Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 9/15 p. 7-8
  • Ekpere Ndị E Ji n’Aka na A Ga-aza

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ekpere Ndị E Ji n’Aka na A Ga-aza
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ka E Doo Aha Gị Nsọ”
  • “Ka Alaeze Gị Bịa”
  • “Ka E Mee Ihe Ị Na-achọ”
  • Mgbe Alaeze ahụ Na-achị Achị
  • “Onyenwe Anyị, Kụziere Anyị Otú E Si Ekpe Ekpere”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Na-eme Ihe E Kwuru n’Ekpere Onyenwe Anyị—Nke Mbụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ekpere Òle Ndị Ka A Na-aza?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Banyere Ekpere Chineke Na-anụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 9/15 p. 7-8

Ekpere Ndị E Ji n’Aka na A Ga-aza

ENWERE ekpere ndị o doro anya na a gaje ịza. E jikọtara isi ihe dị na ha n’ime otu ihe nlereanya nke Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ sịrị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:9-13.

Okwu ndị ahụ dị n’ekpere ihe nlereanya nke Jisọs abụwo nke e kwughachiri ọtụtụ nde ugbo. Ọ bụ ezie na ihe Jisọs tụrụ anya ya abụghị nanị ka ezi ndị na-eso ụzọ ya na-ekwughachi okwu ekpere dị otú ahụ mgbe mgbe, e ji n’aka na a ga-aza arịrịọ ha ndị na-egosipụta mmetụta ndị yiri nke ahụ. (Matiu 6:7, 8) Ya mere, gịnị ka ọ pụtara, bụ́ ido aha Chineke nso? N’ihi gịnị ka a ga-eji kpee ekpere ka Alaeze ya bịa? N’ihi gịnịkwa ka a ga-eji rịọ ka e mee uche Chineke?

“Ka E Doo Aha Gị Nsọ”

Jehova, bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile,” bụ Onye ahụ Jisọs kpọrọ “Nna anyị nke bi n’eluigwe.” (Abụ Ọma 83:18) Chineke ‘abụwo nna’ nye ụmụ Israel site n’ime ka ha nwere onwe ha pụọ n’agbụ nke Ijipt, nakwa site n’iso ha banye ná mmekọrịta nke ọgbụgba ndụ. (Deuterọnọmi 32:6, 18; Ọpụpụ 4:22; Aịsaịa 63:16) Taa, ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ezi mmetụta n’ebe Jehova nọ dị ka Nna ha. (Ndị Rom 8:15) Ndị na-esonyekwara ha, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala, na-ekpekukwa Jehova Chineke ekpere n’otu aka ahụ dị ka Nna ha.—Jọn 10:16; Mkpughe 7:1-9.

Ma n’ihi gịnị ka a ga-eji kpee ekpere ka e doo aha Chineke nsọ? Ee, kemgbe mmadụ abụọ mbụ ahụ nupụrụ isi n’ogige Iden, e bokwasịwo aha Chineke nkọcha. N’azịza nye ekpere dị otú ahụ, Jehova ga-ewepụchasị nkọcha nile e wetawooro aha ya ahụ nke bụ ihe ncheta. (Abụ Ọma 135:13) Ọ ga-eme nke a site n’iwepụ ajọ omume n’elu ala. N’ihe banyere oge ahụ, Chineke kwuru site n’ọnụ Ezikiel onye amụma, sị: “M ga-emekwa onwe m ka m dị ukwuu, m ga-edokwa onwe m nsọ, mee ka a mara mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.” —Ezikiel 38:23.

Jehova Chineke bụ onye dị nsọ, dịkwa ọcha. N’ihi ya, e kwesịrị ido aha ya nsọ, ma ọ bụ doo ya iche dị ka ihe dị nsọ. Ọ ga-egosipụta ịdị nsọ ya site n’ime ihe iji doo onwe ya nsọ n’ihu ihe nile e kere eke. (Ezikiel 36:23) Ndị nile chọrọ inweta ihu ọma ya na ndụ ebighị ebi aghaghị iji oké egwu na-ele Jehova anya, na-edokwa aha ya nsọ site n’idebe ya dị ka ihe dị iche, dịkwa elu karịa aha nile ọzọ. (Levitikọs 22:32; Aịsaịa 8:13; 29:23) N’ụzọ kwekọrọ na nke a, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Ka e doo aha gị nsọ” ma ọ bụ, “were ya dị ka ihe dị nsọ; mesoo ya dị ka ihe dị nsọ.” Anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-aza akụkụ nke a nke ekpere ihe nlereanya Jisọs ahụ.

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Jịsọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa.” E ji n’aka na a ga-aza ekpere ndị e kpere maka ọbịbịa nke Alaeze Chineke. Alaeze ahụ bụ ọchịchị eze Jehova dị ka e gosipụtara ya site n’ọchịchị Mesaịa dị n’eluigwe nke dị n’aka Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, ya na “ndị nsọ” ha na ya so. (Daniel 7:13, 14, 18, 22, 27; Aịsaịa 9:6, 7) Ọ dịwo ogologo oge Ndịàmà Jehova na-anwapụta site n’Akwụkwọ nsọ na e mere ka Jisọs nọkwasị n’ocheeze dị ka Eze n’eluigwe n’afọ 1914. Ya mere, n’ihi gịnị ka onye ọ bụla kwesịrị iji kpee ekpere ka Alaeze ahụ “bịa”?

Ikpe ekpere maka ọbịbịa nke Alaeze ahụ pụtara n’ezie ịrịọ ka ọ bịa megide ndị nile na-eguzogide ọchịchị Chineke n’elu ala. N’oge na-adịghị anya ugbu a, “Alaeze [nke Chineke] . . . ga-etipịa alaeze [elu ala] ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ihe omume nke a ga-enye aka n’iwepụ aha nsọ Jehova n’ụta.

“Ka E Mee Ihe Ị Na-achọ”

Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere, sị: “Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” Nke a bụ arịrịọ ka Jehova mee ihe kwekọrọ ná nzube ya maka elu ala. O yiri nkwupụta okwu onye ọbụ abụ ahụ, bụ: “Ihe nile nke tọrọ Jehova ụtọ, nke ahụ ka o meworo, n’eluigwe, na n’ụwa, na n’oké osimiri nile, na ogbu mmiri nile. Ọ bụ onye na-eme ka aluluu si ná nsọtụ ụwa kwụgoo; o meworo mmiri ozuzo àmụ̀mà; ọ bụ onye na-eme ka ifufe si n’ụlọ nkwakọba ya nile pụta. Onye tigburu ụmụ e buru ụzọ mụọ n’ala Ijipt, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụ ụlọ. O zitere ihe ịrịba ama dị iche iche na ihe ebube dị iche iche n’etiti gị, Ijipt, n’ahụ Fero, na n’ahụ ndị ohu ya nile. Onye tigburu ọtụtụ mba, gbuokwa ndị eze dị ike.”—Abụ Ọma 135:6-10.

Ikpe ekpere ka e mee ihe Jehova na-achọ n’elu ala bụ arịrịọ ka o mezuo nzube ya n’ebe mbara ala nke a dị. Nke a gụnyere iwepụchasị ndị na-emegide ya ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna dị ka o wepụrụ ha n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta n’oge ochie. (Abụ Ọma 83:9-18; Mkpughe 19:19-21) E ji n’aka na a gaje ịza ekpere ndị e kpere ka e mee ihe Jehova na-achọ n’elu ala dum nakwa n’eluigwe na ala dum.

Mgbe Alaeze ahụ Na-achị Achị

Kama ịbụ ajọ omume ahụ nke rikpuru ọha mmadụ ugbu a, gịnị ka a pụrụ ịtụ anya ya mgbe Alaeze Chineke malitere ịchị, mgbe a na-emekwa ihe Chineke na-achọ n’elu ala dị ka a na-eme ya n’eluigwe? Dị ka Pita onyeozi si kwuo, “dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (2 Pita 3:13) “Eluigwe ọhụrụ” ahụ bụ ike ọchịchị ime mmụọ nke ezi omume—Jisọs Kraịst na 144,000 ndị ahụ ya na ha na-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe. (Ndị Rom 8:16, 17; Mkpughe 14:1-5; 20:4-6) “Ụwa ọhụrụ” abụghị mbara ala ọzọ bụ ụwa. Kama nke ahụ, ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ndị ezi omume, ndị bi n’elu ala.—Tụlee Abụ Ọma 96:1.

N’okpuru ọchịchị Alaeze, a ga-agbanwe elu ala ka ọ ghọọ paradaịs zuru ụwa ọnụ. (Luk 23:43) Ezi udo na inwe ihe ịga nke ọma ga-erutere ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’oge ahụ. (Abụ Ọma 72:1-15; Mkpughe 21:1-5) Ị pụrụ iso n’ìgwè mmadụ obi ụtọ ahụ ma ọ bụrụ na ị bụ onye na-eguzosi ike n’ihe n’ịkwado ọchịchị Mesaịa ahụ n’elu ndị ji nrubeisi nọrọ n’okpuru ya n’elu ala. Ndị na-akwado ọchịchị dị otú ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekpe ekpere maka ido aha Jehova nsọ, ka Alaeze ya bịa, ka e meekwa ihe ọ na-achọ. E ji n’aka na a ga-aza ekpere ndị a sitere n’ala ala obi ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya