Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jizọs Ekpughee “Amamihe Sitere na Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
    • 6-8. (a) Olee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Jizọs kwuru mere a ga-eji zere nchegbu? (b) Gịnị na-egosi na ndụmọdụ Jizọs nyere na-egosipụta amamihe si n’elu?

      6 Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Jizọs nyere banyere ụzọ isi merie inwe nchegbu maka ihe onwunwe, dị ka e kwuru na Matiu isi 6. “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ banyere ahụ́ unu maka ihe unu ga-eyi,” ka Jizọs na-adụ anyị n’ọdụ. (Amaokwu 25) Ihe oriri na uwe bụ mkpa ndị bụ́ isi, ọ bụkwa nnọọ ihe kwesịrị ekwesị bụ́ mmadụ ichegbu onwe ya banyere inweta ihe ndị a. Ma Jizọs na-agwa anyị ka anyị ‘kwụsị ichegbu onwe anyị’ banyere ihe ndị dị otú ahụ.b N’ihi gịnị?

      7 Gee ntị n’ezi ịrụ ụka Jizọs bụ́ nke na-eme ka e kwenye. Ebe Jehova nyeworo anyị ndụ na ahụ́, ọ̀ bụ na ọ pụghị inye anyị ihe oriri iji na-azụ ndụ ahụ na uwe a ga-eyikwasị n’ahụ́ ahụ? (Amaokwu 25) Ọ bụrụ na Chineke na-enye ụmụ nnụnụ nri ma na-eme ka okooko osisi maa mma, lee ka ọ ga-esi lekọta ụmụ mmadụ na-efe ya ofufe karị! (Amaokwu 26, 28-30) N’ezie, ọ baghịkwa uru inwewe nchegbu na-enweghị isi. Ọ gaghị enwe ike ịgbatịkwu ndụ anyị ọbụna nke nta.c (Amaokwu 27) Olee otú anyị pụrụ isi zere inwe nchegbu? Jizọs na-adụ anyị ọdụ, sị: Nọgidenụ na-ebute ofufe Chineke ụzọ ná ndụ. Ndị na-eme otú ahụ pụrụ inwe obi ike na Nna ha nke eluigwe ‘ga-atụkwasịrị’ ha ihe ndị dị ha mkpa kwa ụbọchị. (Amaokwu 33) N’ikpeazụ, Jizọs tụrụ aro dị irè karịsịa—chewe maka ụbọchị nke ị hụrụ. Gịnị mere ị ga-eji buru nchegbu nke echi tụkwasị na nke taa? (Amaokwu 34) E wezụga nke ahụ, gịnị mere ị ga-eji na-echegbu onwe gị n’ụzọ na-enweghị isi maka ihe ndị nwedịrị ike ha agaghị eme eme? Itinye ndụmọdụ dị otú ahụ amamihe dị na ya n’ọrụ pụrụ igbochiri anyị oké nhụsianya n’ime ụwa a nke nrụgide jupụtara na ya.

  • Jizọs Ekpughee “Amamihe Sitere na Chineke”
    Bịaruo Jehova Nso
    • b Ngwaa Grik a sụgharịrị “na-echegbu” pụtara “ịdọpụ uche.” Dị ka e si jiri ya mee ihe na Matiu 6:25, ọ na-ezo aka n’egwu na-akpata nchegbu nke na-adọpụ ma ọ bụ na-aghasasị uche mmadụ, na-eme ka ndụ bụrụ ihe na-adịghị enye ọṅụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya