abụworị otu n’ime ndị ozi iri na otu ahụ, n’ihi na ha nwere afọ ojuju zuru ezu, kwere nke ọma, kwupụta nke ahụ na mbụ. Ndị ahụ nwere obi abụọ aghaghị, dị ka anyị na-eche, ịbụworị n’etiti ‘ụmụnna narị ise’ ahụ nọ ya n’oge nzukọ nke a a kara aka, bụ́ ndị na-ezutebeghị ya na mbụ kemgbe mbilite n’ọnwụ ya, ndị ụfọdụ n’ime ha, dị ka anyị pụrụ iche n’ụzọ ziri ezi, na-adịchaghị ike n’okwukwe karịa ndị ozi ahụ na ndị enyi pụrụ iche ọ gwawororị okwu. Okwu ahụ bụ na ‘ụfọdụ nwere obi abụọ’ bụ ihe àmà nke na-egosi izi ezi nke ihe ndekọ Onye Ozi ahụ. Ọ na-egosikwa anyị na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị adịghị ngwa ikwere ihe, kama ha nwere àgwà nke inyocha na ịtụle ihe àmà ndị e wepụtara, ịnụ ọkụ n’obi, ume na mmụọ nke iji onwe onye chụọ àjà nke ndị ahụ kwere ekwe mesịrị nwee na-enye anyị ihe àmà bara ụba nke nkweta ezi obi ha ná mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị, bụ́ nke ha nakwa anyị onwe anyị ghọtara dị ka isi nkume nke okwukwe anyị n’ebe ọ nọ. Ọ bụrụ na e meghị ka Kraịst bilie, okwukwe anyị bụ n’efu, anyị ka nọkwa na mmehie anyị.— 1 Kọr. 15:17.”—Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, May 1, 1901, peji nke 152.
Tupu anyị agaa n’ihu, anyị pụrụ ịrịba ama na ụzọ Matiu si hota isi ihe nke a na-enye anyị ihe àmà nke ịbụ ihe kwesịrị ndabere na eziokwu nke Bible. Ọ bụrụ na mmadụ na-akọ akụkọ na-emeghị eme, o yiri ka ọ̀ ga-ekwu ụmụ irighiri ihe ụfọdụ ndị ga-eme ka akụkọ ahụ o chepụtara yie ihe a pụrụ ikwere; eleghị anya ọ ga-eche na ụmụ irighiri ihe ndị a hapụrụ ma ọ bụ na-edoghị anya ga-eme ka e nwee obi abụọ n’akụkọ ahụ o chepụtara. Gịnị banyere Matiu?
O cheghị na ọ dị mkpa inye ụmụ irighiri nkọwa banyere ihe o kwuru nke na “ụfọdụ nwere obi abụọ.” Ihe ndekọ nke Mak, Luk, na Jọn ekwughị ihe ọ bụla banyere nke a, ya mere, ọ bụrụ na e jiri nanị ihe Matiu kwuru mee ihe, ọ pụrụ iyi ka ò kpughere ajọ omume nke ndị ozi 11 ahụ, nke ya onwe ya so n’ime ya. Otú o sina dị, Matiu kwuru ihe ahụ dị mkpirikpi n’enyeghị nkọwa ọ bụla. Mgbe ihe dị ka 14 afọ gasịrị, Pọl onyeozi dere akwụkwọ Ndị Kọrint nke Mbụ. N’ihi ụmụ irighiri ihe o kwuru ná 1 Ndị Kọrint 15:6, anyị pụrụ iru n’ihe pụrụ ịbụ nkwubi okwu ahụ nke na ndị ahụ nwere obi abụọ abụghị ndị ozi kama ndị na-eso ụzọ nọ na Galili, bụ́ ndị Jisọs na-apụtabeghị n’ihu ha. Otú a, ihe ahụ Matiu kwuru nke bụ na “ụfọdụ nwere obi abụọ” na-ada dị ka eziokwu ná ntị; ọ na-ada ná ntị n’ụzọ ziri ezi dị ka onye dere ihe n’eziokwu nke na-ewepụta ihe ndekọ bụ eziokwu n’emeghị mgbalị ịkọwa ụmụ irighiri ihe ọ bụla.