Ọgwụgwọ Ọrụ Ebube nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ Dị Nso
“Ọ DỊGHỊ mgbe ọ bụla anyị hụrụ ya otú a.” Otú ahụ ka ndị ji anya ha hụ ọgwụgwọ Jisọs gwọrọ onye akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ n’otu ntabi anya n’ụzọ ọrụ ebube kwuru. (Mak 2:12) Jisọs gwọkwara ndị ìsì, ndị ogbi, na ndị ngwụrọ, ụmụazụ ya mekwara otu ihe ahụ. Olee ike Jisọs ji mee ya? Òkè dị aṅaa ka okwukwe keere? Ihe ọmụma dị aṅaa ka ahụmahụ narị afọ mbụ ndị a na-enye banyere ọgwụgwọ ọrụ ebube taa?—Matiu 15:30, 31.
“Okwukwe Gị Azọpụtawo Gị”
Ndị ji okwukwe agwọ ọrịa taa na-ehotakarị okwu Jisọs gwara otu nwanyị nwere oruru ọbara ruo afọ 12 bụ́ onye bịakwutere ya maka ọgwụgwọ: “Okwukwe gị azọpụtawo gị.” (Luk 8:43-48) Okwu Jisọs ọ̀ na-egosi na ọgwụgwọ ọ gwọrọ ya dabeere n’okwukwe ya? Nke ahụ ọ̀ bụ ihe atụ nke “iji okwukwe agwọ ọrịa” dị ka a na-eme ya taa?
Mgbe anyị ji nlezianya na-agụ ihe ndekọ Bible, anyị na-ahụ na n’ihe ka n’ọtụtụ mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya achọghị ka ndị ọrịa ahụ kwupụta okwukwe ha tupu a gwọọ ha. Nwanyị ahụ e hotara n’elu bịara, na-agwaghịkwa Jisọs ihe ọ bụla, zoro ezoro si n’azụ metụ uwe ya aka, “ngwa ngwa oruru ọbara ya wee guzo.” N’oge ọzọ, Jisọs gwọrọ otu nwoke so n’ime ndị bịaworo ijide ya. Ọbụna na ọ gwọrọ nwoke na-amatụghị onye Jisọs bụ.—Luk 22:50, 51; Jọn 5:5-9, 13; 9:24-34.
Mgbe ahụ, òkè dị aṅaa ka okwukwe keere? Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ n’ógbè Taịa na Saịdọn, nwanyị Finisia bịara ma tie mkpu, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid; mmụọ ọjọọ na-ejisi nwa m nwanyị ike.” Cheedị banyere obi nkoropụ ya ka ọ na-arịọ: “Onyenwe anyị, nyere m aka.” N’ịbụ onye jupụtara n’obi ebere, Jisọs zaghachiri: “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu: ka e meere gị dị ka ị na-achọ.” E wee mee ka ahụ dị nwa ya nwanyị ike “site n’oge hour ahụ.” (Matiu 15:21-28) N’ụzọ doro anya, ọ gụnyere okwukwe, ma ọ̀ bụ okwukwe ònye? Rịba ama na ọ bụ okwukwe nne ya, ọ bụghị nke nwa ahụ na-arịa ọrịa, ka Jisọs jara mma. Okwukwe na gịnịkwa? Site n’ịkpọ Jisọs “Onyenwe anyị, Nwa Devid,” nwanyị ahụ nọ na-ekwupụta n’ihu ọha na Jisọs bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ bụghị nkwupụta nkịtị nke okwukwe na Chineke ma ọ bụ okwukwe n’ike nke onye na-agwọ ọrịa. Mgbe Jisọs sịrị, “Okwukwe gị azọpụtawo gị,” o bu n’uche na ma e nweghị okwukwe na ya dị ka Mesaịa ahụ, ndị ọrịa ahụ agaraghị abịakwute ya ka a gwọọ ha.
Site n’ihe atụ Akwụkwọ Nsọ ndị a, anyị pụrụ ịhụ na ọgwụgwọ ọrịa nke Jisọs gwọrọ dị nnọọ iche n’ihe a na-ahụkarị ma ọ bụ na-azọrọ taa. E nweghị ngosi mmetụta uche siri ike—iti mkpu, ikwe ukwé, ibe ákwá, ịtụbọ, na ihe ndị ọzọ—n’aka ìgwè mmadụ, e nweghịkwa mwụgharị ihu na azụ n’akụkụ nke Jisọs. Tụkwasị na nke a, ọ dịghị mgbe Jisọs ji nzọrọ bụ́ na ha enweghị okwukwe ma ọ bụ na ụtụ ha ezughị ezu hapụ ịgwọ ndị ahụ na-adịghị ike.
