“Na-agbasonụ Ọrụ Ile Ndị Ọbịa Anya nke Ọma”
“N’akụkụ ihe na-akpa ndị nsọ, na-enwekọnụ ihe; na-agbasonụ ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma.”—NDỊ ROM 12:13.
1. Gịnị bụ otu mkpa bụ isi nke ụmụ mmadụ, oleekwa otú e si egosipụta ya?
IJI ụkwụ gbadaa okporo ámá tọgbọ chakoo n’ógbè a na-amachaghị nke ọma n’ime abalị pụrụ ịbụ ahụmahụ na-egbu mgbu n’obi n’oge a. Ma ọ pụkwara ịbụ ihe na-egbu mgbu n’obi ịnọ n’etiti ìgwè mmadụ ma ghara ịma onye ọ bụla ma ọ bụ a ghara ịma gị. N’ezie, otu akụkụ bụ isi nke ọdịdị mmadụ bụ mkpa nke ịbụ onye a na-eche banyere ya, onye a chọrọ, ma hụ n’anya. Ọ dịghị onye ọ na-amasị ka e mesoo ya dị ka onye a na-amabughị ma ọ bụ onye èzí.
2. Olee otú Jehova siworo gboo mkpa anyị maka onye ibe?
2 Jehova Chineke, Onye Mere na Onye Okike nke ihe nile, maara nke ọma mkpa mmadụ nwere maka onye ibe. Dị ka Omenkà nke mmadụ o kere, site ná mmalite Chineke maara na “ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọrọ nanị ya,” o mekwara ihe banyere ya. (Jenesis 2:18, 21, 22) Ihe ndekọ Bible jupụtara n’ihe atụ nke omume obiọma ndị Jehova na ndị ohu ya meere ụmụ mmadụ. Nke a na-eme ka anyị nwee ike ịmụta ụzọ isi ‘na-agbaso ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma,’ maka ọṅụ na obi ụtọ nke ndị ọzọ na maka afọ ojuju nke anyị.—Ndị Rom 12:13.
Mmasị Maka Ndị A Na-amabughị
3. Kọwaa ihe ile ọbịa pụtara n’ụzọ bụ isi.
3 Okwu bụ ‘ile ọbịa’ dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible bụ nke e si n’okwu Grik bụ́ phi·lo·xe·niʹa sụgharịta, bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ okwu abụọ bụ isi nke pụtara “ịhụnanya” na “onye a na-amabughị.” N’ihi ya, ile ọbịa pụtara n’ụzọ bụ isi “ịhụnanya maka ndị a na-amabughị.” Otú ọ dị, nke a abụghị nanị mmezu iwu ma ọ bụ okwu banyere nkwanye ùgwù. Ọ na-emetụta echiche na mmetụta ịhụnanya mmadụ. Ngwaa bụ́ phi·leʹo, dị ka The Exhaustive Concordance of the Bible nke James Strong si kwuo, pụtara “ịbụ enyi (inwe mmasị maka [mmadụ ma ọ bụ ihe]), ya bụ nwee mmetụta ịhụnanya maka (na-egosi nrapagide onwe onye, n’ihi mkpali ma ọ bụ mmetụta).” N’ihi ya, ile ọbịa gafere ịhụnanya dabeere n’ụkpụrụ, ikekwe n’ihi echiche nke ibu ọrụ. Ọ na-abụkarị ngosipụta nke ezi mmasị, mmetụta ịhụnanya, na ọbụbụenyi.
4. Ònye ka e kwesịrị ile ọbịa?
