N’ihi na O Kpere Ekpere
NÁ 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17, 18, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Na-ekpenụ ekpere n’ewepụghị aka; na-ekelenụ ekele n’ihe nile ọ bụla: n’ihi na nke a bụ ihe Chineke na-achọ n’ime Kraịst Jisọs n’ebe unu nọ.” Otú ọ dị, ọ̀ dị mgbe ụfọdụ ị na-ala azụ n’inye ekele mgbe ị na-eri nri n’ebe ọha mmadụ nọ, dị ka n’ụlọ nri ọha? N’iburu n’uche ịdọ aka ná ntị Jisọs megide ekpere e ji mere ihe ngosi, o kwere nghọta na mmadụ pụrụ ịchọ izere ịdọrọkarị uche bịa n’ebe onwe ya dị. (Matiu 6: 5, 6) Otú o sina dị, ekpere nke e kpere n’ụzọ ezi uche dị na ya pụrụ ịdọta ezi mmasị.
Nke a bụ ahụmahụ nke otu onyeozi bụ nwa okoro nke na-eje ozi na Betel nke Brooklyn, bụ́ isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke Ndịàmà Jehova. Ọ na-eri nri ụtụtụ n’otu ụlọ nri ọha, na-eme nkwadebe ije n’ebe ọgbakọ nke ya na-ezukọ isonyere otu ìgwè ndị gaje ikere okè n’ọrụ nkwusa Alaeze. Mgbe e buteere ya nri, o kpere ekpere n’ụzọ ọ na-esibu eme. Mgbe o meghere anya ya, ọ hụrụ otu nwa agbọghọ n’eje ozi n’ụlọ oriri ahụ ka o guzo n’ebe ahụ na-ele ya anya.
Ọ jụrụ, sị, “Ọ̀ kwa ekpere ka ị na-ekpe?” Mgbe ọ zara na ọ bụ ihe ya na-eme, nwa agbọghọ ahụ sịrị: “Ị ghaghị ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Nne na nna m bụkwa Ndịàmà Jehova. Ọ dịbeghị mgbe m tinyere onwe m n’okpukpe ha, ma amaara m na ekwesịrị m ime otú ahụ. Ma eleghị anya ekwesịrị m ịtụ ụtụ Ụlọ Nche na Teta! M̀ pụrụ ime nke a site n’aka gị?”
Nwanna nwa okorobịa ahụ kọrọ, sị, “Ọ fọrọ nke nta ka nri m gbanye m n’akpịrị.” Otú o sina dị, ọ natara ụtụ abụọ n’aka nwa agbọghọ ahụ, nyefeekwa ya magazin abụọ ndị ọhụrụ, meekwa ndokwa ịbịa nletaghachi—ihe nile a bụ n’ihi na o kpere ekpere.