Ọgwụgwọ Site n’Ike Chineke
Olee otú ọgwụgwọ ọrịa ndị nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya si were ọnọdụ? “Ike nke Onyenwe anyị dịnyekwaara Ya ime ka ahụ dị mmadụ ike,” ka Bible na-aza. (Luk 5:17) Mgbe otu ọgwụgwọ gasịrị, ka Luk 9:43 na-ekwu, “ibobo ịdị ukwuu nke Chineke nwụrụ ha nile n’ahụ.” N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Jisọs adọrọghị uche gaa n’ebe ya onwe ya nọ dị ka onye gwọrọ ọrịa ahụ. N’otu oge ọ gwara otu nwoke ọ tọhapụworo n’iyi egwu ndị mmụọ ọjọọ, sị: “Laa n’ụlọ gị, lakwuru ndị nke gị, kọọrọ ha ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke Onyenwe anyị mewooro gị, na otú O meere gị ebere.”—Mak 5:19.
Ebe Jisọs na ndị ozi ya gwọrọ ọrịa site n’ike Chineke, ọ dị mfe ịhụ ihe mere e ji ghara ịchọ okwukwe mgbe nile maka ọgwụgwọ n’aka onye a na-agwọ. Otú ọ dị, okwukwe siri ike n’akụkụ nke onye na-agwọ ọrịa dị mkpa. Ya mere, mgbe ụmụazụ Jisọs na-enweghị ike ịchụpụ otu mmụọ ọjọọ dị ike, Jisọs gwara ha ihe kpatara ya, sị: “N’ihi okwukwe nta unu.”—Matiu 17:20.
Nzube nke Ọgwụgwọ Ọrụ Ebube
Ọ bụ ezie na Jisọs gwọrọ ọtụtụ ọrịa n’ozi elu ala ya nile, ọ nọghị na-achụso ‘ozi ịgwọ ọrịa’ n’ụzọ bụ isi. Ọgwụgwọ ọrụ ebube ya—nke ọ na-anaghị ndị mmadụ ego ma ọ bụ rịọ maka onyinye—dị ala karịa nchegbu ya bụ isi, ya bụ ‘ikwusa ozi ọma nke alaeze ahụ.’ (Matiu 9:35) Ihe ndekọ ahụ na-asị na n’otu oge “O wee nara ha nke ọma, wee gwa ha okwu banyere alaeze Chineke, na-emekwa ka ahụ dị ha ike, bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e mee ka ahụ ha dị ike.” (Luk 9:11) N’akụkọ Oziọma ndị ahụ, a na-akpọkarị Jisọs “Onye Ozizi” ma ọ bụghị “Ọgwọ Ọrịa” ma ọlị.
Mgbe ahụ, gịnị mere Jisọs ji gwọọ ọrịa n’ụzọ ọrụ ebube? N’ụzọ bụ isi ọ bụ iji mee ka a mata ya dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Mgbe a tụrụ Jọn Onye Na-eme Baptism mkpọrọ n’enweghị ihe o mere, ọ chọrọ mmesi obi ike na ya arụzuwo ihe Chineke zitere ya ịrụ. O zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya ịgakwuru Jisọs wee jụọ, sị: “Gị onwe gị bụ Onye na-abịa, ma ọ̀ bụ na anyị na-ele anya onye dị iche?” Rịba ama ihe Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ Jọn: “Gaanụ, kọọrọ Jọn ihe nile unu na-anụ na nke unu na-ahụ: ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-ezi ndị ogbenye ozi ọma.”—Matiu 11:2-5.
Ee, eziokwu ahụ bụ na ọ bụghị nanị ọrịa ka Jisọs gwọrọ kamakwa ọ rụrụ ọrụ ebube ndị ọzọ e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ mere ka a mata ya nke ọma dị ka “Onye na-abịa,” Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ dịghị onye ọ bụla mkpa ịdị “na-ele anya onye dị iche.”
È Nwere Ọgwụgwọ Ọrụ Ebube Taa?
Mgbe ahụ, ànyị kwesịrị ịtụ anya ka Chineke nwapụta ike ya taa site n’ọgwụgwọ ọrịa? Ee e. Site n’ọrụ ebube ndị ọ rụrụ site n’ike Chineke, Jisọs egosipụtawo n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na ya bụ Mesaịa ahụ nke Chineke kweworo ná nkwa na ọ ga-abịa. E dekọrọ ọrụ ndị dị ike nke Jisọs na Bible ka mmadụ nile gụọ. Ọ dịghị mkpa ka Chineke gosipụta nke a site n’imeghachi ihe ndị dị otú ahụ nye ọgbọ nile nke mmadụ.
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọgwụgwọ ọrịa na ọrụ ebube ndị ọzọ na-eme ka e kweta ihe nanị ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ọbụna ụfọdụ ndị ji anya ha hụ ọrụ ebube Jisọs ekwetaghị na o nwere nkwado Nna ya nke eluigwe. “Ma ọ bụ ezie na O mererịị ọtụtụ ihe ịrịba ama dị otú a n’ihu ha, ma ha ekweghị na Ya.” (Jọn 12:37) Ọ bụ ya mere, mgbe o kwusịrị banyere onyinye ọrụ ebube dị iche iche—ibu amụma, ịsụ asụsụ dị iche iche, ime ka ahụ mmadụ dị ike, na ndị ọzọ—ndị Chineke nyeworo ndị dị iche iche nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ, Pọl onyeozi kwuru n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ọ bụrụ na ibu amụma dị, a ga-eme ka ha ghara ịdị irè; ọ bụrụkwa na asụsụ dị iche iche dị, ha ga-agwụ; ọ bụrụkwa na ihe ọmụma dị, a ga-eme ka ọ ghara ịdị irè. N’ihi na anyị maara ná mkpirikpi, anyị na-ebukwa amụma ná mkpirikpi: ma mgbe ọ bụla ihe nke zuru okè ga-abịa, a ga-eme ihe nke dị ná mkpirikpi ka ọ ghara ịdị irè.”—1 Ndị Kọrint 12:28-31; 13:8-10.
N’eziokwu, inwe okwukwe na Chineke dị mkpa maka ọdịmma anyị. Otú ọ dị, mmadụ ime ka okwukwe ya dabere ná nkwa ụgha nke ọgwụgwọ ọrịa ga-eduba nanị ná ndakpọ olileanya. Ọzọkwa, banyere oge ọgwụgwụ, Jisọs nyere ihe ịdọ aka ná ntị a: “Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha ga-ebili, gosikwa ihe ịrịba ama ukwu dị iche iche na ọrụ ebube ukwu dị iche iche; iduhie ọbụna ndị a họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.” (Matiu 24:24) E wezụga ndị adịgboroja na ndị wayo, a ga-enwekwa ngosipụta nke ike ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi ya, nzọrọ nke ihe omume a na-apụghị ịkọwa ekwesịghị iju anyị anya, ndị a kwa n’ezie abụghị ebe ndabere maka ezi okwukwe na Chineke.
Ebe ọ bụ na taa ọ dịghị onye na-agwọ ọrịa dị ka Jisọs gwọrọ, ànyị nọ n’ọghọmahịa? Ọ dịghị ma ọlị. N’ezie, ndị ahụ Jisọs gwọrọ pụrụ imesị daa ọrịa ọzọ. Ha nile kara nká ma nwụọ. Abamuru ọgwụgwọ ndị ha nwetara dịruru nwa mgbe nta. Ma, ọgwụgwọ ọrụ ebube ndị nke Jisọs nwere ihe na-adịgide adịgide ha pụtara n’echiche nke na ha sere onyinyo ngọzi ndị dị n’ihu.
Ya mere, mgbe ha nyochasịrị Okwu Chineke, bụ́ Bible, Alexandre na Benedita, ndị e hotara na mbụ, adịkwaghị enwe okwukwe n’iji okwukwe agwọ ọrịa na ọgwụgwọ mgbaasị nke oge a. Ka o sina dị, ha kwetara na ọgwụgwọ ọrụ ebube abụghị ihe gara aga. N’ihi gịnị? Dị ka ọtụtụ nde n’ụwa nile, ha na-elepụ anya maka ngọzi nke ọgwụgwọ ọrịa n’okpuru Alaeze Chineke.—Matiu 6:10.
Ọrịa na Ọnwụ Adịkwaghị
Dị ka anyị hụworo na mbụ, nzube bụ isi nke ozi Jisọs abụghị ịgwọ ndị ọrịa na ịrụ ọrụ ebube ndị ọzọ. Kama nke ahụ, o mere ka ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke bụrụ ọrụ ya bụ isi. (Matiu 9:35; Luk 4:43; 8:1) Alaeze ahụ bụ ihe Chineke ga-eji weta ọgwụgwọ ọrụ ebube nke ihe a kpọrọ mmadụ ma dozie mbibi nke mmehie na ezughị okè wetawooro ezinụlọ mmadụ. N’ụzọ dị aṅaa, ọ̀ bụkwa ole mgbe ka ọ ga-emezu ihe a?
Ilepụ anya n’ọtụtụ narị afọ n’ihu, Kraịst Jisọs nyere onyeozi ya bụ́ Jọn ọhụụ amụma: “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst Ya.” (Mkpughe 12:10) Ihe àmà nile na-egosi na kemgbe 1914 a chụdawo onye mmegide ukwu nke Chineke, Setan, n’ógbè ụwa, Alaeze ahụ na-arụkwa ọrụ ugbu a dị ka ihe dị adị! E chiwo Jisọs echichi dị ka Eze nke Alaeze Mesaịa ahụ, ọ dịwokwa njikere ugbu a ime mgbanwe dị ukwuu n’ụwa.
N’ọdịnihu dị nnọọ nso, ọchịchị eluigwe nke Jisọs ga-achị ọha mmadụ ọhụrụ nke ezi omume, ya bụ “ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13) Olee ihe ọnọdụ ga-adị ka ya mgbe ahụ? Nke a bụ ngwutụ anya dị ebube: “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị . . . [Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:1, 4.
Ị̀ pụrụ iche n’echiche ihe ndụ ga-adị ka ya mgbe ọgwụgwọ ọrụ ebube nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-emezu? “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa: a ga-ebupụ ajọ omume nke ndị bi n’ime ya.” Ee, Chineke ga-arụzu ihe ndị ji okwukwe agwọ ọrịa na-apụghị ime ma ọlị. “O lodawo ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.” N’ezie, “Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:8; 33:24.
[Foto dị na peeji nke 7]
N’okpuru Alaeze Chineke a ga-agwọ ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ ọrụ ebube