4 Onye a na-egosi mmasị na mmetụta ịhụnanya a bụ ‘onye ahụ a na-amabughị’ (Grik, xeʹnos). Ònye ka nke a pụrụ ịbụ? Ọzọkwa, Concordance nke Strong na-akọwa okwu bụ xeʹnos dị ka ‘nke si mba ọzọ (n’ụzọ nkịtị nke ala ọzọ, ma ọ bụ n’ụzọ ihe atụ dị ọhụrụ); na-atụ aro onye ọbịa ma ọ bụ (n’aka nke ọzọ) onye a na-amabughị.’ Ya mere ile ọbịa, dị ka e nyere ihe atụ ya n’ime Bible, pụrụ igosi obiọma a na-egosi onye anyị nwere mmasị na ya, ma ọ bụ a pụrụ igosi ya ọbụna onye a na-amabughị ma ọlị. Jisọs kọwara, sị: “Ùnu nwere ụgwọ ọrụ gịnị, ma ọ bụrụ na unu hụrụ ndị ahụ n’anya, bụ́ ndị na-ahụ unu n’anya? ọbụna ndị ọna ụtụ, há adịghị eme otu ihe ahụ? Ọ bụrụkwa na unu na-ekele nanị ụmụnne unu, gịnị ka unu na-eme karịa ndị ọzọ? ọbụna ndị mba ọzọ, há adịghị eme otu ihe ahụ?” (Matiu 5:46, 47) Ezi ile ọbịa na-agabiga nkewa na ịkpa ókè ndị mbunobi na egwu wetara.
Jehova, Onye Nlekọta Zuru Okè
5, 6. (a) Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru, sị, “Nna unu nke eluigwe zuru okè”? (b) Olee otú e si ahụ mmesapụ aka Jehova?
5 Ka ọ kọwapụtasịrị ihe ndị kọrọ ụkọ n’ịhụnanya ụmụ mmadụ na-egosirịta ibe ha, dị ka e zoro aka n’elu, Jisọs kwukwasịrị okwu a: “Ya mere unu onwe unu ga-ezu okè, dị ka Nna unu nke eluigwe zuru okè.” (Matiu 5:48) N’ezie, Jehova zuru okè n’akụkụ nile. (Deuterọnọmi 32:4) Otú ọ dị, Jisọs na-eme ka otu akụkụ kpọmkwem nke izu okè Jehova pụta ìhè, dị ka o buru ụzọ kwuo: “[Chineke] na-eme ka anyanwụ Ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, Ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.” (Matiu 5:45) Mgbe a bịara n’igosi obiọma, Jehova adịghị ele mmadụ anya n’ihu.
6 Dị ka Onye Okike, Jehova bụ onye nwe ihe nile. “Mụ nwe anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa, ya na anụ nile n’elu [otu puku ugwu]. Amawo m anụ ufe ọ bụla nke ugwu nile: anụ nile nke na-enugharị n’ọhịa dịkwa n’aka m,” ka Jehova na-ekwu. (Abụ Ọma 50:10, 11) Ma, ọ dịghị eji ọchịchọ onwe onye akwakọba ihe ọ bụla. Ná mmesapụ aka ya, ọ na-enye ihe nile o kere ihe na-akpa ha. Ọbụ abụ ahụ kwuru banyere Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.”—Abụ Ọma 145:16.
7. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’otú Jehova si emeso ndị ala ọzọ nye ya na ndị nọ ná mkpa?
7 Jehova na-enye ndị mmadụ ihe dị ha mkpa—ọbụna ndị na-amaghị ya, ndị ala ọzọ nye ya. Pọl na Banabas chetaara ndị na-ekpere arụsị nọ n’obodo Listra na Jehova ‘ahapụghị Onwe ya n’enweghị ihe àmà, ebe Ọ na-eme ezi ihe, na-enyekwa unu mmiri ozuzo na oge mkpụrụ site n’eluigwe, na-emeju obi unu n’ihe ọzụzụ na ọṅụ.’ (Ọrụ 14:17) Jehova nwere obiọma ma na-emesapụ aka karịsịa n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ. (Deuterọnọmi 10:17, 18) E nwere ihe dị ukwuu anyị pụrụ ịmụta site n’aka Jehova n’igosi obiọma na mmesapụ aka—ile ọbịa—nye ndị ọzọ.
8. Olee otú Jehova siworo gosi mmesapụ aka ya n’igbo mkpa ime mmụọ anyị?
8 Tinyere inye ihe n’ụba maka mkpa anụ ahụ nke ihe ndị o kere, Jehova na-egbo mkpa ha n’ụzọ ime mmụọ. Jehova mere ihe n’ụzọ mmesapụ aka kasị ukwuu maka ọdịmma ime mmụọ anyị, ọbụna tupu onye ọ bụla n’ime anyị achọpụta na anyị nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’ụzọ ime mmụọ. Anyị na-agụ ná Ndị Rom 5:8, 10, sị: “Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị. . . . Mgbe anyị bụ ndị iro, e sitere n’ọnwụ Ọkpara Ya mee ka anyị na Chineke dị n’otu.” Ndokwa ahụ na-eme ka o kwe ụmụ mmadụ na-eme mmehie omume ịbata ná mmekọrịta obi ụtọ ezinụlọ ha na Nna anyị nke eluigwe. (Ndị Rom 8:20, 21) Jehova hụkwara na e nyere anyị nduzi na ntụzi kwesịrị ekwesị ka anyị wee nwee ike inwe ihe ịga nke ọma ná ndụ n’agbanyeghị ọnọdụ mmehie na ezughị okè anyị.—Abụ Ọma 119:105; 2 Timoti 3:16.
9, 10. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova bụ onye nlekọta zuru okè? (b) Olee otú ndị na-efe ezi ofufe kwesịrị isi ṅomie Jehova n’akụkụ a?
9 N’ihi nke a, anyị pụrụ ikwu na Jehova bụ n’ezie onye nlekọta zuru okè n’ọtụtụ ụzọ. Ọ dịghị eleghara ndị nọ ná mkpa, ndị dị ala, na ndị na-enweghị ihe anya. Ọ na-egosi ezi mmasị na nchegbu maka ndị ala ọzọ nye ya, ọbụna ndị iro ya, ọ dịghịkwa achọ nkwụghachi ọ bụla nke ihe onwunwe. N’ihe a nile, ọ́ bụghị ya bụ ihe atụ kasịnụ nke onye nlekọta zuru okè?
10 Dị ka Chineke nke ebere ịhụnanya na mmesapụ aka dị otú ahụ, Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya ṅomie ya. N’akụkụ nile nke Bible, anyị na-ahụ ihe atụ ndị pụrụ iche nke àgwà ọma a. Akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica na-ekwu na “n’Israel oge ochie, ile ọbịa abụghị nanị okwu banyere àgwà ọma, kama ụkpụrụ omume e guzobeworo . . . Omenala Bible nke ịnabata onye njem ike gwụrụ na ịnabata ndị a na-amabughị n’etiti onwe onye bụ ebe ile ọbịa na akụkụ ya ndị ọzọ nile si ghọọ omume ọma nke e ji kpọrọ ihe nke ukwuu n’ọdịnala ndị Juu.” Karịa ịbụ akara e ji mara mba ma ọ bụ agbụrụ ọ bụla, ile ọbịa kwesịrị ịbụ ihe e ji mara ezi ndị nile na-efe Jehova ofufe.
Onye Lekọtara Ndị Mmụọ Ozi
11. Olee ihe atụ dị ịrịba ama na-egosi na ile ọbịa wetara ngọzi a na-atụghị anya ha? (Leekwa Jenesis 19:1-3; Ndị Ikpe 13:11-16.)
11 Otu n’ime ihe ndekọ Bible a kasị mara banyere ngosipụta nke ile ọbịa bụ nke Abraham na Sera mgbe ha mara ụlọikwuu ha n’etiti osisi ukwu nile nke Mamre, na nso nso Hebrọn. (Jenesis 18:1-10; 23:19) Obi abụọ adịghị ya na Pọl onyeozi bu nke a n’uche mgbe o nyere ndụmọdụ a: “Echezọla ile ndị ọbịa nke ọma: n’ihi na ụfọdụ esitewo na nke a lee ndị mmụọ ozi ọbịa n’amaghị ama.” (Ndị Hibru 13:2) Ịmụ ihe ndekọ a ga-enyere anyị aka ịhụ na ile ọbịa abụghị nanị okwu banyere omenala ma ọ bụ nzụlite. Kama nke ahụ, ọ bụ àgwà Chineke nke na-eweta ngọzi ndị dị ebube.
12. Olee otú Abraham si gosi ịhụnanya ya maka ndị ọ na-amabughị?
12 Jenesis 18:1, 2 na-egosi na Abraham amaghị, ọ tụghịkwa anya ndị nleta ahụ, ya bụ mmadụ atọ a na-amabughị na-agafe agafe. Omenala dị n’etiti ndị Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, dị ka ụfọdụ ndị na-enye nkọwa si kwuo, bụ na onye na-eme njem n’ala ọ na-amabughị nwere ikike ịtụ anya ile ọbịa a sịgodị na ọ maghị onye ọ bụla n’ebe ahụ. Ma Abraham echereghị ka ndị ahụ ọ na-amabughị jiri ikike ha nwere mee ihe; o bu ụzọ mee ihe. Ọ ‘gbara ọsọ’ izute ndị a ọ na-amabughị bụ́ ndị nọtụ n’ebe dị anya site n’ebe ọ nọ—ihe a nile bụ “n’ikpo ọkụ nke ehihie,” Abraham dịkwa afọ 99! Nke a ọ́ dịghị egosi ihe mere Pọl ji zoo aka n’ebe Abraham nọ dị ka ihe nlereanya anyị ga-eṅomi? Nke ahụ bụ ihe ile ọbịa pụtara, inwe mmasị ma ọ bụ ịhụnanya maka ndị a na-amabughị, nchegbu maka mkpa ha. Ọ bụ àgwà dị mma.
13. N’ihi gịnị ka Abraham ji “kpọọ isiala” nye ndị nleta ahụ?
13 Ihe ndekọ ahụ na-agwakwa anyị na mgbe o zutesịrị ndị ahụ ọ na-amabughị, Abraham ‘kpọrọ isiala.’ Ịkpọrọ ndị a na-amabughị ma ọlị isiala? Ịkpọ isiala, dị ka Abraham mere, bụ otu ụzọ isi kelee onye ọbịa a na-asọpụrụ ma ọ bụ onye nọ n’ọkwá dị elu, a gaghị aghọtahie ya na ife ofufe, bụ́ nke dịịrị nanị Chineke. (Tụlee Ọrụ 10:25, 26; Mkpughe 19:10.) Site n’ịkpọ isiala, ọ bụghị nanị ihulata isi kama ịkpọ “isiala,” Abraham nyere ndị a ọ na-amabughị nsọpụrụ nke ịbụ ndị dị mkpa. Ọ bụ onye isi nke ezinụlọ buru ibu, na-aga n’ihu nke ndị nna ochie, ma o weere ndị a ọ na-amabughị dị ka ndị kwesịrị nsọpụrụ karịa ya onwe ya. Lee ka nke a si dị iche n’obi abụọ a na-enwekarị banyere ndị a na-amabughị, omume emela oké ngwa ngwa! Abraham gosipụtara n’eziokwu ihe okwu ahụ pụtara: “N’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.”—Ndị Rom 12:10.
14. Mgbalị na àjà dị aṅaa ka Abraham ile ndị ahụ ọ na-amabughị ọbịa gụnyere?
14 Akụkụ fọdụrụ n’ihe ndekọ ahụ na-egosi na mmetụta Abraham nwere bụ nke ezie. Nri ahụ n’onwe ya pụrụ iche. Ọbụna n’ezinụlọ buru ibu nke nwere ọtụtụ anụ ụlọ, “nwa ehi nke anụ ahụ ya na-akaghị aka nke dịkwa mma” abụghị ihe a na-eri kwa ụbọchị. Banyere omenala ndị dị n’ógbè ahụ, Daily Bible Illustrations nke John Kitto na-ekwu, sị: “A dịghị etinye aka n’okomoko ọ gwụla n’oge ememe ụfọdụ, ma ọ bụ n’oge onye a na-amabughị bịara; ọ bụkwa nanị n’oge ndị dị otú ahụ ka a na-eri anụ, ọbụna ndị nwere ọtụtụ ìgwè atụrụ na ehi.” Ọnọdụ ihu igwe na-ekpo ọkụ ekweghị ka e debe ihe oriri ndị pụrụ imebi ngwa ngwa, ya mere iji sie ụdị nri ahụ, a ghaghị imesị ihe nile otu mgbe. Ka a sịkwa ihe mere na n’ihe ndekọ a dị mkpirikpi, okwu bụ́ “mee ngwa” pụtara ugboro atọ, Abraham ‘gbakwara ọsọ’ n’ụzọ nkịtị iji kwadebe ihe oriri ahụ!—Jenesis 18:6-8.
15. Gịnị bụ echiche kwesịrị ekwesị banyere ihe oriri n’ile ọbịa, dị ka Abraham mere ihe atụ ya?
15 Otú ọ dị, nzube ya abụghị nanị ime oké oriri ka mmadụ hụ ya. Ọ bụ ezie na Abraham na Sera tinyere mgbalị ahụ nile iji kwadebe ma bupụta nri ahụ, rịba ama otú Abraham si zoo aka na ya tupu mgbe ahụ: “Biko, ka e kute nwantịị mmiri, unu saa ụkwụ unu, zurukwanụ ike n’okpuru osisi a: ka m wetakwa iberibe achịcha, nweekwanụ ume n’obi unu; e mesịa gabiganụ: n’ihi na ọ bụ n’ihi nke a ka unu gabigakwutere ohu unu.” (Jenesis 18:4, 5) “Iberibe achịcha” ahụ ghọrọ oké oriri nke nwa ehi mara abụba na ógbè achịcha nke ụtụ ọka, mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi—oriri kwesịrị onye eze. Gịnị bụ ihe mmụta dị na ya? Mgbe a na-ele ọbịa, ihe dị mkpa, ma ọ bụ ihe a ga-emesi ike, abụghị otú ihe oriri na ihe ọṅụṅụ ahụ ga-adịru oké ọnụ, ma ọ bụ oké ntụrụndụ a ga-enye, na ihe ndị ọzọ. Ile ọbịa adịghị adabere na ma mmadụ ọ ga-azụtali ihe ndị dara ọnụ. Kama nke ahụ, ọ dabeere n’ezi nchegbu maka ọdịmma ndị ọzọ na ọchịchọ imere ndị ọzọ ihe ọma ruo n’ókè mmadụ nwere ike. “Ọ dị mma, bụ òkè ihe oriri nke bụ nanị akwụkwọ nri, ma ịhụnanya dị n’ebe ahụ, karịa ehi a zụrụ azụ igbu egbu, ma ịkpọasị adị ya,” ka otu ilu Bible na-ekwu, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ezi ile ọbịa hiwere isi.—Ilu 15:17.
16. Olee otú Abraham si gosi ekele maka ihe ime mmụọ n’ihe o meere ndị nleta ahụ?
16 Otú ọ dị, anyị aghaghị ịrịba ama na e nwekwara ọdịdị ime mmụọ n’ihe omume ahụ nile. N’ụzọ ụfọdụ Abraham chọpụtara na ndị nleta a bụ ndị ozi Jehova zitere. E gosiri nke a site na ya ịgwa ha okwu ndị a: “Onyenwe m, biko, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu gị, biko, esila n’ebe ohu gị nọ gabiga.”a (Jenesis 18:3; tụlee Ọpụpụ 33:20.) Abraham amaghị tupu mgbe ahụ ma ọ̀ dị ozi ha nwere izi ya ka ọ bụ nanị na ha na-agafe agafe. Ka o sina dị, ọ ghọtara na mmezu nke nzube Jehova na-ewere ọnọdụ. Mmadụ ndị a na-eje ozi Jehova ziri ha. Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọ pụrụ ime iji tụnye ụtụ na nke ahụ, ọ ga-enwe obi ụtọ ime ya. Ọ ghọtara na ndị ohu Jehova kwesịrị inweta ihe kasị mma, ọ ga-enyekwa ihe kasị mma n’ọnọdụ ahụ. Site n’ime otú ahụ, a ga-enwe ngọzi ime mmụọ, ma ọ bụ maka onwe ya ma ọ bụ maka onye ọzọ. Dị ka o si daba, a gọziri Abraham na Sera nke ukwuu maka ile ọbịa ha si n’ezi obi.—Jenesis 18:9-15; 21:1, 2.
