Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 5/1 p. 8-9
  • Mpụta Ndị Ikpeazụ, na Pentikọst 33 O.A.

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mpụta Ndị Ikpeazụ, na Pentikọst 33 O.A.
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mpụta Ndị Ikpeazụ, na Pentikọst nke 33 O.A.
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Laghachiri Eluigwe
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • ‘Unu Ga-abụ Ndị Àmà M’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 5/1 p. 8-9

Ndụ na Ije Ozi Jisọs

Mpụta Ndị Ikpeazụ, na Pentikọst 33 O.A.

N’OTU oge, Jisọs mere ndokwa ka ndị ozi 11 ya dum zute ya n’otu ugwu dị na Galili. O yiri ka à gwakwara ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ banyere nzukọ ahụ, ngụkọta nke ihe karịrị 500 mmadụ wee zukọta. Lee nnọọ mgbakọ obi ụtọ nke a bụ mgbe Jisọs pụtara ma malite izi ha ihe!

Gụnyere ihe ndị ọzọ, Jisọs kọwaara ìgwè mmadụ ahụ na Chineke enyewo ya ike nile dị n’eluigwe na n’elu ala. Ọ gbara ha ume, sị, “Ya mere, gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ: na-ezi ha ka ha debe ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.”

Cheedị echiche banyere ya! E nyere ma ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị, otu ọrụ nke a nke ikere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. Ndị mmegide ga-anwa ịkwụsị ọrụ nkwusa na izi ihe ha, ma Jisọs kasiri ha obi, sị: “Lee, mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” Jisọs na-anọnyere ndị na-eso ụzọ ya site ná mmụọ nsọ ahụ, inyere ha aka ijezu ozi ha.

Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya ná ndụ ruo ogologo oge dị 40 ụbọchị site ná mbilite n’ọnwụ ya. N’oge mpụta ndị a ọ pụtara, o ziri ha ihe banyere Alaeze Chineke, o mekwara ka ihe bụ ibu ọrụ ha dị ka ndị na-eso ụzọ ya pụta ìhè. N’otu oge, ọbụna na o mere ka onye ahụ otu nne ji ya na ya bụ Jemes hụ ya anya, wee mee ka onye nke a na-ekwebughị ekwe kwere n’ezie na Ọ bụ Kraịst ahụ.

Mgbe ndị ozi ahụ ka nọ na Galili, ihe àmà gosiri na Jisọs gwara ha ka ha laghachi na Jerusalem. Mgbe ya na ha na-ezukọ n’ebe ahụ, ọ gwara ha, sị: ‘Unu esila na Jerusalem pụọ, kama nọgidenụ na-echere nkwa nke Nna m, nke unu nụrụ n’ọnụ m, n’ihi na Jọn jiri mmiri mee baptism n’ezie; ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptism mgbe ọtụtụ ụbọchị na-agaghị agabiga site n’ugbu a.’

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, Jisọs na ndị ozi ya zutekwara ọzọ, o wee duru ha pụọ n’obodo ahụ ruo Betani, bụ́ nke dị na ndagwurugwu ebe ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Olive. N’ụzọ dị ịtụnanya, n’agbanyeghị ihe nile o kwuworo banyere nlago ọ gaje ịlago n’eluigwe n’oge na-adịghị anya, ha ka chere na a gaje iguzobe Alaeze ya n’elu ala. Ya mere, ha jụrụ, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka ị na-enyeghachi Israel alaeze?”

Kama ịnwa ịgbazighachi nghọtahie ha ọzọ, Jisọs zara n’ụzọ dị mfe, sị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka ya.” Mgbe ahụ, n’imesighachi ike ọrụ ahụ nke ha na-aghaghị ịrụ, ọ sịrị: “Unu ga-anata ike, mgbe mmụọ nsọ ga-abịakwasịworị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”

Mgbe ha ka lekwasịrị ya anya, Jisọs malitere ịrịgo n’eluigwe, mgbe ahụ, igwe ojii kpuchiri ya nke na ha apụghịkwa ịhụ ya anya. Mgbe o nwoghapụsịrị anụ ahụ ya, ọ lagoro n’eluigwe dị ka onye bụ mmụọ. Ka mmadụ 11 ahụ nọgidere na-elegide anya na mbara igwe, ndị ikom abụọ yi uwe ọcha bịara guzoo n’akụkụ ha. Ndị mmụọ ozi ndị a nwoghataworo anụ ahụ jụrụ ha, sị: “Ndị ikom nke Galili, gịnị mere unu na-eguzo na-ele anya n’eluigwe? Jisọs nke a, onye a napụrụ n’ebe unu nọ rịgoo n’eluigwe, ga-abịa n’otu aka ahụ dị ka unu kiriri ya ka ọ na-aga n’eluigwe.”

Ụzọ Jisọs siworo hapụ elu ala mgbe ahụ bụ nke a na-emereghị oké mkpọsa ihu ọha, ọ bụkwa nanị ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi huru ya. Ya mere, ọ ga-abịaghachi n’ụzọ dị otú ahụ—n’emeghị mkpọsa ihu ọha, ọ bụkwa nanị ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-aghọta na ọ bịaghachiwo, na ọ malitewokwa ọnụnọ ya n’ike Alaeze.

Ugbu a, ndị ozi ahụ rịdara site n’Ugwu Olive, gabiga Ndagwurugwu Kidrọn, wee banyeghachi na Jerusalem. Ha nọgidere n’ebe ahụ n’irubere iwu Jisọs isi. Mgbe ụbọchị iri gasịrị, n’oge Ememe ndị Juu bụ Pentikọst nke afọ 33 O.A., mgbe ihe dị ka 120 ndị na-eso ụzọ zukọtara n’otu ọnụ ụlọ dị n’ụlọ elu na Jerusalem, ụzụ nke dị ka nke oké ifufe na-efesi ike jupụtara ụlọ ahụ dum na mberede. A hụrụ ire yiri nke ọkụ, otu na-anọkwasịkwa n’isi nke ọ bụla n’ime ndị nọ n’ebe ahụ, ndị ahụ na-eso ụzọ malitekwara ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Nke a bụ mwụpụ nke mmụọ nsọ ahụ Jisọs kwewororịị ná nkwa! Matiu 28:16-20; Luk 24:49-52; 1 Ndị Kọrint 15:5-7; Ọrụ 1:3-15; 2:1-4.

◆ Òle ndị ka Jisọs bu ụzọ nye ntụziaka ikpeazụ n’ugwu ahụ dị na Galili, gịnị bụkwa ntụziaka ndị a?

◆ Nkasi obi dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ụzọ ọ ga-esi na-anọnyere ha?

◆ Ruo ogologo oge ha aṅaa mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ ka Jisọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya hụ ya anya, gịnịkwa ka ọ kụziiri ha?

◆ Ònye, nke ihe àmà gosiri na ọ ghọbeghị onye na-eso ụzọ tupu ọnwụ Jisọs, ka Jisọs mere ka ọ hụ ya anya?

◆ Nzukọ ikpeazụ abụọ dị aṅaa ka Jisọs na ndị ozi ya nwere, gịnịkwa mere n’oge ndị a?

◆ Olee ụzọ o si bụrụ na Jisọs ga-alọghachi n’otu ụzọ ahụ o si laa?

◆ Gịnị mere na Pentikọst 33 O.A.?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya