Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi Kpegara Chineke Ekpere?
MGBE otu onye na-eso ụzọ rịọrọ maka ntụziaka banyere ekpere, Jisọs ajụghị inye ya. Dị ka Luk 11:2-4 si kwuo, ọ zaghachiri, sị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: Nna, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Nye anyị taa nri ụbọchị anyị. Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị, n’ihi na anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla ji anyị ụgwọ. Edubakwala anyị n’ime ọnwụnwa.” (Douay Version nke ndị Katọlik) A maara nke a ebe nile dị ka Ekpere Onyenwe Anyị. Ọ na-enye ihe ọmụma dị ukwuu.
Nke mbụ, okwu mbụ dị na ya na-agwa anyị onye anyị na-aghaghị ikpegara ekpere anyị—Nna anyị. Rịba ama na Jisọs enyeghị ohere ọ bụla maka ikpegara onye ọzọ, ihe oyiyi, “senti,” ma ọ bụ ọbụna ya onwe ya ekpere. E kwuwerị, Chineke ekwuwo, sị: “M gaghị enye onye ọzọ ebube m, ma ọ bụkwanụ nye ihe ndị a kpụrụ akpụ otuto m.” (Aịsaịa 42:8, Dy) N’ihi ya ọ dịghị anụ ekpere ndị e kpegaara ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ na-abụghị Nna anyị nke eluigwe, otú ọ masịkwara onye ahụ na-efe ofufe nweruo n’obi eziokwu. N’ime Bible, nanị Jehova Chineke ka a kpọrọ “Onye na-anụ ekpere.”—Abụ Ọma 65:2.
Ụfọdụ pụrụ ikwu na “ndị senti” na-eje ozi nanị dị ka ndị nrịọchitere n’ebe Chineke nọ. Ma Jisọs n’onwe ya nyere ntụziaka, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na Mụ. Ihe ọ bụla unu ga-arịọkwa n’aha m, ihe ahụ ka M ga-eme, ka e wee nye Nna m otuto n’ime Ọkpara Ya.” (Jọn 14:6, 13) Jisọs si otú a gụpụ echiche bụ na onye ọ bụla a kpọrọ senti pụrụ ịrụ ọrụ onye nrịọchitere. Rịbakwa ama ihe Pọl onyeozi kwuru banyere Kraịst: “Ọ bụghị nanị na ọ nwụrụ n’ihi anyị—o si n’ọnwụ bilie, n’ebe ahụkwa n’aka nri Chineke ọ na-eguzo ma na-arịọ arịrịọ n’ihi anyị.” “Ọ na-adịru ebighị ebi ịrịọchitere ndị nile na-abịakwute Chineke arịrịọ site na ya.”—Ndị Rom 8:34; Ndị Hibru 7:25, The Jerusalem Bible nke ndị Katọlik.
Aha ahụ nke A Na-aghaghị Ido Nsọ
Okwu ndị na-esonụ n’ekpere Jisọs bụ: “Ka e doo aha gị nsọ.” Olee otú mmadụ pụrụ isi doo aha Chineke nsọ, ya bụ, mee ka ọ dị nsọ, ma ọ bụ doo ya iche, ma ọ bụghị ma ọ maara ya ma jiri ya na-eme ihe? Ihe gafere ugboro 6,000 n’ime “Agba Ochie,” e ji aha onwe onye ahụ bụ́ Jehova wee mara Chineke.
Nkọwa ala ala peji maka Ọpụpụ 6:3 na Douay Version nke ndị Katọlik na-ekwu banyere aha Chineke, sị: “Ụfọdụ ndị nke oge a echepụtawo aha ahụ bụ́ Jehova . . . , n’ihi na a makwaghị nnọọ ugbu a ụzọ ziri ezi isi kpọọ aha [Chineke], bụ́ nke dị n’ihe odide Hibru, n’ihi ejighị ya mee ihe ruo ogologo oge.” N’ihi ya The New Jerusalem Bible nke ndị Katọlik na-eji aha ahụ bụ́ Yahweh eme ihe. Ọ bụ ezie na ndị ọkà mmụta ụfọdụ nwere mmasị karị ná mkpọpụta ahụ, “Jehova” bụ ụzọ ziri ezi na ụzọ nọteworo anya nke isi na-akpọ aha Chineke na Bekee. Asụsụ ndị ọzọ nwere ụzọ nke ha ha si akpọ aha nsọ ahụ. Ihe bụ isi bụ ka anyị jiri aha ahụ na-eme ihe iji doo ya nsọ. Chọọchị gị ọ̀ kụziworo gị iji aha ahụ bụ́ Jehova eme ihe n’ekpere?
Ihe Ndị Kwesịrị Ekwesị A Pụrụ Ikpe Ekpere Maka Ha
Ọzọ, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” Oziọma Matiu na-agbakwụnye okwu ndị bụ́: “Ka e mee uche gị n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe.” (Matiu 6:10, Dy) Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’aka Jisọs Kraịst. (Aịsaịa 9:6, 7) Dị ka amụma Bible si kwuo, n’isi nso ọ ga-ewezụga ọchịchị nile nke ụmụ mmadụ ma weta oge nke udo zuru ụwa ọnụ. (Abụ Ọma 72:1-7; Daniel 2:44; Mkpughe 21:3-5) N’ihi ya ezi ndị Kraịst na-eme ọbịbịa nke Alaeze ahụ ihe a na-ekpe ekpere maka ya ugboro ugboro. Chọọchị gị ọ̀ kụziworo gị ime otú ahụ?
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Jisọs gosikwara na ekpere anyị pụrụ ịgụnye ihe ndị dịịrị onwe onye ndị na-echegbu anyị. O kwuru, sị: “Nye anyị taa nri ụbọchị anyị. Gbagharakwa anyị mmehie nile anyị, n’ihi na anyị na-agbagharakwa onye ọ bụla ji anyị ụgwọ. Edubakwala anyị n’ime ọnwụnwa.” (Luk 11:3, 4, Dy) Okwu Jisọs pụtara na anyị pụrụ ịchọ uche Chineke n’ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị, na anyị pụrụ ịbịakwute Jehova banyere ihe ọ bụla nke pụrụ inye anyị nsogbu ma ọ bụ mebie udo nke uche anyị. Ịrịọchi Chineke arịrịọ anya n’ụzọ dị otú a na-enyere anyị aka ịghọta ndabere anyị na-adabere n’ebe ọ nọ. Anyị na-esi otú a amatawanye mmetụta ya ná ndụ anyị. Ịrịọ Chineke kwa ụbọchị ka ọ gbaghara anyị mmejọ anyị nile bakwara uru. N’ihi ya anyị na-amatawanye adịghị ike anyị—ma na-anagide amaghị eme nke ndị ọzọ karị. Agbamume Jisọs bụ́ ka anyị na-ekpe ekpere maka nnapụta n’ọnwụnwa kwesịkwara ekwesị, karịsịa n’ihi ụkpụrụ omume ọma na-adalata adalata nke ụwa a. N’ikwekọ n’ekpere ahụ, anyị na-elezi anya izere ihe na ọnọdụ ndị pụrụ iduba anyị n’ime ihe ọjọọ.
Mgbe ahụ, ajụjụ ọ bụla adịghị ya na Ekpere Onyenwe Anyị na-agwa anyị ihe dị ukwuu banyere ikpe ekpere ndị na-adị Chineke mma. Ma Jisọs ò zubere na anyị ga-ewere ekpere a ma nanị na-agụghachi ya ugboro ugboro?
Ndụmọdụ Ọzọkwa n’Ekpere
Jisọs nyekwuru ntụziaka banyere ekpere. Na Matiu 6:5, 6, anyị na-agụ, sị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpekwa ekpere, unu agaghị adị ka ndị ihu abụọ ahụ: n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ unu na nkuku ámá unu ikpe ekpere, ka ha wee were onwe ha gosi mmadụ. . . . Ma gị onwe gị, mgbe ọ bụla ị na-ekpe ekpere, baa n’ime ụlọ nta gị, mgbe i mechisịkwara ụzọ gị, kpeere Nna gị Nke dị na nzuzo, Nna gị Nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-enyeghachikwa gị.” Okwu ndị a na-akụziri anyị na e kwesịghị ikpe ekpere n’ụzọ ime oké ngosi, ka mmadụ hụ anyị. Ị̀ na-awụpụrụ Jehova obi gị mgbe ị nọ nanị gị, dị ka Bible na-agba ume ya?—Abụ Ọma 62:8.
Jisọs nyekwara ịdọ aka ná ntị a, sị: “N’ekpere unu unu atagharịla ọnụ dị ka ndị ọgọ mmụọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na ha ga-eme ka a nụ olu ha site n’ikwu ọtụtụ okwu.” (Matiu 6:7, JB) N’ụzọ doro anya, Jisọs akwadoghị iburu ekpere n’isi—ma ya fọdụziekwa isi n’akwụkwọ na-agụpụta ha. Ihe ndị o kwuru kagbukwara iji chaplet eme ihe.
Otu akwụkwọ ekpere ndị Katọlik kwetara nke a, sị: “Ekpere anyị kasị mma pụrụ ịbụ ihe ndị anyị chepụtara n’onwe anyị mgbe anyị na-echigharịkwuru ya n’ihi ekele ma ọ bụ mkpa, n’oge iru újú, ma ọ bụ n’ofufe anyị na-efechi ya anya kwa ụbọchị.” Ekpere ndị nke Jisọs bụ ndị o chepụtara n’onwe ya, ọ bụghị ndị e bu n’isi. Dị ka ihe atụ, gụọ ekpere Jisọs nke e dekọrọ na Jọn isi nke 17. Ọ na-ekwekọ n’ekpere ihe nlereanya ahụ, na-emesi ọchịchọ Jisọs ike ịhụ ka e mere ka aha Jehova dị nsọ. Ekpere Jisọs bụ ya chepụtara ya n’onwe ya, bụrụkwa nke si n’ime ime obi.
Ekpere Ndị Chineke Na-anụ
Ọ bụrụ na a kụziworo gị ikpe ekpere ndị e bu n’isi, ikpegara “ndị senti” ma ọ bụ ihe oyiyi dị iche iche ekpere, ma ọ bụ iji ihe okpukpe ndị dị ka chaplet eme ihe, echiche nke ikpe ekpere n’ụzọ Jisọs tụziri pụrụ iyi ihe na-emenye ụjọ na mbụ. Otú ọ dị, isi ihe dị na ya bụ ịbịa mara Chineke—aha ya, nzube ya, na ụdị onye ọ bụ. Ị pụrụ imezu nke a site n’ịmụ Bible nke ọma. (Jọn 17:3) Ndịàmà Jehova dị njikere, nweekwa ọchịchọ inyere gị aka n’akụkụ a. Leenụ, ha enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka n’ụwa nile ‘idetụ ire na ịhụ na Jehova dị mma’! (Abụ Ọma 34:8) Ka ị na-amata Chineke karị, otú a ka ị ga-abụ onye a kpalikwuru ito ya n’ekpere. Ka ị na-abịakwa Jehova nso karị n’ekpere nsọpụrụ, otú a ka mmekọrịta gị na ya ga-echi anya karị.
N’ihi ya a gbara ndị nile na-efe Chineke ezi ofufe ume ‘ikpe ekpere n’ewepụghị aka.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Jide n’aka na ekpere gị nile kwekọrọ n’ezie na Bible, gụnyere ntụziaka dị iche iche nke Jisọs Kraịst. N’ụzọ dị otú a ị pụrụ ijide n’aka na ekpere gị nile ga-enweta nnwapụta Chineke.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ka anyị na-amụtakwu banyere Jehova, otú a ka a na-akpalikwu anyị ikpegara ya ekpere site n’obi