Ndị Na-ele Ọbịa
17. Gịnị ka Jehova chọrọ n’aka ndị Israel banyere ndị a na-amabughị na ndị nọ ná mkpa n’etiti ha?
17 Ihe nlereanya dị ịrịba ama nke Abraham abụghị nke mba si n’ebe ọ nọ pụta gaje ichezọ. Iwu Jehova nyere ndị Israel gụnyere ndokwa maka ile ndị a na-amabughị nọ n’etiti ha ọbịa. “Dị ka onye a mụrụ n’ala site n’ahụ unu ka ọbịa ga-adịrị unu, bụ́ onye nọ dị ka ọbịa n’etiti unu, ị ga-ahụkwa ya n’anya dị ka onwe gị; n’ihi na ndị ọbịa ka unu bụrịị n’ala Ijipt: Mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.” (Levitikọs 19:34) Ndị ahụ gaje inye ndị nọ ná mkpa ihe onwunwe nchebara echiche pụrụ iche ma ghara ilefuru ha anya. Mgbe Jehova ji ụba ihe ubi gọzie ha, mgbe ha ṅụrịrị ọṅụ n’ememe ha dị iche iche, mgbe ha zuuru ike n’ọrụ ha n’afọ Izu Ike ndị ahụ, na n’oge ndị ọzọ, ndị ahụ ga-echeta ndị ahụ ihe na-adabachaghịrị—ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ụmụ mgbei, nakwa ndị ọbịa.—Deuterọnọmi 16:9-14; 24:19-21; 26:12, 13.
18. Ruo n’ókè ha aṅaa ka ile ọbịa dịruru ná mkpa iji nweta amara na ngọzi Jehova?
18 Ịdị mkpa nke obiọma, mmesapụ aka, na ile ọbịa n’ebe ndị ọzọ nọ, karịsịa n’ebe ndị nọ ná mkpa nọ, bụ nke a pụrụ ịhụ n’ụzọ Jehova si mesoo ndị Israel mgbe ha leghaara igosipụta àgwà ndị a anya. Jehova mere ka o doo anya na obiọma na mmesapụ aka n’ebe ndị a na-amabughị na ndị nọ ná mkpa nọ so n’ihe ndị a chọrọ ka ndị ya wee nọgide na-anata ngọzi ya. (Abụ Ọma 82:2, 3; Aịsaịa 1:17; Jeremaịa 7:5-7; Ezikiel 22:7; Zekaraịa 7:9-11) Mgbe mba ahụ dị uchu n’imezu ihe ndị a na ndị ọzọ a chọrọ ha n’aka, ha nwere ọganihu ma nwee ụba ihe onwunwe na nke ime mmụọ. Mgbe ha mikpuru ná nchụso ọchịchọ onwe onye ha ma leghara igosi ndị nọ ná mkpa àgwà ọma ndị a anya, ha natara nkatọ Jehova, n’ikpeazụkwa a mara ha ikpe.—Deuterọnọmi 27:19; 28:15, 45.
19. Gịnị ka anyị na-aghaghị ịtụlekwu?
19 Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa anyị inyocha onwe anyị ma chọpụta ma anyị na-ebi ndụ kwekọrọ n’ihe ndị Jehova na-atụ anya ya n’akụkụ a! Nke a dị otú a taa karịsịa n’ihi mmụọ nke ọchịchọ onwe onye na nkewa dị n’ụwa. Olee otú anyị pụrụ isi gosi ile ọbịa nke ndị Kraịst n’ụwa kewasịrị ekewasị? Nke ahụ bụ ihe a tụlere n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle ka zuo ezuo nke isi ihe a, lee isiokwu bụ́ “Ọ̀ Dịwo Onye Hụrụ Chineke?” n’Ụlọ Nche nke May 15, 1988 (Bekee), peji nke 21-23.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị ka okwu Bible ahụ a sụgharịrị ‘ile ọbịa’ pụtara?
◻ N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Jehova ji bụrụ ihe nlereanya kasịnụ n’ile ọbịa?
◻ Ruo n’ókè ha aṅaa ka Abraham garuru iji lee ọbịa?
◻ N’ihi gịnị ka ndị nile na-efe ezi ofufe ga-eji ‘na-agbaso ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma’?